Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 2/1 p. 3
  • À Zọpụtawo Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • À Zọpụtawo Gị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Anyị Na-aghaghị Ime Ka A Zọpụta Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Nzọpụta Ihe Ọ Pụtara n’Ezie
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Olee Otú Jizọs Si Azọpụta Anyị?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Baịbụl Ọ̀ Na-akụzi na ‘A Zọpụtahaala Mmadụ, A Zọpụtachaala Ya’?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 2/1 p. 3

À Zọpụtawo Gị?

JOHNNY dị afọ iri mgbe otu nwoke kwụsịrị ya n’ọma ahịa ma jụọ, sị: “Nwa okorobịa, ị̀ narawo Jisọs Kraịst dị ka Onyenwe gị na Onye Nzọpụta gị?” Nke ahụ dara dị ka ajụjụ dị mgbagwoju anya nye Johnny, ebe o kwerewororị na Jisọs mgbe nile. Ya mere ọ zara, sị, “Eenụ.” “Toonụ Onyenwe anyị!” ka nwoke ahụ tiri ná mkpu ka mmadụ nile nụrụ. “A zọpụtaworo Kraịst mkpụrụ obi ọzọ!”

Nzọpụta ọ̀ dị mfe otú ahụ n’ezie? À “zọpụtawo” Johnny site n’oge ahụ o kwuru okwu ndị ahụ, n’agbanyeghị ihe ọ bụla ọ ga-eme ná ndụ ya nile fọdụrụnụ? Ọtụtụ ndị obi ha ziri ezi ga-aza ee. Ụfọdụ traktị okpukpe na-asị ka i detuo ụbọchị a “zọpụtara” gị ka i nwee ike icheta ya.

Otu onye ụkọchukwu dere na “ozugbo ahụ e gosiri okwukwe nkịtị na Kraịst . . . e kwubiela ihe ga-abụ ọdịnihu mmadụ n’ụzọ na-adịgide adịgide.” Ọ zọọrọ na Bible na-asị na nzọpụta dabeere n’otu “ngosipụta nke okwukwe, ọ bụghị n’ịnọgide na-enwe okwukwe.” Onye ọzọ na-ede ihe banyere okpukpe dere, sị: “Nke a bụ ọrụ a rụsịworo. E mezuworo gị ya . . . ‘Ịlụ agha gị agwụsịwo.’ ‘E wepụwo mmehie’ gị.” Ma ọbụna ndị kwenyesiri ike na nke a bụ eziokwu pụrụ ịhụ nsogbu n’ebe a. O doro anya na ọtụtụ ndị a gwaworo na a “zọpụtawo” ha adịghị ebi ndụ n’ụzọ Bible na-asị na ha kwesịrị. Nkọwa a na-enwekarị bụ na ma eleghị anya ha ‘anarabeghị’ Kraịst n’ezie.

Ya mere, gịnị ka “ịnara” Jisọs pụtara n’ezie? Ọ̀ bụ otu ngosipụta nke okwukwe, ka ọ̀ bụ ụzọ ndụ na-aga n’ihu? Nkwenkwe anyị ọ̀ bụ nke na-aghaghị isi ike n’ụzọ zuru ezu iji kwalie anyị ime ihe? Ànyị pụrụ n’ezie ịnara abamuru nke àjà Jisọs n’enweghị ibu ọrụ nke isoro ya?

Ọtụtụ ndị mmadụ chọrọ ngọzi nile ma ọ bụghị ibu ọrụ nke iso Jisọs na irubere ya isi. N’ezie, okwu ahụ bụ́ “rube isi” na-enyekarị ha nsogbu n’obi. Ma Jisọs sịrị: “Bịakwa, so m.” (Luk 18:18-23) Bible na-ekwukwa, sị: “Ndị na-aṅaghị ntị ozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs . . . ga-ahụ ahụhụ mmehie nke ọmụma ikpe ziri ezi, bụ́ mbibi ebighị ebi.”—2 Ndị Tesalọnaịka 1:8, 9; Matiu 10:38; 16:24.

Bible na-ekwu ọtụtụ ihe ndị na-ewelite ajụjụ ndị e kwesịrị ichebara echiche banyere ihe a kụziworo banyere nzọpụta. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ịchọpụta ihe Bible na-ekwu n’ezie n’isiokwu a, ị ga-ahụta peji ndị na-esonụ dị ka ihe na-adọrọ mmasị karịsịa. Saghee Bible gị, ma gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ e hotara iji hụ ihe Jisọs na ndị ozi ya kụziri banyere okwu a dị oké mkpa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya