Ọnọdụ Dị Ùgwù nke Ndị Inyom n’Etiti Ndị Ohu Chineke n’Oge Gboo
“Jehova, bụ́ Chineke, wee sị, Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọọ nanị ya; M ga-emere ya onye inyeaka kwesịrị ya.”—JENESIS 2:18.
1. Olee otú otu ọkọwa okwu Bible si kọwaa ọnọdụ ndị inyom n’oge ochie?
“Ọ DỊGHỊ ebe ọ bụla na Mediterranean ma ọ bụ Nso Ebe Ọwụwa Anyanwụ e nyere ndị inyom nnwere onwe nke ha na-enwe n’ọha mmadụ oge ugbu a nke Ebe Ọdịda Anyanwụ. Ụkpụrụ a maara ebe nile bụ nke ido ndị inyom n’okpuru ndị ikom, dị ka ndị ohu na-anọ n’okpuru ndị nwe onwe ha, ndị na-eto eto n’okpuru ndị agadi kwa. . . . A na-ewere ụmụaka bụ́ ndị ikom ná ndị bara uru nke ukwuu karịa ndị inyom, mgbe ụfọdụkwa a na-ahapụ ụmụ ọhụrụ bụ́ ndị inyom ka ha nwụọ site n’ịgbahapụ ha.” Ọ bụ otú ahụ ka otu ọkọwa okwu Bible si na-akọwa ọnọdụ ndị inyom n’oge ochie.
2, 3. (a) Dị ka otu akụkọ na-ekwu, gịnị bụ ọnọdụ nke ọtụtụ ndị inyom taa? (b) Olee ajụjụ ndị a na-ewelite?
2 Ọnọdụ ahụ akachaghị mma n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa taa. Na 1994, na nke mbụ ya, akụkọ mgbaafọ banyere ihe ndị ruuru mmadụ nke ụlọ ọrụ State Department nke United States lekwasịrị anya ná mmeso a na-emeso ndị inyom. “Ihe Ndekọ Banyere 193 Mba Na-egosi na Ịkpa Ókè Kwa Ụbọchị Bụ Ihe Na-eme n’Ezie,” ka otu isiakụkọ banyere akụkọ ahụ kwuru n’akwụkwọ akụkọ The New York Times.
3 Ebe ọ bụ na ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị inyom nwere nzụlite ọdịbendị dịgasị iche iche nọ n’ọgbakọ ndị Jehova gburugburu ụwa, ajụjụ ụfọdụ na-ebilite: Mmeso ahụ a ka kọwapụrụ ọ̀ bụ ụdị nke Chineke bu n’uche na mbụ mbụ maka ndị inyom? Olee otú e si mesoo ndị inyom n’etiti ndị na-efe Jehova n’oge Bible? Oleekwa ụzọ e kwesịrị isi mesoo ndị inyom taa?
“Onye Inyeaka Kwesịrị Ya”
4. Gịnị ka Jehova rịbara ama mgbe nwoke mbụ ahụ nọworo nanị ya n’ogige Iden ruo oge ụfọdụ, gịnịkwa ka Chineke meziri?
4 Mgbe Adam nọworo n’ogige Iden nanị ya ruo oge ụfọdụ, Jehova rịbara ama, sị: “Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọọ nanị ya; M ga-emere ya onye inyeaka kwesịrị ya.” (Jenesis 2:18) Ọ bụ ezie na Adam bụ nwoke zuru okè, ihe ọzọ dị mkpa iji mezuo nzube Onye Okike ahụ. Iji mejuo mkpa ahụ, Jehova kere nwanyị wee mee alụmdi na nwunye mbụ.—Jenesis 2:21-24.
5. (a) Olee otú ndị dere Bible si ejikarị mkpọaha Hibru a sụgharịrị “onye inyeaka” eme ihe? (b) Gịnị ka eziokwu bụ na Jehova zoro aka n’ebe nwanyị mbụ nọ dị ka nke “kwesịrị ya” na-egosi?
5 Okwu ndị ahụ bụ́ “onye inyeaka kwesịrị ya” hà na-egosi na ọnọdụ Chineke kenyere ndị inyom na-ewetu n’ala? Ọ dịghị. Ndị dere Bible na-ejikarị mkpọaha Hibru bụ́ (ʽeʹzer) nke a na-asụgharị “onye inyeaka” eme ihe banyere Chineke. Dị ka ihe atụ, Jehova na-aghọ “inyeaka anyị na ọta anyị.” (Abụ Ọma 33:20; Ọpụpụ 18:4; Deuterọnọmi 33:7) Na Hosea 13:9, ọbụna na Jehova zoro aka n’ebe ya onwe ya nọ dị ka “inyeaka” Israel. Banyere okwu Hibru bụ́ (neʹghedh) nke a sụgharịrị “kwesịrị ya,” otu ọkà mmụta Bible na-akọwa, sị: “Enyemaka a na-achọ abụghị nnọọ enyemaka nkịtị n’ọrụ ọ na-arụ kwa ụbọchị, ma ọ bụ n’ịmụ ụmụ . . . kama nkwadorịta ibe nke mkpakọrịta na-enye.”
6. Gịnị ka e kwuru mgbe e kesịrị nwanyị ahụ, n’ihi gịnịkwa?
6 Ya mere ọ dịghị ihe mweda n’ala dị ná nkọwa Jehova kọwara onye inyom dị ka “onye inyeaka kwesịrị ya.” Nwanyị nwere ọdịdị uche, mmetụta uche, na anụ ahụ ndị nke ya. Ọ bụ onye ibe kwesịrị ekwesị, onye kwekọrọ ekwekọ n’ụzọ na-eju afọ nye nwoke. Nke ọ bụla dị iche, ma nke ọ bụla dị mkpa iji “jupụta ụwa” n’ikwekọ ná nzube Onye Okike ahụ. Ihe àmà na-egosi na ọ bụ mgbe e kesịrị ma nwoke ma nwanyị ka ‘Chineke hụrụ ihe nile ọ bụla O mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.’—Jenesis 1:28, 31.
7, 8. (a) Mgbe mmehie batasịrị n’Iden, olee otú ọ ga-esi metụta ọnọdụ ndị inyom? (b) Ajụjụ dịgasị aṅaa ka a na-ewelite n’ihe banyere mmezu nke Jenesis 3:16 n’etiti ndị na-efe Jehova?
7 Mgbe mmehie batasịrị, ihe gbanweere nwoke na nwanyị ahụ. Jehova mara ha abụọ ikpe dị ka ndị mmehie. “M ga-eme ka ihe mgbu gị na ịtụ ime gị baa ụba nke ukwuu,” ka Jehova gwara Iv, mgbe ọ na-ekwu banyere ihe ga-emesịa mee bụ́ nke ọ na-ekwe ka ọ dịrị dị ka a ga-asị na ọ bụ ya mere ya. O kwukwasịrị: “N’ihe mgbu ka ị ga-amụ ụmụ; n’ebe di gị nọ ka ọchịchọ gị ga-adị, ya onwe ya ga-achịkwa gị.” (Jenesis 3:16) Eri oge ahụ, ọtụtụ ndị nwunye abụwo ndị ndị bụ di ha chịworo, ọtụtụ mgbe n’aka ike. Kama iwere ha dị ka ndị inyeaka kwesịrịnụ, ọtụtụ mgbe e mesowo ha dị nnọọ ka ndị ohu ma ọ bụ odibo.
8 Ma, gịnị ka mmezu nke Jenesis 3:16 pụtaara ndị inyom na-efe Jehova? È weturu ha ala gaa n’ọnọdụ nke ịgba ohu na mweda n’ala? Ọ dịtụghị otú ahụ ma ọlị! Ma gịnị banyere ihe ndekọ Bible ndị na-akọ banyere omenala na omume ndị metụtara ndị inyom bụ́ ndị pụrụ ịbụ ndị a na-apụghị ịnakwere n’etiti ọha mmadụ ụfọdụ taa?
Ịghọta Omenala Dị Iche Iche nke Bible
9. Mgbe anyị na-atụle omenala ndị metụtara ndị inyom n’oge Bible, olee ihe atọ anyị kwesịrị iburu n’uche?
9 E mesoro ndị inyom nke ọma n’etiti ndị ohu Chineke n’oge Bible. Otú ọ dị, n’ịtụle omenala ndị metụtara ndị inyom n’ụbọchị ndị ahụ, ọ bụ ihe enyemaka iburu ihe ụfọdụ n’uche. Nke mbụ, mgbe Bible na-akọ banyere ọnọdụ na-adịghị mma bilitere n’ihi ndị ikom dị obi ọjọọ iji ọchịchọ onwe onye nanị na-achị, nke ahụ apụtaghị na Chineke kwadoro imeso ndị inyom otú ahụ. Nke abụọ, ọ bụ ezie na Jehova kwere ka omenala ụfọdụ dịrị n’etiti ndị ohu ya ruo oge ụfọdụ, ọ chịkwara ndị a iji chebe ndị inyom. Nke atọ, anyị aghaghị ilezi anya ịghara iji ụkpụrụ ndị e nwere n’oge a kpee omenala dị iche iche nke oge ochie ikpe. Ndị inyom laa azụ n’oge ahụ elechaghị omenala ụfọdụ pụrụ iyi ihe na-adịghị mma nye ụfọdụ ndị dị ndụ taa anya dị ka ihe mweda n’ala. Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ.
10. Olee otú Jehova si lee ịlụ ìgwè mmadụ anya, gịnịkwa na-egosi na ọ dịghị mgbe ọ gbahapụrụ ụkpụrụ mbụ ya nke otu nwoke otu nwanyị?
10 Ịlụ ìgwè mmadụ:a Dị ka nzube mbụ nke Jehova si dị, nwunye na nwanyị ọzọ agaghị ekerịta di ya. Chineke keere Adam nanị otu nwunye. (Jenesis 2:21, 22) Mgbe nnupụisi ahụ n’Iden gasịrị, ịlụ ìgwè mmadụ nke mbụ weere ọnọdụ n’eriri Ken. E mesịa ọ ghọrọ omenala, ụfọdụ ndị na-efe Jehova nakweerekwara ya. (Jenesis 4:19; 16:1-3; 29:21-28) Ọ bụ ezie na Jehova kwere ka ịlụ ìgwè mmadụ dịrị, o nyekwara aka ịmụba ọnụ ọgụgụ ndị Israel, o gosiri nchebara echiche maka ndị inyom site n’ịchịkwa omume ahụ ka e wee chebe ndị nwunye na ụmụ ha. (Ọpụpụ 21:10, 11; Deuterọnọmi 21:15-17) E wezụga nke ahụ, Jehova agbahapụghị ma ọlị ụkpụrụ mbụ ya nke otu nwoke otu nwanyị. Noa na ụmụ ya, ndị e nyeghachiri iwu ‘ịmụ ụmụ jupụta ụwa,’ nwechara nanị otu nwunye otu nwunye. (Jenesis 7:7; 9:1; 2 Pita 2:5) Chineke sere onyinyo onwe ya dị ka di otu nwunye mgbe ọ na-eme ihe atụ mmekọrịta ya na Israel. (Aịsaịa 54:1, 5) Ọzọkwa, Jisọs Kraịst guzobeghachiri ụkpụrụ mbụ nke Chineke nke otu nwoke otu nwanyị, ọgbakọ ndị Kraịst n’oge mbụ gbasokwara ya.—Matiu 19:4-8; 1 Timoti 3:2, 12.
11. N’ihi gịnị ka e ji akwụ ụgwọ isi nwanyị n’oge Bible, nke a ọ̀ bụkwa ihe mweda n’ala nye ndị inyom?
11 Ịkwụ ụgwọ isi nwanyị: Akwụkwọ bụ́ Ancient Israel—Its Life and Institutions na-ekwu, sị: “Ịchọ ka a kwụọ ego ụfọdụ, ma ọ bụ ihe ruru ya, nye ezinụlọ nwa agbọghọ yiri ka ọ na-enye alụmdi na nwunye ndị Israel ngosipụta a na-ahụ anya nke ihe a zụrụ azụ. Ma [ụgwọ isi nwanyị] ahụ yiri ka ọ bụchaghị ụgwọ a na-akwụ maka nwanyị ahụ dị ka ọ bụ ihe iti aka n’obi nye ezinụlọ ahụ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ya mere ịkwụ ụgwọ isi nwanyị jere ozi dị ka ihe iti ezinụlọ nwanyị ahụ aka n’obi maka mfu nke ije ozi ya na maka mgbalị na mmefu ndị ọ dị mkpa ka ezinụlọ ya mefuo n’ilekọta ya. Ya mere, kama iweda nwanyị ala, o mesiri ike abamuru ya nye ezinụlọ ya.—Jenesis 34:11, 12; Ọpụpụ 22:16; lee Ụlọ Nche, January 15, 1989, peji nke 21-24.
12. (a) Olee otú e si zoo aka n’ebe ndị ikom na ndị inyom lụrụ di ma ọ bụ nwunye nọ mgbe ụfọdụ n’Akwụkwọ Nsọ, okwu ndị a kwa hà na-akpasu ndị inyom iwe? (b) Gịnị kwesịrị ịrịba ama n’okwu ndị Jehova ji mee ihe n’Iden? (Lee nkọwa ala ala peji.)
12 Ndị bụ di dị ka ‘ndị nwenụ’: Otu ihe mere ná ndụ Abraham na Sera n’ihe dị ka na 1918 T.O.A. na-egosi na ka ọ na-erule n’oge ahụ ihe àmà na-egosi na ọ bụwo omenala ile nwoke lụrụ nwunye anya dị ka “onye nwenụ” (Hibru, baʹʽal) na nwanyị a lụrụ alụ dị ka ‘onye e nwe enwe’ (Hibru, beʽu·lahʹ). (Jenesis 20:3, NW) E mesịrị jiri okwu ndị a mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ mgbe ụfọdụ, e nweghịkwa ihe ọ bụla na-egosi na ndị inyom tupu oge ndị Kraịst weere ya n’ihe mkpasu iwe.b (Deuterọnọmi 22:22) Ma, a gajeghị imeso ndị nwunye dị ka ngwongwo nkịtị. A pụrụ ịzụta, ire, na ọbụna iketa ngwongwo ma ọ bụ akụ̀, ma a pụghị ime nwunye otú ahụ. “Ụlọ na akụ̀ bụ ihe nketa ndị bụ nna na-ahapụ,” ka otu ilu Bible na-ekwu, “ma Jehova ka nwunye nke nwere uche sitere n’aka.”—Ilu 19:14; Deuterọnọmi 21:14.
Ọnọdụ Dị Ùgwù
13. Mgbe ndị ikom na-atụ egwu Chineke gbasoro ihe nlereanya Jehova ma rube isi n’Iwu ya, gịnị ka ọ rụpụtaara ndị inyom?
13 Mgbe ahụ, gịnị bụ ọnọdụ nke ndị inyom n’etiti ndị ohu Chineke tupu oge ndị Kraịst? Olee otú e si lee ha anya ma mesoo ha? Ikwu ya n’ụzọ dị mfe, mgbe ndị ikom na-atụ egwu Chineke gbasoro ihe nlereanya nke Jehova n’onwe ya ma rube isi n’Iwu ya, ndị inyom nọgidere na-enwe ùgwù ha ma nwee ọtụtụ ikike na ihe ùgwù.
14, 15. Olee ihe ndị na-egosi na a kwanyere ndị inyom ùgwù n’Israel, n’ihi gịnịkwa ka Jehova pụrụ iji zie ezi ịtụ anya ka ndị ikom na-efe ya kwanyere ha ùgwù?
14 E kwesịrị ịkwanyere ndị inyom ùgwù. Iwu Chineke nyere Israel kwuru ka a kwanyere ma ndị nna ma ndị nne ùgwù. (Ọpụpụ 20:12; 21:15, 17) “Unu ga-atụ egwu, onye ọ bụla ọ tụọ egwu nne ya na nna ya,” ka Levitikọs 19:3 na-ekwu. Mgbe Bat-sheba gakwuuru nwa ya nwoke bụ́ Solomọn n’otu oge, “eze wee bilie izute ya, wee kpọọ isiala nye ya” ná nkwanye ùgwù. (1 Ndị Eze 2:19) Akwụkwọ bụ́ Encyclopaedia Judaica na-ekwu, sị: “A pụrụ ijiwo ịhụnanya Chineke maka Israel tụnyere ịhụnanya nke di maka nwunye ya n’ụzọ amụma nanị n’ọha mmadụ ebe a na-akwanyere ndị inyom ùgwù.”
15 Jehova na-atụ anya ka ndị ikom na-efe ya na-akwanyere ndị inyom ùgwù, n’ihi na ọ na-akwanyere ha. A na-achọta ihe ndị na-egosi nke a n’akụkụ akwụkwọ nsọ ebe Jehova jiri ahụmahụ nke ndị inyom mee ihe n’ụzọ ihe atụ ma jiri mmetụta ndị nke onwe ya tụnyere nke ndị inyom. (Aịsaịa 42:14; 49:15; 66:13) Nke a na-enyere ndị na-agụ ya aka ịghọta mmetụta Jehova. Ọ bụ ihe na-adọrọ mmasị ịmara na okwu Hibru maka “ebere,” ma ọ bụ “ọmịiko,” nke Jehova ji eme ihe banyere onwe ya, bụ nke e jikọrọ n’ụzọ chiri anya ya na okwu e ji eme ihe maka “akpa nwa,” a pụkwara ịkọwa ya dị ka “mmetụta onye bụ nne.”—Ọpụpụ 33:19; Aịsaịa 54:7.
16. Ihe atụ dịgasị aṅaa na-egosi na e ji okwu ndụmọdụ ndị inyom na-asọpụrụ Chineke kpọrọ ihe?
16 E ji okwu ndụmọdụ ndị inyom na-asọpụrụ Chineke kpọrọ ihe. Mgbe Abraham na-atụ egwu Chineke lara azụ n’ịṅa ntị n’okwu ndụmọdụ nwunye ya na-asọpụrụ Chineke, bụ́ Sera, n’otu ọnọdụ, Jehova gwara ya, sị: “Gee ntị n’olu ya.” (Jenesis 21:10-12) Ndị nwunye Ịsọ bụ́ ndị Het “ghọọrọ Aịsak, ghọọkwara Rebeka, ihe mmụọ ilu.” Mgbe oge na-aga, Rebeka kwupụtara obi mgbu ọ ga-enwe ma ọ bụrụ na nwa ha nwoke bụ́ Jekọb alụọ onye Het. Gịnị bụ mmeghachi omume Aịsak? “Aịsak wee kpọọ Jekọb,” ka ihe ndekọ ahụ na-ekwu, “gọzie ya, nye ya iwu, sị ya, Gị alụla nwunye sitere n’ụmụ ndị inyom Kenean.” Ee, ọ bụ ezie na Rebeka enyeghị okwu ndụmọdụ ọ bụla kpọmkwem, di ya mere mkpebi chebaara mmetụta ya echiche. (Jenesis 26:34, 35; 27:46; 28:1) Eze Devid mesịrị zere ikpe ọmụma ọbara n’ihi na ọ ṅara ntị n’arịrịọ Abigail.—1 Samuel 25:32-35.
17. Gịnị na-egosi na ndị inyom nwere ikike ụfọdụ n’ezinụlọ?
17 Ndị inyom nwere ike ụfọdụ n’ezinụlọ. A gbara ụmụaka ume, sị: “Nwa m, nụrụ ịdọ aka ná ntị nke nna gị, ahapụkwala iwu nne gị.” (Ilu 1:8) Nkọwa nke “nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma” n’Ilu isi 31 na-ekpughe na nwanyị a lụrụ alụ nke na-arụsi ọrụ ike abụghị nanị na ọ na-elekọta ụlọ kamakwa ọ pụkwara ịhụ maka ịzụ ala, kọọ ugbo na-emepụta ihe, lekọta obere azụmahịa, bụrụkwa onye e ji okwu amamihe ya mara. Nke kasị ha nile mkpa bụ egwu Jehova nke nwanyị ahụ kwesịrị otuto. Ka a sịkwa ihe mere uru nwunye dị otú ahụ ji dị ‘ọnụ karịrị ruby nke ukwuu’! A na-ewere ruby dị oké ọnụ ahịa n’ihe a na-achọsi ike maka ọla oyiyi na ihe ịchọ mma ndị ọzọ.—Ilu 31:10-31.
Ndị Inyom Nwetara Afọ Ọma Pụrụ Iche nke Chineke
18. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka e meere ndị inyom ụfọdụ n’oge Bible afọ ọma pụrụ iche?
18 E gosipụtara ùgwù Jehova na-akwanyere ndị inyom n’afọ ọma pụrụ iche o meere ụfọdụ n’ime ha n’oge Bible. Hega, Sera, na nwunye Manoa bụ ndị ndị mmụọ ozi nyere ha nduzi Chineke letara. (Jenesis 16:7-12; 18:9-15; Ndị Ikpe 13:2-5) E nwere “ndị inyom” n’ụlọikwuu na ndị inyom na-ekwe ukwe n’ogige obí Solomọn.—Ọpụpụ 38:8; 1 Samuel 2:22; Eklisiastis 2:8.
19. N’oge ụfọdụ, Jehova jiri ndị inyom nọchite anya onwe ya n’ụzọ dị aṅaa?
19 Ọtụtụ ugboro n’akụkọ ihe mere eme nke Israel, Jehova jiri nwanyị mee ihe ịnọchite anya ya ma ọ bụ ikwuchitere ya okwu. Banyere onye amụma nwanyị bụ́ Debọra, anyị na-agụ, sị: “Ụmụ Israel wee rịgokwute ya ka o kpee ha ikpe.” (Ndị Ikpe 4:5) Mgbe Israel merisịrị eze Kenean bụ́ Jabin, Debọra nwere ihe ùgwù pụrụ iche n’ezie. Ihe àmà na-egosi na ọ bụ ya rọrọ abụ mmeri ahụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ akụkụ ya ụfọdụ, bụ́ nke mesịrị ghọọ akụkụ nke ihe ndekọ Jehova nke sitere n’ike mmụọ nsọ.c (Ndị Ikpe, isi 5) Ọtụtụ narị afọ n’ihu, iji jụta uche Jehova, Eze Josaịa zigaara onye amụma nwanyị bụ́ Hulda ndị nnọchiteanya nke gụnyere onye isi nchụàjà. Hulda pụrụ iji ikike zaghachi, sị: “Otú a ka Jehova, bụ́ Chineke Israel, sịrị.” (2 Ndị Eze 22:11-15) N’oge ahụ eze nyere ndị nnọchiteanya ahụ iwu ka ha gakwuru onye amụma nwanyị, ma e mere nke a iji nata nduzi sitere n’aka Jehova.—Tụlee Malakaị 2:7.
20. Ihe atụ dịgasị aṅaa na-egosi nchegbu Jehova maka mmetụta na ọdịmma ndị inyom?
20 Nchegbu Jehova maka ọdịmma ụmụ nwanyị pụtara ìhè site n’oge dị iche iche o mere ihe n’ihi ụfọdụ n’ime ndị inyom na-efe ya. Ugboro abụọ ka o mere ihe iji chebe nwunye Abraham mara mma, bụ́ Sera, ka a ghara imetọ ya. (Jenesis 12:14-20; 20:1-7) Chineke meere Lia, bụ́ nwunye Jekọb nke ọ na-ahụchaghị n’anya ka nke ọzọ, afọ ọma site ‘n’imeghe akpa nwa ya,’ o wee mụọ nwa nwoke. (Jenesis 29:31, 32) Mgbe ndị Israel abụọ na-atụ egwu Chineke, bụ́ ndị inyom na-ele ime tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ iji chebe ụmụ ndị ikom ndị Hibru ka a ghara igbu ha n’Ijipt, Jehova ji obi ekele ‘mee ezinụlọ nye ha.’ (Ọpụpụ 1:17, 20, 21) Ọ zakwara ekpere Hana nke sitere n’ime ime obi. (1 Samuel 1:10, 20) Mgbe nwanyị di ya bụ́ onye amụma nwụrụ chekwara onye o ji ụgwọ ihu bụ́ onye dị njikere ịkpọrọ ụmụ ya iji kwụchapụ ụgwọ o ji, Jehova agbahapụghị ya. N’ịhụnanya, Chineke nyere Elaịsha onye amụma ike ịmụba mmanụ ya ka o wee nwee ike ịkwụ ụgwọ ahụ. Otú a o chebere ezinụlọ ya na ùgwù ya.—Ọpụpụ 22:22, 23; 2 Ndị Eze 4:1-7.
21. Akwụkwọ Nsọ Hibru na-ese onyinyo dị aṅaa a haziri nke ọma nke ọnọdụ ndị inyom?
21 Ya mere, n’anwatụghị ịgba ume ileda ndị inyom anya, Akwụkwọ Nsọ Hibru na-ese onyinyo a haziri nke ọma nke ọnọdụ ha n’etiti ndị ohu Chineke. Ọ bụ ezie na Jehova ekpuchighị ndị inyom na-efe ya ofufe pụọ ná mmezu nke Jenesis 3:16, ndị ikom na-asọpụrụ Chineke bụ́ ndị gbasoro ihe nlereanya Jehova ma ṅaa ntị n’Iwu ya mesoro ndị inyom n’ụzọ dị ùgwù na ná nsọpụrụ.
22. Ka ọ na-erule oge Jisọs nọ n’elu ụwa, olee otú ọnọdụ ndị inyom siworo gbanwee, ajụjụ dịgasị aṅaa ka a na-ajụkwa?
22 Na narị afọ ndị sochiri ndezu nke Akwụkwọ Nsọ Hibru, ọnọdụ ndị inyom gbanwere n’etiti ndị Juu. Ka ọ na-erule oge Jisọs bịara n’elu ụwa, ọdịnala dị iche iche nke ndị rabaị egbochiwo ndị inyom nke ukwuu n’ihe ùgwù ha nile n’ihe banyere okpukpe na mmekọrịta ọha na eze. Ọdịnala ndị dị otú ahụ hà metụtara ụzọ Jisọs si mesoo ndị inyom? Olee otú e kwesịrị isi mesoo ndị inyom bụ́ ndị Kraịst taa? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu nke na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary na-ekwu, “ịlụ ìgwè mmadụ” na-ezo aka n’ebe “alụmdi na nwunye nke nwoke ma ọ bụ nwanyị pụrụ inwe n’ime ya ihe karịrị otu onye òtù ọlụlụ n’otu oge ahụ” dị. Okwu ka gaa n’isi ihe bụ́ “ịlụ ìgwè nwanyị” ka a kọwara dị ka “ọnọdụ ma ọ bụ omume nke inwe karịa otu nwunye ma ọ bụ onye ibe bụ́ inyom n’otu oge.”
b N’Akwụkwọ Nsọ Hibru nile, e zoro aka n’ebe ndị ikom na ndị inyom lụrụ di ma ọ bụ nwunye nọ ọtụtụ ugboro karị dị ka “di” (Hibru, ʼish) na “nwunye” (Hibru, ʼish·shahʹ). N’Iden, dị ka ihe atụ, okwu ndị Jehova ji mee ihe bụ “di” na “nwunye,” ọ bụghị “onye nwe” na ‘onye e nwe enwe.’ (Jenesis 2:24; 3:16, 17) Amụma Hosea kwuru na mgbe ha latasịrị site n’ibi n’ala ọzọ, Israel ga-eji nchegharị kpọọ Jehova “Di m,” ọ bụkwaghị “Onye nwe m.” Nke a pụrụ igosi na okwu bụ “di” na-enye nghọta nke ịdị nro karịa “onye nwe.”—Hosea 2:16, NW.
c Iji okwu bụ “mụ” mee ihe ná Ndị Ikpe 5:7 mgbe a na-ekwu banyere Debọra kwesịrị ịrịba ama.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Gịnị ka okwu ndị ahụ bụ́ “onye inyeaka kwesịrị ya” na-egosi banyere ọnọdụ Chineke kenyere ndị inyom?
◻ Mgbe a na-atụle omenala ndị metụtara ndị inyom n’oge Bible, gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche?
◻ Gịnị na-egosi na ndị inyom nwere ọnọdụ dị ùgwù n’etiti ndị ohu Chineke n’oge gboo?
◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova meere ndị inyom tupu oge ndị Kraịst afọ ọma pụrụ iche?