Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 4/1 p. 21-25
  • Mkpebi M Ịga n’Ihu Ruo Ntozu Okè

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mkpebi M Ịga n’Ihu Ruo Ntozu Okè
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Agha ahụ Gbanwere Ndụ Anyị
  • Ihe Mgbochi Dị Iche Iche Nye Ọganihu Ime Mmụọ
  • Iwere Ozi Ọsụ Ụzọ
  • Ịchụso Ozi Ala Ọzọ
  • Ime Mgbanwe Ikwekọ ná Mba Ọzọ
  • Nleta Gaa na States
  • Ịnọgide Na-aga n’Ihu n’Ụzọ Ime Mmụọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 4/1 p. 21-25

Mkpebi M Ịga n’Ihu Ruo Ntozu Okè

DỊ KA CARL DOCHOW SI KỌỌ

“Ịga n’Ihu ruo Ntozu Okè Ka Ọ Bụ Ịdaghachi n’Ime Mmehie, Olee Nke?” bụ isiokwu nke ihe odide dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke June 15, 1948. Ihe odide ahụ kwapụrụ m site n’ihe ize ndụ ime mmụọ n’ala ugbo nke United States gaa n’ọrụ ozi ala ọzọ na South America nke weworo ihe karịrị 43 afọ.

AMỤRỤ m na March 31, 1914, nke atọ n’ụmụ nwoke anọ, n’ụlọ e ji osisi wuo na Vergas, Minnesota. Afọ ndị ntorobịa m dị ụtọ. M chetara isoro papa m gaa igbu azụ. Otú ọ dị, mama m na-adakarị ọrịa, m ghaghịkwa ịhapụ ụlọ akwụkwọ na praịmarị nke ise iji nyere ya aka n’ọrụ ndị dị n’ụlọ. Ka ọ na-erule mgbe m dị afọ 13, a chọpụtara na ọrịa ya bụ cancer akpa ume.

Mama m maara na ndụ ya dị mkpụmkpụ, ya mere ọ malitere ịkwadebe m iweghara ọnọdụ ya. Ọ ga-anọdụ na kichin ma nye m ntụzi banyere otú e si esi nri na eghe ihe. Tinyere nke ahụ, ọ kụziiri m ịsa uwe, ilekọta ubi, na ilekọta otu narị ọkụkọ. Ọ gbakwara m ume ịgụ otu isiakwụkwọ Bible kwa ụbọchị, bụ́ nke m mere n’agbanyeghị na mụ amachaghị agụ ihe. Mgbe ọ zụsịrị m ruo ọnwa iri, mama m nwụrụ na January 27, 1928.

Agha ahụ Gbanwere Ndụ Anyị

Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ malitesịrị na September 1939, e kpeere ndị agha ekpere na Sunday ọ bụla na chọọchị Lutheran anyị. Nwanne m nwoke nke tọrọ m bụ́ Frank kpebiri ịghara igbu mmadụ, ya mere mgbe ọ jụrụ ịlụ ọgụ dị ka onye òtù nke ìgwè ndị agha, e jidere ya. N’oge ikpe ya o kwuru, sị: “Tupu mụ egbuo ndị aka ha dị ọcha, unu pụrụ ịgbagbu m!” A mara ya ikpe ịnọ otu afọ n’ụlọ mkpọrọ n’Àgwàetiti McNeil ná mpụga nke ụsọ osimiri nke Washington State.

N’ebe ahụ Frank hụrụ ihe karịrị 300 n’ime Ndịàmà Jehova ndị a tụworo mkpọrọ n’ihi na ha nọpụrụ nnọọ iche n’oge agha ahụ. (Aịsaịa 2:4; Jọn 17:16) N’oge na-adịghị anya ọ malitere isonyere ha, e mekwara ya baptism kpọmkwem n’ụlọ mkpọrọ ahụ. N’ihi ezi àgwà, e melatara oge mkpọrọ ya gaa n’ọnwa itoolu. Na November 1942 anyị nụrụ na Frank enwerewo onwe ya, n’oge na-adịghịkwa anya mgbe nke ahụ gasịrị ọ gwara anyị banyere ozi ọma nke Alaeze Chineke. Mgbe anyị jisịrị nlezianya nyochaa ozi ndị ahụ na Bible anyị, anyị nile pụrụ ịhụ na ihe Frank na-akụziri anyị bụ eziokwu.

Ihe Mgbochi Dị Iche Iche Nye Ọganihu Ime Mmụọ

Na 1944, akwagara m n’ógbè Malta, Montana, ibinyere nwanne papa m. Anyị nwekọrọ otu ihe ọnụ—anyị abụọ nwere nwunye nke hapụrụ anyị mgbe ọnwa isi nke alụmdi na nwunye gasịrị. O nwere obi ụtọ inwe m dị ka onye inyeaka n’ọrụ ugbo na isi nri, anyị kerịtakwara uru anyị n’ụzọ hà nhata. Nwanne papa m sịrị na m ga-abụ onye nketa nke ugbo ya dị 260 hekta ma ọ bụrụ na m ga-eso ya nọrọ. Ndị ahụ bụ afọ ịba ụba maka ịrụ ọrụ ugbo, leekwa ka nke ahụ si tọọ mụ ụtọ! Anyị nwekwara owuwe ihe ubi dị ukwuu kwa afọ, ọka wheat darukwara $3.16 maka otu bushel.

Otú ọ dị, nwanne papa m enweghị mmasị na m na-aga nzukọ nke ọgbakọ nta nke Ndịàmà Jehova na Malta. Na June 7, 1947, n’emeghị ka nwanne papa m mara, e mere m baptism ná mgbakọ sekit nke Ndịàmà Jehova na Wolf Point. N’ebe ahụ nwanna nwoke bụ́ onye Kraịst kpọrọ m òkù ịghọ onye ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye ozi oge nile. Ọ bụ ezie na iji ndụ m eme ihe n’ụzọ dị otú ahụ bụ ọchịchọ obi m, akọwara m na nwanne papa m emekataghị kwere ka m tinye oge ha otú ahụ n’ozi.

Ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị, nwanne papa m meghere ma gụọ akwụkwọ ozi otu enyi m detaara m nke na-agba mụ ume ịbụ onye ozi oge nile. N’oké iwe, nwanne papa m nyere m iwu—hapụ ime nkwusa ma ọ bụ kwapụ. Iwu ahụ o nyere bụ ihe ọma n’ihi na m nwere mmasị n’ịrụ ọrụ ugbo nke ukwuu nke na amaghị m ma m gaara ahapụ ya n’onwe m. Ya mere alaghachikwuru m ezinụlọ m na Minnesota, bụ́ ndị e mesịworo baptism ma na-esonyere Ọgbakọ Detroit Lakes.

Na mbụ ezinụlọ m gbara mụ ume ịsụ ụzọ, ma na 1948 ha malitere ịnyụ ọkụ n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka isiokwu ahụ bụ́ “Ịga n’Ihu ruo Ntozu Okè Ka Ọ Bụ Ịdaghachi n’Ime Mmehie, Olee Nke?” nyere nkwali ime mmụọ m chọrọ. Ọ dọrọ aka ná ntị na “ihe dị nnọọ mwute aghaghị isochi ma ọ bụrụ na anyị amara ụma jụ ibi ndụ kwekọrọ n’ihe ọmụma na-aga n’ihu.” Isiokwu ahụ kwuru, sị: “Anyị agaghị anwa ịkwụ otu ebe ma laghachi azụ, kama nke ahụ anyị aghaghị ịga n’ihu n’ezi omume. Ọganihu, ọ bụghị ịkwụsị, bụ ike kasị ukwuu na-eguzogide ndaghachi azụ.”

Ọ bụ ezie na ezinụlọ m nyere ihe ngọpụ ndị ọzọ, m kwenyere na ihe bụ nsogbu n’ezie bụ ọchịchọ ha ịba ọgaranya. Ha pụrụ ịhụ uru akụ̀ na ụba nke itinye oge ka ukwuu n’ịrụ ọrụ ugbo na nke ka nta n’ime nkwusa. Kama ịbụ onye ọchịchọ maka ịba ụba matara n’ọnyà, m mere atụmatụ ịsụ ụzọ. Amaara m na ọ gaghị adị mfe, ọbụna echekwara m na m apụghị imeli ya. Ya mere na 1948, m lere onwe m ule site n’ịmara ụma denye aha m ịmalite ịsụ ụzọ n’akụkụ afọ kasị njọ—December.

Iwere Ozi Ọsụ Ụzọ

Jehova gọziri mgbalị m. Dị ka ihe atụ, ọ̀tụ̀tụ̀ ịjụ oyi nke otu ụbọchị bụ -27° Celsius, n’agụnyeghị ikuku oyi. M na-agba àmà okporo ámá nke m na-emekarị, na-agbanwegharị aka m—na-etinye nke jụrụ oyi n’ime akpa uwe m ka m na-eji nke ọzọ ejide magazin ruo mgbe aka nke ahụ jụrụ oyi nke ukwuu wee ruo eru itinye n’akpa uwe. Otu nwoke bịakwutere m. Mgbe ọ na-ekwu na ya arịbawo ọrụ m na-arụ ama ruo oge ụfọdụ, ọ jụrụ, sị: “Gịnị dị n’ime magazin ndị ahụ nke dị mkpa otú ahụ? Nye m abụọ ndị ahụ ka m nwee ike ịgụ ha.”

Ka ọ dị ugbu a, m pụrụ ịhụ na mmekọrịta mụ na ezinụlọ m na-etinye ọnọdụ ime mmụọ m n’ihe ize ndụ, ya mere n’ihi arịrịọ m zigaara Watch Tower Society, e nyere m ọrụ ọhụrụ na Miles City, Montana. N’ebe ahụ ejere m ozi dị ka ohu kọmpini, bụ́ nke a maara ugbu a dị ka onye isi oche ndị nlekọta. Ebe m bi n’ụlọ ụgbọ ala na-adọkpụ nke dị mita abụọ n’obosara na mita atọ n’ogologo, akwadowo m onwe m site n’ịrụ ọrụ nwa oge n’ụlọ ọrụ na-asa uwe. Site n’oge ruo n’oge e goro m ọrụ maka ihe m hụrụ n’anya karịsịa—iwe ihe ubi.

N’oge ahụ, m nọgidere na-anụ banyere ọnọdụ ime mmụọ na-adịwanye njọ nke ezinụlọ m. N’ikpeazụ ha, nakwa ndị ọzọ nọ n’Ọgbakọ Detroit Lakes, megidere nzukọ Jehova. N’ime 17 ndị nkwusa Alaeze nọ n’ọgbakọ ahụ, nanị 7 nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi. Ezinụlọ m kpebiri ịdọpụkwa m na nzukọ Jehova, ya mere aghọtara m na e nwere nanị otu ngwọta dịnụ, ịga n’ihu. Ma ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?

Ịchụso Ozi Ala Ọzọ

N’oge a na-enwe mgbakọ mba nile e nwere na New York City na 1950, m kiriri ngụsị akwụkwọ nke ụmụ akwụkwọ ozi ala ọzọ site na klas nke 15 nke Watchtower Bible School of Gilead. ‘Oo, a sị nnọọ na m pụrụ iso n’etiti ndị na-aga ijere Jehova ozi ná mba ọzọ,’ ka m chere.

M zigara akwụkwọ m dejupụtara, a nabatakwara m dị ka onye òtù nke klas nke 17 nke Gilead, bụ́ nke malitere na February 1951. Akụkụ ebe ụlọ akwụkwọ ahụ dị n’ala ugbo n’ebe ugwu nke New York mara mma n’anya. Lee ka m si chọọ ịrụ ọrụ n’ugbo ahụ mgbe oge klas gasịrị, eleghị anya n’ọbá ilekọta ehi ma ọ bụ n’èzí ilekọta ihe ọkụkụ! Ma John Booth, onye nlekọta nke Kingdom Farm n’oge ahụ, kọwara na ọ bụ nanị m bụ onye nwere ahụmahụ n’ịsa uwe. Ya mere e kenyere m ọrụ ahụ.

Gilead adịghịrị onye gụruru nanị klas nke ise mfe. Ọ bụ ezie na e kwesịrị ịgbanyụ ọkụ na 10:30 nke abalị, m na-amụkarị ihe ruo ime abalị. Otu ụbọchị otu n’ime ndị nkụzi gwara m ka m bịa n’ọfịs ya. “Carl,” ka o kwuru, “ahụrụ m na akara ugo mmụta gị adịchaghị mma.”

‘Chaị,’ ka m chere n’onwe m, ‘ha na-aga ịchụpụ m.’

Otú ọ dị, onye nkụzi ahụ ji ịhụnanya nye m ụfọdụ ndụmọdụ banyere otú m pụrụ isi jiri oge m mee ihe bara uru karịsịa n’amụghị ihe ruo ime abalị. M jiri ụjọ jụọ, sị: “M̀ ruru eru ịnọgide na Gilead?”

“Eenụ,” ka ọ zaghachiri. “Kama amaghị m ma ị ga-eru eru maka ịnata diplọma.”

Enwetara m nkasi obi site n’okwu onye isi oche nke ụlọ akwụkwọ ahụ, bụ́ Nathan H. Knorr. Tupu mgbe ahụ ọ gwaworị ụmụ akwụkwọ ahụ na akara ugo mmụta mara mma amasịghị ya ruo ka “nnọgidesi ike n’ikwesị ntụkwasị obi” nke ndị ozi ala ọzọ bụ́ ndị nọgidere n’ebe e kenyere ha ọrụ.

Ihe ọmụmụ kasị siere m ike bụ asụsụ Spanish, kama m na-atụ anya ka e kenye m ọrụ ịga Alaska, ebe ikuku oyi ya bụ ihe mataworo m ahụ n’ebe m si bịa. E wezụgakwa nke ahụ, m ga-enwe ike ikwusa ozi ọma n’asụsụ Bekee. Ya mere ị pụrụ iche echiche ihe ịtụnanya m nwere mgbe ihe ọmụmụ ahụ gara ọkara, anatara m ọrụ m ịga Ecuador, South America. Ee, m ga-asụrịrị Spanish, kpọmkwem n’ebe na-ekpo oké ọkụ!

Otu ụbọchị onye ozi FBI (Ụlọ Ọrụ Gọọmenti Maka Inyocha Mpụ) bịara leta m n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead. Ọ jụrụ banyere nwa nke ohu kọmpini bụ́ onye hapụworo nzukọ anyị na Detroit Lakes. A na-alụ Agha Korea mgbe ahụ, nwa okorobịa a zọọrọ na ya bụ onye ozi nke Ndịàmà Jehova wee bụrụ onye a gụpụrụ n’ije ozi ndị agha. M kọwara na ọ bụkwaghị otu onye n’ime Ndịàmà Jehova. Ka onye ozi ahụ na-asị m ka e mesịa, ọ sịrị: “Ka Chineke gị gọzie gị n’ọrụ gị.”

E mesịrị m nụ na e gburu nwa okoro ahụ n’otu n’ime agha ndị mbụ ọ lụrụ na Korea. Lee ihe dị mwute nke ahụ rụpụtaara onye pụrụ ịgaworị n’ihu ruo ntozu okè ná nzukọ Chineke!

N’ikpeazụ, ụbọchị ngụsị akwụkwọ anyị na-eme obi ụtọ bịara na July 22, 1951. N’ezie, ọ dịghị otu onye n’ezinụlọ m bịaranụ, ma ọṅụ m zuru ezu mgbe m natara diplọma n’ihi ọganihu m nwere.

Ime Mgbanwe Ikwekọ ná Mba Ọzọ

N’otu mgbe m nọ n’ọrụ m, m chọpụtara na ọzụzụ mama m nyere m bara uru. Isi ihe, iji aka na-asa uwe, na ụkọ nke mmiri pọmpụ abụghị ihe ọhụrụ nye m. Ma iji asụsụ Spanish eme nkwusa bụ! M jiri ozi e biri ebi n’asụsụ Spanish mee ihe ruo mgbe ụfọdụ. O were afọ atọ tupu mụ enwee ike ikwu okwu ihu ọha n’asụsụ Spanish, ejikwa m ihe odide juru eju mee nke ahụ.

Mgbe m bịaruru n’Ecuador na 1951, e nwere ihe dị nta karịa 200 ndị nkwusa Alaeze. Ime ndị na-eso ụzọ yiri ka ọ na-aga nwayọọ nwayọọ na 25 afọ mbụ ma ọ bụ ihe dị ka nke ahụ. Ozizi Bible anyị nile dịcha nnọọ iche n’ọdịnala na-adịghị n’Akwụkwọ Nsọ nke okpukpe Katọlik, nrapagide anyị rapagidekwara ná ntụziaka Bible banyere ikwesị ntụkwasị obi nye otu onye òtù ọlụlụ anyị bụ ihe a na-adịghị ele anya ọma karịsịa.—Ndị Hibru 13:4.

N’agbanyeghị nke ahụ, anyị nwere ike itinye ọtụtụ akwụkwọ ndị dabeere na Bible. Ozi anyị na Machala, nke dị n’etiti ala ugbo ndị na-emepụta unere, mere ihe atụ nke a. Nicholas Wesley na mụ onwe m bụ nanị Ndịàmà nọ ebe ahụ mgbe anyị rutere na 1956. Anyị ga-apụ n’isi ụtụtụ n’ime gwongworo e ji ekpofu ihe nke e ji na-arụ ọrụ n’ụzọ awara awara a na-arụ n’oge ahụ. Mgbe anyị gbatụrụ ntakịrị, anyị ga-awụtu ma gbaara ndị mmadụ àmà site n’ebe ahụ gaghachi n’ebe anyị bi.

Otu ụbọchị, mụ na Nick na-edekọ ihe anyị na-eme iji lee onye n’ime anyị ga-etinye magazin karị. Echetara m na nke m karịrị nke Nick n’etiti ehihie, ma ka ọ na-erule uhuruchi onye nke ọ bụla n’ime anyị nyefere 114 magazin. Anyị hapụụrụ ndị nọ n’ụzọ magazin anyị ọtụtụ narị magazin anyị kwa ọnwa. Ugboro isii etinyere m ihe karịrị otu puku magazin n’ime otu ọnwa. Cheedị mmadụ olè pụrụ ịmụta eziokwu Bible site na magazin ndị ahụ!

Na Machala anyị nwekwara ihe ùgwù nke iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ nke ọgbakọ nwe n’Ecuador. Nke ahụ bụ 35 afọ gara aga, na 1960. N’oge gboo ndị ahụ, anyị nwere nanị 15 ndị na-abịa nzukọ anyị dị iche iche. Taa Machala nwere ọgbakọ 11 na-eme nke ọma!

Nleta Gaa na States

Ná ngwụsị afọ ndị 1970, m lọtara United States n’oge ezumike ma jiri hour ole na ole nọnyere nwanne m nwoke bụ́ Frank. O buuru m n’ụgbọ ala ya gaa n’otu ntakịrị ugwu bụ́ ebe anyị pụrụ isi lepụ anya ná Ndagwurugwu Red River. Ọ mara mma, na-enwe ọka ndị chara acha na-anyagharị n’ikuku, ubi sara mbara nke ọka wheat chachara acha. N’ebe dịpụrụ anya a pụrụ ịhụ Osimiri Sheyenne ebe osisi kwụchara n’ahịrị. A kwụsịtụrụ ịnụ ụtọ nke ịma mma ahụ na-edo ahụ mgbe nwanne m nwoke malitere nkwurịta okwu ọ na-enwekarị.

“Ọ bụrụ na ị bụghị nnọọ onye nzuzu nke na-awụgharị na South America, nke a pụkwara ịbụ nke gị!”

“Frank,” ka m nabiiri ya okwu n’ọnụ ngwa ngwa. “Kwụsị ya nnọọ ebe ahụ ugbu a.”

O kwughị okwu ọzọ. Afọ ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, ọ nwụrụ ná mberede site n’ọrịa ahụ mkpọnwụ, na-ahapụ ebe atọ mara mma a na-azụ ụmụ anụ na North Dakota na-enwe ngụkọta nke ihe karịrị 400 hekta, nakwa ugbo nwanne papa m dị 260 hekta na Montana bụ́ nke ọ ghọworo onye nketa ya.

Ugbu a mmadụ nile n’ezinụlọ m anwụchaala. Ma obi dị m ụtọ na na Detroit Lakes, bụ́ ebe anyị nile malitere ndụ dị ka Ndịàmà Jehova ọtụtụ afọ gara aga, enwere m ezinụlọ ime mmụọ nke ihe karịrị 90 ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị n’ime Kraịst.

Ịnọgide Na-aga n’Ihu n’Ụzọ Ime Mmụọ

Afọ 15 gara aga amịwo mkpụrụ bara ụba n’owuwe ihe ubi ime mmụọ n’ebe a n’Ecuador. Site n’ihe dị ka 5,000 ndị nkwusa Alaeze na 1980, anyị nwere ugbu a ihe karịrị 26,000. Enwetawo m ngọzi nke inyere ihe karịrị otu narị n’ime ndị a aka ime baptism.

Ugbu a, n’afọ ndụ nke 80, m na-arụsi ọrụ ike inweta hour 30 n’otu ọnwa n’ozi karịa ka m mere iji rụzuo 150 hour a chọrọ m n’aka na 1951. Kemgbe 1989, mgbe m ghọtara na m nwere ọrịa cancer mkpụrụ amụ, m werewo ohere mgbake m gụọ ihe. Kemgbe afọ ahụ, agụsịwo m Bible ugboro 19 nakwa akwụkwọ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom ugboro 6. N’ụzọ dị otú a m nọgidere na-aga n’ihu n’ụzọ ime mmụọ.

Ee, enwewo m ohere inweta uru ihe onwunwe n’ala ugbo nke United States. Ma ụgwọ ọrụ nke ụba ihe onwunwe abụghị ihe ọ bụla ma e jiri ya tụnyere ọṅụ m nwetaworo n’owuwe ihe ubi ime mmụọ. Alaka dị ebe a n’Ecuador gwara m na etinyewo m ihe karịrị 147,000 magazin na 18,000 akwụkwọ n’ọrụ ije ozi ala ọzọ m. M na-ele ihe ndị a anya ịbụ mkpụrụ ime mmụọ, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha pupụtawororịị; ndị ọzọ ka pụrụ ipupụta n’obi ndị mmadụ ka ha na-agụ banyere eziokwu Alaeze ndị a.

M pụghị iche banyere ihe ọzọ dị mma karịa ịnọgide na-aga n’ihu baa n’ime ụwa ọhụrụ Chineke, mụ na ụmụ ime mmụọ m na ọtụtụ nde ndị ọzọ bụ́ ndị họrọwooro ijere Chineke anyị, bụ́ Jehova ozi. Ego agaghị azọpụta anyị gafee ọgwụgwụ nke ajọ ụwa nke a. (Ilu 11:4; Ezikiel 7:19) Otú ọ dị, mkpụrụ nke ọrụ ime mmụọ anyị ga-aga n’ihu—ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị anọgide na-aga n’ihu ruo ntozu okè.

[Foto dị na peeji nke 24]

Adịwo m njikere ịsụ ụzọ na Miles City, Montana, na 1949

[Foto dị na peeji nke 24]

Ịzụ mmiri maka ebe obibi ndị ozi ala ọzọ anyị, 1952

[Foto dị na peeji nke 25]

Ime nkwusa na Machala, 1957

[Foto dị na peeji nke 25]

Kemgbe m dara ọrịa na 1989, agụsịwo m Bible ugboro 19

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya