William Tyndale—Nwoke Na-elepụ Anya n’Ihu
A mụrụ William Tyndale n’England “n’ụsọ ụsọ ókèala Wales,” ma eleghị anya na Gloucestershire, ọ bụ ezie na a pụghị ikwu ebe na ụbọchị ọ bụ kpọmkwem. N’October 1994, England mere ememe ncheta nke 500 nke ọmụmụ nke nwoke “nyere anyị Bible Bekee anyị.” N’ihi akwụkwọ a e gburu Tyndale n’ihi okwukwe ya. N’ihi gịnị?
WILLIAM TYNDALE bụ ọkàibe ná mmụta Grik na Latin. Na July 1515, mgbe ọ na-akarịbeghị 21 afọ, ọ natara akara ugo mmụta Master of Arts n’Oxford University. Ka ọ na-erule 1521 e chiri ya ụkọchukwu Roman Katọlik. N’oge ahụ okpukpe Katọlik na Germany nọ n’ọgba aghara n’ihi ọrụ Martin Luther. Ma England nọgidere na-abụ mba Katọlik ruo mgbe Eze Henry nke Asatọ mesịrị kewapụ site na Rom na 1534.
Ọ bụ ezie na Bekee bụ asụsụ ọha mmadụ n’ụbọchị Tyndale, agụmakwụkwọ nile bụ na Latin. Ọ bụ asụsụ nke chọọchị na nke Bible. Na 1546 Kansụl nke Trent kwughachiri na a ga na-eji nanị Vulgate dị n’asụsụ Latin nke narị afọ nke ise nke Jerome sụgharịrị na-eme ihe. Otú ọ dị, nanị ndị gụrụ akwụkwọ pụrụ ịgụ ya. N’ihi gịnị ka a ga-eji jụ inye ndị England Bible na Bekee na nnwere onwe ịgụ ya? “Jerom[e] sụgharịkwara bible gaa n’asụsụ ala ya: n’ihi gịnị ka anyị na-agaghị emekwa otú ahụ?” bụ arụmụka Tyndale.
Nzọụkwụ nke Okwukwe
Mgbe oge ya n’Oxford gasịrị na ma eleghị anya ọmụmụ akwụkwọ ọzọ na Cambridge, Tyndale kụziiri ụmụ ndị ikom John Walsh akwụkwọ ruo afọ abụọ na Gloucestershire. N’ime oge a ọ zụlitere ọchịchọ ya ịsụgharị Bible gaa na Bekee, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na o nwere ohere ịzụlite nkà nsụgharị ya site n’enyemaka nke ihe odide Bible ọhụrụ nke Erasmus nke nwere Grik na Latin na kọlụm ndị chere onwe ha ihu. Na 1523, Tyndale hapụrụ ezinụlọ Walsh ma gaa London. Nzube ya bụ inweta ikike maka nsụgharị ya site n’aka Cuthbert Tunstall, bishọp nke London.
Ikike Tunstall dị mkpa n’ihi na ihe ndị e kwuru n’otu nzukọ e mere na 1408 n’Oxford, nke a maara dị ka Ụkpụrụ Iwu nke Oxford, gụnyere mmachibido iwu n’ịsụgharị ma ọ bụ ịgụ Bible n’asụsụ ọzọ, ọ gwụla ma ọ bụ site n’ikike onye bishọp. N’ihi ịnwa imebi ihe mgbochi a, a kpọrọ ọtụtụ ndị nkwusa na-ejegharị ejegharị a maara dị ka ndị Lollard ọkụ dị ka ndị jụrụ okwukwe. Ndị Lollard a gụrụ ma kesaa Bible John Wycliffe, nsụgharị Bekee site na Vulgate. Tyndale chere na oge eruwo ịsụgharị ihe odide ndị Kraịst site na Grik gaa ná nsụgharị ọhụrụ, nke bụ ezie maka chọọchị ya na maka ndị England.
Bishop Tunstall bụ nwoke gụrụ akwụkwọ nke mere ihe dị ukwuu ịgba Erasmus ume. Dị ka ihe àmà nke nkà nke ya, Tyndale sụgharịrị otu okwu ihu ọha Isocrates, bụ́ ihe odide Grik siri ike, maka nnwapụta Tunstall. Tyndale tụsiri anya ike na Tunstall ga-eme ya enyi ma kwado ya ma nabata arịrịọ ya ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ. Gịnị ka bishọp ahụ ga-eme?
Ọjụjụ—N’ihi Gịnị?
Ọ bụ ezie na Tyndale nwere akwụkwọ ozi nkọwa, Tunstall jụrụ ịhụ ya. Ya mere Tyndale aghaghị ide akwụkwọ na-arịọ ka a gbaa ya ajụjụ ọnụ. O doghị anya ma Tunstall ò mesịrị kweta izute Tyndale, ma ozi ya bụ, ‘Ụlọ m juru eju.’ N’ihi gịnị ka Tunstall ji mara ụma lelịa Tyndale otú a?
Ọrụ ndozigharị Luther na kọntinent Europe na-akpatara Chọọchị Katọlik oké nchekasị, na-enwe mmetụta n’England. Na 1521, Eze Henry nke Asatọ bipụtara nkọwa okwu siri ike na-agbachitere popu megide Luther. Site n’obi ekele popu nyere Henry ùtú aha bụ́ “Onye Na-agbachitere Okwukwe.”a Cardinal Wolsey nke Henry nọkwa n’ọrụ, na-ebibi akwụkwọ Luther ndị e bubatara n’ụzọ megidere iwu. Dị ka bishọp Katọlik nke na-anọgidesi ike n’ihe nye popu, eze, na nye kadịnal ya, Tunstall nwere ọrụ nke ịbịanyụ echiche ọ bụla pụrụ inye Luther ahụ na-enupụ isi nkwado. Tyndale bụ onye mbụ a na-enyo enyo. N’ihi gịnị?
N’oge ọ nọnyeere ezinụlọ Walsh, n’atụghị egwu Tyndale ekwugidewo amaghị nke a na-akọ na nkwenkwe ikwesi olu ike nke ndị ụkọchukwu mba ahụ. John Stokesley bụ́ onye matara Tyndale n’Oxford so n’etiti ha. O mesịrị nọchie Cuthbert Tunstall dị ka bishọp nke London.
Mmegide nye Tyndale pụtakwara ìhè ná nkwata ya na otu ụkọchukwu nọ n’ọkwá ukwu kwatara, bụ́ onye sịrị: “Ọ ga-akara anyị mma ịnọ n’enweghị iwu Chineke kama ịnọ n’enweghị nke popu.” N’okwu ndị kwesịrị ncheta, nzaghachi Tyndale bụ: ‘Ana m emegide Popu na iwu ya nile. Ọ bụrụ na Chineke edebe m ndụ, tupu ọtụtụ afọ, aga m eme ka nwa na-ebu ọ́gụ̀ mara ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ karịa ka ị maara.’
Tyndale aghaghị ịbịa n’ihu onye ọchịchị dayọses nke Worcester n’ihi ebubo ụgha nke ịjụ okwukwe ndị e boro ya. “O yiri m egwu nke ukwuu, kwaakwa m emo,” ka Tyndale mesịrị cheta, na-agbakwụnye na e mesowo ya dị ka “nkịta.” Ma e nweghị ihe àmà ọ bụla iji maa Tyndale ikpe ịjụ okwukwe. Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwetara na a kọọrọ Tunstall okwu a nile na nzuzo ka o wee metụta mkpebi ya.
Mgbe ọ nọsịrị otu afọ na London, Tyndale kwubiri, sị: “E nweghị ohere n’obí onye nwe m nke London ịnọ sụgharịa Agba ọhụrụ, e nweghịkwa . . . ebe ọ bụla a ga-anọ mee ya n’England nile.” O kwuziri ekwuzi. N’ọnọdụ nzọda nke ọrụ Luther kpatara, olee onye na-ebi akwụkwọ n’England nke ga-anwa anwa bipụta Bible n’asụsụ Bekee? Ya mere na 1524, Tyndale gabigara Ọwa Mmiri England, n’alataghị ọzọ.
Ịga Europe na Nsogbu Ndị Ọhụrụ
Na-eji akwụkwọ ya ndị dị oké ọnụ ahịa, William Tyndale nwetara ebe mgbaba na Germany. O ji £10 nke enyi ya bụ́ Humphrey Monmouth, onye azụmahịa London a ma ama, ji obi ọma nye ya. Onyinye nke a fọrọ nke nta ka o zuo n’oge ndị ahụ iji mee ka Tyndale nwee ike ibi Akwụkwọ Nsọ Grik o mere atụmatụ ịsụgharị. E mesịrị jide Monmouth maka inyere Tyndale aka na maka ebubo nke ịkwado Luther. N’ịbụ onye a gbara ajụjụ ma tụba na Tower of London, e mesịrị tọhapụ Monmouth nanị mgbe o degaara Cardinal Wolsey akwụkwọ maka mgbaghara.
Kpọmkwem ebe Tyndale gara na Germany edoghị anya. Ihe àmà ụfọdụ na-atụ aka na Hamburg, ebe ọ pụrụ ịnọwo otu afọ. Ò zutere Luther? E jighị nke a n’aka, ọ bụ ezie na ebubo e boro Monmouth kwuru na o mere otú ahụ. Otu ihe doro anya: Tyndale jisi ọrụ n’aka ike na-asụgharị Akwụkwọ Nsọ Grik. Ebee ka ọ pụrụ ibi ihe odide ya? O nyere Peter Quentell nọ na Cologne ọrụ ahụ.
Ihe nile nọ na-aga nke ọma ruo mgbe onye mmegide bụ́ John Dobneck, nke a makwaara dị ka Cochlaeus, matara ihe na-emenụ. Ngwa ngwa Cochlaeus kọọrọ otu ezi enyi Henry nke Asatọ ihe ndị ọ chọpụtara, bụ́ onye mere ngwa nata ike mmachibido megide Quentell ịdị na-ebi nsụgharị nke Tyndale.
Tyndale na onye inyeaka ya, bụ́ William Roye, gbalagara maka ndụ ha, na-ewere peji nile nke Oziọma Matiu nke e biwororịị. Ha ji ụgbọ mmiri gaa n’ebe osimiri Rhine iru Worms, ebe ha nọ rụsịa ọrụ ha. Ka oge na-aga, e bipụtara 6,000 nke mbipụta mbụ nke New Testament (Agba Ọhụrụ) nke Tyndale.b
Ihe Ịga nke Ọma —N’agbanyeghị Mmegide
Nsụgharị na obibi bụ otu ihe. Ibuba Bible ndị ahụ na Britain bụ ihe ọzọ. Ndị ọrụ chọọchị na ndị ọchịchị kpebisiri ike igbochi mbubata ya site n’Ọwa Mmiri England, ma ndị ahịa nwere omume enyi nwere azịza ya. N’izo ya n’ùkwù ákwà na ná ngwá ahịa ndị ọzọ, e zobatara mpịakọta ndị a n’ikpere mmiri England, ruokwa Scotland. A gbara Tyndale ume, ma ọgụ ya ka malitere amalite.
Na February 11, 1526, Cardinal Wolsey, ya na bishọp 36 na ndị isi chọọchị ndị ọzọ, zukọrọ na nso St. Paul’s Cathedral dị na London “ịhụ ka a wụnyere ọtụtụ ùjú nkata akwụkwọ n’ọkụ.” Ihe so n’etiti ha bụ ụfọdụ n’ime nsụgharị dị oké ọnụ ahịa nke Tyndale. N’ime mbipụta mbụ nke a, e nwere ugbu a nanị abụọ a na-ebibighị. Otu nke nanị ya zuru ezu (n’enweghị nanị peji aha ya) dị na British Library. N’ụzọ na-eju anya, a chọtara nke ọzọ, nke 71 peji na ya na-efu efu, n’ime St. Paul’s Cathedral Library. Otú o si ruo n’ebe ahụ, ọ dịghị onye ma.
N’enweghị nkụda obi, Tyndale nọgidere na-ebipụta mbipụta ndị ọhụrụ nke nsụgharị ya, bụ́ ndị ndị ụkọchukwu England ji ụzọ dị n’usoro chọta ma na-esu ọkụ. Mgbe ahụ Tunstall gbanwere ụzọ ime ihe ya. O so otu onye ahịa aha ya bụ Augustine Packington mee nkwekọrịta ịzụrụ akwụkwọ ọ bụla Tyndale dere, gụnyere New Testament ahụ, ka e wee suo ha ọkụ. E so Tyndale dokwaa nke a, bụ́ onye Packington soworo mee nkwekọrịta. Chronicle nke Halle na-asị: “Bishọp ahụ nwetara akwụkwọ ndị ahụ, Packington nwetara ekele, ma Tyndale nwetara ego. Mgbe e mesịrị ka e biri ọtụtụ Agba Ọhụrụ ọzọ, ha nubatara enubata n’England.”
N’ihi gịnị ka ndị ụkọchukwu ji na-emegide nsụgharị Tyndale n’ụzọ dị ilu otú a? Ebe Vulgate ahụ dị n’asụsụ Latin na-ekpuchi ihe odide ahụ dị nsọ, nsụgharị Tyndale site na Grik mbụ na nke mbụ ya wepụtara ozi Bible n’okwu doro anya nye ndị Bekee. Dị ka ihe atụ, Tyndale họọrọ ịsụgharị okwu Grik bụ́ a·gaʹpe ná 1 Ndị Kọrint isi 13 dị ka “ịhụnanya” kama “obi ebere.” O siri ọnwụ n’iji “ọgbakọ” mee ihe kama “chọọchị” iji mesie ike ndị na-efe ofufe, ọ bụghị ụlọ chọọchị. Otú ọ dị, ihe ikpeazụ kpasuru ndị ụkọchukwu iwe bịara mgbe Tyndale ji “okenye” dochie “ụkọchukwu” ma jiri “chegharịa” mee ihe kama iji “ime ọpịpịa,” si otú ahụ na-anapụ ndị ụkọchukwu ikike ndị ụkọchukwu ha. David Daniell na-ekwu banyere nke a, sị: “Pọgatrị adịghị ya; e nweghị nkwupụta mmehie ná ntị otu onye na ọpịpịa. Ihe nkwado abụọ nke akụ̀ na ụba na ikike Chọọchị dakpọrọ.” (William Tyndale—A Biography) Nke ahụ bụ ihe ịma aka nsụgharị Tyndale wepụtara, nkà mmụta oge a na-akwadokwa izi ezi nke nhọrọ okwu ya n’ụzọ zuru ezu.
Antwerp, Nraranye, na Ọnwụ
N’agbata 1526 na 1528, Tyndale kwagara Antwerp, ebe ọ pụrụ inwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe n’etiti ndị ahịa bụ́ ndị England. N’ebe ahụ o dere The Parable of the Wicked Mammon, The Obedience of a Christian Man, na The Practice of Prelates. Tyndale gara n’ihu n’ọrụ nsụgharị ya, bụrụkwa onye mbụ jiri aha Chineke, bụ́ Jehova, mee ihe ná nsụgharị Bekee nke Akwụkwọ Nsọ Hibru. Aha ahụ pụtara ihe karịrị 20 ugboro.
Ogologo oge nile Tyndale nọnyeere enyi ya na onye inyeaka ya bụ́ Thomas Poyntz n’Antwerp, ọ nọ ná nchebe pụọ n’atụmatụ nile nke Wolsey na ndị nledo ya. Ọ ghọrọ onye a ma ama n’ihi nlekọta ya nke ndị ọrịa na ndị ogbenye. E mesịa, onye England bụ́ Henry Phillips ji aghụghọ nweta ntụkwasị obi Tyndale. N’ihi ya, na 1535, a raara Tyndale nye, a kpụgakwa ya Vilvorde Castle, kilomita iri n’ebe ugwu Brussels. A tụrụ ya mkpọrọ n’ebe ahụ ruo ọnwa 16.
A pụghị ikwu kpọmkwem onye goro Phillips ọrụ, ma a na-enyo Bishop Stokesley enyo, bụ́ onye nọworo na-akpọ “ndị jụrụ okwukwe” ọkụ na London. N’àkwà ọnwụ ya na 1539, Stokesley “ṅụrịrị ọṅụ na n’oge ndụ ya ọ kpọwo iri mmadụ ise jụrụ okwukwe ọkụ,” ka W. J. Heaton na-ekwu n’akwụkwọ bụ́ The Bible of the Reformation. William Tyndale so n’ọnụ ọgụgụ ahụ, bụ́ onye a nyagburu tupu a kpọọ anụ ahụ ya ọkụ n’ihu ọha n’October 1536.
Ndị ọkà mmụta okpukpe atọ sitere na Louvain University nke ndị Katọlik, bụ́ ebe Phillips denyeworo aha, so n’òtù ikpe kpere Tyndale ikpe. Ndị ụkọchukwu atọ si Louvain na ndị bishọp atọ gụnyere ndị oké ozu ndị ọzọ nọkwa ya ịhụ ka a mara Tyndale ikpe ịjụ okwukwe ma napụ ya ọkwá ụkọchukwu ya. Ha nile ṅụrịrị ọṅụ n’ihi ọdịda ya n’ihe dị ka n’afọ ndụ nke 42.
“Tyndale,” ka onye odeakụkọ ndụ mmadụ bụ́ Robert Demaus kwuru n’ihe karịrị otu narị afọ gara aga, “pụtara ìhè n’oge nile maka ịkwụwa aka ọtọ ya n’atụghị egwu.” Nye John Frith, onye ya na ya rụkọrọ ọrụ nke Stokesley kpọrọ ọkụ na London, Tyndale dere, sị: “Agbanweghị m otu mkpụrụ okwu nke okwu Chineke n’imegide akọ na uche m, m gaghị emekwa ya taa, a sị na e nye m ihe nile dị n’ụwa, ọ sọ ya ya bụrụ ihe ụtọ, nsọpụrụ, ma ọ bụ akụ̀ na ụba.”
Otú ahụ ka o si bụrụ na William Tyndale nyere ndụ ya maka ihe ùgwù nke inye ndị England Bible nke ha pụrụ ịghọta n’ụzọ dị mfe. Lee ụgwọ dị elu ọ kwụrụ—ma lee onyinye dị oké ọnụ ahịa ọ bụ!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ngwa ngwa e bikwasịrị Fidei Defensor ná mkpụrụ ego ndị e ji eme ihe n’alaeze ahụ, Henry kwukwara ka a na-enye ndị ga-anọchi ya ùtú aha a. Taa ọ na-apụta na gburugburu isi onye eze ná mkpụrụ ego Britain dị ka Fid. Def., ma ọ bụ nanị dị ka F.D. N’ụzọ na-akpali mmasị, e mesịrị binye “Onye Na-agbachitere Okwukwe” n’okwu nraranye nke Eze James n’ime King James Version nke 1611.
b E jighị ọnụ ọgụgụ a n’aka; ụfọdụ ndị na-asị 3,000.
[Igbe dị na peeji nke 29]
NSỤGHARỊ NDỊ MBỤ
ARỊRỊỌ Tyndale maka nsụgharị Bible gaa n’asụsụ nke ndị nkịtị abụghị nke ezi uche na-adịghị ya ma ọ bụ nke a na-emetụbeghị mbụ. E mere otu nsụgharị gaa n’Anglo-Saxon (asụsụ Bekee oge gboo) na narị afọ nke iri. E kesawo Bible ndị e biri ebi bụ́ ndị e si na Latin sụgharịta ná ngwụsị narị afọ nke 15 na Europe n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla: German (1466), Italian (1471), French (1474), Czech (1475), Dutch (1477), na Catalan (1478). Na 1522, Martin Luther bipụtara New Testament ya n’asụsụ German. Ajụjụ Tyndale agwụla gịnị mere a gaghị enye England ikike ime otu ihe ahụ.
[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 26]
Bible e senyere n’azụ: © The British Library Board; William Tyndale: Site n’ikike obi ọma nke Onye Isi Ụlọ Akwụkwọ, Ndị Òtù, na Ụmụ Akwụkwọ nke Hertford College, Oxford