Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 3/15 p. 3
  • Ezi Ndị Enyi Dị Anyị Mkpa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezi Ndị Enyi Dị Anyị Mkpa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere Ezi Ndị Enyi Ji Dị Anyị Mkpa
  • Otú Gị na Ndị Enyi Gị Ga-esi Na-abụ Enyi n’Ụwa A Ịhụnanya Kọrọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ị Pụrụ Inweta Ọbụbụenyi Ndị Na-adịgide Adịgide
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Saa Anya ná Mmiri ma A Bịa n’Ụdị Ndị Ị Na-emete Enyi
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Imejụ Agụụ Anyị Na-enwe Maka Ndị Enyi
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 3/15 p. 3

Ezi Ndị Enyi Dị Anyị Mkpa

JENNY na Sue nọ na-enwe mkparịta ụka na-ekpo ọkụ. Ọchị juru ha n’ihu, anya ha na-egbukepụ—ihe nile banyere ha na-egosi oké mmasị n’ihe onye nke ọzọ nwere ikwu. Ọ bụ ezie na nzụlite ha dị iche iche, o doro anya na ha nwekọrọ ọtụtụ ihe ọnụ, ha nwekwara nkwanye ùgwù dị ukwuu n’ebe ibe ha nọ.

N’ebe ọzọ, Eric na Dennis nọ na-arụkọ ọrụ ọnụ n’otu ọrụ ihe owuwu, otu n’ime ndị ha rụkọworo ọnụ kemgbe ọtụtụ afọ. Ahụ ruru ha ala, ntakịrị ihe na-emekwa ha ịchị ọchị. Ka mkparịta ụka ahụ na-agafe n’okwu ndị siri ike, ha na-eji obi eziokwu ekwupụta echiche ha. Ha na-akwanyere ibe ha ùgwù. Dị ka Jenny na Sue, Eric na Dennis bụ ezi ndị enyi.

Nkọwa ndị a pụrụ ịmasị gị, mee gị iche echiche banyere ndị enyi nke gị. N’aka nke ọzọ, ha pụrụ ime ka i nwee agụụ siri ike maka ọbụbụenyi ndị dị otú ahụ. Gị onwe gị kwa pụrụ inwe ha!

Ihe Mere Ezi Ndị Enyi Ji Dị Anyị Mkpa

Ọbụbụenyi ndị dị mma dị mkpa maka ahụ ike anyị nke uche na anụ ahụ. Otú ọ dị, mgbe anyị na-enwe owu ọmụma, nke a apụtaghị na ọ dị ihe na-eme anyị. Ụfọdụ ndị na-eme nchọpụta na-ekwu na owu ọmụma bụ agụụ, mgbaàmà ebumpụta ụwa na inwe onye ibe dị anyị mkpa. Ka o sina dị, dị nnọọ ka ihe oriri na-eme ka agụụ dajụlata ma ọ bụ kwụsị, ụdị ọbụbụenyi kwesịrị ekwesị pụrụ ibelata owu ọmụma ma ọ bụ ọbụna mee ka ọ kwụsị. Ọzọkwa, inwe ezi ndị enyi bụ́ ndị ji anyị kpọrọ ihe abụghị ihe okomoko nke a na-apụghị inweta.

E kekọtara mmadụ na mkpa nke inwe onye ibe. (Jenesis 2:18) Bible na-asị na ‘a na-amụ’ ezi enyi, ma ọ bụ onye ibe, ‘banyere ahụhụ.’ (Ilu 17:17) N’ihi ya, ezi ndị enyi kwesịrị inwe ike ịrịọ ibe ha maka enyemaka mgbe ọ dị mkpa. Ma ọbụbụenyi karịrị nanị inwe onye a ga-echigharịkwuru ma ọ bụ ịbụ onye ibe n’ọrụ ma ọ bụ n’egwuregwu. Ezi ndị enyi na-eme ka ihe ndị kasị mma n’ime ibe ha pụta ìhè. Ilu 27:17 na-asị: “Ígwè na-amụcha ígwè; otú a ka mmadụ na-amụcha ihu enyi ya.” Dị ka a pụrụ isi jiri otu ígwè mụchaa ihu ígwè ọzọ nke e ji otu ọla ahụ mee, otu enyi pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịmụcha ọnọdụ ọgụgụ isi na nke ime mmụọ nke onye ọzọ. Ọ bụrụ na ndakpọ olileanya emee ka anyị daa mbà n’obi, ile anya ọmịiko nke enyi na agbamume Akwụkwọ Nsọ pụrụ ịbụ nnọọ ihe na-ewuli elu.

Na Bible, e jikọtara ọbụbụenyi na ịhụnanya, ịkpachi anya, inwe ihe nzuzo, na inwe onye ibe. Ọbụbụenyi pụrụ ịgụnye ndị agbata obi, ndị ha na mmadụ na-arụkọ ọrụ, na ndị ọzọ. Ụfọdụ na-agụnyekwa ndị ikwu ha ụfọdụ ná ndị enyi ha kasị chie anya. Otú ọ dị, nye ọtụtụ ndị taa, o siri ike ịchọta na ịnọgide na-enwe ezi ndị enyi. N’ihi gịnị ka nke a ji dị otú a? Ị̀ pụrụ inwe ezi ọbụbụenyi ndị na-adịgidekwa adịgide?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya