Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 8/15 p. 8-11
  • Obi Abụọ Ndị A Na-enwe Banyere Jisọs Hà Ziri Ezi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Obi Abụọ Ndị A Na-enwe Banyere Jisọs Hà Ziri Ezi?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ E Si Kụnye Obi Abụọ Banyere Jisọs
  • Akaebe Ndị Na-ewepụ Obi Abụọ
  • Ihe Mere Ụfọdụ Ji Arụ Ụka Banyere Ọrụ Ebube Jisọs
  • Obi Abụọ Banyere Mbilite n’Ọnwụ Jisọs Hà Ziri Ezi?
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nwee Obi Abụọ Banyere Òkè Jisọs Ugbu A?
  • Ọrụ Ebube Jizọs—Gịnị Ka Ị Pụrụ Ịmụta?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Uru Mbilite n’Ọnwụ Jizọs Baara Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Azịza nke Ajụjụ Ndị A Na-ajụ Banyere Jizọs Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Gịnị Ka Jizọs Mere Mgbe Ọ Nọ n’Ụwa?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 8/15 p. 8-11

Obi Abụọ Ndị A Na-enwe Banyere Jisọs Hà Ziri Ezi?

JISỌS nke Nazaret ọ̀ rụrụ ọrụ ebube n’ezie? À kpọlitere ya n’ọnwụ dị ka ndị na-eso ụzọ ya kpọsara? Ọ̀ dịrị ndụ ma ọlị? N’oge anyị, ọtụtụ ndị yiri ka ha enweghị ike iji obi ike zaa ajụjụ ndị dị otú ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ha na-enwe obi abụọ banyere Jisọs, obi abụọ bụkwa mmetụta nke ejighị ihe n’aka, n’amaghị ma ihe ọ bụ eziokwu ma ọ bụ bụrụ ihe mere eme. Ma mmetụta nile nke ejighị ihe n’aka banyere Jisọs hà ziri ezi? Ka anyị lee.

Ụzọ E Si Kụnye Obi Abụọ Banyere Jisọs

Ụfọdụ ndị ọkà mmụta okpukpe Germany ná ngwụsị narị afọ nke 19 na mmalite narị afọ nke 20 gosiri Jisọs dị ka “onye na-adịghị adị nke Chọọchị oge ochie.” Ha ịkatọ Jisọs dị ka onye dịrị adị n’akụkọ ihe mere eme dujere n’ịrụ ụka n’etiti ndị mmụta ná mmalite nke narị afọ nke a bụ́ nke rutere ọha mmadụ n’oge ahụ ma ka na-enwe mmetụta taa. Dị ka ihe atụ, otu ihe ọmụmụ e mere na nso nso a na Germany kpughere na pasent 3 nke ndị a gbara ajụjụ ọnụ kwenyere na ‘ọ dịghị mgbe Jisọs dịrị ndụ’ nakwa na “ndị ozi ahụ chepụtara ya.” Ee, mkpụrụ nke obi abụọ ndị ahụ a kụrụ ná mmalite nke narị afọ nke a banyere Jisọs na-achọta ọnọdụ dị mma n’obi ndị mmadụ ọbụna ugbu a.

N’ihi gịnị ka nkwubi okwu bụ́ na e “chepụtara” Jisọs ji bụrụ nnọọ nke na-ezighị ezi? Onye mmụta Bible bụ́ Wolfgang Trilling na-ekwu, sị: “E doziri ịrụ ụka ahụ banyere ma ọ̀ dị mgbe Jisọs dịrị ndụ, n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ ma ọ̀ bụ onye dị n’akụkọ ihe mere eme ka ọ bụ onye dị n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme. A zara ajụjụ ahụ n’ụzọ mmụta akwụkwọ, ma ọ dịghị ihe ọzọ n’ụdị na ndị ji ihe kpọrọ ihe adịkwaghị ahụ nsogbu ahụ dị ka ihe e chepụtara echepụta.” Ka o sina dị, ụfọdụ ka na-enwe obi abụọ na ọ dị mgbe Jisọs dịrị adị. N’ihi ya, ka anyị nyochaa otú mmadụ pụrụ isi nwapụta Jisọs ịbụ onye dịrị adị n’akụkọ ihe mere eme ma wepụkwa obi abụọ ndị ọzọ banyere ya.

Akaebe Ndị Na-ewepụ Obi Abụọ

Ogbugbu e gburu Jisọs n’ụzọ ihere dị ka onye omekome a na-asọ oyi na-enye “ihe ịrụ ụka kasị edo anya megide ndị na-ekwugide Jisọs ịbụ onye dịrị adị n’akụkọ ihe mere eme,” ka Trilling na-ekwu. N’ihi gịnị? N’ihi na ogbugbu ahụ “dọghachiri azụ, ọbụna gbochie, mgbasa nke okwukwe ọhụrụ ahụ n’etiti ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu.” (Tụlee 1 Ndị Kọrint 1:23.) Ọ bụrụ na ogbugbu nke Jisọs bụ́ Mesaịa bụụrụ ndị Juu na ndị Jentaịl oké mkparị, ọ ga-esi ike ịbụworị ihe ndị ozi ahụ chepụtara! Ọzọkwa, a gbara akaebe banyere ọnwụ Jisọs ịbụ ihe mere eme ọ bụghị nanị site n’Oziọma anọ ahụ kamakwa site n’aka onye Rom na-ede akwụkwọ bụ́ Tacitus nakwa Talmud ndị Juu.a

Ihe ndị ọzọ mere n’oge ndụ Jisọs bụkwa ndị e lere anya dị ka ihe àmà sitere n’ime nke ịbụ eziokwu nke Oziọma ndị ahụ, si otú a bụrụkwa ihe àmà nke ihe ha na-agwa anyị banyere ya. Dị ka ihe atụ, ụmụazụ Jisọs hà gaara echepụtaworị ọbịbịa ya site na Nazaret, ebe yiri ebe a na-amaghị ama? Ka ò yiri ka ha ga-echepụtaworị nrara nke Judas bụ́ enyi ya ọ tụkwasịrị obi raara ya nye? Ò yiri ihe ga-eme eme iche na ha ga-echepụtaworị akụkọ banyere Jisọs ịbụ onye ihe fọdụrụ ná ndị na-eso ụzọ ya gbahapụrụ n’ụzọ ịtụ ụjọ dị otú ahụ? Ọ bụ n’ezie ihe ezi izu na-adịghị na ya na ndị ahụ na-eso ụzọ ga-echepụtaworị ihe sara mbara ndị na-ebibi ihe otú a ma kpọsaa ha ebe nile! Tụkwasị, nkà izi ihe nke Jisọs ji mee ihe bụ nke pụrụ iche. E nweghị ihe ọ bụla dị n’ime akwụkwọ ọgụgụ narị afọ mbụ ndị Juu nke a pụrụ iji tụnyere ihe atụ ya dị iche iche. Olee onye a na-amaghị ama nke pụrụ ‘ichepụtaworị’ ihe magburu onwe ya ka Ozizi Elu Ugwu ahụ? Ịrụ ụka ndị a nile yiri ka ha na-akwado ikwesị ndabere nke Oziọma ndị ahụ dị ka akụkọ ndụ Jisọs.

E nwekwara ihe àmà sitere n’èzí maka Jisọs ịbụ onye dịrị adị n’akụkọ ihe mere eme. Oziọma anọ ahụ na-egosi ya dị ka onye biri n’ebe ụfọdụ a kpọtụrụ aha kpọmkwem, nke a kọwara n’ụzọ sara mbara n’ụzọ ziri ezi, n’akụkọ ihe mere eme. E chepụtaghị nnọọ ebe ndị dị ka Betlehem na Galili echepụta; ndị mmadụ na ìgwè ndị a ma ama, dị ka Pọntiọs Paịlet na ndị Farisii; tinyere omenala ndị Juu na ihe ndị ọzọ e ji mara ya. Ha ghọrọ akụkụ nke ụdị ndụ dị na narị afọ nke mbụ, ihe odide ndị na-adabereghị na Bible na nchọpụta ihe ndị e gwutere n’ala akwadowokwa ha.

Ya mere, e nwere ihe àmà na-eme ka e kwenye, ma n’ime ma n’èzí, na Jisọs bụ onye dịrị adị n’akụkọ ihe mere eme.

Otú ọ dị, ọtụtụ mmadụ na-enwe obi abụọ banyere ọrụ ebube ndị metụtara ya. N’ezie, dị ka nnyocha e hotara n’elu si dị, ọ bụ nanị ọnụ ọgụgụ dị ala nke ndị Germany na-eje chọọchị kwenyesiri ike na ọrụ ebube dị iche iche nke Jisọs na mbilite n’ọnwụ ya “mere eme n’ezie.” Obi abụọ banyere ọrụ ebube dị iche iche nke Jisọs na mbilite n’ọnwụ ya hà ziri ezi?

Ihe Mere Ụfọdụ Ji Arụ Ụka Banyere Ọrụ Ebube Jisọs

Matiu 9:18-36 na-akọ na Jisọs gwọrọ ndị ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube, kpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, chụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ. Professor Hugo Staudinger, bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme, na-ekwu, sị: “Ọ bụ nnọọ ihe a na-apụghị ikweta ekweta, bụrụkwa ihe na-apụghị ikwe omume n’ụzọ akụkọ ihe mere eme si ele ihe anya, na akụkọ ndị a pụrụ iche bụ ihe sitere ná nchepụta doro anya.” N’ihi gịnị? N’ihi na o yiri ka e dere Oziọma ndị ahụ kasị mee ochie mgbe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ji anya ha hụ ọrụ ebube ndị a ka dị ndụ! A na-ahụ ihe nkwado ọzọ n’ihi na, dị ka Staudinger gara n’ihu ikwu, ndị mmegide bụ́ ndị Juu “adịghị mgbe ọ bụla ha gọnarịrị na Jisọs rụrụ ọrụ ndị pụrụ iche.” N’ileghara ihe àmà ndị ọzọ nile anya ma na-adabere ná nkwubi okwu anyị nanị n’ihe àmà nke a sitere n’èzí, anyị na-ahụ na ọrụ ebube dị iche iche nke Jisọs ruru eru n’ezie ka anyị kwere ha.—2 Timoti 3:16.

Ọ bụ ezie na “ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị Germany kwetara na Jisọs gwọrọ ndị ọrịa,” ọtụtụ na-enwe obi abụọ banyere ike nọ n’azụ ọgwụgwọ ndị a. Dị ka ihe atụ, otu onye Germany bụ́ onye ọkà mmụta okpukpe a ma ama kwuru n’ihu ọha na ọgwụgwọ ndị Jisọs mere bụ ihe sitere n’ike e kwube o rebe nke na-arụ ọrụ n’ahụ ndị na-enwe nsogbu uche. Nke a ọ̀ bụ nkọwa ziri ezi?

Cheedị echiche. Mak 3:3-5 na-akọ na Jisọs gwọrọ aka kpọnwụrụ akpọnwụ nke otu nwoke. Ma aka kpọnwụrụ akpọnwụ ọ̀ bụ ihe sitere ná nsogbu uche? N’ezie ọ bụghị. N’ihi nke ahụ, a pụghị ikwu na ọgwụgwọ nke a bụ n’ihi ike e kwube o rebe. Ya mere, gịnị nyeere Jisọs aka ịrụ ọrụ ebube dị iche iche? Professor Staudinger na-ekweta, sị: “Ọ bụrụ na e nweghị iwu ọ bụla dị irè ma ọlị, ọ bụrụkwa na mmadụ adịghị agọnarị Chineke kpam kpam, mgbe ahụ n’ụzọ bụ isi mmadụ apụghị ịgụpụ ikwe omume na Chineke, onye ike ya karịrị nke mmadụ, nwere ike ime ihe ndị na-adịghị emekebe.” Ee, n’ezie, site n’enyemaka nke ‘ike nke Chineke,’ n’ụzọ nkịtị Jisọs gwọrọ ndị na-arịa ọrịa. Ya mere ọ dịghị ihe mere a ga-eji rụọ izi ezi nke ọrụ ebube ya dị iche iche ụka.—Luk 9:43; Matiu 12:28.

Dị ka akwụkwọ bụ́ The American Peoples Encyclopedia si tinye ya, ọ bụrụ na ọrụ ebube kasị ọrụ ebube nile—mbilite n’ọnwụ Jisọs—weere ọnọdụ, ọrụ ebube ndị ọzọ nile a kọrọ banyere ha n’Oziọma ahụ “dabatara n’ihe ndị pụrụ ikwe omume.” À kpọlitere Jisọs n’ọnwụ n’ezie?

Obi Abụọ Banyere Mbilite n’Ọnwụ Jisọs Hà Ziri Ezi?

Buru ụzọ tụlee otu ọnọdụ bụ ihe àmà siri ike nke na-akwado ịbụ eziokwu nke mbilite n’ọnwụ Jisọs—ili ya tọgbọrọ chakoo. Ndị ya na ha bikọrọ ndụ, ọbụna ndị mmegide ya, arụghị eziokwu ahụ bụ́ na a hụrụ na ili Jisọs tọgbọrọ chakoo ụka. (Matiu 28:11-15) A gaara ekpugheworị aghụghọ ọ bụla n’ụzọ dị mfe! Akwụkwọ ahụ e hotara n’elu na-ekwubi n’ụzọ ziri ezi, sị: “Ọ dịbeghị nkọwa ọ bụla dị irè e nyere maka ili ahụ tọgbọrọ chakoo ma e wezụga ihe ahụ Bible kwuru, ‘Ọ nọghị n’ebe a; n’ihi na e mere ka o si n’ọnwụ bilie’ (Mat. 28:6).”

Ụfọdụ na-arụ ụka, na-asị na ọ bụ nanị ndị na-eso ụzọ Jisọs bụ ndị kpọsara ebe nile na ọ bụ Mesaịa ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie. Ọ bụ ha. Ma ọ̀ bụ na ịbụ eziokwu nke ozi ha agbakwasịghị ụkwụ n’ụzọ siri ike n’ihe mere eme n’ezie, karịsịa ọnwụ na mbilite n’ọnwụ nke Jisọs? N’ezie ọ gbakwasịrị. Pọl onyeozi maara banyere njikọ nke a mgbe o dere, sị: “Ma ọ bụrụ na e meghị ka Kraịst si n’ọnwụ bilie, ya mere ihe anyị na-ekwusa bụ ihe efu, okwukwe unu bụkwa ihe efu. Ọzọkwa, a na-ahụ na anyị bụ ndị àmà ụgha nke Chineke; n’ihi na anyị gbara àmà megide Chineke na O mere ka Kraịst ahụ si n’ọnwụ bilie.”—1 Ndị Kọrint 15:14, 15; tụlee Jọn 19:35; 21:24; Ndị Hibru 2:3.

Na narị afọ mbụ, e nwere ọtụtụ ndị a maara ndị ha bụ nke ọma ndị pụkwara ịgba akaebe banyere mpụta nke Jisọs mgbe ọnwụ ya gasịrị. Ndị ozi 12 ahụ na Pọl so ná ndị a, tinyere ihe karịrị 500 ndị ọzọ ji anya ha hụ ya.b (1 Ndị Kọrint 15:6) Burukwa n’uche ihe mere Mataịas ji ruo eru ịnọchi onyeozi ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi bụ́ Judas. Ọrụ Ndị Ozi 1:21-23 na-akọ na Mataịas pụrụ ịgba akaebe banyere mbilite n’ọnwụ Jisọs na ihe ndị ọzọ metụtara Ya ndị mere tupu mgbe ahụ. Ọ bụrụ na ndụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs bụrịị akụkọ e chepụtara echepụta kama ịbụ eziokwu, iru eru dị otú ahụ maka nhọpụta gaara abụ n’ezie ihe na-enweghị isi ma ọlị.

N’ihi na ọtụtụ ndị ji anya ha hụ ya na narị afọ mbụ pụrụ ịgba akaebe nke ndụ, ọrụ ebube, ọnwụ, na mbilite n’ọnwụ nke Jisọs, Iso Ụzọ Kraịst gbasatụrụ ngwa ngwa n’Alaeze Ukwu Rom nile, n’agbanyeghị ihe mgbochi ndị a kpọtụrụ aha n’elu. Ụmụazụ ya dị njikere ịtachi obi n’ihe isi ike, mkpagbu, na ọbụna ọnwụ iji kpọsaa n’ebe nile mbilite n’ọnwụ na eziokwu bụ isi ndị sitere na ya. Eziokwu dị aṅaa? Na mbilite n’ọnwụ ya kwere omume nanị site n’ike nke Chineke. N’ihi gịnịkwa ka Jehova Chineke jiwororịị kpọlite Jisọs n’ọnwụ? Azịza nye ajụjụ ahụ na-egosi onye Jisọs ahụ dịrị adị n’akụkọ ihe mere eme bụ.

N’ụbọchị Pentikọst, Pita onyeozi gwara ndị Juu ahụ nọ ná mgbagwoju anya hoo haa, sị: “Jisọs nke a ka Chineke mere ka O si n’ọnwụ bilie, nke anyị onwe anyị nile bụ ndị àmà ya. Ya mere, ebe e weliri Ya elu site n’aka nri Chineke, ebe Ọ natakwara n’aka Nna Ya nkwa ahụ, bụ́ Mmụọ Nsọ, Ọ wụsara nke a, nke unu onwe unu na-ahụ na-anụkwa. N’ihi na Devid arịgoghị n’eluigwe: ma ya onwe ya sị, Onyenwe anyị sịrị Onyenwe m, Nọdụ ala n’aka nri m, ruo mgbe M ga-edo ndị iro Gị ka ihe mgbakwasị nke ụkwụ Gị abụọ. Ya mere ka ụlọ Israel nile mazuo, na Chineke mere Ya ka Ọ bụrụ Onyenwe anyị na Kraịst anyị, bụ́ Jisọs ahụ Onye unu onwe unu kpọgidere [n’elu osisi ịta ahụhụ, NW].” (Ọrụ 2:32-36) Ee, Jehova Chineke mere Jisọs nke Nazaret “Onyenwe anyị na Kraịst anyị.” Obi abụọ nile banyere òkè ya n’akụkụ nke a nke nzube Chineke hà ziri ezi?

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nwee Obi Abụọ Banyere Òkè Jisọs Ugbu A?

Olee otú a pụrụ isi wepụsịa obi abụọ nile banyere onye Jisọs bụ na òkè ya? Site n’eziokwu ahụ bụ na ọ bụ ezi onye amụma n’ụzọ doro anya. O buru amụma banyere agha dị iche iche, ụnwụ nri, ala ọma jijiji, mpụ, na enweghị ịhụnanya nke anyị na-ahụ taa. Tụkwasị, o buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:3-14) Mmezu nke amụma ndị a na-egosi na Jisọs bụ Kraịst ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie, nke na-achị achị n’ụzọ a na-adịghị ahụ anya ‘n’etiti ndị iro ya,’ ọ ga-ewetakwa ụwa ọhụrụ Chineke n’isi nso.—Abụ Ọma 110:1, 2; Daniel 2:44; Mkpughe 21:1-5.

Ugbu a dị ka ọ na-adịtụbeghị mbụ, ihe a kpọrọ mmadụ nọ n’oké mkpa nke Onye Nzọpụta nwere amamihe karịrị nke mmadụ. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nwee obi abụọ na Jisọs bụ onye ahụ a họọrọ n’ụzọ ziri ezi ịzọpụta ihe a kpọrọ mmadụ? Jọn, onye ji anya ya hụ ọrụ ebube ndị ahụ na-atụ n’anya na mbilite n’ọnwụ Jisọs, kwuru, sị: “Anyị onwe anyị ekiriwokwa, anyị na-agbakwa àmà, na Nna anyị ezitewo Ọkpara Ya ka Ọ bụrụ Onye nzọpụta nke ụwa.” (1 Jọn 4:14; tụlee Jọn 4:42.) Dị nnọọ ka anyị na-enweghị ezi ihe ọ bụla mere anyị ga-eji nwee obi abụọ banyere ịdị adị Jisọs, ọrụ ebube, ọnwụ, na mbilite n’ọnwụ ya, anyị enweghị ihe ọ bụla mere anyị ga-eji nwee obi abụọ na Jehova Chineke emewo ka ọ nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze iwu kwadoro n’aka nri Ya. N’enweghị obi abụọ ọ bụla, Jisọs nke Nazaret bụ Eze nke Alaeze Chineke na “Onye nzọpụta nke ụwa.”—Matiu 6:10.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ nanị ụfọdụ ndị ọkà mmụta nakweere izo aka obi ọjọọ ndị e zoro n’ebe Jisọs nọ n’ime Talmud ahụ dị ka eziokwu. N’aka nke ọzọ, izo aka ndị Tacitus, Suetonius, Pliny nke Nta, na ma ọ dịghị ihe ọzọ otu nke Flavius Josephus zoro n’ebe Jisọs nọ, bụ ndị a nakweere n’ozuzu ha dị ka ihe àmà nke ịdị adị n’akụkọ ihe mere eme nke Jisọs.

b N’otu oge, Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie soro ndị na-eso ụzọ ya rie azụ, nke na-egosi na mpụta ya abụghị nanị ọhụụ, dị ka ụfọdụ na-azọrọ taa.—Luk 24:36-43.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya