Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 8/1 p. 14-19
  • Ndị Jehova Na-akụziri Ihe Ruo Taa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Jehova Na-akụziri Ihe Ruo Taa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọmarịcha Mmekọrịta Onye Nkụzi na Nwa Akwụkwọ
  • Usoro Nkụzi Ihe A Gbasapụrụ
  • Ndị A Na-ezi Ihe ná Nzukọ Ọgbakọ
  • Ndị A Na-ezi Ihe ná Nzukọ Ndị Ka Ibu
  • Ịbụ Ndị Chineke Na-ezi Ihe Ịkụzi Ihe
  • Ndị E Ziri Ime Ihe Dị Jehova Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Jehova—Chineke nke Na-akụzi Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Mgbakọ Distrikti “Izi Ihe Chineke”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Nweta Abamuru nke Izi Ihe Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 8/1 p. 14-19

Ndị Jehova Na-akụziri Ihe Ruo Taa

“Jehova, enyewo m ire nke ndị mmụta.”—AỊSAỊA 50:4.

1, 2. (a) Maka gịnị ka Jehova kwadebere nwa akwụkwọ ya ọ kasị nwee mmasị n’ahụ ya, gịnịkwa ka ọ rụpụtara? (b) Olee otú Jisọs si kwupụta Isi Iyi nke nkụzi ya?

JEHOVA CHINEKE abụwo Onye Nkụzi eri mgbe ọ ghọrọ Nna. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị ka ụfọdụ n’ime ụmụ ya nupụsịrị isi, ọ kwadebere nwa akwụkwọ ya o nwere mmasị na ya karịsịa, Nwa Mbụ ya, maka ozi n’elu ụwa. (Ilu 8:30) Aịsaịa isi nke 50 kọwapụtara nwa akwụkwọ nke a n’ụzọ amụma dị ka onye kwuru, sị: “Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, enyewo m ire nke ndị mmụta, ka m wee mara iwere okwu kwagide onye dara mbà.” (Aịsaịa 50:4) N’ihi itinye nkụzi Nna ya n’ọrụ mgbe ọ nọ n’ụwa, Jisọs bụ isi iyi nke ntụrụndụ nye ndị nile ‘na-adọgbu onwe ha n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ.’—Matiu 11:28-30.

2 Jisọs rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube n’ime narị afọ mbụ. O meghere anya ndị ìsì na ọbụna kpọlite ndị nwụrụ anwụ, ma ndị ọgbọ ya maara ya karịsịa dị ka onye nkụzi. Ụmụazụ ya nakwa ndị mmegide ya kpọrọ ya nke ahụ. (Matiu 8:19; 9:11; 12:38; 19:16; Jọn 3:2) Ọ dịghị mgbe Jisọs naara otuto maka ihe ọ kụziri kama o ji obi umeala kweta, sị: “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke Onye zitere m.” “Dị ka Nna m ziri m, otú a ka m na-ekwu ihe ndị a.”—Jọn 7:16; 8:28; 12:49.

Ọmarịcha Mmekọrịta Onye Nkụzi na Nwa Akwụkwọ

3. Olee otú amụma Aịsaịa si egosi mmasị Jehova ná ndị ọ na-akụziri ihe?

3 Ezigbote onye nkụzi na-enwe mmasị onwe onye, site n’ezi akọ na uche, na nke ịhụnanya n’ụmụ akwụkwọ ya. Aịsaịa isi nke 50 na-ekpughe na Jehova Chineke nwere ụdị mmasị ahụ ná ndị ọ na-akụziri ihe. “Ọ na-akpọte ntị m kwa ụtụtụ,” ka amụma ahụ na-arịba ama, “ọ na-akpọte ntị m ịnụ ihe dị ka ndị mmụta.” (Aịsaịa 50:4) Okwu e ji mee ihe n’ebe a na-enye echiche nke onye na-ezi ihe nke na-akpọte ụmụ akwụkwọ ya n’isi ụtụtụ iji zie ha ihe. N’ikwu okwu banyere ụzọ isi jiri amụma ahụ mee ihe, otu onye ọkà mmụta Bible kwuru, sị: “Echiche dị ya bụ, na Onye Mgbapụta ahụ ga-abụ . . . onye nọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, n’ụlọ akwụkwọ Chineke; nakwa onye ga-eru eru inye ndị ọzọ ozizi. . . . Mesaịa ahụ ga-eru eru n’ụzọ kasịnụ, site ná nkụzi Chineke, ịbụ onye ozizi nke ihe a kpọrọ mmadụ.”

4. Olee otú Jisọs si zaghachi ná nkụzi Nna ya?

4 N’ụzọ a tụrụ anya ya, ụmụ akwụkwọ na-azaghachi ná nkụzi onye ozizi ha. Olee otú Jisọs si zaghachi ná nkụzi Nna ya? Nzaghachi ya kwekọrọ n’ihe anyị na-agụ n’Aịsaịa 50:5: “Onyenwe anyị Jehova emegheworo m ntị m, ma Mụ onwe m enupụghị isi, alaghachighị m azụ.” Ee, Jisọs nụrụ ọkụ n’obi ịmụta ihe. Dị ka a na-ekwu ya, ntị ya ghere nnọọ oghe. Tụkwasị na nke ahụ, ọ dị njikere ime ihe ọ bụla Nna ya gwara ya mee. Ọ dịghị enupụ isi; kama nke ahụ, ọ sịrị: “Ka e mee ihe Gị onwe gị na-achọ, ọ bụghị ihe Mụ onwe m na-achọ.”—Luk 22:42.

5. (a) Gịnị na-egosi na Jisọs bu ụzọ mara ule nile ọ ga-enweta n’elu ụwa? (b) Olee otú e si mezuo amụma dị n’Aịsaịa 50:6?

5 Amụma ahụ na-egosi na Ọkpara ahụ maara ihe ga-esite n’ime uche Chineke pụta. E gosiri nke a site n’ihe onye mmụta ahụ kwuru: “Azụ m ka m nyere ndị oti ihe, ntị m abụọ ka m nyere ndị na-ekwopụ afụ ọnụ: ezopụghị m ihu m n’ọnọdụ ihere a na-etinye m na ọbụbụ ọnụ.” (Aịsaịa 50:6) Dị ka amụma ahụ na-egosi, e mesoro Jisọs n’ụzọ obi ọjọọ n’elu ụwa. “Ha bụsara Ya ọnụ mmiri n’ihu,” ka Matiu onyeozi dere. “Ụfọdụ wee pịa Ya ihe.” (Matiu 26:67) Nke a mere n’aka ndị ndú okpukpe n’abalị Ememe Ngabiga nke 33 O.A. N’ụbọchị na-eso ya Jisọs nyere ndị oti ihe azụ ya, ka ndị agha Rom na-eti ya ihe n’emeghị ebere tupu ịkwụwa ya n’elu osisi ka ọ nwụọ.—Jọn 19:1-3, 16-23.

6. Gịnị na-egosi na Jisọs atụfughị obi ike ya n’Onye Nkụzi ya, oleekwa ụzọ e si nyeghachi ụgwọ ọrụ maka obi ike ya?

6 Ọkpara ahụ, nke e bu ụzọ zie ihe nke ọma, adịghị mgbe ọ kwụsịrị inwe obi ike n’Onye Nkụzi ya. E gosiri nke a site n’ihe o kwuziri dị ka amụma ahụ na-egosi: “Onyenwe anyị Jehova na-enyere m aka; n’ihi nke a e tinyeghị m n’ọnọdụ ihere.” (Aịsaịa 50:7) Obi ike Jisọs n’enyemaka Onye Nkụzi ya bụ nke e nyeghachiri ụgwọ ọrụ n’ụba. Nna ya buliri ya elu, jiri ọkwá dị elu karịa nke ndị ohu nile ọzọ nke Chineke gọzie ya. (Ndị Filipaị 2:5-11) Ngọzi ndị dị ebube na-echekwara anyị ma ọ bụrụ na anyị ejiri nrubeisi rapagide ná nkụzi Jehova ma ghara ‘ịlaghachi azụ.’ Ka anyị lee ụzọ e siworo na-enye nkụzi ahụ ruo n’ụbọchị anyị.

Usoro Nkụzi Ihe A Gbasapụrụ

7. Olee otú Jehova siworo gaa n’ihu ná nkụzi ya n’ụwa?

7 Dị ka anyị kwuru na mbụ, Jehova jiri Onye Nnọchiteanya ya nke elu ala, Jisọs Kraịst, nye nkụzi Chineke n’ime narị afọ mbụ. (Jọn 16:27, 28) Jisọs nọgidere na-ezo aka n’Okwu Chineke dị ka ebe nkụzi ya sitere, na-esetịpụrụ ndị ọ kụziiri ihe ihe nlereanya. (Matiu 4:4, 7, 10; 21:13; 26:24, 31) E mesịa, e ji nkụzi Jehova gaa n’ihu n’elu ụwa site n’ozi nke ndị mmụta dị otú ahụ. Cheta na Jisọs nyere ha iwu, sị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Mgbe e mere ndị na-eso ụzọ, ndị a ghọrọ akụkụ nke ‘ezinụlọ Chineke, nzukọ nke Chineke dị ndụ.’ (1 Timoti 3:15) A chịkọtakwara ha n’ime ọgbakọ dị iche iche ebe Jehova nọ na-ezi ha ihe. (Ọrụ 14:23; 15:41; 16:5; 1 Ndị Kọrint 11:16) Nkụzi Chineke ọ̀ nọgidewo na-aga n’ihu otú ahụ ruo ụbọchị anyị?

8. Olee ụzọ Jisọs gosiri na a ga-esi duzie ọrụ nkwusa ahụ n’ụwa tupu ọgwụgwụ ahụ abịa?

8 N’ezie, ọ nọgidewo! Ụbọchị atọ tupu ọnwụ ya, Jisọs buru amụma na tupu ọgwụgwụ nke usoro ihe a, a ga-enwe oké ọrụ nkwusa. “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile,” ka o kwuru, “mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” Jisọs gara n’ihu ịkọwa ụzọ a ga-esi duzie usoro ihe omume nke a nke nkwusa na nkụzi zuru ụwa ọnụ. O kwuru banyere “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” nke ga-eje ozi dị ka ụzọ, ma ọ bụ ngwá ọrụ, iji nye ndị ohu Ya nri ime mmụọ. (Matiu 24:14, 45-47) Jehova Chineke ejiwo “ohu” a lekọta ọdịmma nile nke Alaeze n’ụwa nile.

9. Olee ndị mejupụtara ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche?

9 Taa, ihe fọdụrụnụ ná ndị nketa Alaeze ahụ mejupụtara ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche. Ndị a bụ ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị fọdụrụ n’elu ụwa n’etiti 144,000 ahụ, bụ́ “ihe dị n’ahụ nke Kraịst” nakwa ndị bụ akụkụ nke “mkpụrụ Abraham.” (Ndị Galetia 3:16, 29; Mkpughe 14:1-3) Olee otú ị pụrụ isi mata ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche? Karịsịa site n’ọrụ ha na-arụ na site ná nrapagidesi ike ha n’Okwu Chineke, bụ́ Bible.

10. Ngwá ọrụ dịgasị aṅaa ka òtù ohu ahụ ji akwalite nkụzi Jehova?

10 Jehova na-eji “ohu” a eme ihe dị ka ụzọ ya isi kụziere ndị mmadụ ihe taa. Ndị nke òtù ohu ahụ nakweere aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova na 1931. Eri mgbe ahụ ọtụtụ nde mmadụ esonyeworo ha ma nakwerekwa aha ahụ ma sonye n’ịkpọsa Alaeze Chineke. Magazin a, Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova, bụ ngwá ọrụ bụ́ isi “ohu” ahụ ji eme ihe n’ọrụ nkụzi ahụ. Otú ọ dị, a na-ejikwa mbipụta ndị ọzọ, gụnyere akwụkwọ ukwu, akwụkwọ nta, broshuọ, traktị, na magazin Teta!

11. Ụlọ akwụkwọ dịgasị aṅaa ka “ohu” ahụ kwadoworo, olee nzube nke nke ọ bụla n’ụlọ akwụkwọ ndị a na-emezu?

11 Ọzọkwa, “ohu” ahụ na-akwado ụlọ akwụkwọ dị iche iche. Ndị a gụnyere Watchtower Bible School of Gilead, nke bụ́ usoro ọmụmụ akwụkwọ ọnwa ise nke na-akwadebe ndị ozi bụ́ ụmụ okoro na agbọghọ maka ije ozi ala ọzọ n’ofesi, na usoro ọmụmụ akwụkwọ ọnwa abụọ nke Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, nke na-azụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-alụbeghị nwunye maka ọrụ ọchịchị Chineke ndị pụrụ iche. E nwekwara Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze, ebe a na-enye ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nke ndị Kraịst ntụziaka site n’oge ruo n’oge n’ibu ọrụ ha nile n’ọgbakọ, na Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ, nke na-akwadebe ndị nkwusa ozi ọma oge nile ịghọ ndị dị irè karị n’ọrụ nkwusa ha.

12. Olee akụkụ usoro nkụzi ihe ahụ na-adị kwa izu?

12 Akụkụ ọzọ nke usoro ihe omume nkụzi ahụ bụ nzukọ ise a na-enwe kwa izu n’ihe karịrị 75,500 ọgbakọ ndị Jehova gburugburu ụwa. Ị̀ na-erite uru n’ụzọ zuru ezu dị ka i nwere ike site ná nzukọ ndị a? Site n’ige ntị ná ntụziaka a na-enye, ị̀ na-egosi na i kwenyere n’ezie na ị nọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, n’ụlọ akwụkwọ Chineke? Ọganihu ime mmụọ gị ọ̀ na-eme ka o doo ndị ọzọ anya na i nwere “ire nke ndị mmụta”?—Aịsaịa 50:4; 1 Timoti 4:15, 16.

Ndị A Na-ezi Ihe ná Nzukọ Ọgbakọ

13. (a) Olee otu ụzọ dị mkpa Jehova si akụziri ndị mmadụ ihe taa? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gosi ekele anyị maka Ụlọ Nche?

13 Jehova na-ezi ndị ya ihe karịsịa site n’ọmụmụ Bible kwa izu, na-eji Ụlọ Nche eme ihe dị ka ihe enyemaka n’ịkụzi ihe. Ị̀ na-ele nzukọ a anya dị ka ebe Jehova pụrụ izi gị ihe? Ọ bụ ezie na Aịsaịa 50:4 dịịrị Jisọs n’ụzọ bụ́ isi, a pụkwara iji ya mee ihe maka ndị nile wepụtara onwe ha ịnara ndokwa Chineke iji nata “ire nke ndị mmụta.” Otu ụzọ ị pụrụ isi gosi na i ji Ụlọ Nche kpọrọ oké ihe bụ site n’ịgụ mbipụta nke ọ bụla ngwa ngwa o kwere omume mgbe ị natara ya. E mesịa, mgbe a na-amụ Ụlọ Nche ahụ n’ọgbakọ, ị pụrụ igosi obi ekele gị maka Jehova site n’ịnọ ya nakwa site n’ịdị nkwadebe ime nkwupụta ihu ọha nke olileanya gị.—Ndị Hibru 10:23.

14. (a) N’ihi gịnị ka ịza ajụjụ ná nzukọ ji bụrụ nnukwu ihe ùgwù? (b) Ụdị azịza dịgasị aṅaa nke ụmụaka na-agba ume karịsịa?

14 Ị̀ na-aghọta na site n’azịza gị ná nzukọ, ị pụrụ inwe òkè n’oké usoro nkụzi ihe nke Jehova? Ajụjụ ọ bụla adịghị ya, ịza ajụjụ ná nzukọ bụ otu ụzọ dị mkpa anyị pụrụ isi kpasuo n’ime ibe anyị “ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Ụmụaka hà pụkwara inwe òkè n’usoro nkụzi ihe nke a? Ee, ha pụrụ. Azịza ndị sitere n’obi nke ndị na-eto eto na-agbakarị ndị toro eto ume. N’oge ụfọdụ, ndị ọhụrụ ná nzukọ anyị abụwo ndị azịza ụmụaka kpaliri inwekwu mmasị dị omimi n’eziokwu Bible. Ụfọdụ ndị na-eto eto na-enwe àgwà nke ịgụpụta azịza ha kpọmkwem site na paragraf ahụ ma ọ bụ site n’ikwughachi ihe onye ka okenye na-atakwụnyere ha ná ntị. Otú ọ dị, ọ bụ nnukwu ihe agbamume mgbe azịza ha bụ ndị a kwadebere nke ọma. Ịza ajụjụ dị otú ahụ na-enye Onye Ozizi Kasị Ukwuu anyị na usoro ihe omume ya e buliri elu maka nkụzi nsọpụrụ n’ezie.—Aịsaịa 30:20, 21, NW.

15. Gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ime iji nyere ụmụaka aka ịza ajụjụ n’ụzọ dị irè karị?

15 Ọ bụ ihe ọṅụ ịhụ ụmụaka ka ha na-achọ ikere òkè n’ito Chineke anyị. Jisọs jiri nkwupụta nke otuto site n’ọnụ ụmụaka kpọrọ ihe. (Matiu 21:15, 16) Otu okenye bụ́ onye Kraịst na-asị: “Mgbe m bụ nwata, m chọrọ ịza ajụjụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Mgbe o nyeresịịrị m aka ịkwadebe azịza, nna m ga-achọ ka m mụghachi azịza ahụ ọ dịkarịa ala ugboro asaa.” Ma eleghị anya n’oge ọmụmụ Bible ezinụlọ unu, unu ndị nne na nna pụrụ inyere ụmụ unu aka ịkwadebe azịza n’okwu ndị nke ha na paragraf ndị unu họọrọ n’Ụlọ Nche. Nyere ha aka ịghọta oké ihe ùgwù ha nwere n’ikere òkè n’usoro nkụzi ihe nke Jehova.

16. Gịnị bụworo uru nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, oleekwa ndị pụrụ idenye aha n’ụlọ akwụkwọ ahụ?

16 Ma ndị nwere ihe ùgwù inye ihe ọmụma ahụ ma ndị na-ege ntị ná ntụziaka a na-enye kwesịkwara itinyesi uche ike ná nkụzi dị ná nzukọ ndị ọzọ nke ndị Kraịst. Ruo ihe karịrị 50 afọ ugbu a, Jehova ejiwo Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke a na-enwe kwa izu zụọ ọtụtụ nde ndị ikom na ndị inyom izi ozi Alaeze ahụ n’ụzọ ka dịrị irè. Ndị na-esonyeresi ọgbakọ ike pụrụ idenye aha, tinyere ndị ka malitere ọhụrụ ịbịa nzukọ, ọ bụrụhaala na ha na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị Kraịst.

17. (a) N’ihi gịnị karịsịa ka e ji guzobe Nzukọ Ihu Ọha? (b) Olee ihe ndị ọkà okwu ihu ọha kwesịrị iburu n’uche?

17 Akụkụ ọzọ dịteworo anya n’usoro ihe omume nkụzi ahụ bụ Nzukọ Ihu Ọha. Dị ka aha ya na-egosi, e hiwere nzukọ a karịsịa iji mee ka ndị na-abụghị Ndịàmà mata nkụzi ndị bụ́ isi nke Bible. N’ihi ya, ọ dị onye na-enye okwu ahụ mkpa inye ihe ọmụma ahụ ka o wee kwe ndị na-anụ ozi ahụ nke mbụ ya nghọta. Nke a pụtara ịkọwa okwu ndị dị ka “atụrụ ọzọ,” “ụmụnna,” na “ihe fọdụrụnụ,” okwu ndị na-abụghị Ndịàmà nwere ike ha agaghị aghọta. Ebe ọ bụ na ndị na-abịa Nzukọ Ihu Ọha nwere ike inwe nkwenkwe na ụzọ ndụ ndị megidere nnọọ Akwụkwọ Nsọ—ọ bụ ezie na a na-anakwere ha n’ọha mmadụ nke oge a—ọkà okwu kwesịrị ịdị akọ mgbe nile, ghara iji nkwenkwe ma ọ bụ ụzọ ndụ ndị ahụ mee ihe ọchị mgbe ọ bụla.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 9:19-23.

18. Olee nzukọ ọgbakọ ndị ọzọ a na-enwe kwa izu, oleekwa nzube ndị ha na-emezu?

18 Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ bụ nzukọ ebe a na-amụ kwa izu akwụkwọ ndị a kwadebere n’okpuru ntụzi nke ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, ha na Bible. Akwụkwọ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! bụ nke a na-amụ ugbu a n’ọtụtụ ala. A haziri Nzukọ Ije Ozi ịkwadebe ndị Jehova ikere òkè zuru ezu ná nkwusa nke ozi ọma Alaeze ahụ na ime ndị na-eso ụzọ.—Matiu 28:19, 20; Mak 13:10.

Ndị A Na-ezi Ihe ná Nzukọ Ndị Ka Ibu

19. Olee mgbakọta ndị ka ibu “ohu” ahụ na-edokwa kwa afọ?

19 Ruo ihe karịrị otu narị afọ, ‘ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi’ ahaziwo mgbakọ dị iche iche maka nkụzi na agbamume pụrụ iche nye ezi ndị Kraịst. A na-enwe ugbu a atọ n’ime nzukọ ndị dị otú ahụ ka ibu kwa afọ. E nwere mgbakọ otu ụbọchị nke ìgwè ọgbakọ dị iche iche mejupụtara otu sekit na-aga. N’ime afọ, sekit nke ọ bụla na-enwekwa otu mgbakọ ụbọchị abụọ a na-akpọ mgbakọ sekit. Tinyere ndị ahụ, e nwere mgbakọta nke a na-akpọ mgbakọ distrikti, nke sekit ole na ole na-aga. N’afọ ụfọdụ a pụrụ inwe mgbakọ mba nile. Mgbakọta ukwu ndị a nke na-enwe ndị ọbịa bụ́ Ndịàmà sitere n’ọtụtụ mba na-ewusi okwukwe ndị Jehova ike n’ezie!—Tụlee Deuterọnọmi 16:16.

20. Gịnị ka a nọgideworo na-emesi ike ná mgbakọta ndị ka ibu nke Ndịàmà Jehova?

20 Na 1922, mgbe ihe dị ka 10,000 mmadụ zukọrọ na Cedar Point, Ohio, U.S.A., a kpaliri ndị bịaranụ site n’agbamume onye ọkà okwu bụ́: “Nke a bụ ụbọchị kachasị ụbọchị nile. Lee, Eze ahụ na-achị achị! Unu bụ ndị mgbasa ozi ya. Ya mere, kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ, Eze ahụ na alaeze ya.” Mgbakọ ukwu ndị dị otú ahụ anọgidewo na-emesi ọrụ nkwusa ahụ ike. Dị ka ihe atụ, ná mgbakọ mba nile na New York City na 1953, a mara ọkwa banyere nguzobe nke usoro ihe omume ọzụzụ ụlọ n’ụlọ n’ọgbakọ nile. Itinye ya n’ọrụ nwere mmetụta dị mma ná nkwusa Alaeze ahụ n’ọtụtụ ala.

Ịbụ Ndị Chineke Na-ezi Ihe Ịkụzi Ihe

21. Olee ihe ùgwù anyị ga-achọ ịnakwere, ghara ikwe ka nzube ya kwaa anyị?

21 N’ezie, Jehova nwere usoro nkụzi ihe magburu onwe ya n’elu ụwa taa! Ndị nile na-eji ya eme ihe pụrụ ịbụ ndị Chineke na-ezi ihe, ee, pụrụ iso ná ndị a na-enye “ire nke ndị mmụta.” Lee ihe ùgwù ọ bụ ịnọ, dị ka a pụrụ ikwu ya, n’ụlọ akwụkwọ Chineke! Ma, mgbe a na-anara ihe ùgwù a, ka nzube ya ghara ịkwa anyị ma ọlị. Jehova kụziiri Jisọs ihe ka o wee nwee ike ịkụziri ndị ọzọ, Jisọs kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ihe ka ha wee nwee ike ịrụ otu ọrụ ahụ ọ na-arụ kama ọ ga-abụ ọbụna n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu. N’otu aka ahụ, a na-azụ anyị n’oké usoro nkụzi ihe nke Jehova ná nzube nke ịkụziri ndị ọzọ ihe.—Jọn 6:45; 14:12; 2 Ndị Kọrint 5:20, 21; 6:1; 2 Timoti 2:2.

22. (a) Olee nsogbu Mosis na Jeremaịa nwere, ma olee otú e si dozie ya? (b) Obi ike dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe na Chineke ga-ahụ na a rụzuru ọrụ nkwusa Alaeze ahụ?

22 Ị̀ na-ekwu, dị ka Mosis, sị, “Ọ bụghị onye ọkà okwu ka m bụ,” ma ọ bụ dị ka Jeremaịa kwuru, “Amaghị m ikwu okwu”? Jehova ga-enyere gị aka dị ka o nyeere ha. “Mụ onwe m ga-anọnyere ọnụ gị,” ka ọ gwara Mosis. Ọ gwakwara Jeremaịa, sị: “Atụla egwu . . . , gị ka M nọnyeere.” (Ọpụpụ 4:10-12; Jeremaịa 1:6-8) Mgbe ndị ndú okpukpe chọrọ ikpuchi ndị na-eso ụzọ ya ọnụ, Jisọs sịrị: “Ọ bụrụ na ndị a ekpuchie ọnụ ha, nkume ga-eti mkpu.” (Luk 19:40) Ma ọ dịghị mkpa ka nkume tie mkpu n’oge ahụ, ọ dịghịkwa ha mkpa ugbu a n’ihi na Jehova na-eji ire nke ndị mmụta ya ezi ozi Alaeze ya.

Ị̀ Pụrụ Ịza?

◻ Ọmarịcha Mmekọrịta nke Onye Nkụzi na nwa akwụkwọ dị aṅaa ka e gosipụtara n’Aịsaịa isi 50?

◻ Olee otú Jehova siworo gaa n’ihu n’usoro nkụzi ihe sara mbara?

◻ Olee ihe ụfọdụ e nwegasịrị n’usoro nkụzi ihe nke Jehova?

◻ Gịnị mere o ji bụrụ ihe ùgwù dị ebube ikere òkè n’usoro nkụzi ihe nke Jehova?

[Foto dị na peeji nke 16]

Azịza ndị sitere n’obi nke ụmụaka na-agbakarị ndị ka okenye ume

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya