Mkpụrụ Nke Agwọ Ahụ—olee Ụzọ E Si Kpughee Ya?
“Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya.”—JENESIS 3:15.
1. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji bụrụ Chineke obi ụtọ? (b) Gịnị ka o meworo iji mee ka o kwe anyị omume ikere òkè n’ọṅụ ya?
JEHOVA bụ Chineke obi ụtọ, nke kwesịkwara ekwesị. Ọ bụ onye kasị ukwuu na onye mbụ na-enye ihe ndị dị mma, ọ dịghịkwa ihe pụrụ igbochi mmezu nke nzube ya. (Aịsaịa 55:10, 11; 1 Timoti 1:11, NW; Jemes 1:17) Ọ na-achọ ka ndị ohu ya kere òkè n’ọṅụ ya, ọ na-enyekwa ezi ihe mere ha ga-eji eme nke ahụ. N’ihi ya, n’oge gbakarịsịrị ọchịchịrị n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ—nnupụisi n’Iden—o nyere ihe ndabere maka anyị iji olileanya lepụ anya n’ọdịnihu.—Ndị Rom 8:19-21.
2. Mgbe ọ na-ama ndị nnupụisi ahụ ikpe n’Iden, olee otú Jehova si nye ihe ndabere maka olileanya maka ụmụ Adam na Iv?
2 Otu n’ime ụmụ mmụọ nke Jehova, site n’iguzogide na ikwutọ Chineke, ka mere onwe ya Setan bụ́ Ekwensu. Ụmụ mmadụ mbụ, Iv na e mesịa Adam, adabawo n’okpuru mmetụta ya ma mebie iwu Jehova nyere n’ụzọ doro anya. A mara ha ikpe ọnwụ n’ụzọ ziri ezi. (Jenesis 3:1-24) Ma, mgbe ọ na-ama ndị nnupụisi a ikpe, Jehova nyere ihe ndabere maka olileanya nye ụmụ Adam na Iv. N’ụzọ dị aṅaa? Dị ka e dekọrọ na Jenesis 3:15, Jehova sịrị: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” Amụma ahụ bụ isi ihe ga-eme ka a ghọta Bible dum nakwa ihe omume ndị gara aga na ndị na-eme ugbu a bụ́ ndị metụtara ma ụwa ma ndị ohu Jehova.
Ihe Amụma ahụ Pụtara
3. Dị ka e zoro aka na Jenesis 3:15, kọwaa (a) Agwọ ahụ, (b) “nwanyị ahụ,” (ch) “mkpụrụ” nke Agwọ ahụ, (d) “mkpụrụ” nke nwanyị ahụ.
3 Iji ghọtazuo ihe ọ pụtara, tụlee akụkụ dị iche iche nke amụma ahụ n’onwe ya. Onye ahụ a gwara okwu na Jenesis 3:15 bụ Agwọ ahụ—ọ bụghị agwọ nkịtị ahụ kama onye ahụ ji ya mee ihe. (Mkpughe 12:9) “Nwanyị ahụ” abụghị Iv kama nzukọ eluigwe nke Jehova, nne nke ndị ohu ya e ji mmụọ nsọ tee mmanụ n’elu ala. (Ndị Galetia 4:26) “Mkpụrụ” Agwọ ahụ, bụ mkpụrụ nke Setan, ụmụ ya—ndị mmụọ ọjọọ na ụmụ mmadụ nakwa nzukọ dị iche iche nke mmadụ ndị na-egosipụta àgwà Setan, na-egosikwa iro n’ebe “mkpụrụ” nke nwanyị ahụ nọ. (Jọn 15:19; 17:15) “Mkpụrụ” nwanyị ahụ bụ n’ụzọ bụ isi Jisọs Kraịst, onye e ji mmụọ nsọ tee mmanụ na 29 O.A. Puku narị na iri anọ na anọ, bụ́ ndị ‘a mụrụ ọzọ site na mmiri na Mmụọ Nsọ,’ bụrụkwa ndị ha na Kraịst ga-eketakọ Alaeze eluigwe, bụ akụkụ nke abụọ nke mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa. A malitere ịgbakwụnye ndị a ná mkpụrụ nwanyị ahụ site na Pentikọst 33 O.A. gaa n’ihu.—Jọn 3:3, 5; Ndị Galetia 3:16, 29.
4. Olee otú Jenesis 3:15 si metụta ụwa ịghọ paradaịs, nke ndị mmadụ nweere onwe ha pụọ ná mmehie na ọnwụ jupụtara?
4 Onye ahụ aghụghọ ya dubara ihe a kpọrọ mmadụ n’ịtụfu Paradaịs jiri agwọ nkịtị ahụ nọ n’Iden mee ihe dị ka ọnụ na-ekwuchitere ya. Jenesis 3:15 tụrụ aka n’ọdịnihu n’oge mgbe a ga-egwepịa onye ahụ jiri agwọ ahụ mee ihe. Mgbe ahụ a ga-emeghekwa ụzọ ọzọ maka ndị ohu Chineke bụ́ mmadụ ibiri na Paradaịs, nke mmehie na ọnwụ na-adịghị. Lee aha oge ọṅụ nke ahụ ga-abụ!—Mkpughe 20:1-3; 21:1-5.
5. Àgwà ndị dị aṅaa bụ njimara nke ụmụ Ekwensu?
5 Mgbe nnupụisi ahụ n’Iden gasịrị, ndị mmadụ na nzukọ malitere ịpụta bụ́ ndị na-egosi àgwà ndị dị ka nke Setan bụ́ Ekwensu—nnupụisi, ịgha ụgha, nkwutọ, na igbu ọchụ, tinyere mmegide nye uche Jehova na nye ndị na-efe Jehova ofufe. Àgwà ndị ahụ na-egosipụta ụmụ, ụmụ ime mmụọ, nke Ekwensu. N’etiti ndị a e nwere Ken, onye gburu Ebel mgbe Jehova nabatara ofufe Ebel kama nke Ken. (1 Jọn 3:10-12) Nimrọd bụ otu onye nke aha ya n’onwe ya gosipụtara dị ka onye nnupụisi na onye ghọrọ dike n’ịchụ nta na onye ọchịchị n’imegide Jehova. (Jenesis 10:9) Tụkwasịkwa e nwere otu usoro nke alaeze na-esochi ibe ya ndị oge ochie, gụnyere Babilọn, ha na okpukpe ha ndị gọọmenti kwadoro bụ́ ndị e wukwasịrị n’ụgha, ndị a kpagbukwara ndị na-efe Jehova n’ụzọ dị ilu.—Jeremaịa 50:29.
‘Iro n’Etiti Gị na Nwanyị Ahụ’
6. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Setan si gosi iro megide nwanyị nke Jehova?
6 N’oge a nile, e nwere iro n’etiti Agwọ ahụ na nwanyị Jehova, n’etiti Setan bụ́ Ekwensu na nzukọ Jehova dị n’eluigwe nke ihe ndị e kere eke bụ́ mmụọ na-anọgidesi ike n’ihe. E gosipụtara obubuiro Setan mgbe ọ tara Jehova ụta wee nwaa ịkpasasị nzukọ Jehova dị n’eluigwe, na-ara ndị mmụọ ozi ụra ịhapụ ọnọdụ ebe obibi nke aka ha. (Ilu 27:11; Jud 6) Ọ pụtara ìhè mgbe Setan jiri ndị mmụọ ọjọọ ya nwaa igbochi ndị mmụọ ozi Jehova zipụrụ. (Daniel 10:13, 14, 20, 21) Ọ pụtara ìhè n’ụzọ pụrụ iche na narị afọ nke 20 nke a mgbe Setan chọrọ ụzọ ibibi Alaeze Mesaịa ahụ n’oge ọmụmụ ya.—Mkpughe 12:1-4.
7. N’ihi gịnị ka ndị mmụọ ozi Jehova na-anọgidesi ike n’ihe ji nwee iro megide Agwọ ihe atụ ahụ, ma njighachi azụ dị aṅaa ka ha gosiworo?
7 E nwekwara iro n’akụkụ nke nwanyị Jehova, òtù nke ndị mmụọ ozi na-anọgidesi ike n’ihe, n’ebe Agwọ ihe atụ ahụ nọ. Setan ekwutọwo aha ọma Chineke; ọ mawokwa ikwesị ntụkwasị obi nke ihe ọ bụla Chineke kere nke nwere ọgụgụ isi, gụnyere ndị mmụọ ozi nile aka, ọ na-agbalịsikwa ike ịkwada nnọgidesi ike n’ihe ha nye Chineke. (Mkpughe 12:4a) Ndị mmụọ ozi na-anọgidesi ike n’ihe, ndị cherub, na ndị seraph apụghị ime ihe ọzọ karịa ịkpọ onye ahụ nke mere onwe ya Ekwensu na Setan asị. Ma, ha echerewo Jehova ka o dozie okwu n’oge na n’ụzọ nke aka ya.—Tụlee Jud 9.
Ịkpọasị Megide Mkpụrụ nke Nwanyị Chineke
8. Ònye ka Setan na-elepụ anya maka ya?
8 Ka ọ dị na mgbe ahụ, Setan nọ na-elepụ anya maka Mkpụrụ nke nwanyị ahụ e buru n’amụma, onye Jehova sịrị na ọ ga-echifịa Agwọ ahụ n’isi. Mgbe mmụọ ozi sitere n’eluigwe kpọsara na Jisọs, onye a mụworo na Betlehem, bụ “Onye nzọpụta, Nke bụ Kraịst Onyenwe anyị,” nke a bụ ihe àmà siri ike na ọ ga-aghọ Mkpụrụ nke nwanyị ahụ e buru n’amụma.—Luk 2:10, 11.
9. Mgbe a mụsịrị Jisọs, olee otú Setan si gosipụta ajọ obubuiro?
9 E gosiri ajọ obubuiro nke Setan n’oge na-adịghị anya mgbe ọ rara ndị na-ekpere arụsị na-agụ kpakpando ụra ije ozi nke bu ụzọ duje ha na nke Eze Herọd na Jerusalem ma mgbe e mesịrị gaa n’ụlọ dị na Betlehem ebe ha hụrụ nwata ahụ bụ́ Jisọs na nne ya, bụ́ Meri. Nwa oge mgbe nke a gasịrị, Eze Herọd nyere iwu ka e gbuo ụmụaka ndị ikom nile site n’afọ abụọ laa azụ, n’ime na gburugburu Betlehem. Na nke a, Herọd gosiri ịkpọasị Setan maka Mkpụrụ ahụ. Ihe àmà gosiri na Herọd maara nke ọma na ọ na-anwa iwepụ ndụ onye ga-abụ Mesaịa ahụ. (Matiu 2:1-6, 16) Akụkọ ihe mere eme na-agba àmà na Eze Herọd bụ onye arụrụala, onye aghụghọ, na ogbu mmadụ—n’ezie otu n’ime mkpụrụ nke Agwọ ahụ.
10. (a) N’isochi baptism Jisọs, olee otú Setan n’onwe ya si gbalịa igbochi nzube Jehova banyere Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa? (b) Olee otú Setan si jiri ndị ndú okpukpe Juu mee ihe n’imezu nzube ya?
10 Mgbe e jisịrị mmụọ nsọ tee Jisọs mmanụ na 29 O.A., Jehova ekwuokwa okwu site n’eluigwe na-ekwupụta Jisọs dị ka Ọkpara ya, Setan nwara ọtụtụ ugbo ime ka Jisọs daba n’ọnwụnwa, si otú a na-achọ igbochi nzube Jehova banyere Ọkpara ya. (Matiu 4:1-10) N’ịda na nke ahụ, ọ gara n’ihu ijikwu ndị mmadụ eme ihe iji mezuo nzube ya nile. N’etiti ndị o ji nwaa ịkatọ Jisọs bụ ndị ndú okpukpe ihu abụọ. Ha jiri ụgha na nkwutọ mee ihe, ụdị atụmatụ Setan n’onwe ya jikwa mee ihe. Mgbe Jisọs gwara otu onye akụkụ ahụ ya nwụrụ anwụ, “Nwee obi ike; a na-agbaghara gị mmehie gị nile,” ndị odeakwụkwọ, n’echeghị ka ha hụ ma a gwọrọ nwoke ahụ n’ezie, kpebiri na Jisọs bụ onye nkwulu. (Matiu 9:2-7) Mgbe Jisọs gwọrọ ndị mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike, ndị Farisii katọrọ ya dị ka onye na-emebi iwu Ụbọchị Izu Ike wee chọọ igbu ya. (Matiu 12:9-14; Jọn 5:1-18) Mgbe Jisọs chụpụrụ ndị mmụọ ọjọọ, ndị Farisii boro ya ebubo na o so “Beelzebul onye isi ndị mmụọ ọjọọ,” arụkọ ọrụ. (Matiu 12:22-24) Mgbe e mesịrị ka Lazarọs si n’ọnwụ bilie, ọtụtụ ndị tinyere okwukwe na Jisọs, ma ndị isi nchụàjà na ndị Farisii ọzọkwa chọrọ ụzọ igbu ya.—Jọn 11:47-53.
11. Ụbọchị atọ tupu ọnwụ Jisọs, ole ndị ka ọ kọwara dị ka akụkụ nke mkpụrụ nke Agwọ ahụ, n’ihi gịnịkwa?
11 N’ịmata nke ọma ihe ha na-ezube, na Nisan 11, 33 O.A., Jisọs, ọ bụ ezie na ọ maara nke ọma ihe ha na-ezube, banyere kpọmkwem n’atụghị egwu n’ime ogige ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem wee nọrọ n’ebe ahụ kwupụta okwu ikpe megide ha n’ihu ọha. Dị ka otu ìgwè, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii anọgidewo na-egosipụta ụdị mmadụ ha bụ; ya mere Jisọs sịrị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ; n’ihi na unu na-emechi ụzọ alaeze eluigwe n’ihu mmadụ: n’ihi na unu onwe unu abataghị, unu adịghị ekwekwa ndị na-abata ka ha bata.” Jisọs kpọsara hoo haa na ha bụ akụkụ nke mkpụrụ nke Agwọ ahụ, na-asị: “Unu agwọ, unu ajụala, ùnu ga-esi aṅaa gbanarị ikpe nke [Gehena, NW]?” (Matiu 23:13, 33) Okwu ya na-egosipụta ihe e kwuworo n’amụma na Jenesis 3:15.
12, 13. (a) Olee otú ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ si nyekwuo ihe àmà maka onye nna ime mmụọ ha bụ? (b) Olee ndị sonyere ha? (ch) Ná mmezu nke Jenesis 3:15, olee otú e si chifịa Mkpụrụ nke nwanyị ahụ n’ikiri ụkwụ?
12 Mgbe ha nụrụ okwu Jisọs, ò gburu ha mgbu n’obi, nke na ha rịọrọ Chineke maka ebere? Hà chegharịrị site n’ajọ omume ha nile? Ee e! Mak 14:1 na-akọ na kpọmkwem n’ụbọchị na-esonụ, ná nzukọ e nwere n’obí nke onye isi nchụàjà, ‘ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ wee na-achọ ụzọ ha ga-esi jide Jisọs n’aghụghọ, gbuo ya.’ Ha nọgidere na-egosipụta mmụọ igbu ọchụ nke Setan, onye Jisọs kọwara na mbụ dị ka ogbu mmadụ. (Jọn 8:44) N’oge na-adịghị anya Judas Iskarịọt, onye Setan rabara n’ịbụ onye dapụrụ n’ezi ofufe, sonyeere ha. Judas gbakụtara Mkpụrụ nke nwanyị Chineke a na-apụghị ịta ụta azụ wee sonyere mkpụrụ nke Agwọ ahụ.
13 N’isi ụtụtụ nke Nisan 14, ndị òtù ụlọikpe okpukpe ndị Juu kpọọrọ Jisọs dị ka onye mkpọrọ gakwuru onye ọchịchị ndị Rom. N’ebe a ọ bụ ndị isi nchụàjà butere ụzọ n’iti mkpu ka a kpọgbuo ya. Mgbe Paịlet jụrụ, “M̀ [ga-akpọgbu, NW] Eze unu?” ọ bụ ndị isi nchụàjà zara, “Anyị enweghị eze ma ọ bụghị Siza.” (Jọn 19:6, 15) N’ezie, ha gosipụtara n’ụzọ nile na ha bụ akụkụ nke mkpụrụ nke Agwọ ahụ. Ma ọ bụghị nanị ha kwụ. Ihe ndekọ e ji ike mmụọ nsọ dee na Matiu 27:24, 25 na-akọ akụkọ nke a: “Paịlet . . . weere mmiri, kwọọ aka ya abụọ n’ihu ìgwè mmadụ ahụ.” Mgbe ahụ ndị mmadụ nile sịrị: “Ọbara Ya dị anyị n’isi, dịkwa n’isi ụmụ anyị.” Otú a ọtụtụ ndị Juu nke ọgbọ ahụ gosipụtara onwe ha dị ka akụkụ nke mkpụrụ nke Agwọ ahụ. Tupu ọgwụgwụ nke ụbọchị ahụ, Jisọs anwụwo. Site n’iji mkpụrụ ya a na-ahụ anya mee ihe, Setan echifịawo Mkpụrụ nke nwanyị Chineke n’ikiri ụkwụ.
14. Gịnị mere na nchifịa nke Mkpụrụ nwanyị ahụ n’ikiri ụkwụ apụtaghị mmeri maka Setan?
14 Setan ò meriwo? Ọ dịghị ma ọlị! Jisọs Kraịst emeriwo ụwa, meriekwa onye ọchichị ya. (Jọn 14:30, 31; 16:33) O jigidewo iguzosi ike n’ihe ya nye Jehova ruo ọnwụ. Ọnwụ ya dị ka mmadụ zuru okè enyewo ọnụ ahịa mgbapụta a chọrọ iji zụtaghachi ikike ịdị ndụ Adam tụfuru. Ya mere o meghere ụzọ nke ndụ agwụghị agwụ maka ndị ga-egosi okwukwe ná ndokwa ahụ ma rubere iwu Chineke isi. (Matiu 20:28; Jọn 3:16) Jehova kpọlitere Jisọs n’ọnwụ gaa ná ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. N’oge Jehova kara aka, Jisọs ga-egwepịa Setan pụọ n’anya. Na Jenesis 22:16-18, e buru n’amụma na Jehova ga-emere ezinụlọ nile nke ụwa ndị mere ihe a chọrọ maka ịgọzi onwe ha site ná Mkpụrụ ahụ na-eguzosi ike n’ihe ihe ọma.
15. (a) Mgbe ọnwụ Jisọs gasịrị, olee otú ndị ozi ya si nọgide na-ekpughe mkpụrụ nke Agwọ ahụ? (b) Ịkpọasị dị aṅaa ka mkpụrụ nke Agwọ ahụ nọgideworo na-egosikwu kpọmkwem ruo n’ụbọchị anyị a?
15 Mgbe ọnwụ Jisọs gasịrị, ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ nọgidere na-ekpughe mkpụrụ nke Agwọ ahụ, dị ka Onyenwe ha meworo. N’ịbụ onye mmụọ nsọ kwaliri, Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị megide “onye ahụ na-emebi iwu” onye ọnụnọ ya ga-abụ “dị ka ịrụsi ọrụ ike nke Setan” si dị. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:3-10) “Onye” a nke ọtụtụ ndị mejupụtara egosiwo onwe ya ịbụ ndị ụkọchukwu nke Krisendọm. Mkpụrụ nke Agwọ ahụ, n’aka nke ọzọ, akpagbuwo ụmụazụ Jisọs Kraịst n’ụzọ obi ọjọọ. N’amụma e dekọrọ na Mkpughe 12:17, Jọn onyeozi buru amụma na Setan ga-anọgide na-ebu agha megide ihe fọrọ ná mkpụrụ nke nwanyị Chineke ahụ ruo kpọmkwem n’oge anyị. Nke ahụ bụ nnọọ ihe meworonụ. N’ọtụtụ ala, a machibidowo Ndịàmà Jehova iwu, tie ha ihe, tụọ ha mkpọrọ, ma ọ bụ tụba ha n’ime ogige ịta ahụhụ dị iche iche n’ihi nguzo ha siri ike maka Alaeze Chineke na ụzọ ezi omume ya nile.
Mkpughe nke Mkpụrụ nke Agwọ ahụ n’Oge A
16. N’oge ndị a, ole ndị ka e kpugheworo dị ka ndị bụ akụkụ nke mkpụrụ nke Agwọ ahụ, n’ụzọ dịkwa aṅaa?
16 N’iṅomi Jisọs Kraịst, ezi ndị Kraịst alabeghị azụ n’iji atụghị egwu na-ekpughe Agwọ ahụ na mkpụrụ ya. Na 1917 Ndị Mmụta Bible, dị ka a maara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, bipụtara akwụkwọ ahụ bụ́ The Finished Mystery, ebe ha kpughere ihu abụọ nke ndị ụkọchukwu Krisendọm. E ji nkwupụta okwu e bipụtara ebipụta a kpọrọ Ecclesiastics Indicted sochie nke a na 1924. E kesara nde 50 nke akwụkwọ a n’ụwa nile. Na 1937, J. F. Rutherford, onye bụ onye isi oche nke Watch Tower Society ná mgbe ahụ, kwupụtara mkpughe ndị dị ike nke mkpụrụ Setan n’okwu ihu ọha ndị a kpọrọ “E Kpughee” na “Okpukpe na Iso Ụzọ Kraịst.” N’afọ na-esonụ, ka ndị bịaranụ nọ ná mgbakọ 50 n’ala dị iche iche na-ege ntị, o kwuru okwu ihu ọha bụ́ “Nakwere nke Bụ Eziokwu” site n’ígwè telifon ụzarị redio site na London, England. Mgbe otu ọnwa gasịrị, usoro nzirịta ozi redio nke gbasapụrụ agbasapụ na United States buru okwu ahụ bụ́ “Ọchịchị Aka Ike Fascism Ka Ọ Bụ Nnwere Onwe.” A gbakwụnyere ndị a mkpughe ndị ọzọ dị ike n’akwụkwọ ndị dị ka Enemies na Religion nakwa n’akwụkwọ nta bụ́ Uncovered. N’ikwekọ n’ihe e bipụtaworo eri afọ ndị 1920, akwụkwọ ahụ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!,a nke e biri ugbu a na 65 asụsụ, na-akọwa ndị isi ndọrọ ndọrọ ọchịchị rụrụ arụ na ndị azụmahịa iwu na-akwadoghị dị anyaukwu, na-enweghị ụkpụrụ, dị ka ndị sokwa ná ndị òtù bụ isi nke mkpụrụ a na-ahụ anya nke Agwọ ahụ. Mgbe ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-eme ya àgwà ha iji ụgha na-eduhie ndị ha na-achị, na-egosi enweghị nsọpụrụ maka ịdị nsọ nke ọbara, na ịkpagbu ndị ohu Jehova (si otú a na-egosi ịkpọasị maka mkpụrụ nke nwanyị Chineke), ha na-egosipụta onwe ha kpọmkwem dị ka akụkụ nke mkpụrụ nke Agwọ ahụ. Nke ahụ bụkwa eziokwu banyere ndị azụmahịa iwu na-akwadoghị ndị, n’enweghị ihe mgbu nke akọ na uche ọ bụla, na-agha ụgha n’ihi uru ego na ndị na-emepụta ma ọ bụ na-ere ngwá ahịa ndị a maara na ha na-akpata ọrịa.
17. Ohere dị aṅaa ka ghere oghe nye ndị mmadụ a maara aha ha ndị pụrụ isi n’usoro ihe nke ụwa pụta?
17 Ọ bụghị onye ọ bụla nke okpukpe, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma ọ bụ azụmahịa ụwa tetọrọ ka a ga-agụ n’ikpeazụ dị ka akụkụ nke mkpụrụ Agwọ ahụ. Ụfọdụ n’etiti ndị ikom na ndị inyom ndị a na-enwe mmasị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ. Ha na-eji ikike ha enyere ha aka, na-anabatakwa ezi ofufe ka oge na-aga. (Tụlee Ọrụ 13:7, 12; 17:32-34.) Nye ndị nile dị otú ahụ, a kpọwo ha òkù a: “Ugbu a, ndị eze, nweenụ uche: ka a dọọ unu aka ná ntị, ndị ikpe nke ụwa. Werenụ egwu fee Jehova ofufe, werekwanụ ọma jijiji tegharịa egwú ọṅụ. Sutunụ onye a họpụtaworo ọnụ, ka ọ ghara iwe iwe, unu wee laa n’iyi n’ụzọ, n’ihi na iwe ya ga-ere ọkụ na mgbe nta. Ndị ihe na-agara nke ọma ka ha bụ, bụ́ ndị nile na-agbaba n’ime ya.” (Abụ Ọma 2:10-12) N’ezie, ọ dị ndị nile chọrọ ihu ọma Jehova mkpa ime ihe ugbu a, tupu Onyeikpe eluigwe ahụ emechie ụzọ nke ohere ahụ!
18. Ọ bụ ezie na ha abụghị akụkụ nke mkpụrụ nke nwanyị ahụ, otú o sina dị olee ndị na-efe Jehova ofufe?
18 Nanị ndị ga-emejupụta Alaeze eluigwe ahụ bụ akụkụ nke mkpụrụ nke nwanyị ahụ. Ndị a dị ole na ole n’ọnụ ọgụgụ. (Mkpughe 7:4, 9) Ma, e nwere oké ìgwè mmadụ ọzọ, ee, ọtụtụ nde n’ime ha, ndị dị ka ndị na-efe Jehova ofufe na-ele anya ndụ agwụghị agwụ na paradaịs elu ala. Ma n’okwu ma n’omume, ha na-agwa ndị Jehova e tere mmanụ: “Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.”—Zekaraịa 8:23.
19. (a) Nhọrọ dị aṅaa ka ndị mmadụ nile na-aghaghị ime? (b) Ole ndị karịsịa ka a na-akpọ òkù iji amamihe mee ihe ebe a ka nwere ohere?
19 Ugbu a bụ oge mgbe ihe nile a kpọrọ mmadụ na-aghaghị ime nhọrọ. Hà chọrọ ife Jehova ofufe ma kwadoo ọbụbụeze ya, ka hà gaje ikwe ka Setan bụrụ onye isi ha site n’ime ihe na-atọ ya ụtọ? Ihe dị ka nde mmadụ ise sitere ná mba nile ewerewo nguzo ha n’akụkụ Jehova n’isonyere ndị ahụ fọdụrụ ná mkpụrụ nwanyị ahụ, nke ndị nketa Alaeze. Nde asatọ ọzọ egosiwo mmasị n’isoro ha mụọ Bible ma ọ bụ n’ịbịa nzukọ ha dị iche iche. Ndịàmà Jehova na-asị ndị a nile: Ọnụ ụzọ nke ohere ka ghere oghe. Were nguzo gị n’enweghị obi abụọ n’akụkụ Jehova. Nakwere Kraịst Jisọs dị ka Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa. Jiri ọṅụ na-esonyere nzukọ Jehova a na-ahụ anya. Kere òkè ná ngọzi nile Ọ ga-ewepụta site n’ịchịisi nke Eze ahụ, Kraịst Jisọs.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Ònye bụ Agwọ ahụ e zoro aka na ya na Jenesis 3:15? Ònye bụkwa nwanyị ahụ?
◻ Àgwà ndị dị aṅaa bụ njimara nke mkpụrụ nke Agwọ ahụ?
◻ Olee otú Jisọs si kpughee mkpụrụ nke Agwọ ahụ?
◻ Ole ndị ka e kpugheworo dị ka akụkụ nke mkpụrụ nke Agwọ ahụ n’oge ndị a?
◻ Ihe omume dị aṅaa dị oké ngwa ka a chọrọ iji zere ịbụ ndị e weere dị ka akụkụ nke mkpụrụ nke Agwọ ahụ?
[Foto dị na peeji nke 10]
Jisọs kpughere ndị ndú okpukpe ihu abụọ dị ka akụkụ nke mkpụrụ nke Agwọ ahụ