Olee Otú Ị Pụrụ Isi Mee Ka Ekpere Gị Ka Mma?
EKPERE pụrụ iche n’etiti ndokwa ịhụnanya ndị Jehova Chineke mere. Ndị mmegide pụrụ ijichi Bible gị ma ọ bụ gbochie gị iso ndị na-efe ofufe ibe gị na-ezukọ, ma ọ dịghị onye pụrụ ịnapụ gị ekpere. Ikwubiga okwu ókè banyere uru nke ekpere bụ ihe a na-apụghị ime eme. Mgbe ahụ, lee ka o si dị mkpa nye onye ọ bụla n’ime anyị iji ihe ùgwù nke a kpọrọ ihe ma jiri ya na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu. Gịnị pụrụ inyere gị aka ime ka ekpere gị ka mma?
Bible abụghị akwụkwọ ekpere. Otú ọ dị, a pụrụ ịkọwa ya dị ka akwụkwọ ọgụgụ kachasịnụ nke ihe a kpọrọ mmadụ banyere ekpere. Akwụkwọ Nsọ Hibru nanị nwere ihe karịrị 150 ekpere. Ụfọdụ dị mkpirikpi; ndị ọzọ dị ogologo. E kwupụtara ha n’ihu ọha ma ọ bụ na nzuzo, site n’ọnụ ndị eze ma ọ bụ ndị a dọọrọ n’agha, ná mmeri ma ọ bụ ná mkpagbu. Dị ka Devid bụrụ n’Abụ Ọma 65:2, “anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ” na-echigharịkwuru Jehova, “Onye na-anụ ekpere.” N’ihi gịnị ka Chineke ji kpalie ndị dere Bible idekọ ọtụtụ ekpere ndị dị otú ahụ a họọrọ nke ọma?
Iji zaa ajụjụ ahụ, tụlee 2 Timoti 3:16. Ọ na-asị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru.” Ya mere, ekpere ndị e dekọrọ na Bible bụ maka ya iduzi anyị, dịkwa ka amụma, ụkpụrụ dị iche iche, na akụkọ ihe mere eme ndị e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ. Olee otú ekpere ndị a pụrụ isi bara anyị uru?
Site n’ileru ekpere ndị e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ anya, anyị pụrụ ịmata ndị ahụ e kpere n’ọnọdụ ndị yiri nke anyị. Anyị pụrụ ịmụta otú ekpere si adịgasị iche iche ná nzube na n’ọnọdụ. Ọzọkwa, anyị ga-achọpụta okwu otuto na ekele ndị ọhụrụ, chọtakwa okwu ndị ọhụrụ maka arịrịọ anyị dị iche iche. N’ikwu ya ná mkpirikpi, ekpere ndị dị na Bible pụrụ inyere anyị aka ime ka ekpere nke anyị ka mma.
Meri, onye ghọrọ nne Jisọs, bụ́ onye o doro anya na o ritere uru site n’okwu ndị e ji mee ihe n’otu ekpere e dekọrọ n’ime Bible. O letara onye ikwu ya bụ́ Elizabet mgbe nke ọ bụla n’ime ha tụrụsịịrị ime nwa nwoke site n’enyemaka Chineke. Meri nyere Chineke otuto na ekele, okwu ya ụfọdụ yikwara nnọọ n’ụzọ dị ịrịba ama ndị ahụ dị n’otu ekpere dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. O yikarịrị ka Meri ọ̀ maara ekpere ahụ nke Hana, bụ́ nne Samuel onye amụma kpere. Hana atụrụwokwa ime nwa nwoke site n’enyemaka Chineke, ihe karịrị 1,000 afọ gara aga. Ọ̀ pụrụ ịbụ na Meri tụgharịrị uche n’ekpere nke a n’ihi na o gosipụtara mmetụta ndị nke ya?—1 Samuel 2:1-10; Luk 1:46-55.
Gịnị banyere gị? Ị̀ pụrụ icheta otu ekpere dị na Bible nke e kpere n’ọnọdụ ndị yiri nke gị? Ịchọta, ịgụ, na ịtụgharị uche n’ekpere ndị dị otú ahụ ga-enyere gị aka ime ka nkwurịta okwu nke gị na Chineke ka mma. N’isiokwu na-esonụ, anyị na-akpọ gị òkù ka i nyochaa ekpere atọ ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ. E kpere ha n’ọnọdụ dịgasị iche iche ndị pụrụ iyi nke gị ma eleghị anya.