Mmadụ Nile Ga-azarịrị Ajụjụ Nye Chineke
“Onye ọ bụla n’etiti anyị ga-aza ajụjụ banyere onwe ya nye Chineke.”—NDỊ ROM 14:12.
1. Ókè dịgasị aṅaa ka a kpaara nnwere onwe Adam na Iv?
JEHOVA CHINEKE kere nne na nna anyị mbụ, Adam na Iv, dị ka ndị nweere onwe ha ime nhọrọ. Ọ bụ ezie na ha dị ala karịa ndị mmụọ ozi, ha bụ ihe e kere eke nwere ọgụgụ isi ndị nwere ikike ime mkpebi ndị amamihe dị na ha. (Abụ Ọma 8:4, 5) Ma, nnwere onwe ahụ Chineke nyere abụghị ikike ikpebiri onwe onye ihe. Ha ga-aza Onye Okike ha ajụjụ, ịza ajụjụ a agbatịruwokwara ụmụ ha nile.
2. Mpịazi dị aṅaa ka Jehova ga-eme n’isi nso, n’ihi gịnịkwa?
2 Ugbu a anyị na-eru ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a nso, Jehova ga-eme mpịazi n’ụwa. (Tụlee Ndị Rom 9:28.) N’isi nso, ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke ga-aza Jehova Chineke ajụjụ n’ihi mbibi nke ihe ndị e nwere n’ụwa, mbibi nke ndụ mmadụ, na karịsịa mkpagbu nke ndị ohu ya.—Mkpughe 6:10; 11:18.
3. Ajụjụ dịgasị aṅaa ka anyị ga-atụle?
3 N’ịbụ ndị atụmanya a na-ebu isi na-eche ihu, ọ baara anyị uru ịtụgharị uche ná mmeso ezi omume Jehova mesoro ihe ndị o kere n’oge ndị gara aga. Olee otú Akwụkwọ Nsọ pụrụ isi nyere anyị aka, n’aka nke anyị, ịza ajụjụ a ga-anakwere nye Onye Okike anyị? Olee ihe atụ ndị pụrụ inye aka, oleekwa ndị anyị kwesịrị izere iṅomi?
Ndị Mmụọ Ozi Ga-aza Ajụjụ
4. Olee otú anyị si mara na ndị mmụọ ozi ga-aza Chineke ajụjụ maka omume ha?
4 Ndị mmụọ ozi Jehova e kere eke n’eluigwe ga-azakwa ya ajụjụ dị nnọọ ka anyị ga-aza. Tupu Iju Mmiri ụbọchị Noa, ụfọdụ ndị mmụọ ozi ji nnupụisi nwoghaa iji soro ụmụ nwanyị nwee mmekọahụ. Dị ka ndị nweere onwe ha ime nhọrọ, ndị mmụọ a e kere eke pụrụ ime mkpebi a, ma Chineke mere ka ha zaa ajụjụ. Mgbe ndị mmụọ ozi nnupụisi ahụ laghachiri n’ógbè ndị bụ́ mmụọ, Jehova ekweghị ka ha nwetaghachi ọnọdụ mbụ ha. Jud onye na-eso ụzọ na-agwa anyị na e “debewokwa ha n’agbụ ebighị ebi n’okpuru ọchịchịrị nye ikpe nke oké ụbọchị ahụ.”—Jud 6.
5. Olee ọdịda Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya daworo, oleekwa ụzọ a ga-esi mee mpịazi maka nnupụisi ha?
5 Ndị mmụọ ozi nnupụisi a, ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ, nwere Setan Ekwensu dị ka onye na-achị ha. (Matiu 12:24-26) Mmụọ ozi obi ọjọọ a nupụụrụ Onye Okike ya isi ma maa izi ezi nke ọbụbụeze Jehova aka. Setan dubara nne na nna anyị mbụ ná mmehie, nke a kpatakwara ọnwụ ha mesịrị nwụọ. (Jenesis 3:1-7, 17-19) Ọ bụ ezie na Jehova kwere ka Setan nwee ike ịbata ná nzukọ eluigwe ruo oge ụfọdụ mgbe nke ahụ gasịrị, akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe buru amụma na n’oge Chineke kara aka, a ga-achụda onye ọjọọ a na gburugburu ụwa. Ihe àmà na-egosi na nke a weere ọnọdụ nwa ntakịrị oge ka Jisọs Kraịst natasịrị ike Alaeze na 1914. E mesịa, Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya ga-aba ná mbibi ebighị ebi. Ebe e mesịworo dozie ihe iseokwu nke ọbụbụeze, a ga-eme mpịazi banyere nnupụisi nke ọma mgbe ahụ.—Job 1:6-12; 2:1-7; Mkpughe 12:7-9; 20:10.
Ọkpara Chineke Ga-aza Ajụjụ
6. Olee otú Jisọs si ele ịza ajụjụ nke ya onwe ya nye Nna ya anya?
6 Lee ihe nlereanya ọma Ọkpara Chineke, Jisọs Kraịst, setịpụworo! Dị ka nwoke zuru okè nke ya na Adam hà nhata, Jisọs nwere obi ụtọ ime uche Chineke. Ọ tọkwara ya ụtọ ịbụ onye zara ajụjụ maka ikwekọ n’iwu Jehova. Banyere ya, ọbụ abụ ahụ buru amụma kwesịrị ekwesị, sị: “Ime ihe dị Gị ụtọ atọwo m ụtọ, Chineke; iwu Gị dịkwa n’ime obi m.”—Abụ Ọma 40:8; Ndị Hibru 10:6-9.
7. Mgbe ọ na-ekpe ekpere n’uhuruchi ahụ ọ nwụrụ, n’ihi gịnị ka Jisọs pụrụ iji kwuo okwu ndị e dekọrọ na Jọn 17:4, 5?
7 N’agbanyeghị mmegide ịkpọasị Jisọs nwetara, o mere uche Chineke ma nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe ruo ọnwụ n’elu osisi ịta ahụhụ. O si otú ahụ kwụọ ụgwọ mgbapụta ahụ iji napụta ihe a kpọrọ mmadụ site n’ihe ndị na-akpata ọnwụ nke mmehie Adam wetara. (Matiu 20:28) N’ihi ya, n’uhuruchi ahụ ọ nwụrụ, Jisọs pụrụ iji obi ike kpee ekpere, sị: “Mụ onwe m nyere Gị otuto n’elu ụwa, ebe M rụzuru ọrụ I nyeworo m ka M rụọ. Nna, Gị onwe gị werekwa otuto nke M nwere n’ebe Ị nọ mgbe ụwa aka-adịghị nye m otuto ugbu a n’ebe Gị onwe Gị nọ.” (Jọn 17:4, 5) Jisọs pụrụ ịgwa Nna ya nke eluigwe okwu ndị ahụ n’ihi na ọ na-enwe ihe ịga nke ọma n’imeri ule nke ịza ajụjụ, Chineke nakwerekwaara ya.
8. (a) Olee otú Pọl si gosi na anyị aghaghị ịza ajụjụ banyere onwe anyị nye Jehova Chineke? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka ịbụ ndị Chineke nakweere?
8 N’adịghị ka nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jisọs Kraịst, anyị ezughị okè. Ma, anyị ga-aza Chineke ajụjụ. Pọl onyeozi sịrị: “Gịnị mere ị na-ekpe nwanna gị ikpe? ma ọ bụ gị onwe gị kwa, gịnị mere ị na-akpọ nwanna gị ihe efu? n’ihi na anyị nile ga-eguzo n’ihu oche ikpe Chineke. N’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Dị ka Mụ onwe m na-adị ndụ, ka Onyenwe anyị kwuru, ọ bụ Mụ onwe m ka ikpere nile ọ bụla ga-egburu, ire nile ọ bụla ga-ekwupụtakwa Chineke. Ya mere otú a onye ọ bụla n’etiti anyị ga-aza ajụjụ banyere onwe ya nye Chineke.” (Ndị Rom 14:10-12) Ka anyị wee mee otú ahụ ma bụrụ ndị Jehova nakweere, o jiwo ịhụnanya nye anyị ma akọ na uche ma Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible, iji duzie anyị n’ihe anyị na-ekwu ma na-eme. (Ndị Rom 2:14, 15; 2 Timoti 3:16, 17) Iji ndokwa ime mmụọ nke Jehova mee ihe n’ụzọ zuru ezu na ịgbaso akọ na uche anyị e ji Bible zụọ ga-enyere anyị aka ịbụ ndị Chineke nakweere. (Matiu 24:45-47) Mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ Jehova, bụ isi iyi ọzọ nke ume na nduzi. Ọ bụrụ na anyị emee ihe kwekọrọ ná nduzi mmụọ ahụ na nduzi nke akọ na uche anyị e ji Bible zụọ, anyị na-egosi na anyị adịghị ‘ajụ Chineke,’ onye anyị na-aghaghị ịza ajụjụ n’ihi ihe nile anyị na-eme.—1 Ndị Tesalọnaịka 4:3-8; 1 Pita 3:16, 21.
Mba Ndị Ga-aza Ajụjụ
9. Ole ndị ka ndị Edọm bụ, gịnị mekwara ha n’ihi mmeso ha mesoro Israel?
9 Jehova na-eme ka mba dị iche iche zaa ajụjụ. (Jeremaịa 25:12-14; Zefanaịa 3:6, 7) Tụlee alaeze oge ochie bụ́ Edọm, nke dị n’ebe ndịda nke Osimiri Nwụrụ Anwụ na n’ebe ugwu nke Gulf nke Aqaba. Ndị Edọm bụ ndị Semite, ndị ha na ndị Israel bụ ụmụnne. Ọ bụ ezie na nna nna ndị Edọm bụ nwa nwa Abraham bụ́ Ịsọ, e kweghị ka ndị Israel si Edọm gafere “n’ụzọ eze” mgbe ha na-aga n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 20:14-21) Ka ọtụtụ narị afọ na-agafe obi ọjọọ Edọm ghọrọ ajọ ịkpọasị maka Israel. N’ikpeazụ, ndị Edọm aghaghị ịza ajụjụ n’ihi ha ịgba ndị Babilọn ume ibibi Jerusalem na 607 T.O.A. (Abụ Ọma 137:7) Na narị afọ nke isii T.O.A., ndị agha Babilọn n’okpuru Eze Nabonidus meriri Edọm, ọ ghọkwara ebe tọgbọrọ n’efu, dị ka Jehova nyeworo n’iwu.—Jeremaịa 49:20; Obadaịa 9-11.
10. Olee otú ndị Moab si mesoo ndị Israel, oleekwa ụzọ Chineke si mee ka Moab zaa ajụjụ?
10 Ọnọdụ akaghịrị Moab mma. Alaeze Moab dị n’akụkụ ugwu Edọm na n’ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Nwụrụ Anwụ. Tupu ndị Israel abanye n’Ala Nkwa ahụ, ndị Moab eleghị ha ọbịa nke ọma, na-enye ha achịcha na mmiri nanị maka uru ego dị ka ihe àmà gosiri. (Deuterọnọmi 23:3, 4) Eze Belak nke Moab goro onye amụma Belam ọrụ ịbịa kọchaa Israel, e jikwa ndị inyom Moab raba ndị ikom Israel n’omume rụrụ arụ na ikpere arụsị. (Ọnụ Ọgụgụ 22:2-8; 25:1-9) Otú ọ dị, Jehova ekweghị ka ịkpọasị Moab kpọrọ Israel bụrụ nke a na-ahụtaghị. Dị ka e buru n’amụma, Moab nwetara mbibi n’aka ndị Babilọn. (Jeremaịa 9:25, 26; Zefanaịa 2:8-11) Ee, Chineke mere ka Moab zaa ajụjụ.
11. Moab na Amọn ghọrọ ndị yiri obodo dịgasị aṅaa, gịnịkwa ka amụma Bible gosiri banyere usoro ihe ọjọọ dị ugbu a?
11 Ọ bụghị nanị Moab kamakwa Amọn aghaghị ịza Chineke ajụjụ. Jehova ebuwo amụma, sị: “Moab ga-adị ka Sọdọm, ụmụ Amọn ga-adịkwa ka Gọmọra, ihe onwunwe nke akụba, na olulu nnu, na ebe tọgbọrọ n’efu ruo mgbe ebighị ebi.” (Zefanaịa 2:9) E bibiri ala Moab na Amọn, ọbụna dị ka Chineke bibiworo obodo Sọdọm na Gọmọra. Dị ka Òtù Ọdịdị Ala nke London si kwuo, ndị nnyocha na-azọrọ na ha achọtawo ebe Sọdọm na Gọmọra e bibiri ebibi dị n’ụsọ osimiri ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Nwụrụ Anwụ. Ihe àmà ọ bụla a pụrụ ịdabere na ya nke ka pụrụ ịpụta ìhè n’akụkụ nke a pụrụ nanị ịkwado amụma Bible ndị na-egosi na Jehova Chineke ga-emekwa ka usoro ihe ọjọọ dị ugbu a zaa ajụjụ.—2 Pita 3:6-12.
12. Ọ bụ ezie na Israel aghaghị ịza ajụjụ nye Chineke maka mmehie ya, gịnị ka e buworo n’amụma banyere ihe fọdụrụ ná ndị Juu?
12 Ọ bụ ezie na Jehova egosiwo Israel ihu ọma dị ukwuu, ọ ghaghị ịza Chineke ajụjụ maka mmehie ya. Mgbe Jisọs Kraịst bịara ná mba Israel, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ jụrụ ya. Nanị ihe fọdụrụnụ gosiri okwukwe ma ghọọ ụmụazụ ya. Pọl ji amụma ụfọdụ mee ihe banyere ndị Juu a fọdụrụnụ mgbe o dere, sị: “Aịsaịa na-eti mkpu banyere Israel, sị, Ọ bụrụ na ọnụ ọgụgụ ụmụ Israel dị ka ájá nke oké osimiri, ọ bụ nke fọdụrụ ka a ga-azọpụta: n’ihi na Onyenwe anyị ga-eme ihe O kwuru n’elu ụwa, na-emezu ya na-emekwa ya ka o bie. Ọzọ, dị ka Aịsaịa buru ụzọ kwuo, Ọ bụrụ na Onyenwe usuu nile nke ndị agha ahapụghị anyị otu mkpụrụ, anyị ga-adịworị ka Sọdọm, a ga-emeworị anyị ka anyị yie Gọmọra.” (Ndị Rom 9:27-29; Aịsaịa 1:9; 10:22, 23) Onyeozi ahụ zoro aka n’ihe atụ nke mmadụ 7,000 ahụ n’oge Elaịja bụ́ ndị na-akpọbeghịrị Beal isiala, o wee sị: “Ya mere otú a n’oge dị ugbu a ndị fọdụrụ apụtawokwa dị ka nhọpụta nke amara si dị.” (Ndị Rom 11:5) Ihe mejupụtara ihe ahụ fọdụrụ bụ ndị mmadụ ndị ga-aza Chineke ajụjụ n’otu n’otu.
Ihe Atụ nke Ịza Ajụjụ Onwe Onye
13. Gịnị mere Ken mgbe Chineke mere ka ọ zaa ajụjụ n’ihi igbu nwanne ya bụ́ Ebel?
13 Bible na-ehota ọtụtụ ọnọdụ nke ịza ajụjụ onwe onye nye Jehova Chineke. Were nwa nwoke mbụ Adam, bụ́ Ken, dị ka ihe atụ. Ma ya ma nwanne ya nwoke bụ́ Ebel chụụrụ Jehova àjà. Chineke nakweere àjà Ebel, ma ọ nakwereghị nke Ken. Mgbe a kpọrọ ya ịza ajụjụ maka iji obi ọjọọ gbuo nwanne ya nwoke, Ken ji ịkpọ obi nkụ gwa Chineke: “Ọ̀ bụ onye nche nwanne m ka m bụ?” N’ihi mmehie ya, a chụpụrụ Ken gaa “n’ala Nod, n’Ihu anyanwụ Iden.” O gosighị ezi nchegharị ọ bụla maka mpụ ya, na-enwe mwute nanị maka ntaramahụhụ kwesịrị ya.—Jenesis 4:3-16.
14. Olee otú e si mee ihe atụ ịza ajụjụ onwe onye nye Chineke n’ọnọdụ nke onye isi nchụàjà Ịlaị na ụmụ ya?
14 E mekwara ihe atụ ịza ajụjụ onwe onye nye Chineke n’ọnọdụ nke onye isi nchụàjà Israel bụ́ Ịlaị. Ụmụ ya, Họfnaị na Finehas, rụrụ ọrụ dị ka ndị nchụàjà na-eje ozi ma “ikpe emeghị ihe n’ikpe ziri ezi n’ebe ụmụ mmadụ nọ, na enyeghị Chineke nsọpụrụ mara ha, ha ewepụghịkwa aka site n’ụdị ihe ọjọọ ọ bụla,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus na-ekwu. ‘Ndị ikom a jọgburu onwe ha’ amaghị Jehova, tinye aka n’àgwà a na-asọ asọ, ikpe ajọ omume rụrụ arụ makwara ha. (1 Samuel 1:3; 2:12-17, 22-25) Dị ka nna ha na onye isi nchụàjà Israel, Ịlaị nwere ọrụ nke ịdọ ha aka ná ntị, ma nanị ihe o mere bụ ịbara ha mba nwayọọ. Ịlaị ‘na-asọpụrụ ụmụ ya karịa Jehova.’ (1 Samuel 2:29) Nkwụghachi ụgwọ bịakwasịrị n’ụlọ Ịlaị. Ụmụ ya abụọ ahụ nwụrụ n’otu ụbọchị ahụ nna ha nwụrụ, n’ikpeazụkwa e kpochapụrụ kpam kpam usoro ndị nchụàjà ha. E si otú ahụ mee mpịazi ahụ.—1 Samuel 3:13, 14; 4:11, 17, 18.
15. N’ihi gịnị ka e ji kwụghachi ọkpara Eze Sọl bụ́ Jonatan ụgwọ ọrụ?
15 Ọkpara Eze Sọl bụ́ Jonatan setịpụrụ ihe nlereanya dịwagara nnọọ iche. Ngwa ngwa Devid gbusịrị Golaịat, “e kekọtara mkpụrụ obi Jonatan na mkpụrụ obi Devid,” ha wee gbaa ọgbụgba ndụ ọbụbụenyi. (1 Samuel 18:1, 3) O yiri ka Jonatan ọ̀ chọpụtara na mmụọ Chineke ahapụwo Sọl, ma ịnụ ọkụ n’obi nke ya maka ezi ofufe adalataghị ma ọlị. (1 Samuel 16:14) Nghọta Jonatan ghọtara ikike Chineke nyere Devid adịghị mgbe ọ dara. Jonatan maara na ya ga-aza Chineke ajụjụ, Jehova nyekwara ya ụgwọ ọrụ maka ụzọ nsọpụrụ ọ gbasoro site n’ịhụ na eriri ezinụlọ ya dịgidere ruo ọtụtụ ọgbọ.—1 Ihe Emere 8:33-40.
Ịza Ajụjụ n’Ime Ọgbakọ Ndị Kraịst
16. Ònye bụ Taịtọs, n’ihi gịnịkwa ka a pụrụ iji kwuo na o nyere azịza dị mma banyere onwe ya nye Chineke?
16 Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na-ekwu okwu ọma banyere ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom nyere azịza dị mma banyere onwe ha. Dị ka ihe atụ, e nwere onye Kraịst bụ́ onye Grik aha ya bụ Taịtọs. A tụwo aro na ọ ghọrọ onye Kraịst n’oge njem ozi ala ọzọ mbụ nke Pọl gaa Saịprọs. Ebe ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu si Saịprọs nwere ike ịnọwo na Jerusalem n’oge Pentikọst nke 33 O.A., Iso Ụzọ Kraịst pụrụ iruwo àgwàetiti ahụ ngwa ngwa nke ahụ gasịrị. (Ọrụ 11:19) Ka o sina dị, Taịtọs ghọrọ otu n’ime ndị ọrụ ibe Pọl kwesịrị ntụkwasị obi. O sonyeere Pọl na Banabas na njem gaa Jerusalem n’ihe dị ka na 49 O.A., mgbe e doziri okwu ibi úgwù ahụ dị mkpa. Eziokwu ahụ bụ na e bighị Taịtọs úgwù gbakwụnyere ihe n’arụmụka Pọl na ndị a tọghatara bịa n’Iso Ụzọ Kraịst ekwesịghị ịnọ n’okpuru Iwu Mosis. (Ndị Galetia 2:1-3) A gbara akaebe maka ozi dị mma Taịtọs jere n’Akwụkwọ Nsọ, ọbụnakwa na Pọl degaara ya otu akwụkwọ ozi sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke. (2 Ndị Kọrint 7:6; Taịtọs 1:1-4) Kpọmkwem ruo n’ọgwụgwụ ndụ elu ụwa ya dị ka ihe àmà na-egosi, Taịtọs nọgidere na-enye azịza dị mma banyere onwe ya nye Chineke.
17. Azịza dị aṅaa ka Timoti nyere, oleekwa ụzọ ihe atụ nke a pụrụ isi metụta anyị?
17 Timoti bụ onye ọzọ na-anụ ọkụ n’obi nke nyere azịza a na-anakwere banyere onwe ya nye Jehova Chineke. Ọ bụ ezie na Timoti nwere nsogbu ụfọdụ nke ahụ ike, o gosipụtara “okwukwe ihu abụọ na-adịghị ya” ma ‘soro Pọl bụrụ ohu n’izisa ozi ọma.’ N’ihi ya onye ozi ahụ pụrụ ịgwa ndị Kraịst ibe ya na Filipaị, sị: “Enweghị m onye ọ bụla nke mkpụrụ obi ya yiri nke [Timoti], bụ́ onye ga-echegbu onwe ya banyere ọnọdụ unu n’ezie.” (2 Timoti 1:5; Ndị Filipaị 2:20, 22; 1 Timoti 5:23) N’agbanyeghị adịghị ike nile nke mmadụ na ule ndị ọzọ, anyị onwe anyị kwa pụrụ inwe okwukwe ihu abụọ na-adịghị ya ma nye azịza a na-anakwere banyere onwe anyị nye Chineke.
18. Ònye bụ Lidia, mmụọ dịkwa aṅaa ka o gosipụtara?
18 Lidia bụ nwanyị na-atụ egwu Chineke nke ihe àmà na-egosi na o nyere azịza ọma banyere onwe ya nye Chineke. Ya na ezinụlọ ya so ná ndị mmadụ mbụ na Europe nabatara Iso Ụzọ Kraịst n’ihi ọrụ Pọl na Filipaị n’ihe dị ka na 50 O.A. Ọ bụ onye Taịataịra, Lidia bụ ma eleghị anya onye na-eso ụzọ ndị Juu, ma ọ pụrụ ịbụ na e nwere ndị Juu ole na ole, ọ dịghịkwa ụlọ nzukọ e nwere na Filipaị. Ya na ndị inyom ọzọ na-ekpere Chineke na-ezukọ n’akụkụ osimiri mgbe Pọl gwara ha okwu. N’ihi ya, Lidia ghọrọ onye Kraịst ma rụgide Pọl na ndị òtù ya ịnọnyere ya. (Ọrụ 16:12-15) Ile ọbịa nke Lidia gosipụtara nọgidere na-abụ ihe e ji amata ezi ndị Kraịst.
19. Ọrụ ọma dịgasị aṅaa ka Dọkas ji nye azịza dị mma banyere onwe ya nye Chineke?
19 Dọkas bụ nwanyị ọzọ nyere azịza ọma banyere onwe ya nye Jehova Chineke. Mgbe ọ nwụrụ, Pita gara Jọpa ná nzaghachi nye arịrịọ ndị na-eso ụzọ bi n’ebe ahụ. Ndị ikom abụọ ahụ zutere Pita “duuru ya rịgoo n’ime ụlọ ahụ dị n’elu ụlọ: ndị inyom nile ndị di ha nwụrụ guzokwara ya nso na-akwa ákwá, na-egosikwa uwe ime na uwe ọzọ, ka ha hà, bụ́ nke Dọkas na-eme mgbe ya na ha nọ.” E weghachiri Dọkas ná ndụ. Ma ọ̀ bụ nanị maka mmụọ mmesapụ aka ya ka a ga-eji na-echeta ya? Ee e. Ọ bụ “onye na-eso ụzọ,” o kerekwaara òkè n’ezie n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ n’onwe ya. Ndị inyom bụ́ ndị Kraịst taa n’otu aka ahụ ‘na-ejupụta n’ezi ọrụ na ọrụ ebere.’ Ha na-enwekwa obi ụtọ ikere òkè pụtara ìhè n’ịkpọsa ozi ọma nke Alaeze ahụ na ime ndị na-eso ụzọ.—Ọrụ 9:36-42; Matiu 24:14; 28:19, 20.
20. Ajụjụ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ ịjụ onwe anyị?
20 Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na mba dị iche iche na ndị mmadụ n’otu n’otu aghaghị ịza ajụjụ nye Eze Onyenwe anyị Jehova. (Zefanaịa 1:7) Ọ bụrụ na anyị raara onwe anyị nye Chineke, anyị pụrụ n’ihi ya ịjụ onwe anyị, sị, ‘Olee otú m si ele ihe ùgwù na ibu ọrụ ndị Chineke nyere m anya? Azịza dị aṅaa ka m na-enye Jehova Chineke na Jisọs Kraịst banyere onwe m?’
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Olee otú ị ga-esi gosi na ndị mmụọ ozi na Ọkpara Chineke na-aza Jehova ajụjụ?
◻ Ihe atụ dịgasị aṅaa nke Bible na-egosi na Chineke na-eme ka mba dị iche iche zaa ajụjụ?
◻ Gịnị ka Bible na-ekwu banyere ịza ajụjụ onwe onye nye Chineke?
◻ Olee ndị ụfọdụ dị n’ihe ndekọ Bible bụ́ ndị nyere azịza dị mma nye Jehova Chineke?
[Foto dị na peeji nke 10]
Jisọs Kraịst nyere azịza dị mma banyere onwe ya nye Nna ya nke eluigwe
[Foto dị na peeji nke 15]
Dị ka Dọkas, ndị inyom bụ́ ndị Kraịst taa na-enye azịza dị mma banyere onwe ha nye Jehova Chineke
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 13]
Ọnwụ Ebel/The Doré Bible Illustrations/Dover Publications, Inc.