Inwe Ọṅụ Ugbu A na Mgbe Ebighị Ebi
“Ka obi tọọ unu ụtọ, tegharịakwa egwu ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe nke Mụ onwe m na-eke: n’ihi na, lee, M na-eke Jerusalem ịbụ ihe ntegharị egwu ọṅụ, ndị ya kwa, ịbụ ihe obi ụtọ.”—AỊSAỊA 65:18.
1. Olee otú ezi ofufe siworo metụta ndị mmadụ kemgbe ọtụtụ narị afọ?
RUO ọtụtụ narị afọ, oké ìgwè mmadụ enwetawo ọṅụ dị ukwuu n’ijere ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ozi. Devid bụ otu n’ime ndị nwere ọṅụ n’ezi ofufe. Bible na-akọ na mgbe e bubatara igbe ọgbụgba ndụ ahụ na Jerusalem, “Devid na ụlọ Israel nile wee were iti mkpu, werekwa olu opi ike, na-ebugota igbe Jehova.” (2 Samuel 6:15) Ụdị ọṅụ ahụ dị n’ijere Jehova ozi abụghị nanị ihe gaworo aga. Ị pụrụ ikere òkè na ya. Ọbụnakwa ọ̀tụ̀tụ̀ ndị ọhụrụ nke ọṅụ pụrụ ịbụ nke gị n’isi nso!
2. E wezụga mmezu mbụ nke Aịsaịa isi nke 35 n’ahụ ndị Juu na-alaghachinụ, ole ndị taa ka mmezu ọzọ metụtara?
2 N’isiokwu bu ụzọ, anyị nyochara mmezu mbụ nke amụma ahụ na-akpali akpali nke e dekọrọ n’Aịsaịa isi nke 35. Anyị pụrụ ịkpọ nke a n’ụzọ ziri ezi amụma mweghachi n’ihi na nke ahụ bụ ihe o mesịrị bụrụ nye ndị Juu nke oge ochie. O nwere mmezu yiri nke ahụ n’oge anyị. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ dị mma, malite ná ndị ozi Jisọs na ndị ọzọ na Pentikọst 33 O.A., Jehova anọwo na-eji ndị Israel ime mmụọ eme ihe. Ndị a bụ ụmụ mmadụ e ji mmụọ nsọ Chineke tee mmanụ, bụ́ ndị ghọrọ akụkụ nke ihe Pọl onyeozi na-akpọ “Israel nke Chineke.” (Ndị Galetia 6:16; Ndị Rom 8:15-17) Chetakwa, na 1 Pita 2:9, a kpọrọ ndị Kraịst a “ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara.” Pita gara n’ihu ịkọwa ọrụ e nyere Israel ime mmụọ, sị: “Ka unu wee kwusaa ịdị mma nile nke Onye ahụ Onye kpọpụtara unu n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè Ya dị ebube.”
Otu Mmezu n’Oge Anyị
3, 4. Gịnị bụ ọnọdụ dịnụ mgbe Aịsaịa isi nke 34 mezuru n’oge a?
3 E nwere oge ná mmalite nke narị afọ a mgbe ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ nọ n’ụwa na-anọgideghị na-arụsi ọrụ ike n’ikwusa ozi dị otú ahụ. Ha anọghị na-aṅụrị ọṅụ n’ụzọ zuru ezu n’ìhè dị ebube nke Chineke. N’ezie, ha nọ n’oké ọchịchịrị. Olee mgbe ọ bụ? Gịnịkwa ka Jehova Chineke mere banyere ya?
4 Ọ bụ n’oge Agha Ụwa Mbụ, ngwa ngwa e guzobesịrị Alaeze Mesaịa Chineke n’eluigwe na 1914. Mba nile, na-enwe nkwado nke ndị ụkọchukwu chọọchị dị iche iche n’ala dị iche iche, wesoro ibe ha iwe. (Mkpughe 11:17, 18) Ma, Chineke megidere Krisendọm ahụ si n’ezi ofufe dapụ ya na òtù ndị ụkọchukwu e buliri elu dị ka o megidere mba Edọm obi ha dị elu. N’ihi ya, Krisendọm, bụ́ Edọm ihe atụ, gaje inweta mmezu nke oge a nke Aịsaịa isi nke 34. Mmezu a site ná mkpochapụ na-adịgide adịgide bụ nnọọ ihe e ji n’aka dị ka mmezu mbụ ya megide Edọm oge ochie.—Mkpughe 18:4-8, 19-21.
5. Ụdị mmezu dị aṅaa ka Aịsaịa isi nke 35 nweworo n’oge anyị?
5 Gịnị banyere isi nke 35 nke amụma Aịsaịa, nke na-emesi ọṅụ ike? Nke ahụ emezuwokwa n’oge anyị. Olee otú nke ahụ si mee? E mezuwo ya ná mweghachi nke Israel ime mmụọ site n’otu ụdị nke ndọrọ n’agha. Ka anyị nyochaa ihe ndị mere eme n’ihe bụ n’ezie akụkọ ọchịchị Chineke n’oge ndị na-adịbeghị anya, nke na-adaba n’ime oge ndụ nke ọtụtụ ndị ka nọ ndụ.
6. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ batara n’ọnọdụ ndọrọ n’agha?
6 Ruo oge dịtụ mkpirikpi n’oge Agha Ụwa Mbụ, ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ edebeghị onwe ha ọcha n’ime mmụọ kpam kpam ma kwekọọ n’uche Chineke. Ụfọdụ n’ime ha nwere ntụpọ nke ozizi ndị na-ezighị ezi, mebitụkwa ọnọdụ ha site n’ewereghị nguzo doro anya maka Jehova mgbe ha nọ ná nrugide ịkwado mba ndị ahụ na-alụ agha. N’afọ ndị ahụ a lụrụ agha, ha tara ahụhụ ụdị mkpagbu nile, ọbụna na-amachibido akwụkwọ ha ndị dabeere na Bible iwu n’ọtụtụ ebe. N’ikpeazụ, a mara ụfọdụ n’ime ụmụnna ndị a ma ama karị ikpe ma tụọ ha mkpọrọ n’ebubo ụgha dị iche iche. N’ileghachi anya azụ, o sighị ike ịhụ na, n’otu echiche, ndị Chineke, kama ịbụ ndị nweere onwe ha, nọ n’ọnọdụ ndọrọ n’agha. (Tụlee Jọn 8:31, 32.) Ihe kọrọ ha nke ukwuu n’ọhụhụ ụzọ ime mmụọ. (Ndị Efesọs 1:16-18) Ha datụrụ ogbi n’ihe banyere ito Chineke, nke mere ka ha ghara ịmị mkpụrụ n’ụzọ ime mmụọ. (Aịsaịa 32:3, 4; Ndị Rom 14:11; Ndị Filipaị 2:11) Ị̀ na-ahụ otú nke a si kwekọọ n’ọnọdụ nke ndị Juu oge ochie ahụ ná ndọrọ a dọọrọ ha n’agha laa Babilọn?
7, 8. Ụdị mweghachi dị aṅaa ka ihe fọdụrụ nke oge a na-enweta?
7 Ma Chineke ọ̀ ga-ahapụ ndị ohu ya nke oge a n’ọnọdụ ahụ? Ee e, o kpebiri iweghachi ha n’ikwekọ n’ihe e buru n’amụma site n’ọnụ Aịsaịa. N’ihi ya otu amụma a kwa n’isi nke 35 na-enweta mmezu pụrụ iche n’oge anyị, site ná mweghachị nke ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ gaa n’ịba ụba na ahụ ike n’ime paradaịs ime mmụọ. Ná Ndị Hibru 12:12, Pọl ji Aịsaịa 35:3 mee ihe n’ụzọ ihe atụ, na-akwado izi ezi anyị ịkọwa akụkụ a nke amụma Aịsaịa n’ụzọ ime mmụọ.
8 N’oge sochiri agha ahụ, ndị ahụ e tere mmanụ fọdụrụnụ n’Israel ime mmụọ si ná ndọrọ n’agha lata, dị ka a pụrụ ikwu ya. Jehova Chineke jiri Jisọs Kraịst, bụ́ Saịrọs Ka Ukwuu, tọhapụ ha. Otú a, ihe a fọdụrụnụ pụrụ ịrụ ọrụ mwughachi, nke a pụrụ iji tụnyere ọrụ nke ihe fọdụrụ ná ndị Juu oge ochie bụ́ ndị laghachiri n’ala ha iwughachi ụlọ nsọ nkịtị dị na Jerusalem. Ọzọkwa, ndị Israel ime mmụọ a n’oge a pụrụ ịmalite ịkụ na ịzụlite paradaịs ime mmụọ nke ahịhịa ndụ jupụtara, ogide Iden ihe atụ.
9. Olee otú ihe yiri ihe a kọwara n’Aịsaịa 35:1, 2, 5-7 si bilite n’oge anyị?
9 N’iburu ihe dị n’elu n’uche, ka anyị tụlee Aịsaịa isi nke 35 otu ugbo ọzọ, ma buru ụzọ lee amaokwu nke 1 na 2. Ihe yiworo ógbè mmiri na-adịghị na ya malitere n’ezie ịgbawa okooko ọhịa ma na-eme nri dị ka ala nile dị larịị nke Sherọn. Lezie amaokwu nke 5 ruo 7. E mepere anya nghọta nke ihe ahụ fọdụrụ, ndị ọtụtụ n’ime ha ka nọ ndụ ma na-arụsi ọrụ ike n’ozi Jehova. Ha pụrụ ịhụ nke ọma karị ihe ihe mere na 1914 na mgbe ọ gasịrị pụtara. Nke ahụ enwewokwa mmetụta n’ahụ ọtụtụ n’ime anyị ndị mejupụtara “oké ìgwè mmadụ” ahụ, ndị nọ ugbu a na-eso ihe fọdụrụ ahụ na-eje ozi.—Mkpughe 7:9.
Ị̀ Bụ Akụkụ nke Mmezu Ahụ?
10, 11. (a) Olee otú i siworo soro ná mmezu nke Aịsaịa 35:5-7? (b) Olee otú mgbanwe ndị a dị gị?
10 Were onwe gị dị ka ihe atụ. Tupu i zute Ndịàmà Jehova, ị̀ na-agụchi Bible anya? Ọ bụru na ị na-eme otú ahụ, nghọta hà aṅaa ka i nwere? Dị ka ihe atụ, ị maara ugbu a eziokwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Ikekwe ị pụrụ ịdọrọ uche onye nwere mmasị n’okwu ahụ gaa n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị metụtara okwu ahụ na Jenesis isi nke 2, Eklisiastis isi nke 9, na Ezikiel isi nke 18, nakwa ọtụtụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ. Ee, ma eleghị anya ị na-aghọta ihe Bible na-akụzi banyere ọtụtụ isiokwu. N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ezi echiche dị na Bible nye gị, ị pụkwara ịkọwara ndị ọzọ ihe dị ukwuu n’ime ya, dị ka o doro anya na i mewo.
11 Ma, ọ ga-adị mma ka ọnye ọ bụla n’ime anyị jụọ, sị, ‘Olee otú m si mụta ihe nile m maara banyere eziokwu Bible? Tupu mụ amalite iso ndị Jehova na-amụ ihe, m̀ chọtawo akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ a ka kpọpụrụ aha? Hà eyiwo m ka ihe ezi echiche dị na ha, m ruokwa mkpebi ndị ziri ezi banyere isi ihe ndị dị n’ime ha?’ Azịza eziokwu dị na ya nye ajụjụ ndị a bụ ma eleghị anya ee e. Ọ dịghị onye okwu dị otú ahụ kwesịrị iwute, ma a pụrụ ikwu na n’ụzọ bụ isi ị kpuru ìsì n’ebe akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a na ihe ha pụtara dị. Ọ́ bụghi eziokwu? Ha dị n’ebe ahụ n’ime Bible, ma ị pụghị ịhụ ha ma ọ bụ ghọta ihe ha pụtara. Mgbe ahụ, olee otú e si mepee anya gị n’ụzọ ime mmụọ? Ọ bụ site n’ihe Jehova meworo ná mmezu nke Aịsaịa 35:5 n’isi ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ. E siwokwa otú ahụ mepee anya gị. Ị nọkwaghị n’ọchịchịrị ime mmụọ. Ị pụrụ ịhụ ụzọ.—Tụlee Mkpughe 3:17, 18.
12. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na nke a abụghị oge ọgwụgwọ nkịtị n’ụzọ ọrụ ebube? (b) Olee otú ihe banyere Nwanna F. W. Franz si mee ihe atụ ụzọ Aịsaịa 35:5 si mezuo n’oge anyị?
12 Ndị ji ịdị uchu na-amụ Bible na ihe ndị Chineke na-eme kemgbe ọtụtụ narị afọ maara na nke a abụghị oge n’akụkọ ihe mere eme maka ọrụ ebube nke ọgwụgwọ ọrịa nkịtị. (1 Ndị Kọrint 13:8-10) Ya mere anyị adịghị atụ anya ka Jisọs Kraịst na-emepe anya ndị kpuru ìsì iji nwapụta na ya bụ Mesaịa ahụ, Onye Amụma Chineke. (Jọn 9:1-7, 30-33) Ọ dịghịkwa eme ka ndị ntị chiri na-anụ ihe ọzọ. Ka Frederick W. Franz, otu n’ime ndị e tere mmanụ na onye bụ onye isi oche nke Watch Tower Society n’oge ahụ na-eru 100 afọ, ọ fọrọ nke nta ka o kpuchaa ìsì, nweekwa mkpa nke iji ngwá enyemaka ịnụ ihe na-eme ihe. Ruo afọ ụfọdụ ọ pụghị ịhụ ụzọ iji gụọ ihe; ma, onye ga-ewere ya dị ka onye kpuru ìsì ma ọ bụ onye ntị chiri n’echiche nke Aịsaịa 35:5? Ọhụhụ ụzọ ime mmụọ ya dị nkọ bụ ngọzi nye ndị Chineke gburugburu ụwa.
13. Mgbanwe ma ọ bụ mweghachi dị aṅaa ka ndị Chineke nke oge a nwetara?
13 Ma ọ bụ gịnị banyere ire gị? Ọ pụrụ ịbụ na e mewo ka ọnụ ndị Chineke e tere mmanụ mechie n’oge a dọọrọ ha n’agha n’ụzọ ime mmụọ. Ma ozugbo Chineke chigharịrị ọnọdụ ahụ, ire ha malitere iti mkpu ọṅụ n’ihi ihe ha maara banyere Alaeze Chineke e guzobeworo na nkwa ya nile maka ọdịnihu. Ọ pụrụ ịbụ na ha enyeworo gị aka ịtọgakwa ire gị. Ruo n’ókè hà aṅaa ka ị gwara ndị ọzọ eziokwu Bible n’afọ ndị gara aga? Eleghị anya ọ dị mgbe i chere sị, ‘ọmụmụ ihe na-atọ m ụtọ, ma ọ dịghị mgbe m ga-apụ ịga gwa ndị m na-amaghị ama okwu.’ Otú ọ dị, ọ́ bụghị eziokwu na ‘ire onye ogbi na-eti mkpu ọṅụ’ ugbu a?—Aịsaịa 35:6.
14, 15. Olee otú ọtụtụ ndị siworo gaa ije ‘n’Ụzọ nke Ịdị Nsọ’ n’oge anyị?
14 Ndị Juu oge ochie a tọhapụrụ site na Babilọn gara njem dị ogologo ịlaghachi ala nna ha. Gịnị ka nke ahụ kwekọrọ na ya n’oge anyị? Ọ dị mma, lee anya n’Aịsaịa 35:8: “Ụzọ a tụliri atụli, ọbụna ụzọ, ga-adịkwa n’ebe ahụ, Ụzọ nke ịdị nsọ ka a ga-akpọkwa ya; onye rụrụ arụ agaghị agabiga na ya.”
15 Kemgbe a tọhapurụ ha site ná ndọrọ n’agha n’ụzọ ime mmụọ, ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ, ndị ọtụtụ nde nke atụrụ ọzọ ahụ na-esonyere ugbu a, esiwo na Babilọn Ukwu ahụ kwapụ banye n’okporo ụzọ ihe atụ, ụzọ dị ọcha nke ịdị nsọ nke na-eduga mmadụ na paradaịs ime mmụọ. Anyị na-eme mgbalị ọ bụla iji ruo eru maka ya na ịnọgide n’Ụzọ nke Ịdị Nsọ a. Chee banyere onwe gị. Ọ̀ bụ na ụkpụrụ omume gị na ụkpụrụ ndị ị na-ejigide adịghi elu nke ukwuu ugbu a karịa mgbe ị nọ n’ime ụwa? Ị́ dịghị etinye mgbalị ka ukwuu iji mee ka echiche na àgwà gị kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke?—Ndị Rom 8:12, 13; Ndị Efesọs 4:22-24.
16. Olee ọnọdụ ndị anyị pụrụ inweta ka anyị na-aga n’Ụzọ nke Ịdị Nsọ ahụ?
16 Ka ị na-anọgide n’Ụzọ nke Ịdị Nsọ a, n’ụzọ bụ isi i nweere onwe gị pụọ ná nchekasị banyere ụmụ mmadụ dị ka anụ ọhịa. Ọ bụ eziokwu na n’ime ụwa, ị ghaghị ịnọ na nche ka ndị anyaukwu ma ọ bụ ndị na-akpọ asị ghara iri gị ná ndụ n’ụzọ ihe atụ. Ọtụtụ ndị nnọọ na-akpa àgwà ka ajọ anụ n’ụzọ ha si emeso ndị ọzọ. Lee ka o si dị iche n’etiti ndị Chineke! N’ebe ahụ ị nọ gburugburu ebe dị nchebe. Ma, ndị Kraịst ibe gị ezughị okè; mgbe ụfọdụ otu n’ime ha na-emehie ihe ma ọ bụ kpata ihe iwe. Ma ị maara na ụmụnna gị ebughị n’uche imerụ gị ahụ ma ọ bụ iripịa gị. (Abụ Ọma 57:4; Ezikiel 22:25; Luk 20:45-47; Ọrụ 20:29; 2 Ndị Kọrint 11:19, 20; Ndị Galetia 5:15) Kama nke ahụ, ha nwere mmasị n’ebe ị nọ; ha enyeworo gị aka; ha chọkwara iso gị na-eje ozi.
17, 18. N’echiche dị aṅaa ka paradaịs dị adị ugbu a, gịnịkwa bụ mmetụta nke a na-enwe n’ahụ anyị?
17 Ya mere anyị pụrụ ile anya n’Aịsaịa isi nke 35, na-eburu n’uche mmezu nke oge a nke amaokwu nke 1 ruo 8. Ó doghị anya na anyị achọtaworị ihe a kpọrọ n’ụzọ ziri ezi paradaịs ime mmụọ? Ee e, o zughị okè—o rubeghị. Ma ọ bụ n’ezie paradaịs, n’ihi na n’ebe a, dị ka e kwuru n’amaokwu nke 2, anyị pụrụrị ‘ịhụ ebube Jehova, bụ́ ịma mma nke Chineke anyị.’ Gịnịkwa ka ọ na-arụpụta? Amaokwu nke 10 na-asị: “Ndị Jehova a gbapụtara agbapụta ga-alatakwa, were iti mkpu ọṅụ bata n’ime Zaịọn; ọṅụ ebighị ebi ga-adịkwa n’isi ha: obi ụtọ na ọṅụ ka ha ga-abịarute, iru újú na ize ume ewee gbalaga.” N’ezie, anyị ịbụ ndị siworo n’okpukpe ụgha pụta na ịgbaso ezi ofufe n’okpuru ihu ọma Chineke bụ n’ezie ihe na-akpali ọṅụ.
18 Ọṅụ e jikọtara ya na ezi ofufe anọgidewo na-amụba, ọ̀ bụ na ọ dịghị? Ị na-ahụ ndị ọhụrụ nwere mmasị ka ha na-eme mgbanwe ma na-akwụrụsi ike n’eziokwu Bible. Ị na-ahụ ndị ntorobịa ka ha na-etolite ma na-enwe ọganihu ime mmụọ n’ọgbakọ. A na-eme baptism, bụ́ ebe ị na-ekiri ndị ị maara ka a na-eme ha baptism. Ọ̀ bụ na ihe ndị ahụ abụghị ihe ndị na-akpata ọṅụ, ọṅụ bara ụba, taa? Ee, lee aha ọṅụ ọ bụ ime ka ndị ọzọ sonyere anyị ná nnwere onwe ime mmụọ na ọnọdụ paradaịs anyị!
Otu Mmezu Ka Dị n’Ihu!
19. N’olileanya dị aṅaa ka Aịsaịa isi nke 35 na-eme ka anyị jupụta?
19 Anyị atụlewo ka ọ dị ugbu a Aịsaịa isi nke 35 n’ihe banyere mmezu mbụ ya site ná nlata ndị Juu nakwa banyere mmezu ime mmụọ ya nke na-aga n’ihu taa. Ma ọ kwụsịghị n’ebe ahụ. A ka nwere ihe dị ukwuu. E jikọtara ya na nkwa Bible nke mweghachi na-abịanụ nke ọnọdụ paradaịs nkịtị n’elu ala.—Abụ Ọma 37:10, 11; Mkpughe 21:4, 5.
20, 21. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ezi izu dị na ya na ihe Akwụkwọ Nsọ kwadoro ikwere na a ka ga-enwe mmezu ọzọ nke Aịsaịa isi nke 35?
20 Ọ gaghị ekwekọ ekwekọ Jehova inye nkọwa ndị doro anya nke paradaịs ma kpaara mmezu ya ókè ịbụ nanị n’ihe ime mmụọ. Otú ọ dị, nke a abụghị ikwu na mmezu ime mmụọ ya adịghị mkpa. Ọbụna ọ bụrụ na e guzobere paradaịs nkịtị, ọ gaghị eju anyị afọ ma ọ bụrụ na n’ime ebe mara mma na n’etiti anụ ndị nọ n’udo, anyị abụrụ ndị ndị rụrụ arụ n’ụzọ ime mmụọ, ụmụ mmadụ na-akpa àgwà ka anụ ndọgbu gbara gburugburu. (Tụlee Taịtọs 1:12.) Ee, nke ime mmụọ aghaghị ibute ụzọ, n’ihi na ọ kasị mkpa.
21 Ka o sina dị, Paradaịs ahụ na-abịanụ agaghị ejedebe n’akụkụ ime mmụọ ndị anyị na-anụ ụtọ ha ugbu a na ndị anyị ga-anụ ụtọ ha ọbụna karịa n’ọdịnihu. Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji tụọ anya mmezu nkịtị nke amụma ndị dị ka Aịsaịa isi nke 35. N’ihi gịnị? Ọ dị mma, n’isi nke 65, Aịsaịa buru amụma “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” Pita onyeozi webatara nke ahụ mgbe ọ na-akọwa ihe ga-esochi ụbọchị Jehova. (Aịsaịa 65:17, 18; 2 Pita 3:10-13) Pita na-egosi na akụkụ ndị Aịsaịa kọwara ga-adị adị n’ezie mgbe “ụwa ọhụrụ” ahụ ga-abịa n’ezie. Nke ahụ gụnyere nkọwa ndị i nwere ike ịmara nke ọma—iwu ụlọ biri n’ime ha; ịkụ ubi vine rie mkpụrụ ha; mmadụ ịnụ ụtọ ihe aka ya rụtara mgbe dị anya; anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ịmakpukọ; a gaghị enwekwa ihe ọjọọ na-ewere ọnọdụ n’ụwa nile. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ogologo ndụ, ebe obibi dị nchebe, ụba ihe oriri, ọrụ na-eju afọ, na udo n’etiti ụmụ anụmanụ na ibe ha na n’etiti ụmụ anụmanụ na mmadụ.
22, 23. Ihe ndabere dị aṅaa maka ọṅụ ka a ga-enwe ná mmezu ọdịnihu nke Aịsaịa isi nke 35?
22 Ọ̀ bụ na atụmanya ahụ adịghị eme ka i jupụta n’ọṅụ? O kwesịrị, n’ihi na ọ bụ otú ahụ ka Chineke kere anyị ịdị ndụ. (Jenesis 2:7-9) Ya mere, gịnị ka ọ pụtara n’ihe banyere amụma ahụ dị n’Aịsaịa isi nke 35 nke anyị na-atụle? Ọ pụtara na anyị nwere ihe ọzọ mere anyị ga-eji eti mkpu ọṅụ. Ọzara na ebe ndị kpọrọ nkụ n’ụzọ nkịtị ga-agbawa okooko ọhịa, na-eme ka anyi ṅụrịa. Mgbe ahụ ndị nwere anya na-acha anụnụ anụnụ, ma ọ bụ anya na-acha nchara nchara, ma ọ bụ àgwà ọ bụla ọzọ mara mma, ma bụrụ ndị kpuru ìsì ugbu a, ga-enwe ike ịhụ ụzọ ọzọ. Ndị Kraịst ibe anyị ntị chiri, ma ọ bụ ọbụna ụfọdụ anyị na-enwe ihe isi ike ịnụ ihe, ga-enwe ike ịnụ ihe nke ọma. Lee ihe ọṅụ ọ ga-abụ iji ikike ahụ nụ Okwu Chineke ka a na-agụ ma na-akọwa ya, nakwa na-ege ntị n’ụda ndị na-atọ ụtọ nke ikuku ka ọ na-efe osisi, ọchị nwatakịrị, ukwe nnụnụ!
23 Ọ ga-apụtakwa na ndị dara ngwụrọ, gụnyere ndị ọrịa arthritis ji ugbu a, ga na-agagharị n’enweghị ihe mgbu. Lee aha ahụ efe nke ahụ ga-abụ! Mgbe ahụ isi iyi nkịtị ga-agbapụta mmiri n’ime ọzara. Anyị ga-ahụ nnupụta mmiri ma nụ ụzụ nsụlite ya. Anyị ga-enwe ike ịga n’ebe ahụ ma metụ ahịhịa ndụ na osisi papyrus aka. Ọ ga-abụ n’ezie Paradaịs e weghachiri. Gịnị banyere ọṅụ nke ịnọnyere ọdụm ma ọ bụ anụ ọzọ dị otú ahụ n’atụghị egwu? Ọ dịghịdị mkpa ịmalite kọwawa nke ahụ, n’ihi na anyị nile ejiworị uche anyị mara ụtọ nke ọnọdụ ahụ.
24. N’ihi gịnị ka ị pụrụ iji kwere n’okwu dị n’Aịsaịa 35:10?
24 Aịsaịa na-emesi anyị obi ike, sị: “Ndị Jehova a gbapụtara agbapụta ga-alatakwa, were iti mkpu ọṅụ bata n’ime Zaịọn; ọṅụ ebighị ebi ga-adịkwa n’isi ha.” Ya mere anyị pụrụ ikwenye na anyị nwere ihe mere anyị ga-eji tie mkpu ọṅụ. Ọṅụ n’ihi ihe Jehova nọwororịị na-emere ndị ya na paradaịs ime mmụọ anyị, na ọṅụ n’ihi ihe anyị pụrụ ịtụ anya ya na Paradaịs nkịtị nke dị ezi nso. Banyere ndị na-enwe ọṅụ—banyere anyị—Aịsaịa na-ede, sị: “Obi ụtọ na ọṅụ ka ha ga-abịarute, iru újú na ize ume ewee gbalaga.”—Aịsaịa 35:10.
Ị̀ Rịbara Ama?
◻ Mmezu nke abụọ dị aṅaa ka Aịsaịa isi nke 35 nweworo?
◻ Gịnị kwekọrọ n’ụzọ ime mmụọ ná mgbanwe ọrụ ebube ndị Aịsaịa buru amụma ha?
◻ Olee otú i siworo kere òkè ná mmezu nke amụma a?
◻ N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Aịsaịa isi nke 35 na-eme ka anyị jupụta n’olileanya maka ọdịnihu?
[Foto dị na peeji nke 15]
Ụlọ nga dị n’Okporo Ámá Raymond dị na Brooklyn, ebe e jichiri ụmụnna asaa a ma ama na June 1918
[Foto dị na peeji nke 16]
Ọ bụ ezie na ọ fọrọ nke nta ka o kpuchaa ìsì n’afọ ndị ikpeazụ nke ndụ ya, ọhụhụ ụzọ ime mmụọ nke Nwanna Franz nọgidere na-adị nkọ
[Foto ndị dị na peeji nke 17]
Uto na ọganihu ime mmụọ bụcha ihe ndị mere a ga-eji enwe ọṅụ