Ifego Elu na Nkù Dị Ka Ugo
MMETỤTA dị aṅaa ka mmadụ na-enwe mgbe ọ nọsịrị n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi ruo afọ ise? Ọ̀ bụ nkụda obi? Obi ilu? Ọchịchọ ịbọ ọ́bọ̀?
Ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ihe a na-adịghị ahụkebe, otu nwoke dị otú ahụ dere, sị: “E mere ka ndụ m dịwanye mma karịa ka m pụrụ inweworị olileanya ya.” Gịnị mere o ji nwee mmetụta dị otú ahụ? Ọ kọwara, sị: “Agbabara m n’okpuru nkù nke Onye Kasị Ihe Nile Elu, enwetakwara m mmezu nke okwu onye amụma bụ́ Aịsaịa, mgbe ọ sịrị: ‘Ndị na-ele anya Jehova ga-agbanwe ike ha; ha ga-efego elu na nkù dị ka ugo; . . . ha ga-eje ije, ghara ịda mbà.’”—Aịsaịa 40:31.
Nwoke a bụ́ onye Kraịst, onye mmeso kasị njọ a pụrụ iche n’echiche tiri ihe otiti, nwere mmụọ nke feliri elu n’ụzọ ihe atụ, mmụọ nke mmekpọ ọnụ nke ndị Nazi na-apụghị imeri. Dị ka Devid ọ gbabara na ndo nke “nkù” Chineke. (Abụ Ọma 57:1) Onye Kraịst a jiri ihe yiri ihe Aịsaịa onye amụma jiri mee ihe mee ihe, na-eji ume ime mmụọ ya na-atụnyere nke ugo na-efego elu elu n’igwe.
Ọ̀ dịtụla mgbe ị na-enwe mmetụta nke onye nsogbu na-anyịgbu? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na gị onwe gị kwa ga-achọ ịgbaba n’okpuru nkù nke Onye Kasị Ihe Nile Elu, ‘ifego elu na nkù dị ka ugo.’ Iji ghọta otú nke a pụrụ isi kwe omume, ọ ga-enye aka ịmara ihe ụfọdụ banyere ugo, bụ́ nke a na-ejikarị eme ihe n’ụzọ ihe atụ n’Akwụkwọ Nsọ.
N’okpuru Ọkọlọtọ nke Ugo
N’ime nnụnụ nile nke ndị oge ochie hụrụ, ikekwe ugo bụ nke a kasị nwee mmasị na ya n’ihi ike na ufe ya dị ebube. Ọtụtụ ndị agha nke oge ochie, tinyere ndị nke Babilọn, Peasia, na Rom, zọrọ njem agha n’okpuru ọkọlọtọ nke ugo. Ndị agha Saịrọs Onye Ukwu bụ otu n’ime ndị a. Bible buru amụma na eze Peasia a ga-adị ka nnụnụ na-eri anụ nke na-abịa site n’ọwụwa anyanwụ ịdọgbu Alaeze Ukwu Babilọn. (Aịsaịa 45:1; 46:11) Narị afọ abụọ e desịrị amụma a, ndị agha Saịrọs, ndị nwere ugo n’ọkọlọtọ agha ha, wakwasịrị obodo Babilọn dị ka ugo na-awakwasị anụ ọ na-adọgbu.
Na nso nso a karị, ndị dike dị ka Charlemagne na Napoleon na mba ndị dị ka United States na Germany ahọrọwokwa ugo dị ka ihe oyiyi ha. E nyere ndị Israel iwu ka ha ghara ife ihe oyiyi nke ugo ma ọ bụ ihe e kere eke ọ bụla ọzọ. (Ọpụpụ 20:4, 5) Ma, ndị dere Bible zoro aka na njimara nke ugo iji mee ka ozi ha doo anya. Otú a e ji ugo, bụ́ nnụnụ a kasị kpọọ aha n’Akwụkwọ Nsọ, nọchite anya ihe ndị dị ka amamihe, nchebe Chineke, na ịdị gara gara.
Anya Ugo
Ọhụhụ ụzọ dị nkọ nke ugo abụrụwo mgbe nile ihe e ji atụ ilu. Ọ bụ ezie na golden eagle anaghị agafekarị kilogram ise n’ịdị arọ, anya ya dị ukwuu karịa nke mmadụ n’ezie, ọhụhụ ụzọ ya kakwa nkọ nke ukwuu. Jehova n’onwe ya, mgbe ọ na-akọwara Job ikike ugo nwere ịchọta nri ya, kwuru, sị: “Anya ya abụọ na-esi n’ebe dị anya legide ya.” (Job 39:27, 29) Alice Parmelee, n’akwụkwọ ya bụ́ All the Birds of the Bible, na-akọ na “n’otu mgbe ugo nọrọ mile atọ [kilomita 5] hụ azụ nwụrụ anwụ na-ese n’elu ọdọ mmiri ma feda kpọmkwem n’ebe ọ dị. Ọ bụghị nanị na ugo ahụ nwere ike ịnọ ebe dị anya nke ukwuu hụ ihe dị ntakịrị karịa ka mmadụ pụrụ ime, ma nnụnụ ahụ si mile atọ o si na-efeda nọgide na-elekwasị azụ ahụ anya.”
N’ihi ọhụhụ ụzọ ya dị nkọ, ugo bụ ihe nnọchiteanya kwesịrị ekwesị nke amamihe, otu n’ime àgwà ndị bụ isi nke Jehova. (Tụlee Ezikiel 1:10; Mkpughe 4:7.) N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ? Amamihe na-agụnye ibu ụzọ hụ ihe ga-esite n’ihe ọ bụla anyị pụrụ ime pụta. (Ilu 22:3) Ugo, site n’ikike ya ịhụ ihe dị anya, pụrụ ịhụ ihe ize ndụ n’ebe dị anya ma kpachara anya, dị nnọọ ka nwoke ahụ nwere uche n’ilu Jisọs, onye buru ụzọ hụ na e nwere ike inwe oké ifufe wee wukwasị ụlọ ya n’elu oké nkume. (Matiu 7:24, 25) Ọ dị mma ịmara na n’asụsụ Spanish, ịkọwa mmadụ dị ka ugo pụtara na o nwere nghọta.
Ọ bụrụ na i mekata nwee ohere ịhụ ugo n’ebe dị nso, rịba ama ụzọ ọ na-esi eji anya ya eme ihe. Ọ naghị eleperetụ gị anya; kama nke ahụ, o yiri ka ọ na-enyocha ihe nile banyere ọdịdị gị. N’otu aka ahụ, onye maara ihe na-eji nlezianya enyocha ihe tupu ya emee mkpebi kama ịtụkwasị amamihe ebumpụta ụwa ma ọ bụ mmetụta ya obi. (Ilu 28:26) Ọ bụ ezie na ọhụhụ ụzọ dị nkọ nke ugo na-eme ya ihe nnọchiteanya dabara adaba nke àgwà Chineke bụ́ amamihe, ufe ya dị ebube bụkwa ihe ndị dere Bible jiri mee ihe n’ụzọ ihe atụ.
“Ụzọ Ugo n’Eluigwe”
“Ụzọ ugo n’eluigwe” na-adọrọ mmasị n’ihi ma ife ọsọ ya ma otú o si yie ka ọ na-efe nnọọ n’etinyeghị mgbalị ọ bụla, n’agbasoghị ụzọ a kara aka, n’ahapụghịkwa ihe ga-esosi ebe ọ nọ. (Ilu 30:19) E zoro aka n’ịdị gara gara nke ugo n’Abụ Ákwá 4:19, ebe a kọwara ndị agha Babilọn, sị: “Ndị na-achụ anyị dị gara gara karịa ugo nke eluigwe: n’elu ugwu nile ka ha chụrụ anyị n’ọkụ ọkụ.” Mgbe ugo na-efe gburugburu n’elu hụrụ anụ ọ ga-eri, ọ ga-apịaji nkù ya ma kpọdaa, bụ́ oge ọ pụrụ ife ọsọ ruru 130 kilomita n’otu hour, dị ka ụfọdụ akụkọ si kwuo ya. N’abụghị ihe ijuanya, Akwụkwọ Nsọ na-eji ugo eme ihe dị ka ihe ya na ife ọsọ pụtara otu ihe, karịsịa n’ihe metụtara ndị agha.—2 Samuel 1:23; Jeremaịa 4:13; 49:22.
N’aka nke ọzọ, Aịsaịa zoro aka n’ufe ugo a na-etinyeghị mgbalị ọ bụla na ya. “Ndị na-ele anya Jehova ga-agbanwe ike ha; ha ga-efego elu na nkù dị ka ugo; ha ga-agba ọsọ, ike agaghị agwụkwa ha; ha ga-eje ije, ghara ịda mbà.” (Aịsaịa 40:31) Gịnị bụ ihe na-akpata ufe nrugharị nke ugo? Ifego elu na-achọ ntakịrị mgbalị ebe ọ bụ na ugo na-eji ikuku ọkụ na-arị elu eme ihe. A dịghị ahụ ikuku ọkụ na-arị elu anya, ma ugo dị nkà n’ịchọta ha. Ozugbo ọ hụrụ ikuku ọkụ na-arị elu, ugo na-agbasa nkù ya na ọdụ ya ma na-agba ikuku ọkụ ahụ na-arị elu gburugburu, bụ́ nke na-eburu ugo ahụ na-ala elu elu. Mgbe o fegoro elu zuru ezu, ọ na-efega n’ikuku ọkụ ọzọ na-arị elu, bụ́ ebe a na-emeghachi usoro ahụ. N’ụzọ dị otú a ugo pụrụ ịdị na-erugharị n’elu ruo ọtụtụ hour na-emefu ume kasị ala.
N’Israel, karịsịa na Ndagwurugwu Rift nke sitere Eziọn-geba n’ụsọ mmiri nke Osimiri Uhie ruo na Dan n’ebe ugwu, a na-ahụkarị ugo. Ha na-abakarị ụba n’oge opupu ihe ubi na n’oge mgbụsị akwụkwọ mgbe ha na-esi otu ebe efega ebe ọzọ. N’ụfọdụ afọ a gụtawo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 100,000 ugo. Mgbe anwụ ụtụtụ mere ka ikuku dị ọkụ, a pụrụ ịhụ ọtụtụ narị nnụnụ na-eri anụ ka ha na-efefe ugwu ndị dị nso Ndagwurugwu Rift ahụ.
Ufe a na-etinyeghị mgbalị ọ bụla nke ugo bụ ihe atụ magburu onwe ya nke otú ume Jehova pụrụ isi bulie anyị elu n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ mmetụta uche ka anyị wee nwee ike ịga n’ihu n’ọrụ anyị. Dị nnọọ ka ugo na-apụghị ifeli oké elu n’ume nke onwe ya, anyị apụghị ịnagide ma ọ bụrụ na anyị adabere n’ikike onwe anyị. “Enwere m ike n’ihe nile n’ime Onye ahụ Nke na-eme m ka m dị ike,” ka Pọl onyeozi kọwara. (Ndị Filipaị 4:13) Dị ka ugo nke na-anọgide na-achọ ikuku dị ọkụ na-arị elu a na-adịghị ahụ anya, anyị na-anọgide ‘na-arịọ’ maka ike ọrụ a na-adịghị ahụ anya nke Jehova site n’ekpere anyị sitere n’obi.—Luk 11:9, 13.
Ugo ndị na-esi otu ebe efega ebe ọzọ na-ahụkarị ikuku dị ọkụ na-arị elu site n’ile nnụnụ ndị ọzọ na-eri anụ anya. Onye ọkà n’ihe okike bụ́ D. R. Mackintosh kọrọ na n’otu oge a hụrụ ka 250 ugo na udele na-efego elu n’otu ikuku ọkụ na-arị elu. Ndị Kraịst taa pụkwara n’otu aka ahụ ịmụta ịdabere n’ike Jehova site n’iṅomi ihe ilereanya ikwesị ntụkwasị obi nke ndị ohu Chineke ndị ọzọ.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 11:1.
Na Ndo nke Nkù Ugo
Otu n’ime oge kasị ize ndụ ná ndụ ugo bụ mgbe ọ na-amụ ufe. Ọtụtụ ugo na-anwụ ná mgbalị ime nke ahụ. Mba Israel a ka guzobere ọhụrụ nọkwa n’ihe ize ndụ mgbe ọ hapụrụ Ijipt. Ya mere okwu Jehova gwara ndị Israel kasị daba adaba: “Unu onwe unu ahụwo ihe M mere ndị Ijipt, ebukwara m unu n’elu nkù ugo, mee ka unu bịakwute m.” (Ọpụpụ 19:4) E nwere ọtụtụ akụkọ nke ugo iburu nwa nnụnụ n’azụ ya ruo nwa mgbe nta ka nwa ọhụrụ ahụ ghara ịkụjasị ná mgbalị mbụ ya ife ufe. G. R. Driver, n’okwu o kwuru n’akwụkwọ Palestine Exploration Quarterly banyere akụkọ ndị dị otú ahụ, sịrị: “Ya mere nkọwa [Bible] abụghị nanị ihe e chepụtara echepụta kama ọ dabeere n’ihe mere eme n’ezie.”
Ugo bụ nne na nna ihe ilereanya n’ụzọ ndị ọzọkwa. Ọ bụghị nanị na ha na-ewetara nwa nnụnụ ka nọ n’akwụ́ nri mgbe nile kamakwa nnụnụ nke bụ nne na-eji nlezianya tụrisie anụ ahụ nke nnụnụ nke oké na-eweta n’akwụ́ ahụ ka nwa ugo ahụ nwee ike ilo ya. Ebe a na-akpakarị akwụ ha n’ebe dị mkpọda ma ọ bụ n’osisi ndị toro ogologo, a na-ekpughe nwa nnụnụ ndị ahụ nye ọnọdụ ihu igwe dị iche iche. (Job 39:27, 28) Anyanwụ na-achasi ike, nke a na-enwekarị n’ala ndị dị na Bible, pụrụ ịkpata ọnwụ nke nwa nnụnụ ma ọ bụghị nlekọta nke ndị mụrụ ya. Ugo nke kataworo ahụ na-agbasa nkù ya, mgbe ụfọdụ ruo ọtụtụ hour n’otu mgbe, iji kpuchie nwa ọhụrụ ya dị nro.
N’ihi ya o kwesịrị nnọọ ekwesị na e ji nkù ugo mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ dị ka ihe nnọchiteanya nke nchebe Chineke. Deuterọnọmi 32:9-12 na-akọwa otú Jehova si chebe ndị Israel n’oge ha gara ije n’ọzara: “N’ihi na òkè Jehova bụ ndị Ya; Jekọb bụ akụkụ ihe nketa Ya. Ọ chọtara ya n’ala ọzara, na n’ihe tọgbọrọ nkịtị, bụ́ ala tọgbọrọ n’efu nke na-agbọ ụja. Ọ na-agba ya gburugburu, Ọ na-eme ka ọ ghọta ihe, Ọ na-echezi ya dị ka nwantanta anya Ya: dị ka ugo na-akpọte ụmụ dị n’akwụ ya, na-erugharị n’elu ụmụ ya, na-agbasa nkù ya, na-aghọrọ ha, na-ebu ha n’elu nkù ya: otú a Jehova, nanị Ya, na-edu ya.” Jehova ga-enye anyị otu ụdị nchebe ịhụnanya ahụ ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị ya obi.
Ụzọ Mgbapụ
Mgbe ụfọdụ mgbe anyị na-eche nsogbu ihu, anyị pụrụ ịchọta onwe anyị dị ka ndị ọ ga-adị mma isi n’ihe isi ike anyị nile fepụ. Nke ahụ bụ kpọmkwem mmetụta Devid nwere. (Tụlee Abụ Ọma 55:6, 7.) Ma ọ bụ ezie na Jehova ekwewo nkwa inyere anyị aka mgbe anyị na-eche ule na nhụjuanya dị iche iche ihu n’usoro ihe a, ọ dịghị enye ụzọ mgbapụ site ná nsogbu nile. Anyị nwere nkwa Bible: “Ọ dịghị ọnwụnwa ọ bụla nwaworo unu ma ọ bụghị nke mmadụ na-anagide: ma Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, Onye na-agaghị ekwe ka a nwaa unu karịa nke unu pụrụ ịnagide; kama n’oge ọnwụnwa ahụ Ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike ịnagide ya.”—1 Ndị Kọrint 10:13.
“Ụzọ mgbapụ” metụtara ịmụta ịtụkwasị Jehova obi. Nke a bụ ihe Max Liebster, bụ́ onye e hotara okwu ya ná mmalite nke isiokwu a, chọpụtara. N’afọ ndị ọ nọrọ n’ogige ịta ahụhụ, ọ bịara mara ma na-adabere na Jehova. Dị ka Max chọpụtara, Jehova na-enye anyị ume site n’Okwu ya, mmụọ ya, na nzukọ ya. Ọbụna n’ogige ndị ahụ, Ndịàmà chọtara ndị kwere ekwe ibe ha ma nye ha enyemaka ime mmụọ, soro ha kerịta echiche Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible e nwere. Dịkwa ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi lanarịrịnụ gbara akaebe ya mgbe mgbe, Jehova wusiri ha ike. “M nọgidere na-arịọ Jehova maka enyemaka,” ka Max na-akọwa, “mmụọ ya kwagidekwara m.”
N’agbanyeghị ule anyị na-eche ihu, anyị pụkwara n’otu aka ahụ ịdabere na mmụọ nsọ Chineke, ma ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-arịọ maka ya. (Matiu 7:7-11) N’ịbụ ndị “ọkịka nke ike” a nyere ume, anyị ga-efeli elu kama ịbụ ndị nsogbu anyị nyịgburu. Anyị ga-anọgide na-eje ije n’ụzọ Jehova, anyị agaghịkwa ada mbà. Anyị ga-efego elu na nkù dị ka ugo.—2 Ndị Kọrint 4:7; Aịsaịa 40:31.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]
Ọ dịghị eleperetụ gị anya
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 9]
Foto: Cortesía de GREFA
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 10]
Foto: Cortesía de Zoo de Madrid