Ọkpụkpọ Òkù Ịhụnanya Nye Ndị Ike Gwụrụ
“Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.”—MATIU 11:28.
1. Gịnị ka Jisọs hụrụ na Galili na njem nkwusa ya nke atọ?
NSO nso mmalite afọ 32 O.A., Jisọs nọ na njem ime nkwusa ya nke atọ n’ógbè Galili. O mere njem n’obodo na obodo nta dị iche iche, “na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ nile ha, na-ekwusakwa ozi ọma nke alaeze ahụ, na-agwọkwa ọrịa nile dị iche iche na nrịanrịa nile dị iche iche.” Ka ọ na-eme nke a, ọ hụrụ ìgwè mmadụ ma nwee “ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.”—Matiu 9:35, 36.
2. Olee otú Jisọs si nyere ndị mmadụ aka?
2 Otú ọ dị, Jisọs mere ihe karịrị nanị inwe ọmịiko maka ìgwè mmadụ ahụ. Mgbe o nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ntụziaka ikpegara “Onyenwe owuwe ihe ubi ahụ,” bụ́ Jehova Chineke ekpere, o zipụrụ ha inyere ndị mmadụ aka. (Matiu 9:38; 10:1) Mgbe ahụ o nyere ndị mmadụ ihe mmesi obi ike nke onwe ya banyere ụzọ isi nweta ezi ahụ efe na nkasi obi. Ọ kpọrọ ha òkù nke a na-ekpo obi ọkụ: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu.”—Matiu 11:28, 29.
3. N’ihi gịnị ka ọkpụkpọ òkù Jisọs jikwa bụrụ ihe na-adọrọ mmasị taa?
3 Taa anyị na-ebi n’oge mgbe ọtụtụ ndị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị e boworo ibu dị arọ. (Ndị Rom 8:22; 2 Timoti 3:1) Nye ụfọdụ, nanị inweta ihe e ji ebi ndụ na-ewekọrọ ihe dị ukwuu n’oge na ike ha nke na ha na-enwe ntakịrị fọdụrụ maka ezinụlọ ha, ndị enyi, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ. Ọtụtụ ndị nwere ibu arọ nke ọrịa siri ike, nrịanrịa, ịda mbà n’obi, na nsogbu ndị ọzọ nke anụ ahụ na uche. N’ihi nrụgide ya, ụfọdụ ndị na-anwa ịchọta ahụ efe site n’imikpu onwe ha ná nchụso nke ihe ụtọ, iri ihe oriri, ịṅụ ihe ọṅụṅụ, ọbụna n’iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Otú ọ dị, nanị ihe nke a na-eme bụ ịtụbanye ha n’ọnọdụ ọjọọ na-abịaghachi ọzọ, na-ewetara ha nsogbu na ihe nrụgide ndị ọzọ. (Ndị Rom 8:6) N’ụzọ doro anya, ọkpụkpọ òkù ịhụnanya nke Jisọs na-ada ụda na-adọrọ mmasị taa dị nnọọ ka ọ dara laa azụ na mgbe ahụ.
4. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịtụle iji rite uru site n’ọkpụkpọ òkù ịhụnanya nke Jisọs?
4 Otú ọ dị, n’ọnọdụ dị aṅaa ka ndị mmadụ nọ na ya n’ụbọchị Jisọs, nke na ha yiri ‘ndị a na-esogbu na ndị a na-achụsa,’ na-akpali Jisọs inwere ha ọmịiko? Gịnị bụ ibu ndị ha na-aghaghị ibu, oleekwa otú ọkpụkpọ òkù Jisọs ga-esi nyere ha aka? Azịza nye ajụjụ ndị a pụrụ ịbụ oké ihe inyeaka nye anyị n’irite uru site n’ọkpụkpọ òkù ịhụnanya nke Jisọs nye ndị ike gwụrụ.
Ndị ‘Na-adọgbu Onwe Ha n’Ọrụ na Ndị E Boworo Ibu Dị Arọ’
5. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị na Matiu onyeozi nyere akụkọ ihe omume nke a n’ije ozi Jisọs?
5 Ọ bụ ihe na-akpali mmasị na ọ bụ nanị Matiu dekọrọ ihe omume nke a n’ije ozi Jisọs. Ebe ọ bụworo onye ọna ụtụ, Matiu, onye a makwa dị ka Livaị, maara nke ọma otu ibu ndị mmadụ na-ebu. (Matiu 9:9; Mak 2:14) Akwụkwọ bụ́ Daily Life in the Time of Jesus na-ekwu, sị: “Ụtụ isi ahụ [ndị Juu na-aghaghị] ịkwụ n’ụzọ ego na n’ụdị inye ihe dị arọ n’ụzọ gabigara ókè, ha dịkwa arọ ọbụna karị n’ihi na ụdị abụọ nke ịtụ ụtụ isi na-agakọtara ha ọnụ, ụtụ isi ndị ọchịchị na ụtụ isi okpukpe; ọ dịghịkwa nke n’ime ha dị mfe.”
6. (a) Gịnị bụ usoro ịtụ ụtụ isi e ji na-eme ihe n’oge Jisọs? (b) N’ihi gịnị ka ndị ọna ụtụ ji nwee aha ọjọọ dị otú ahụ? (ch) Banyere gịnị ka Pọl hụrụ mkpa ọ dị ichetara ndị Kraịst ibe ya?
6 Ihe mere ka ihe a nile bụrụ ibu arọ n’ụzọ pụrụ iche bụ usoro ụtụ isi n’oge ahụ. Ndị ọchịchị Rom nyegasịrị ndị kasị kwee ọnụ n’ógbè ahụ ikike ịnakọta ụtụ isi. N’aka nke ha, ha na-ewe ndị mmadụ n’ọrụ n’ógbè ndị dị n’ime obodo ilekọta kpọmkwem ọrụ ịnakọta ụtụ isi. Onye ọ bụla nọ n’usoro ahụ chere na o ziri nnọọ ezi ịtụkwasị ihe n’uru ma ọ bụ òkè nke ya. Dị ka ihe atụ, Luk kọrọ na ọ dị “otu nwoke a na-akpọ Zakịọs; onye ahụ bụkwa onye isi ọna ụtụ, onye ahụ bụkwa ọgaranya.” (Luk 19:2) O doro anya na “onye isi ọna ụtụ” bụ́ Zakịọs na ndị nọ n’okpuru nduzi ya sitere ná nhụjuanya ndị mmadụ baa ọgaranya. Arụrụala na mmegbu nke usoro dị otú ahụ kpaliri mere ndị mmadụ ji ele ndị ọna ụtụ anya dị ka ndị ha na ndị mmehie na ndị akwụna nọ n’otu ọkwá, ikekwe nke ahụ kwesịkwara ekwesị n’ọnọdụ ka ukwuu. (Matiu 9:10; 21:31, 32; Mak 2:15; Luk 7:34) Ebe ọ bụ na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ibu a na-apụghị idi edi na-anyịgbu ndị mmadụ, ọ bụghị ihe ijuanya na Pọl onyeozi hụrụ mkpa ọ dị ichetara ndị Kraịst ibe ya ka ha ghara iji iwe nọrọ n’okpuru yoke ndị Rom kama ka ha ‘na-akwụghachi mmadụ nile ihe nile ha ji ha n’ụgwọ: tụọ ụtụ nye onye ọ bụla ha ji ụgwọ ụtụ; tụọ ụtụ ahịa nye onye ha ji ụgwọ ụtụ ahịa.’—Ndị Rom 13:7a; tụlee Luk 23:2.
7. Olee otú iwu ntaramahụhụ nke ndị Rom si tụkwasị ihe n’ibu ndị mmadụ?
7 Pọl chetakwaara ndị Kraịst ka ha ‘tụọ egwu onye ha ji ụgwọ egwu; sọpụrụ onye ha ji ụgwọ nsọpụrụ.’ (Ndị Rom 13:7b) A maara ndị Rom nke ọma n’ihi iwu ntaramahụhụ ha nke obi ọjọọ na nke siri ike. Iji mee ka ndị mmadụ na-erube isi, e jiri ihe otiti, ịpịa ụtarị, ịtụ mkpọrọ n’ọnọdụ ndị siri ike, na igbu mmadụ mee ihe ọtụtụ mgbe. (Luk 23:32, 33; Ọrụ 22:24, 25) E nyere ọbụna ndị ndú ndị Juu ikike inye ntaramahụhụ ndị dị otú ahụ ma ọ bụrụ na ha ahụ na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị. (Matiu 10:17; Ọrụ 5:40) N’ezie usoro dị otú ahụ bụ nke mmegbu dị ukwuu ma ọ bụrụ na ọ dịghị akpagbu akpagbu nye onye ọ bụla na-ebi n’okpuru ya.
8. Olee otú ndị ndú okpukpe si ebokwasị ndị mmadụ ibu arọ?
8 Otú ọ dị, ihe dị njọ karịa ụtụ isi ndị Rom na iwu ha bụ ibu ndị ndú okpukpe nke oge ahụ bokwasịrị ndị nkịtị. N’ezie, o yiri ka nke a ọ bụ nchegbu bụ́ isi nke Jisọs mgbe ọ kọwara ndị ahụ dị ka ndị ‘na-adọgbu onwe ha n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ.’ Jisọs sịrị na kama inye ndị ahụ a zọdara n’ala olileanya na nkasi obi, ndị ndú okpukpe “na-eke ibu dị arọ dịkwa ike obubu, tụkwasị ha n’ubu mmadụ; ma ha onwe ha achọghị iji otu mkpịsị aka ha wezụga ha.” (Matiu 23:4; Luk 11:46) Mmadụ apụghị ịghara ịrịba ama n’Oziọma ndị ahụ ngosipụta doro anya nke ndị ndú okpukpe ahụ—karịsịa ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii—dị ka òtù ndị mpako, ndị obi tara mmiri, na ndị ihu abụọ. Ha na-eleda ndị nkịtị anya dị ka ndị na-amụghị akwụkwọ na ndị na-adịghị ọcha, ha sọkwara ndị ala ọzọ bi n’etiti ha oyi. Otu nkọwa e nyere banyere àgwà ha na-ekwu, sị: “Onye bokwasịrị ịnyịnya ibu gabigara ókè n’ụbọchị ndị a bụ onye iwu ji. Gịnị banyere onye bokwasịrị ‘ndị ala’ na-enweghị ọzụzụ okpukpe ọ bụla 613 iwu; mgbe ahụkwa, n’emeghị ihe ọ bụla iji nyere ha aka, mara ha ikpe dị ka ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke?” Otú ọ dị, nke bụ ibu n’ezie abụghị Iwu Mosis kama ọ bụ nnukwu ọdịnala a tụkwasịrị ndị ahụ.
Ihe Na-akpata Ihe Isi Ike n’Ezie
9. Olee otú ọnọdụ ndị dị n’etiti ndị mmadụ n’oge Jisọs si dị ma a tụnyere ya ndị dị n’ụbọchị Eze Solomọn?
9 Mgbe ụfọdụ ibu ihe onwunwe dị n’ubu ndị mmadụ bụ nke dị arọ, nke mere na ịda ogbenye gbasapụrụ agbasapụ. Ọ bụ iwu na ndị Israel ga-atụ ụtụ isi ezi uche dị na ya, bụ́ ndị Iwu Mosis setịpụrụ. E mesịa n’oge ọchịchị Solomọn, ndị ala ahụ hụrụ maka ọrụ ndị dara oké ọnụ ndị mba ahụ ji dị ka iwu ụlọ nsọ ahụ na nnukwu ihe owuwu ndị ọzọ. (1 Ndị Eze 7:1-8; 9:17-19) Otú ọ dị, Bible na-agwa anyị na ndị ahụ “na-eri ihe, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-aṅụrịkwa ọṅụ. . . . Juda na Israel wee biri ná ntụkwasị obi, nwoke ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya, site na Dan wee ruo na Bịasheba, ụbọchị nile nke Solomọn.” (1 Ndị Eze 4:20, 25) Gịnị kpatara ọdịiche ahụ?
10. Gịnị kpatara ọnọdụ ndị Israel nọ n’ime ya na narị afọ mbụ?
10 Ruo oge nile mba ahụ guzo kwem maka ezi ofufe, ha nwetara ihu ọma Jehova ma nweta ngọzi nke ịnọ ná ntụkwasị obi na ụba ihe onwunwe n’agbanyeghị oké mmefu ego nke mba ahụ. Otú ọ dị, Jehova dọrọ aka ná ntị na ọ bụrụ na ha ‘esi n’iso ya laghachi ma ọlị, wee ghara idebe ihe nile o nyere n’iwu,’ ha ga-ata ahụhụ ọnọdụ dị njọ. N’ezie, “Israel ga-aghọkwa ilu na ihe àkụ̀kụ̀ n’etiti ndị ọzọ nile.” (1 Ndị Eze 9:6, 7) Ihe mechara dịrị nnọọ otú ahụ. Israel batara n’okpuru ọchịchị ndị mba ọzọ, e wetukwara alaeze ahụ dịbu ebube ịghọ nanị ógbè ndị mba ọzọ na-achị. Lee nnọọ oké ụgwọ a kwụrụ maka ileghara ibu ọrụ ime mmụọ ha anya!
11. N’ihi gịnị ka Jisọs ji chee na “a na-esogbu” ndị mmadụ, “na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha”?
11 Ihe a nile na-enyere anyị aka ịghọta ihe mere Jisọs ji nwee mmetụta na “a na-esogbu” ndị ahụ ọ hụrụ, “na-achụsakwa” ha. Ndị a bụ ndị Israel, ndị Jehova, ndị na-anwa n’ozuzu ha ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’iwu Chineke ma na-efe ofufe ha n’ụzọ a na-anakwere. Otú o sina dị, e rigburu ma zọdaa ha ọ bụghị nanị site n’aka ndị ike ọchịchị na nke azụmahịa kamakwa site n’aka ndị ndú okpukpe si n’ezi ofufe dapụ nọ n’etiti ha. Ha “dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha” n’ihi na ha enweghị onye na-elekọta ha ma ọ bụ onye ga-ekpechitere ha. Enyemaka dị ha mkpa ịnagide ihe isi ike ndị na-eme eme na-ezie. Lee nnọọ otú ọkpụkpọ òkù ịhụnanya nke Jisọs si bụrụ ihe bịara n’ezi oge!
Ọkpụkpọ Òkù Jisọs Taa
12. Nrụgide ndị dị aṅaa ka ndị ohu Chineke na ndị ọzọ nwere obi eziokwu na-enwe mmetụta ha taa?
12 N’ọtụtụ ụzọ ihe dị otú ahụ taa. Ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị na-anwa ibi ndụ n’ụzọ eziokwu na-ahụ nrụgide na ihe ndị usoro ihe nke a rụrụ arụ na-achọ n’aka mmadụ dị ka ihe ndị siri ike ịnagide. Ọbụna ndị rarawooro ndụ ha nye Jehova abụghị ndị e kpuchiri pụọ n’ikike mmerụ. Akụkọ dị iche iche na-egosi na ụfọdụ n’ime ndị ohu Jehova na-ahụ ya dị ka ihe na-esiwanye ike imezu ibu ọrụ ha nile, ọ bụ ezie na ha chọrọ ime otú ahụ. Ha na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị ibu na-anyịgbu, ndị ike gwụrụ. Ọbụna ụfọdụ na-eche na ọ ga-abụ ihe na-enye ahụ efe ma ọ bụrụ na ha pụrụ ichefu ihe nile ma gaa n’ebe a na-apụghị ịhụ ha, ka ha wee nwee ike ịchịkọta onwe ha. Ì chewo otú ahụ? Ọ̀ dị onye dị gị nso ị maara nọ n’ọnọdụ ahụ? Ee, ọkpụkpọ òkù na-ekpo obi ọkụ nke Jisọs pụtara ihe dị ukwuu nye anyị taa.
13. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Jisọs pụrụ inyere anyị aka ịchọta ahụ efe na izu ike?
13 Tupu Jisọs akpọọ òkù ịhụnanya ya, o kwuru, sị: “Nna m raara ihe nile nye m n’aka: ọ dịghịkwa onye ọ bụla mazuru Ọkpara ahụ, ma ọ́ bụghị Nna Ya; ọ dịghịkwa onye mazuru Nna ahụ, ma ọ́ bụghị Ọkpara Ya, na onye ọ bụla Ọkpara na-ezube ikpughe Ya nye ya.” (Matiu 11:27) N’ihi mmekọrịta nke a chiri anya dị n’etiti Jisọs na Nna ya, e mere ka obi sie anyị ike na site n’ịnakwere òkù ịhụnanya nke a nke Jisọs na ịghọ ndị na-eso ụzọ ya, anyị pụrụ isoro Jehova, “Chineke nke nkasi obi nile,” banye ná mmekọrịta chiri anya nke onwe onye. (2 Ndị Kọrint 1:3; tụlee Jọn 14:6.) Tụkwasị, ebe ‘a rarawooro ihe nile nye n’aka ya,’ nanị Jisọs Kraịst nwere ike na ikike ime ka ibu anyị dị mfe. Olee ndị nke ọ bụ? Ndị ahụ usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị, azụmahịa, na okpukpe rụrụ arụ bokwasịworo, tinyere ibu nke mmehie na ezughị okè e ketara eketa bokwasịworo. Lee echiche na-agba ume na nke na-emesi obi ike nke ahụ bụ kpọmkwem site ná mmalite!
14. Site n’ụdị ndọgbu n’ọrụ dị aṅaa ka Jisọs pụrụ inye izu ike?
14 Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.” (Matiu 11:28) N’ezie Jisọs adịghị ekwugide ịrụsi ọrụ ike, n’ihi na ọtụtụ mgbe o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ijisi ike n’ọrụ ha ji n’aka. (Luk 13:24) Ma ‘ịdọgbu n’ọrụ’ pụtara ọrụ dị ogologo na nke na-agwụ ike, ọtụtụ mgbe n’enweghị ihe bara uru si n’ime ya pụta. ‘Ịbụ onye e boro ibu dị arọ’ nwekwara echiche nke ịbụ onye e bokwasịrị ibu karịrị ike e nwere. A pụrụ iji ọdịiche ya tụnyere nke ahụ dị n’etiti nwoke na-egwu ala iji nweta akụ̀ zoro ezo na onye na-egwu olulu n’ogige ịta ahụhụ. Ha na-arụ otu ụdị ọrụ ahụ siri ike. N’ebe otu nọ, e ji ọchịchọ na-arụ ọrụ ahụ, ma n’ebe onye nke ọzọ nọ, ọ bụ ọrụ na-agwụ ike nke na-adịghị agwụ agwụ. Ihe mere ka e nwee ọdịiche bụ nzube nke ọrụ ahụ, ma ọ bụ enweghị nzube.
15. (a) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị na-eche na anyị bu ibu dị arọ n’ubu anyị? (b) Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere isi iyi nke ibu anyị?
15 Ị̀ na-eche na ị ‘na-adọgbu onwe gị n’ọrụ, bụrụkwa onye e boro ibu dị arọ,’ na e nwere nnọọ ihe karịrị akarị i nwere iji oge na ike gị mee? Ibu ndị ị na-ebu hà yiri ihe dị arọ nke ukwuu nye gị? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụrụ inye aka ma ị jụọ onwe gị sị, ‘Gịnị ka m na-adọgburu onwe m n’ọrụ? Ụdị ibu dị aṅaa ka m na-ebu?’ Banyere nke a, otu onye na-enye nkọwa Bible kwuru n’ihe karịrị 80 afọ gara aga, sị: “Ọ bụrụ na anyị atụlee ibu dị iche iche nke ndụ ha dị n’ụdị abụọ; anyị pụrụ ịkpọ ndị a ndị mmadụ ji aka ya tụkwasị onwe ya na ndị a na-apụghị izere ezere: ndị omume anyị kpatara na ndị ọ na-abụghị omume anyị kpatara.” Mgbe ahụ o kwukwara: “Ọ ga-atụ ọtụtụ n’ime anyị n’anya, mgbe e mesịrị ezi nnyocha onwe onye, ịhụ na ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu nke ibu arọ anyị bụ ndị anyị ji aka anyị bokwasị onwe anyị.”
16. Ibu ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ iji ụzọ amamihe na-adịghị na ya bokwasị onwe anyị?
16 Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ibu ndị anyị pụrụ ibukwasị onwe anyị? Taa anyị na-ebi n’ime ụwa nke hụrụ ihe onwunwe na ihe ụtọ n’anya, na nke omume rụrụ arụ. (2 Timoti 3:1-5) Ọbụna ndị Kraịst raara onwe ha nye nọ mgbe nile n’okpuru nrụgide nke ikwekọ n’ụdị uwe oyiyi na ndụ nke ụwa. Jọn onyeozi dere banyere “agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na oké okwu nke ibi obi.” (1 Jọn 2:16) Ndị a bụ mmetụta dị ike ndị pụrụ imetụta anyị n’ụzọ dị mfe. A matawo na ụfọdụ ndị adịwo njikere ịbami n’ime iji ụgwọ iji nwetakwuo ihe ụtọ nke ụwa ma ọ bụ iji nọgide n’otu ụdị ịdị ndụ. Mgbe ahụ ha na-achọpụta na ha aghaghị itinye oge gabigara ókè n’ọrụ ahụ, ma ọ bụ na-arụ ọtụtụ ọrụ, iji nweta ego kwụọ ụgwọ ha ji.
17. Ọnọdụ dị aṅaa pụrụ ọbụna ime ya ka o sie ike karị iburu ibu ahụ, oleekwa otú a pụrụ isi dozie nke a?
17 Ọ bụ ezie na mmadụ pụrụ iche n’echiche na ọ bụghị ihe ọjọọ inwe ma ọ bụ ime ụfọdụ n’ime ihe ndị ọzọ nwere ma ọ bụ na-eme, ọ dị mkpa inyocha ma ọ̀ na-atụkwasị ihe n’ibu ya n’ụzọ na-adịghị mkpa. (1 Ndị Kọrint 10:23) Ebe ọ bụ na e nwere ókè mmadụ pụrụ ibudebe n’ibu, a ghaghị ịtụhapụ ihe iji buru ibu ọzọ. Ọtụtụ mgbe, ọ bụ ihe ndị dị mkpa maka ọdịmma ime mmụọ anyị—ọmụmụ Bible onwe onye, ije nzukọ, na ozi ubi—ka a na-ebu ụzọ atụhapụ. Ihe na-esi n’ime ya apụta bụ ntụfu nke ume ime mmụọ, bụ́ nke, n’aka nke ya, na-eme ọbụna ka o sie ike karị ibu ibu ahụ. Jisọs Kraịst dọrọ aka ná ntị megide ihe ize ndụ dị otú ahụ mgbe ọ sịrị: “Na-ezenụ onwe unu, ka a ghara iwere imebiga ajọ ihe ókè, na ịṅụbiga mmanya ókè, na nchegbu nke ndụ a, bogbuo obi unu ma eleghị anya, ụbọchị ahụ wee bịakwasị unu na mberede dị ka ọnyà.” (Luk 21:34, 35; Ndị Hibru 12:1) O siri ike ịmata ọnyà ma zere ya ma ọ bụrụ na ibu na-anyịgbu mmadụ, o nweekwa ike ọgwụgwụ.
Ahụ Efe na Izu Ike
18. Gịnị ka Jisọs kwuru na ya ga-enye ndị bịakwutere ya?
18 N’ihi ya, n’ụzọ ịhụnanya, Jisọs nyere ihe ngwọta ya: “Bịakwutenụ m, . . . Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.” (Matiu 11:28) Okwu ahụ bụ́ “zuru ike” n’ebe a na “izu ike” n’amaokwu nke 29 si n’okwu Grik nke kwekọrọ n’okwu nke nsụgharị Septuagint jiri mee ihe n’ịsụgharị okwu Hibru e nwere maka “ụbọchị izu ike” ma ọ bụ “idebe ụbọchị izu ike.” (Ọpụpụ 16:23) Ya mere, Jisọs ekweghị nkwa na ndị bịakwutere ya agaghị enwe ọrụ ọzọ, kama o kwere nkwa na ọ ga-eme ka ha zuru ike ka ha wee nwee ike ịdị njikere maka ọrụ ha na-aghaghị ịrụ n’ụzọ kwekọrọ ná nzube Chineke.
19. Olee otú mmadụ ga-esi ‘bịakwute Jisọs’?
19 Otú ọ dị, olee otú mmadụ ga-esi ‘bịakwute Jisọs’? Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ka o soo m n’azụ, ya jụ onwe ya, buliekwa [osisi ịta ahụhụ, NW] ya, na-esokwa m.” (Matiu 16:24) N’ihi ya, ịbịakwute Jisọs pụtara mmadụ ime ka uche nke ya dịrị n’okpuru nke Chineke na nke Kraịst, ịnakwere otu ụdị ibu ọrụ, na-eme otú ahụ mgbe nile. Ihe a nile ọ̀ na-achọ ihe gabigara ókè n’aka mmadụ? Ihe ọ ga-efu ọ̀ dị elu nke ukwuu? Ka anyị tụlee ihe Jisọs kwuru mgbe ọ kpọsịrị ndị ike gwụrụ òkù ịhụnanya ahụ.
Ị̀ Pụrụ Icheta?
◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị mmadụ n’ụbọchị Jisọs si bụrụ ndị e bokwasịrị ibu?
◻ Gịnị bụ n’ezie ihe kpatara ihe isi ike nke ndị ahụ?
◻ Olee otú anyị kwesịrị isi nyochaa onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị e bokwasịrị oké ibu?
◻ Ibu ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ iji ụzọ amamihe na-adịghị na ya bokwasị onwe anyị?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi nata izu ike ahụ Jisọs kwere nkwa ya?
[Foto dị na peeji nke 15]
Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ibu arọ ndị anyị pụrụ ibokwasị onwe anyị?
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 15]
Site n’ikike Bahamas Ministry of Tourism