Ọ Dịghị Mgbe Jehova Hapụrụ Anyị
DỊ KA NASHO DORI SI KỌỌ
Mbreshtan bụ obodo nta dị n’elu ugwu n’ebe ndịda Albania, nke na-adịghị anya site na Gris. N’ebe ahụ ka a mụrụ m na 1907. Mgbe m gbara afọ ise, m malitere ịga ụlọ akwụkwọ ahụ e ji Grik akụzi ihe, ma a kwụsịtụrụ agụmakwụkwọ m mgbe ndị agha Itali wakporo Albania n’oge Agha Ụwa Mbụ. Mgbe agha ahụ bisịrị, m maliteghachiri agụmakwụkwọ m kama n’asụsụ Albanian.
ỌBỤ ezie na nne na nna m ejighị okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu, ha na-edebe ọdịnala nke Chọọchị Orthodox nke Albania. Nwanne nna nna m bụ onye ụkọchukwu na Mbreshtan, ya mere m rụrụ ọrụ na chọọchị ma jiri anya m hụ ihe na-aga ebe ahụ. Ememe okpukpe ya dị iche iche yichara nnọọ ihe efu, ihu abụọ ya kwa nyere m nsogbu n’obi.
N’ịgbaso omenala obodo, nne na nna m họtaara m otu nwa agbọghọ ka m lụọ. Argjiro sitere n’obodo nta dị nso bụ́ Grabova, anyị lụkwara na 1928, mgbe ọ gbara afọ 18.
Ịmụ Eziokwu Bible
Ihe dị ka n’oge ahụ m kpesaara otu nwa nwanne nna m si United States bịa nleta banyere Chọọchị Orthodox. “N’America, ná nso ụlọ m,” ka ọ zaghachiri, “e nwere otu ìgwè mmadụ n’enweghị chọọchị, ma ha na-amụ Bible.” Echiche nke ịmụ Bible n’enweghị chọọchị masịrị m. Ya mere m jụrụ ya ma ọ̀ ga-ezitere m ụfọdụ akwụkwọ e ji amụ Bible.
M chefuru kpam kpam banyere nkwurịta okwu anyị ruo ihe dị ka otu afọ n’ihu mgbe m natara otu ngwugwu si Milwaukee, Wisconsin. N’ime ya e nwere akwụkwọ bụ́ The Harp of God n’asụsụ Albanian na Ụlọ Nche n’asụsụ Grik. M nyobara anya n’ime akwụkwọ ahụ ma hụ ebe e hotara ezi chọọchị ahụ. Nke ahụ kpasuru m iwe. ‘O nweghị ihe m ji chọọchị eme,’ ka m gwara onwe m. Ya mere agụghị m akwụkwọ ahụ nke ọma.
Na 1929, m banyere ọrụ agha, e zijekwara m n’obodo ukwu bụ́ Tiranë, isi obodo Albania. N’ebe ahụ m zutere Stathi Muçi, bụ́ onye na-agụ Bible Grik. “Ị̀ na-aga chọọchị?” ka m jụrụ. “Ee e,” ka ọ zara. “M hapụrụ chọọchị. Abụ m otu onye n’ime Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile.” Mụ na onye soja ọzọ sooro Stathi gaa nzukọ na Sunday. N’ebe ahụ m mụtara na ezi chọọchị ahụ abụghị ụlọ ma ọ bụ okpukpe, kama ọ bụ nke ndị ohu Kraịst e tere mmanụ mejupụtara. Ugbu a aghọtara m ihe The Harp of God na-ekwu.
Nasho Idrizi na Spiro Vruho esiwo United States lọta Albania n’etiti afọ ndị 1920, ha nọkwa na-agbasa eziokwu Bible nke ha mụtaworo n’ebe ahụ. M malitere iso Ndị Mmụta Bible ole na ole na-aga nzukọ na Tiranë. Ngwa ngwa o doro m anya na mụ achọtawo nzukọ Jehova. Ya mere n’August 4, 1930, e mere m baptism n’otu osimiri dị nso.
Mgbe nke ahụ gasịrị m laghachiri Mbreshtan ịga n’ihu n’ọrụ m nke imezi akpụkpọ ụkwụ. Ma nke kasị mkpa, m malitekwara isoro ndị ọzọ na-ekerịta eziokwu Bible ndị m mụtaworo. M ga-agwa ha, sị: “Jisọs Kraịst adịghị ka ihe oyiyi dị n’ime chọọchị. Ọ dị ndụ!”
Ime Nkwusa n’Agbanyeghị Mmegide
Ahmed Bey Zogu weghaara ọchịchị na 1925, mee onwe ya Eze Zog Mbụ na 1928 ma chịa ruo 1939. Onye o mere minista nke ihe ndị ruuru mmadụ nyere nkwado maka ọrụ ndị Kraịst anyị. Ka o sina dị, anyị nwere nsogbu dị iche iche. Nke a bụ n’ihi na Musa Juka, minista okwu ihe na-eme n’ime obodo dị n’aka, na popu nọ na Rom nwere mmekọrịta chiri anya. Juka nyere iwu na nanị okpukpe atọ ka a a ga-akwado—Alakụba, Orthodox, na Roman Katọlik. Ndị uwe ojii nwara ijichi akwụkwọ anyị nile ma kwụsị anyị ime nkwusa, ma ha emelighị ya.
N’afọ ndị 1930, m na-ejekarị eleta Berat, obodo dị ukwuu karị n’Albania bụ́ ebe Mihal Sveci si na-eduzi ọrụ nkwusa anyị. Anyị mere ndokwa maka ime njem nkwusa gburugburu mba ahụ. N’otu mgbe e zijere m n’obodo Shkodër ruo izu abụọ, m nwekwara ike itinye ọtụtụ akwụkwọ. Na 1935 ụfọdụ n’ime anyị jikọtara aka jiri ego gbaziri otu bọs iji mee nkwusa n’obodo Këlcyrë. E mesịa e mere ndokwa maka nkwusa ka ukwuu nke Albania maka obodo Përmet, Leskovik, Ersekë, Korçë, Pogradec, na Elbasan. Anyị gazuru ozi ahụ na Tiranë n’ezi oge iji mee Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst.
Nri ime mmụọ anyị nwere nyeere anyị aka isi ike n’ime mmụọ, ya mere ọ dịghị mgbe anyị nwere mmetụta nke ịbụ ndị a hapụrụ. Site na 1930 ruo 1939, m natara Ụlọ Nche n’asụsụ Grik mgbe nile. Ihe mgbaru ọsọ m bụ ịgụ Bible ọ dịkarịa ala otu hour kwa ụbọchị, bụ́ nke m mere ruo ihe dị ka 60 afọ tupu mụ aghara ịdị na-ahụzikwa ụzọ. Ọ bụ nanị n’oge na-adịbeghị anya ka Bible dum pụtara n’asụsụ Albanian, ya mere obi dị m ụtọ na m mụrụ asụsụ Grik na nwata. Ndịàmà Albania ndị ọzọ nọ n’oge ndị mbụ ahụ mụkwara ịgụ Grik ka ha wee nwee ike ịgụ Bible dum.
Na 1938, e mere Argjiro baptism. Ka ọ na-erule 1939 a mụwo asaa n’ime ụmụ iri anyị. N’ụzọ dị mwute, atọ n’ime ụmụ asaa anyị mbụ nwụrụ mgbe ha ka dị na nwata.
Ihe Isi Ike n’Oge Agha Ụwa nke Abụọ
N’April 1939, ntakịrị oge tupu mmalite nke Agha Ụwa nke Abụọ, ndị agha Fascism nke Itali lụsoro Albania agha. Ngwa ngwa nke ahụ gasịrị a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu, ma ìgwè nta anyị nke ihe dị ka 50 ndị nkwusa Alaeze gara n’ihu na-eme nkwusa. E jichiri ma bibie ihe dị ka 15,000 akwụkwọ na akwụkwọ nta anyị n’oge Agha Ụwa nke Abụọ.
Jani Komino nwere ọnụ ụlọ ukwu a na-akwasa ihe maka akwụkwọ bụ́ nke a rụnyere n’ụlọ ya. Mgbe ndị agha Itali matara na e biri akwụkwọ ndị ahụ na United States, iwe were ha. “Unu bụ ndị na-agbasa ozi ụgha! United States na-emegide Itali!” ka ha kwuru. E jidere ụmụnne abụọ na-anụ ọkụ n’obi bụ́ ụmụ okorobịa, bụ́ Thomai na Vasili Cama, mgbe a nụkwara na akwụkwọ ha na-ekesa sitere n’aka Komino, e jidekwara ya. N’oge na-adịghị anya ndị uwe ojii kpọrọ m òkù maka ịgba m ajụjụ ọnụ.
“Ị̀ maara ndị ikom a?” ka ha jụrụ.
“Ee,” ka m zara.
“Ì so ha na-arụ ọrụ?”
“Ee,” ka m zara. “Anyị bụ Ndịàmà Jehova. Anyị adịghị emegide gọọmenti. Anyị nọpụrụ iche.”
“Ùnu anọwo na-ekesa akwụkwọ a?”
Mgbe m zara ee, ha tụrụ m ị́gà, a tụnyekwara m n’ụlọ mkpọrọ na July 6, 1940. N’ebe ahụ m sonyeere mmadụ ise ọzọ sitere n’obodo m—Josef Kaci, Llukan Barko, Jani Komino, na ụmụnne abụọ aha nna ha bụ Cama. Mgbe anyị nọ n’ụlọ mkpọrọ anyị zutere Ndịàmà atọ ọzọ—Gori Naçi, Nikodhim Shyti, na Leonidas Pope. A fakọtara anyị mmadụ itoolu n’ụlọ nga dị 1.8 mita n’ogologo na 3.7 mita n’obosara!
Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, e kekọtara anyị nile agbụ ma kpụrụ anyị gaa n’obodo ukwu bụ́ Përmet. Ọnwa atọ n’ihu a kpọfere anyị n’ụlọ mkpọrọ dị na Tiranë ma jichie anyị ruo ọnwa asatọ ọzọ n’ewepụghị okwu anyị n’ụlọikpe.
N’ikpeazụ, a kpụpụrụ anyị n’ụlọikpe ndị agha. A mara mụ na Nwanna Shyti ikpe ịga nga 27 ọnwa, Nwanna Komino ịga 24 ọnwa, a tọhapụkwara ndị ọzọ mgbe ọnwa 10 gasịrị. A kpọfere anyị n’ụlọ mkpọrọ dị na Gjirokastër, bụ́ ebe Nwanna Gole Flloko nyere aka gbapụta anyị na 1943. E mesịa ezinụlọ anyị gara biri n’obodo ukwu bụ́ Përmet, bụ́ ebe m ghọrọ onye nlekọta nke otu ntakịrị ọgbakọ.
Ọ bụ ezie na a machibidoro ọrụ anyị iwu nakwa na Agha Ụwa nke Abụọ kpụ ọkụ n’ọnụ ná mba ndị gbara anyị gburugburu, anyị gara n’ihu na-eme ihe anyị pụrụ ime iji rụzuo ọrụ anyị nke ikwusa ozi Alaeze ahụ. (Matiu 24:14) Na 1944 ngụkọta nke Ndịàmà 15 nọ n’ụlọ mkpọrọ. Ma, n’oge ihe isi ike ndị a, ọ dịghị mgbe anyị nwere mmetụta nke ịbụ ndị Jehova hapụrụ.
Ndị E Lere Ule n’Okwu Nnọpụiche
Ọ bụ ezie na agha ahụ biri na 1945, ihe isi ike anyị gara n’ihu ma ọbụna ka njọ. A manyere onye ọ bụla ịtụ votu n’oge ntụliaka elu nke December 2, 1946. E lere onye ọ bụla nke nwara anwa ghara ime nke ahụ anya dị ka onye iro nke Gọọmenti. Ndị nọ n’ọgbakọ anyị na Përmet malitere ịjụ, sị, “Gịnị ka anyị kwesịrị ime?”
“Ọ bụrụ na unu atụkwasị Jehova obi,” ka m zara, “unu ekwesịghị ịjụ m ihe unu ga-eme. Unu amaraworị na ndị Jehova nọpụrụ iche. Ha abụghị akụkụ nke ụwa.”—Jọn 17:16.
Ụbọchị ntụliaka elu bịara, ndị nnọchiteanya gọọmenti bịara n’ụlọ anyị. Ha ji nwayọọ malite, “Oo, nyetụ anyị otu iko kọfị, ka anyị kparịtakwa. Ị̀ maara ihe taa bụ?”
“Ee, a na-eme ntụliaka elu taa,” ka m zara.
“I kwesịrị ime ngwa ngwa, ma ọ bụghị ya ị ga-aga n’azụ oge,” ka otu onye ọfịsa kwuru.
“Ee e, emeghị m atụmatụ ịga. Votu anyị dịịrị Jehova,” ka m zaghachiri.
“Ọ dị mma, mgbe ahụ bịa tụnyere ndị mmegide votu gị.”
M kọwara na Ndịàmà Jehova nọpụrụ iche kpam kpam. Mgbe a maara nguzo anyị nke ọma, a rụgidere anyị n’ụzọ ka ukwuu. E nyere anyị iwu ịkwụsị inwe nzukọ anyị, ya mere anyị malitere izukọ na nzuzo.
Ịlachaghi Obodo Nta nke Anyị Bi
Na 1947 mụ na ezinụlọ m laghachiri Mbreshtan. Ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị, n’otu ehihie na-atụ oké oyi nke December, a kpọrọ m n’ụlọ ọrụ nke Sigurimi (ndị uwe ojii nzuzo). “Ị̀ maara ihe mere m ji kpọọ gị?” ka ọfịsa ahụ jụrụ.
“M na-eche na ọ bụ n’ihi na ị nụwo ụfọdụ ebubo e boro m,” ka m zaghachiri. “Ma Bible na-asị na ụwa ga-akpọ anyị asị, ya mere ebubo adịghị eju m anya.”—Jọn 15:18, 19.
“Agwakwala m ihe banyere Bible,” ka o bigbọrọ ná nzaghachi. “M ga-akụpụ gị isi.”
Ọfịsa ahụ na ndị òtù ya hapụrụ ọfịs ahụ ma gwa m ka m guzoro n’èzí n’oyi. Mgbe e mesịrị ọ kpọghachiri m n’ọfịs ya ma nye m iwu ka m kwụsị nzukọ n’ebe obibi anyị. “Mmadụ ole bi n’obodo unu?” ka ọ jụrụ.
“Otu narị na iri abụọ,” ka m sịrị.
“Olee okpukpe ha na-ekpe?”
“Orthodox nke Albania.”
“Gị kwanụ?”
“Abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova.”
“Otu narị na iri mmadụ abụọ na-aga otu ụzọ, gị onwe gị na-agakwa ụzọ ọzọ?” Mgbe ahụ o nyere m iwu ịmụ kandụl na chọọchị. Mgbe m sịrị na agaghị m eme ya, ọ malitere ịkụ m ígwè. Ọ na-akụ ihe dị ka elekere anya mbụ n’ụtụtụ mgbe e mesịrị tọhapụ m.
E Mechie Mbubata Akwụkwọ
Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri, anyị malitekwara na-anata Ụlọ Nche site na post ọfịs, ma e mesịrị a dịghị ebutekwa magazin ndị ahụ. E mesịa, otu abalị n’elekere anya iri, ndị uwe ojii nzuzo kpọrọ m òkù. “Otu magazin n’asụsụ Grik erutewo,” ka a gwara m, “ọ ga-amasịkwa anyị ma ị kọwaa ihe ọ na-ekwu.”
“Amaghị m asụsụ Grik nke ọma,” ka m kwuru. “Onye agbata obi m maara ya nke ọma karị. Eleghị anya ọ pụrụ inyere unu aka.”
“Ee e, anyị chọrọ ka ị kọwaa nke a,” otu onye ọfịsa kwuru ka ọ fapụtara ụfọdụ Ụlọ Nche n’asụsụ Grik.
“Oo, ndị a bụ nke m!” ka m tiri ná mkpu. “Eenụ, m pụrụ ịkọwa nke a. Ị hụla, magazin ndị a sitere Brooklyn, New York. Ọ bụ ebe e nwere isi ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova. Abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ma o yiri ka ha dehiere adres ya. O kwesịrị ịbụ m ka e ziteere magazin ndị a, ọ bụghị unu.”
Ha enyeghị m magazin ndị ahụ, ma site n’oge ahụ ruo 1991, ihe karịrị nnọọ 40 afọ n’ihu, anyị anataghị akwụkwọ ọ bụla e ji amụ Bible n’Albania. N’afọ ndị ahụ nile, anyị gara n’ihu na-eme nkwusa, na-eji nanị Bible anyị. Ihe dị ka 20 Ndịàmà nọ n’ụlọ mkpọrọ na 1949; a mara ụfọdụ ikpe ịnọ afọ ise.
Ihe Isi Ike Amụbaa
N’afọ ndị 1950, e nyere ndị mmadụ iwu iburu akwụkwọ ndị na-egosi na ha kwadoro ndị agha. Ma Ndịàmà Jehova jụrụ iburu ụdị akwụkwọ ndị ahụ. N’ihi nke a, mụ na Nwanna Komino nọrọ ọnwa abụọ ọzọ n’ụlọ nga.
N’oge Gọọmenti kwere ka e nwee ụfọdụ okpukpe, anyị nwetụrụ nnwere onwe. Otú ọ dị, na 1967 a machibidoro okpukpe nile iwu, na-eme ka ọha mara na Albania bụ mba na-ekweghị na Chineke kpam kpam. Ndịàmà gara n’ihu na-agbalị inwe nzukọ, ma ọ ghọrọ ihe tara nnọọ akpụ. Ụfọdụ n’ime anyị dụnyere akpa pụrụ iche na kotu anyị ka anyị nwee ike izo otu ntakịrị Bible. Mgbe ahụ anyị ga-aga n’ubi ịgụ ya.
E jidere Ndịàmà nọ na Tiranë, a makwara atọ ikpe ịga ogige ọrụ mmanye dịpụrụ adịpụ ịnọ afọ ise. N’ihi ya, ezinụlọ ha tara ahụhụ. E zipụghị anyị bụ́ ndị sitere ná ntakịrị obodo ndị dịpụrụ adịpụ n’ihi na e leghị anyị anya dị ka ihe iyi egwu siri ike. Ma nnọpụiche anyị dujere n’iwepụ aha anyị ná ndepụta ndị ga-anata ihe oriri. N’ihi ya, ndụ tara nnọọ akpụ. Ọzọkwa, abụọ ọzọ n’ime ụmụ anyị nwụrụ. Ma ọ dịghị mgbe anyị nwere mmetụta na Jehova ahapụwo anyị.
Egwu dị ebe nile n’Albania. A na-enyo onye ọ bụla, ndị uwe ojii nzuzo na-edekwa akụkọ banyere onye ọ bụla nwara ikwu echiche dị iche na nke òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke na-achịnụ. Ya mere anyị na-akpachapụ nnọọ anya banyere ide akụkọ banyere ọrụ anyị. Anyị apụghị izukọ maka agbamume ime mmụọ n’ìgwè ndị buru ibu karịa abụọ ma ọ bụ atọ. Ma, ọ dịghị mgbe anyị kwụsịrị ime nkwusa.
Ná mgbalị ịkpata ọgba aghara n’etiti ụmụnna, ndị uwe ojii nzuzo ahụ gbasara akụkọ ụgha bụ́ na Onyeàmà a ma ama na Tiranë bụ onye nledo. Nke a mere ka ụfọdụ ghara inwekwa obi ike, ọ kpaghasịtụkwara ịdị n’otu anyị. N’ihi enweghị akwụkwọ ndị ọhụrụ ọ bụla e ji amụ Bible na esoghị nzukọ Jehova a na-ahụ anya enwe mmekọrịta ọ bụla, ole na ole dara n’ihi egwu.
Tụkwasị, ndị ọchịchị gbasara akụkọ na-ezighị ezi na Spiro Vruho, onye okenye bụ́ onye Kraịst nke a na-akwanyere ùgwù nke ukwuu n’Albania, egbuwo onwe ya. “Ị hụla,” ka ha kwuru, “ọbụna Vruho achịliwo aka elu.” O mechara pụta ìhè na n’ezie e gburu Nwanna Vruho egbu.
Na 1975, mụ na Argjiro binyeere nwa anyị nwoke na Tiranë ruo ọnwa ole na ole. N’oge ntụliaka elu, ndị ọchịchị n’obodo ukwu ahụ rụgidere anyị site n’iyi anyị egwu, sị: “Ọ bụrụ na unu atụnyeghị votu, anyị ga-anapụ nwa unu nwoke ọrụ ya.”
“Nwa m nwoke anọwo n’ọrụ ya kemgbe 25 afọ,” ka m zaghachiri. “Unu nwere ihe ndekọ sara mbara banyere ya na ezinụlọ ya. Atụbeghị m votu kemgbe ihe karịrị 40 afọ. Ihe ọmụma a na-adịkarị n’ihe ndekọ mmadụ. Ọ bụrụ na ọ dịghị otú ahụ, mgbe ahụ ihe ndekọ unu ezighị ezi. Ọ bụrụ na ọ dị n’ihe ndekọ unu, mgbe ahụ unu eguzosighị ike n’ihe nye òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị site n’ikwe ya ka ọ rụọ ọrụ ruo ọtụtụ afọ dị otú a.” Mgbe ha nụrụ nke a, ndị ọchịchị ahụ sịrị na ọ bụrụ na anyị alaghachi Mbreshtan, ha agaghị aga n’ihu n’okwu ahụ.
Mgbanwe Ndị Dị Ịrịba Ama
Na 1983 anyị sitere Mbreshtan kwaga n’obodo ukwu bụ́ Laç. Ntakịrị oge nke ahụ gasịrị, na 1985, onye ọchịchị aka ike ahụ nwụrụ. Ọ chịwo kemgbe ntụliaka elu ndị mbụ ahụ a manyere mmadụ amanye na 1946. Ka oge na-aga, a kwaturu ihe oyiyi ya, bụ́ ndị nanị ha guzoworo n’ámá Tiranë na nke Stalin.
N’oge afọ iri ndị a a machibidoro ọrụ anyị iwu, e mekpọrọ ọtụtụ Ndịàmà ọnụ, e gbukwara ụfọdụ. Otu nwoke gwara ụfọdụ Ndịàmà n’okporo ámá, sị: “N’oge ndị Kọmunist, anyị nile hapụrụ Chineke. Nanị Ndịàmà Jehova nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya n’agbanyeghị ule na ihe isi ike dị iche iche.”
Ka e nyekwuru nnwere onwe, mmadụ itoolu nyere akụkọ ozi n’ozi ndị Kraịst na June 1991. Na June 1992, otu ọnwa mgbe e wepụsịrị mmachibido iwu ahụ, 56 mmadụ keere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ. Ná mmalite afọ ahụ anyị ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu inwe 325 ndị bịara Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst. Kemgbe ahụ ọnụ ọgụgụ ndị na-eme nkwusa amụbawo gaa n’ihe karịrị 600, ngụkọta nke 3,491 mmadụ bịakwara Ememe Ncheta n’April 14, 1995! N’afọ ndị na-adịbeghị anya ọ bụrụwo ihe ọṅụ na-enweghị atụ nye m ịhụ ọtụtụ ndị na-eto eto a na-atụkwasị n’ọgbakọ anyị.
Argjiro anọgidewo na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova ma na-eguzosi ike n’ihe nye m ọtụtụ afọ ndị a. Mgbe m nọ n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ na-eme njem n’ọrụ nkwusa ahụ, o ji ndidi na-elekọta mkpa ezinụlọ anyị n’emeghị mkpesa. E mere otu n’ime ụmụ anyị ndị nwoke na nwunye ya baptism na 1993. Nke ahụ mere anyị obi ụtọ nke ukwuu.
Ịdịrị Nanị Alaeze Chineke
Obi dị m ụtọ ịhụ ka nzukọ Jehova n’Albania dị nnọọ n’otu ma na-enweta ịba ụba ime mmụọ. Mmetụta m dị ka nke Simeọn meworo agadi nọ na Jerusalem bụ́ onye e nyere ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke ịhụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa mgbe dị anya tupu ya anwụọ. (Luk 2:30, 31) Ugbu a mgbe a jụrụ m ụdị gọọmenti m họọrọ, m na-asị: “Ma ọchịchị ndị Kọmunist ma usoro akụ̀ na ụba dị n’aka ndị nkịtị enweghị nke m họọrọ. Ma ọ̀ bụ ndị mmadụ ma ọ bụ Gọọmenti nwe ala adịghị mkpa. Gọọmenti na-arụ ụzọ, wetara obodo nta ndị dịpụrụ adịpụ ọkụ eletrik, ma weta ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịdị n’usoro. Otú ọ dị, ọchịchị Jehova, Alaeze eluigwe ya, bụ nanị ngwọta dịịrị nsogbu nile siri ike na-eche Albania nakwa akụkụ ndị ọzọ nke ụwa ihu.”
Ihe ndị ohu Chineke na-eme n’ụwa nile n’ikwusa banyere Alaeze Chineke abụghị ọrụ nke mmadụ ọ bụla. Nke a bụ ọrụ Chineke. Anyị bụ ndị ohu ya. Ọ bụ ezie na anyị nwere ọtụtụ ihe isi ike n’Albania ma bụrụ ndị na-esoroghị nzukọ Jehova a na-ahụ anya mekọọ ihe ruo ogologo oge, ọ dịghị mgbe ọ hapụrụ anyị. Mmụọ ya nọ ebe a mgbe nile. O duru anyị n’ihe nile anyị mere. Ahụwo m nke a ná ndụ m nile.