Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 5/1 p. 3-4
  • Chineke, Ọchịchị, na Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke, Ọchịchị, na Gị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Krisendọm Si Ghọọ Akụkụ Ụwa Nke A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Iso Ụzọ Kraịst Oge Mbụ na Ọchịchị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Chineke na Siza
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • È Nwere Nanị Otu ‘Ezi Chọọchị’?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 5/1 p. 3-4

Chineke, Ọchịchị, na Gị

“Chọọchị na Ọchịchị Ezute Onwe Ha ná Ntụliaka Banyere Ịgba Alụkwaghịm na Ireland”

ISI akụkọ a nke pụtara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-egosi otú ndị mmadụ taa pụrụ isi chee nhọrọ dị n’etiti ihe Ọchịchị chọrọ na ihe chọọchị ha na-akụzi ihu.

Edemede ahụ sịrị: “N’ihe na-erukwaghị otu ọnwa tupu ntụliaka n’ihe banyere ma a ga-ewepụ mmachibido nke ụkpụrụ iwu ya machibidoro ịgba alụkwaghịm, Ireland nke ihe dị ukwuu n’ime ha bụ ndị Roman Katọlik na-enwe nsọkọrịta isi dị egwu n’etiti ndị ndú nke Gọọmenti ya na ndị nke chọọchị ya.” Ọchịchị mere atụmatụ mwepụ nke mmachibido a machibidoro ịgba alụkwaghịm, ebe Chọọchị Katọlik na-emegidesi ịgba alụkwaghịm na nlụgharị ike. Ndị Katọlik nke Ireland aghaghị ime nhọrọ n’etiti Chọọchị na Ọchịchị. Dị ka o mesịrị dapụta, Ọchịchị ji ihe ntakịrị merie.

N’ụzọ dị ịrịba ama karị, ruo ọtụtụ afọ ndị nọ na Northern Ireland echewo ibu agha dị ilu ihu n’ihe banyere nnwere onwe nke mba. E gbuwo ọtụtụ ndị. Ndị Roman Katọlik na ndị Protestant enwewo echiche ndị megidere ibe ha n’Ọchịchị ha ga-anọ n’okpuru ya: ịchịisi Britain nọgidere na-achị na Northern Ireland ka ọ bụ gọọmenti etiti maka Ireland nile.

N’otu aka ahụ, n’ihe bụbu Yugoslavia, ndị na-achị achị achọwo n’aka ndị òtù nke okpukpe dị iche iche, gụnyere Katọlik na Orthodox, ịlụ ọgụ n’agha a na-alụ maka ókèala. Nye ndị amaala nkịtị, olee onye mbụ ọ ga-erubere isi? Hà ga-agbaso ndị ahụ na-asị na ha na-anọchite anya Ọchịchị, ka hà ga-erubere Chineke isi, bụ́ onye na-asị: “Egbula mmadụ . . . Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị”?—Ndị Rom 13:9.

Ị pụrụ iche na ụdị ọnọdụ a nwere ike ọ gaghị emetụta gị mgbe ọ bụla. Ma ọ pụrụ. N’ezie, ọ pụrụ ịgbasa gị ọbụna ugbu a. N’akwụkwọ ya bụ́ The State in the New Testament, ọkà mmụta okpukpe bụ́ Oscar Cullmann na-ekwu banyere “mkpebi ọnwụ na ndụ nke a pụrụ ma ọ bụ a na-aghaghị ịchọ ka ndị Kraịst nke oge a mee n’ọnọdụ ndị siri oké ike mgbe ọchịchị aka ike yiri ha egwú.” Otú ọ dị, ọ na-ekwukwa okwu banyere “ibu ọrụ dịkwa adị ma dị mkpa nke onye Kraịst ọ bụla—nakwa onye Kraịst na-ebi ndụ n’okpuru ihe a kpọrọ ọnọdụ ndị ‘dị ka o kwesịrị, ‘na-adị kwa ụbọchị’—izute na ịgwọta nsogbu siri ike nke na-eche ya ihu nanị n’ihi na ọ bụ onye Kraịst.”

Ya mere ò kwesịrị ka mmekọrịta dị n’etiti okpukpe na Ọchịchị masị ndị Kraịst taa? O kwesịrị n’ezie. Site n’oge mbụ, ndị Kraịst agbalịwo ịzụlite echiche ziri ezi banyere ndị ọchịchị ụwa. Onyendú ha, bụ́ Jisọs Kraịst, bụ onye Ọchịchị Rom kpere ikpe, maa ikpe, ma gbuo. Ndị na-eso ụzọ ya aghaghị ime ka ibu ọrụ ndị Kraịst ha kwekọọ n’ozi ha ga-ejere Alaeze Ukwu Rom. N’ihi ya, ntụleghachi nke mmekọrịta ha na ndị ọchịchị ga-enye ndị Kraịst taa ihe nduzi.

[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 3]

Tom Haley/Sipa Press

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya