Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 3/1 p. 8-13
  • “Cherenụ M”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Cherenụ M”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Zefanaịa—Onye Àmà Nwere Obi Ike
  • Ihe Ndị Kpatara Iwe Jehova Na-ere Ka Ọkụ
  • Obi Abụọ Banyere Ụbọchị Jehova
  • “Oké Ụbọchị Jehova Dị Nso”
  • E Kpee Mba Ndị Ọzọ Ikpe
  • “Cherenụ”
  • “Ekwela Ka Aka Gị Abụọ Kụdaa”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ụbọchị Ikpe Jehova Dị Nso!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Chọọ Jehova Tupu Ụbọchị Iwe ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka Zefanaya Onye Amụma
    Ozi Alaeze Anyi—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 3/1 p. 8-13

“Cherenụ M”

“N’ihi nke a cherenụ m, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.”—ZEFANAỊA 3:8.

1. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Zefanaịa onye amụma nyere, uru gịnịkwa ka nke a baara ndị na-adị ndụ taa?

“OKÉ ụbọchị Jehova dị nso.” Ọ bụ Zefanaịa onye amụma tiri mkpu ịdọ aka ná ntị a n’etiti narị afọ nke asaa T.O.A. (Zefanaịa 1:14) Tupu 40 ma ọ bụ 50 afọ agwụsịa, e mezuru amụma ahụ mgbe ụbọchị imezu ihe nile Jehova kpere n’ikpe bịakwasịrị Jerusalem na mba ndị ahụ na-ama ọbụbụeze Jehova aka site n’imegbu ndị ya. N’ihi gịnị ka nke a ji na-adọrọ mmasị nke ndị na-ebi ná ngwụsị nke narị afọ nke 20? Anyị na-ebi n’oge mgbe “oké ụbọchị” ikpeazụ nke Jehova ji ọsọ na-abịaru nso. Dị ka ọ dị n’oge Zefanaịa, “oké iwe” Jehova nke na-ere ka ọkụ fọrọ nke nta ka ọ bịakwasị ihe dị n’oge a nke ya na Jerusalem kwekọrọ—Krisendọm—na mba nile na-emegbu ndị Jehova ma na-ama ọbụbụeze eluigwe na ala ya aka.—Zefanaịa 1:4; 2:4, 8, 12, 13; 3:8; 2 Pita 3:12, 13.

Zefanaịa—Onye Àmà Nwere Obi Ike

2, 3. (a) Gịnị ka anyị maara banyere Zefanaịa, gịnịkwa na-egosi na ọ bụ onye àmà Jehova nke nwere obi ike? (b) Eziokwu ndị dị aṅaa na-eme ka anyị nwee ike ịmata oge na ebe Zefanaịa nọ buo amụma ya?

2 A maara ihe dị nta banyere Zefanaịa onye amụma, onye aha ya (Hibru, Tsephan·yahʹ) pụtara “Jehova Ekpuchiwo (Echekwawo).” Otú ọ dị, n’ụzọ dị iche n’ebe ndị amụma ndị ọzọ nọ, Zefanaịa nyere usoro ọmụmụ ya ruo n’ọgbọ nke anọ, laa azụ na “Hezekaịa.” (Zefanaịa 1:1; tụlee Aịsaịa 1:1; Jeremaịa 1:1; Ezikiel 1:3.) Nke a adịghị emekebe nke na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị na-akọwa okwu kwuru na nna nna ya ochie bụ Eze Hezekaịa kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ bụrụ na ọ bụ, mgbe ahụ, Zefanaịa sitere n’ezinụlọ ndị eze, nke a ga-emeworị ka nkatọ ya siri ike nke ọ katọrọ ndị isi Juda sie ike karị, ọ ga-egosiwokwarị na ọ bụ onye àmà na onye amụma nwere obi ike nke Jehova. Ọmụma ọ maara ọdịdị nke ala Jerusalem na ihe na-eme n’obí eze nke ọma na-egosi na ọ pụrụ ịbụ na ọ nọ n’isi obodo ahụ kpọmkwem wee kpọsaa ikpe Jehova.—Lee Zefanaịa 1:8-11, ntụaka ala ala peji nke NW.

3 Ihe dị ịrịba ama bụ eziokwu ahụ bụ na, n’agbanyeghị na Zefanaịa kpọsara ikpe Chineke nile megide “ndị isi” ọchịchị nke Juda (ndị a maara aha ha, ma ọ bụ ndị chiifu nke ebo dị iche iche) na “ụmụ eze,” ọ dịghị mgbe ọ kpọtụrụ eze n’onwe ya aha ná nkatọ ya.a (Zefanaịa 1:8; 3:3) Nke a na-atụ aro na Eze Josaịa na-eto eto egosilarị mmasị maka ofufe dị ọcha, ọ bụ ezie na n’ihi ọnọdụ ahụ nke Zefanaịa katọrọ, o doro anya na ọ malitebeghị ndozigharị ya nile nke okpukpe. Ihe a nile na-atụ aro na Zefanaịa nọ na Juda buo amụma n’afọ ndị mbụ nke Josaịa, bụ́ onye chịrị malite na 659 ruo 629 T.O.A. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ibu amụma kpụ ọkụ n’ọnụ nke Zefanaịa mekwuru ka Josaịa na-eto eto mara banyere ikpere arụsị, ime ihe ike, na ịrụ arụ ndị jupụtara na Juda n’oge ahụ ma kpalie ọgụ o mesịrị lụọ megide ikpere arụsị.—2 Ihe Emere 34:1-3.

Ihe Ndị Kpatara Iwe Jehova Na-ere Ka Ọkụ

4. Okwu ndị dị aṅaa ka Jehova ji kwupụta iwe ya megide Juda na Jerusalem?

4 Jehova nwere ezi ihe mere ọ ga-eji wee iwe megide ndị ndú na ndị bi na Juda na isi obodo ya bụ́ Jerusalem. Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Zefanaịa, o kwuru, sị: “M ga-esetịkwa aka m imegide Juda, na imegide ndị nile bi na Jerusalem; M ga-ebipụkwa ndị Beal fọdụrụ n’ebe a, na aha ndị nchụàjà arụsị, ha na ndị nchụàjà nile; na ndị na-akpọ isiala nye usuu ihe nile dị n’eluigwe n’elu ụlọ nile; na ndị na-akpọ isiala, ndị na-aṅụrụ Jehova iyi, ndị jikwa Malkam aṅụ iyi.”—Zefanaịa 1:4, 5.

5, 6. (a) Gịnị bụ ọnọdụ okpukpe nke dị na Juda n’oge Zefanaịa? (b) Gịnị bụ ọnọdụ nke ndị ndú ọchịchị Juda na ndị ha na-achị?

5 E ji ememe ọmụmụ dị iche iche rụrụ arụ nke ofufe Beal, ịgụ kpakpando nke ndị mmụọ ọjọọ, na ofufe nke chi ọgọ mmụọ bụ́ Malkam metọọ Juda. Ọ bụrụ na Malkam na Mọlek bụ otu ihe ahụ, dị ka ụfọdụ na-ekwu, mgbe ahụ ofufe ụgha nke Juda gụnyere iji ụmụaka achụ àjà nke a na-asọ nsọ. Ụdị omume okpukpe dị otú ahụ bụ ihe arụ n’anya Jehova. (1 Ndị Eze 11:5, 7; 14:23, 24; 2 Ndị Eze 17:16, 17) Ha wetaara onwe ha iwe ya karịsịa ebe ọ bụ na ndị ahụ na-ekpere arụsị ka ji aha Jehova na-aṅụ iyi. Ọ gakwaghị agbachi nkịtị ọzọ n’ụdị adịghị ọcha okpukpe dị otú ahụ, ọ ga-ebipụkwa ma ndị nchụàjà na-agọ mmụọ ma ndị si n’ezi ofufe dapụ.

6 Ọzọkwa, ndị ndú ọchịchị nke Juda rụrụ arụ. Ndị isi ya yiri ajọ “ọdụm na-agbọ ụja,” ndị ikpe ya yikwara “anụ ọhịa wolf” na-adọgbu adọgbu. (Zefanaịa 3:3) E boro ndị ha na-achị ebubo nke ịdị “na-emeju ụlọ ndị nwe ha n’ihe ike na aghụghọ.” (Zefanaịa 1:9) Ịhụ ihe onwunwe n’anya jupụtara ebe nile. Ọtụtụ ndị ji ọnọdụ ahụ mere ihe iji kwakọba akụ̀ na ụba.—Zefanaịa 1:13.

Obi Abụọ Banyere Ụbọchị Jehova

7. Ruo ogologo oge hà aṅaa tupu “oké ụbọchị Jehova” ka Zefanaịa buru amụma, gịnịkwa bụ ọnọdụ ime mmụọ nke ọtụtụ ndị Juu?

7 Dị ka anyị hụworo, ọnọdụ okpukpe na-eweta ọdachi nke dị n’ụbọchị Zefanaịa na-egosi na ọ rụrụ ọrụ ya dị ka onye àmà na onye amụma tupu Eze Josaịa amalite ọgụ ya megide ikpere arụsị, n’ihe dị ka na 648 T.O.A. (2 Ihe Emere 34:4, 5) Ya bụrụ otú ahụ, o yiri ka Zefanaịa ò buru amụma 40 afọ ma ọ dịkarịa ala tupu “oké ụbọchị Jehova” abịakwasị alaeze Juda. Tupu ọ bịa, ọtụtụ ndị Juu nwere obi abụọ ma “laghachi azụ” n’ijere Jehova ozi, na-aghọ ndị nwere omume ọ gbasara m. Zefanaịa na-ekwu banyere “ndị na-achọghị Jehova, na-ajụghịkwa ase Ya.” (Zefanaịa 1:6) Dị ka ihe àmà gosiri, ndị nọ na Juda nwere omume enweghị mmasị, n’echegbughị onwe ha banyere Chineke.

8, 9. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ga-eji leta “ndị ikom ahụ ndị rahụrụ arahụ n’ịdị ka mmanya vine doro edo”? (b) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova ga-esi chee ihu ya n’ebe ndị bi na Juda na ndị ndú ha nke ọchịchị na okpukpe nọ?

8 Jehova mere ka a mara nzube ya ileta ndị na-azọrọ na ha bụ ndị ya. N’etiti ndị sị na ha na-efe ya, ọ ga-achọpụta ndị na-enwe n’ime obi ha obi abụọ banyere ikike ma ọ bụ nzube ya itinye aka n’ihe omume mmadụ. O kwuru, sị: “Ọ ga-erukwa, na mgbe ahụ, na M ga-achịrị oriọna chọsie ike n’ime Jerusalem; M ga-ejikwa mmehie ndị ikom ahụ ndị rahụrụ arahụ n’ịdị ka mmanya vine doro edo leta ha, ndị na-asị n’obi ha, Jehova agaghị eme ezi ihe, Ọ gaghị emekwa ihe ọjọọ.” (Zefanaịa 1:12) Okwu ahụ bụ́ “ndị ikom ahụ rahụrụ arahụ n’ịdị ka mmanya vine doro edo” (izo aka n’otú e si eme mmanya) na-ezo aka n’ebe ndị daruru ala nọ, dị ka ikè mmanya n’ala ololo e ji eme mmanya, ndị na-achọghịkwa ka mkpọsa ọ bụla nke ntinye aka dị nso nke Chineke ga-etinye n’ihe omume nke ihe a kpọrọ mmadụ nye ha nsogbu.

9 Jehova ga-eche ihu n’ebe ndị bi na Juda na Jerusalem na ndị nchụàjà ha nọ bụ́ ndị gwakọtaworo ofufe ya na ịgọ mmụọ. Ọ bụrụ na ọ dị ha ka ha nọ ná ntụkwasị obi, dị ka a ga-asị na ọ bụ n’ọchịchịrị nke abalị n’ime mgbidi nile nke Jerusalem, ọ ga-achọta ha dị ka a ga-asị na o ji oriọna na-achasi ike nke ga-achabanye n’ọchịchịrị ime mmụọ ebe ha gbabaworo. Ọ ga-esi n’enweghị mmasị okpukpe ha nupụta ha, nke mbụ site n’ozi ikpe ndị na-atụ ụjọ, sitezia n’imezu ihe ndị ahụ e kpere n’ikpe.

“Oké Ụbọchị Jehova Dị Nso”

10. Olee otú Zefanaịa si kọwaa “oké ụbọchị Jehova”?

10 Jehova kpaliri Zefanaịa ịkpọsa, sị: “Oké ụbọchị Jehova dị nso, ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu: gee ntị olu ụbọchị Jehova; dike na-eti mkpu dị ilu n’ebe ahụ.” (Zefanaịa 1:14) N’ezie ụbọchị ndị dị njọ dị n’ihu nye onye ọ bụla—ndị nchụàjà, ndị isi, na ndị ala ahụ—ndị jụrụ ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ ma laghachi n’ofufe dị ọcha. N’ịkọwa ụbọchị ahụ nke mmezu ihe e kpere n’ikpe, amụma ahụ gara n’ihu, sị: “Ụbọchị nrubiga ókè nke iwe ka ụbọchị ahụ bụ, ụbọchị ahụhụ na mkpagbu, ụbọchị nke ime mkpọmkpọ ebe na ịtọgbọrọ n’efu, ụbọchị ọchịchịrị na oké mgbachi, ụbọchị igwe ojii na oké ọchịchịrị, ụbọchị opi ike na iti mkpu agha, imegide obodo nile e wusiri ike, na imegide ụlọ nkuku nile dị elu.”—Zefanaịa 1:15, 16.

11, 12. (a) Ozi ikpe dị aṅaa ka e kwupụtara megide Jerusalem? (b) Ọganihu ihe onwunwe ọ̀ ga-azọpụta ndị Juu?

11 N’ime afọ iri ole na ole dị mkpirikpi, usuu ndị agha Babilọn gaje ịwakwasị Juda. Jerusalem agaghị alanarị. A gaje ibibi akụkụ ebe obibi na azụmahịa ya. “Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị ahụ, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), na olu iti mkpu ga-esi n’ọnụ ụzọ ámá azụ daa, ya na ịkwasi ákwá ike site n’obodo nke abụọ, na oké ntiwa site n’ugwu nta nile. Kwasienụ ákwá ike, unu ndị bi na Maktesh [otu mpaghara nke Jerusalem], n’ihi na ndị Kenean nile alawo n’iyi: e bipụwo ndị nile e boro ọlaọcha.”—Zefanaịa 1:10, 11, ntụaka ala ala peji nke NW.

12 N’ịjụ ikweta na ụbọchị Jehova dị nso, ọtụtụ ndị Juu tinyemiri aka n’atụmatụ achụmnta ego nke na-enye ego buru ibu. Ma site n’ọnụ onye amụma ya kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Zefanaịa, Jehova buru amụma na akụ̀ na ụba ha “ga-aghọkwa ihe a pụnawooro ha, ụlọ nile ha ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu.” Ha agaghị aṅụ mmanya ha mepụtara, “ọlaọcha ha ma ọ bụ ọlaedo ha agaghị enwe ike ịnapụta ha anapụta n’ụbọchị nrubiga ókè nke iwe Jehova.”—Zefanaịa 1:13, 18.

E Kpee Mba Ndị Ọzọ Ikpe

13. Ozi ikpe dị aṅaa ka Zefanaịa kwupụtara megide Moab, Amọn, na Asiria?

13 Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Zefanaịa, Jehova kwupụtakwara iwe ya megide mba ndị megbuworo ndị ya. O kwuru, sị: “Anụwo m ịta ụta Moab, na nkwulu nile nke ụmụ Amọn, nke ha jiworo taa ndị m ụta, mee onwe ha ukwuu megide ókèala ha. N’ihi nke a, Mụ onwe m na-adị ndụ, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, bụ́ Chineke nke Israel, pụta), n’ezie Moab ga-adị ka Sọdọm, ụmụ Amọn ga-adịkwa ka Gọmọra, ihe onwunwe nke akụba, na olulu nnu, na ebe tọgbọrọ n’efu ruo mgbe ebighị ebi. . . . Ọ ga-esetịkwa aka Ya imegide Ugwu, mee ka Asiria laa n’iyi; Ọ ga-emekwa ka Nineve ghọọ ebe tọgbọrọ n’efu, ala kpọrọ nkụ dị ka ọzara.”—Zefanaịa 2:8, 9, 13.

14. Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na mba ndị ọzọ ‘mere onwe ha ukwuu’ megide ndị Israel na Chineke ha, bụ́ Jehova?

14 Moab na Amọn bụ ndị iro nke Israel eri ogologo oge. (Tụlee Ndị Ikpe 3:12-14.) Nkume Moab, nke dị na Louvre Museum na Paris, bu ihe odide nke nwere okwu itu ọnụ nke Eze Mesha nke Moab. O ji mpako na-akọ banyere ya iweghara ọtụtụ obodo ukwu nke Israel site n’enyemaka nke chi ya bụ Kemọsh. (2 Ndị Eze 1:1) Jeremaịa, bụ́ onye ya na Zefanaịa biri ndụ n’otu oge, kwuru okwu banyere ndị Amọn ibi n’ókèala Israel bụ́ Gad n’aha chi ha bụ́ Malkam. (Jeremaịa 49:1) Banyere Asiria, Eze Shalmaneser nke Ise awakwasịwo ma weghara Sameria n’ihe dị ka otu narị afọ tupu ụbọchị Zefanaịa. (2 Ndị Eze 17:1-6) Ntakịrị oge ka e mesịrị, Eze Senakerib wakporo Juda, weghara ọtụtụ obodo ukwu ya ndị e wusiri ike, ọbụna yie Jerusalem egwu. (Aịsaịa 36:1, 2) Ọnụ na-ekwuchitere eze Asiria mere onwe ya ukwuu megide Jehova mgbe ọ na-ekwu ka Jerusalem chịlie aka elu.—Aịsaịa 36:4-20.

15. Olee otú Jehova ga-esi wedaa chi nke mba nile ndị meworo onwe ha ukwuu megide ndị ya ala?

15 Abụ Ọma 83 hotara ọtụtụ mba, gụnyere Moab, Amọn, na Asiria, bụ́ ndị mere onwe ha ukwuu megide Israel, ma jiri itu ọnụ kwuo, sị: “Jeenụ, ka anyị zopụ ha n’ịbụ mba; a gaghị echetakwa aha Israel ọzọ.” (Abụ Ọma 83:4) Zefanaịa onye amụma jiri obi ike maa ọkwa na Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-eweda mba ndị a nile dị mpako na chi ha ala. “Nke a ka ha ga-enwe n’ihi mpako ha, n’ihi na ha atawo ndị Jehova nke usuu nile nke ndị agha ụta, mee onwe ha ukwuu imegide ha. Onye dị egwu ka Jehova ga-abụ n’imegide ha: n’ihi na Ọ ga-eme ka chi nile nke ụwa taa ahụ; mmadụ ga-akpọkwa isiala nye Ya, onye ọ bụla site n’ọnọdụ ya, bụ́ àgwàetiti nile nke mba nile.”—Zefanaịa 2:10, 11.

“Cherenụ”

16. (a) Ole ndị ka ọbịbịa nke ụbọchị Jehova bụụrụ ihe ọṅụ, n’ihi gịnịkwa? (b) Olee ọkpụkpọ òkù na-akpali akpali nke a kpọrọ ihe a fọdụrụnụ na-ekwesị ntụkwasị obi?

16 Ọ bụ ezie na ịdị ọ̀bọ̀ ime mmụọ, inwe obi abụọ, ikpere arụsị, ịrụ arụ, na ịhụ ihe onwunwe n’anya jupụtara n’etiti ndị ndú na ọtụtụ ndị bi na Juda na Jerusalem, o doro anya na ụfọdụ ndị Juu gere ntị n’amụma ịdọ aka ná ntị Zefanaịa. Omume nile a na-asọ nsọ nke ndị isi, ndị ikpe, na ndị nchụàjà nke Juda wutere ha. Nkwupụta okwu nile nke Zefanaịa bụ ihe nkasi obi nye ndị a na-eguzosi ike n’ihe. Kama ịbụ ihe na-akpata nchekasị, ọbịbịa nke ụbọchị Jehova bụụrụ ha ihe na-enye ọṅụ, n’ihi na ọ gaje ime ka omume ndị dị otú ahụ rụrụ arụ kwụsị. Ndị a fọdụrụnụ kwesịrị ntụkwasị obi ṅara ntị n’òkù na-akpali akpali nke Jehova, sị: “N’ihi nke a cherenụ m, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), cherenụ ụbọchị mgbe M ga-ebili ọtọ ịkwata ihe: n’ihi na ikpe m bụ ime ka mba nile zukọta, ka M wee chịkọta alaeze nile, ịwụsa ha oké iwe m, bụ́ ọnụma nile nke iwe m.”—Zefanaịa 3:8.

17. Olee mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka ozi ikpe nile nke Zefanaịa malitere imezu n’ahụ mba nile?

17 Ọ daghị ndị ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ na mberede. Ọtụtụ ndị dịrị ndụ hụ mmezu nke amụma Zefanaịa. Na 632 T.O.A., e weghaara Nineve ma bibie ya site ná njikọ nke ndị Babilọn, ndị Midia, na ìgwè ndị si n’ebe ugwu, ikekwe ndị Sitia. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Will Durant na-akọ, sị: “Ndị agha Babilọn n’okpuru idu ndú Nabopolassar sooro ndị agha Midia n’okpuru idu ndú Cyaxares na ìgwè ndị Sitia sitere Caucasus wee jikọọ aka, wee weghara ebe ndị e wusiri ike nke ebe ugwu n’ụzọ dị oké mfe nakwa ọsọ ọsọ. . . . N’otu mwakwasị Asiria pụrụ n’akụkọ ihe mere eme.” Nke a bụ kpọmkwem ihe Zefanaịa buwororị n’amụma.—Zefanaịa 2:13-15.

18. (a) Olee otú e si mezuo ihe Chineke kpere n’ikpe n’ahụ Jerusalem, n’ihi gịnịkwa? (b) Olee otú e si mezuo amụma Zefanaịa banyere Moab na Amọn?

18 Ọtụtụ ndị Juu nọ na-echere Jehova dịkwara ndụ hụ ka e mezuru ikpe ya nile n’ahụ Juda na Jerusalem. Banyere Jerusalem, Zefanaịa ebuworị n’amụma, sị: “Ahụhụ ga-adịrị obodo nke na-enupụ isi, nke rụwokwara arụ, obodo ahụ nke na-eme ihe ike! O geghị ntị olu Chineke; ọ naraghị ịdọ aka ná ntị; Jehova ka ọ na-atụkwasịghị obi; Chineke ya ka ọ na-abịakwuteghị nso.” (Zefanaịa 3:1, 2) N’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi ya, ndị Babilọn wakwasịrị Jerusalem ugboro abụọ, wegharakwa ma bibie ya n’ikpeazụ na 607 T.O.A. (2 Ihe Emere 36:5, 6, 11-21) Banyere Moab na Amọn, dị ka onye Juu bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus si kwuo, n’afọ nke ise mgbe ọdịda nke Jerusalem gasịrị, ndị Babilọn busoro ha agha ma merie ha. Ka nke ahụ gasịrị, ha kwụsịrị ịdị adị, dị ka e buru n’amụma.

19, 20. (a) Olee otú Jehova si kwụghachi ndị nọ na-echere ya ụgwọ ọrụ? (b) N’ihi gịnị ka ihe omume ndị a ji gbasa anyị, gịnịkwa ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Mmezu nke nkọwa nke ụmụ irighiri ihe ndị a na ndị ọzọ nke amụma Zefanaịa bụ ahụmahụ na-ewusi okwukwe ike nye ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu bụ́ ndị nọ na-echere Jehova. Jeremaịa, onye Etiopịa bụ́ Ebed-melek, na ezinụlọ Jehonadab, bụ́ onye Rịkab, so ná ndị lanarịrị mbibi ahụ dakwasịrị Juda na Jerusalem. (Jeremaịa 35:18, 19; 39:11, 12, 16-18) Ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi ndị nọ ná ndọrọ n’agha na ụmụ ha, bụ́ ndị nọgidere na-echere Jehova, ghọrọ otu akụkụ nke ihe ahụ fọdụrụnụ obi dị ụtọ ndị e si na Babilọn napụta na 537 T.O.A., ha alaghachikwa Juda iji guzobeghachi ofufe dị ọcha.—Ezra 2:1; Zefanaịa 3:14, 15, 20.

20 Gịnị ka ihe a nile pụtara nye oge anyị? N’ọtụtụ ụzọ, ọnọdụ dị n’ụbọchị Zefanaịa kwekọrọ n’ihe arụ ndị na-eme taa na Krisendọm. Ọzọkwa, omume dị iche iche nke ndị Juu n’oge ndị ahụ yiri omume ndị a pụrụ ịhụ taa, mgbe ụfọdụ ọbụna n’etiti ndị Jehova. Ndị a bụ ihe ndị a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ ga-eyi ka okwu ahụ bụ́ “ụmụ eze” ọ̀ na-ezo aka n’ebe ndị isi nile bụ eze nọ, ebe ọ bụ na ụmụ nke Josaịa n’onwe ya dị nnọọ ntakịrị n’oge ahụ.

Ná Ntụleghachi

◻ Gịnị bụ ọnọdụ okpukpe nke dị na Juda n’ụbọchị Zefanaịa?

◻ Olee ọnọdụ ndị jupụtara n’etiti ndị ndú ọchịchị, gịnịkwa bụ omume nke ọtụtụ n’ime ndị ala ahụ?

◻ Olee otú mba nile si mee onwe ha ukwuu megide ndị Jehova?

◻ Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Zefanaịa nyere Juda na mba ndị ọzọ?

◻ Olee otú e si kwụghachi ndị nọ na-echere Jehova ụgwọ ọrụ?

[Foto dị na peeji nke 9]

Nkume Moab na-egosipụta na Eze Mesha nke Moab kwuru okwu nkọcha dị iche iche megide Israel oge ochie

[Ebe E Si Nweta Foto]

Nkume Moab: Musée du Louvre, Paris

[Foto dị na peeji nke 10]

N’ịkwado amụma Zefanaịa, ihe odide “cuneiform” a nke Ihe Ndekọ nke Babilọn dekọrọ mbibi nke ndị agha jikọrọ aka ọnụ bibiri Nineve

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ihe odide cuneiform: Site n’ikike nke The British Museum

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya