Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 11/15 p. 4-7
  • Ndụ Ka Mma—N’isi Nso!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndụ Ka Mma—N’isi Nso!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndụ Ka Mma—Olee Mgbe?
  • Ndụ Ka Mma—N’ụzọ Dị Aṅaa?
  • Ihe Ọ Dị Gị Mkpa Ime
  • Paradaịs dị nso!
    Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • Ànyị Na-ebi “n’Ụbọchị Ikpeazụ”?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • A Gaje Imezu Nzube Chineke n’Isi Nso
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Olee Mgbe Ụwa Ga-aghọ Paradaịs?
    Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 11/15 p. 4-7

Ndụ Ka Mma—N’isi Nso!

CHEEDỊ banyere onye na-akọ ọnọdụ ihu igwe nke amụma ya na-afọ nke nta ka ọ bụrụ eziokwu mgbe nile. Ọ bụrụ na o kwuo n’akụkọ mgbede na mmiri ga-ezo n’ụbọchị na-esonụ, ị gaghị egbu oge iwere ncheanwụ gị mgbe ị na-ahapụ ụlọ n’ụtụtụ echi. Ihe ndekọ ya nke oge gara aga emewo ka ị na-atụkwasị ya obi. Ị na-eji ihe o kwuru eme ihe.

Ugbu a, ruo ókè hà aṅaa ka nkwa Jehova maka ndụ ka mma n’ụwa paradaịs kwesịruru ndabere? Ọ dị mma, gịnị ka ihe ndekọ ya nke oge gara aga na-egosi? Mmezu nke amụma Bible n’ụzọ doro anya na-eme ka ihe ndekọ Jehova guzosie ike. Ọ bụ Chineke nke izi ezi na ịbụ eziokwu na-adịghị agha agha. (Joshua 23:14; Aịsaịa 55:11) Nkwa Jehova Chineke kwesịrị ndabere nke ukwuu nke na mgbe ụfọdụ ọ na-ekwu nnọọ banyere ihe ndị e kwere nkwa ga-eme n’ọdịnihu dị ka ha emeworị. Dị ka ihe atụ, mgbe nkwa ya maka ụwa ọhụrụ ebe ọnwụ na iru újú na-agaghị adịkwa gasịrị, anyị na-agụ, sị: “E mewo ha [ngọzi ndị ahụ e kwere nkwa ha].” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, “Ha bụ eziokwu!”—Mkpughe 21:5, 6, NW, nkọwa ala ala peji.

Ee, mmezu nke nkwa ndị gara aga nke Jehova na-enye anyị obi ike ná mmezu nke nkwa ya maka ndụ ka mma nye ihe a kpọrọ mmadụ. Ma olee mgbe ndụ ka mma nke a ga-abịa?

Ndụ Ka Mma—Olee Mgbe?

Ndụ ka nnọọ mma ga-abịa n’isi nso! Anyị pụrụ ijide nke ahụ n’aka n’ihi na Bible na-ekwu na ọtụtụ ihe ọjọọ ga-eme n’ụwa kpọmkwem tupu Paradaịs ewebata ndụ ka mma. Ihe ọjọọ ndị ahụ na-eme ugbu a.

Dị ka ihe atụ, Jisọs Kraịst buru amụma na a ga-enwe oké agha dị iche iche. Ọ sịrị: “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ.” (Matiu 24:7) Amụma nke a emezuwo. N’agbata afọ 1914 ruo 1945, e nwere agha ụwa abụọ, ọtụtụ agha ọzọ ebe mba dị iche iche lụsoro onwe ha ọgụ esochiwokwa ndị a. “Ná nkezi nke kwa afọ, ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ n’agha n’oge a [eri Agha Ụwa nke Abụọ] akarịwo okpukpu abụọ nke ndị na-anwụ na narị afọ nke 19 na okpukpu asaa karịa na narị afọ nke 18.”—World Military and Social Expenditures 1993.

Mgbasa nke ọrịa bụ ihe àmà ọzọ nke ịdị nso nke ndụ ka mma na Paradaịs. Jisọs buru amụma na “ajọ ọrịa na-efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” (Luk 21:11) Amụma nke a ò mezuwo? Ee. Mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, oké ahụ ọkụ si Spain gburu ihe karịrị 20 nde mmadụ. Eri mgbe ahụ, ọrịa cancer, ọrịa obi, ịba, AIDS, na nrịanrịa ndị ọzọ egbuwo ọtụtụ nde mmadụ. Ná mba ndị na-emepe emepe, ọrịa ndị na-esite ná mmiri e metọrọ emetọ (gụnyere afọ ọsịsa na ọrịa okpo ndị na-adị n’ime eriri afọ) na-ata isi ọtụtụ nde mmadụ kwa afọ.

Jisọs kwukwara, sị: “Oké ụnwụ . . . ga-adịkwa.” (Matiu 24:7) Dị ka a rịbara ama n’isiokwu bu ụzọ, ndị ogbenye bi n’ụwa enweghị ihe zuru ezu ha ga-eri. Nke a bụ akụkụ ọzọ nke ihe àmà nke na ndụ ka mma na Paradaịs gaje ịbịa n’isi nso.

“Oké ala ọma jijiji ga-adịkwa,” ka Jisọs sịrị. (Luk 21:11) Nke a emezuwokwa n’oge anyị. Eri 1914 mbibi nke ala ọma jijiji ndị na-ebibi ihe kpatara atawo isi ọtụtụ narị puku mmadụ.

Bible kwukwara na a ga-eji mgbanwe n’ahụ ụmụ mmadụ kaa “mgbe ikpeazụ” akara. Ha ga-abụ “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya” na “ndị na-ahụ ego n’anya,” ụmụaka ga-abụkwa “ndị na-ekwenyeghịrị ndị mụrụ ha.” Ndị mmadụ n’ozuzu ha ga-abụ “ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:1-5) Ọ̀ bụ na i kweghị na ọtụtụ ndị dabara ná nkọwa a?

Ka ọtụtụ mmadụ karị na-eme ihe ọjọọ, e nwere ịba ụba nke ihe na-emebi iwu. E bukwara amụma nke a. Dị ka Matiu 24:12 na-ekwu, Jisọs kwuru banyere “ịba ụba nke ihe na-emebi iwu.” Ma eleghị anya ị ga-ekweta na mpụ ka njọ ugbu a karịa ka ọ dị afọ ole na ole gara aga. Ndị mmadụ n’ebe ọ bụla nọ n’egwu na a ga-ezu ha ohi, ghọgbuo ha, ma ọ bụ merụọ ha ahụ n’ụzọ ụfọdụ.

Agha, ọrịa n’ebe nile, ụkọ nri, ala ọma jijiji, mpụ na-arị elu, na mgbanwe nke ihe ịkawanye njọ ná mmekọrịta ụmụ mmadụ—a na-ahụ ihe a nile taa, dị nnọọ ka Bible buru ụzọ kwuo. ‘Ma ọ̀ bụ na ihe ndị a emebeghị n’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ?’ ka ị pụrụ ịjụ. ‘Gịnị dị iche banyere ụbọchị anyị?’

E nwere akụkụ ụfọdụ dị oké ịrịba ama banyere ihe ndị na-eme taa. Bible ekwughị na otu ihe ọ bụla, dị ka ụkọ nri, ga-abụ ihe àmà n’onwe ya nke na anyị na-ebi n’oge ọgwụgwụ nakwa na ndụ ka mma dị nso. A gaje imezu amụma nile nke Bible maka oge ọgwụgwụ n’isi otu ọgbọ na-adịghị asọpụrụ Chineke.—Matiu 24:34-39; Luk 17:26, 27.

Ọzọkwa, ọ bụ nnọọ ihe pụrụ iche na akụkụ ụfọdụ nke amụma Jisọs—karịsịa ndị kwuru maka ụkọ nri na ọrịa zuru ebe nile—na-emezu taa. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe ndị a rụzuru ná nkà mmụta sayensị enwebeghị mgbe ọzọ ọ dị ukwuu otú ọ dị taa. Ihe ọmụma nkà mmụta ọgwụ na ụdị dị iche iche nke ịgwọ ọrịa abụbeghị ọkpọka ma ọ bụ gbasapụ agbasapụ karịa ka ọ dị ugbu a. Nanị Chineke pụrụ ibuwo amụma n’Okwu ya, bụ́ Bible, na n’oge dị otú a, ọrịa na ụnwụ nri ga-aka njọ, ọ bụghị ịka mma.

Ebe ọ bụ na amụma nile nke Bible banyere oge ọgwụgwụ, ma ọ bụ “mgbe ikpeazụ,” na-emezu, gịnị ka anyị pụrụ ikwubi? Na ndụ ka mma dị nso! Ma olee otú ọ ga-esi bịa?

Ndụ Ka Mma—N’ụzọ Dị Aṅaa?

Ì chere na ụmụ mmadụ pụrụ iweta Paradaịs? N’akụkọ ihe mere eme nile ruo nnọọ taa, e nwewo ọtụtụ ụdị ọchịchị mmadụ. Ụfọdụ agbalịsiwo ike imeju mkpa ụmụ mmadụ. Ma, ọtụtụ nsogbu na-aka njọ. Ma ná mba ndị bara ọgaranya ma n’ala ndị dara ogbenye, ọchịchị dị iche iche na-agbaso iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ụlọ obibi na-adịghị mma, ịda ogbenye, mpụ, enweghị ọrụ, na obubu agha mgba.

Ọ bụrụgodị na ọchịchị pụrụ ịgwọta ụfọdụ n’ime nsogbu ndị a, ọ dịghị mgbe ha ga-enwe ike inye nnwere onwe zuru ezu pụọ n’ahụ esighị ike; ha apụghịkwa iweta ịka nká na ọnwụ ná njedebe. N’ụzọ doro anya, ọ dịghị mgbe ụmụ mmadụ ga-eweta Paradaịs n’elu ụwa a.

N’ụzọ amamihe Bible na-asị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere.” Mgbe ahụ, ònye ka anyị kwesịrị ịtụkwasị obi anyị? Bible na-aza: “Onye ihe na-agara nke ọma ka onye ahụ bụ nke Chineke nke Jekọb bụ Onye na-enyere ya aka, nke olileanya ya dịkwasị Jehova, bụ́ Chineke ya.” (Abụ Ọma 146:3, 5) Ọ bụrụ na anyị etinye olileanya anyị na Jehova Chineke, ọ dịghị mgbe ọ ga-emechu anyị ihu.

N’ezie Onye ahụ nke nwere amamihe na ike iji kee ụwa, anyanwụ, na kpakpando nile pụkwara ime ụwa ka ọ bụrụ paradaịs. Ọ pụrụ ime ka ụmụ mmadụ nwee ike ibi ndụ ka mma. Ihe ọ bụla Jehova Chineke setịpụrụ ime, o nwere ike ya, ọ ga-emezukwa ya. Okwu ya na-asị: “Ọ dịghị okwu ọ bụla si Chineke n’ọnụ pụta nke na-agaghị adị irè.” (Luk 1:37) Ma olee otú Chineke ga-esi weta ndụ ka mma?

Jehova ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ndụ ka nnọọ mma site n’Alaeze ya. Gịnịkwa bụ Alaeze Chineke? Ọ bụ ọchịchị dị adị nke nwere Onye Ọchịchị Chineke họpụtara, Jisọs Kraịst. Alaeze Chineke dị n’eluigwe, ma n’isi nso ọ ga-ewetara ndị ga-ebi n’ụwa Paradaịs ngọzi magburu onwe ha na ndụ ka nnọọ mma.—Aịsaịa 9:6, 7.

Ọ pụrụ ịbụ na ị maworị ekpere ihe atụ Jisọs nke ọma, bụ́ nke a na-ahụ n’ime Bible na Matiu 6:9-13. Ihe ụfọdụ dị n’ekpere ahụ a na-ekpegara Chineke na-asị: “Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” N’ikwekọ n’ekpere ahụ, Alaeze Chineke ‘ga-abịa’ imezu nzube Jehova Chineke maka ụwa. Ọ bụkwa nzube ya ka ụwa ghọọ paradaịs.

Otu ajụjụ ikpeazụ na-ebilite: Gịnị ka ị na-aghaghị ime iji bie ndụ ka mma na Paradaịs ahụ na-abịanụ?

Ihe Ọ Dị Gị Mkpa Ime

N’ịhụnanya, Jehova Chineke na-enye ndị nile na-eme uche ya olileanya nke ndụ ka mma na Paradaịs. Bible na-agwa anyị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Ma gịnị na-eme mmadụ onye ezi omume n’anya Chineke?

Iji mee ihe na-atọ Jehova ụtọ ọ dị anyị mkpa ịmụtakwu banyere ihe ọ chọrọ ka anyị mee. Ọ bụrụ na anyị anara ihe ọmụma Chineke ma tinye ya n’ọrụ ná ndụ anyị, anyị pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi. N’otu ekpere o kpegaara Chineke, Jisọs sịrị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

Akwụkwọ nke na-agwa anyị banyere Jehova Chineke na Jisọs Kraịst bụ Okwu Chineke, bụ́ Bible. Ọ bụ otu n’ime onyinye ndị kasị ọnụ ọhịa nke Jehova. Bible dị ka akwụkwọ ozi sitere n’aka nna na-ahụ n’anya nye ụmụ ya. Ọ na-agwa anyị banyere nkwa Chineke iwetara ihe a kpọrọ mmadụ ndụ ka mma ma na-egosi anyị ụzọ anyị pụrụ isi nweta ya. Bible na-eme ka anyị mara ihe Chineke meworo n’oge gara aga na ihe ọ ga-eme n’ọdịnihu. Ọ na-enyekwa anyị ndụmọdụ dị irè banyere ụzọ isi chee nsogbu anyị nile ihu n’ụzọ na-aga nke ọma ugbu a. N’ezie, Okwu Chineke na-akụziri anyị ụzọ isi chọta ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke obi ụtọ ọbụna n’ụwa a nọ ná nsogbu.—2 Timoti 3:16, 17.

Ndịàmà Jehova ga-eji ọṅụ dokwaara gị ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu. Mụta ụzọ ị pụrụ isi bie ndụ obi ụtọ ka ukwuu ugbu a, na-enwe olileanya maka ndụ ka nnọọ mma n’ọdịnihu dị nso.

[Foto dị na peeji nke 5]

Amụma Bible na-egosi na ndụ ka mma dị nso

[Foto dị na peeji nke 7]

Alaeze Chineke ga-ewebatara ihe a kpọrọ mmadụ ndụ ka mma

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya