Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 3/15 p. 29-31
  • Ị̀ Ga-eto Jehova?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Ga-eto Jehova?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Too Chineke Otuto Site n’Ikwusa Ozi Ọma Ahụ
  • Enyemaka E Nwere
  • Nyere Ụmụntakịrị Aka Ito Jehova Otuto
  • Mmekọrịta Ebighị Ebi n’Ebe Jehova Nọ
  • Ndị E Doro Iche Ịbụ Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto n’Ụwa Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ndị Na-eto Eto, Toonụ Jehova!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Toonụ Jehova, Bụ́ Chineke Anyị!
    Bụkuo Jehova Abụ
  • Toonụ Jehova Chineke Anyị
    Jiri Ọṅụ Bụkuo Jehova Abụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 3/15 p. 29-31

Ị̀ Ga-eto Jehova?

“DỊ KA aha Gị si dị, Chineke, otú a ka otuto Gị dị ruo nsọtụ nile nke ụwa.” Ndị a bụ okwu ndị sitere n’abụ amụma nke ụmụ Kora. (Abụ Ọma 48:10) Taa, oké ìgwè ndị ukwe nke ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova na-eto Chineke otuto, na-emekwa ka a mara aha ya site n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ya. Site n’ime nke a n’ime 232 ala na àgwàetiti nke oké osimiri na n’ihe karịrị 300 asụsụ, ha na-eru n’ụzọ nkịtị “nsọtụ nile nke ụwa.”

Gịnị bụ ihe na-akpali ndị mmadụ nke ọdịbendị, ọnọdụ ọha na eze, na asụsụ dị iche iche ito Jehova otuto? Ekele ha nwere maka ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke, bụ́ Bible, bụ otu ihe bụ isi kpatara ya. Eziokwu ime mmụọ emewo ka ha nwere onwe ha pụọ ná nkwenkwe na-enweghị isi, pụọkwa na nkwenkwe okpukpe ndị ahụ na-ejide mmadụ n’ohu, dị ka mmekpa ahụ ebighị ebi. (Jọn 8:32) Eziokwu ahụ na-enyekwara ha aka ịghọta àgwà Chineke ndị magburu onwe ha, dị ka ịhụnanya, ike, amamihe na ikpe ziri ezi ya, nke e ji ebere mee ka ọ dị nro. Ịghọta onyinye Chineke nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Jisọs Kraịst, dị ka àjà mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ na-akpali ndị ziri ezi ito na ijere Jehova ozi.

Dị ka akwụkwọ Bible nke Mkpughe si kwuo, otu ìgwè ndị ukwe eluigwe na-ekwupụta, sị: “Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, I kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụrụ nile na ike nile: n’ihi na Gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ Gị ka ha dịịrị, ka e kekwara ha eke.” (Mkpughe 4:11) Ụdị otuto dị otú ahụ adịghị abịa nanị site n’inwe echiche nke ibu ọrụ. Kama, ọ na-esite ná nsọpụrụ ofufe nye Jehova.

Too Chineke Otuto Site n’Ikwusa Ozi Ọma Ahụ

N’ito Jehova otuto, mmadụ na-eṅomi ihe nlereanya magburu onwe ya nke Jisọs Kraịst, onye bụ isi na-eto Chineke otuto. Ịgbaso nzọụkwụ Jisọs na-agụnye ikere òkè n’ọrụ nke ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Matiu 4:17, 23; 24:14) Ọrụ nkwusa nke a aghọwo mgbalị kasị ukwuu zuru ụwa ọnụ n’ito Jehova otuto.

Ọrụ nkwusa nke a dị mkpa nke ukwuu nke na Bible na-ejikọta ya na nzọpụta n’ụzọ doro anya. Ndị Rom 10:13-15 na-agụ, sị: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya. Hà ga-esikwa aṅaa kpọkuo Onye ahụ ha a ka ekweghị na Ya? ma hà ga-esi aṅaa kwere n’Onye ahụ ha a ka anụghị okwu Ya? ma hà ga-esi aṅaa nụ ma onye na-ekwusa anọghị? ma hà ga-esi aṅaa kwusaa, ma ọ bụrụ na e zigaghị ha? dị ka e deworo n’akwụkwọ nsọ, sị, Lee, ka ha si maa mma nke ukwuu, bụ́ ụkwụ ndị na-ezisa ozi ọma nke ezi ihe!”

N’afọ gara aga nanị, Ndịàmà Jehova tinyere ihe karịrị otu ijeri hour n’ọrụ nkwusa. Leekwa ezi ihe ndị si n’ito Chineke otuto nke a pụta! Ihe dị ka 314,000 sonyeere ndị ukwe nke ndị na-eto otuto site n’igosipụta nrara ha raara onwe ha nye Jehova site na baptism ime mmiri.

Ma, gịnị ka a pụrụ ikwu banyere 12,288,917 ndị bịara Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst na 1994? E nwere 7,000,000 n’etiti ha ndị na-amalitebeghị ito Jehova otuto dị ka ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ. Ma ọnụnọ ha n’ihe omume nke a dị mkpa pụrụ imesị rụpụta ntinye nke ọtụtụ nde ndị ọzọ ná ndị ukwe nke ndị na-eto otuto. Gịnị ka a pụrụ ime iji nyere ndị a nwere mmasị aka ịghọ ndị na-eto Jehova otuto?

Enyemaka E Nwere

Ọtụtụ ndị nwere mmasị pụrụ inwe ọchịchọ ito Jehova otuto ma na-eche na ha apụghị iru ihe ndị a chọrọ. Ha ga-eme nke ọma icheta okwu onye ọbụ abụ ahụ: “M ga-eweli anya m abụọ lee ugwu nile: olee ebe inyeaka m ga-esi bịa? Inyeaka m na-esi n’aka Jehova bịa, Onye meworo eluigwe na ụwa.” (Abụ Ọma 121:1, 2) Ọ pụtara ìhè na onye ọbụ abụ ahụ weliri anya ya lee ugwu nile nke Jerusalem ebe e guzobere ụlọ nsọ Jehova na ebe bụ isi nke ọchịchị Chineke n’elu ala. Site na nke a anyị pụrụ ikwubi n’ụzọ ziri ezi na enyemaka dị mkpa iji too Chineke otuto ma kpọsaa ozi Alaeze ahụ na-abịa nanị site n’aka Jehova na nzukọ ya.—Abụ Ọma 3:4; Daniel 6:10.

Taa, ndị ahụ nwere ọchịchọ ito Jehova otuto pụrụ ịtụ anya enyemaka ịhụnanya site n’aka nzukọ elu ala ya. Dị ka ihe atụ, Ndịàmà Jehova na-enye aka site n’iduziri ndị nwere mmasị ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu. Usoro ihe omume nkụzi nke a gụnyere ihe karịrị nanị ịmụ ozizi Bible dị iche iche. Ọ na-enyere onye mmụta ahụ aka ịzụlite ekele maka ihe ọ na-amụta na maka nzukọ nke Jehova na-eji eme ihe.

N’ikwekọ na nke a, Onyeàmà na-eduzi ọmụmụ Bible ahụ na-agbalị ijide n’aka na eziokwu ndị ahụ a chọtara ọhụrụ ruru ọ bụghị nanị n’isi kamakwa n’obi. Onye nkụzi ahụ ekwesịghịkwa ịla azụ n’igosi onye mmụta ahụ otú Jehova si jiri nzukọ Ya na-arụzu nzube Ya n’elu ala. Broshuọ ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova Na-eme Uche Chineke n’Ịdị n’Otu n’Ụwa Nile na vidio ahụ bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name enyewo aka ọtụtụ mgbe n’ịrụzu nke a.

Nzukọ nile nke ndị Kraịst na-ekerekwa òkè dị mkpa n’inyere ndị gaje ịbụ ndị na-eto Jehova otuto aka. N’oge a ka na-amalite nnọọ ọmụmụ Bible amalite, a pụrụ ịkpọ onye mmụta ahụ òkù ka ọ bịa nzukọ nile nke ndị Kraịst. Ka oge na-aga, ọ ga-amụta ịdị mkpa nke ịbịachi anya na ikere òkè ná nzukọ nile nke ọgbakọ. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ndị nlekọta pụrụ inye ndị kwere ekwe ibe ha na ndị gaje ịbụ ndị na-eto Jehova otuto enyemaka a na-apụghị ịtụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ site n’ịkwado nzukọ ndị na-ewuli elu n’ụzọ ime mmụọ, ma dị irè.

Nyere Ụmụntakịrị Aka Ito Jehova Otuto

Ụmụntakịrị so n’etiti ọtụtụ ndị ndị pụrụ ịghọ ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ n’ọdịnihu dị nso. Ndị bụ́ nna karịsịa nwere ibu ọrụ sitere na Bible nke ịzụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Mgbe nne na nna na-atụ egwu Chineke zụlitere ha nke ọma, ọbụna ụmụntakịrị ka dị nnọọ nta pụrụ ịzụlite ọchịchọ ito Jehova otuto.

Otu nwantakịrị nwanyị n’Argentina gakwuuru ndị okenye ọgbakọ ugboro ugboro ruo ọtụtụ ọnwa, na-arịọ enyemaka ha ka ya wee nwee ike iru eru dị ka onye nkwusa Alaeze. Ka oge na-aga, ndị mụrụ ya na ndị okenye kwetara ịhapụ ya ka ọ ghọọ onye nkwusa na-emebeghị baptism. Ọ malitelarị na-eche ozi Alaeze ahụ n’ihu ndị mmadụ n’ụzọ dị irè n’ọnụ ụzọ. N’agbanyeghị na nwantakịrị nwanyị a dị nanị afọ ise, ma bụrụ onye na-amaghị ka e si agụ ihe, o buruwo ebe a pụrụ ịchọta akụkụ Bible ụfọdụ n’isi. Mgbe ọ sapetasịrị akwụkwọ nsọ, ọ na-agwa onye nwe ụlọ ka ọ gụọ ya, mgbe ahụkwa, ọ na-enye nkọwa.

O doro anya na ma ndị okenye ma ndị mụrụ ụmụ pụrụ ịrụzu ihe dị mma nke ukwuu site n’ịgba ndị ahụ na-enwe ọganihu ume na inyere ha aka ịghọ ndị na-eto Jehova otuto.—Ilu 3:27.

Mmekọrịta Ebighị Ebi n’Ebe Jehova Nọ

Ma, gịnị ma ọ bụrụ na gị onwe gị anọwo na-eso Ndịàmà Jehova ruo oge ụfọdụ ma i sonyebeghị ha n’ọrụ nkwusa ha? Ọ pụrụ ịba uru ịjụ onwe gị ajụjụ ndị sonụ, ‘M̀ kwetara na achọtawo m eziokwu ahụ nakwa na Jehova bụ nanị ezi Chineke e nwere? Ò dowo m anya na Alaeze Chineke bụ nanị ihe ngwọta maka nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ? M̀ hapụwo okpukpe ụgha nile na omenala na omume nile nke ụwa nke na-akpasu Jehova iwe? M̀ nwere ịhụnanya dị omimi maka Chineke na ụkpụrụ ezi omume ya?’ (Abụ Ọma 97:10) Ọ bụrụ na ị pụrụ iji obi eziokwu zaa ee n’ajụjụ ndị a, gịnị na-egbochi gị ito Jehova otuto?—Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 8:36.

Ito Jehova otuto gụnyere ihe karịrị ikwusa ozi ọma ahụ. Ọ bụrụ na i nwetawo ezi ihe ọmụma, nwee ezi okwukwe, na-emekwa ka ndụ gị kwekọọ n’ihe ndị Chineke chọrọ, ọ dị gị mkpa imesiwanye mmekọrịta onwe onye gị n’ebe Chineke nọ ike. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’iji ekpere rara onwe gị nye ya ma gosipụtakwa nke a site na baptism ime mmiri. O metụtara ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, mee ihe dị na ndụmọdụ Jisọs ugbu a: “Sinụ n’ọnụ ụzọ dị warara baa: n’ihi na obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla n’iyi, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba. N’ihi na warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.”—Matiu 7:13‚ 14.

Ka usoro ihe dị ugbu a na-abịaru ọgwụgwụ ọjọọ ya nso, nke a abụghị oge igbu oge. Were nzọụkwụ ndị dị ngwa inweta mmekọrịta ebighị ebi n’ebe Jehova nọ. N’eziokwu, ugbu a bụ oge iji zaghachi n’ụzọ dị mma n’ajụjụ ahụ bụ́, Ị̀ ga-eto Jehova?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya