Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 12/15 p. 5-8
  • Eziokwu Banyere Jisọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Eziokwu Banyere Jisọs
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Bible Na-ekwu
  • Ihe Ndabere Maka Obi Ike
  • Ihe Mere na Ha Ekweghị
  • Ịchọta Ezigbo Jisọs Ahụ
  • Jisọs nke Bụ́ Ezigbo Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Azịza nke Ajụjụ Ndị A Na-ajụ Banyere Jizọs Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ihe Ndị A Kọrọ Gbasara Jizọs Hà Mere Eme n’Eziokwu?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 12/15 p. 5-8

Eziokwu Banyere Jisọs

O YIRI ka e nweghị ọgwụgwụ nke nchepụta echiche na ịkọ nkọ banyere onye Jisọs bụ na ihe ọ rụzuru. Ma gịnị banyere Bible n’onwe ya? Gịnị ka ọ na-agwa anyị banyere Jisọs Kraịst?

Ihe Bible Na-ekwu

I jiri nlezianya gụọ Bible, ị ga-arịba eziokwu ndị a gbara ọkpụrụkpụ ama:

◻ Jisọs bụ Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya, onye e buru ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke.—Jọn 3:16; Ndị Kọlọsi 1:15.

◻ Ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, Chineke bufere ndụ Jisọs n’akpa nwa onye Juu na-amaghị nwoke ka a mụọ ya dị ka mmadụ.—Matiu 1:18; Jọn 1:14.

◻ Jisọs abụghị nanị ezi mmadụ. Ọ bụ n’ụzọ nile ngosipụta kwesịrị ntụkwasị obi nke ọdịdị mara mma nke Nna ya, bụ́ Jehova Chineke.—Jọn 14:9, 10; Ndị Hibru 1:3.

◻ N’oge ozi elu ala ya, Jisọs ji ịhụnanya gboo mkpa nke ndị a na-emegbu emegbu. Ọ gwọrọ ndị ọrịa ma ọbụna mee ka ndị nwụrụ anwụ bilie n’ụzọ ọrụ ebube.—Matiu 11:4-6; Jọn 11:5-45.

◻ Jisọs kpọsara Alaeze Chineke dị ka nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ na-ahụsi anya, o nyekwara ndị na-eso ụzọ ya ọzụzụ ịga n’ihu n’ọrụ nkwusa a.—Matiu 4:17; 10:5-7; 28:19, 20.

◻ Na Nisan 14 (ihe dị ka n’April 1), 33 O.A., e jidere Jisọs, kpee ya ikpe, maa ya ikpe, ma gbuo ya n’ebubo ụgha nke ịgba ọchịchị mgba okpuru.—Matiu 26:18-20, 48–27:50.

◻ Ọnwụ Jisọs jere ozi dị ka ihe mgbapụta, na-atọpụ ihe a kpọrọ mmadụ kwere ekwe site n’ọnọdụ mmehie ha, sikwa otú a na-emeghe ụzọ nke ndụ agwụghị agwụ maka ndị nile kwere na ya.—Ndị Rom 3:23, 24; 1 Jọn 2:2.

◻ Na Nisan 16, a kpọlitere Jisọs n’ọnwụ, ntakịrị oge nke ahụ gasịkwara ọ rịgoghachiri n’eluigwe iji kwụọ Nna ya uru ihe mgbapụta ahụ nke ndụ mmadụ ya zuru okè.—Mak 16:1-8; Luk 24:50-53; Ọrụ 1:6-9.

◻ Dị ka Eze Jehova a họpụtara ahọpụta, Jisọs e mere ka o si n’ọnwụ bilie nwere ikike zuru ezu imezu nzube mbụ nke Chineke maka mmadụ.—Aịsaịa 9:6, 7; Luk 1:32, 33.

N’ụzọ dị otú a, Bible na-akọwa Jisọs dị ka onye bụ isi ná mmezu nke nzube Chineke. Ma olee otú ị pụrụ isi jide n’aka na nke a bụ ezigbo Jisọs ahụ—Jisọs nke akụkọ ihe mere eme, onye a mụrụ na Betlehem, onye jekwara ije n’elu ala ihe dị ka afọ 2,000 gara aga?

Ihe Ndabere Maka Obi Ike

A pụrụ iwepụ ọtụtụ obi abụọ nanị site n’ịgụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’obi ghere oghe. N’ime otú ahụ, ị ga-achọpụta na ihe ndekọ Bible abụghị akụkọ ihe mere eme nke dị inyoghị inyoghị, bụ́ otú akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme na-adị. Kama nke ahụ, e kwuru aha, oge kpọmkwem, na ebe dị iche iche kpọmkwem. (Dị ka ihe atụ, lee Luk 3:1, 2.) Ọzọkwa, e ji ịkwụwa aka ọtọ dị ịrịba ama, eziokwu nke na-akụnye obi ike n’ime ndị na-agụ ya kwuo banyere ndị na-eso ụzọ Jisọs. Ndị dere ya ekpuchighị njọ nke onye ọ bụla—ọbụna ha onwe ha—iji dekọọ ihe kwesịrị ntụkwasị obi. Ee, ị ga-ahụ na Bible na-ada ụda nke eziokwu.—Matiu 14:28-31; 16:21-23; 26:56, 69-75; Mak 9:33, 34; Ndị Galetia 2:11-14; 2 Pita 1:16.

A ka nwere ihe ndị ọzọ. Nchọpụta nkà mmụta ihe ochie ndị e gwupụtara n’ala akwadowo ihe ndekọ Bible ugboro ugboro. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i jee leta Ụlọ Ndebe Ihe Ochie Israel dị na Jerusalem, ị pụrụ ịhụ nkume e dere ihe n’elu ya bụ́ nke kpọrọ aha Pọntiọs Paịlet. Nchọpụta ndị ọzọ nke nkà mmụta ihe ochie ndị e gwupụtara n’ala na-akwado Lisanias na Sajiọs Pọlọs, ndị Bible kpọtụrụ aha, dị ka ndị dịrị adị n’ezie kama ịbụ ndị ndị Kraịst oge mbụ chepụtara echepụta. Ihe omume ndị a kọrọ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst (Agba Ọhụrụ) na-enweta nkwado dị ukwuu n’izo aka nke ndị oge ochie na-ede ihe, gụnyere Juvenal, Tacitus, Seneca, Suetonius, Pliny nke Nta, Lucian, Celsus, na onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus.a

Ọtụtụ puku ndị dị ndụ na narị afọ mbụ nakweere akụkọ nke dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’arụghị ụka. Ọbụna ndị iro nke Iso Ụzọ Kraịst agọnarịghị ịbụ eziokwu nke ihe a kọrọ na Jisọs kwuru ma mee. Banyere ikwe omume nke na ndị na-eso ụzọ ya tinyekwuru ihe n’ụdị onye Jisọs bụ mgbe ọ nwụsịrị, Prọfesọ F. F. Bruce na-asị: “Ọ pụghị ịdịworị mfe ma ọlị dị ka o yiri ka ụfọdụ ndị na-ede ihe ha na-eche ichepụta okwu na omume nke Jisọs n’afọ ndị mbụ ahụ, mgbe ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ Ya ka nọ ndụ, bụ́ ndị pụrụ icheta ihe meworonụ na ihe na-emebeghị. . . . Ndị na-eso ụzọ ya apụghị itinye onwe ha n’ihe ize ndụ nke ide ihe ndị na-ezighị ezi (ya fọdụziekwa ịma ụma gbanwee eziokwu), nke ndị ga-enwe nnọọ obi ụtọ ikpughe ya ga-eme otú ahụ ozugbo.”

Ihe Mere na Ha Ekweghị

Ka o sina dị, ụfọdụ ndị ọkà mmụta nọgidere na-enwe obi abụọ. Ọ bụ ezie na ha weere ya na ihe ndekọ Bible bụ ihe e chepụtara echepụta, ọ na-adị ha ọkụ n’obi ịchọgharị ihe odide apọkrịfa ma nakwere ndị a dị ka ihe ziri ezi! N’ihi gịnị? N’ụzọ doro anya, ihe ndekọ Bible nwere ihe ọtụtụ ndị oge a nwere ọgụgụ isi na-adịghị achọ ikwere.

N’akwụkwọ ya bụ́ The Union Bible Companion, nke e bipụtara na 1871, S. Austin Allibone nyere ndị na-enwe obi abụọ ihe ịma aka. O dere, sị: “Jụọ onye ọ bụla na-asị na ya na-arụ eziokwu nke akụkọ ihe mere eme nke Oziọma ahụ ụka ihe mere o ji kwere na Cæsar nwụrụ na Capitol, ma ọ bụ na e mere Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu Charlemagne Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu nke Ebe Ọdịda Anyanwụ n’aka Popu Leo nke Atọ. na 800? . . . Anyị kwenyere ihe nile a . . . a na-ekwu banyere ndị ikom a; ọ bụkwa otú ahụ n’ihi na anyị nwere ihe àmà akụkọ ihe mere eme nke ịbụ eziokwu ha. . . . Ọ bụrụ na, mgbe e wepụtara ihe nnwapụta dị ka nke a, ndị ọ bụla ka na-ajụ ikwere, anyị na-ahapụ ha dị ka ndị rụrụ arụ n’ụzọ nzuzu ma ọ bụ ndị na-amaghị ihe bụ́ ndị na-enweghị olileanya. Mgbe ahụ, gịnị ka anyị ga-ekwu banyere ndị, n’agbanyeghị ihe àmà bara ụba e wepụtaworo ugbu a banyere ịbụ eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ, na-asị na e mebeghị ka ha kwere? . . . Ha achọghị ikwere ihe nke ga-eweda mpako ha ala, wee manye ha ibi ndụ dị iche.”

Ee, ụfọdụ ndị nwere obi abụọ nwere ebumnobi na-ezighị ezi n’ịjụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Nsogbu ha nwere abụghị n’izi ezi ya kama n’ụkpụrụ ya. Dị ka ihe atụ, Jisọs kwuru banyere ụmụazụ ya, sị: “Ha esiteghị n’ụwa, dị ka Mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:14) Otú ọ dị, ọtụtụ ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst tinyemiri aka ha n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa a, ọbụna na-etinye aka n’agha ndị na-awụfu ọbara. Kama ikwekọ n’ụkpụrụ Bible, ọtụtụ ndị mmadụ ga-achọ ka Bible kwekọọ n’ụkpụrụ nke ha.

Tụleekwa ihe banyere omume. Jisọs nyere ọgbakọ dị na Taịataịra ndụmọdụ siri ike maka ịgbachiri omume ịkwa iko nkịtị. “Mụ onwe m bụ onye na-enyocha akụrụ na obi nile,” ka ọ gwara ha, “M ga-enyekwa unu n’otu n’otu dị ka ọrụ nile unu si dị.”b (Mkpughe 2:18-23) Ma, ọ́ bụghị eziokwu na ọtụtụ ndị na-akpọ onwe ha ndị Kraịst na-ajụ ụkpụrụ omume ọma? Ha ga-ajụ ihe Jisọs kwuru kama ịjụ ụzọ rụrụ arụ nke àgwà ha.

N’ịbụ ndị nwere ọchịchọ ịjụ Jisọs nke Bible, ndị ọkà mmụta echepụtawo Jisọs nke onwe ha. Ha ghọrọ ndị ikpe ichepụta ihe na-emeghị eme mara bụ́ otu ihe ahụ ha na-ebo ndị dere Oziọma ahụ ebubo ụgha ime. Ha na-ejidesi ike akụkụ nke ndụ Jisọs ndị ha chọrọ ịnakwere, jụ ndị ọzọ, ma tụkwasị ụmụ irighiri ihe ole na ole nke onwe ha. N’eziokwu, onye amamihe ha na-awagharị awagharị ma ọ bụ onye mgbazi olu ọha mmadụ abụghị Jisọs nke akụkọ ihe mere eme nke ha na-azọrọ na ha na-achọ; kama nke ahụ, ọ bụ nanị ntakịrị nchepụta nkà mmụta nganga.

Ịchọta Ezigbo Jisọs Ahụ

Jisọs gbalịrị ịtụte obi nke ndị agụụ eziokwu na ezi omume na-agụ n’obi eziokwu. (Matiu 5:3, 6; 13:10-15) Ụdị ndị ahụ na-anara ịkpọ òkù Jisọs: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”—Matiu 11:28-30.

A gaghị achọta onye bụ ezigbo Jisọs n’akwụkwọ nke ndị ọkà mmụta nke oge a dere; a gaghịkwa achọta ya na chọọchị nile nke Krisendọm, bụ́ ndị ghọworo ebe a na-akwalite ọdịnala nke mmadụ mere. Ị pụrụ ịchọta Jisọs dị n’akụkọ ihe mere eme na Bible nke gị. Ị̀ ga-achọ ịmụtakwu ihe banyere ya? Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ime otú ahụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka inwetakwu ihe ọmụma, lee The Bible—God’s Word or Man’s?, isi nke 5, peji nke 55-70, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

b N’ime Bible, akụrụ mgbe ụfọdụ na-anọchite anya echiche na mmetụta uche kasị dị omimi nke mmadụ.

[Igbe dị na peeji nke 6]

ỌTỤTỤ NARỊ AFỌ NKE NKATỌ

Nkatọ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst malitere n’ihe karịrị afọ 200 gara aga, mgbe onye Germany bụ́ ọkà ihe ọmụma bụ́ Hermann Samuel Reimarus (1694-1768) kwuru, sị: “Anyị ziri ezi n’iwepụta nnọọ ọdịiche dị n’etiti ozizi nke Ndị Ozi n’ihe odide ha na ihe Jisọs n’Onwe Ya kpọsara ma kụzie n’oge ndụ Ya.” Kemgbe Reimarus, a kụziworo ọtụtụ ndị ọkà mmụta iche otú ahụ.

Akwụkwọ bụ́ The Real Jesus na-ekwu na ọtụtụ ndị nkatọ nke oge gara aga eleghị onwe ha anya dị ka ndị si n’ezi ofufe dapụ. Kama nke ahụ, “ha hụrụ onwe ha dị ka ezi ndị Kraịst karị maka inwere onwe ha pụọ n’agbụ nke ozizi na nkwenkwe ụgha.” Ha chere na oké nkatọ bụ “ụdị Iso Ụzọ Kraịst e mere ka ọ dị ọcha.”

Eziokwu dị mwute bụ na Krisendọm aghọwo ebe dị mma maka mmụba ọdịnala mmadụ mere. Ozizi nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ, Atọ n’Ime Otu, na hel na-ere ọkụ bụ nanị ụfọdụ n’ime ozizi ndị na-emegide Bible. Ma ọ bụghị ndị dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst kpatara mmerụ a nke eziokwu. N’ụzọ megidere nke ahụ, ha lụsoro mpụta ndị mbụ nke ozizi ụgha n’etiti narị afọ mbụ ọgụ, mgbe Pọl dere na ndapụ n’ezi ofufe n’etiti ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst “na-arụsi ọrụ ike ugbu a.” (2 Ndị Tesalọnaịka 2:​3, 7) Anyị pụrụ inwe obi ike na ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst bụ ihe ndekọ nke eziokwu akụkọ ihe mere eme na ozizi.

[Igbe dị na peeji nke 7]

OLEE MGBE E DERE OZIỌMA NDỊ AHỤ?

Ọtụtụ ndị na-akatọ Agba Ọhụrụ na-esi ọnwụ na e dere Oziọma ndị ahụ ogologo oge mgbe ihe omume ndị ha na-akọwa gasịrị, n’ihi ya kwa ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe e ji n’aka na ha nwere ihe ndị ­na-ezighị ezi n’ime ha.

Otú ọ dị, ihe àmà na-atụ aro na e dere Matiu, Mak, na Luk mgbe dị anya. Mkpụrụ akwụkwọ ndị dị n’ụfọdụ ihe odide nke Matiu na-egosi na e dere ya nke mbụ ya laa azụ na 41 O.A. Ma eleghị anya e dere Luk n’agbata 56 na 58 O.A., n’ihi na akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi (ikekwe nke e desịrị ka ọ na-erule 61 O.A.) na-egosi na onye dere ya, bụ́ Luk, edeworị “akwụkwọ mbụ” ya, bụ́ Oziọma ahụ. (Ọrụ 1:⁠1) E weere Oziọma Mak dị ka nke e dere na Rom n’oge a tụrụ Pọl onyeozi mkpọrọ nke mbụ ma ọ bụ nke abụọ​—⁠ikekwe n’agbata 60 na 65 O.A.

Prọfesọ Craig L. Blomberg kwetara na e dere Oziọma ndị ahụ mgbe dị anya. Ọ na-ekwu na ọbụna mgbe anyị gbakwụnyere Oziọma Jọn, bụ́ nke e dere ná ngwụsị narị afọ mbụ, “anyị ka dị nnọọ nso n’ihe omume ndị mbụ ahụ karịa ọtụtụ akụkọ ndụ nke oge ochie. Dị ka ihe atụ, mmadụ abụọ kasị bụrụ ndị mbụ kọrọ akụkọ ndụ Alexander Onye Ukwu, bụ́ Arrian na Plutarch, dere ihe n’ihe karịrị narị afọ anọ mgbe Alexander nwụsịrị na 323 B.C., ma ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme weere ha n’ozuzu dị ka ihe a pụrụ ịtụkwasị obi. Akụkọ mgbe ochie ndị na-ebu isi banyere ndụ Alexander malitere mgbe oge na-aga, ma n’ihe ka ọtụtụ n’akụkọ a malitere nanị n’ime ọtụtụ narị afọ mgbe mmadụ abụọ a na-ede ihe desịrị.” Akụkụ akụkọ ihe mere eme nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’ezie kwesịchara ma ọ dịghị ihe ọzọ iwere ha dị ka eziokwu ruo n’ókè e weere akụkọ ihe mere eme nke ụwa.

[Foto dị na peeji nke 8]

Mmadụ nile ga-ejupụta n’ọṅụ na Paradaịs elu ala ahụ na-abịanụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya