Uru Ndị Dị n’Ịtụ Ezi Chineke ahụ Egwu
“Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.”—AỊSAỊA 48:17.
1. Ọdachi ndị dị aṅaa ka a gaara ezere site n’egwu Chineke?
A SỊ na Adam zụlitere egwu Chineke, ọ pụrụ igbochiworị ya ime mmehie nke dujere n’ọnwụ ebighị ebi nke onwe ya na ọtụtụ puku afọ nke iru újú nye ụmụ ya. A sị na mba Israel ochie ahụ ṅara ntị ná ndụmọdụ Jehova ịtụ egwu ya na ịhụ ya n’anya, a garaghị adọrọ mba ahụ n’agha gaa Babilọn, ha agaraghịkwa ajụ Ọkpara Chineke ma bụrụ ndị ikpe mwụsị ọbara ya mara. A sị na ụwa taa na-atụ Chineke egwu, a garaghị enwe omume rụrụ arụ n’ọchịchị ma ọ bụ n’azụmahịa, mpụ agaghị adị, agha agaghị adị.—Ilu 3:7.
2. N’agbanyeghị ọnọdụ ndị dị n’ụwa anyị bi n’ime ya, n’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji zụlite egwu Jehova?
2 Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe ọ bụla ụwa anyị bi n’ime ya na-eme, anyị dị ka mmadụ n’otu n’otu, dị ka ezinụlọ dị iche iche, na dị ka ọgbakọ nile nke ndị ohu Jehova pụrụ irite uru site n’ịzụlite egwu nke ezi Chineke ahụ. Nke a kwekọrọ n’ihe ncheta nke Mosis nyere mba Israel: “Gịnị ka Jehova, bụ́ Chineke gị, na-arịọ n’aka gị, ma ọ bụghị ịtụ egwu Jehova, bụ́ Chineke gị, ije ije n’ụzọ Ya nile, na ịhụ Ya n’anya, na iwere obi gị nile na mkpụrụ obi gị nile fee Jehova, bụ́ Chineke gị, ofufe, idebe ihe nile Jehova nyere n’iwu . . . ka o wee dịrị gị mma?” (Deuterọnọmi 10:12, 13) Gịnị bụ ụfọdụ n’ime uru ndị na-abịara anyị mgbe anyị na-atụ egwu Jehova, bụ́ ezi Chineke ahụ?
Amamihe—Ọ Dị Oké Ọnụ Karịa Ọlaedo
3. (a) Gịnị bụ uru mbụ nke anyị pụrụ irite? (b) Gịnị ka Abụ Ọma 111:10 pụtara?
3 Uru mbụ bụ ezi amamihe. Abụ Ọma 111:10 na-ekwupụta, sị: “Mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ.” Gịnị ka nke ahụ pụtara? Amamihe bụ ikike nke iji ihe ọmụma agwọta nsogbu dị iche iche n’ụzọ gara nke ọma, gbochie ihe ize ndụ, ma ruo ihe mgbarụ ọsọ ụfọdụ. Ọ na-agụnye ezi mkpebi. Mmalite ya, akụkụ nke mbụ, ntọala nke ụdị amamihe ahụ, bụ egwu Jehova. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe nile e kere eke bụ ọrụ aka ya. Ha dabeere na ya. O nyere ihe a kpọrọ mmadụ nnwere onwe ime nhọrọ kama ọ bụghị ikike nke iduzi nzọụkwụ nke ha n’ụzọ gara nke ọma ma e wezụga nduzi ya. (Joshua 24:15; Jeremaịa 10:23) Nanị ma ọ bụrụ na anyị aghọta eziokwu ndị ahụ gbara ọkpụrụkpụ banyere ndụ ma bie ndụ kwekọrọ na ya ka anyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma na-adịgide adịgide. Ọ bụrụ na ihe ọmụma anyị nwere banyere Jehova na-enye anyị okwukwe kwụrụ chịm nke na uche Chineke ga-agarịrị nke ọma nakwa na nkwa na ikike ya ịkwụghachi ikwesị ntụkwasị obi ụgwọ ọrụ bụcha ihe e ji n’aka, mgbe ahụ egwu Chineke na-aga ịkpali anyị ime ihe n’ụzọ amamihe.—Ilu 3:21-26; Ndị Hibru 11:6.
4, 5. (a) N’ihi gịnị ka agụmakwụkwọ mahadum otu nwa okoro ji ghara inye ya ezi amamihe? (b) Olee otú nwoke a na nwunye ya si mesịa nweta ezi amamihe, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka nke a gbanwere ndụ ha?
4 Tụlee otu ihe atụ. Iri afọ ole na ole ndị gaworo aga, otu nwa okoro na-eje akwụkwọ na University of Saskatchewan, na Canada. Ihe ọmụmụ biology so n’usoro ihe ndị ọ gaje ịmụ, a kụzikwaara ya evolushọn. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, o kpebiri ilekwasị anya nanị n’ihe ọmụmụ atomic physics, na-anata ihe ùgwù ịgụ akwụkwọ n’efu ịga n’ihu n’ihe ọmụmụ ya n’ụlọ akwụkwọ University of Toronto. Ka ọ na-amụ ihe, ọ hụrụ ihe àmà dị ebube nke ịdị n’usoro nke nhazi ọdịdị atọm. Ma e nweghị azịza e nyere ajụjụ ndị bụ: Ònye haziri ya? Olee mgbe? N’ihi gịnịkwa? N’enweghị azịza ndị ahụ, ọ̀ pụrụ ikwe ya omume iji ihe ọmụma ya mee ihe n’ụzọ amamihe dị na ya n’ime ụwa nke nọ n’agha n’oge ahụ? Gịnị ga-eduzi ya? Ọ̀ bụ ịhụ mba n’anya? Ọ̀ bụ ọchịchọ maka ụgwọ ọrụ nke ihe onwunwe? N’ezie, ò nwetawo ezi amamihe?
5 N’oge na-adịghị anya mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, nwa okoro ahụ na nwunye ya malitere isoro Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Site n’Okwu Chineke n’onwe ya, ha malitere inweta azịza ndị ha na-adịghị enweta na mbụ. Ha bịara mata Onye Okike ahụ, bụ́ Jehova Chineke. Ka ha na-amụ banyere Mosis n’Osimiri Uhie ahụ, nakwa banyere Daniel na ndị enyi ya na Babilọn, ha mụtara ịdị mkpa nke atụghị egwu mmadụ kama Chineke. (Ọpụpụ 14:10-31; Daniel 3:8-30) Egwu Chineke nke dị otú ahụ tinyere ezi ịhụnanya maka Jehova malitere ịkpali ha. N’oge na-adịghị anya ụzọ ndụ ha nile gbanwere. N’ikpeazụ nwa okoro a matara Onye ọ bụ ọrụ aka ya ka ọ mụworo n’ihe ọmụmụ biology. Ọ malitere ịghọta nzube nke Onye ahụ ọ hụworo ka e gosipụtara amamihe ya n’ihe ọmụmụ physics ya. Kama iji ihe ọmụma ya mee ihe n’imepụta ngwá ọrụ nke ga-ebibi ndụ mmadụ ibe ya, ya na nwunye ya chọrọ inyere ndị ọzọ aka ịhụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya. Ha denyere aha ha n’ozi oge nile dị ka ndị na-ekwusa Alaeze Chineke. Mgbe e mesịrị, ha jere ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead, e wee zipụ ha dị ka ndị ozi ala ọzọ.
6. Ọ bụrụ na anyị nwere amamihe dabeere n’egwu Jehova, ihe nchụso ezi uche na-adịghị ya ndị dị aṅaa ka anyị ga-ezere, gịnịkwa ka anyị ga na-eme kama nke ahụ?
6 N’ezie, ọ bụghị onye ọ bụla pụrụ ịbụ onye ozi ala ọzọ. Ma anyị nile pụrụ inweta amamihe nke dabeere n’egwu Jehova. Ọ bụrụ na anyị azụlite amamihe ahụ, anyị agaghị eji ịnụ ọkụ n’obi na-amịkọrọ nkà ihe ọmụma ụwa nke mmadụ bụ́ n’ezie ndị na-ekwu ihe ha chere ndụ pụtara. Anyị ga na-emikpu onwe anyị n’ọmụmụ Bible, nke e dere site n’ike Isi Iyi nke ndụ, bụ́ Jehova Chineke, onye ahụ pụrụ inye anyị ndụ ebighị ebi. (Abụ Ọma 36:9; Ndị Kọlọsi 2:8) Kama ịghọ ndị ohu nke usoro azụmahịa nke na-aga n’ụsọ mbibi n’onwe ya, anyị ga-aṅa ntị ná ndụmọdụ Jehova ịbụ ndị afọ juru ná nri na ihe mgbokwasị, ka anyị na-eme ka mmekọrịta anyị na Chineke bụrụ ihe kasị mkpa ná ndụ. (1 Timoti 6:8-12) Kama ime omume dị ka à ga-asị na ọdịnihu anyị dabeere n’inwe ọnọdụ dị mma n’ime ụwa nke a, anyị ga-ekwere n’Okwu Jehova mgbe ọ na-agwa anyị na ụwa na-agabiga ya na agụụ ihe ọjọọ ya, ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.—1 Jọn 2:17.
7. (a) Olee otú Ilu 16:16 si na-enyere anyị aka inwe echiche ziri ezi nke ihe ndị bara uru? (b) Ụgwọ ọrụ ndị dị aṅaa na-esi n’ime uche Chineke ihe ka mkpa ná ndụ anyị abịa?
7 Ilu 16:16 na-agba anyị ume site n’ikwu n’eziokwu, sị: “Inweta amamihe [amamihe ahụ nke na-amalite n’ịtụ egwu Jehova], lee ka o si bụrụ ihe dị mma nke ukwuu karịa ọlaedo ọma! Inweta nghọta kwa, lee ka o si bụrụ ihe a na-ahọpụta nke ukwuu karịa ọlaọcha!” Ụdị amamihe na nghọta dị otú ahụ na-aga ịkwali anyị ime ka ime uche Chineke bụrụ ihe kasị mkpa ná ndụ anyị. Gịnịkwa bụ ọrụ Chineke tụkwasịrị n’ubu Ndịàmà ya maka oge a n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ? Ikwusa banyere Alaeze ya na inyere ndị obi ha ziri ezi aka ịghọ ezi ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Nke a bụ ọrụ na-enye ụgwọ ọrụ nke ezi afọ ojuju na obi ụtọ dị ukwuu. Mgbe ahụ, ọ bụ ezi ihe mere Bible ji sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ nke chọtaworo amamihe bụ.”—Ilu 3:13.
Ihe Nchebe Pụọ n’Ime Ihe Ọjọọ
8. (a) Kpọtụ aha uru nke abụọ na-esi n’ịtụ egwu Chineke abịa. (b) Gịnị bụ ihe ọjọọ ahụ nke a na-echebe anyị pụọ na ya? (ch) Olee otú egwu Chineke na-esi aghọ ikike dị ike na-akpali akpali?
8 Uru nke abụọ na-esite n’ịtụ egwu Chineke bụ na a na-esi otú a echebe anyị pụọ n’ime ihe ọjọọ. Ndị na-akwanyere Chineke ùgwù n’ụzọ miri emi adịghị ekpebiri onwe ha ihe bụ ezi ihe na ihe ọjọọ. Ha adịghị ahụ dị ka ihe ọjọọ ihe Chineke sịrị na ọ dị mma, ha adịghịkwa ele ihe ndị Chineke sịrị na ọ dị njọ ịbụ ihe ndị dị mma. (Abụ Ọma 37:1, 27; Aịsaịa 5:20, 21) Ọzọ, onye egwu Chineke na-akpali adịghị akwụsị nanị n’ịmara ihe Jehova na-asị na ọ dị mma na ihe ọ na-asị na ọ dị njọ. Onye dị otú ahụ na-ahụ n’anya ihe Jehova hụrụ n’anya ma na-akpọ asị ihe Jehova kpọrọ asị. N’ihi ya, ọ na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke. Ya mere, dị ka e kwuru n’Ilu 16:6, “ọ bụkwa egwu Jehova ka mmadụ ji esi n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.” Ụdị egwu Chineke dị otú ahụ na-aghọ ikike dị ike na-akpali akpali iji mezuo ihe mmadụ na-apụghị imezu n’ike nke onwe ya.
9. Olee otú ọchịchọ siri ike ịghara imejọ Chineke si metụta mkpebi otu nwanyị na Mexico mere, gịnịkwa si na ya pụta?
9 Ọbụna ọ bụrụ na egwu Chineke ka na-amalite itolite n’ime mmadụ, ọ pụrụ ime ya ka o sie ike izere ime ihe ọ pụrụ ịkwa ụta maka ya n’ihe fọdụrụ ná ndụ ya. Dị ka ihe atụ, otu nwanyị dị ime na Mexico jụrụ otu n’ime Ndịàmà Jehova ajụjụ banyere isikwopụ afọ ime. Onyeàmà ahụ gụụrụ nwanyị ahụ ọtụtụ akụkụ akwụkwọ nsọ ma kọwazie, sị: “Nye Onye Okike, ndụ dị mkpa nke ukwuu, ọbụna ndụ nke ndị a na-amụbeghị amụ.” (Ọpụpụ 21:22, 23; Abụ Ọma 139:13-16) Nnyocha e mere n’ụlọ ọgwụ atụwo aro na nwa ahụ pụrụ inwe nkwarụ. Ma ugbu a, n’ịbụ onye ihe ọ hụworo n’Okwu Chineke kpaliri, nwanyị ahụ kpebiri ịmụ nwa ya. Dọkịta ya jụrụ ịhụ ya ọzọ, di ya yikwara ya egwu ịhapụ ya, ma o guzosiri ike. Mgbe oge na-aga, ọ mụrụ nwa nwanyị—nke na-enweghị nkwarụ, ahụ dị ike, maakwa mma. N’ịbụ onye obi ekele kwaliri, ọ chọtara Ndịàmà, ha malitekwara isoro ya na-amụ Okwu Chineke. N’ime otu afọ e mere ya na di ya baptism. Afọ ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị n’otu mgbakọ distrikti, ha nwere obi ụtọ izute Onyeàmà mbụ ahụ ọzọ ma meekwa ka ọ mata ọmarịcha ada ha nwanyị dị afọ anọ. Nkwanye ùgwù ziri ezi maka Chineke na ọchịchọ siri ike ịghara imejọ ya n’ezie na-enwe mmetụta siri ike ná ndụ mmadụ.
10. Egwu Chineke pụrụ iwusi ndị mmadụ ike inwere onwe ha pụọ n’ụdị ajọ omume ndị dị aṅaa?
10 Egwu Chineke na-ewusi anyị ike megide ọtụtụ omume ndị na-adịghị mma. (2 Ndị Kọrint 7:1) Mgbe a zụlitere ya nke ọma, ọ pụrụ inyere mmadụ aka ịkwụsị mmehie nzuzo, nke nanị ya na Jehova maara. Ọ pụrụ inyere ya aka ịdọkapụ onwe ya site n’ịbụ ohu nye iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ma ọ bụ ọgwụ na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Otu onye ọgwụ riburu ahụ na South Africa kọwara, sị: “Ka m na-anara ihe ọmụma banyere Chineke, m wulitekwara egwu ime ihe na-ewute ya ma ọ bụ imejọ ya. M maara na ọ na-ele ihe na-emenụ, m nwekwara ọchịchọ nke ịbụ onye a nwapụtara n’anya ya. Ọ kpaliri m ibibi ọgwụ ndị m nwere site n’iji mmiri wụdaa ha n’ebe a na-eje mposi.” Egwu Chineke enyeworo ọtụtụ puku ndị ọzọ aka n’otu ụzọ ndị ahụ.—Ilu 5:21; 15:3.
Ihe Nchebe Megide Egwu Mmadụ
11. Megide ọnyà dị aṅaa a na-ahụkarị ka ezi egwu nke Jehova ga-echebe anyị?
11 Egwu dị mma nke Chineke na-echebekwa anyị megide ịtụ mmadụ egwu. Egwu mmadụ na-eti ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ ihe otiti n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu ma ọ bụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka nta. Ọbụna ndị ozi Jisọs Kraịst gbahapụrụ ya ma gbalaga mgbe ndị soja jidere ya n’ogige Getsemane. Mgbe nke a gasịrị, n’ime ogige ụlọ nke onyeisi nchụàjà, n’ịbụ onye e tigharịrị anya nakwa ịnọ ná njikpọ nke egwu, Pita gọnarịrị na ya bụ otu onye n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs, ọbụnakwa na ya maara ya. (Mak 14:48-50, 66-72; Jọn 18:15-27) Ma e nyeere ndị ozi ahụ aka inwetaghachi ezi nguzo ime mmụọ. N’aka nke ọzọ, n’ụbọchị Eze Jehoiakim, Uraịja nwa Shemaịa bụ onye egwu rikpuru nke na ọ gbahapụrụ ozi ọ na-eje dị ka onye amụma Jehova ma gbapụ n’ala ahụ, nanị ịbụ onye e jidekwararị ma gbuo.—Jeremaịa 26:20-23.
12. (a) Nye nchebe dị aṅaa megide egwu mmadụ ka Ilu 29:25 rụtụrụ aka? (b) Olee otú a na-esi azụlite ntụkwasị obi na Chineke?
12 Gịnị ga-enyere mmadụ aka imeri ịtụ egwu mmadụ? Mgbe ọ dọsịrị aka ná ntị na “egwu mmadụ na-eweta ọnyà,” Ilu 29:25 gbakwụnyere, sị: “Onye na-atụkwasị Jehova obi, a ga-eme ka ọ nọ n’elu.” Ịtụkwasị Jehova obi bụ isi ihe dị na ya. Ntụkwasị obi dị otú ahụ dabeere n’ihe ọmụma na ahụmahụ. Site n’ịmụ Okwu ya, anyị na-ahụ ihe àmà nke izi ezi nke ụzọ Jehova. Anyị na-amara ihe omume ndị na-egosipụta ya ịbụ onye kwesịrị ndabere, ịbụ ihe e ji n’aka nke nkwa ya nile (gụnyere nke mbilite n’ọnwụ), ịhụnanya na ike ya pụrụ ime ihe nile. Mgbe ahụ mgbe anyị na-eme omume kwekọrọ n’ihe ọmụma ahụ, na-eme ihe Jehova tụziri ma na-ajụ n’ụzọ kwụrụ chịm ihe ọ dọrọ aka ná ntị megide, anyị na-amalite inweta n’ihu anya anyị nlekọta ịhụnanya ya na ikwesị ndabere ya. Anyị na-ahụ n’onwe anyị ihe àmà nke na ike ya na-arụ ọrụ iji rụzuo uche ya. Obi ike anyị n’ebe ọ nọ na-eto eto, ya na, ịhụnanya maka ya na ọchịchọ siri ike izere imejọ ya. A na-ewukwasị ụdị ntụkwasị obi ahụ ná ntọala siri ike. Ọ na-arụ ọrụ dị ka ihe nkwado siri ike megide egwu nke mmadụ.
13. Olee otú egwu Chineke pụrụ isi nyere anyị aka n’ebe anyị na-arụ ọrụ ego, ebe obibi, na n’ụlọ akwụkwọ?
13 Anyị ịtụkwasị Jehova obi, tinyere egwu Chineke, ga-eme ka anyị kwụrụ chịm n’ebe ihe ziri ezi dị ma ọ bụrụ na onye were anyị n’ọrụ ejiri ịchụ anyị n’ọrụ anyị yie anyị egwu n’ihi ịjụ ikere òkè n’omume azụmahịa a na-adịghị eme n’ụzọ eziokwu. (Tụlee Maịka 6:11, 12.) Ụdị egwu Chineke ahụ na-eme ka ọtụtụ puku ndị Kraịst nọgidesie ike n’ezi ofufe n’ihu mmegide site n’aka ndị òtù ezinụlọ na-ekweghị ekwe. Ọ na-enyekwa ndị ntorobịa na-eje akwụkwọ obi ike ime ka a mara ha dị ka Ndịàmà Jehova, ọ na-ewusikwa ha ike ịnagide ịkwa emo site n’aka ụmụ klas ha bụ́ ndị na-akwa ụkpụrụ Bible emo. N’ihi nke a, otu Onyeàmà nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu kwuru, sị: “Ihe ha na-eche n’ezie adịghị mkpa. Ihe Jehova na-eche bụ ihe dị mkpa.”
14. Olee otú ndị ohu Jehova si enwe ike inwe mmeri ọbụna mgbe e yiri ndụ ha egwu?
14 Otu nkwenye ahụ na-ewusikwa ezi ndị Kraịst ike ijigidesi ụzọ Jehova ike ọbụna mgbe a na-eyi ndụ ha egwu. Ha maara na ha aghaghị ịtụ anya mkpagbu site n’ụwa. Ha ghọtara na a pịara ndị ozi ahụ ụtarị, nakwa na ndị obi tara mmiri kụrụ Jisọs Kraịst ihe ma gbuo ya. (Mak 14:65; 15:15-39; Ọrụ 5:40; tụlee Daniel 3:16-18.) Ma ndị ohu Jehova nwere obi ike zuru ezu na ọ pụrụ iwusi ha ike ịtachi obi; na site n’enyemaka Chineke ha pụrụ inwe mmeri; na Jehova agaghị ahapụ ịkwụghachi ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ụgwọ ọrụ—ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa ọbụna site ná mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ya. Ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ tinyere egwu Chineke na-akpali ha n’ụzọ dị ike izere ime ihe ọ bụla nke ga-ewute ya.
15. Gịnị nyeere Ndịàmà Jehova aka ịnọgide n’iguzosi ike n’ezi ihe ha n’ogige ịta ahụhụ nke Nazi?
15 Mkpali nke a nyeere Ndịàmà Jehova aka ịnagide ihe ọjọọ nile nke ogige ịta ahụhụ ndị Nazi n’oge afọ ndị 1930 na 1940. Ha buuru n’uche ndụmọdụ Jisọs nke a hụrụ na Luk 12:4, 5: “Asị m unu ndị enyi m, Unu atụla egwu ndị na-egbu ahụ, ma e mesịa ha enweghị ihe ọzọ karịa nke ahụ ha ga-eme. Ma M ga-egosi unu Onye unu ga-atụ egwu: tụọnụ egwu Onye ahụ, Nke nwere ike ịtụba [na Gehena, NW] mgbe O gbusịrị; ee, asị m unu, Tụọnụ egwu Onye ahụ.” Ya mere, Gustav Auschner, Onyeàmà nọ n’ogige ịta ahụhụ dị na Sachsenhausen, mesịrị dee, sị: ‘Ndị SS gbagburu August Dickmann ma yie egwu ịgbagbu anyị ndị fọdụrụ ma ọ bụrụ na anyị abịanyeghị aka n’akwụkwọ na-ajụ okwukwe anyị. E nweghị onye n’ime anyị bịanyere aka n’akwụkwọ. Anyị nwere egwu dị ukwuu nke imejọ Jehova karịa nke mgbọ égbè ha.’ Ịtụ egwu mmadụ na-eduje n’imebi okwukwe, ma egwu Chineke na-eme ka mmadụ kwụrụ chịm n’ebe ihe ziri ezi dị.
Nchebe nke Ndụ
16. Gịnị nyeere Noa aka ịnọgide n’ụzọ ziri ezi ọtụtụ iri afọ ruo mgbe Iju Mmiri ahụ bịara, gịnịkwa bụ ihe ọ rụpụtaara ya na ezinụlọ ya?
16 Noa biri ndụ n’ime ụbọchị ndị ikpeazụ nke ụwa dị tupu Iju Mmiri ahụ. Jehova ekpebiwo ibibi ajọ ụwa nke oge ahụ n’ihi ịdị njọ nke mmadụ. Otú ọ dị, ka ọ dị mgbe ahụ, Noa nọ n’ime ụwa ahụ nke jupụtara n’ime ihe ike, omume rụrụ arụ gabiga ókè, nakwa enweghị mmasị n’ebe uche Chineke dị. N’agbanyeghị nkwusa Noa na-ekwusa ezi omume, “ha amaghịkwa ruo mgbe oké iju mmiri ahụ bịara, kpopụ ha nile.” (Matiu 24:39) Ma e gbochighị Noa ịrụ ọrụ ahụ Chineke setịpụụrụ ya. O mere “dị ka iwu nile si dị nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.” (Jenesis 6:22) Gịnị mere ka Noa nọgide n’ihe ọ na-eme kwa afọ ruo kpọmkwem mgbe Iju Mmiri ahụ bịara? Ndị Hibru 11:7 na-aza, sị: “Noa, mgbe Chineke dụsịrị ya ọdụ banyere ihe a ka ahụghị anya ruo oge ahụ, ebe ọ tụrụ egwu Chineke, ọ bụ okwukwe.” Dị ka ihe si na ya pụta, e chebere ya na nwunye ya na ụmụ ya na nwunye ha ndụ gabiga Iju Mmiri ahụ.
17. (a) N’agbanyeghị ihe ndị ọzọ na-eme, gịnị ka anyị kwesịrị ime? (b) N’ihi gịnị ka ndị na-atụ egwu Jehova ji bụrụ ndị obi ụtọ n’ezie?
17 Anyị na-ebi n’oge yiri ụbọchị Noa n’ọtụtụ akụkụ. (Luk 17:26, 27) A nọwo na-enye ịdọ aka ná ntị ọzọ. Mkpughe 14:6, 7 na-ekwu banyere otu mmụọ ozi nke na-efe n’etiti eluigwe bụ́ onye na-agba ndị mba na agbụrụ na asụsụ nile ume ka ha “tụọ egwu Chineke, nyekwa Ya otuto.” N’agbanyeghị ihe ụwa nke i bi n’ime ya na-eme, ṅaa ntị n’okwu ndị ahụ, ma mgbe ahụ mee ka òkù ahụ ruo ndị ọzọ ntị. Dị ka Noa, na-eme ihe n’okwukwe ma na-egosi egwu Chineke. Gị ime nke ahụ pụrụ iduga n’ichebe ndụ gị nakwa ndụ nke ọtụtụ ndị ọzọ. Ka anyị na-atụle uru ndị ndị na-atụ ezi Chineke ahụ egwu na-enweta, anyị pụrụ nanị ikwenyere onye ọbụ abụ ahụ nọ n’okpuru ike mmụọ nsọ bụ́ onye bụrụ abụ, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka nwoke ahụ bụ nke na-atụ egwu Jehova, nke ihe nile O nyere n’iwu na-atọ ụtọ nke ukwuu.”—Abụ Ọma 112:1.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Gịnị bụ ụfọdụ uru ndị gbara ọkpụrụkpụ na-esite n’ịtụ ezi Chineke ahụ egwu?
◻ Olee otú amamihe nke dabeere n’egwu Chineke pụrụ isi echebe anyị?
◻ N’ihi gịnị ka egwu Chineke na-eji eme ka anyị pụọ n’ihe ọjọọ?
◻ Olee otú egwu Chineke na-esi echebe anyị pụọ n’egwu mmadụ?
◻ Gịnị jikọrọ egwu Chineke na olileanya ndụ anyị n’ọdịnihu?
[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]
“Onye ihe na-agara nke ọma ka nwoke ahụ bụ nke na-atụ egwu Jehova, nke ihe nile O nyere n’iwu na-atọ ụtọ nke ukwuu.”—Abụ Ọma 112:1