Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 2/15 p. 3-4
  • Ime Ihe Ike Dị Ebe Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ime Ihe Ike Dị Ebe Nile
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ime Ihe Ike n’Ebe Obibi
  • Ime Ihe Ike n’Ụlọ Ọrụ
  • Ime Ihe Ike n’Egwuregwu na Ntụrụndụ
  • Ime Ihe Ike n’Ụlọ Akwụkwọ
  • Àgwà Ime Ihe Ike
  • Olee Otú Chineke Si Ele Ime Ihe Ike Anya?
    Teta!—2002
  • Tigbuo Zọgbuo Ọ̀ Ga-ala Ala n’Ụwa A?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Tigbuo Zọgbuo
    Teta!—2015
  • N’ihi Gịnị Ka E Ji Enwe Ọtụtụ Mpụ Ime Ihe Ike Ugbu A?
    Teta!—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 2/15 p. 3-4

Ime Ihe Ike Dị Ebe Nile

KA Ọ nọ n’ime ụgbọ ala ya na-echere ka ọkụ eletrik nke na-eduzi ụgbọ ala gbanwee, ọkwọ ụgbọ ala ahụ hụrụ na mberede ka otu nwoke gbara agba na-abịakwute ya, jiri olu ike na-ekwu okwu ịkpọ iyi nile, na-emegharị aka ọkpọ ọ pịrị. Ọkwọ ụgbọ ala ahụ mere ngwa ngwa ịgbachi ụzọ ya nile ma mechie window ya nile, ma nwoke ahụ gbara agba nọgidere na-abịa. Ka ọ bịarutere, nwoke ahụ nunyara ụgbọ ala ahụ ma dọọ aka n’ọnụ ụzọ ụgbọ ala ahụ. N’ikpeazụ, ná mwute o buliri aka ọkpọ ya buru ibu ma suo ya n’enyo ihu ụgbọ ala ahụ, tirisie ya.

Ihe a ọ̀ bụ ihe mere n’ihe nkiri sinima? Ee e! Nke a bụ nghọtahie okporo ụzọ n’àgwàetiti Oahu, Hawaii, bụ́ nke a ma ama n’ihi ọdịdị ịdị jụụ ya, nke dị mma n’ahụ.

Ọ bụghị ihe ijuanya. Ihe mkpọchi dị n’ọnụ ụzọ, ihe ngebichi dị na window, ndị ọrụ nche n’ụlọ dị iche iche, ọbụna ihe odide na-adị na bọs ndị na-asị “Ọkwọ ụgbọ ala adịghị eji ego”—ha nile na-ezo aka n’otu ihe: Ime ihe ike dị ebe nile!

Ime Ihe Ike n’Ebe Obibi

Eri ogologo oge e werewo ebe obibi dị ka ebe nchebe mmadụ. Otú ọ dị, echiche a na-agbanwe ngwa ngwa. Ime ihe ike ezinụlọ, bụ́ nke na-agụnye mmetọ ụmụaka, iti onye òtù ọlụlụ ihe, na igbu ọchụ, na-aghọ isiokwu e ji mere akụkọ n’ụwa nile.

Dị ka ihe atụ, “ma ọ dịkarịa ala 750,000 ụmụaka na Britain pụrụ inwe nsogbu mmetụta uche na-adịte anya n’ihi na e kpughere ha nye ime ihe ike ebe obibi,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Manchester Guardian Weekly na-ekwu. Akụkọ ahụ dabeere n’otu nnyocha nke chọpụtakwara na “atọ n’ime ụmụ nwanyị anọ a gbara ajụjụ kwuru na ụmụ ha ahụwo ka a na-eme ihe ike, ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke ụmụaka ahụ ahụwo ka e tiri mama ha ihe.” N’otu aka ahụ, dị ka magazin bụ́ U.S.News & World Report si kwuo, Òtù Bọdụ Na-enye Ndụmọdụ Banyere Mmetọ na Nleghara Ụmụaka Anya na United States na-eme atụmatụ na “2,000 ụmụaka, nke ihe ka ukwuu n’ime ha na-erubeghị afọ 4, na-anwụ kwa afọ n’aka ndị nne na nna ma ọ bụ ndị nlekọta.” Nke a gafere ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ n’ihi ihe mberede okporo ụzọ, mmiri iri mmadụ, ma ọ bụ ịda ada, ka akụkọ ahụ na-ekwu.

Ime ihe ike ebe obibi na-agụnyekwa mmetọ onye òtù ọlụlụ, bụ́ nke na-agụnye malite n’inu aka ma ọ bụ ịkwa aka ruo n’ịbụ onye a mara ọra, gbaa ụkwụ, tọnye aka n’akpịrị, tie ihe, jiri mma ma ọ bụ égbè yie egwu, ma ọ bụ ọbụna gbuo. Taakwa, ụdị ime ihe ike a na-emetụta ma ndị nwoke ma ndị nwanyị. Otu ihe ọmụmụ na-achọpụta na n’ime ihe ike ndị a kọrọ akụkọ ha n’etiti ndị di na nwunye, ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ anọ n’ime ha bụ nwoke na-amalite ha, otu ụzọ n’ụzọ anọ ọzọ bụ ụmụ nwanyị na-amalite ha, a pụkwara ịkọwa ihe fọdụziri dị ka esemokwu nke a ga-ata ha abụọ ụta.

Ime Ihe Ike n’Ụlọ Ọrụ

E wepụ ebe obibi, ụlọ ọrụ anọwo na-abụ ebe mmadụ na-achọta ịdị n’usoro, nkwanye ùgwù, na ezi àgwà. Ma nke ahụ eyikwaghị ka ọ ka dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ndekọ ọnụ ọnụgụ nke Ngalaba Ikpe Ziri Ezi nke United States wepụtara na-egosi na a na-emeso ihe karịrị 970,000 mmadụ mpụ ihe ike kwa afọ n’ụlọ ọrụ. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, “ndị ọrụ pụrụ inwe ohere dị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ịbụ ndị e mesoro ụdị ihe ike ụfọdụ n’ụlọ ọrụ,” dị ka otu akụkọ nke dị na magazin bụ́ Professional Safety—Journal of the American Society of Safety Engineers si kwuo.

Ihe na-enyekarịsị nsogbu bụ na ime ihe ike n’ụlọ ọrụ akwụsịghị n’ịba mba na okwu ọjọọ. “Ime ihe ike nke ndị ọzọ e were n’ọrụ na-emeso kpọmkwem ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ na ndị e were n’ọrụ bụ ụdị igbu ọchụ kasị amụba ngwa ngwa ugbu a na U.S.,” ka otu akụkọ ahụ na-ekwu. Na 1992, 1 n’ime ọnwụ 6 e jikọtara ya na ọrụ bụ igbu ọchụ; nye ụmụ nwanyị, ọnụ ọgụgụ ahụ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1 n’ime 2. A pụghị ịgọ agụgọ na ntiwapụ nke ime ihe ike na-abanye n’ụlọ ọrụ nke bụbu ebe dị n’usoro.

Ime Ihe Ike n’Egwuregwu na Ntụrụndụ

A chụsowo egwuregwu na ntụrụndụ dị ka ihe iji gbuo oge ma ọ bụ zuo ike iji mee ka mmadụ nwetaghachi ume ọhụrụ maka nchụso ndị ka sie ike ná ndụ. Taa ntụrụndụ bụ ụlọ ọrụ nwere ọtụtụ ijeri dollar. Iji nweta uru buru ibu site n’azụmahịa a ego dị na ya ruo n’ókè o kwere mee, ọ dịghị enye ndị na-emepụta ihe ntụrụndụ nsogbu n’uche iji ụzọ ọ bụla ruru ha aka mee ihe. Otu n’ime ụzọ dị otú ahụ bụkwa ime ihe ike.

Dị ka ihe atụ, Forbes, bụ́ magazin azụmahịa, kọrọ na otu onye na-emepụta egwuregwu vidio nwere egwuregwu agha nke na-egosi ebe otu dike na-adọbipụ isi na ọkpụkpụ azụ nke onye ya na ya na-alụ agha ka ndị na-ekiri ya nọ na-eti, “Gbuo ya! Gbuo ya!” Otú ọ dị, ụdị egwuregwu ahụ e meere otu ụlọ ọrụ na-eme egwuregwu vidio enweghị akụkụ ahụ na-egosi nkwafu ọbara. Gịnị si na ya pụta? A na-erepụ ụdị ahụ a ka mee ihe ike na ya karịa nke ya na ya na-asọ mpi ná nkezi 3 maka 2. Nke a pụtakwara ego buru ibu. Mgbe ụdị egwuregwu ndị a ndị e mere maka ikiri n’ebe obibi gbara n’ahịa, ụlọ ọrụ ndị ahụ nwetara $65 nde n’ụwa nile n’ime izu abụọ mbụ! Mgbe o metụtara uru, ime ihe ike bụ nanị nkò ọzọ e ji ekota ndị na-azụ ya.

Ime ihe ike n’egwuregwu bụ nnọọ ihe ọzọ. Ndị na-eme egwuregwu na-eji mmerụ ahụ ha pụrụ imenye mmadụ eme nganga. Dị ka ihe atụ, n’otu egwuregwu hockey e mere na 1990, e nwere 86 ntaramahụhụ—ọnụ ọgụgụ kasị elu e nwetụworo. Hour atọ na ọkara nke ime ihe ike kwụsịtụrụ egwuregwu ahụ. E nyere otu onye so na-eme egwuregwu ọgwụgwọ maka ọkpụkpụ ihu gbawara agbawa, elu mkpụrụ anya chihịara echihịa na otu ọnyá miri emi. Gịnị kpatara ụdị ime ihe ike ahụ? Otu onye so na-eme egwuregwu kọwara, sị: “Mgbe i meriri n’otu egwuregwu nke jupụtara ná mmetụta uche, ya na ịlụ ọgụ dị ukwuu, ị na-ala ụlọ na-enwe mmetụta nke ịnọ ndị òtù egwuregwu gị nso karị. Echere m na ọgụ ndị ahụ mere ka ọ bụrụ egwuregwu ime mmụọ n’ezie.” N’ihe dị ukwuu n’egwuregwu nke taa, o yiri ka ime ihe ike aghọọla ọ bụghị nanị ụzọ isi nweta ihe a na-achọ kama ihe a na-achọ.

Ime Ihe Ike n’Ụlọ Akwụkwọ

A nọwo na-ele ụlọ akwụkwọ anya mgbe nile dị ka ebe e wusiri ike ebe ndị na-eto eto pụrụ ịnọ chezọọ nchegbu ha nile ma tụkwasị uche n’ịzụlite uche na ahụ ha. Otú ọ dị, taa, ụlọ akwụkwọ abụchakwaghị ebe dị nchebe na ntụkwasị obi. Otu Njụta echiche e mere na 1994 chọpụtara na ime ihe ike na òtù ndị na-eme ihe ike bụ nsogbu kachasịnụ n’ụlọ akwụkwọ ọha na eze ndị dị na United States, na-agafe mmefu ego, bụ́ nke butere ụzọ ná ndepụta ahụ n’afọ bu ya ụzọ. Ruo nnọọ n’ókè ha aṅaa ka ọnọdụ ahụ dịruru ná njọ?

Nye ajụjụ ahụ bụ́, “Ọ̀ dịtụwo mgbe e mesoro gị ihe ike n’ime ma ọ bụ gburugburu ụlọ akwụkwọ?” ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1 n’ime ụmụ akwụkwọ 4 ọ bụla a jụrụ ajụjụ zara ee. Ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ iri nke ndị nkụzi zakwara ee. Otu nnyocha ahụ chọpụtara na 13 pasent nke ụmụ akwụkwọ, ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị, kwetara na ha ejitụwo ngwá agha jee ụlọ akwụkwọ. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha zọọrọ na ha mere otú ahụ nanị ije mee tiga tiga ma ọ bụ iji chebe onwe ha. Ma otu nwata akwụkwọ dị afọ 17 gbara onye nkụzi ya égbè n’obi mgbe onye nkụzi ahụ nwara ịnapụ ya égbè ya.

Àgwà Ime Ihe Ike

A pụghị ịgọ agụgọ na ime ihe ike dị ebe nile taa. N’ebe obibi, n’ụlọ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, na ná ntụrụndụ, anyị na-ezute àgwà ime ihe ike. N’ịbụ ndị e kpughere nye ya kwa ụbọchị, ọtụtụ abịawo nakwere ya dị ka ihe dị otú o kwesịrị—ruo mgbe e mesoro ha ya. Mgbe ahụ ha na-ajụ, sị, Ọ̀ dị mgbe ọ ga-akwụsị? Gị onwe gị kwa ị̀ ga-enwe mmasị ịmata azịza ya? Ya bụrụ otú ahụ biko gụọ isiokwu na-esonụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya