Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 5/15 p. 15-20
  • Gụọ Okwu Chineke Ma Jeere Ya Ozi n’Eziokwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gụọ Okwu Chineke Ma Jeere Ya Ozi n’Eziokwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Uru Ndị Na-adịte Anya
  • Ọ Dị Mkpa Nye Mmadụ Nile
  • Gụpụta Okwu Chineke
  • Ụzọ Ịmụ Ihe n’Isiokwu n’Isiokwu
  • Na-eje Ije Mgbe Nile n’Ime Eziokwu Ahụ
  • Irite Uru Site n’Ọgụgụ Bible Kwa Ụbọchị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Mikpuo Onwe Gị n’Igụ Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Gbasoo Ụkpụrụ Ahụ A Tụpụtaara Ndị Eze
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Nakwere Bible n’Ihi Ihe Ọ Bụ n’Ezie
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 5/15 p. 15-20

Gụọ Okwu Chineke Ma Jeere Ya Ozi n’Eziokwu

“Zi m ụzọ Gị, Jehova; m ga-ejegharị n’eziokwu Gị.”—ABỤ ỌMA 86:11.

1. N’ụzọ bụ isi, gịnị ka mbipụta mbụ nke magazin a kwuru banyere eziokwu?

JEHOVA na-ezipụta ìhè na eziokwu. (Abụ Ọma 43:3) Ọ na-enyekwa anyị ikike nke ịgụ Okwu ya, bụ́ Bible, na ịmụta eziokwu. Mbipụta mbụ nke akwụkwọ a—July 1879 (Bekee)—kwuru, sị: “Eziokwu, dị ka okooko osisi nta dị ala nke dị n’ọzara nke ndụ, bụ nke uto na-ama pokopoko nke ahịhịa nke okwu ụgha gbara gburugburu ma fọ nke nta ka ha kpagbuo. Ọ bụrụ na ị ga-achọta ya ị ghaghị ịnọgide na-achọgharị ya. Ọ bụrụ na ị ga-ahụ ịma mma ya ị ghaghị inuchapụ n’akụkụ ahịhịa nile nke okwu ụgha na ogwu nile nke ịkpọ ekwo nkụ. Ọ bụrụ na ị ga-enweta ya ị ghaghị ihulata ala iji nweta ya. Ekwela ka otu okooko osisi nke eziokwu ju gị afọ. A sị na otu zuru a garaghị enweworị ndị ọzọ. Nọgide na-achịkọba, nọgide na-achọ.” Ịgụ na ịmụ Okwu Chineke na-eme ka anyị nwee ike inweta ezi ihe ọmụma ma jee ije n’eziokwu ya.—Abụ Ọma 86:11.

2. Gịnị mere mgbe Ezra na ndị ọzọ gụụrụ ndị Juu nọ na Jerusalem oge ochie Iwu Chineke?

2 Mgbe e wughachisịrị mgbidi nke Jerusalem na 455 T.O.A., onye nchụàjà bụ́ Ezra na ndị ọzọ gụụrụ ndị Juu Iwu Chineke. Ihe sochiri nke a bụ Ememe Ụlọ Ntu nke na-enye ọṅụ, nkwupụta mmehie, na ịgba “ọgbụgba ndụ kwesịrị ntụkwasị obi.” (Nehemaịa 8:1–9:38) Anyị na-agụ, sị: “Ha wee gụọ n’akwụkwọ ahụ, bụ́ n’iwu Chineke, gụpụta ya nke ọma, wee mee ka a mata isi ya, ha wee ghọta ọgụgụ ya.” (Nehemaịa 8:8) Ụfọdụ ndị na-atụ aro na ndị Juu ahụ aghọtaghị asụsụ Hibru nke ọma na a kọwakwara ya n’asụsụ Aramaic. Ma ihe odide ahụ adịghị egosi nanị nkọwa nke okwu ndị dị n’asụsụ. Ezra na ndị ọzọ kọwara Iwu ahụ ka ndị ahụ wee nwee ike ịghọta ụkpụrụ ya nile ma tinye ha n’ọrụ. Mbipụta dị iche iche na nzukọ ndị Kraịst na-ejekwa ozi ‘ime ka a mata isi’ nke Okwu Chineke. Otú a ka ndị okenye a họpụtara ahọpụta na-emekwa, bụ́ ndị “nwere ike izi ihe.”—1 Timoti 3:1, 2; 2 Timoti 2:24.

Uru Ndị Na-adịte Anya

3. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime uru ndị a na-enweta site n’ọgụgụ Bible?

3 Mgbe ezinụlọ bụ́ ndị Kraịst na-agụkọ Bible ọnụ, o yiri ka ha ga-enweta uru ndị na-adịte anya. Ha na-abịa mara iwu Chineke ma mụta ihe bụ eziokwu banyere ozizi dị iche iche, okwu amụma, na isiokwu ndị ọzọ. Mgbe a gụsịworo otu akụkụ Bible, onye isi ezinụlọ ahụ pụrụ ịjụ, sị: Olee otú nke a kwesịrị isi metụta anyị? N’ụzọ dị aṅaa ka nke a si emetụta ozizi ndị ọzọ nke Bible? Olee otú anyị pụrụ isi jiri isi ihe ndị a mee ihe ná nkwusa nke ozi ọma ahụ? Ezinụlọ na-enweta nghọta ka ukwuu mgbe ha na-agụ Bible ma ọ bụrụ na ha na-eme nnyocha site n’iji Watch Tower Publications Index ma ọ bụ index ndị ọzọ na-eme ihe. A pụrụ irite uru site n’ịchọ ya ná mpịakọta abụọ nke Insight on the Scriptures.

4. Olee otú Joshua gaje isi tinye ntụziaka ahụ e dekọrọ na Joshua 1:8 n’ọrụ?

4 Ụkpụrụ ndị e si n’Akwụkwọ Nsọ weta pụrụ iduzi anyị ná ndụ. Ọzọkwa, ịgụ na ịmụ ‘ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ pụrụ ime ka anyị bụrụ ndị amamihe ịnata nzọpụta.’ (2 Timoti 3:15) Ọ bụrụ na anyị ekwe ka Okwu Chineke na-eduzi anyị, anyị ga-anọgide na-eje ije n’eziokwu ya, anyị ga-enwetakwa ọchịchọ ezi omume anyị nile. (Abụ Ọma 26:3; 119:130) Otú ọ dị, ọ dị anyị mkpa ịchọ nghọta, dị ka onye nọchiri Mosis, bụ́ Joshua, chọrọ. “Akwụkwọ iwu a” agaghị apụ n’ọnụ ya, ọ ga-agụkwa n’ime ya ehihie na abalị. (Joshua 1:8) Ịghara ikwe ka “akwụkwọ iwu a” pụọ n’ọnụ ya pụtara na Joshua agaghị akwụsị ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị na-enye nghọta o kwuru. Ịgụ n’ime Iwu ahụ ehihie na abalị pụtara na Joshua gaje ịtụgharị uche n’ime ya, gaje ịmụ ya. Pọl onyeozi gbara Timoti ume n’otu aka ahụ ka ọ “na-ejisi ike”—tụgharịa uche—n’àgwà, ozi, na izi ihe ya. Dị ka onye Kraịst bụ́ okenye, ọ dị Timoti mkpa karịsịa ịkpachara anya ka ndụ ya bụrụ ihe ilereanya nakwa na ọ kụziri eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ.—1 Timoti 4:15.

5. Gịnị dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-achọta eziokwu nke Chineke?

5 Eziokwu Chineke bụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. Ịchọta ya chọrọ igwu ala, ịnọgide na-enyocha Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụ nanị site n’ịdị ka ụmụ akwụkwọ yiri ụmụaka nke Onye Nkụzi Ukwu ahụ ka anyị na-enweta amamihe ma bịa ghọta egwu nsọpụrụ nke Jehova. (Ilu 1:7; Aịsaịa 30:20, 21) N’ezie, anyị kwesịrị iji Akwụkwọ Nsọ nwapụta ihe dị iche n’onwe anyị. (1 Pita 2:1, 2) Ndị Juu bi na Beria “ka ndị bi na Tesalọnaịka mma n’obi, ebe ha weere obi dị ọkụ nile nara okwu ahụ nke ọma, na-enyocha ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị, ma ihe ndị a [Pọl kwuru] dị otú a.” A jara ndị Beria mma maka ime nke a kama ịbara ha mba.—Ọrụ 17:10, 11.

6. N’ihi gịnị ka Jisọs ji nwee ike igosi na ndị Juu ụfọdụ eriteghị uru site n’inyocha Akwụkwọ Nsọ?

6 Jisọs gwara ụfọdụ ndị Juu, sị: “Unu na-enyocha ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ, n’ihi na unu onwe unu na-eche na unu na-enwe ndụ ebighị ebi n’ime ha; ha onwe ha bụkwa ihe na-agbara m àmà; unu achọghịkwa ịbịakwute m, ka unu wee nwee ndụ.” (Jọn 5:39, 40) Ha ji ezi nzube nyochaa Akwụkwọ Nsọ—ka ihe ndị a nwee ike iduru ha gaa ná ndụ. N’ezie, Akwụkwọ Nsọ nwere amụma dị iche iche banyere Mesaịa bụ́ ndị zoro aka n’ebe Jisọs nọ dị ka ụzọ isi nweta ndụ. Ma ndị Juu jụrụ ya. N’ihi ya, inyocha Akwụkwọ Nsọ abaghịrị ha uru ọ bụla.

7. Gịnị dị mkpa iji too ná nghọta anyị nke Bible, n’ihi gịnịkwa?

7 Iji too ná nghọta anyị nke Bible, nduzi nke mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ Chineke, dị anyị mkpa. “Mmụọ Nsọ na-enyocha ihe nile, ọbụna ihe nile dị omimi nke Chineke” iji wepụta ihe ha pụtara. (1 Ndị Kọrint 2:10) Ndị Kraịst nọ na Tesalọnaịka gaje ‘ịnwa ihe nile’ dị n’amụma ọ bụla ha nụrụ. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:20, 21) Mgbe Pọl degaara ndị Tesalọnaịka akwụkwọ (ihe dị ka 50 O.A.), nanị akụkụ Akwụkwọ Nsọ Grik e deelara bụ Oziọma Matiu. Ya mere ndị Tesalọnaịka na ndị Beria pụrụ ịnwapụta ihe nile, ma eleghị anya site n’inyocha nsụgharị Septuagint Grik nke Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ọ dị ha mkpa ịgụ na ịmụ Akwụkwọ Nsọ, otú ahụ ka ọ dịkwa anyị.

Ọ Dị Mkpa Nye Mmadụ Nile

8. N’ihi gịnị ka ndị okenye a họpụtara ahọpụta kwesịrị iji kasị nwee ihe ọmụma Bible?

8 Ndị okenye a họpụtara ahọpụta kwesịrị ịkasị nwee ihe ọmụma Bible. Ha aghaghị ịbụ ndị “nwere ike izi ihe,” ha aghaghịkwa ‘ijide okwu ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi.’ Onye nlekọta bụ́ Timoti gaje ịdị “na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ.” (1 Timoti 3:2; Taịtọs 1:9; 2 Timoti 2:15) Nne ya, bụ́ Yunaịsị, na nne ya ochie bụ́ Lọis, akụziworo ya ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ site n’oge ọ dị na nwa ọhụrụ, na-akụbanye “okwukwe ihu abụọ na-adịghị ya” n’ime ya, ọ bụ ezie na nna ya bụ onye na-ekweghị ekwe. (2 Timoti 1:5; 3:15) Ndị nna kwere ekwe gaje ịzụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị,” ndị okenye bụ́ ndị nna karịsịakwa aghaghị inwe ‘ụmụ kwere ekwe, ndị na-abụghị ndị na-ekweghị ịdị n’okpuru iwu ma ọ bụ ndị na-ebi ndụ ịla n’iyi.’ (Ndị Efesọs 6:4; Taịtọs 1:6) Ya mere, n’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ anyị, anyị kwesịrị iji mkpa nke ịgụ, ịmụ, na itinye Okwu Chineke n’ọrụ kpọrọ ihe.

9. N’ihi gịnị ka a ga-eji soro ndị Kraịst ibe anyị mụọ Bible?

9 Anyị kwesịkwara isoro ndị kwere ekwe ibe anyị mụọ Bible. Pọl chọrọ ka ndị Kraịst nọ na Tesalọnaịka soro ibe ha tụlekọọ ndụmọdụ ya. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:18) Iji mụbakwuo nghọta anyị nke eziokwu, ọ dịghị ihe dị mma karịa isonyere ndị mmụta ndị ọzọ dị uchu n’inyocha Akwụkwọ Nsọ. Ilu ahụ bụ na: “Ígwè na-amụcha ígwè; otú a ka mmadụ na-amụcha ihu enyi ya” bụ eziokwu. (Ilu 27:17) Ngwá ọrụ e ji ígwè mee pụrụ ịta nchara ma ọ bụrụ na e jighị ya eme ihe ma na-amụcha ya. N’ụzọ yiri ya, ọ dị anyị mkpa ịdị na-ezukọtachi anya na ịmụcha ibe anyị site n’ikerịta ihe ọmụma anyị nwetaworo site n’ịgụ, ịmụ, na ịtụgharị uche n’Okwu Chineke nke eziokwu. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ọzọkwa, nke a bụ otu ụzọ isi jide n’aka na anyị na-erite uru site ná mgbukepụ nke ìhè ime mmụọ.—Abụ Ọma 97:11; Ilu 4:18.

10. Gịnị ka ọ pụtara bụ ijegharị n’eziokwu?

10 N’ọmụmụ anyị na-amụ Akwụkwọ Nsọ, anyị pụrụ ikpegara Chineke ekpere n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ka onye ọbụ abụ ahụ mere: “Zipụta ìhè Gị na eziokwu Gị; ka ha onwe ha na-edu m.” (Abụ Ọma 43:3) Ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta nnwapụta Chineke, anyị aghaghị ije ije n’eziokwu ya. (3 Jọn 3, 4) Nke a na-agụnye irube isi n’ihe nile ọ chọrọ na ijere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi na n’obi eziokwu. (Abụ Ọma 25:4, 5; Jọn 4:23, 24) Anyị aghaghị ijere Jehova ozi n’eziokwu, dị ka e kpughere n’Okwu ya ma mee ka o doo anya ná mbipụta dị iche iche nke “ohu ahụ kwesịri ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Nke a chọrọ ezi ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ. Mgbe ahụ, olee otú anyị kwesịrị isi gụọ ma mụọ Okwu Chineke? Ànyị kwesịrị ịmalite ịgụ ya site na Jenesis isi nke 1, amaokwu nke 1, ruo mgbe anyị gụchara akwụkwọ 66 ahụ? Ee, onye Kraịst ọ bụla nke nwere Bible zuru ezu n’asụsụ ya kwesịrị ịgụcha ya malite na Jenesis ruo ná Mkpughe. Nzube anyị n’ịgụ Bible na mbipụta ndị Kraịst kwesịrị ịbụ ịmụba nghọta anyị nke eziokwu buru ibu nke Akwụkwọ Nsọ nke Chineke nyeworo site n’aka ‘ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi.’

Gụpụta Okwu Chineke

11, 12. N’ihi gịnị ka o ji baa uru ịgụpụta Bible ná nzukọ?

11 Anyị pụrụ ịgụ ihe n’agụpụtaghị ya mgbe anyị nọ nanị anyị. Otú ọ dị, n’oge ochie, a na-agụpụta ọgụgụ ihe onwe onye. Ya mere, ka ọnozi Etiopia ahụ na-agba n’ịnyịnya ya, Filip onye na-ezisa ozi ọma nụrụ ka ọ na-agụ amụma Aịsaịa. (Ọrụ 8:27-30) Okwu Hibru a sụgharịrị “gụọ” pụtara n’ụzọ bụ isi “kpọọ.” Ya mere ndị na-enwebughị ike ịgụ ihe n’agụpụtaghị ya ma ghọta isi ihe dị n’ihe ọgụgụ ahụ ekwesịghị ịbụ ndị a kụdara aka ịkpọpụta okwu ọ bụla. Ihe kasị mkpa bụ ịmụta eziokwu ahụ site n’ịgụ Okwu Chineke e dere ede.

12 Ọ bara uru ịdị na-agụpụta Bible ná nzukọ ndị Kraịst. Pọl onyeozi gbara onye ọrụ ibe ya bụ́ Timoti ume, sị: “Na-aṅa ntị ọgụgụ akwụkwọ gị [“ịgụ ihe n’ihu ọha,” NW] na ịdụ ọdụ gị na ozizi gị.” (1 Timoti 4:13) Pọl gwara ndị Kọlọsi, sị: “Mgbe ọ bụla a ga-agụsị akwụkwọ ozi a n’etiti unu, meenụ ka a gụọkwa ya ná nzukọ Kraịst nke ndị Leọdisia; leziekwanụ anya ka unu onwe unu gụọkwa akwụkwọ ozi ahụ si na Leọdisịa bịa.” (Ndị Kọlọsi 4:16) Mkpughe 1:3 na-ekwukwa, sị: “Ngọzi na-adịrị onye na-agụ [“na-agụpụta,” NW], na ndị na-anụ okwu nile nke amụma nke a, ndị na-edebekwa ihe nile e deworo n’ime ya: n’ihi na oge ahụ dị nso.” Ya mere, onye na-ekwu okwu n’ihu ọha kwesịrị ịgụ amaokwu ndị sitere na Bible iji kwadoo ihe ọ na-agwa ọgbakọ.

Ụzọ Ịmụ Ihe n’Isiokwu n’Isiokwu

13. Olee ụzọ kasị aga n’ihu nke isi mụta eziokwu Bible, gịnịkwa pụrụ inyere anyị aka ịchọta akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche?

13 Ịmụ ihe n’isiokwu n’isiokwu bụ ụzọ kasị aga n’ihu nke isi mụọ eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ. Concordance ndị depụtara okwu Bible n’usoro mkpụrụ okwu ha dị ka ihe ha na-ekwu si dị n’usoro akwụkwọ, isiakwụkwọ, na amaokwu, na-eme ka ọ dị mfe ịchọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị metụtara otu isiokwu. A pụkwara ime ka akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị otú ahụ na ibe ha kwekọọ n’ihi na Onye Chepụtara Bible adịghị emegide onwe ya. Site na mmụọ nsọ, ọ kpaliri ihe dị ka 40 ndị ikom ide Bible n’ime oge dị narị afọ 16, ịmụkwa ya n’isiokwu n’isiokwu bụ ụzọ a nwapụtaworo isi mụta eziokwu ahụ.

14. N’ihi gịnị ka a ga-eji mụkọta Akwụkwọ Nsọ Hibru na nke Grik nke Ndị Kraịst?

14 Ekele anyị nwere maka eziokwu Bible kwesịrị ịkpali anyị ịgụ na ịmụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst tinyere Akwụkwọ Nsọ Hibru. Nke a ga-egosi otú e si jikọta Akwụkwọ Nsọ Grik na nzube Chineke, ọ ga-amụkwasịkwa ìhè n’amụma ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. (Ndị Rom 16:25-27; Ndị Efesọs 3:4-6; Ndị Kọlọsi 1:26) Nsụgharị New World Translation of the Holy Scriptures na-enye aka n’akụkụ a. Ọ bụ ndị ohu Chineke raara onwe ha nye, ndị ji ihe ọmụma mụbara amụba e nwere banyere ihe odide mbụ nke Bible tinyere ọnọdụ a nọ na ya dee ya na akpaala okwu ya wee mee ihe, kwadebere ya. Ihe ndị e ji amụ Bible ndị Jehova nyeworo site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” dịkwa oké mkpa.

15. Olee otú ị ga-esi egosi na o kwesịrị ekwesị ihota ihe site n’akụkụ dị iche iche n’ime Bible?

15 Ụfọdụ pụrụ ikwu, sị, ‘Mbipụta unu na-ehota ọtụtụ puku akụkụ Bible, ma gịnị mere unu na-eji ehota ha site n’akụkụ dị iche iche?’ Site n’ihota ihe site n’akụkụ dị iche iche n’ime akwụkwọ 66 nke Bible, mbipụta ndị ahụ na-esite n’ọnụ ọtụtụ ndị akaebe e nyere ike mmụọ nsọ anwapụta ịbụ eziokwu nke otu ozizi. Jisọs n’onwe ya jiri ụzọ izi ihe a mee ihe. Mgbe o ziri Ozizi Elu Ugwu ya, o mere nhota 21 site n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Okwu ahụ o kwuru nwere nhota atọ sitere n’Ọpụpụ, abụọ site na Levitikọs, otu site n’Ọnụ Ọgụgụ, isii site na Deuterọnọmi, otu site ná Ndị Eze nke Abụọ, anọ site n’Abụ Ọma, atọ site n’Aịsaịa, na otu site na Jeremaịa. Site n’ime nke a, Jisọs ọ̀ ‘na-anwa igosipuṭa nnọọ ihe ọ bụla’? Ee e, n’ihi na ‘O ziri ihe dị ka O nwere ike ọ bụghịkwa dị ka ndị odeakwụkwọ.’ Ọ dị otú ahụ n’ihi na Jisọs ji ikike nke Okwu Chineke e dere ede kwadoo ihe ọ na-ezi. (Matiu 7:29) Otú a ka Pọl onyeozi mere.

16. Nhota ndị dị aṅaa sitere n’Akwụkwọ Nsọ ka Pọl hotara ná Ndị Rom 15:7-13?

16 N’akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ dị ná Ndị Rom 15:7-13, Pọl hotara ihe site n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ Hibru atọ—Iwu ahụ, Ndị Amụma, na Abụ Ọma. O gosiri na ndị Juu na ndị Jentaịl ga-eto Chineke, ya mere ndị Kraịst kwesịkwara ịnabata ndị nke mba nile. Pọl kwuru, sị: “Na-akpọbatanụ ibe unu, dị ka Kraịst anyị kpọbatakwara unu, ka e wee nye Chineke otuto. N’ihi na asị m na e mewo Kraịst ka Ọ bụrụ onye na-ejere obibi úgwù ozi n’ihi eziokwu Chineke, ka O wee mee ka nkwa nile e kwere nna anyị hà guzosie ike, ka ndị mba ọzọ wee nyekwa Chineke otuto n’ihi ebere Ya; dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ [n’Abụ Ọma 18:49], sị, N’ihi nke a ka M ga-ekwupụta Gị n’etiti mba nile, aha Gị ka m ga-abụkukwa abụ ọma. Ọzọkwa Ọ sị [na Deuterọnọmi 32:43], Unu mba ọzọ, soronụ ndị Ya nwee obi ụtọ. Ọzọkwa [n’Abụ Ọma 117:1], Toonụ Onyenwe anyị, unu mba nile; ka ndị nile dị iche iche na-ajakwa Ya. Ọzọkwa, Aịsaịa [11:1, 10] sị, Mkpọrọgwụ ahụ nke Jesi ga-adị, na Onye ahụ Nke na-ebili ịbụ onye isi mba nile; Onye ahụ ka ndị mba ọzọ ga-ele anya Ya. Ma Chineke nke olileanya ahụ mejuo unu n’ọṅụ nile na udo nile n’ikwe ekwe, ka unu wee nwebiga olileanya ahụ ókè, n’ike Mmụọ Nsọ.” Site n’ụzọ a nke isite n’otu isiokwu gaa n’ọzọ, Pọl gosiri ụzọ isi hota akwụkwọ nsọ iji kwadoo eziokwu Bible.

17. N’ikwekọ n’ihe ilereanya dị aṅaa ka ndị Kraịst ji ehota ihe site n’akụkụ dị iche iche n’ime Bible dum?

17 Akwụkwọ ozi mbụ nke Pita onyeozi dere site n’ike mmụọ nsọ nwere nhota 34 site n’akwụkwọ iri ndị dị n’Iwu ahụ, Ndị Amụma, na Abụ Ọma. N’akwụkwọ ozi ya nke abụọ, Pita hotara ihe ugboro isii site n’akwụkwọ atọ. Oziọma Matiu nwere 122 nhota site na Jenesis ruo Malakaị. N’ime akwụkwọ 27 nke Akwụkwọ Nsọ Grik, e nwere 320 nhota e dere otu e si kwuo ya site na Jenesis ruo Malakaị tinyere ọtụtụ narị izo aka ndị ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. N’ikwekọ n’ihe nlereanya Jisọs setịpụrụ, nke ndị ozi ya gbasokwara, mgbe ndị Kraịst nke oge a na-enwe ọmụmụ ihe isiokwu n’isiokwu n’otu isiokwu sitere n’Akwụkwọ Nsọ, ha na-ehota ihe site n’akụkụ dị iche iche na Bible dum. Nke a kwesịrị ekwesị karịsịa na “mgbe ikpeazụ” a, mgbe a na-emezu ihe ka ukwuu n’Akwụkwọ Nsọ Hibru na Grik. (2 Timoti 3:1) ‘Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi’ na-eji Bible eme ihe n’ụzọ dị otú ahụ ná mbipụta ya nile, ma ọ dịghị mgbe ọ na-etinye ma ọ bụ na-ewepụ ihe n’Okwu Chineke.—Ilu 30:5, 6; Mkpughe 22:18, 19.

Na-eje Ije Mgbe Nile n’Ime Eziokwu Ahụ

18. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji ‘jegharịa n’eziokwu ahụ’?

18 Anyị agaghị ewepụ ihe ọ bụla na Bible, n’ihi na ozuzu nke ozizi nile nke ndị Kraịst ndị dị n’ime Okwu Chineke bụ “eziokwu” ma ọ bụ “eziokwu nke ozi ọma.” Ịrapagidesi ike n’eziokwu a—ịdị “na-ejegharị” n’ime ya—dị oké mkpa maka nzọpụta. (Ndị Galetia 2:5; 2 Jọn 4; 1 Timoti 2:3, 4) Ebe ọ bụ na Iso Ụzọ Kraịst bụ “ụzọ nke eziokwu,” anyị na-aghọ “ndị na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ime eziokwu ahụ” site n’inyere ndị ọzọ aka n’ịmụba ọdịmma ya nile.—2 Pita 2:2; 3 Jọn 8.

19. Olee otú anyị pụrụ isi nọgide “na-ejegharị n’eziokwu ahụ”?

19 Ọ bụrụ na anyị ga-anọgide “na-ejegharị n’eziokwu ahụ,” anyị aghaghị ịgụ Bible ma nara enyemaka ime mmụọ Chineke na-enye site n’aka ‘ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi.’ (3 Jọn 4) Ka anyị mee nke a maka abamuru nke onwe anyị iji nwee ike izi ndị ọzọ banyere Jehova Chineke, Jisọs Kraịst, na nzube Chineke. Ka anyị nweekwa ekele na mmụọ Jehova na-enyere anyị aka ịghọta Okwu ya ma nwee ihe ịga nke ọma n’ijere ya ozi n’eziokwu.

Gịnị Bụ Azịza Gị?

◻ Gịnị bụ uru ụfọdụ na-adịte anya nke ọgụgụ Bible?

◻ N’ihi gịnị ka anyị ga-eji soro ndị kwere ikwe ibe anyị mụọ Bible?

◻ N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ihota ihe site n’akụkụ dị iche iche n’ime Bible nile?

◻ Gịnị ka ọ pụtara bụ ‘ijegharị n’eziokwu ahụ,’ oleekwa otú anyị pụrụ isi mee otú ahụ?

[Foto dị na peeji nke 17]

Ndị mụrụ ụmụ, kụzierenụ ụmụ unu Akwụkwọ Nsọ

[Foto dị na peeji nke 18]

N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs hotara ihe site n’akụkụ dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ Hibru

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya