Ọrụ Ebube Jisọs—Akụkọ Ihe Mere Eme Ka Hà Bụ Akụkọ Ọdịbendị Na-emeghị Eme?
“Na nche nke anọ n’abalị Ọ bịakwutere ha, na-eje ije n’elu oké osimiri.”—Matiu 14:25.
NYE ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa, nkwenye na Jisọs Kraịst rụrụ ọrụ ebube fọrọ nke nta ka ọ dịruo mkpa ka ikwenye na Chineke n’onwe ya. Ndị dere Oziọma ndị ahụ—Matiu, Mak, Luk, na Jọn—kọwara ihe dị ka 35 n’ọrụ ebube Jisọs. Ma, ihe ndekọ ha na-enye echiche nke na ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ dị ịtụnanya.—Matiu 9:35; Luk 9:11.
A rụghị ọrụ ebube ndị a iji mee ihe ọchị. Ha dị mkpa maka nzọrọ Jisọs ịbụ Ọkpara Chineke, Mesaịa ahụ a nọworo eri oge na-eche. (Jọn 14:11) Mosis emewo ihe ịrịba ama nke ọrụ ebube mgbe o gosiri mba Israel ahụ na-agba ohu onwe ya. (Ọpụpụ 4:1-9) N’ụzọ ezi uche dị na ya, a ga-atụwokwa anya na Mesaịa ahụ, onye e buru amụma na ọ ga-aka Mosis ukwuu, ga-eme ihe ịrịba ama ụfọdụ nke nkwado Chineke. (Deuterọnọmi 18:15) N’ihi ya Bible na-akpọ Jisọs “nwoke Nke Chineke gosiworo [ndị Juu] site n’ọrụ dị ike na ọrụ ebube na ihe ịrịba ama.”—Ọrụ 2:22.
N’oge ndị gara aga, ndị mmadụ n’ozuzu ha na-anakwere ngosi Bible gosipụtara Jisọs dị ka onye na-arụ ọrụ ebube n’arụghị ụka. Ma n’iri afọ ndị a, ndị nkatọ anọwo na-akatọ ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ. N’akwụkwọ ya bụ́ Deceptions and Myths of the Bible, Lloyd Graham na-ezo aka ná ndekọ Bible nke Jisọs ịga ije n’elu mmiri ma ruo n’ókè nke ikwu, sị: “Ọ na-ewe oké amaghị nke a na-akọ iji kwere nke a n’ụzọ nkịtị, ka o sina dị, n’ụzọ nkịtị, ọtụtụ nde mmadụ na-ekwere ya. Mgbe ahụ ọ na-ejukwa anyị anya ihe na-enye ụwa anyị nsogbu. Olee ụwa ka mma nke ị ga-atụ anya amaghị nke a na-akọ dị otú a n’aka ya?”
Hà Bụ Ihe Na-apụghị Ime Eme?
Otú ọ dị, ezi uche adịghị ná nkatọ ndị dị otú ahụ. Akwụkwọ The World Book Encyclopedia na-akọwa ọrụ ebube dị ka “ihe omume nke a na-apụghị ịkọwa site n’iwu okike ndị a maara.” Site ná nkọwa ahụ, TV na-egosi àgwà àgwà, fon a na-ebugharị ebugharị, ma ọ bụ kọmputa a na-adọkwasị n’apata ụkwụ bụ ihe ndị a gaara ele anya dị ka ọrụ ebube nanị n’otu narị afọ gara aga! Ezi uche ọ̀ dị n’ikwesi olu ike ma na-asị na ihe bụ ihe na-apụghị ime eme nanị n’ihi na anyị apụghị ịkọwa ya n’ikwekọ n’ihe ọmụma sayensị e nwere ugbu a?
Ihe ọzọ a ga-atụle bụ: N’asụsụ Grik mbụ e ji dee “Agba Ọhụrụ,” okwu e ji mee ihe maka “ọrụ ebube” bụ dyʹna·mis—okwu pụtara n’ụzọ bụ isi “ike.” A sụgharịkwara ya “ọrụ dị ike” ma ọ bụ “ikike.” (Luk 6:19; 1 Ndị Kọrint 12:10; Matiu 25:15) Bible na-azọrọ na ọrụ ebube Jisọs bụ ngosipụta nke “ịdị ukwuu nke Chineke.” (Luk 9:43) Ọrụ ndị dị otú ahụ hà bụ ihe ndị na-apụghị ime eme nye Chineke pụrụ ime ihe nile—Onye nwere ‘ịba ụba nke ike’?—Aịsaịa 40:26.
Ihe Àmà nke Ịbụ nke A Pụrụ Ịtụkwasị Obi
Nnyocha chiri anya nke Oziọma anọ ndị ahụ na-enye ihe àmà ọzọkwa nke ha ịbụ ndị a pụrụ ikwere. Otu ihe bụ na ihe ndekọ ndị a dịwaga nnọọ iche site n’akụkọ ifo dị iche iche. Tụlee, dị ka ihe atụ, akụkọ ụgha ndị gbasara banyere Jisọs na narị afọ ndị sochiri ọnwụ ya. “Oziọma Thomas” nke apọkrịfa na-akọ, sị: “Mgbe nwa okoro a bụ́ Jisọs dị afọ ise . . . , ọ gabigara obodo nta ahụ, otu nwatakịrị kwa wee gbapụta kụọ onwe ya n’ubu ya. Iwe were Jisọs, o wee sị ya: ‘Ị gaghị agakwa n’ihu n’ụzọ gị’, nwatakịrị ahụ wee daa n’ala nwụọ ozugbo ahụ.” O sighị ike ịhụ ihe akụkọ nke a bụ n’ezie—ihe odide e chepụtara echepụta nke na-emeghị eme. Ọzọkwa, nwatakịrị na-enwe mkpali gabigara ókè, nke obi ọjọọ, nke e gosipụtara n’ebe a eyitụghị Jisọs nke Bible.—Lee ọdịiche dị na Luk 2:51, 52.
Ugbu a tụlee ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ a pụrụ ịtụkwasị obi. Ha enweghị nkwubiga okwu ókè na nchepụta na-emeghị eme. Jisọs rụrụ ọrụ ebube ná nzaghachi nye mkpa ndị e nwere n’ezie, ọ bụghị iji mejuo nanị mkpali gabigara ókè. (Mak 10:46-52) Ọ dịghị mgbe Jisọs jiri ike ya metara onwe ya uru. (Matiu 4:2-4) O jighịkwa ha mee ngosi mgbe ọ bụla. N’ezie, mgbe Eze Herọd nwere ọchịchọ ịmata ihe chọrọ ka Jisọs meere ya “ihe ịrịba ama” nke ọrụ ebube, Jisọs “azaghị ya ihe ọ bụla.”—Luk 23:8, 9.
Ọrụ ebube Jisọs guzopụkwara nnọọ iche n’ọrụ nke ndị ọkà ná mmegharị anya, ndị majik, na ndị ji okwukwe agwọ ọrịa. Ọrụ ya ndị dị ike nyere Chineke otuto mgbe nile. (Jọn 9:3; 11:1-4) Ọrụ ebube ya nile enweghị ememe oké mmetụta uche, ịgụ okwu majik, ime ngosi, mmegharị anya, na iji ọgwụ ekegide mmadụ. Mgbe Jisọs zutere otu onye ìsì na-arịọ arịrịọ aha ya bụ Batimiọs bụ́ onye tiri mkpu sị, “Rabonaị, ka e mee ka m hụ ụzọ,” nanị ihe Jisọs gwara ya bụ: “Laba; okwukwe gị azọpụtawo gị. Ngwa ngwa e wee mee ka ọ hụ ụzọ.”—Mak 10:46-52.
Ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ na-egosi na Jisọs rụrụ ọrụ ya ndị dị ike n’enweghị ngwongwo ndị a kwadebere, ọnọdụ ihe nkiri a haziri n’ụzọ pụrụ iche, ma ọ bụ ìhè ọkụ aghụghọ. E mere ha n’ihu ọha, ọtụtụ mgbe n’ihu ọtụtụ ndị ji anya ha na-ekiri. (Mak 5:24-29; Luk 7:11-15) N’adịghị ka mgbalị nile nke ndị ji okwukwe agwọ ọrịa nke oge a, mgbalị ya ịgwọ ọrịa adịghị mgbe ha kụrụ afọ n’ala n’ihi onye ọrịa a sịrị na o nweghị okwukwe. Matiu 8:16 na-asị: “[O] meekwa ndị nile ahụ na-adịghị mma ka ahụ ha dị ike.”
N’akwụkwọ ya bụ́ “Many Infallible Proofs:” The Evidences of Christianity, onye mmụta bụ́ Arthur Pierson na-ekwu banyere ọrụ ebube Kraịst, sị: “Ọnụ ọgụgụ ha, ha ịbụ ndị mere n’enweghị nkwadebe e bu ụzọ mee na ọdịdị dum nke ọgwụgwọ ọrịa nile o mere na e nweghị otu nke dara ada ná mgbalị ọbụna iji kpọlite ndị nwụrụ anwụ, na-etinye oké ọdịiche n’etiti ọrụ ebube ndị a na ihe ịtụnanya ndị e ji aghụghọ eme n’ọgbọ a ma ọ bụ n’ọgbọ ọ bụla ọzọ.”
Nkwado nke Ihe Ndị Na-emetụtaghị Okpukpe
Pierson na-ewepụtakwa arụmụka ọzọ na-akwado ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ mgbe ọ sịrị: “Ọ dịghị nnwapụta nke ọrụ ebube dị iche iche nke akwụkwọ nsọ dị ịrịba ama karịa mmechi ọnụ nke ndị iro.” Ndị ndú ndị Juu nwere nnọọ ihe mkpali zuru ezu maka ịchọ ịkatọ Jisọs, ma a maara ọrụ ebube ya nile nke ọma nke na ndị mmegide anwaghị anwa ịgọnarị ha. Nanị ihe ha pụrụ ime bụ ikwu na oké ọrụ ndị dị otú ahụ sitere n’ike ndị mmụọ ọjọọ. (Matiu 12:22-24) Ọtụtụ narị afọ ka ọnwụ Jisọs gasịrị, ndị dere Talmud ndị Juu nọgidere na-ekwu na Jisọs nwere ike ọrụ ebube. Dị ka akwụkwọ Jewish Expressions on Jesus na-ekwu, ha leghaara ya anya dị ka onye “gbasoro ihe omume dị iche iche nke majik.” À gaara ekwuwo ihe dị otú ahụ ma ọ bụrụ na a pụrụ ọbụna n’ụzọ ọ bụla ileghara ọrụ ebube Jisọs anya dị ka nanị akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme?
Ihe nnwapụta ọzọ na-esite n’aka ọkọ akụkọ chọọchị na narị afọ nke anọ bụ́ Eusebius. N’akwụkwọ ya bụ́ The History of the Church From Christ to Constantine, o hotara otu Quadratus onye zigaara onye ọchịchị alaeze ukwu akwụkwọ ozi n’ịgbachitere Iso Ụzọ Kraịst. Quadratus dere, sị: “A na-ahụ ọrụ Onye Nzọpụta anyị mgbe nile, n’ihi na ha bụ eziokwu—ndị a gwọworo ọrịa ha na ndị a kpọlitere n’ọnwụ, ndị a na-ahụghị nanị n’oge ahụ a gwọrọ ha ma ọ bụ kpọlite ha, kama ha nọ ya mgbe nile ịhụ ha, ọ bụghị nanị mgbe Onye Nzọpụta ahụ nọ n’etiti anyị, kama ruo ogologo oge mgbe ọpụpụ Ya gasịrị; n’ezie ụfọdụ n’ime ha nọgidere ndụ kpọmkwem ruo n’oge nke m.” Onye mmụta bụ́ William Barclay kwuru, sị: “Quadratus na-ekwu na ruo n’ụbọchị nke ya a pụrụ n’ezie ịkpọpụta ndị ikom a rụrụ ọrụ ebube n’ahụ ha. Ọ bụrụ na nke ahụ abụghị eziokwu ọ dịghị ihe gaara akara gọọmenti Rom mfe karịa ịkpọ ya ihe ụgha.”
Nkwere n’ọrụ ebube Jisọs bụ ihe ezi uche, echiche ọma, na nke kwekọzuru n’ihe àmà. Ka o sina dị, ọrụ ebube Jisọs abụghị akụkọ ihe mere eme gabigaworo. Ndị Hibru 13:8 na-echetara anyị: “Jisọs Kraịst dị otu aka ahụ ụnyaahụ na taa, ee, ruokwa mgbe nile ebighị ebi.” Ee, ọ dị ndụ n’eluigwe taa, nwee ike iji ike ọrụ ebube mee ihe n’ụzọ ka nnọọ ukwuu karịa ka o mere n’elu ụwa dị ka mmadụ. Ọzọkwa, ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ nke ọrụ ebube ya (1) na-akụziri ndị Kraịst ihe mmụta ndị dị irè taa, (2) na-ekpughe akụkụ ndị na-akpali mmasị nke ụdị onye Jisọs bụ, ma (3) na-atụ aka n’oge dị nso n’ihu mgbe ọbụna ihe ndị ka na-atụ n’anya ga-ewere ọnọdụ!
Isiokwu na-esonụ ga-elekwasị anya n’ihe ndekọ atọ a maara nke ọma nke Bible iji nye ihe atụ nke isi ihe ndị a.