Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Mgbe ụfọdụ anyị na-anụ ka ụmụnna na-ekwu ma ọ bụ na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa n’elu ala. Nke a ọ̀ bụ okwu ziri ezi?
N’ikwu ya kpọmkwem, ọ bụghị ụzọ Akwụkwọ Nsọ kwadoro isi na-ekwu ya. Alaeze Chineke dị n’eluigwe. Ya mere, Pọl onyeozi pụrụ ide, sị: “Onyenwe anyị ga-adọpụta m n’ajọ ọrụ nile ọ bụla, Ọ ga-azọpụtakwa m ka m bata n’alaeze Ya dị n’eluigwe: Onye otuto dịịrị ruo mgbe nile ebighị ebi. Amen.”—2 Timoti 4:18; Matiu 13:44; 1 Ndị Kọrint 15:50.
E guzobere Alaeze ahụ n’eluigwe na 1914, ọ dịghịkwa mgbe a ga-ebufe ya na Paradaịs elu ala e weghachiri eweghachi ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ. Jisọs Kraịst bụ Eze nke Alaeze ahụ. Dị ka Eze, Jisọs nwere ikike n’ebe ndị mmụọ ozi nọ. N’ihi ya, ebe kwesịrị ekwesị nke ịchịisi ya bụ n’aka nri nke Chineke n’eluigwe. Ndị Kraịst e tere mmanụ na-esonyere ya dị ka ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe.—Ndị Efesọs 1:19-21; Mkpughe 5:9, 10; 20:6.
Nke a ọ̀ pụtaziri na anyị ekwesịkwaghị ikwupụtara Chineke arịrịọ ndị a na-achọta n’akụkụ nke Ekpere Onyenwe Anyị ahụ bụ́ nke na-asị: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa”? (Matiu 6:10) N’ụzọ dị iche na nke ahụ, ekpere ahụ kwesịrị ekwesị, ka nweekwa ihe dị ukwuu ọ pụtara.
Alaeze Chineke ka ga-eme ihe n’ụzọ pụtara ìhè n’ebe ụwa a dị, nke a bụkwa ihe anyị bu n’uche mgbe anyị na-ekpe ekpere ma na-eji okwu ndị yiri ndị ahụ e kwuru n’Ekpere Onyenwe Anyị ahụ na-eme ihe. Dị ka ihe atụ, Daniel 2:44 buru amụma na Alaeze ahụ ‘ga-abịa’ bibie mba nile ma weghara ịchịisi nke ụwa a. Mkpughe 21:2 na-ekwu banyere Jerusalem Ọhụrụ isi n’eluigwe rịdata. Ihe mejupụtara Jerusalem Ọhụrụ bụ 144,000 ndị Kraịst e tere mmanụ ndị ga-abụ nwunye ọhụrụ nke Kraịst. Ha bụkwa ndị ha na Jisọs ga-eketakọ ihe n’Alaeze ahụ. Ya mere Mkpughe 21:2 na-akọwa ochiche ha ga-eche ihu n’ebe ụwa dị, na-arụpụtara agbụrụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi ngọzi ndị dị ukwuu.—Mkpughe 21:3, 4.
Ruo mgbe e mezuru amụma ndị a na ndị ọzọ dị ebube, ọ ga-anọgide bụrụ ihe kwesịrị ekwesị ikpegara Jehova Chineke ekpere n’ụzọ kwekọrọ n’okwu Jisọs, “Ka alaeze Gị bịa.” Ma anyị kwesịrị iburu n’uche na Alaeze ahụ agaghị abịa na mbara Ụwa n’ụzọ nkịtị. Ọchịchị Alaeze ahụ ga-adịgide n’eluigwe, ọ bụghị n’ụwa.
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 31]
Ụwa: Dabere na NASA photo