Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 7/15 p. 3-4
  • “Zi Anyị Ikpe Ekpere”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Zi Anyị Ikpe Ekpere”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Oyiyi na “Ndị Senti Nchebe”
  • Mmalite nke Chaplet
  • Ànyị Kwesịrị Ikpegara Ndị Senti Ekpere?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ì Kwesịrị Ikpegara Vegin Meri Ekpere?
    Teta!—2005
  • Ọ̀ Dị Mma Ikpegara “Ndị Senti” Ekpere?
    Teta!—2011
  • Ekpere
    Teta!—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 7/15 p. 3-4

“Zi Anyị Ikpe Ekpere”

“ONYENWE anyị, zi anyị ikpe ekpere.” Ọ bụ otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst rịọrọ arịrịọ ahụ. (Luk 11:1) O doro anya na onye ahụ na-eso ụzọ a na-akpọghị aha ya bụ nwoke nwere ekele dị omimi maka ekpere. Ndị na-efe ezi ofufe taa ghọtakwara ịdị mkpa ya n’otu aka ahụ. E kwuwerị, ekpere bụ ụzọ isi mee ka Onye Kasị Elu n’eluigwe na ala gee anyị ntị! Cheekwa banyere ya! “Onye na-anụ ekpere” na-aṅa ntị n’onwe ya ná nchegbu na nchekasị nile anyị. (Abụ Ọma 65:2) Nke ka mkpa, site n’ekpere, anyị na-enye Chineke ekele na otuto.—Ndị Filipaị 4:6.

Ka o sina dị, okwu ahụ bụ́ “zi anyị ikpe ekpere” na-akpalite ajụjụ ụfọdụ siri ike. N’ụwa nile okpukpe dị iche iche na-eji ọtụtụ ụzọ nke isi bịakwute Chineke eme ihe. Ma ọ̀ dị ụzọ ziri ezi na nke na-ezighị ezi isi kpee ekpere? N’ịza ya, ka anyị buru ụzọ leba anya n’ụfọdụ omenala a ma ama nke okpukpe ndị metụtara ekpere. Anyị ga-elekwasị anya ná ndị a na-eji eme ihe na Latin America.

Ihe Oyiyi na “Ndị Senti Nchebe”

N’ozuzu ha, mba ndị Latin America ji okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu. Dị ka ihe atụ, na Mexico nile mmadụ pụrụ ịhụ omume zuru ọnụ nke ikpegara “ndị senti nchebe” ekpere. N’ezie, ọ bụ omenala nke obodo ndị dị na Mexico inwe “ndị senti nchebe” bụ́ ndị a na-emere ememe n’ụbọchị ụfọdụ. Ndị Katọlik bụ́ ndị Mexico na-ekpegakwara ọtụtụ ihe oyiyi dịgasị iche iche ekpere. Otú ọ dị, “senti” nke a ga-akpọku dabeere n’ụdị arịrịọ onye ahụ na-efe ofufe chọrọ ịrịọ. Ọ bụrụ na mmadụ na-achọ onye ọ ga-alụ, ọ pụrụ ịmụnyere “Senti” Anthony kandụl. Onye na-achọ ime njem ụgbọ ala pụrụ inyefe “Senti” Christopher onwe ya, bụ́ onye nchebe nke ndị njem, karịsịa ndị ji ụgbọ ala eme njem.

Otú ọ dị, olee ebe omenala ndị ahụ si malite? Akụkọ ihe mere eme na-egosi na mgbe ndị Spain bịarutere Mexico, ha hụrụ ọha mmadụ mikpuru onwe ha n’ofufe nke chi ndị ọgọ mmụọ. N’akwụkwọ ya bụ́ Los Aztecas, Hombre y Tribu (Ndị Aztec, Nwoke ahụ na Agbụrụ Ahụ), Victor Wolfgang von Hagen na-ekwu, sị: “E nwere chi onwe onye dị iche iche, ihe ọkụkụ ọ bụla nwere chi ya, ọrụ ọ bụla nwere chi ma ọ bụ chi nwanyị nke ya, ọbụna igbu onwe onye nwere otu. Yacatecuhtli bụ chi ndị o ji ego achụ ego. N’ụwa nke a nwere ọtụtụ chi, chi nile ahụ nwechara àgwà na ọrụ ndị a kapịrị ọnụ.”

Oyiyi chi ndị a yiri “ndị senti” nke ndị Katọlik dị oké ịrịba ama nke na mgbe ndị Spain nwere mmeri nwara ime ka ndị obodo ahụ “ghọọ ndị Kraịst,” nanị ihe ndị a mere bụ ichigharị nrubeisi ha site n’ebe arụsị ha nọ gaa n’ebe “ndị senti” chọọchị nọ. Otu ihe odide dị n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal kwetara na okpukpe Katọlik a na-ekpe n’akụkụ ụfọdụ nke Mexico gbanyere mkpọrọgwụ n’ịgọ mmụọ. O kwuru na n’otu ógbè, ihe ka n’ime 64 “ndị senti” nke ndị ahụ na-asọpụrụ kwekọrọ na “chi ndị Maya ụfọdụ kpọmkwem.”

Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia na-arụ ụka na “e nwere nkekọ ntụkwasị obi chiri anya nke e guzobeworo n’etiti senti na ndị nọ n’elu ala, . . . nkekọ nke, kama ịdị na-adọpụ uche n’iso Kraịst na Chineke nwee mmekọrịta, na-emeziwanye ma na-eme ka o mie emie.” Ma olee otú nkekọ nke o doro anya na ọ bụ akụkụ nke ịgọ mmụọ pụrụ isi mee ka mmekọrịta mmadụ na ezi Chineke ahụ mie emie? Ekpere ndị a na-ekpegara “ndị senti” dị otú ahụ hà pụrụ ịdị Chineke mma n’ezie?

Mmalite nke Chaplet

Omenala ọzọ a ma ama metụtara iji chaplet eme ihe. Akwụkwọ bụ́ Diccionario Enciclopédico Hispano-Americano (Akwụkwọ Nkà Ihe Ọmụma Ọkọwa Okwu nke Hispanic-America) na-akọwa chaplet dị ka “eriri nke nwere ihe dị ka mkpụrụ ákà iri ise ma ọ bụ otu narị na iri ise ndị e ji ndị gbara okpotokpo karị kebie iri iri ma jiri obe nke na-esote mkpụrụ ákà atọ jikọta isi eriri abụọ ahụ.”

N’ịkọwa otú e si eji chaplet eme ihe, otu akwụkwọ ndị Katọlik na-ekwu, sị: “Chaplet ahụ Dị Nsọ bụ otú ụdị nke ekpere a na-agụpụta agụpụta na nke e ji uche ekpe banyere Ihe Omimi Nile nke mgbapụta anyị. Ihe mejupụtara ya bụ nkebi iri iri ụzọ iri na ise. Ihe mejupụtara nkebi iri nke ọ bụla bụ ịgụghachi Ekpere Onyenwe Anyị, na Ekele Maria iri, na otu Gloria Patri. A na-atụgharị uche n’otu ihe omimi n’oge a na-agụ nkebi iri nke ọ bụla.” Ihe omimi ndị ahụ bụ ozizi, ma ọ bụ nkụzi, nke ndị Katọlik kwesịrị ịma, a bịa na nke a ọ na-ezo aka ná ndụ, ahụhụ, na ọnwụ Kraịst Jisọs.

Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “Ụdị mbụ nke iji chaplet kpee ekpere malitere n’Iso Ụzọ Kraịst n’oge Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, ma ọ ghọrọ nke gbasazuru ebe nile nanị n’afọ ndị 1400 na 1500.” Ọ̀ bụ nanị okpukpe Katọlik na-eji chaplet eme ihe? Ee e. Akwụkwọ bụ́ Diccionario Enciclopédico Hispano-Americano na-ekwu, sị: “A na-eji ákà ndị yiri ya eme ihe n’ofufe ndị Alakụba, ndị Lama na ndị Buddha.” N’ezie, akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of Religion and Religions na-ekwu, sị: “A tụwo aro na ndị òtù Mohammed si n’aka ndị Buddha nweta Chaplet, ndị Kraịst sitekwa n’aka ndị òtù Mohammed nweta n’oge Agha Ntute ndị ahụ.”

Ụfọdụ na-arụ ụka na chaplet bụ nanị ihe na-enye aka iji cheta ihe mgbe a chọrọ ịgụghachi ọtụtụ ekpere. Ma iji ya eme ihe ọ̀ dị Chineke mma?

Ọ dịghị mkpa anyị ịkọ nkọ ma ọ bụ ịrụ ụka banyere izi ezi ma ọ bụ ikwesị ekwesị nke omenala ndị dị otú ahụ. Jisọs nyere nzaghachi doro anya n’arịrịọ ahụ nke ịkụziri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere. Ihe o kwuru ga-enye ihe ọmụma na ikekwe tụọ ụfọdụ ndị na-agụ magazin a n’anya.

[Foto ndị dị na peeji nke 3]

Ndị Katọlik na-ejikarị ákà chaplet eme ihe. Olee ebe ha si malite?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya