Nkasi Obi Maka Ndị A Na-emegbu
Ị̀RỊBAWO ama na n’ime afọ ndụ gị nile e jiriwo ụfọdụ okwu mere isi akụkọ mgbe mgbe? Ike ọ̀ gwụla gị ịgụ okwu ndị dị ka agha, mpụ, ọdachi, agụụ, na nhụjuanya? Otú ọ dị, n’ụzọ dị mfe ịchọpụta, otu okwu adịghị n’akụkọ ndị ahụ. Ma, ọ bụ okwu na-anọchite anya ihe dị ihe a kpọrọ mmadụ oké mkpa. Okwu ahụ bụ “nkasi obi.”
“Ịkasi obi” pụtara “inye ume na olileanya” na “ibelata iru újú ma ọ bụ nsogbu” mmadụ. N’ihi oké ọgba aghara nile nke ụwa gabigaworo na narị afọ nke 20, a chọrọ olileanya na ibelata iru újú nke ukwuu. N’eziokwu, ụfọdụ n’ime anyị taa na-enwe ntụsara ahụ ihe ndị e kere eke karịa ka ndị nna nna anyị hà chere na ọ ga-ekwe omume. Nke a bụ n’ụzọ dị ukwuu n’ihi ọganihu sayensị. Ma sayensị na nkà na ụzụ akasibeghị anyị obi n’echiche nke iwepụ ihe nile na-akpata nhụjuanya n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. Gịnị bụ ihe ndị a na-akpata ya?
Ọtụtụ narị afọ gara aga, nwoke ahụ maara ihe bụ́ Solomọn kwuru banyere otu ọkpụrụkpụ ihe na-akpata nhụjuanya mgbe o kwuru, sị: “Mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) Sayensị na nkà na ụzụ enwebeghị ike ịgbanwe àgwà nke mmadụ ịchọ inwe ike n’ahụ mmadụ ibe ya. Na narị afọ nke 20, nke a edujewo n’ọchịchị aka ike nke mmegbu n’ime mba dị iche iche nakwa n’agha ndị dị egwu n’etiti mba dị iche iche.
Kemgbe 1914 e gbuola ihe karịrị otu narị nde mmadụ n’ihi agha. Cheedị banyere nhụsianya nke ọnụ ọgụgụ a nọchiri anya ya—ọtụtụ nde ezinụlọ na-eru újú bụ́ ndị nkasi obi dị mkpa. Agha na-edujekwa n’ụdị nhụjuanya ndị ọzọ ma e wezụga ọnwụ ike. Mgbe agha ụwa nke abụọ biri, e nwere ihe karịrị nde 12 ndị gbara ọsọ ndụ na Europe. N’afọ ndị na-adịchabeghị anya, ihe karịrị otu nde na ọkara si n’ógbè a na-alụ agha na Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia gbapụ. Ịlụ agha ná mba ndị Balkan amanyewo ihe karịrị nde abụọ ịgbapụ n’ebe obibi ha—n’ọtụtụ ọnọdụ iji gbanarị “nhichapụ agbụrụ.”
N’ezie ndị gbara ọsọ ndụ chọrọ nkasi obi, nke ka nke ndị ji nanị ihe onwunwe ha pụrụ iburu wee gbapụ n’ebe obibi ha, n’amaghị ebe ha ga-aga ma ọ bụ ihe ọdịnihu nwere maka ha na ezinụlọ ha. Ndị dị otú ahụ so n’ime ndị e megburu n’ụzọ dị imere ebere karịsịa; nkasi obi dị ha mkpa.
N’akụkụ ụwa ebe dị n’udo karị, ọtụtụ nde bi n’ihe a pụrụ ịsị na ọ bụ ohu nye usoro akụ̀ na ụba ụwa. N’eziokwu, ụfọdụ enwewo ụba nke ihe onwunwe. Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ na-eche mgba a na-agba kwa ụbọchị inweta ihe e ji ebi ndụ ihu. Ọtụtụ na-achọ ụlọ dị mma. Ọnụ ọgụgụ na-arị elu enweghị ọrụ. “Ụwa,” ka otu akwụkwọ akụkọ Africa na-ebu amụma ya, “na-aga ná nsogbu enweghị ọrụ nke na-enwebeghị ihe yiri ya, na-enwekwu ihe karịrị ijeri 1.3 ọzọ na-achọ ọrụ ma a na-erule afọ 2020.” N’ezie ndị a na-emegbu n’ụzọ akụ̀ na ụba nwere mkpa “ume na olileanya”—nkasi obi.
N’imeghachi omume n’ọnọdụ ndị dị njọ, ụfọdụ na-echigharịkwuru ndụ ime mpụ. N’ezie, nke a nanị na-eweta ihe isi ike nye ndị a na-emeso ya, ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke mpụ na-etinyekwa ihe n’echiche nke mmegbu. Otu isi akụkọ pụtara na nso nso a na The Star, otu akwụkwọ akụkọ nke Johannesburg, South Africa, na-agụ: “Otu ụbọchị ná ndụ nke ‘mba kasị egbu ọchụ n’ụwa.’” Isiokwu ahụ kọwara otu ụbọchị yiri ndị ọzọ n’ime na gburugburu Johannesburg. N’otu mkpụrụ ụbọchị ahụ, e gburu mmadụ anọ ma zuru ụgbọala nke mmadụ asatọ. A kọrọ banyere izu ohi 17 n’otu mpaghara ndị ọkwá etiti. Tụkwasị na nke a, e nwere ọtụtụ iji égbè ezu ohi. Dị ka akwụkwọ akụkọ ahụ si kwuo, ndị uwe ojii kọwara nke a dị ka ụbọchị “datụrụ jụụ.” N’ụzọ kwere nghọta, ndị ikwu nke ndị e gburu egbu na ndị a kpakara ụlọ ha na ndị e zuuru ụgbọala ha na-enwe mmetụta ịbụ ndị a na-emegbu nnọọ emegbu. Mmesi obi ike na olileanya—nkasi obi—dị ha mkpa.
N’ụfọdụ ala, e nwere ndị nne na nna na-erenye ụmụ ha n’ịgba akwụna. A kọrọ na otu mba Esia ebe ndị na-eme njem nleta na-enubanye maka “njem mmekọahụ” nwere nde ndị akwụna abụọ, ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ndị a zụrụ azụ ma ọ bụ tọrọ mgbe ha bụ ụmụaka. È nwere ndị a na-emegbu karịa ndị a dị imere ebere a na-emegbu? N’ịtụle azụmahịa a dị oké njọ, magazin Time kọrọ banyere nnọkọ nkwurịta okwu nke òtù ndị inyom Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia nwere na 1991. N’ebe ahụ, e mere atụmatụ na “e rewo nde ndị inyom 30 n’ụwa nile kemgbe etiti afọ ndị 1970.”
N’ezie, ọ dịghị mkpa ka e renye ụmụaka n’ịgba akwụna iji megbuo ha. Ndị nne na nna na ndị ikwu na-eti ọnụ ọgụgụ na-arị elu ihe ma ọ bụ ọbụna dinaa ha n’ike n’ebe obibi nke ha. Ụdị ụmụaka ahụ pụrụ iburu àpà mmetụta uche ruo ogologo oge. N’ezie, dị ka ndị a na-emegbu n’ụzọ dị mwute, nkasi obi dị ha mkpa.
Onye Mmụta Oge Ochie nke Mmegbu
Ókè nke mmegbu mmadụ ruru wụrụ Eze Solomọn akpata oyi n’ahụ. O dere, sị: “Mụ onwe m wee laghachi hụ mmegbu nile a na-emegbu n’okpuru anyanwụ: ma, lee, anya mmiri nke ndị a na-emegbu, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere; ma n’akụkụ ndị na-emegbu ha ka ike dị, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere.”—Eklisiastis 4:1.
Ọ bụrụ na eze ahụ nwere amamihe ghọtara afọ 3,000 gara aga na ndị a na-emegbu nọ n’oké mkpa maka nkasi obi, gịnị ka ọ ga-ekwu taa? Ka o sina dị, Solomọn maara na ọ dịghị mmadụ ọ bụla na-ezughị okè, tinyere ya onwe ya, nke pụrụ iweta nkasi obi nke dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa. A chọrọ onye ka ukwuu iji wepụ ike nke ndị mmegbu. È nwere ụdị onye ahụ?
Na Bible, Abụ Ọma 72 na-ekwu banyere onye nkasi obi ukwu maka mmadụ nile. Nna Solomọn, bụ́ Eze Devid, dere abụ ọma ahụ. Okwu e dere ya n’elu na-agụ, sị: “Abụ Ọma nke Solomọn.” Dị ka ihe àmà na-egosi, ọ bụ Eze Devid meworo agadi dere ya banyere Onye gaje iketa ocheeze ya. Onye a, dị ka abụ ọma ahụ si kwuo, ga-eweta ahụ efe na-adịgide adịgide site ná mmegbu. “Onye ezi omume ga-ama akwụkwọ n’ụbọchị nile ya dị ka osisi ndụ; ọtụtụ udo ga-adịkwa ruo mgbe ọnwa agaghị adị. Ya nweekwa ike n’ahụ mmadụ site n’otu oké osimiri ruo oké osimiri ọzọ . . . ruo nsọtụ nile nke ụwa.”—Abụ Ọma 72:7, 8.
Ikekwe, mgbe Devid dere okwu ndị a, o bu nwa ya nwoke bụ́ Solomọn n’uche. Ma Solomọn ghọtara na ọ karịrị ike ya ijere ihe a kpọrọ mmadụ ozi n’ụzọ a kọwara n’abụ ọma ahụ. Ọ pụrụ imezu okwu abụ ọma ahụ nanị n’ụzọ dị nta nakwa n’ihi mba Israel, ọ bụghị maka abamuru nke ụwa nile. Dị ka ihe àmà na-egosi, abụ ọma amụma a e dere n’ike mmụọ nsọ tụrụ aka gaa n’onye ka Solomọn ukwuu hie nne. Ònye bụ onye ahụ? Ọ pụrụ nanị ịbụ Jisọs Kraịst.
Mgbe otu mmụọ ozi mara ọkwa ọmụmụ Jisọs, o kwuru, sị: “Onyenwe anyị Chineke ga-enyekwa Ya ocheeze nna Ya Devid.” (Luk 1:32) Ọzọ, Jisọs zoro aka n’onwe ya dị ka “Onye ka Solomọn.” (Luk 11:31) Kemgbe mbilite n’ọnwụ Jisọs gaa n’aka nri Chineke, ọ nọwo n’eluigwe, n’ebe ọ pụrụ isi mezuo okwu nke Abụ Ọma 72. Ọzọkwa, ọ natawo ike na ọchịchị site n’aka Chineke iji gbubie yoke nke ndị mmegbu bụ́ mmadụ. (Abụ Ọma 2:7-9; Daniel 2:44) Ya mere Jisọs bụ onye ga-emezu okwu nke Abụ Ọma 72.
Mmegbu Ga-akwụsị n’Isi Nso
Gịnị ka nke a pụtara? Ọ pụtara na nnwere onwe pụọ n’ụdị nile nke mmegbu mmadụ ga-adị n’ezie n’isi nso. Nhụjuanya na mmegbu a na-enwebeghị ihe yiri ya nke e nwetara na narị afọ nke 20 nke a bụ ihe Jisọs buru amụma ya dị ka akụkụ nke ihe ịrịba ama ahụ ga-aka “ọgwụgwụ oge a” akara. (Matiu 24:3) Tinyere ihe ndị ọzọ, o buru amụma, sị: “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ.” (Matiu 24:7) Akụkụ ahụ nke amụma ahụ malitere mmezu ya n’ihe dị ka oge ahụ Agha Ụwa Mbụ tiwapụrụ na 1914. “N’ihi na ihe na-emebi iwu ga-aba ụba,” ka Jisọs gbakwụnyere, “ịhụnanya nke ndị ka n’etiti mmadụ ga-ajụkwa oyi.” (Matiu 24:12) Mmebi iwu na enweghị ịhụnanya emepụtawo ọgbọ dị obi ọjọọ ma na-emegbu emegbu. Ya mere, oge ahụ aghaghị ịdị nso maka Jisọs Kraịst itinye aka dị ka Eze ọhụrụ nke ụwa. (Matiu 24:32-34) Gịnị ka nke ahụ ga-apụtara ụmụ mmadụ a na-emegbu bụ́ ndị nwere okwukwe n’ebe Jisọs Kraịst nọ nakwa ndị na-elega anya n’ebe ọ nọ dị ka Onye Nkasi Obi nke ihe a kpọrọ mmadụ nke Chineke họpụtara?
Maka azịza nye ajụjụ ahụ, ka anyị gụọ okwu ndị ọzọ nke Abụ Ọma 72 ndị mezuru n’isi Kraịst Jisọs: “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.” (Abụ Ọma 72:12-14) Ya mere Eze Chineke họpụtara, Jisọs Kraịst, ga-ahụ na o nweghị onye ga-ahụju anya n’ihi mmegbu. O nwere ike ịkwụsị ụdị nile nke ikpe na-ezighị ezi.
‘Nke ahụ na-ada ka ihe magburu onwe ya,’ ka mmadụ pụrụ ikwu, ‘ma gịnị banyere ugbu a? Nkasi obi dị aṅaa dịịrị ndị na-ahụju anya ugbu a?’ N’ezie, e nwere nkasi obi maka ndị a na-emegbu. Isiokwu abụọ na-esonụ na magazin a ga-egosi otú ọtụtụ nde siwororịị na-enweta nkasi obi site n’ịzụlite mmekọrịta chiri anya nke ha na ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, Jisọs Kraịst. Ụdị mmekọrịta ahụ pụrụ ịkasi anyị obi n’oge mmegbu ndị a, ọ pụkwara iduga mmadụ ná ndụ ebighị ebi nke mmegbu na-adịghị. Jisọs kwuru n’ekpere nye Chineke, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.”—Jọn 17:3.
[Foto dị na peeji nke 4, 5]
Ọ dịghị mmadụ ọ bụla ga-emegbu ibe ya n’ụwa ọhụrụ Chineke