Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 10/1 p. 13-18
  • Ndị Nne na Nna na Ụmụ: Butenụ Chineke Ụzọ!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Nne na Nna na Ụmụ: Butenụ Chineke Ụzọ!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ibu Ọrụ Onye Kraịst
  • Ibu Ọrụ Bụ́ Isi
  • Inye Nkwado nke Dị Mkpa
  • Ndị Nne na Nna, Gịnị Ka Unu Na-ebute Ụzọ?
  • Ụmụ—Ònye Ka Unu Ga-eme Obi Ụtọ?
  • Ndị Nne na Nna, Gboonụ Mkpa Ezinụlọ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ndị Nne na Nna—Jirinụ Ịhụnanya Na-azụ Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ụmụ Anyị—ihe Nketa Dị Oké Ọnụ Ahịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 10/1 p. 13-18

Ndị Nne na Nna na Ụmụ: Butenụ Chineke Ụzọ!

“Tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu.”—EKLISIASTIS 12:13.

1. Ụdị egwu dị aṅaa ka ọ dị ndị nne na nna na ụmụ mkpa ịzụlite, gịnịkwa ka ọ ga-ewetara ha?

OTU amụma banyere Jisọs Kraịst kwuru na “ihe na-atọ ya ụtọ bụ egwu Jehova.” (Aịsaịa 11:3) Egwu ya n’ụzọ bụ́ isi bụ nsọpụrụ na ụjọ dị omimi nke Chineke, egwu nke ime ihe na-adịghị atọ Chineke ụtọ n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya. Ọ dị ndị nne na nna na ụmụ ha mkpa ịzụlite ụdị egwu Chineke ahụ yiri nke Kraịst, bụ́ nke ga-ewetara ha obi ụtọ dị ka o wetaara Jisọs. Ọ dị ha mkpa ibute Chineke ụzọ ná ndụ ha site n’irube isi n’ihe ndị o nyere n’iwu. Dị ka otu onye so dee Bible si kwuo ya, “nke a bụ ọrụ mmadụ nile.”—Eklisiastis 12:13.

2. Gịnị bụ iwu kasị mkpa e nyere n’Iwu ahụ, ole ndị ka e nyere ya n’ụzọ bụ́ isi?

2 Ihe kasị mkpa e nyere n’iwu nke Iwu ahụ, ya bụ, na anyị kwesịrị ‘iwere obi, mkpụrụ obi, na ike anyị nile, hụ Jehova n’anya,’ bụ nke e nyere ndị nne na nna n’ụzọ bụ́ isi. E gosiri nke a n’ihe Iwu ahụ gara n’ihu kwuo, sị: “Ị ga-ejisikwa ike izi ha [okwu ndị a banyere ịhụ Jehova n’anya] ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” (Deuterọnọmi 6:4-7; Mak 12:28-30) E si otú a nye ndị nne na nna iwu ibute Chineke ụzọ site n’ịhụ ya n’anya n’onwe ha nakwa site n’izi ụmụ ha imekwa otú ahụ.

Ibu Ọrụ Onye Kraịst

3. Olee otú Jisọs si gosi ịdị mkpa nke ilebara ụmụ anya?

3 Jisọs gosipụtara ịdị mkpa nke inye ọbụna ụmụntakịrị nlebara anya. N’otu oge mgbe ọ na-eru n’ọgwụgwụ nke ozi elu ala Jisọs, ndị mmadụ malitere ịkpọtara ya ụmụntakịrị ha. Dị ka ihe àmà na-egosi, n’ịbụ ndị kwenyere na Jisọs ji ọrụ n’aka nke ukwuu nke na ọ chọghị nsogbu, ndị na-eso ụzọ ya nwara ịkwụsị ndị ahụ. Ma Jisọs baara ndị na-eso ụzọ ya mba, sị: “Kwenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha.” Ọbụna Jisọs “kuru ha n’aka Ya,” si otú a na-egosi n’ụzọ na-emetụ n’ahụ ịdị mkpa nke ilebara ndị na-eto eto anya.—Luk 18:15-17; Mak 10:13-16.

4. Olee ndị e nyere iwu ‘ime mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ,’ gịnịkwa ka nke a ga-achọ ha n’aka ime?

4 Jisọs mekwara ka o doo anya na ndị na-eso ụzọ ya nwere ibu ọrụ nke izi ndị ọzọ ma e wezụga ụmụ ha ihe. Mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya gasịrị, Jisọs “mere ka ndị karịrị [narị mmadụ ise] n’etiti ụmụnna anyị hụ Ya anya n’otu mgbe”—tinyere ụfọdụ ndị nne na nna. (1 Ndị Kọrint 15:6) O doro anya na nke a mere n’otu ugwu dị na Galili ebe ndị ozi ya 11 zukọtakwara. N’ebe ahụ Jisọs gbara ha nile ume, sị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:16-20, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ọ dịghị onye Kraịst pụrụ izi ezi n’ileghara ihe e nyere n’iwu anya! Ka ndị nna na ndị nne wee rụzuo nke a, ọ chọrọ ha n’aka ilekọta ụmụ ha nakwa ikere òkè n’ọrụ nkwusa na nkụzi ihu ọha.

5. (a) Gịnị na-egosi na ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ozi ahụ, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ha nile, lụrụ nwunye, ikekwe nweekwa ụmụ? (b) Ndụmọdụ dị aṅaa ka ndị isi ezinụlọ kwesịrị iji kpọrọ ihe?

5 N’ụzọ dị ịrịba ama, ọbụna ndị ozi ahụ aghaghị ime ka ibu ọrụ ezinụlọ ha na ọrụ ime nkwusa nakwa ịzụ ìgwè atụrụ Chineke nwee ezi nhazi. (Jọn 21:1-3, 15-17; Ọrụ 1:8) Nke a bụ n’ihi na ihe ka ọtụtụ n’ime ha, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ha nile, lụrụ nwunye. N’ihi ya Pọl onyeozi kọwara, sị: “Ọ̀ ga-abụ na anyị enweghị ike ikuru nwunye, bụ́ nwanna nwanyị n’ime Kraịst, jegharịa, dị ka ndị ozi fọdụrụ na-emekwa, ha na ụmụnne Onyenwe anyị, na Sifas?” (1 Ndị Kọrint 9:5, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche; Matiu 8:14) Ụfọdụ ndị ozi pụkwara inweworị ụmụ. Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke oge gboo, dị ka Eusebius, sịrị na Pita nwere. Ndị nne na nna nile bụ́ ndị Kraịst oge gboo nwere mkpa ịṅa ntị na ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ ahụ bụ́: “Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha, ma nke kachasị ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.”—1 Timoti 5:8.

Ibu Ọrụ Bụ́ Isi

6. (a) Ihe ịma aka dị aṅaa ka ndị okenye bụ́ ndị Kraịst nwere ezinụlọ nwere? (b) Gịnị bụ ibu ọrụ bụ́ isi nke onye okenye?

6 Ndị okenye ndị Kraịst bụ́ ndị nwere ezinụlọ taa nọ n’ọnọdụ yiri nke ndị ozi. Ha aghaghị ime ka ibu ọrụ ha nke igbo mkpa ime mmụọ na nke anụ ahụ nke ezinụlọ ha na ọrụ ha nke ime nkwusa n’ihu ọha na ịzụ ìgwè atụrụ Chineke nwee nhazi. Ihe omume dị aṅaa kwesịrị ibute ụzọ? Ụlọ Nche nke February 1, 1965, sịrị: “Ọlu mbụ diri [nna] bu n’ebe ezi-na-ulo ya di, ma n’ezie, ọ pughi ije ozi nke-ọma ọ buru na o lekọtagh ọlu nka diri ya nke-ọma.”

7. Olee otú ndị nna bụ́ ndị Kraịst si ebute Chineke ụzọ?

7 Ya mere ndị bụ́ nna aghaghị ibute Chineke ụzọ site n’ịṅa ntị n’iwu ahụ bụ ‘ịzụpụta ụmụ ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.’ (Ndị Efesọs 6:4) A pụghị inyefe onye ọzọ ibu ọrụ ahụ, ọ bụ ezie na onye bụ́ nna pụkwara inwe ọrụ ilekọta ihe a na-eme n’ọgbakọ ndị Kraịst. Olee otú ndị dị otú ahụ bụ́ nna pụrụ isi elekọta ibu ọrụ ha—igbo mkpa ndị òtù ezinụlọ ha n’ụzọ anụ ahụ, n’ụzọ ime mmụọ, na n’ụzọ mmetụta uche—nakwa n’otu oge ahụ, na-eduzi ma na-enye nlekọta n’ọgbakọ?

Inye Nkwado nke Dị Mkpa

8. Olee otú nwunye onye okenye pụrụ isi kwadoo ya?

8 N’ụzọ doro anya, ndị okenye nwere ibu ọrụ ezinụlọ pụrụ irite uru site ná nkwado. Ụlọ Nche ahụ e hotara n’elu kwuru na onye Kraịst bụ́ nwunye pụrụ ịkwado di ya. Ọ sịrị: “Nwayi ahu puru ime ka ọ nwe oghere otú ọ bula ọ gekwe me iji kwadebe ihe di iche iche ọ nwere ime, ye kwa aka izọputa oge di oké ọnu-ahia n’ihi nwoke ahu na n’ihi ya onwe ya site n’inwe ezi usoro-ọlu n’ulo, nedozi nri na mb̧e-ha, nabu onye jikere irapu na mb̧e ọma maka nzukọ nile nke ọb̧akọ. . . . N’okpuru ntuzi-aka nke di-ya, nwunye nke bu onye neso uzọ Kraist puru ime ihe di uku izulite umu-ntakiri n’uzọ o kwesiri ka ha ga nime ya ka ha we me ihe natọ Jehova utọ.” (Ilu 22:6) Ee, e kere nwunye ịbụ “onye inyeaka,” di ya ga-ejikwa amamihe nabata enyemaka ya. (Jenesis 2:18) Nkwado ya pụrụ inyere ya aka ilekọta ibu ọrụ ya nke ezinụlọ na nke ọgbakọ anya n’ụzọ dịkwu irè.

9. Ole ndị ka a gbara ume n’ime ọgbakọ Tesalọnaịka inyere ndị ọzọ n’ime ọgbakọ aka?

9 Otú ọ dị, ndị nwunye nke ndị okenye ndị Kraịst abụghị nanị ndị pụrụ ikere òkè n’ihe omume nke na-akwado onye nlekọta bụ́ onye na-aghaghị ‘ịzụ ìgwè atụrụ Chineke’ ma lekọta ezinụlọ nke ya. (1 Pita 5:2) Olee ndị ọzọ pụrụ inyeaka? Pọl onyeozi gbara ụmụnna nọ na Tesalọnaịka ume inwe nkwanye ùgwù maka ‘ndị bụ ndị isi’ ha. Ma, mgbe ọ na-aga n’ihu na-agwa otu ụmụnna ahụ okwu—kpọmkwem ndị ahụ na-abụghị ndị isi—Pọl dere, sị: “Anyị na-arịọ unu, ụmụnna anyị, na-adụnụ ndị na-adịghị agazi ije ọdụ, na-agụgụnụ ndị dara mbà n’obi, na-enyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nweenụ ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ nile nọ.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:12-14.

10. Mmetụta ọma dị aṅaa ka enyemaka ịhụnanya nke ụmụnna nile na-enwe n’ọgbakọ?

10 Lee otú o si dị mma mgbe ụmụnna nọ n’ọgbakọ nwere ịhụnanya nke na-akwali ha ịkasi ndị dara mbà n’obi obi, inyere ndị na-adịghị ike aka, ịdụ ndị na-adịghị agazi ije ọdụ, nakwa inwe ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ nile nọ! Ụmụnna ahụ nọ na Tesalọnaịka, bụ́ ndị nataworo eziokwu Bible n’oge na-adịghị anya n’agbanyeghị inweta oké mkpagbu, tinyere ndụmọdụ Pọl n’ọrụ iji mee nke a. (Ọrụ 17:1-9; 1 Ndị Tesalọnaịka 1:6; 2:14; 5:11) Cheedị banyere mmetụta ọma nke nkwado ịhụnanya ha nwere n’iwusi ọgbakọ ahụ nile ike na ime ka ọ dịrị n’otu! N’otu aka ahụ, mgbe ụmụnna taa na-akasi obi, na-enye nkwado, na-adụrịta ibe ha ọdụ, ọ na-eme ka ibu ọrụ nile nke ọzụzụ atụrụ nke ndị okenye, bụ́ ndị na-enwekarị ezinụlọ ndị ha ga-elekọta, bụrụ ihe dị mfe nke ukwuu ịrụ.

11. (a) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na a gụnyere ndị inyom n’okwu ahụ bụ́ “ụmụnna”? (b) Enyemaka dị aṅaa ka nwanyị bụ́ onye Kraịst tozuru okè pụrụ inye ụmụ agbọghọ taa?

11 À gụnyere ndị inyom n’ime “ụmụnna” ndị Pọl onyeozi na-agwa okwu? Ee, a gụnyere ha, ebe ọtụtụ ndị inyom ghọrọ ndị kwere ekwe. (Ọrụ 17:1, 4; 1 Pita 2:17; 5:9) Olee ụdị enyemaka ndị inyom dị otú ahụ pụrụ inye? E nwere n’ọgbakọ dị iche iche ndị inyom ka bụ ụmụ aghọghọ ndị nwere nsogbu ịchịkwa “mkpali mmekọahụ” ha ma ọ bụ ndị ghọrọ “ndị dara mbà n’obi.” (1 Timoti 5:11-13, NW) Ụfọdụ ndị inyom taa nwere otu ụdị nsogbu ndị ahụ. Ihe pụrụ ịdị ha mkpa karịsịa bụ nanị onye ga-ege ha ntị ma ọ bụ onye ha ga-ebesara ákwá. Mgbe mgbe nwanyị bụ́ onye Kraịst tozuru okè bụ onye kasị kwesị ekwesị inye enyemaka dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ isoro nwanyị ọzọ tụlee nsogbu dịịrị onwe onye nke nwoke bụ́ onye Kraịst n’onwe ya na-apụghị ime ihe banyere ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. N’imesi uru nke enyemaka dị otú ahụ bara ike, Pọl dere, sị: “Ka agadi ndị inyom . . . bụrụ ndị na-ezi ihe ọma; ka ha wee mee ka ndị bụ ụmụ agbọghọ nwee uche zuru okè ịbụ ndị na-ahụ di ha n’anya, ndị na-ahụ ụmụ ha n’anya, ndị uche ha zuru okè, ndị dị ọcha, ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ, ezi mmadụ, ndị na-edo onwe ha n’okpuru di nke aka ha, ka e wee ghara ikwulu okwu Chineke.”—Taịtọs 2:3-5.

12. Nduzi ònye ka ọ dị mkpa na mmadụ nile n’ọgbakọ gbasoro?

12 Lee ihe ngọzi ụmụnna nwanyị ndị dị umeala n’obi bụ n’ọgbakọ mgbe ha jikọrọ aka kwadoo ma di ha ma ndị okenye! (1 Timoti 2:11, 12; Ndị Hibru 13:17) Ndị okenye nwere ibu ọrụ ezinụlọ karịsịa na-erite uru mgbe mmadụ nile na-ejikọ aka inyerịtara ibe ha aka na mmụọ nke ịhụnanya nakwa mgbe mmadụ nile na-edo onwe ha n’okpuru nduzi nke ndị ọzụzụ atụrụ a họpụtara ahọpụta.—1 Pita 5:1, 2.

Ndị Nne na Nna, Gịnị Ka Unu Na-ebute Ụzọ?

13. Olee otú ọtụtụ ndị bụ́ nna na-esi emejọ ezinụlọ ha?

13 Ọtụtụ afọ gara aga, otu onye a ma ama na-eme ihe ntụrụndụ kwuru, sị: “Anamahụ ndikom ihe nagara nke-ọma ndị na-achi òtù-ọlu nile ndị nwere ọtụtụ ọgụ madụ ise; ha mara otu ha si emeso ọnọdu ọ bula, otú ha si enye madu ọ̀zùzù na otu esi akwu madu ugwọ-ọlu n’ebe analu ọlu. Ma ọlu kachasi uku nke ha neduzi bu ezi-na-ulo-ha, ma ha narapu ya.” N’ihi gịnị? Ọ́ bụghị n’ihi na ha ha na-ebute achụmnta ego na nchụso ndị ọzọ ụzọ ma leghara ndụmọdụ Chineke anya? Okwu ya na-asị: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu . . . ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị.” A ga-emekwa nke a kwa ụbọchị. Ọ dị ndị nne na nna mkpa ka ha ghara iji aka ntagide na-enye oge ha—karịsịakwa na-enye ịhụnanya na nchegbu ha miri emi.—Deuterọnọmi 6:6-9.

14. (a) Olee otú ndị nne na nna kwesịrị isi elekọta ụmụ ha? (b) Gịnị ka ọzụzụ kwesịrị ekwesị nke ụmụ gụnyere?

14 Bible na-echetara anyị na ụmụ bụ ihe nketa sitere n’aka Jehova. (Abụ Ọma 127:3) Ị̀ na-elekọta ụmụ gị dị ka ihe onwunwe Chineke, onyinye nke ọ tụkwasịworo n’ubu gị? Nwa gị yiri ka ọ ga-azaghachi ma ọ bụrụ na i kuru ya, si otú a na-egosi nlekọta na nlebara anya ịhụnanya gị. (Mak 10:16) Ma ‘ịzụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị’ chọrọ ihe karịrị ịmakụ ya na isutụ ya ọnụ. Iji bụrụ onye e nyere amamihe iji zere ihe ọnyà nke ndụ, nwatakịrị chọkwara ịdọ aka ná ntị ịhụnanya. Nne ma ọ bụ nna na-egosi ezi ịhụnanya site ‘n’ịdọsi nwa ya aka ná ntị ike.’—Ilu 13:1, 24; 22:6.

15. Gịnị na-egosi ịdị mkpa nke ịdọ aka ná ntị nne na nna?

15 A pụrụ ịhụ ịdị mkpa nke ịdọ aka ná ntị nne ma ọ bụ nna site ná nkọwa onye ndụmọdụ ụlọ akwụkwọ nyere banyere ụmụaka bụ́ ndị na-abịa n’ọfịs ya: “Ha dị imere ebere, daa mbà n’obi, ma bụrụ ndị na-amaghị ihe ha ga-eme. Ha na-ebe ákwá ka ha na-akọ banyere otú ihe dị n’ezie. Ọtụtụ—ọtụtụ ndị karịa ka mmadụ pụrụ icheli n’echiche—anwawo igbu onwe ha, ọ bụghị n’ihi na ha nwere nnọọ obi ụtọ gafere ókè; ọ bụ n’ihi na ha nwere oké mwute, mmetụta nke ndị a na-adịghị elekọta, ndị nrụgide rikpuworo n’ihi na n’oge ha dị ntakịrị otú ahụ ha ‘na-elekọta onwe ha,’ ọ gafekwara ihe ha ga-ebuli.” O kwukwasịrị: “Ọ bụ ihe na-atụ egwu nye onye na-eto eto inwe mmetụta na ya na-elekọta onwe ya.” N’eziokwu, ụmụaka pụrụ ịjụ ịdọ aka ná ntị, ma ha na-enwe ekele n’ezie maka nduzi na mgbochi nke nne ma ọ bụ nna ha. Ha nwere obi ụtọ na nne na nna ha na-eche banyere ha ruo n’ókè nke ịkpara ha ókè. “Ọ bụrụwo nnọọ ihe ahụ efe nye m,” ka otu onye nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu kwuru, bụ́ onye nne na nna ya mere otú ahụ.

16. (a) Gịnị na-eme ụfọdụ ụmụ a zụlitere n’ezinụlọ ndị Kraịst? (b) N’ihi gịnị ka ụzọ isi ike nke otu nwa na-apụtachaghị na ọzụzụ nne na nna nyere adịghị mma?

16 Ma, n’agbanyeghị inwe nne na nna hụrụ ha n’anya ma na-enye ọzụzụ dị mma, ụfọdụ ndị na-eto eto, dị ka nwa mmefu ahụ nọ n’ilu Jisọs, na-ajụ nduzi nne na nna ma kpafuo. (Luk 15:11-16) Otú ọ dị, nke ahụ n’onwe ya nwere ike ọ gaghị apụta na ndị nne na nna arụzughị ibu ọrụ ha ịzụlite nwa ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị, dị ka Ilu 22:6 tụziri. E kwuru okwu banyere ‘ịzụlite nwatakịrị dị ka ụzọ ya si dị’ dị ka ihe na-emekarị. N’ụzọ dị mwute, dị ka nwa mmefu ahụ, ụfọdụ ụmụ ‘ga-eleda ịṅa nne ma ọ bụ nna ha ntị.’—Ilu 30:17.

17. Site na gịnị ka ndị nne na nna nke ụmụ isi ike pụrụ inweta nkasi obi?

17 Nna nke otu nwa isi ike kwara arịrị, sị: “Agbalịkatawo m iru obi ya. Amaghị m ihe m ga-eme n’ihi na anwalewo m nnọọ ọtụtụ ihe. Ọ dịbeghị ihe nwere isi.” A na-atụ anya na ụmụ isi ike dị otú ahụ ga-emesịa, mgbe oge na-aga, cheta ọzụzụ ịhụnanya nke ha nataworo ma laghachi dị ka nwa mmefu ahụ. Otú ọ dị, eziokwu ka dị na ya bụ na ụfọdụ ụmụ na-enupụ isi ma mee omume rụrụ arụ dị iche iche wee wetara nne na nna ha oké ihe mgbu. Ndị nne na nna pụrụ inweta nkasi obi site n’ịmara na ọbụna onye ozizi kasị ukwuu nke dịrị ndụ n’ụwa hụrụ ka nwa akwụkwọ ya ọ kụziwooro ihe ruo ogologo oge bụ́ Judas Iskarịọt raara ya nye. Ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na o wutere Jehova n’onwe ya mgbe ọtụtụ n’ime ụmụ ya bụ́ mmụọ jụrụ ndụmọdụ ya ma ghọọ ndị nnupụisi n’esighị Ya n’aka.—Luk 22:47, 48; Mkpughe 12:9.

Ụmụ—Ònye Ka Unu Ga-eme Obi Ụtọ?

18. Olee otú ụmụ pụrụ isi egosi na ha na-ebute Chineke ụzọ?

18 Jehova na-agba unu bụ́ ndị na-eto eto ume, sị: “Na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:1) Ndị na-eto eto butenụ Chineke ụzọ site n’ime nke a. Ezuzula nzuzu! “Onye nzuzu na-elelị ịdọ aka ná ntị nna ya,” ka Okwu Chineke na-ekwu. I kwesịghịkwa iji mpako chee na ị pụrụ ịnọ n’enweghị ịdọ aka ná ntị. Eziokwu dị na ya bụ na “ọgbọ dị nke dị ọcha n’anya ha, ma oruru unyi ha ka a na-asachapụghị.” (Ilu 15:5; 30:12, American Standard Version) Ya mere ṅaa ntị ná nduzi Chineke—“nụrụ,” “zobe,” “echezọla,” ‘tọọkwa ntị n’ala,’ “chebe,” “ahapụkwala” ihe nne na nna nyere n’iwu na ịdọ aka ná ntị ha.—Ilu 1:8; 2:1; 3:1; 4:1; 6:20.

19. (a) Ihe ndị siri ike dị aṅaa ka ụmụ nwere mere ha ga-eji rubere Jehova isi? (b) Olee otú ndị na-eto eto pụrụ isi gosi na ha nwere ekele nye Chineke?

19 I nwere ihe ndị siri ike mere ị ga-eji erubere Jehova isi. Ọ hụrụ gị n’anya, o nyewokwa iwu ya, tinyere iwu ahụ e nyere ụmụ irubere nne na nna ha isi, iji chebe gị na iji nyere gị aka inweta ndụ obi ụtọ. (Aịsaịa 48:17) O nyewokwa Ọkpara ya ịnwụ n’ihi gị ka i wee nwee ike ịbụ onye a zọpụtara n’aka mmehie na ọnwụ ma nweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) Ì nwere ekele? Chineke si n’eluigwe na-ele, na-enyocha obi gị ịhụ ma ị hụrụ ya n’anya n’ezie ma nwee ekele maka ndokwa ya nile. (Abụ Ọma 14:2) Setan na-elekwa anya, ọ na-atakwa Chineke ụta, na-azọrọ na ị gaghị erubere Ya isi. Ị na-eme Setan obi ụtọ ma na-eme ka “o wute” Jehova mgbe i nupụụrụ Chineke isi. (Abụ Ọma 78:40, 41) Jehova na-arịọ gị, sị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa [site n’irubere m isi], ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” (Ilu 27:11) Ee, ajụjụ bụ, Ònye ka ị ga-eme obi ụtọ, Setan ka ọ bụ Jehova?

20. Olee otú otu onye ntorobịa siworo nọgide na-enwe obi ike ijere Jehova ozi ọbụna mgbe ụjọ ji ya?

20 Ọ dịghị mfe ime ihe Chineke na-achọ n’ihu nrụgide nke Setan na ụwa ya na-enwe n’ahụ gị. Ọ pụrụ ịdị na-atụ ụjọ. Otu onye ntorobịa kwuru, sị: “Ịbụ onye e menyere ụjọ yiri ịbụ onye oyi na-atụ. Ị pụrụ ime ihe banyere ya.” Ọ kọwara, sị: “Mgbe oyi na-atụ gị, ị na-eyiri uwe oyi. Ọ bụrụ na oyi ka nọgide na-atụ gị, i yinye ọzọ. Ị ga-anọgidekwa na-eyikwasị uwe ruo mgbe oyi ahụ pụrụ, i wee bụrụ onye oyi na-adịghị atụkwa. Ya mere ikpegara Jehova ekpere mgbe ụjọ na-atụ gị yiri iyikwasị uwe oyi mgbe oyi na-atụ gị. Ọ bụrụ na mgbe m kpesịrị ekpere m ka na-atụ ụjọ, m ga-ekpe ekpere ọzọ, kpeekwa ọzọ, kpeekwa ọzọ, ruo mgbe ụjọ na-agaghị na-atụkwa m. Ọ na-arụkwa ọrụ. Ọ nọgidewokwa na-eme ka m zere nsogbu!”

21. Olee otú Jehova ga-esi kwadoo anyị ma ọ bụrụ na anyị agbalịa n’ezie ibute ya ụzọ ná ndụ anyị?

21 Ọ bụrụ na anyị agbalịa n’ezie ibute Chineke ụzọ ná ndụ anyị, Jehova ga-akwado anyị. Ọ ga-enye anyị ume, na-enye enyemaka ndị mmụọ ozi mgbe ọ dị mkpa, ọbụna dị ka o meere Ọkpara ya. (Matiu 18:10; Luk 22:43) Nweenụ obi ike unu nile bụ́ ndị nne na nna na ụmụ. Nweenụ egwu yiri nke Kraịst, ọ ga-ewetakwara unu ọṅụ. (Aịsaịa 11:3) Ee, “tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.”—Eklisiastis 12:13.

Ị̀ Pụrụ Ịza?

◻ Ibu ọrụ ndị dị aṅaa ka ọ dị mkpa ka ndị na-eso ụzọ mbụ nke Jisọs mee ka ha nwee ezi nhazi?

◻ Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst na-aghaghị imezu?

◻ Enyemaka dị aṅaa dịịrị ndị okenye ndị Kraịst nwere ezinụlọ?

◻ Ozi dị aṅaa bara uru ka ụmụnna nwanyị pụrụ ije n’ọgbakọ?

◻ Ndụmọdụ na nduzi dị aṅaa ka ọ dị mkpa ka ụmụ ṅaa ntị?

[Foto dị na peeji nke 15]

Mgbe mgbe nwanyị bụ́ onye Kraịst tozuru okè pụrụ inye nwa agbọghọ enyemaka dị mkpa

[Foto dị na peeji nke 17]

Nkasi obi dị aṅaa ka ndị nne na nna nwere ụmụ isi ike pụrụ inweta site n’Akwụkwọ Nsọ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya