Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 4/1 p. 9
  • Ime Nkwusa n’Oge Na-ekwesịghị Ekwesị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ime Nkwusa n’Oge Na-ekwesịghị Ekwesị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 4/1 p. 9

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ime Nkwusa n’Oge Na-ekwesịghị Ekwesị

PỌL onyeozi buru amụma na “oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1) Lee ka okwu ndị ahụ siworo bụrụ eziokwu! Ndị El Salvador dị na Central America ahụwo eziokwu a dị ilu eri ogologo oge. Ruo ihe karịrị afọ iri, mba ahụ nọ n’agha obodo nke wetaara ọtụtụ puku mmadụ nhụjuanya na ọnwụ. Agha ahụ akwụsịla ugbu a, ma nhụjuanya ka dị. Mpụ arịwo elu n’ụzọ dị ukwuu ka agha ahụ gasịrị. Otu onye na-ekwu okwu n’ụlọ ọrụ telivishọn obodo ahụ kwuru n’oge na-adịbeghị anya, sị: “Ime ihe ike na iji égbè ezu ohi bụzi akụkụ nke ihe oriri anyị kwa ụbọchị.”

A gụpụbeghịkwa Ndịàmà Jehova ná ntiwapụ mpụ nke a. Ndị ohi awabawo n’ime ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, zurukwa ígwè okwu. Ọtụtụ mgbe ìgwè ndị ntorobịa bu ngwá agha enubatawo n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze ka a nọ ná nzukọ ndị Kraịst, na-ezuru ego, elekere mgbanaka, na ngwongwo ndị ọzọ site n’aka ndị bịaranụ. Ka ha nọ na-arụ ọrụ ha kwa ụbọchị, ndị ohi ọbụna egbuwo ọtụtụ Ndịàmà.

N’agbanyeghị ihe mgbochi ndị a, Ndịàmà Jehova n’El Salvador nọgidere na-arụsi ọrụ ike n’ikwusa ozi ọma ahụ. Ha na-eme nke a ná nrubeisi n’iwu Akwụkwọ Nsọ ahụ bụ́: “A ghaghịkwa ibu ụzọ kwusaa ozi ọma nke m n’ihu mba nile.” (Mak 13:10) A ka nwere ọtụtụ ndị n’ime mba a bụ́ ndị agụụ olileanya Alaeze ahụ nke Bible na-enye na-agụsi ike, Ndịàmà ahụ na-agbalịsikwa ike irute onye ọ bụla n’ime ha. Ịgba àmà mberede abụrụwo ụzọ dị irè isi mee nkwusa.

Ka ọ na-anara nlekọta ọgwụgwọ n’otu ụlọ ọgwụ, otu Onyeàmà jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ mee ihe n’ịgwa ndị ọrịa ndị ọzọ banyere nkwa nile nke Chineke maka ọdịnihu, dị ka ọ dị n’ime Bible. Otu onye nke na-arịasi ọrịa ike ji mwute kwaa arịrị, sị: “N’oge na-adịghị anya m gaje ịnwụ!” Ma enweghị olileanya nke onye ọrịa ahụ akụdaghị Onyeàmà ahụ aka n’isoro ya kerịta ozi ọma nke Alaeze Chineke. Kama nke ahụ, ọ gụpụtaara nwoke ahụ ihe sitere n’akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, nke Ndịàmà Jehova bipụtara. Ụbọchị ole na ole ka nke ahụ gasịrị, Onyeàmà ahụ hapụrụ ụlọ ọgwụ ahụ, jiri mwute na-eche na nwoke ahụ nọ n’àkwà ọnwụ ya.

Afọ anọ ka e mesịrị, ọ dịrị mkpa na Onyeàmà ahụ aghaghị ịnata nlekọta ọgwụgwọ n’ụlọ ọgwụ ọzọ. Ka ọ nọ n’ebe ahụ, otu onye ọrịa bịakwutere ya wee sị: “Ì chetara onye m bụ?” Ọ bụ nwoke ahụ o zutere afọ anọ gara aga, nwoke ahụ e chere na ọ na-anwụ anwụ! Lee ihe ijuanya na-enye ọṅụ ọ bụ mgbe nwoke ahụ makụrụ ya wee kwukwasị: “Ugbu a abụkwa m otu n’ime Ndịàmà Jehova!” Nwoke anakwerewo olileanya Bible maka ọdịnihu, soro Ndịàmà Jehova mụọ Bible, rarakwa ndụ ya nye Jehova. Ọ bụghị nanị na ọ bụ Onyeàmà kama ọ nọwo na-ekere òkè n’ozi oge nile dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile ruo ihe dị ka afọ abụọ.

N’ọnọdụ nke a, mkpụrụ nke eziokwu nke a kụrụ n’ọnọdụ mberede banyere n’obi na-anabata ihe. Ihe ùgwù nke a nke inyere ndị mmadụ aka ịbịa nweta ihe ọmụma nke eziokwu na-akpali ezi ndị Kraịst ịnọgide n’ọrụ ime nkwusa ahụ n’agbanyeghị ‘oge ndị a dị oké egwu.’

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya