Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 11/15 p. 30
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Aha Chineke?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • Aha Chineke
    Teta!—2017
  • Jehova Na-eme Ka E Too Aha Ya
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • Otú Ị Pụrụ Isi Mara Aha Chineke
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 11/15 p. 30

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ná Ndị Filipaị 2:9, Pọl kwuru banyere Jisọs, sị: “Chineke welikwara Ya elu nke ukwuu, werekwa amara nye Ya aha ahụ nke karịrị aha nile ọ bụla elu.” Gịnị bụ aha ọhụrụ a? Ọ bụrụkwa na Jisọs dị ala n’ebe Jehova nọ, olee otú aha Jisọs si di elu karịa aha nile ọ bụla?

Ndị Filipaị 2:8, 9 na-agụ, sị: “Ebe a hụrụ Ya ka Ọ [Jisọs] dị ka mmadụ n’oyiyi Ya, O wedakwara Onwe ya, wee bụrụ Onye na-aṅa ntị ruo ọnwụ, bụ́ ọnwụ nke [osisi ịta ahụhụ, NW]. N’ihi nke a Chineke welikwara Ya elu nke ukwuu, werekwa amara nye Ya aha ahụ nke karịrị aha nile ọ bụla elu.”

Akụkụ ihe odide a apụtaghị na ebe nanị Jehova nwere aha kasị nnọọ aha nile ọ bụla elu, na Jisọs na Jehova aghaghị ịbụ otu onye ahụ. Dị ka ihe a na-akọ ná Ndị Filipaị isi nke 2 na-egosi, Jisọs natara aha ya e buliri elu mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ. Tupu mgbe ahụ, o nweghị ya. N’aka nke ọzọ, Jehova abụwo mgbe nile onye kasị elu, ọ dịbeghịkwa mgbe ọnọdụ ya gbanwere. Eziokwu bụ na Jisọs natara aha karịrị nke o nwere tupu ije ozi elu ụwa ya elu na-anwapụta na ya na Jehova abụghị otu. Mgbe Pọl sịrị na e nyere Jisọs aha karịrị aha nile ọ bụla elu, o bu n’uche na Jisọs nwere ugbu a aha kachasị elu n’etiti ihe nile Chineke kere.

Gịnị bụ aha dị elu nke Jisọs? Aịsaịa 9:6 na-enyere anyị aka ịza. N’ibu amụma banyere Mesaịa ahụ na-abịanụ, bụ́ Jisọs, amaokwu ahụ na-asị: “Ịbụ onye isi ga-adịkwasịkwa n’ubu ya: a ga-akpọkwa aha ya Onye ebube, Onye ndụmọdụ, Chineke Nke bụ Dike, Nna Nke bụ Nna mgbe nile ebighị ebi, Onyeisi Udo.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) N’ebe a “aha” Jisọs metụtara ọnọdụ na ikike ya dị elu, nke bụkwa ụzọ anyị si na-aghọta “aha ahụ nke karịrị aha nile ọ bụla elu” nke e hotara ná Ndị Filipaị 2:9. E nyere ikpere ọ bụla iwu igbu n’ihu Jisọs n’ịnakwere ọnọdụ ikike ya dị elu nke Jehova nyeworo ya—ọnọdụ ikike karịrị nke e nyere ihe ọ bụla ọzọ e kere eke. Okwu ahụ bụ “ọ bụla” ná nsụgharị a abụghị nke e gosipụtara kpọmkwem n’ihe odide Grik e si weta ya, ma e nyere echiche ya site ná nghọta nke amaokwu ahụ. “Aha” Jisọs akarịghị aha nke onwe ya kama ọ karịrị aha ihe e kere eke ọ bụla.

Lee ka anyị si nwee obi ụtọ isonyere ndị mmụọ ozi nile na ụmụ mmadụ nile na-ekwesị ntụkwasị obi n’igbu ikpere n’ala n’ịnakwere aha Jisọs! Anyị na-eme nke a site n’ido onwe anyị n’okpuru Jisọs n’ọnọdụ e buliri elu na nke ike nke Jehova nyere ya—“ka e wee nye Chineke, bụ́ Nna, otuto.”—Ndị Filipaị 2:11; Matiu 28:18.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya