Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
A Nọgide Na-ekwusa Eziokwu Bible n’Ireland
N’AFỌ ndị na-adịbeghị anya, mba Ireland nke nwere ala mara mma abụwo ebe e nwere oké ọgba aghara. N’otu oge ahụ, ndị Ireland azaghachiwo nke ọma n’ozi olileanya Bible nke Ndịàmà Jehova wetaara ha. Ahụmahụ ndị na-esonụ sitere na Ireland na-akwado nke a.
■ Na Dublin otu n’ime Ndịàmà Jehova na obere nwa ya nwanyị nọ na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ụlọ n’ụlọ. Ha zutere otu nwanyị aha ya bụ Cathy bụ́ onye ji nnọọ ọrụ n’aka ya na ọtụtụ ụmụ ya. Onyeàmà ahụ jụrụ ma nwa ya nwanyị, bụ́ onye na-amụ otú e si eme nkwusa, ọ̀ pụrụ isoro ya kerịta nanị otu ozi dị mkpirikpi. Cathy kweere, nwa agbọghọ nta ahụ kwukwara okwu doro anya, nke e chepụtara nke ọma. Ezi obi na nkwanye ùgwù pụtara ìhè nke nwatakịrị ahụ masịrị Cathy, ọ nakwaara traktị Bible e nyefere ya.
Mgbe e mesịrị Cathy tụgharịrị uche n’ezi nkwado na àgwà nke nwatakịrị bịara leta ya. “Ọ masịrị m na nwatakịrị nwanyị ahụ pụrụ ikerịta ụdị ozi ahụ na-akpali mmasị n’adọrọghị uche gaa n’ebe ya onwe ya nọ,” ka o kwuru. “M kpebiri na mgbe ọzọ Ndịàmà Jehova bịara, m ga-ege ha ntị.”
Ka ọ dịgodị n’oge ahụ, Cathy kwagara n’obodo nta dị n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ nke Ireland ná nso ókèala nke obodo Cork na Kerry. Oge ụfọdụ mgbe nke a gasịrị, Ndịàmà Jehova kpọtụrụ n’ọnụ ụzọ ya, ọ kpọbatakwara ha. Ọ nakweere ọmụmụ Bible chiri anya, ọ na-akpọkwa ọtụtụ ụmụ ya aga nzukọ ọgbakọ. Cathy nwere ekele maka ezi ọchịchọ nke nwa agbọghọ nta ahụ nwere isoro ya kerịta ozi ọma ahụ.
■ N’ógbè Tullamore, Ndịàmà sooro otu nwanyị aha ya bụ Jean nwee nkwurịta okwu Bible ruo afọ asaa. Mgbe ụfọdụ o gosiri mmasị ma nara akwụkwọ, ma n’oge ndị ọzọ mmasị ya nyụrụ ọkụ. Otu ụbọchị, mgbe otu Onyeàmà aha ya bụ Frances na onye òtù ya kpọtụụrụ Jean, ha hụrụ ya mgbe obi na-adịchaghị ya mma. “N’agbanyeghị ihe anyị kwuru,” ka Onyeàmà ahụ na-akọ, “ọ kara njọ. N’ikpeazụ, ọ gwara anyị ka anyị zuzupụ ma kwachie ụzọ n’ike.”
Frances chere ma ijekwu nleta ọ̀ ga-akpata nanị otu mmeghachi omume ahụ. ‘Ma eleghị anya ọ bakwaghị uru ịkpọtụrụ ya ma ọ bụrụ na o nweghị mmasị n’ezie n’ozi ahụ,’ ka Frances chere. Otú ọ dị, o sooro di ya, Thomas, kwurịta banyere okwu ahụ, o nwekwara olileanya karị. N’oge ọzọ ha nọ n’ógbè ahụ, ha kpọtụụrụ Jean ọzọ. O nwere omume enyi ma nara magazin Ụlọ Nche na Teta! Mkpọtụ ọzọ a kpọtụụrụ ya dịkwa mma otú ahụ, Thomas na Frances malitekwara iduziri ya ọmụmụ Bible ebe obibi.
N’ihi gịnị ka o ji gbanwee? Jean kọwara na n’oge ahụ ọ na-akwanyeghịrị Ndịàmà ahụ ùgwù, ọ ka mụsịrị nwa ma ka si n’ụlọ ọgwụ pụta. N’ihi inye nwa ọhụrụ ya ara na iji ngaji enye nwa ya nke tọrọ nke ọhụrụ nri, ọ na-ehi ụra nanị otu hour na ọkara kwa abalị. “Ihe ikpeazụ m chọrọ ime,” ka Jean na-ekwu, “bụ ikwu banyere okpukpe.”
N’ime ọnwa abụọ Jean nọ na-aga nzukọ ọgbakọ nile, n’ime ọnwa anọ kwa ọ na-ekere òkè n’ozi ubi. Ọnwa iri site n’oge ọ malitere ọmụmụ Bible ya, e mere ya baptism. Ugbu a ahụmahụ nke Jean na-enyere ya aka n’ozi. Ọ na-akọ, sị: “Ọ bụrụ na mụ ezute onye na-enweghị nkwanye ùgwù, m na-agbalị ịghọtakwu ya. M na-edetukarị ya. Ma eleghị anya ọnọdụ ahụ ga-agbanwe ma ọ na-erule oge m ga-agaghachi; onye ahụ pụrụ inwe mmetụta ka mma ma na-anabata ihe karị.”