Michael Faraday—Ọkà Mmụta Sayensị na Nwoke Okwukwe
“Nna Nke Ike Eletrik.” “Onye Kasịnụ N’ime Ndị Ọkà Mmụta Sayensị Na-eme Nnyocha Dịworo Ndụ.” Ndị A Bụ Ụzọ Abụọ E Ji Akọwa Michael Faraday, Onye A Mụrụ Na 1791 N’england, Bụ́ Onye Nchọpụta Ọ Chọpụtara Magnet Dị N’ike Eletrik Dugara Ná Mmepụta Nke Electric Motor Na Injin Na-enye Ike Eletrik.
FARADAY kụziri ihe nke ukwuu ná mmụta chemistry na physics n’Ụlọ Akwụkwọ Royal dị na London. Ihe ndị ọ kụziri iji mee ka sayensị kwe nghọta nyeere ndị na-eto eto aka ịghọta echiche ndị dị mgbagwoju anya. Ọ natara ihe nrite site n’ọtụtụ mahadum. Ma ọ jụrụ iwepụta onwe ya n’ihu ọha. Ọ bụ nwoke ji okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu, nke na-enwekarịsị obi ụtọ n’ịnọrọ onwe ya n’ụlọ ya nwere ọnụ ụlọ atọ, bụrụkwa onye ezinụlọ ya na ndị kwere ekwe ibe ya na-anọnyere. Faraday dịnyeere ihe ọ kọwara dị ka “ịrọ òtù ndị Kraịst dị nnọọ nta, nke a na-eledakwa anya, bụ́ ndị a maara . . . dị ka ndị Sandeman. Ndị olè ka ha bụ? Gịnị ka ha kwere na ya? Oleekwa otú nke a si metụta Faraday?
Ndị Sandeman
“Nne na nna ochie Faraday kpebiri njikọ mbụ dị n’etiti ezinụlọ Faraday na chọọchị ndị Sandeman,” ka Geoffrey Cantor, onye dere Michael Faraday: Sandemanian and Scientist na-ekwu. Ha sonyeere ndị na-eso ụzọ onye okwuchukwu na-ejegharị ejegharị nke na-ekwekọghị n’echiche ọha mmadụ bụ́ onye ndị òtù ya kwusara nkwenkwe nke ndị Sandeman.
Robert Sandeman (1718-1771) bụ nwa akwụkwọ mahadum n’Edinburgh, na-amụ mgbakọ na mwepụ, asụsụ Grik, na asụsụ ndị ọzọ mgbe o gere onye bụbu onye okwuchukwu Presbyterian bụ́ John Glass ntị otu ụbọchị ka ọ na-ekwu okwuchukwu. Ihe ọ nụrụ mere ka ọ hapụ mahadum, laghachi n’ebe obibi ya bụ́ Perth, ma soro Glass na ndị òtù ya.
N’afọ ndị 1720, John Glass amalitela inwe obi abụọ banyere ozizi ụfọdụ nke Church of Scotland. Ọmụmụ ọ mụrụ Okwu Chineke dujere ya n’ikwubi na mba Israel nke dị na Bible mere ihe atụ otu mba ime mmụọ nke ndị amaala ya sitere n’ọtụtụ mba. Ọ dịghị ebe ọ hụrụ ihe kwadoro chọọchị dị iche maka mba nke ọ bụla.
N’ịbụ onye ahụ na-erukwaghị ala na chọọchị ya dị na Tealing, n’èzí Dundee, Scotland, Glass hapụrụ Church of Scotland ma hazie nzukọ nke onwe ya. Ihe dị ka otu narị mmadụ sonyeere ya, sitekwa ná mmalite, ha hụrụ na ọ dị mkpa ijigide ịdị n’otu n’òtù ha. Ha kpebiri ịgbaso ntụziaka Kraịst, ndị e dekọrọ na Matiu isi nke 18, amaokwu nke 15 ruo 17, idozi nghọtahie ọ bụla nke ha pụrụ inwe. Ka oge na-aga ha nọ na-enwe nzukọ kwa izu bụ́ ebe ndị nwere otu okwukwe ahụ gbakọrọ maka ekpere na agbamume.
Mgbe ọnụ ọgụgụ mmadụ butụrụ ibu malitere ịbịachi nzukọ nke ìgwè dị iche iche anya, a chọrọ ndị ikom ji ihe akpọrọ ihe ilekọta ofufe ha. Ma ònye ruru eru? John Glass na ndị òtù ya lekwasịrị anya karịsịa n’ihe Pọl onyeozi dere n’okwu a. (1 Timoti 3:1-7; Taịtọs 1:5-9) Ha achọtaghị ebe ọ bụla e hotara agụmakwụkwọ mahadum ma ọ bụ ịdị mkpa nke ịghọta Hibru na Grik. Ya mere mgbe ha jisịrị ekpere tụgharịa uche n’ụkpụrụ nduzi dị n’Akwụkwọ Nsọ, ha họpụtara ndị ikom ruru eru ịbụ ndị okenye. Ndị nọsiri ike na Church of Scotland lere ya anya dị ka “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nkwulu” bụ́ ndị ikom na-agụghị akwụkwọ bụ́ “ndị e ji ihe e ji akpa ákwà, ndụdụ, ma ọ bụ ọgụ zụlite” ime dị ka a ga-asị na ha ghọtara Bible na ikwusa ozi ya. Na 1733, mgbe Glass na ndị kwere ekwe ibe ya wuru ụlọ nzukọ nke ha n’obodo Perth, ndị ụkọchukwu ógbè ahụ nwara ịrụgide ndị majie ịchụpụ ha n’obodo ahụ. Ha emelighị ya, òtù ahụ tokwara.
Robert Sandeman lụrụ ada Glass, n’afọ ndụ 26 kwa, ọ ghọrọ onye okenye n’ọgbakọ Perth nke ndị na-eso ụzọ Glass. Ọrụ ya dị ka onye okenye nyịgburu ya nke na o kpebiri itinye oge ya nile n’ọrụ ọzụzụ atụrụ. Ka oge na-aga, mgbe nwunye ya nwụsịrị, Robert “ji obi ụtọ kweta ijere Onyenwe anyị ozi ebe ọ bụla ọ pụrụ ịdabara ya,” ka otu akụkọ ndụ ya na-ekwu.
Okpukpe Ndị Sandeman Agbasaa
Sandeman ji ịnụ ọkụ n’obi gbasaa ozi ya site na Scotland gaa England, ebe ìgwè ọhụrụ nke ndị kwere ekwe ibe ya toro. N’oge ahụ, esemokwu jupụtara n’etiti ndị Calvin bụ́ ndị England. Ụfọdụ n’ime ha kwenyere na a kaala ha akara maka nzọpụta. Sandeman, n’aka nke ọzọ, dụnyeere ndị kwenyere na okwukwe bụ ihe dị mkpa a chọrọ úkwù. N’ịkwado echiche a, o bipụtara akwụkwọ nke e bipụtaghachiri ugboro anọ ma pụtakwa ná mbipụta abụọ nke America. Dị ka Geoffrey Cantor si kwuo, mbipụta nke mpịakọta a bụ “otu ihe omume kasị mkpa nke buliri ịrọ òtù [ndị Sandeman] elu gafee mmalite ya na parish Scotland.”
Na 1764, Sandeman, bụ́ onye ndị okenye ndị ọzọ bụ́ ndị na-eso ụzọ Glass sonyeere, mere njem gaa America, nleta nke kpasuru esemokwu na mmegide dị ukwuu. Ka o sina dị, ọ kpatara nguzobe nke otu ìgwè ndị Kraịst nwere otu uche ahụ na Danbury, Connecticut.a N’ebe ahụ, na 1771, Sandeman nwụrụ.
Nkwenkwe Okpukpe Faraday
Michael na-eto eto mịkọọrọ ozizi ndị Sandeman nke ndị mụrụ ya. Ọ mụtara na ndị Sandeman kewapụrụ onwe ha iche n’ebe ndị na-adịghị eme ihe Bible kụziri nọ. Dị ka ihe atụ, ha jụrụ ikere òkè n’ememe agbamakwụkwọ ndị Anglịkan, na-ahọrọ imedebe ememe agbamakwụkwọ ha n’ihe dị mkpa n’iwu.
Ido onwe ha n’okpuru gọọmenti, ma na-anọpụkarị iche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, bụ ihe e ji mara ndị Sandeman. Ọ bụ ezie na ha bụ ndị amaala a na-akwanyere ùgwù, ọ naara ha ahụ ịnakwere ọkwá obodo. Ma n’ọnọdụ ole na ole ebe ha naara ya, ha zeere ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ijigide nguzo a wetaara ha nkọcha. (Tụlee Jọn 17:14.) Ndị Sandeman kwenyere na Alaeze eluigwe nke Chineke bụ ndokwa zuru okè maka ọchịchị. Ha lere ndọrọ ndọrọ ọchịchị anya dị ka “egwuregwu na-abaghị uru, nke ruru unyi nke na-enweghị omume ọma,” ka Cantor na-ekwu.
Ọ bụ ezie na ha nọpụrụ iche n’ebe ndị ọzọ nọ, ha adịghị eme omume ndị Farisii. Ha kwupụtara, sị: “Anyị na-ewere ya dị ka ihe dị oké mkpa izere Mmụọ na Omume nke ndị Farisii oge ochie, n’imepụta Mmehie ma ọ bụ Ọrụ karịa ka Akwụkwọ Nsọ meworo; na iji Ọdịnala mmadụ ma ọ bụ Nzere akọ mee ka ụkpụrụ Chineke ghara ịdị irè.”
Ha nakweere omume Akwụkwọ Nsọ nke ịchụpụ onye òtù ha ọ bụla ghọrọ onye na-aṅụbiga mmanya ókè, onye na-apụnara mmadụ ihe, onye na-akwa iko, ma ọ bụ onye na-eme mmehie ndị ọzọ dị njọ. Ọ bụrụ na onye mmehie ahụ echegharịa n’ezie, ha na-agbalị iweghachi ya. Ma ọ bụghị otú ahụ, ha gbasoro iwu Akwụkwọ Nsọ bụ́ “wepụnụ ajọ onye ahụ.”—1 Ndị Kọrint 5:5, 11, 13.
Ndị Sandeman rubere isi n’iwu Bible nyere ịhapụ ọbara. (Ọrụ 15:29) John Glass arụwo ụka na ọ bụ iwu na ndị Chineke ga-erubere mgbochi a e gbochiri ọbara isi dị ka Chineke nyere ụmụ mmadụ mbụ iwu ịhapụ iri mkpụrụ osisi nke ịma ezi ihe na ihe ọjọọ. (Jenesis 2:16, 17) Nnupụisi n’iwu ahụ banyere ọbara pụtakwara ịjụ iji ọbara Kraịst eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ya bụ mkpuchi mmehie. Glass kwubiri, sị: “Mmachibido a a machibidoro iri ọbara dị mgbe nile, ọ ka bụkwa ihe dị mkpa karịsịa.”
Uche ndị Sandeman na-atụgharị n’Akwụkwọ Nsọ nyeere ha aka izere ọtụtụ njehie. Dị ka ihe atụ, n’ihe banyere ntụrụndụ, ha legara anya ná ntụziaka Kraịst dị ka ụkpụrụ nduzi. “Anyị agaghị anwa anwa ime Iwu n’ebe Kraịst na-emeghị nke ọ bụla,” ka ha kwuru, “ma ọ bụ wepụ nke ọ bụla o nyeworo anyị. Ya mere, ebe anyị na-apụghị ịchọta ebe a machibidoro Ntụrụndụ iwu, ma ọ bụ nke ọha ma ọ bụ nke onwe onye; anyị na-ewere Ntụrụndụ ọ bụla dị ka ihe iwu kwadoro, bụ́ nke na-ejikọghị Ọnọdụ ọ bụla bụ́ mmehie n’ezie.”
Ọ bụ ezie na ndị Sandeman si otú a nwee ọtụtụ echiche ndị dabeere n’ụzọ ziri ezi n’Akwụkwọ Nsọ, ha aghọtaghị ịdị mkpa nke ọrụ ahụ e ji amata ezi ndị Kraịst, ya bụ, na onye ọ bụla kwesịrị ikwusara ndị ọzọ ozi ọma Alaeze ahụ. (Matiu 24:14) Ma, onye ọ bụla pụrụ ịbịa nzukọ ha, n’ebe ahụkwa ha gbalịrị inye mmadụ nile na-ajụ ha ajụjụ ihe mere ha ji nwee olileanya ha.—1 Pita 3:15.
Olee otú usoro nkwenkwe a si metụta ọkà mmụta sayensị bụ́ Michael Faraday?
Faraday Onye Sandeman
Michael Faraday, n’ịbụ onye a sọpụụrụ maka nchọpụta ya ndị dị ịrịba ama, biri ndụ dị mfe. Mgbe ndị a ma ama nwụrụ, a tụọkwa anya ka ndị ọha mmadụ maara bịa olili ozu ha, a na-achọpụta na Faraday adịghị abịa, ebe akọ na uche ya na-adịghị ekwe ya gaa ma tinye aka n’ememe Church of England.
Dị ka ọkà mmụta sayensị Faraday rapagidesịrị ike n’ihe ọ pụrụ igosipụta na ọ bụ eziokwu. O si otú a zere mkpachi anya ya na ndị gụrụ akwụkwọ bụ́ ndị na-akpọsa nchepụta nke onwe ha ma na-adụnyere ibe ha úkwù n’okwu dị iche iche. Dị ka ọ gwara ndị na-ege ya ntị n’otu mgbe, ‘eziokwu gbara ọkpụrụkpụ adịghị emechu anyị ihu, ihe àmà ya na-abụ eziokwu mgbe nile.’ O gosipụtara sayensị dị ka ihe dabeere ‘n’eziokwu e ji nlezianya nyochaa.’ Ka ọ na-emechi otu okwu n’ihe banyere ike ndị bụ isi n’okike, Faraday gbara ndị na-ege ya ntị ume ịtụle “Onye ahụ meworo ha.” Mgbe ahụ o hotara ihe onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi kwuru, sị: “A na-ahụ nke ọma ihe Ya ndị a na-adịghị ahụ anya site n’okike nke ụwa, ebe a na-aghọta ha site n’ihe ndị e mere, ọbụna ike ebighị ebi na Ịbụ Chi Ya.”—Ndị Rom 1:20, King James Version.
Ihe setịpụrụ nnọọ Faraday iche n’ebe ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị ndị ọzọ nọ bụ ọchịchọ ya ịmụta ihe site n’Akwụkwọ Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ nakwa site n’akwụkwọ okike. “Site n’okpukpe ndị Sandeman ya ọ chọpụtara ụzọ ibi ndụ n’irubere iwu omume Chineke isi nakwa nkwa nke ndụ ebighị ebi.” ka Cantor na-ekwu. “Site na sayensị ya ọ ghọtara nke ọma iwu nkịtị nke Chineke họrọwooro iji duzie eluigwe na ala.” Faraday kwenyere na “sayensị apụghị imebi ikike okwucha ọ gwụ nke Bible, kama sayensị, ọ bụrụ na e mee ya n’ụzọ ndị Kraịst n’ezie, pụrụ ịmụkwasị ìhè n’akwụkwọ ọzọ nke Chineke.”
Faraday ji obi umeala jụ ọtụtụ nsọpụrụ nke ndị ọzọ chọrọ inye ya. Ọ nọgidere na-ekwupụta enweghị mmasị n’echichi knight. O nwere mmasị ịnọgide bụrụ ‘nanị Maazị Faraday.’ O tinyere oge dị ukwuu n’ọrụ ya dị ka onye okenye, gụnyere ịga njem mgbe mgbe site n’isi obodo gaa n’obodo Norfolk iji lekọta ntakịrị ìgwè nke ndị kwere ekwe nwere otu uche bụ́ ndị bi ebe ahụ.
Michael Faraday nwụrụ n’August 25, 1867, e likwara ya n’ebe a na-eli ozu dị na Highgate n’ebe ugwu nke London. Onye na-ede akụkọ ndụ mmadụ bụ́ John Thomas na-agwa anyị na Faraday “nyefere ọgbọ ndị dị n’ihu ìgwè ihe sayensị rụpụtara n’ezie karịa onye ọkà mmụta sayensị ihe ndị a na-ahụ anya ọ bụla, mmetụta dịkwa irè nke nchọpụta ya nile rụpụtara emetụtawo ọdịdị nke ndụ mmepeanya n’ụzọ dị omimi.” Nwunye Faraday, bụ́ Sarah, dere, sị: “M pụrụ nanị ịrụ aka n’Agba Ọhụrụ dị ka ihe ndu na ụkpụrụ nduzi ya; n’ihi na o weere ya dị ka Okwu Chineke . . . bụrụkwa nke jigidere ndị Kraịst n’oge a dị ka mgbe e dere ya”—akaebe pụtara ìhè a gbaara ọkà mmụta sayensị a ma ama onye biri ndụ dị ka okwukwe ya si dị.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ìgwè ndị Sandeman, ma ọ bụ ndị òtù Glass ikpeazụ fọdụrụ na United States kwụsịrị ịdị n’ihe dị ka ná mmalite nke narị afọ a.
[Igbe dị na peeji nke 29]
N’ịbụ onye e mere onye nkụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Royal nke Britain, Michael Faraday mere ka sayensị kwee nghọta n’ụzọ ọbụna ndị na-eto eto pụrụ ịghọta. Okwu ndụmọdụ ya nye ndị nkụzi ibe ya nwere aro ndị dị irè nke ndị Kraịst oge a na-akụzi ihe n’ihu ọha ga-eme nke ọma ịtụle.
◻ “E kwesịghị ikwu okwu ọkụ ọkụ na ọsọ ọsọ, wee mee ya ka ọ bụrụ ihe na-agaghị ekwe nghọta, kama nwayọọ nwayọọ na ntakịrị ntakịrị.”
◻ Ọkà okwu kwesịrị ịgbalị ịkpali mmasị nke ndị na-ege ya ntị “ná mmalite nke okwu nakwa site ná nkebi ndị a na-apụghị ịchọpụta, nke ndị na-ege ntị na-ahụtaghị, mee ka mmasị ahụ dịgide ma ọ bụrụhaala na isiokwu ya chọrọ ya.”
◻ “Onye nkụzi adịghị eru ùgwù nke omume ya ma ọlị mgbe o wedara onwe ya ala site n’ikwu okwu n’ụzọ a ga-akụrụ ya aka nakwa ịchọ ka a jaa ya mma.”
◻ N’ihe banyere iji ndepụta mee ihe: “M na-ahụtakarị onwe m mgbe nile ịbụ onye iwu ji . . . idepụta nhazi nke [isiokwu ahụ] n’akwụkwọ ma mejupụta akụkụ ya site n’icheta ha n’uche, ma ọ bụ site n’ijikọ ha ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ. . . . Ana m edepụta n’usoro isi[okwu] ndị gbara ọkpụrụkpụ na ndị dị nta, sitekwa na ndị a m na-ekwupụta ihe ndị dị n’isiokwu m.”
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 26]
Foto abụọ ahụ: Site n’ikike nke Royal Institution