Ịdị n’Otu n’Ozi Chineke n’Oge Ndị Dị Mma na Ndị Dị Njọ
Dị ka Michel na Babette Muller si kọọ
“ENWERE m ozi ọjọọ izi gị,” ka dọkịta kwuru. “I nwere ike ichezọ banyere ndụ ozi ala ọzọ gị n’Africa.” N’ilekwasị nwunye m, bụ́ Babette, anya, ọ sịrị, “I nwere ọrịa cancer ara.”
O riri anyị ọnụ. Ọtụtụ ihe gbatara anyị n’uche. Anyị cheburu na ojije a anyị jere ịhụ dọkịta ga-abụ nanị nnyocha ikpeazụ. A zụtaworị tiketi anyị ga-eji alaghachi Benin, Ọdịda Anyanwụ Africa. Anyị nweburu olileanya ịlaghachi ebe ahụ n’izu ahụ. N’ime 23 afọ nke alụmdi na nwunye anyị, anyị enwewo oge ndị dị mma na ndị dị njọ. N’ịnọ ná mgbagwoju anya na n’ụjọ, anyị kere ájị̀ n’ume ịlụso ọrịa cancer ọgụ.
Ka anyị malite ná mbido. A mụrụ Michel na September 1947, mụọ Babette n’August 1945. Anyị tolitere na France ma lụọ di na nwunye na 1967. Anyị biri na Paris. N’otu ụtụtụ ná mmalite 1968, Babette ejeghị ọrụ n’oge. Otu nwaada bịara n’ọnụ ụzọ anyị wee nyefee ya otu broshuọ okpukpe; ọ nakweere ya. Nwaada ahụ kwuziri, sị: “Mụ na di m ànyị nwere ike ịlaghachite ịgwa gị na di gị okwu?”
Babette nọ na-eche banyere ọrụ ya. Ọ chọrọ ka nwanyị ahụ lawa, ya mere o kwuru, sị, “Ọ dị mma.”
Michel na-akọ, sị: “Enweghị m mmasị n’okpukpe, ma broshuọ ahụ dọọrọ mmasị m, agụkwara m ya. Ụbọchị ole na ole ka e mesịrị, nwaada ahụ, bụ́ Joceline Lemoine, na di ya, bụ́ Claude, laghachitere. Di ya dị nkà n’ojiji o ji Bible eme ihe. O nwere azịza nye ajụjụ m nile. Nke ahụ masịrị m.
“Babette bụ ezigbo onye Katọlik ma o nweghị Bible, nke na-abụghị ihe ọhụrụ nye ndị Katọlik. O nwere obi ụtọ dị ukwuu ịhụ na ịgụ Okwu Chineke. Site n’ọmụmụ ihe anyị, anyị mụtara na ọtụtụ n’ime echiche okpukpe ndị a kụziwooro anyị bụ ụgha. Anyị malitere ịgwa ndị ikwu na ndị enyi anyị okwu banyere ihe ndị anyị na-amụta. Na January 1969 anyị ghọrọ Ndịàmà Jehova e mere baptism. E mere mmadụ itoolu ná ndị ikwu na ndị enyi anyị baptism n’oge na-adịghị anya ka nke ahụ gasịrị.”
Ije Ozi n’Ebe A Chọrọ Ndị Nkwusa
N’oge na-adịghị anya ka e mesịrị anyị baptism, anyị chere, sị: ‘Anyị enweghị ụmụ ọ bụla. Gịnị mere na anyị agaghị ewere ozi oge nile?’ Ya mere na 1970 anyị hapụrụ ọrụ anyị, debanye aha dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile, wee kwaga ná ntakịrị obodo bụ́ Magny-Lormes, nke dịdewere Nevers, n’etiti France.
Ọ bụ ọrụ siri ike. O siri ike ịchọta ndị chọrọ ịmụ Bible. Anyị apụghị ịchọta ọrụ ego, ya mere anyị nwere ntakịrị ego. Mgbe ụfọdụ nanị ihe oriri anyị na-enwe na-abụ poteto. N’oge oyi, ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ dara karịa ọ̀tụ̀tụ̀ mmiri ji akpụkọ. Anyị kpọrọ oge ahụ anyị nọrọ n’ebe ahụ oge nke ehi asaa ahụ tara ahụ.—Jenesis 41:3.
Ma Jehova kwagidere anyị. Otu ụbọchị mgbe ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịkwaghị ihe oriri anyị nwere, onye na-ekesa akwụkwọ ozi buteere anyị otu nnukwute igbe cheese nke sitere n’aka nwanne Babette nke nwanyị. Ụbọchị ọzọ anyị lọtara ụlọ mgbe anyị mesịrị nkwusa wee hụ ụfọdụ ndị enyi gaworo 500 kilomita iji leta anyị. Ebe ha nụworo otú ihe si sie ike, ụmụnna ndị a jiri ihe oriri kwajuoro anyị ụgbọ ala abụọ ha.
Mgbe otu afọ na ọkara gasịrị, Society họpụtara anyị ịbụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. N’ime afọ anọ sochirinụ, anyị jere ozi na Nevers, e mesịa na Troyes, na n’ikpeazụ na Montigny-lès-Metz. Na 1976, a họpụtara Michel ije ozi dị ka onye nlekọta sekit n’akụkụ ndịda nke ebe ọdịda anyanwụ France.
Afọ abụọ ka e mesịrị, n’oge e nwere ụlọ akwụkwọ maka ndị nlekọta sekit, anyị natara otu akwụkwọ ozi site n’aka Watch Tower Society na-akpọ anyị òkù ịga obodo ọzọ dị ka ndị ozi ala ọzọ; akwụkwọ ozi ahụ kwuru na anyị pụrụ ịhọrọ Chad ma ọ bụ Burkina Faso (nke bụ Upper Volta n’oge ahụ). Anyị họọrọ Chad. N’oge na-adịghị anya anyị natara akwụkwọ ozi ọzọ, na-ekenye anyị ịrụ ọrụ n’okpuru alaka Tahiti. Anyị kwuburu ka anyị jee Africa, kọntinent buru ibu, ma n’oge na-adịghị anya anyị chọtara onwe anyị n’otu ntakịrị àgwàetiti!
Ije Ozi na Ndịda Pacific
Tahiti bụ àgwàetiti mara mma bụ́ ebe okpomọkụ dị na ya na Ndịda Pacific. Mgbe anyị rutere, ihe dị ka otu narị ụmụnna nọ n’ebe ahụ izute anyị n’ọdụ ụgbọ elu. Ha ji ihe olu e ji okooko osisi mee nabata anyị, n’agbanyeghịkwa na ike gwụsịrị anyị mgbe anyị mesịrị ogologo njem site na France, obi dị anyị ụtọ nke ukwuu.
Ọnwa anọ ka anyị bịarutesịrị Tahiti, anyị banyere otu ntakịrị ụgbọ epeepe nke na-agba agba nke e ji akị oyibo kpọrọ akpọ kwajuo. Ụbọchị ise ka e mesịrị anyị rutere n’ebe ọhụrụ e kenyere anyị ọrụ—àgwàetiti Nuku Hiva n’Àgwàetiti Marquesas nile. Ihe dị ka 1,500 mmadụ bi n’àgwàetiti ahụ, ma e nweghị ụmụnna ọ bụla. Ọ bụ nanị anyị.
N’oge ahụ ọnọdụ dịnụ bụ nke ime obodo. Anyị biri ná ntakịrị ụlọ nke e ji kọnkrị na ọtọsị wuo. Ọkụ eletrik adịghị. Anyị nwere pọmpụ nke na-agba mgbe ụfọdụ, ma mmiri ya na-adị ụrọ ụrọ. Ihe ka n’ọtụtụ mgbe, anyị na-eji mmiri zoro ezo nke gbanyere n’olulu mmiri eme ihe. E nweghị ụzọ a kwara akwa, ọ bụ nanị ụzọ apịtị.
Iji ruo n’akụkụ ndị dịmiri adịmi nke àgwàetiti ahụ, anyị aghaghị ịgbazite ịnyịnya. E ji osisi rụọ ebe ndị a na-anọkwasị na ha—nke na-adịghị ntụsara ahụ ma ọlị, karịsịa nye Babette, bụ́ onye na-agbatụbeghị ịnyịnya mbụ. Anyị na-eji otu mma ògè iji gbujie ọtọsị ndị dachiri ụzọ. Ọ bụ nnukwute mgbanwe ná ndụ a na-adị na France.
Anyị na-enwe nzukọ na Sunday, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị anyị abụọ na-abịa. Na mbụ anyị adịghị enwe nzukọ ndị nke ọzọ ebe ọ bụ nanị anyị abụọ. Kama nke ahụ anyị na-agụkọ ihe a ga-eji mee nzukọ ahụ ọnụ.
Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, anyị kpebiri na ọ dịghị mma ịnọgide na-eme otú ahụ. Michel na-akọ, sị: “Asịrị m Babette, ‘Anyị aghaghị ijikere n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Nọdụ ala n’ebe ahụ, m ga-anọdụkwa ala n’ebe a. M ga-eji ekpere malite, mgbe ahụ anyị ga-enwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi. M ga-ajụ ajụjụ, ị ga-azakwa, ọ bụrụgodị na ọ bụ nanị gị bụ onye ọzọ nọ n’ọnụ ụlọ ahụ.’ Ọ dị mma na anyị mere nke ahụ n’ihi na ọ dị mfe ịghọ ndị dara mbà n’ụzọ ime mmụọ mgbe a na-enweghị ọgbakọ ọ bụla.”
O were oge iji mee ka ndị mmadụ bịa nzukọ anyị nke ndị Kraịst. Anyị abụọ nọ nanị anyị ruo ọnwa asatọ mbụ. Ka e mesịrị, otu onye, mmadụ abụọ, ma ọ bụ mgbe ụfọdụ mmadụ atọ ndị ọzọ sonyeere anyị. Otu afọ, nanị anyị abụọ malitere ememe Nri Anyasị Onyenwe Anyị nke a na-eme kwa afọ. Mgbe minit iri gasịrị, ndị ụfọdụ bịara, ya mere akwụsịrị m wee maliteghachi okwu ahụ.
Taa, e nwere ndị nkwusa 42 na ọgbakọ 3 n’Àgwàetiti Marquesas nile. Ọ bụ ezie na ndị nọchiri anyị rụrụ akụkụ kasị ukwuu nke ọrụ ahụ, e meela ụfọdụ ndị anyị kpọtụụrụ laa azụ n’oge ahụ baptism ugbu a.
Ụmụnna Anyị Dị Oké Ọnụ Ahịa
Anyị mụtara inwe ndidi na Nuku Hiva. Anyị aghaghị ichere maka ihe nile ma e wezụga ihe ndị kasị mkpa. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị chọrọ akwụkwọ, ị ghaghị ide akwụkwọ maka ya, mgbe ahụ chere ruo ọnwa abụọ ma ọ bụ atọ tupu o rute.
Ihe ọzọ anyị mụtara bụ na ụmụnna anyị dị oké ọnụ ahịa. Mgbe anyị jere leta Tahiti ma jee nzukọ wee nụ ka ụmụnna ahụ na-abụ abụ, a kpaliri anyị ibe ákwá. Ọ pụrụ ịbụ eziokwu na o siri ike iso ụmụnna ụfọdụ na-emekọ ihe n’udo. Ma mgbe nanị gị nọ, ị na-aghọta otú o si dị mma isoro òtù ụmụnna nọrọ. Na 1980, Society kpebiri na anyị kwesịrị ịlaghachi Tahiti ma jee ozi n’ọrụ sekit. N’ebe ahụ, omume ile ọbịa nke ụmụnna na ịhụnanya ha nwere maka ọrụ nkwusa ahụ gbara anyị ume n’ụzọ dị ukwuu. Anyị nọrọ afọ atọ n’ọrụ sekit na Tahiti.
Site n’Àgwàetiti Gaa n’Àgwàetiti
Ọzọ, e kenyere anyị ọrụ n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị na Raïatéa, bụ́ àgwàetiti ọzọ nke Pacific, anyị nọkwara n’ebe ahụ ruo ihe dị ka afọ abụọ. Mgbe anyị nọsịrị na Raïatéa, e kenyere anyị ịrụ ọrụ sekit n’ìgwè àgwàetiti nke Tuamotu. Anyị jiri ụgbọ epeepe jee leta 25 n’ime 80 àgwàetiti ahụ. O siiri Babette ike. Mgbe ọ bụla o jiri ụgbọ epeepe mee njem, ọ na-ada ọrịa.
Babette na-asị: “Ọ dị egwu! M na-arịa ọrịa oge nile anyị nọrọ n’ụgbọ epeepe. Ọ bụrụ na anyị nọrọ ụbọchị ise na mmiri, arịara m ọrịa ụbọchị ise. Ọ dịghị ọgwụ ọ bụla na-arụ ọrụ n’ahụ m. Ma, n’agbanyeghị ọrịa m, echere m na osimiri mara mma. Ọ bụ nnọọ ihe magburu onwe ya ikiri. Azụ dolphin ga-eso ụgbọ epeepe ahụ na-agba ọsọ. Ọtụtụ mgbe ha ga-esi n’ime mmiri malite ma ọ bụrụ na ị kụọ aka gị!”
Mgbe anyị nọsịrị afọ ise n’ọrụ sekit, e kenyeghachiri anyị ọrụ na Tahiti ruo afọ abụọ, ọzọkwa ọrụ nkwusa ahụ tọrọ anyị ụtọ. Ọgbakọ anyị mụbara okpukpu abụọ site na 35 ruo 70 ndị nkwusa n’otu afọ na ọkara. E mere mmadụ 12 ná ndị anyị duziere ọmụmụ Bible baptism ntakịrị oge tupu anyị apụọ. Ugbu a ụfọdụ n’ime ha bụ ndị okenye n’ọgbakọ.
Ná ngụkọta anyị nọrọ afọ 12 na Ndịda Pacific. Mgbe ahụ anyị natara akwụkwọ ozi site n’aka Society na-asị na ha achọkwaghị ndị ozi ala ọzọ n’àgwàetiti ndị ahụ ebe ọ bụ na ọgbakọ ndị ahụ akwụrụsiela ike ugbu a. E nwere ihe dị ka 450 ndị nkwusa mgbe anyị bịarutere Tahiti na ihe karịrị 1,000 mgbe anyị hapụrụ.
Africa n’Ikpeazụ!
Anyị laghachiri France, mgbe otu ọnwa na ọkara gasịkwara, Society kenyere anyị ọrụ ọhụrụ—Benin, Ọdịda Anyanwụ Africa. Afọ 13 tupu mgbe ahụ anyị chọburu ịga Africa, ya mere obi tọrọ anyị ụtọ nke ukwuu.
Anyị bịarutere Benin na November 3, 1990, anyị sokwa ná ndị ozi ala ọzọ mbụ bịaruterenụ mgbe e wepụsịrị mmachibido iwu ahụ were afọ 14 nke a machibidoro ọrụ nkwusa Alaeze ahụ. Ọ bụ nnọọ ihe na-akpali akpali. Anyị enweghị nsogbu ọ bụla ịtụsara ahụ n’ihi na ndụ dị ebe ahụ yiri nke dị n’àgwàetiti nile nke Pacific. Ndị obodo ahụ nwere omume enyi ma na-ele ọbịa nke ọma. Ị pụrụ ịkwụsị ma soro onye ọ bụla nwee nkwurịta okwu n’okporo ámá.
Nanị izu ole na ole ka anyị bịarutesịrị Benin, Babette chọpụtara otu akpụ n’ara ya. Ya mere anyị gara ná ntakịrị ụlọ ọgwụ nke dịdewere alaka ụlọ ọrụ ahụ e guzobere ọhụrụ. Dọkịta lelere ya ahụ wee kwuo na ọ chọrọ ịwa ahụ ngwa ngwa. Echi ya anyị jere n’ụlọ ọgwụ ọzọ ebe anyị hụrụ otu dọkịta bụ́ onye Europe, ọkachamara n’ịgwọ ọrịa ụmụ nwanyị bụ́ onye sitere France. Ya onwe ya kwukwara na anyị aghaghị ịga France ngwa ngwa ka e wee nwee ike ịwa Babette ahụ. Ụbọchị abụọ ka e mesịrị anyị banyere ụgbọ elu gawa France.
Ọ dị anyị mwute ịhapụ Benin. N’inwe nnwere onwe ahụ e nwetaghachiri nke ikpe okpukpe ná mba ahụ, obi dị ụmụnna ahụ ụtọ inwe ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ, obi dịkwa anyị ụtọ ịnọ n’ebe ahụ. Ya mere o wutere anyị na anyị aghaghị ịhapụ mgbe anyị nọsịrị nanị izu ole na ole ná mba ahụ.
Mgbe anyị rutere France, dọkịta ahụ na-awa ahụ nyochara Babette wee kwuo na ọ bụ eziokwu na ọ chọrọ ịwa ahụ. Ndị dọkịta ahụ mere ihe n’egbughị oge, nwee ntakịrị ịwa ahụ, wee hapụ Babette ka o si n’ụlọ ọgwụ ahụ laa n’ụbọchị na-eso ya. Anyị chere na okwu ebiela.
Ụbọchị asatọ ka e mesịrị, anyị hụrụ dọkịta ahụ na-awa ahụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka o kwuru na Babette nwere ọrịa cancer ara.
N’icheghachi echiche azụ n’otú ọ dị ya n’oge ahụ, Babette na-asị: “Na mbụ, o wuterughị m otú o wuteruru Michel. Ma ụbọchị na-esote ụbọchị e nyere anyị ozi ọjọọ ahụ, enweghị m mmetụta ọ bụla. Ebelighị m ákwá. Enweghị m ike ịmụmụ ọnụ ọchị. Echere m na m gaje ịnwụ. Nye m, ọrịa cancer na ọnwụ bụ otu ihe. Omume m bụ, Anyị ga-emerịrị ihe anyị na-aghaghị ime.”
Ịlụso Ọrịa Cancer Ọgụ
Anyị nụrụ ozi ọjọọ ahụ na Friday, e mekwara ndokwa na a ga-awa Babette ahụ nke ugboro abụọ na Tuesday. Anyị nọrịị n’ụlọ nwanne Babette nke nwanyị, ma ya onwe ya na-arịakwa ọrịa, ya mere anyị apụghị ịnọgide ná ntakịrị ụlọ ya.
Anyị nọ na-eche ebe anyị pụrụ ịga. Mgbe ahụ anyị chetara Yves na Brigitte Merda, di na nwunye anyị nọburu na nke ha. Di na nwunye a lere anyị nnọọ ọbịa nke ọma. Ya mere anyị kpọrọ Yves na fon wee gwa ya na ịwa ahụ dị Babette mkpa, na anyị amaghịkwa ebe anyị ga-anọ. Anyị gwakwara ya na ọrụ dị Michel mkpa.
Yves nyere Michel ọrụ na gburugburu ụlọ ya. Ụmụnna ji ọtụtụ omume obi ọma kwadoo ma gbaa anyị ume. Ha nyekwaara anyị aka n’ụzọ ego. Society kwụrụ ụgwọ ọgwụ Babette nile.
Ịwa ahụ ahụ bụ nke siri ike. Ndị dọkịta ahụ aghaghị ibepụ isi akwara ndị na-ebu mmiri dị iche iche n’ahụ na ara. Ha malitere iji ọgwụ agwọ ọrịa ozugbo. Mgbe otu izu gasịrị, Babette nwere ike ịhapụ ụlọ ọgwụ ahụ, ma ọ ghaghị ịlaghachite kwa izu atọ ọ bụla maka ịnọgide na-enweta ọgwụgwọ.
N’oge ahụ a nọ na-agwọ Babette, ụmụnna nọ n’ọgbakọ nyere nnọọ aka. Otu nwanna nwanyị onye rịatụworo ọrịa cancer ara bụ ihe agbamume dị ukwuu. Ọ gwara Babette ihe ọ ga-atụ anya ya, nyekwa ya nkasi obi dị ukwuu.
Ka o sina dị, anyị chị obi n’aka banyere ọdịnihu anyị. N’ịchọpụta nke a, Michel na Jeanette Cellerier kpọọrọ anyị gaa n’ụlọ nri maka iri ihe.
Anyị gwara ya na anyị aghaghị ịkwụsị ọrụ ozi ala ọzọ nakwa na anyị apụghị ịlaghachi Africa mgbe ọ bụla. Otú ọ dị, Nwanna Cellerier sịrị: “Gịnị? Ònye sịrị na unu aghaghị ịkwụsị? Ọ̀ bụ Òtù Na-achị Isi? Ọ̀ bụ ụmụnna nọ na France? Ònye kwuru ya?”
“Ọ dịghị onye kwuru ya,” ka m zaghachiri, “ọ bụ m na-ekwu ya.”
“Mbanụ!” ka Nwanna Cellerier kwuru. “Unu ga-alaghachi!”
E ji ụzarị ọkụ sochie iji ọgwụ agwọ ọrịa, bụ́ nke gwụsịrị ná ngwụsị nke August 1991. Ndị dọkịta ahụ sịrị na ha ahụghị nsogbu ọ bụla dị n’anyị ịlaghachi Africa, ma ọ bụrụhaala na Babette na-agaghachi France maka nnyocha site n’oge ruo n’oge.
Ịlaghachi Benin
Ya mere anyị degaara isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn akwụkwọ na-arịọ ikike iji laghachi n’ozi ala ọzọ. Ọ dị anyị ọkụ n’obi ịnụ nzaghachi ha. O yiri ka ụbọchị adịghị agba ọsọ. N’ikpeazụ, Michel apụkwaghị ichere, ya mere ọ kpọrọ Brooklyn na fon wee jụọ ma ha enwetala akwụkwọ ozi anyị. Ha sịrị na ha atụlewo ya—anyị pụrụ ịlaghachi Benin! Lee ekele anyị nwere n’ebe Jehova nọ!
Ezinụlọ Merda haziri nnọkọ oriri na ọṅụṅụ magburu onwe ya iji ṅụrịa ọṅụ maka ozi ahụ. Na November 1991 anyị laghachiri Benin, ụmụnna ahụ jikwa oriri nabata anyị!
O yiri ka ahụ ọ dị Babette ugbu a. Anyị alaghachiwo France site n’oge ruo n’oge maka nnyocha ahụ ike zuru ezu, ndị dọkịta ahụghịkwa ihe ọ bụla yiri ọrịa cancer. Obi dị anyị ụtọ ịlaghachi n’ọrụ ozi ala ọzọ anyị. Anyị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị a chọrọ na Benin, Jehova agọziwokwa ọrụ anyị. Kemgbe anyị lọghachiri anyị enyeworo mmadụ 14 aka ruo n’ókè nke ime baptism. Ise n’ime ha bụ ndị ọsụ ụzọ oge nile ugbu a, a họpụtawokwa otu onye ịbụ ohu na-eje ozi. Anyị ahụwokwa ka ntakịrị ọgbakọ anyị toro wee kewaa ịghọ ọgbakọ abụọ.
N’ime afọ ndị gafeworonụ, anyị ejeworo Jehova ozi dị ka di na nwunye, anyị enwewokwa ọtụtụ ngọzi ma bịa mara ọtụtụ ndị bụ ndị ezigbo mmadụ. Ma Jehova azụwokwa ma wusie anyị ike inwe ihe ịga nke ọma ịtachi obi n’ihe isi ike dị iche iche. Dị ka Job, anyị aghọtaghị mgbe nile ihe mere ihe dị iche iche ji mee otú ha si mee, ma anyị maara na Jehova nọ mgbe nile inyere anyị aka. Ọ bụ dị ka Okwu Chineke na-ekwu: “Lee, aka Jehova adịghị mkpụmkpụ karị ịzọpụta; ntị Ya adịghịkwa arọ karị ịnụ ihe.”—Aịsaịa 59:1.
[Foto dị na peeji nke 23]
Michel na Babette Muller ka ha yi uwe ọdịnala na Benin
[Foto ndị dị na peeji nke 25]
Ọrụ ozi ala ọzọ n’etiti ndị Polynesia bi na Tahiti ebe okpomọkụ dị na ya