Ihe Mmụta Site N’ọrụ Ebube Ndị Jisọs Rụrụ
“N’ỤBỌCHỊ nke atọ ọlụlụ nwunye dị na Kena nke Galili . . . E wee kpọọkwa Jisọs, Ya na ndị na-eso ụzọ Ya, bịa n’ọlụlụ nwunye ahụ. Mgbe mmanya vine kọrọ, nne Jisọs wee sị Ya, Ha enweghị mmanya vine.” Ihe omume nke a wepụtara ọnọdụ maka ọrụ ebube nke mbụ nke Jisọs.—Jọn 2:1-3.
Ọ̀ bụ na nsogbu dị otú ahụ abụghị nnọọ ihe dị nta, ihe na-enweghị nnọọ isi, ime ka Jisọs mara? Otu onye mmụta Bible na-akọwa, sị: “Ile ọbịa nke ọma n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ bụ ọrụ dị nsọ . . . Ezigbo ile ọbịa nke ọma, karịsịa n’ememe agbamakwụkwọ, chọrọ njupụta nke ihe oriri na ihe ọṅụṅụ. Ọ bụrụ na ihe ndị e nwere [gwụrụ] n’ememe agbamakwụkwọ, ezinụlọ ahụ na di na nwunye ọhụrụ ahụ agaghị nnọọ agbanarị ihe ihere ya.”
Ya mere Jisọs mere ihe. Ọ hụrụ “ite nkume mmiri isii, dị ka ime ọcha nke ndị Juu si dị.” Nsachasị dị ka ememe okpukpe si dị tupu iri nri bụ omenala n’etiti ndị Juu, a chọwokwa mmiri dị ukwuu iji gboo mkpa ndị bịara. “Were mmiri gbajuo ite mmiri ndị a,” ka Jisọs nyere ndị na-ejere ndị ọbịa ozi n’iwu. Jisọs abụghị “onye isi oriri ahụ,” ma o kwuru okwu hoo haa na n’ụzọ onye nwere ike. Ihe ndekọ ahụ na-asị: “Ma mgbe onye isi oriri ahụ detụrụ mmiri ahụ ọnụ [ọ] ghọrọrịị mmanya vine.”—Jọn 2:6-9; Mak 7:3.
Ọ pụrụ iyi ihe pụrụ iche na ihe nkịtị dị ka agbamakwụkwọ ga-abụ ọnọdụ maka ọrụ ebube mbụ nke Jisọs, ma ihe omume ahụ na-ekpughe ihe dị ukwuu banyere Jisọs. Ọ bụ nwoke na-alụghị nwunye, n’ọnọdụ ndị sochikwara o so ndị na-eso ụzọ ya tụlee uru dị iche iche nke alụghị di ma ọ bụ nwunye. (Matiu 19:12) Otú ọ dị, ọnụnọ ya n’ememe agbamakwụkwọ kpughere na ọ bụghị ma ọlị onye na-emegide alụmdi na nwunye. Ọ nọ n’ezi nhazi, na-akwado ndokwa alụmdi na nwunye; o lere ya anya dị ka ihe dị nsọpụrụ n’anya Chineke.—Tụlee Ndị Hibru 13:4.
Jisọs abụghị onye oké ezi omume ihe na-adịghị atọ ụtọ nke ndị chọọchị na-ese ihe osise mesịrị gosipụta ya ịbụ. O nwere mmasị n’ụzọ doro anya n’ịnọ ebe ndị mmadụ nọ, ọ dịghịkwa emegide inwe nnọkọ oriri na ọṅụṅụ. (Tụlee Luk 5:29.) Ihe ndị o mere setịpụrụ ụkpụrụ maka ụmụazụ ya. Jisọs gosipụtara n’onwe ya na ha agaghị na-eme nsọ nsọ ma ọ bụ na-agbarụ ihu n’ụzọ na-enweghị isi—dị ka a ga-asị na ezi omume pụtara enweghị ọṅụ. N’ụzọ dị iche, e mesịrị nye ndị Kraịst iwu, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’Onyenwe anyị mgbe nile.” (Ndị Filipaị 4:4) Ndị Kraịst taa na-elezi anya idebe ntụrụndụ n’ókè ezi uche dị na ya. Ha na-enweta ọṅụ ha n’ije ozi Chineke, ma n’ịgbaso ihe nlereanya Jisọs, mgbe mgbe ha na-ewepụta oge iji nwee nnọkọrịta n’ọnọdụ oriri na ọṅụṅụ.
Leekwa ịdị nro nke mmetụta Jisọs. Iwu ejighị ya ịrụ ọrụ ebube. Ọ dịghị amụma dị na nke a nke a ga-emezu. N’ụzọ ihe àmà na-egosi, nanị ihe mere bụ na nchegbu nne ya na ọnọdụ ọjọọ nke ndị ahụ na-agba akwụkwọ ọhụrụ kpaliri Jisọs. O chere banyere mmetụta ha ma chọọ igbochiri ha mmechuihu. Nke ahụ ọ́ dịghị ewulite obi ike gị na Kraịst nwere ezi mmasị n’ebe ị nọ—ọbụna ná nsogbu ndị ị na-enwe kwa ụbọchị?—Tụlee Ndị Hibru 4:14-16.
Ebe ọ bụ na ite nke ọ bụla “na-anagide firkin abụọ ma ọ bụ atọ” nke mmiri, ọrụ ebube Jisọs gụnyere ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke mmanya—ma eleghị anya 390 lita (105 galọn)! (Jọn 2:6) N’ihi gịnị ka e ji mee ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ dị ukwuu? Jisọs adịghị akwado ịṅụbiga mmanya ókè, ihe Chineke kagburu. (Ndị Efesọs 5:18) Kama nke ahụ, ọ na-egosipụta mmesapụ aka yiri nke Chineke. Ebe ọ bụ na mmanya bụ ihe ọṅụṅụ a na-ejikarị eme ihe, a pụrụ iji nke ọ bụla fọrọnụ mee ihe n’oge ọzọ.—Tụlee Matiu 14:14-20; 15:32-37.
Ndị Kraịst mbụ ṅomiri ihe nlereanya Jisọs nke mmesapụ aka. (Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 4:34, 35.) A na-agbakwa ndị Jehova taa ume n’otu aka ahụ ‘inye ihe.’ (Luk 6:38) Otú ọ dị, ọrụ ebube mbụ nke Jisọs nwekwara ihe amụma dị na ya. Ọ na-atụ aka n’oge dị n’ihu mgbe Chineke n’ụzọ mmesapụ aka ga-eme “oké oriri nke ihe mara abụba, bụ́ oké oriri nke ezi mmanya vine doro edo,” na-ewepụsị agụụ.—Aịsaịa 25:6.
Ma, gịnị banyere ọtụtụ ọrụ ebube Jisọs rụrụ ndị metụtara ọgwụgwọ ọrịa nkịtị? Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site na ha?
Ime Ihe Ọma n’Ụbọchị Izu Ike
“Bilie, chịrị ute gị, na-ejegharị.” Jisọs gwara nwoke rịaworo ọrịa ruo 38 afọ okwu ndị a. Ihe ndekọ Oziọma ahụ na-aga n’ihu: “Ngwa ngwa e wee mee ka ahụ dị nwoke ahụ mma, o wee chịrị ute ya, wee na-ejegharị.” Dị ka ihe ijuanya, ọ bụghị mmadụ nile nwere obi ụtọ ná mgbanwe ọnọdụ nke a. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “Ndị Juu na-esogbukwa Jisọs, n’ihi na Ọ na-eme ihe ndị a n’ụbọchị izu ike.”—Jọn 5:1-9, 16.
E zubere Sabat ịbụ ụbọchị izu ike na nṅụrị ọṅụ maka mmadụ nile. (Ọpụpụ 20:8-11) Ma, ka ọ na-erula oge Jisọs, ọ ghọwo nkekọta nke ụkpụrụ mmegbu, bụ́ ndị ụmụ mmadụ mere. Onye mmụta bụ́ Alfred Edersheim dere na ná nkebi ebe iwu ndị ahụ dị ogologo nke Ụbọchị Izu Ike dị na Talmud, “a tụlere okwu dị iche iche n’ụzọ siri ike dị ka hà bụ ihe ndị dị oké mkpa n’okpukpe, ndị ọ ga-esiri mmadụ ike iche na onye isi zuru okè nwere ọgụgụ isi ga-atụlesi ike.” (The Life and Times of Jesus the Messiah) Ndị rabaị gbakwụnyere ịdị mkpa nke ndụ na ọnwụ n’ụkpụrụ ndị na-enweghị isi, ndị aka ike, ndị chịkwara kpọmkwem akụkụ ọ bụla nke ndụ onye Juu—ọtụtụ mgbe n’enweghị nchebara echiche ọ bụla maka mmetụta mmadụ. Otu ụkpụrụ Ụbọchị Izu Ike nyere iwu, sị: “Ọ bụrụ na ụlọ dagidere mmadụ, e jighịkwa n’aka ma ọ̀ nọ n’ebe ahụ ka ọ bụ na ọ nọghị ya, ma ọ bụ ma ọ̀ dị ndụ ka ọ nwụrụ anwụ, ma ọ bụ ma ọ̀ bụ onye jentaịl ka ọ bụ onye Israel, ha pụrụ ibupụsị mkpọmkpọ ihe ahụ site n’elu ya; ọ bụrụ na ha hụrụ na ọ dị ndụ ha pụrụ ịbụpụkwu ihe ahụ site n’elu ya; ma ọ bụru na [ọ] nwụrụ anwụ, ha ga-ahapụ ya.”—Tractate Yoma 8:7, The Mishnah, nke Herbert Danby sụgharịrị.
Olee otú Jisọs si lee nchụchọgharị ọnụ ndị dị otú ahụ n’iwu anya? Mgbe a katọrọ ya n’ihi ịgwọ ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike, ọ sịrị: “Nna m na-arụ ọrụ ruo ugbu a, Mụ onwe m na-arụkwa ọrụ.” (Jọn 5:17) Jisọs adịghị arụ ọrụ ego iji baa onwe ya ọgaranya. Kama nke ahụ, ọ na-eme uche Chineke. Dị nnọọ ka e nyere ndị Livaị ohere ịga n’ihu n’ije ozi nsọ ha n’Ụbọchị Izu Ike, Jisọs pụrụ n’izi ezi ịrụ ọrụ Chineke kenyere ya dị ka Mesaịa n’emebighị Iwu Chineke.—Matiu 12:5.
Ọgwụgwọ ọrịa ndị Jisọs gwọrọ n’Ụbọchị Izu Ike kpughekwara ndị odeakwụkwọ ndị Juu na ndị Farisii ịbụ ndị ‘bụbigara ndị ezi omume ókè’—na-ekwesi olu ike ma ghara inwe ezi nhazi n’echiche ha. (Eklisiastis 7:16) N’ezie, ọ bụghị uche Chineke na a ga-akpara ọrụ ọma ókè n’ụbọchị ụfọdụ nke izu; Chineke ebughịkwa n’uche ka Ụbọchị Izu Ike bụrụ ngosipụta na-enweghị isi n’ịgbaso ụkpụrụ. Jisọs kwuru na Mak 2:27, sị: “E mere ụbọchị izu ike n’ihi mmadụ, e meghị mmadụ n’ihi ụbọchị izu ike.” Jisọs hụrụ ndị mmadụ n’anya, ọ bụghị ụkpụrụ aka ike dị iche iche.
N’ihi ya ndị Kraịst taa ga-eme nke ọma ịghara ikwesi olu ike gabiga ókè ma ọ bụ jiri ụkpụrụ kpọrọ oké ihe n’echiche ha. Ndị bụ́ isi n’ọgbakọ na-ezere ibokwasị ndị ọzọ ibu arọ site n’ọtụtụ ụkpụrụ na usoro ihe omume ndị ụmụ mmadụ guzobere. Ihe nlereanya Jisọs na-agbakwa anyị ume ịchọ ohere dị iche iche iji mee ihe ọma. Dị ka ihe atụ, ọ dịghị mgbe onye Kraịst ga-eche na ya ga-ekerịta eziokwu Bible nanị mgbe ọ na-ekere òkè n’ụzọ a kwadebere akwadebe n’ozi ụlọ n’ụlọ ma ọ bụ mgbe ọ nọ n’elu ikpo okwu ihu ọha. Ndị Kraịst, ka Pita onyeozi na-ekwu, kwesịrị ịbụ “ndị e doziworo mgbe dum ịgọpụrụ onye ọ bụla nke na-ajụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ nke dị n’ime unu.” (1 Pita 3:15) Ime ihe ọma enweghị ịkpa ókè nke oge.
Ihe Mmụta n’Ọmịiko
E dekọrọ ọrụ ebube ọzọ dị ịrịba ama na Luk 7:11-17. Dị ka ihe ndekọ ahụ na-ekwu, Jisọs “garuru obodo a na-akpọ Nain; ndị na-eso ụzọ Ya wee soo Ya gaa, ha na oké ìgwè mmadụ.” Ruo taa, a pụrụ ịhụ ebe a na-eli ozu n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke obodo nta ndị Arab e nwere ugbu a nke a na-akpọ Nein. “Mgbe Ọ bịaruru nso ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ,” o zutere ọnọdụ mkpọtụ. “Lee, a na-ebupụ otu onye nwụrụ anwụ, bụ́ nwa nwoke nke nne ya mụrụ nanị ya, nwanyị ahụ bụkwa onye di ya nwụrụ: oké ìgwè nke ndị obodo ahụ sorokwa ya.” H. B. Tristram rịbara ama na “ụzọ e si eduzi ememe ili ozu agbanwebeghị” site n’oge ndị ochie, na-agbakwụnye, sị: “Ahụwo m ndị inyom ka ha na-ebute ihe e ji buru ozu ahụ ụzọ, bụ́ ndị ụmụ nwanyị bụ́ ọkà n’ịkwa ákwá na-edu. Ha na-achịli ógwè aka ha, na-adọkasị ntutu ha, na-eme ngosipụta ara ara nke iru újú, na-ebepụtakwa aha onye ahụ nwụrụnụ n’ákwá.”—Eastern Customs in Bible Lands.
N’etiti mkpọtụ ọgba aghara dị otú ahụ ka otu nwanyị di ya nwụrụ na-azọ ije bụ́ onye ihu ya na-aghaghị ịbụwo ihe mgbu n’onwe ya. Ebe di ya nwụnahụwororịị ya, o lere nwa ya nwoke anya dị ka, n’okwu nke Herbert Lockyer na-ede akwụkwọ, “mkpara nke oge nká ya, na nkasi obi nke owu ọmụma ya—nkwado na ide nke ụlọ ahụ. N’ịbụ onye nwa nwoke ọ mụrụ nanị ya nwụnahụrụ, e kpochapụwo nkwado ikpeazụ o nwere.” (All the Miracles of the Bible) Gịnị bụ mmeghachi omume Jisọs? N’okwu na-aga were were nke Luk, “mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, O wee nwee ọmịiko n’ahụ ya, sị ya, Akwala ákwá.” E nwetara okwu ahụ bụ “nwee ọmịiko” site n’okwu Grik nke pụtara n’ụzọ nkịtị “eriri afọ.” Ọ pụtara “ịbụ onye a kwaliri site n’ime ime mmadụ.” (Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words) Ee, a kwaliri Jisọs ruo n’ala ala nke ime ahụ ya.
O yiri ka nne Jisọs n’onwe ya ọ̀ bụ nwanyị di ya nwụrụ n’oge a, ya mere ma eleghị anya ọ maara ihe mgbu nke ịbụ onye mmadụ nwụnahụrụ site n’ịbụ onye nna kuchiri ya, bụ́ Josef, nwụnahụrụ. (Tụlee Jọn 19:25-27.) Ọ dịghị nwanyị ahụ di ya nwụrụ mkpa ịrịọ Jisọs arịọ. Ozugbo, “o wee bịaruo nso, metụ igbe ozu ahụ aka,” n’agbanyeghị na n’okpuru Iwu Mosis imetụ ozu aka na-eme ka mmadụ ghara ịdị ọcha. (Ọnụ Ọgụgụ 19:11) Site n’ike ọrụ ebube ya, Jisọs pụrụ iwepụ kpọmkwem isi iyi nke adịghị ọcha! “O wee sị, Nwa okorobịa, gị ka M na-asị, Bilie. Onye ahụ nke nwụrụ anwụ wee nọlie, malite ikwu okwu. O wee were ya nye nne ya.”
Lee ihe mmụta na-akpali akpali n’ọmịiko ọ bụ! Ndị Kraịst agajeghị iṅomi àgwà ahụghị n’anya, nke enweghị mmasị na-apụta ìhè na “mgbe ikpeazụ” ndị a. (2 Timoti 3:1-5) N’ụzọ dị iche, 1 Pita 3:8 na-agba ume, sị: “N’ikpeazụ, nwekọọnụ otu uche, unu nile, werenụ obi sorịta onwe unu hụkọọ ahụhụ, bụrụnụ ndị na-ahụ ụmụnna unu n’anya, ndị nwere obi ọmịiko.” Mgbe ọnwụ ma ọ bụ ajọ ọrịa dakwasịrị onye anyị maara, anyị apụghị ịkpọlite mmadụ n’ọnwụ ma ọ bụ gwọọ onye ahụ na-adịghị ike. Ma anyị pụrụ inye aka, kasiekwa obi n’ụzọ dị irè, ma eleghị anya nanị site n’ịnọ n’ebe ahụ na iso ha na-akwa ákwá.—Ndị Rom 12:15.
Mkpọlite n’ọnwụ nke a dị ịrịba ama nke Jisọs rụrụ na-atụkwa aka gaa n’ọdịnihu—oge mgbe “ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa”! (Jọn 5:28, 29) Gburugburu ụwa, ndị mmadụ nwụnahụrụ ga-enwe ahụmahụ nke ọmịiko Jisọs n’onwe ha mgbe ndị nne, ndị nna, ụmụ, na ndị enyi si n’ili laghachite!
Ihe Mmụta Ndị Dị n’Ọrụ Ebube Ndị Ahụ
Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, ọrụ ebube dị iche iche nke Jisọs karịrị ngosipụta ndị na-akpali akpali nke ike. Ha nyere Chineke otuto, na-esetịpụ ụkpụrụ maka ndị Kraịst bụ́ ndị a gbara ume ‘inye Chineke otuto.’ (Ndị Rom 15:6) Ha gbara ume ime ihe ọma, igosi mmesapụ aka, ngosipụta nke ọmịiko. Nke ka mkpa, ha jere ozi dị ka nlepụ anya n’ihu nke ọrụ ndị dị ike a ga-arụ n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst.
Mgbe ọ nọ n’elu ụwa, Jisọs rụrụ ọrụ ya ndị dị ike n’ime ógbè dị nnọọ nta. (Matiu 15:24) Dị ka Eze e buliri elu, ókèala ya ga-agbasaru gburugburu ụwa! (Abụ Ọma 72:8) Laa azụ n’oge ahụ, ndị e ji ọrụ ebube gwọọ ma kpọlite n’ọnwụ mesịrị nwụọ. N’okpuru ịbụ eze eluigwe ya, a ga-ewepụ mmehie na ọnwụ kpam kpam, na-emeghepụ ụzọ maka ndụ ebighị ebi. (Ndị Rom 6:23; Mkpughe 21:3, 4) Ee, ọrụ ebube dị iche iche nke Jisọs na-atụ aka n’ụzọ nke ọdịnihu dị ebube. Ndịàmà Jehova enyeworo ọtụtụ nde mmadụ aka ịzụlite ezi olileanya nke ịbụ akụkụ ya. Tupu oge ahụ abịa, lee ndetu ire dị ebube nke ihe ga-ewere ọnọdụ n’isi nso nke ọrụ ebube nile nke Jisọs Kraịst na-enye!
[Foto dị na peeji nke 7]
Jisọs emee mmiri ka ọ ghọọ mmanya