Ị̀ Na-echeta?
Ì nwewo mmasị ịgụ mbipụta ndị na-adịbeghị anya nke Ụlọ Nche? Ọ dị mma, lee ma ị pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:
▫ N’ihi gịnị ka ndị Kraịst oge gboo ji ghara ime ememe ncheta ọmụmụ Jisọs?
Dị ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia si kwuo, “ndị Kraịst Oge Gboo emeghị ememe ncheta ọmụmụ [Jisọs] n’ihi na ha lere ememe ncheta ọmụmụ nke onye ọ bụla anya dị ka omenala ndị ọgọ mmụọ.”—12/15, peji nke 4.
▫ È kwesịrị ikpegara Jisọs ekpere?
Ee e, n’ihi na ekpere bụ otu ụdị nke ofufe nke dịịrị nanị Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Site n’ikpegara Jehova Chineke ekpere anyị nile, anyị na-egosipụta na anyị bu nduzi Jisọs nke ikpe ekpere n’uche: “Nna anyị Nke bi n’eluigwe.” (Matiu 6:9)—12/15, peji nke 25.
▫ N’ihi gịnị ka e ji nwee ọdịiche n’ikpe e kpere maka mmehie dị oké njọ nke Eze Devid n’iji ya tụnyere mmehie ndị nke Ananaịas na Safaịra? (2 Samuel 11:2-24; 12:1-14; Ọrụ 5:1-11)
Mmehie Eze Devid bụ n’ihi adịghị ike anụ ahụ. Mgbe a kọọrọ ya ihe o meworo, o chegharịrị, Jehova gbaghakwaara ya—ọ bụ ezie na ọ naara ihe ndị si ná mmehie ya pụta. Ananaịas na Safaịra mehiere n’ihi na ha jiri ihu abụọ ghaa ụgha, na-anwa ịghọgbu ọgbakọ ndị Kraịst wee si otú a chọọ ‘ịgwa mmụọ nsọ na Chineke okwu ụgha.’ (Ọrụ 5:3, 4) Nke ahụ ghọrọ ihe àmà nke obi ọjọọ, n’ihi ya a mara ha ikpe n’ụzọ siri ike.—1/1, peji nke 27, 28.
▫ Gịnị pụrụ inyere anyị aka ife Jehova ofufe n’obi na-aṅụrị ọṅụ?
Anyị kwesịrị ịzụlite omume nke ile ngọzi na ihe ùgwù ije ozi ndị Chineke na-enye anyị anya n’ụzọ ziri ezi na n’ụzọ obi ekele, anyị ekwesịghịkwa ichefu na site n’ịgbaso Okwu Chineke, anyị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ.—1/15, peji nke 16, 17.
▫ Ihe abụọ dị aṅaa ka anyị na-aghaghị iburu n’uche ma ọ bụrụ na anyị ga-enye agbamume dị irè?
Nke mbụ, chee echiche banyere ihe ị ga-ekwu ka agbamume ahụ wee kwụrụ chịm. Nke abụọ, chọpụta ohere dịnụ ịgwa onye kwesịrị ịja mma okwu ma ọ bụ onye ọ dị mkpa ka e wulie ya elu.—1/15, peji nke 23.
▫ Gịnị mere “oké ìgwè mmadụ” ahụ ji jide “igu nkwụ n’aka ha”? (Mkpughe 7:9)
Mfegharị nke igu nkwụ ahụ na-egosi na “oké ìgwè mmadụ” ahụ ji ọṅụ na-eto Alaeze Jehova na Eze ya e tere mmanụ, bụ́ Jisọs Kraịst. (Lee Levitikọs 23:39, 40.)—2/1, peji nke 17.
▫ Ihe mmụta ndị dị aṅaa bara uru ka a na-achọta n’akwụkwọ Job?
Akwụkwọ Job na-egosi anyị otú e si edozi nsogbu. Ọ na-enye ihe atụ ndị pụtara ìhè otú e kwesịrị—na otú a na-ekwesịghị—isi nye onye na-eche ule dị iche iche ihu ndụmọdụ. N’ịgakwu n’ihu, ahụmahụ Job n’onwe ya pụrụ inyere anyị aka imeghachi omume n’ụzọ ziri ezi mgbe anyị chọtara onwe anyị ka ọnọdụ ọjọọ dị iche iche na-ebuso anyị agha.—2/15, peji nke 27.
▫ Gịnị ka ọrụ ebube Jisọs na-akụziri anyị?
Ọrụ ebube Jisọs nyere Chineke otuto, na-esetịpụ ụkpụrụ maka ndị Kraịst inye Chineke otuto. (Ndị Rom 15:6) Ha na-agba ume ime ihe ọma, igosi mmesapụ aka, na igosipụta ọmịiko.—3/1, peji nke 8.
▫ Nzube dị aṅaa ka a na-arụzu site ná ndị okenye isoro ndị ọhụrụ raara onwe ha nye tụlee ajụjụ ndị a kwadebeworo?
Nke a na-anwapụta na nke ọ bụla ná ndị mmụta ahụ na-aghọtazu ozizi ndị bụ́ isi nke Bible ma mara ihe ọ gụnyere ịbụ Onyeàmà Jehova.—3/1, peji nke 13.
▫ Olee otú ekpere ndị dị na Bible pụrụ isi bara anyị uru?
Site n’ileru ekpere ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ anya, anyị pụrụ ịmata ndị ahụ e kpere n’ọnọdụ ndị yiri nke anyị. Ịchọta, ịgụ, na ịtụgharị uche n’ekpere ndị dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka ime ka nkwurịta okwu nke anyị na Jehova ka mma.—3/15, peji nke 3, 4.
▫ Gịnị bụ egwu Chineke?
Egwu Chineke bụ inwe egwu siri ike nke Jehova, nsọpụrụ miri emi maka ya, tinyere egwu dị mma nke imejọ ya. (Abụ Ọma 89:7)—3/15, peji nke 10.
▫ Olee ụzọ atọ ndị Bible si egosi na anyị dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke?
Bible na-akụzi na onye ọ bụla n’ime anyị bara uru n’anya Chineke (Luk 12:6, 7); ọ na-eme ka ihe ndị Jehova na-ewere dị ka ihe bara uru n’ebe anyị nọ doo anya (Malakaị 3:16); ọ na-akọkwa ihe Jehova meworo iji gosipụta ịhụnanya ya maka anyị. (Jọn 3:16)—4/1, peji nke 11, 12, 14.
▫ N’ihi gịnị ka Ndị Hibru 10:24, 25 ji bụrụ ihe karịrị nanị iwu ka ndị Kraịst na-ezukọta ọnụ?
Okwu ndị a nke Pọl na-esetịpụ ụkpụrụ sitere n’ike mmụọ Chineke maka nzukọ nile nke ndị Kraịst—n’ezie, maka oge ọ bụla ndị Kraịst na-ezukọta ọnụ.—4/1, peji nke 16.