Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 2/15 p. 19-22
  • Otú E Si Achọta Ọṅụ n’Ime Ndị Na-eso Ụzọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú E Si Achọta Ọṅụ n’Ime Ndị Na-eso Ụzọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịmata Ndị Pụrụ Ịbụ “Atụrụ”
  • Ịmalite Ọmụmụ Bible
  • Ime Ka Mmasị ahụ Na-adị Ọhụrụ
  • Ịzụlite Ịhụnanya Maka Jehova
  • Nye Enyemaka Dị Irè
  • Wusie Ha Ike Ịtachi Obi
  • Ihe Mere Ime Ndị Na-eso Ụzọ Ji Kwesị Mgbalị Ahụ
  • Otú E Si Eduziri Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl Ga-eme Ka O Ruo Eru Ime Baptizim—Agba nke Mbụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Otú Ọgbakọ Ga-esi Enyere Ndị A Na-amụrụ Baịbụl Aka Iru Eru Ime Baptizim
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Ì Nwere Ike Inye Aka n’Ime Ndị Na-eso Ụzọ?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • ‘Ya Mere, Gaanụ Mee Ndị Na-eso Ụzọ’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 2/15 p. 19-22

Otú E Si Achọta Ọṅụ n’Ime Ndị Na-eso Ụzọ

OTU n’ime ọṅụ ndị miri emi nke mmadụ pụrụ inwe bụ nke ịbụ onye ya na Chineke na-arụkọ ọrụ. Taa, ọrụ Chineke gụnyere ịchịkọbata ndị obi ha ziri ezi n’ime ọgbakọ ndị Kraịst na ịzụ ha maka ndụ dị ka ndị Kraịst ugbu a nakwa maka nlanarị banye n’ime ụwa ọhụrụ.—Maịka 4:1-4; Matiu 28:19, 20; 2 Pita 3:13.

Ọ bụwo isi iyi nke oké ọṅụ nye Ndịàmà Jehova na Latin America ịhụ ka otu nde mmadụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ nke Jisọs Kraịst eri 1980. N’ala nke a na-amị mkpụrụ, ebe ọtụtụ na-ekwere ma na-akwanyere Bible ùgwù, ụfọdụ ndị ozi oge nile enwewo ike inyere ọtụtụ ndị aka ịrara ndụ ha nye Jehova. N’inwe ọtụtụ ahụmahụ, ikekwe ha pụrụ ịkọrọ anyị ihe ụfọdụ banyere ọṅụ nke ime ndị na-eso ụzọ. Ụfọdụ n’ime aro ha na-atụ pụrụ inyere gị aka ịchọta ọṅụ n’ime ndị na-eso ụzọ n’ebe i bi.

Ịmata Ndị Pụrụ Ịbụ “Atụrụ”

“Ma obodo ọ bụla ma ọ bụ obodo nta ọ bụla unu ga-aba n’ime ya, chọpụtanụ onye kwesịrị n’ime ya,” ka Jisọs kwuru mgbe o zipụrụ ndị ozi ya ime nkwusa. (Matiu 10:11) Mgbe ị na-aga eleta ndị ahụ, olee otú ị pụrụ isi mata ndị ahụ a pụrụ inyere aka n’ụzọ ime mmụọ? Edward, onye ozi oge nile kemgbe ihe karịrị afọ 50, na-asị: “Ha na-egosipụta ya site n’ajụjụ ha ndị sitere n’ezi obi na afọ ojuju ha mgbe e nyere ha azịza ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ.” Carol na-agbakwụnye, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ akọsara m nsogbu ma ọ bụ nchegbu nke onwe ya ná ntụkwasị obi, ọ bụ n’ezie ákwá maka enyemaka. M na-agbalị inweta ihe ọmụma na-enye aka ná mbipụta nke Watch Tower Society. Mmasị onwe onye dị otú a na-edujekarị n’ọmụmụ Bible.” Ma, ọ dịghị adị mfe mgbe nile ịmata ndị nwere obi eziokwu. Luis na-akọ: “Ụfọdụ ndị yiri ka ha nwere nnọọ mmasị ghọrọ ndị na-enweghị mmasị ma ọlị, ma ndị ọzọ ndị yiri ka hà na-emegide emegide na mbụ gbanwere mgbe ha nụrụ ihe Bible na-ekwu n’ezie.” Ebe ọtụtụ ndị Latin America na-akwanyere Bible ùgwù, o kwukwara, “M matara ndị ahụ a pụrụ inyere aka n’ụzọ ime mmụọ mgbe ha na-anakwere ozugbo ihe Bible na-akụzi mgbe m gosiri ha ya.” Inyere ndị “kwesịrị” dị otú a aka ịga n’ihu n’ụzọ ime mmụọ na-eweta ezi ọṅụ na afọ ojuju. Olee otú ị pụrụ isi mee nke a?

Ịmalite Ọmụmụ Bible

Iji ihe ndị e ji amụ Bible nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-ewepụta na-abụkarị ụzọ kasị mma isi nyere ndị mmadụ aka ịghọta eziokwu Bible. (Matiu 24:45) Olee otú ị pụrụ isi wulite obi ekele maka uru nke ihe ndị dị otú ahụ e ji amụ Bible? Edward na-asị: “Ebe ọ bụ na ọnọdụ, ọdịdị, na echiche ndị mmadụ dị iche iche nke ukwuu, m na-agbalị ime mgbanwe n’ịmalite ọmụmụ ihe.” Ị pụghị iji otu ụzọ ahụ mee ihe n’ebe mmadụ nile nọ.

N’ebe ụfọdụ nọ, ọtụtụ mkparịta ụka mberede n’Akwụkwọ Nsọ pụrụ ịdị mkpa tupu e webata otu akwụkwọ e ji amụ Bible. Otú o sina dị, otu di na nwunye bụ́ ndị ozi ala ọzọ na-akọ, sị: “Anyị na-ekwukarị ka a malite ịmụ ihe n’ọbịbịa nke mbụ.” N’otu aka ahụ, otu Onyeàmà nyewooro 55 mmadụ aka ruo n’ọnọdụ nke nraranye na-asị: “Ụzọ bụ isi m na-eji amalite ọmụmụ Bible abụrụwo ịbanye ozugbo n’akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala.” Ọ bụ ezie na ụfọdụ enweghị mmasị n’echiche nke ịmụ ihe ọ bụla, ndị ọzọ na-enwe mmasị ịmụ ihe ọ bụla nke ha kwere na ọ ga-enyere ha aka ná ndụ. Ikwu ka a malite klas ọmụmụ Bible n’ebe obibi n’efu na-adakarị ha dị ka ihe na-adọrọ adọrọ. Ụfọdụ ndị ozi ala ọzọ na-akọwa nnyefe nke a na-asịzi: “Achọrọ m igosi gị otú anyị si eme ya. Ọ bụrụ na ọ masịrị gị, ị pụrụ ịga n’ihu. Ọ bụrụ na ọ masịghị gị, nke ahụ bụ nhọrọ dịịrị gị ime.” Mgbe e kwuru ya n’ụzọ dị otú ahụ, ndị mmadụ adịghị atụ ụjọ ịnakwere.

Onyeàmà ọzọ, nke nyewooro ọtụtụ ndị nwere ihe e ji ebi ndụ na agụmakwụkwọ dị nta aka, na-asị: “Ahụtawo m na traktị bụ ihe bara uru karịsịa n’ịmalite ọmụmụ Bible.” N’agbanyeghị mbipụta ọ bụla nke ha na-eji eme ihe, ndị nkụzi oge nile na-agbalị imesi Bible ike. Carola na-asị: “N’ọmụmụ ihe nke mbụ, ana m eji nanị ihe osise na ihe dị ka akụkụ akwụkwọ nsọ ise eme ihe, ka isi ihe ndị ahụ wee pụta ìhè, ka Bible gharakwa iyi ihe siri ike.”

Ime Ka Mmasị ahụ Na-adị Ọhụrụ

Ndị mmadụ na-enwe obi ụtọ ná mmetụta nke ọganihu, ya mere Jennifer na-atụ aro, sị: “Mee ka ọmụmụ ihe ahụ na-ekpo ọkụ. Mee ka ọmụmụ ihe ahụ na-aga n’ihu.” Iduzi ọmụmụ ihe ahụ mgbe nile n’ahapụghị ya ọtụtụ izu ga-enyekwara ha aka inwe mmetụta na ha na-aga n’ihu. Otu onye ọsụ ụzọ pụrụ iche nke a zụlitere n’ime ime obodo kọwara ịdị mkpa nke ime ka nkọwa dị mfe na ilekwasị anya n’isi ihe ndị ahụ, nke ga-eme ka ọbụna ndị ahụ gụrụ obere akwụkwọ nwee ike inwe ọganihu. Ọ na-asị: “N’obodo m, anyị aghaghị ifesa mmiri n’ala mgbe a kụsịrị mkpụrụ. Ọ bụrụ na anyị awụnyela mmiri n’ubi ahụ gafee ókè, ájá ahụ na-aghọ nke kpụkọrọ akpụkọ nke na mkpụrụ ndị ahụ na-epupụtanụ apụghị ịgbanye mkpọrọgwụ, ha anwụọkwa. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ị wụkwasị ndị nwere mmasị ọhụrụ ọtụtụ isi ihe, ọ pụrụ iyi ihe siri oké ike, ha na-adakwa mbà.” Ọbụna ndị nwere echiche na-achọ ịmara ihe aghaghị ịmụta itinye uche n’otu isiokwu n’otu oge ma ọ bụrụ na ha ga-aga n’ihu ná nghọta. Jisọs gwara ndị ozi ya, sị: “Enwere m ọtụtụ ihe ọzọ ịgwa unu, ma unu apụghị iburu ha ugbu a.”—Jọn 16:12.

Ụzọ ọzọ e si eme ka mmasị na-adịgide bụ site n’ịgba ndị ị na-eleta ume ịnọgide na-eche echiche banyere Okwu Chineke mgbe ị lasịrị. Yolanda na-atụ aro, sị: “Hapụ otu ajụjụ nke a na-azaghị aza. Nye ha ọrụ ha ga-arụ n’ụlọ, dị ka ịgụ otu akụkụ nke Bible ma ọ bụ inyocha otu isiokwu nke metụtara ha.”

Ịzụlite Ịhụnanya Maka Jehova

Ọṅụ gị ga-aba ụba mgbe ị na-enyere ndị ị na-eduziri ọmụmụ ihe aka ịghọ ‘ndị na-eme okwu ahụ, na-abụghịkwa ndị na-anụ nanị.’ (Jemes 1:22) Olee otú ị pụrụ isi mee nke ahụ? Ịhụnanya maka Jehova na-akwali ezi ndị Kraịst. Pedro, bụ́ onye sitere na Mexico, na-akọwa, sị: “Ndị mmadụ apụghị ịhụ onye ha na-amaghị n’anya, ya mere ná mmalite nke ọmụmụ ihe ahụ, m na-akụziri ha aha Chineke site na Bible, m na-elekwa anya maka ohere iji mesie àgwà Jehova ike.” Ná nkwurịta okwu, ị pụrụ iwulite obi ekele maka Jehova site n’ikwupụta mmetụta gị maka ya. Elizabeth na-asị: “M na-agbalị mgbe nile ihota ịdị mma Jehova. N’oge ọmụmụ ihe m, ọ bụrụ na m hụ okooko osisi mara mma, nnụnụ mara mma, ma ọ bụ nwa ologbo nke na-egwuri egwu, m na-ekwu mgbe nile na ọ bụ ọrụ Jehova.” “Na-ekwu okwu banyere ụwa ọhụrụ nke Chineke kwere nkwa ya dị ka ihe bụ ezie nke ị maara ya na ọ bụ,” ka Jennifer na-atụ aro ya. “Jụọ ihe ha ga-achọ ime n’ime ụwa ọhụrụ ahụ.”

Mgbe mmadụ ji obi ekele na-atụgharị uche n’ihe ọ na-amụta banyere Jehova, ọ na-abami n’ime obi ya, na-akwalikwa ya ime ihe. Ma ọ pụghị ịtụgharị uche ọ gwụlakwa ma ọ̀ na-echeta. Ntụleghachi dị mkpirikpi nke isi ihe atọ ma ọ bụ anọ mgbe a mụsịrị ihe bụ ihe na-enye aka icheta ihe. Ọtụtụ ndị nkụzi Bible na-eme ka ndị ọhụrụ detuo akụkụ akwụkwọ nsọ bụ isi ya na okwu ụfọdụ n’azụ Bible ha. Otu onye ozi ala ọzọ sitere England na-akọwa abamuru ọzọ nke ime ntụleghachi, sị: “M na-ajụ ụzọ ihe ọmụma ahụ siworo bara ha uru. Nke a na-eme ka ha jiri obi ekele na-atụgharị uche n’ụzọ na iwu Jehova.”

Otu Onyeàmà kwesịrị ntụkwasị obi nke gụsịrị akwụkwọ na klas nke atọ nke Gilead na-asị: “Anyị aghaghị ịbụ ndị na-ekpo ọkụ. Ndị anyị na-eduziri ọmụmụ ihe aghaghị ịghọta na anyị kweere ihe anyị na-akụzi.” Okwukwe ahụ nke meworo gị onye obi ụtọ “na-eme eme nke na-arụ ọrụ” pụrụ ife efe ma ọ bụrụ na i kwupụta ya.—Jemes 1:25.

“M na-achọpụta na ndị mmadụ na-enwe mmetụta nke ịnọ Chineke nso ma ọ bụrụ na m nyere ha aka ịghọta azịza ekpere ha,” ka otu Onyeàmà nyewooro ọtụtụ ndị aka ife Jehova ofufe na-ekwu. “M na-enye ha ihe atụ ndị sitere n’ahụmahụ nke mụ onwe m, dị ka nke a: Mgbe mụ na onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ bịarutere n’ebe ọhụrụ e kenyere anyị ọrụ dị ka ndị ọsụ ụzọ, anyị nwere nanị akwụkwọ nri ole na ole, otu ngwugwu bọta, ego adịghịkwa. Anyị richara nri anyasị wee sị, ‘Ugbu a anyị enweghị ihe ọ bụla maka echi.’ Anyị kpere ekpere banyere ya, wee lakpuo ụra. N’isi ụtụtụ echi ya otu Onyeàmà nọ n’ógbè ahụ kpọtụụrụ anyị, wee kọwaa onwe ya, na-asị, ‘M kpere ekpere na Jehova ga-ezite ndị ọsụ ụzọ. Ugbu a apụrụ m isoro unu ihe ka ọtụtụ n’ụbọchị, ma ebe m bi n’ime ime obodo, m ga-eso unu rie nri ehihie, ya mere m bu nri nke a bịa maka anyị nile.’ Ọ bụ anụ ehi na akwụkwọ nri dị ukwuu. M na-agwa ndị m na-eduziri ọmụmụ ihe mgbe nile na Jehova adịghị ahapụ anyị mgbe ọ bụla ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ chọọ Alaeze ya.”—Matiu 6:33.

Nye Enyemaka Dị Irè

Ime ndị na-eso ụzọ Kraịst gụnyere ihe karịrị iduzi ọmụmụ Bible. Otu onye ozi ala ọzọ nke jeworo ozi ruo ọtụtụ afọ dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na-asị: “Nye ha oge. Ejila oké ngwa ngwa pụọ n’ọmụmụ ihe ahụ mgbe ọ gasịrị. Ọ bụrụ na o kwesị ekwesị, nọrọ ma soro ya kwurịta okwu ruo nwa oge.” Elizabeth na-asị: “M na-enwe mmasị na ha n’ihi na o metụtara ndụ. Ọtụtụ mgbe m na-echegbu onwe m banyere ha dị ka à ga-asị na ha bụ ụmụ m.” Ndịàmà ọzọ tụrụ aro ndị a: “Leta ha mgbe ha na-arịa ọrịa.” “Mgbe ị nọ nso ebe obibi ha, dị ka ihe atụ n’ozi ubi, leta ha ná mkpirikpi oge iji mee ka ha mara Ndịàmà ọzọ.” Eva na-asị: “Gee ntị nke ọma iji ghọta nzụlite nke onye ahụ na ọnọdụ ya ná ndụ. Nke a na-emetụta ụzọ ndị mmadụ si emeghachi omume n’ebe eziokwu ahụ dị, ọ pụkwara igbochi ọganihu ha. Bụrụ ndị enyi ha, ka ha wee nwee obi ike ikwu okwu banyere nsogbu ha.” Carol na-agbakwụnye, sị: “Ezi mmasị n’ebe onye ahụ nọ dị mkpa ebe mgbanwe nke eziokwu ga-ewetara ndụ ya ga-apụta mgbe ụfọdụ mfu nke ndị ezinụlọ na ndị enyi ya. N’ozuzu, ọ dị mma ma ọ bụrụ na onye ahụ a na-eduziri ọmụmụ ihe mara ebe anyị bi ma nwee obi ike ịbịakwute anyị n’oge ọ bụla.” Nyere ya aka ile ọgbakọ anya dị ka ezinụlọ ọhụrụ ya.—Matiu 10:35; Mak 10:29, 30.

“Nọrọ na nche inye enyemaka dị irè. Soro ha nọrọ ná nzukọ dị iche iche, ma nyere ha aka ilekọta ụmụ ha,” ka Yolanda na-asị. Igosi ndị ọhụrụ ụzọ isi na-azụ ụmụ ha, na-emeziwanye ụkpụrụ ha nke ịdị ọcha, na-akwadebe azịza maka nzukọ nile, na ime ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke bụcha akụkụ nke ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. Otu nwanna nwanyị ọzọ na-agbakwụnye, sị: “Ọ dị mkpa ịzụ ndị ọhụrụ maka ozi ahụ. Mgbe e leghaara akụkụ a nke ọzụzụ anya, ụfọdụ na-anọgide na-atụ ụjọ ọrụ ime nkwusa, tụfuo ọṅụ ha n’ijere Jehova ozi, ma ghara ịtachi obi.” Ya mere nye ọzụzụ e ji nlezianya mee n’ọrụ ụlọ n’ụlọ, n’ime nletaghachi, na n’ịmalite ọmụmụ Bible. Ọṅụ gị ga-adị ukwuu mgbe ị na-ahụ na onye ị na-eduziri ọmụmụ Bible na-aga n’ihu n’ihi enyemaka na nduzi gị.

Wusie Ha Ike Ịtachi Obi

“E nwere àgwà nke ileghara ọmụmụ ihe anya ozugbo onye ahụ a na-eduziri ọmụmụ ihe mesịrị baptism,” ka otu onye nweworo ahụmahụ n’ime ndị na-eso ụzọ na-adọ aka ná ntị. Ma onye nkuzi ma onye ahụ a na-eduziri ọmụmụ ihe aghaghị icheta na onye Kraịst a ka mere baptism ọhụrụ etozubeghị okè n’ime mmụọ. O nwere ntolite dị ukwuu ọ ga-eme n’okwukwe ya, n’obi ekele ya maka iwu Chineke, na n’ịhụnanya ya maka Jehova. Ọ dị mkpa ịgba ya ume ịzụlite àgwà nke ọmụmụ ihe onwe onye dị mma ka o wee nọgide na-aga n’ihu.—1 Timoti 4:15.

Onye ọhụrụ ahụ pụrụ ịchọ enyemaka iji gaa n’ihu ma ghọọ onye òtù na-ele ọbịa nke òtù ụmụnna. Nduzi pụrụ ịdị ya mkpa iji nagide ezughị okè nke ụmụnna ka ọ na-abịaru ha nso. (Matiu 18:15-35) Enyemaka pụrụ ịdị ya mkpa ịghọ onye nkụzi nwere nkà, nke nwere ike ime nchọpụta nke onwe ya. Otu onye ozi ala ọzọ na-akọ, sị: “Otu onye a na-eduziri ọmụmụ ihe mgbe e mesịrị ya baptism chọrọ imeziwanye ikike ya dị ka onye nkụzi, ya mere ọ gwara m, ‘M ga-eduzi ọmụmụ ihe ọhụrụ n’izu na-abịa, ma ọ dị m mkpa ichetaghachi ihe ndị dị n’ime isiakwụkwọ ndị mbụ nke m mụworo. Biko ị̀ pụrụ isoro m mụgharịa isiakwụkwọ ndị a ọzọ, otu n’otu oge, ka m wee nwee ike idetu nkọwa nke akụkụ akwụkwọ nsọ na ihe atụ dị iche iche, mgbe ahụ m pụrụ iji ha mee ihe mgbe m gara iduzi ọmụmụ ihe m?’ Ọ ghọwo onye nkụzi magburu onwe ya, ebe o meworo ka anọ n’ime ndị ọ na-eduziri ọmụmụ ihe bụrụ ndị e mere baptism n’otu mgbakọ.”

Ihe Mere Ime Ndị Na-eso Ụzọ Ji Kwesị Mgbalị Ahụ

“Ime ndị na-eso ụzọ pụtara inwekwu ndị na-eto Jehova. Ọ pụtara ndụ nye ndị ahụ na-anabata eziokwu ahụ,” ka Pamela na-ekwu. “Ahụrụ m nnọọ ịkụziri ndị ọzọ eziokwu ahụ n’anya—ọ mara mma nke ukwuu! Mmadụ na-ahụ ka ndị ọ na-eduziri ọmụmụ ihe na-eto nwayọọ nwayọọ, na-eme mgbanwe ná ndụ ha ma na-emeri ihe mgbochi ndị pụrụ iyi ihe a na-apụghị imeri ma ọ bụghị site ná mmụọ Jehova. Ọtụtụ ndị bịara hụ Jehova n’anya abụrụwo ndị enyi m hụrụ n’anya.”

“Mgbe m na-atụle banyere ndị ahụ m nyewooro aka ịghọ ndị na-eso ụzọ,” ka otu onye ozi ala ọzọ sitere Germany na-akọ, “m na-ahụ ụfọdụ ndị mmadụ na-eme ihere bụ́ ndị nweworo ọganihu nke ukwuu dị ka ndị ozi nke Chineke nke na o siiri m ike ikweta. M na-ahụ ndị meriworo ihe mgbochi ndị siri oké ike, nke o doro anya na ọ bụ n’ihi enyemaka Jehova. M na-ahụ ezinụlọ ndị kewara ekewa na mbụ ma ugbu a dị n’otu—ụmụ obi ụtọ nwere nne na nna ji ihe akpọrọ ihe. M na-ahụ ndị mmadụ ka ha na-anụ ụtọ nke ndụ nwere nzube, na-eto Jehova. Nke a bụ ọṅụ nke ime ndị na-eso ụzọ.”

Ee, ịbụ onye ya na Jehova Chineke na-arụkọ ọrụ n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ bụ isi iyi nke ọṅụ na-enweghị atụ. Ahụmahụ nke ndị ozi ala ọzọ na ndị ọsụ ụzọ egosiwo ya. Ị pụrụ ịchọta otu ụdị ọṅụ na afọ ojuju ahụ ma ọ bụrụ na i tinye aro ndị a n’ọrụ ma jiri obi gị dum rụọ ọrụ na ya. Site ná ngọzi Jehova, ọṅụ gị ga-ezu ezu.—Ilu 10:22; 1 Ndị Kọrint 15:58.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya