Ndịàmà Bụ́ Ndị Kraịst Maka Ọkaaka Chineke
‘Unu kwusaa ịdị mma nile nke Onye ahụ Onye kpọpụtara unu n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè Ya dị ebube.’—1 PITA 2:9.
1. Àmà dị aṅaa dị irè ka a gbara banyere Jehova tupu oge ndị Kraịst?
TUPU oge ndị Kraịst, ogologo ahịrị nke ndị àmà ji nkwuwa okwu gbaa akaebe na Jehova bụ nanị ezi Chineke ahụ. (Ndị Hibru 11:4–12:1) N’ịbụ ndị siri ike n’okwukwe ha, ha ji atụghị egwu rube isi n’iwu nile nke Jehova ma jụ imebi okwukwe ha n’ihe banyere ofufe. Ha gbara àmà dị ike nye ọkaaka eluigwe na ala nke Jehova.—Abụ Ọma 18:21-23; 47:1, 2.
2. (a) Ònye bụ Onye àmà kasị ukwuu nke Jehova? (b) Ònye nọchiri mba Israel dị ka onye àmà Jehova? Olee otú anyị si mara?
2 Onye àmà ikpeazụ nke kasị ukwuu tupu ndị Kraịst bụ Jọn Baptist. (Matiu 11:11) O nwere ihe ùgwù nke ịkpọsa ọbịbịa nke Onye ahụ A Họpụtara, o mekwara ka a mara Jisọs dị ka Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. (Jọn 1:29-34) Jisọs bụ Onyeàmà kasị ukwuu nke Jehova, “Onye àmà ahụ Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke bụkwa Onye eziokwu.” (Mkpughe 3:14) N’ihi na Israel anụ ahụ jụrụ Jisọs, Jehova jụrụ ha ma họpụta mba ọhụrụ, Israel ime mmụọ nke Chineke, ka ọ bụrụ onye àmà ya. (Aịsaịa 42:8-12; Jọn 1:11, 12; Ndị Galetia 6:16) Pita hotara otu amụma banyere Israel ma gosi na o metụtara “Israel nke Chineke,” ọgbakọ ndị Kraịst, mgbe o kwuru, sị: “Unu onwe unu bụ ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara, ka unu wee kwusaa ịdị mma nile nke Onye ahụ Onye kpọpụtara unu n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè Ya dị ebube.”—1 Pita 2:9; Ọpụpụ 19:5, 6; Aịsaịa 43:21; 60:2.
3. Gịnị bụ ibu ọrụ bụ́ isi nke Israel nke Chineke na nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ?
3 Okwu Pita na-egosi na ibu ọrụ bụ́ isi nke Israel nke Chineke bụ ịgba àmà ihu ọha banyere ebube Jehova. N’ụbọchị anyị “oké ìgwè mmadụ” nke ndị àmà na-etokwa Chineke n’ihu ọha esonyeworo mba ime mmụọ a. Ha na-eji olu dara ụda na-eti mkpu ka mmadụ nile nụrụ, sị: “Nzọpụta dịrị Chineke anyị, Onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, dịkwara Nwa atụrụ ahụ.” (Mkpughe 7:9, 10; Aịsaịa 60:8-10) Olee otú Israel nke Chineke na ndị na-esonyere ya pụrụ isi gbazuo àmà ha? Site n’okwukwe na nrubeisi ha.
Ndị Àmà Ụgha
4. N’ihi gịnị ka ndị Juu nke oge Jisọs ji bụrụ ndị àmà ụgha?
4 Okwukwe na nrubeisi gụnyere ibi ndụ n’ụkpụrụ Chineke. A hụrụ ịdị mkpa nke a n’ihe Jisọs kwuru banyere ndị ndú okpukpe ndị Juu nke ụbọchị ya. Ndị a ‘nọdụrụ n’oche Mosis’ dị ka ndị nkụzi nke Iwu ahụ. Ọbụna ha zipụrụ ndị ozi ala ọzọ ịtọghata ndị na-ekweghị ekwe. Ma, Jisọs gwara ha, sị: “Unu na-ejegharị n’oké osimiri na ala kpọrọ nkụ gburugburu ka unu mee otu onye ka o soo ụzọ unu; ma mgbe ọ ghọrọ otú ahụ, unu na-eme ya okpukpu abụọ nwa [Gehena, NW] karịa onwe unu.” Ndị okpukpe a bụ ndị àmà ụgha—ndị mpako, ndị ihu abụọ, na ndị na-adịghị ahụ n’anya. (Matiu 23:1-12, 15) N’otu oge Jisọs gwara ụfọdụ ndị Juu, sị: “Unu onwe unu sitere na nna unu, bụ́ ekwensu, ọ bụkwa ihe na-agụ nna unu ka unu na-achọ ime.” Gịnị mere ọ ga-eji agwa ndị òtù nke mba Chineke họpụtara ụdị ihe ahụ? N’ihi na ha agaghị aṅa ntị n’okwu nke Onyeàmà kasị ukwuu nke Jehova.—Jọn 8:41, 44, 47.
5. Olee otú anyị si mara na Krisendọm agbawo àmà ụgha banyere Chineke?
5 N’ụzọ yiri nke ahụ, n’ọtụtụ narị afọ kemgbe oge Jisọs, ọtụtụ narị nde ndị nọ na Krisendọm azọrọwo ịbụ ndị na-eso ụzọ ya. Otú ọ dị, ha emebeghị uche Chineke, ya mere Jisọs amaghị ha. (Matiu 7:21-23; 1 Ndị Kọrint 13:1-3) Krisendọm ezipụwo ndị ozi ala ọzọ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ n’ime ha nwere obi ziri ezi. Ma, ha ziri ndị mmadụ ife chi Atọ n’Ime Otu nke na-akpọ ndị mmehie ọkụ n’ọkụ ala mmụọ, ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ha tọghatara na-egosikwa ntakịrị ihe àmà nke ịbụ ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, ala Africa bụ́ Rwanda abụworo ndị ozi ala ọzọ nke Roman Katọlik ubi na-amị mkpụrụ. Ma, ndị Katọlik nke Rwanda jiri obi ha dum sonye n’agha agbụrụ a lụrụ ná nso nso a n’ala ahụ. Mkpụrụ nke ubi ozi ala ọzọ ahụ na-egosi na ọ nataghị ezi ịgba àmà ndị Kraịst n’aka Krisendọm.—Matiu 7:15-20.
Ibi Ndụ n’Ụkpụrụ Chineke
6. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka àgwà ziri ezi si bụrụ akụkụ dị mkpa nke ịgba àmà?
6 Omume na-ezighị ezi nke ndị na-azọrọ na ha bụ ndị Kraịst na-eweta nkọcha ‘n’ụzọ nke eziokwu.’ (2 Pita 2:2) Ezi onye Kraịst na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke. Ọ dịghị ezu ohi, agha ụgha, egwu wayo, ma ọ bụ eme omume rụrụ arụ. (Ndị Rom 2:22) N’ezie ọ dịghị egbu onye agbata obi ya. Ndị di bụ́ ndị Kraịst na-enye ezinụlọ ha nlekọta ịhụnanya. Ndị bụ́ nwunye na-eji nkwanye ùgwù akwado nlekọta ahụ. Ndị nne na nna na-azụ ụmụ ha ma si otú a na-akwadebe ha ịbụ ndị Kraịst toruworo ogo mmadụ na-eji ihe akpọrọ ihe. (Ndị Efesọs 5:21–6:4) N’eziokwu, anyị nile bụ ndị na-ezughị okè ma na-ejehie. Ma ezi onye Kraịst na-akwanyere ụkpụrụ Bible ùgwù ma na-eme ezi mgbalị itinye ha n’ọrụ. Ndị ọzọ na-ahụ nke a, ọ na-agbakwa ezi àmà. Mgbe ụfọdụ, ndị megideburu eziokwu hụrụ ezi àgwà nke onye Kraịst ma bụrụ ndị a tọghatara.—1 Pita 2:12, 15; 3:1.
7. Ruo n’ókè ha aṅaa ka ọ dịruru mkpa na ndị Kraịst hụrụ ibe ha n’anya?
7 Jisọs gosiri akụkụ dị mkpa nke àgwà ndị Kraịst mgbe ọ sịrị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Ihe e jiri mara ụwa Setan bụ ‘ajọ omume nile, ajọ ọrụ, anyaukwu, obi ọjọọ, ekworo, ogbugbu mmadụ, esemokwu, aghụghọ, uche ọjọọ, ndị ntakwu, ndị na-ekwutọ mmadụ, ndị na-akpọ Chineke asị, ndị na-eme mmadụ ihe ihere, ndị mpako, ndị na-anya isi, ndị na-achọpụta ihe ọjọọ, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha.’ (Ndị Rom 1:29, 30) Na gburugburu ebe dị otú ahụ, nzukọ zuru ụwa ọnụ nke e ji ịhụnanya mara ga-abụ ihe àmà dị ike nke mmụọ Chineke nọ n’ọrụ—àmà dị irè. Ndịàmà Jehova mejupụtara ụdị nzukọ ahụ.—1 Pita 2:17.
Ndịàmà Bụ Ndị Na-amụ Bible
8, 9. (a) Olee otú e si gbaa onye ọbụ abụ ahụ ume site n’ọmụmụ ya nke Iwu Chineke na ịtụgharị uche na ya? (b) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ọmụmụ Bible na ntụgharị uche ga-esi wusie anyị ike ịnọgide na-agba àmà?
8 Iji mee nke ọma n’ịgba ezi àmà, onye Kraịst aghaghị ịmara ma hụ ụkpụrụ ezi omume nke Jehova n’anya ma kpọọ omume rụrụ arụ nke ụwa asị n’ezie. (Abụ Ọma 97:10) Ụwa na-arụgide arụgide n’ịkwalite echiche nke ya, mmụọ ya kwa pụrụ isi ike iguzogide. (Ndị Efesọs 2:1-3; 1 Jọn 2:15, 16) Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-enwe àgwà uche kwesịrị ekwesị? Ọmụmụ Bible nwere ezi nzube nke a na-emechi anya. Onye dere Abụ Ọma nke 119 kwughachiri ọtụtụ ugboro ịhụnanya o nwere n’ebe Iwu Jehova dị. Ọ gụrụ ya ma tụgharịa uche na ya mgbe nile, “ogologo ụbọchị nile.” (Abụ Ọma 119:92, 93, 97-105) N’ihi ya, ọ pụrụ ide, sị: “Okwu ụgha ka m kpọworo asị, m wee kpọọ ya ihe arụ; ma iwu Gị ka m hụworo n’anya.” Ọzọkwa, Ịhụnanya ya miri emi kpaliri ya ime ihe. Ọ na-asị: “Ugbo asaa n’ụbọchị ka m toworo Gị, n’ihi ikpe nile nke ezi omume Gị.”—Abụ Ọma 119:163, 164.
9 N’otu aka ahụ, ọmụmụ anyị na-amụchi Okwu Chineke anya na ịtụgharị uche na ya ga-emetụ obi anyị ma kpalie anyị ‘ito ya’—ịgba àmà banyere Jehova—mgbe mgbe, ọbụna “ugbo asaa n’ụbọchị.” (Ndị Rom 10:10) N’ikwekọ na nke a, onye dere abụ ọma nke mbụ na-asị na onye na-atụgharị uche mgbe nile n’okwu Jehova ‘ga-adị ka osisi a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara ná mmiri, nke na-amị mkpụrụ ya na mgbe ya, ọzọ, akwụkwọ ya adịghị akpọnwụ; ihe ọ bụla kwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.’ (Abụ Ọma 1:3) Pọl onyeozi gosikwara ike nke Okwu Chineke mgbe o dere, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.”—2 Timoti 3:16, 17.
10. Gịnị doro anya banyere ndị Jehova na mgbe ikpeazụ ndị a?
10 Uto dị ngwa n’ọnụ ọgụgụ nke ndị na-efe ezi ofufe na narị afọ nke 20 nke a na-egosi ngọzi nke Jehova. N’enweghị obi abụọ ọ bụla, dị ka otu òtù, ndị àmà a nke oge a maka ọkaaka Chineke azụlitewo ịhụnanya nke iwu Jehova n’obi ha. Dị ka onye ọbụ abụ ahụ, a na-akpali ha irubere iwu Ya isi na ịgba àmà “ehihie na abalị” n’ikwesị ntụkwasị obi banyere ebube Jehova.—Mkpughe 7:15.
Ọrụ Ebube Nile nke Jehova
11, 12. Gịnị ka ọrụ ebube ndị Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya rụrụ mezuru?
11 Na narị afọ mbụ, mmụọ nsọ nyere ndị àmà bụ́ ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ike ịrụ ọrụ ebube, bụ́ nke nyere ihe àmà siri ike na ịgba àmà ha bụ eziokwu. Mgbe Jọn Baptist nọ n’ụlọ mkpọrọ, o zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya ịjụ Jisọs: “Gị onwe gị bụ Onye na-abịa, ma ọ bụ na ànyị na-ele anya onye di iche?” Jisọs azaghị ee ma ọ bụ ee e. Kama nke ahụ, o kwuru, sị: “Gaanụ, kọọrọ Jọn ihe nile unu na-anụ na nke unu na-ahụ: ndị ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-eje ije, a na-eme ndị ekpenta ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ndi nwụrụ anwụ ka ha si n’ọnwụ bilie, a na-ezi ndị ogbenye ozi ọma. Ngọzi na-adịkwara onye ahụ, bụ́ onye ọ bụla nke na-agaghị ama n’ọnyà n’ahụ m.” (Matiu 11:3-6) Ọrụ ndị a dị ike bụ ihe àmà nye Jọn na Jisọs bụ n’ezie “Onye na-abịa.”—Ọrụ 2:22.
12 N’otu aka ahụ, ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs gwọrọ ndị ọrịa na ọbụna kpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Ọrụ 5:15, 16; 20:9-12) Ọrụ ebube ndị a dị ka àmà sitere n’aka Chineke n’onwe ya n’ihi ha. (Ndị Hibru 2:4) Ọrụ ndị dị otú ahụ gosikwara ike pụrụ ime ihe nile nke Jehova. Dị ka ihe atụ, ọ bụ eziokwu na Setan, “onye isi nke ụwa nke a,” nwere ihe ọ pụrụ iji akpata ọnwụ. (Jọn 14:30; Ndị Hibru 2:14) Ma mgbe Pita kpọlitere nwanyị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Dọkas n’ọnwụ, ọ pụrụ nanị ime ya site n’ike Jehova, ebe ọ bụ nanị Ya pụrụ iweghachi ndụ.—Abụ Ọma 16:10; 36:9; Ọrụ 2:25-27; 9:36-43.
13. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ọrụ ebube nke Bible ka si na-agba akaebe banyere ike Jehova? (b) Olee otú mmezu nke amụma si ekere òkè gbara ọkpụrụkpụ n’igosipụta Ịbụ Chineke nke Jehova?
13 Taa, ọrụ ebube ndị ahụ anaghịzi eme. E mezuwo nzube ha. (1 Ndị Kọrint 13:8) Ka o sina dị, anyị ka nwere ihe ndekọ ha n’ime Bible, nke ọtụtụ ndị hụrụ ihe merenụ gbara akaebe ya. Mgbe ndị Kraịst taa dọọrọ uche gaa n’ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme ndị a, ọrụ ndị ahụ ka na-agbakwa àmà dị irè nye ike Jehova. (1 Ndị Kọrint 15:3-6) Tụkwasị na nke a, laa azụ n’oge Aịsaịa, Jehova rụtụrụ aka n’amụma ziri ezi dị ka ihe àmà pụtara ìhè na Ọ bụ ezi Chineke ahụ. (Aịsaịa 46:8-11) A na-emezu ọtụtụ amụma e buru n’okpuru ike mmụọ nsọ Chineke taa—ọtụtụ n’ime ha n’ọgbakọ ndị Kraịst. (Aịsaịa 60:8-10; Daniel 12:6-12; Malakaị 3:17, 18; Matiu 24:9; Mkpughe 11:1-13) Tinyere ime ka ọ pụta ìhè na anyị na-ebi “na mgbe ikpeazụ,” mmezu nke amụma ndị a na-ewepụ Jehova n’ụta dị ka nanị ezi Chineke ahụ.—2 Timoti 3:1.
14. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka akụkọ ihe mere eme nke oge a nke Ndịàmà Jehova si bụrụ àmà dị ike na Jehova bụ Ọkaaka Onyenwe anyị?
14 N’ikpeazụ, Jehova ka na-eme oké ihe, ihe ndị dị ebube, maka ndị ya. Mmụọ Jehova na-eduzi ìhè ahụ na-aba ụba n’eziokwu Bible. (Abụ Ọma 86:10; Mkpughe 4:5, 6) Ịba ụba ndị pụtara ìhè a kọrọ gburugburu ụwa bụ ihe àmà na Jehova ‘na-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.’ (Aịsaịa 60:22) Mgbe mkpagbu dị ilu tiwapụrụ site ná mba gaa ná mba na mgbe ikpeazụ nile, ntachi obi sitere n’obi ike nke ndị Jehova ekwewo omume n’ihi nkwado na-agba ume nke mmụọ nsọ. (Abụ Ọma 18:1, 2, 17, 18; 2 Ndị Kọrint 1:8-10) Ee, akụkọ ihe mere eme nke oge a nke Ndịàmà Jehova bụ n’onwe ya àmà dị ike na Jehova bụ Ọkaaka Onyenwe anyị.—Zekaraịa 4:6.
A Ga-ekwusa Ozi Ọma Nke A
15. Àmà dị aṅaa gbasara agbasa ka ọgbakọ ndị Kraịst gaje ịgba?
15 Jehova họpụtara Israel dị ka onye àmà ya nye mba nile. (Aịsaịa 43:10) Otú ọ dị, nanị ụmụ Israel ole na ole ka Chineke nyere iwu ịga mee nkwusa gwa ndị na-abụghị ndị Israel, nke a na-abụkarịkwa iji kpọsaa ikpe Jehova. (Jeremaịa 1:5; Jona 1:1, 2) Ka o sina dị, amụma ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru na-egosi na Jehova ga-eche mba nile ihu n’ụzọ dị ukwuu otu ụbọchị, o mewokwa nke a site n’Israel ime mmụọ nke Chineke. (Aịsaịa 2:2-4; 62:2) Tupu ya arịgoro n’eluigwe, Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu, sị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” (Matiu 28:19) Ebe Jisọs tinyeworo uche ya ‘n’atụrụ furu efu nke ụlọ Israel,’ e zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya gaa ná “mba nile,” ọbụna “ebe ụwa sọtụrụ.” (Matiu 15:24; Ọrụ 1:8) Ihe nile a kpọrọ mmadụ ga-anụ àmà nke ndị Kraịst.
16. Ọrụ dị aṅaa ka ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ rụzuru, ruokwa ókè ha aṅaa?
16 Pọl gosiri na ọ ghọtara nke a nke ọma. Ka ọ na-erule afọ 61 O.A., ọ pụrụ ikwu na ozi ọma ahụ “na-amịjukwa mkpụrụ n’ụwa nile, na-abakwa ụba.” Ozi ọma ahụ abụghị nanị maka otu mba ma ọ bụ otu òtù, dị ka nke ndị ahụ ‘na-ekpere ndị mmụọ ozi.’ Kama nke ahụ, ọ bụ ihe “e kwusara n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe” n’ihu ọha. (Ndị Kọlọsi 1:6, 23; 2:13, 14, 16-18) N’ihi ya, Israel nke Chineke na narị afọ mbụ rụzuru ọrụ ya ‘ikwusa ịdị mma nile nke Onye ahụ Onye kpọpụtara ha n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè Ya dị ebube.’
17. Olee otú e siworo gaa n’ihu na-emezu Matiu 24:14 n’ụzọ dị ukwuu?
17 Ma, ọrụ nkwusa ahụ nke narị afọ mbụ bụ nanị ihe atụ nke ihe a ga-arụzu na mgbe ikpeazụ. N’ilepụ anya n’ihu karịsịa n’oge anyị, Jisọs kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14; Mak 13:10) È mezuwo amụma nke a? N’ezie, e mezuwo ya. Site ná mmalite dị nta na 1919, nkwusa ozi ọma ahụ abụrụwo ugbu a nke a gbasaworo ruo ihe karịrị 230 mba. A na-anụ àmà ahụ n’Ebe Ugwu na-ajụ oké oyi na n’ebe ndị na-ekpo oké ọkụ. A gazuwo kọntinent buru ibu, a na-achọpụtakwa àgwàetiti ndị dịmiri adịmi ka ndị bi na ha nwee ike ịnata àmà. Ọbụna n’etiti oké ọgba aghara, dị ka agha dị na Bosnia na Herzegovina, a nọgidere na-ekwusa ozi ọma ahụ. Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, àmà ahụ na-amị mkpụrụ “n’ụwa nile.” A na-akpọsa ozi ọma ahụ n’ihu ọha “n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.” Gịnị si na nke a pụta? Nke mbụ, a chịkọtawo ihe fọdụrụnụ n’Israel nke Chineke ‘site n’ebo, na asụsụ, na ndị, na mba nile ọ bụla.’ Nke abụọ, a malitere ịchịkọbata ọtụtụ nde nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ site “na mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile.” (Mkpughe 5:9; 7:9) Matiu 24:14 na-aga n’ihu ịbụ ihe e mezuru n’ụzọ dị ukwuu.
18. Gịnị bụ ụfọdụ ihe ndị a na-arụzu site ná nkwusa ozi ọma zuru ụwa ọnụ?
18 Nkwusa ozi ọma ahụ zuru ụwa ọnụ na-enye aka igosipụta na ọnụnọ Jisọs dị ka eze amalitewo. (Matiu 24:3) Ọzọkwa, ọ bụ ụzọ bụ́ isi a na-esi ewe ihe ubi nke “ihe a ga-ewe n’ubi nke ụwa,” ka ọ na-eduje ndị mmadụ na nanị ezi olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ Alaeze Jehova. (Mkpughe 14:15, 16) Ebe ọ bụ nanị ezi ndị Kraịst na-ekere òkè n’ikwusa ozi ọma ahụ, ọrụ a dị mkpa na-enye aka isetịpụ ezi ndị Kraịst iche n’ebe ndị ụgha nọ. (Malakaị 3:18) N’ụzọ dị otú a, ọ na-arụ ọrụ maka nzọpụta nke ndị ahụ na-eme nkwusa nakwa ndị na-anụ. (1 Timoti 4:16) Nke kasị mkpa, ikwusa ozi ọma ahụ na-ewetara Jehova Chineke otuto na nsọpụrụ, bụ́ onye nyere iwu ka e mee ya, onye na-akwado ndị na-eme ya, na onye na-eme ka ọ mịa mkpụrụ.—2 Ndị Kọrint 4:7.
19. Mkpebisi ike dị aṅaa ka a na-agba ndị Kraịst nile ume inwe ka ha na-abanye n’afọ ije ozi ọhụrụ?
19 Ka a sịkwa ihe mere e ji kpalie Pọl onyeozi ịsị: “Ahụhụ dịịrị m, a sị na ezisaghị m ozi ọma.” (1 Ndị Kọrint 9:16) Ndị Kraịst taa na-enwe mmetụta dị otú ahụ. Ọ bụ ihe ùgwù dị ebube na oké ibu ọrụ ịbụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ,” na-amụkwasị ìhè nke eziokwu ahụ n’ime ụwa nke a gbara ọchịchịrị. (1 Ndị Kọrint 3:9; Aịsaịa 60:2, 3) Ọrụ ahụ nke nwere mmalite dị nta na 1919 eruwo ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu ugbu a. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde ndị Kraịst ise na-agba àmà maka ọkaaka Chineke ka ha na-etinye ihe karịrị otu ijeri hour kwa afọ iji wetara ndị ọzọ ozi nzọpụta ahụ. Lee ihe ọṅụ ọ bụ ikere òkè n’ọrụ a nke ido aha Jehova nsọ! Ka anyị na-abanye n’afọ ije ozi 1996, ka anyị kpebisie ike ịghara ịkụda aka. Kama nke ahụ, anyị ga-aṅa ntị karịa mgbe ọ bụla ọzọ n’okwu Pọl gwara Timoti: “Kwusaa okwu Ya; tụkwasị uche n’ọrụ gị.” (2 Timoti 4:2) Ka anyị na-eme otú ahụ, anyị na-eji obi anyị nile na-ekpe ekpere na Jehova ga-aga n’ihu na-agọzi mgbalị anyị.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Ònye nọchiri Israel dị ka “onye àmà” Jehova nye mba nile?
◻ Olee otú àgwà ndị Kraịst na-esi etinye ihe n’ịgba àmà?
◻ N’ihi gịnị ka ọmụmụ Bible na ntụgharị uche n’ime ya ji dịrị Onyeàmà bụ́ onye Kraịst mkpa?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka akụkọ ihe mere eme nke oge a nke Ndịàmà Jehova si bụrụ ihe àmà na Jehova bụ ezi Chineke ahụ?
◻ Gịnị ka a na-arụzu site n’ikwusa ozi ọma ahụ?
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
N’abụtụghị nnọọ nke a kpaara ókè, ugbu a a na-ekwusa ozi ọma ahụ “n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe”