Ka Mmadụ Nile Too Jehova!
“Sọpụrụnụ Jehova n’ala ìhè nile.”—AỊSAỊA 24:15.
1. Olee otú ndị amụma Jehova si were aha ya, na-emegide omume dị aṅaa na Krisendọm taa?
JEHOVA—aha na-ede ude nke Chineke! Lee ka ndị amụma kwesịrị ntụkwasị obi nke oge ochie si nwee aṅụrị ikwu okwu n’aha ahụ! Site n’obi aṅụrị, ha toro Eze Onyenwe ha, Jehova, onye aha ya na-akọwapụta ya dị ka Onye Nzube Ukwu. (Aịsaịa 40:5; Jeremaịa 10:6, 10; Ezikiel 36:23) Ọbụnadị ndị a na-akpọ ndị amụma ndị nta jiri olu dara oké ụda nye Jehova otuto. Otu n’ime ndị a bụ Hagaị. N’akwụkwọ Hagaị, nke nanị amaokwu 38 mejupụtara, e jiri aha Chineke mee ihe ugboro 35. Amụma dị otú ahụ na-ada ka ihe na-abaghị uru mgbe e jiri utu aha ahụ bụ́ “Onyenwe anyị” dochie aha dị oké ọnụ ahịa bụ́ Jehova, dị ka ndị ozi kachasị elu nke Krisendọm na-eme ná nsụgharị Bible ha.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 11:5.
2, 3. (a) Olee otú otu amụma dị ịrịba ama gbasara mweghachi nke Israel si mezuo? (b) Ọṅụ dị aṅaa ka ndị Juu fọdụrụnụ na ndị enyi ha kerịtara?
2 N’Aịsaịa 12:2, e ji ụdị abụọ nke aha ahụ mee ihe.a Onye amụma ahụ kwupụtara, sị: “Lee, Chineke bụ nzọpụta m; m ga-atụkwasị Ya obi, ghara ịtụ egwu: n’ihi na ike m na abụ ọma m ka Ja Jehova bụ; O wee ghọọrọ m nzọpụta.” (Leekwa Aịsaịa 26:4.) Ya mere, ihe dị ka afọ 200 tupu ntọhapụ Israel site ná ndọrọ n’agha nke Babilọn, Ja Jehova site n’ọnụ Aịsaịa onye amụma ya nọ na-eme ka o doo anya na ya bụ Onye Nzọpụta ha dị ike. Ndọrọ n’agha ahụ gaje ịdị site na 607 ruo 537 T.O.A. Aịsaịa dekwara: “Mụ onwe m bụ́ Jehova, Onye na-eme ihe nile; . . . Onye ahụ Nke na-ekwu okwu banyere Saịrọs, sị, Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ m, ihe nile nke na-atọ m ụtọ ka ọ ga-emezukwa: ọbụna n’ikwu okwu banyere Jerusalem, sị, A ga-ewu ya; na n’ịsị ụlọ ukwu Chineke, A ga-atọ ntọala gị.” Ònye bụ Saịrọs a? N’ụzọ dị ịrịba ama, ọ ghọrọ Eze Saịrọs nke Peasia, onye meriri Babilọn na 539 T.O.A.—Aịsaịa 44:24, 28.
3 N’imezu okwu Jehova nke Aịsaịa dekọrọ, Saịrọs nyere Israel a dọọrọ n’agha iwu ike, sị: “Ònye nọ n’etiti unu site ná ndị Ya nile? ka Chineke ya nọnyere ya, ya rịgoruokwa Jerusalem, wuo ụlọ Jehova, bụ́ Chineke Israel, (ya onwe ya bụ Chineke,) nke dị na Jerusalem.” Ndị Juu fọdụrụnụ bụ́ ndị nwere nnukwu obi ụtọ, ha na ndị Netinim na-abụghị ndị Israel na ụmụ ndị ozi Solomọn laghachiri Jerusalem. Ha rutere n’oge ime Ememe Ụlọ Ntu na 537 T.O.A. ma chụọrọ Jehova àjà dị iche iche n’ebe ịchụàjà ya. N’afọ na-eso ya, n’ọnwa nke abụọ, ha tọrọ ntọala ụlọ ukwu nke abụọ, ka a na-enwe oké olu iti mkpu ọṅụ na otuto nye Jehova.—Ezra 1:1-4; 2:1, 2, 43, 55; 3:1-6, 8, 10-13.
4. Olee otú Aịsaịa isi nke 35 na nke 55 si mezuo?
4 Amụma mweghachi nke Jehova ga-emezu n’ụzọ dị ebube n’Israel: “Obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe na-adịghị ga-etegharịkwa egwú ọṅụ, gbawaa okooko ọhịa, dị ka rose. . . . Ndị a ga-ahụ ebube Jehova, bụ́ ịma mma nke Chineke anyị.” “N’ihi na ọṅụ ka unu ga-eji pụta, udo ka a ga-ejikwa duru unu: ugwu nile na ugwu nta nile ga-etiwa mkpu ọṅụ n’ihu unu. . . . O wee ghọọrọ Jehova aha, ghọọkwara Ya ihe ịrịba ama ebighị ebi nke a na-agaghị ebipụ ya.”—Aịsaịa 35:1, 2; 55:12, 13.
5. Gịnị mere ọṅụ Israel ji dịrị nwa mgbe?
5 Otú ọ dị, ọṅụ ahụ nọrọ nwa mgbe. Ndị agbata obi chọrọ njikọ aka nke ngwakọ okwukwe maka iwu ụlọ ukwu ahụ. Na mbụ ndị Juu ahụ jụwapụrụ isi, na-ekwu, sị: “Ọ dịghị nke anyị na unu nwekọrọ n’iwuru Chineke anyị ụlọ; kama anyị onwe anyị ga-ewukọrọ Jehova, bụ́ Chineke Israel, ụlọ, dị ka eze, bụ́ Saịrọs eze Peasia, nyere anyị iwu.” Ndị agbata obi ahụ ghọziri ndị ajọ mmegide. Ha “na-eme ka aka ndị Juda ghara ịdị ike, ha na-emekwa ka ha tụọ egwu n’iwu ụlọ.” Ha kọjọkwara ọnọdụ ahụ nye onye nọchiri Saịrọs, bụ́ Ataksakses, onye machibidoro ọrụ iwu ụlọ ukwu ahụ iwu. (Ezra 4:1-24) Ruo afọ 17 ọrụ ahụ kwụsịrị. N’ụzọ dị mwute, ndị Juu ahụ dabara n’ụzọ ndụ ịhụ ihe onwunwe n’anya n’ime oge ahụ.
“Jehova nke Usuu Nile nke Ndị Agha” Ekwuo Okwu
6. (a) Olee otú Jehova si mee ihe maka ọnọdụ dị n’Israel? (b) N’ihi gịnị ka ihe e lere anya dị ka ihe aha Hagaị pụtara ji kwesị ekwesị?
6 N’agbanyeghị nke a, Jehova gosipụtara ‘ịdị ike ya na ịdị ukwuu ya’ maka ndị Israel site n’izipụ ndị amụma, Hagaị na Zekaraịa dị ka ndị pụtakarịsịrị ìhè, ime ka ndị Juu mara ibu ọrụ ha. Aha Hagaị nwere njikọ n’ememe, n’ihi na o yiri ka ọ pụtara “A Mụrụ na Mgbe Ememe.” N’ụzọ kwekọrọ ekwekọ, o bidoro ibu amụma n’ụbọchị mbụ nke ọnwa nke Ememe Ụlọ Ntu, bụ́ oge a chọrọ n’aka ndị Juu ‘ịdị na-aṅụrị nanị ọṅụ.’ (Deuterọnọmi 16:15) Site n’ọnụ Hagaị, Jehova ziri ozi anọ n’ime oge dị ụbọchị 112.—Hagaị 1:1; 2:1, 10, 20.
7. Olee otú okwu ndị mbụ nke Hagaị kwesịrị isi gbaa anyị ume?
7 N’imeghe amụma ya, Hagaị kwuru, sị: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha kwuru, sị.” (Hagaị 1:2a) Olee ndị ka “usuu nile nke ndị agha” ahụ pụrụ ịbụ? Ha bụ ìgwè ndị mmụọ ozi Jehova, ndị a na-akpọtụ uche mgbe ụfọdụ na Bible dị ka ìgwè ndị agha. (Job 1:6; 2:1; Abụ Ọma 103:20, 21; Matiu 26:53) Ọ́ dịghị agba anyị ume taa na Eze Onyenwe anyị Jehova n’onwe ya na-eji ìgwè a a na-apụghị imeri emeri n’eluigwe eduzi ọrụ anyị nke iweghachi ezi ofufe n’ụwa?—Tụlee 2 Ndị Eze 6:15-17.
8. Echiche dị aṅaa metụtaworo Israel, gịnị sikwa n’ime ya pụta?
8 Gịnị dị n’ozi mbụ nke Hagaị? Ndị ahụ asịwo: “Oge ịbịa erughị, bụ́ oge iwu ụlọ Jehova.” Iwu ụlọ ukwu ahụ, nke na-anọchite anya mweghachi ofufe Chineke, abụghịkwa nchegbu mbụ ha. Ha atụgharịwo na-ewu ebe obibi bụ́ ịgba nye onwe ha. Echiche ịhụ ihe onwunwe n’anya abịanyụwo mmasị ha maka ofufe Jehova. N’ihi ya, e wepụwo ngọzi ya. Ubi ha adịkwaghị emepụta ihe, uwe maka mgbe oké oyi kọkwara ha. Ihe ha na-akpata adịwo ala, ọ bụkwa dị ka hà na-etinye ego n’akpa pugasịrị epu.—Hagaị 1:2b-6.
9. Ndụmọdụ dị aṅaa dị ike, na-ewuli elu, ka Jehova nyere?
9 Ugboro abụọ, Jehova nyere ndụmọdụ a dị ike: “Tụkwasịnụ obi unu n’ụzọ nile unu.” Dị ka ihe àmà na-egosi, Zerubabel, onye na-achị Jerusalem, na onye isi nchụàjà bụ́ Joshuab zaghachiri ma gbaa ndị ahụ nile ume n’obi dike ka ha “gee ntị olu Jehova, bụ́ Chineke ha, geekwa ntị okwu nile nke Hagaị, bụ́ onye amụma, dị ka Jehova, bụ́ Chineke ha, zitere ya; ndị Israel wee tụọ egwu n’ihu Jehova.” Ọzọkwa, “Hagaị, bụ́ onye ozi Jehova, wee gwa ndị Israel okwu n’ozi Jehova, sị, Mụ onwe m nọnyeere unu; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.”—Hagaị 1:5, 7-14.
10. Olee otú Jehova si were ike ya mee ihe maka Israel?
10 Ụfọdụ ndị agadi na Jerusalem pụrụ ichewo na ebube ụlọ ukwu ahụ e wughachiri ga-abụ “ihe efu” ma e were ya tụnyere ụlọ ukwu mbụ. Otú ọ dị, ihe dị ka ụbọchị 51 n’ihu, Jehova kwaliri Hagaị izi ozi nke abụọ. Ọ kpọsara: “Dị ike Zerubabel, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta); dị ike, Joshua, nwa Jehozadak, bụ́ onye isi nchụàjà; dị ike, unu ndị nile nke ala nke a, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), rụọnụ ọrụ: n’ihi na Mụ onwe m nọnyeere unu, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha pụta) . . . Unu atụla egwu.” Jehova, onye mgbe oge na-aga ga-eji ike ya pụrụ ime ihe nile mee ka ‘eluigwe na ụwa mee mkpatụ,’ hụrụ na e meriri mmegide nile, ọbụna mmachibido iwu onyeeze. N’ime afọ ise owuwu ụlọ ukwu ahụ bịara ná ngwụsị dị ebube.—Hagaị 2:3-6.
11. Olee otú Chineke si mejupụta ụlọ ukwu nke abụọ ahụ ‘n’ebube dị ukwuu karị’?
11 E mezuru otu nkwa dị ịrịba ama mgbe ahụ: “Ihe a na-achọsi ike nke mba nile ga-abịakwa, M ga-emejukwa ụlọ a n’ebube, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.” (Hagaị 2:7) “Ihe a na-achọsi ike” ndị ahụ ghọrọ ndị na-abụghị ndị Israel bịara ife ofufe n’ụlọ ukwu ahụ, ebe o gosipụtara ebube nke ọnụnọ ịdị ukwuu ya. Olee otú ụlọ ukwu a e wughachiri dị ma a tụnyere ya nke e wuru n’ụbọchị Solomọn? Onye amụma Chineke kwuru, sị: “Ebube ikpeazụ nke ụlọ a ga-adị ukwuu karịa ebube mbụ, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.” (Hagaị 2:9) Ná mmezu mbụ nke amụma ahụ, ụlọ ukwu ahụ e wughachiri nọtere aka karịa ụlọ mbụ ahụ. Ọ ka guzo mgbe Mesaịa pụtara na 29 O.A. Ọzọkwa, tupu ndị iro ya dapụrụ n’ezi ofufe emee ka e gbuo ya na 33 O.A., Mesaịa n’onwe ya wetaara ya ebube mgbe o kwusara eziokwu n’ebe ahụ.
12. Nzube dị aṅaa ka ụlọ ukwu abụọ ndị mbụ ahụ rụzuru?
12 Ụlọ ukwu mbụ na nke abụọ dị na Jerusalem jere ozi dị mkpa n’ise onyinyo akụkụ ndị dị mkpa nke ozi onye nchụàjà nke Mesaịa nakwa na n’ime ka ofufe Jehova nke dị ọcha dịgide n’ụwa ruo mpụta bụ́ ezie nke Mesaịa.—Ndị Hibru 10:1.
Ụlọ Ukwu Ime Mmụọ ahụ Dị Ebube
13. (a) Ihe ndị dị aṅaa banyere ụlọ ukwu ime mmụọ ahụ weere ọnọdụ site na 29 ruo 33 O.A.? (b) Ọrụ dị mkpa dị aṅaa ka àjà mgbapụta Jisọs rụrụ n’ihe omume ndị a?
13 Amụma mweghachi nke Hagaị ò nwere ihe pụrụ iche ọ pụtaara ndị nke oge a? O nwere n’ezie! Ụlọ ukwu ahụ e wughachiri nke dị na Jerusalem ghọrọ ebe nlekwasị anya nke ezi ofufe nile n’ụwa. Mana ọ bụ ihe atụ nke ụlọ ukwu ime mmụọ dị ebube karịa ya. Nke a malitere ọrụ na 29 O.A. mgbe, n’oge baptism Jisọs n’Osimiri Jọdan, Jehova tere Jisọs mmanụ dị ka Onyeisi Nchụàjà, mmụọ nsọ na-adakwasị ya dị ka nduru. (Matiu 3:16) Ka Jisọs jezuchara ozi elu ala ya n’ọnwụ ịchụ àjà, a kpọlitere ya gaa n’eluigwe, nke Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ nke ụlọ ukwu ahụ sere onyinyo ya, n’ebe ahụkwa o chere uru nke àjà ya n’ihu Jehova. Nke a jere ozi dị ka ihe mgbapụta, na-ekpuchi mmehie ndị na-eso ụzọ ya, wee meghee ụzọ maka ite ha mmanụ, n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., dị ka ndị nchụàjà nọ n’okpuru n’ụlọ ukwu ime mmụọ nke Jehova. Ozi ikwesị ntụkwasị obi ha ruo ọnwụ n’ogige ụlọ ukwu ahụ n’ụwa ga-eduje ná mbilite n’ọnwụ gaa eluigwe n’ọdịnihu, maka ịnọgide n’ije ozi nchụàjà.
14. (a) Ọṅụ dị aṅaa ka ya na ọrụ ịnụ ọkụ n’obi ndị Kraịst mbụ na-agakọ? (b) Gịnị mere nṅụrị ọṅụ a ji dị nwa mgbe?
14 Ọtụtụ puku ndị Juu chegharịrịnụ—e mesịakwa ndị Jentaịl—nubara n’ọgbakọ ndị Kraịst ahụ, kerekwa òkè n’ikwusa ozi ọma ịchịisi Alaeze na-abịanụ nke Chineke n’elu ụwa. Ka ihe dị ka afọ 30 gasịrị, Pọl onyeozi pụrụ ikwu na e kwusawo ozi ọma ahụ “n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.” (Ndị Kọlọsi 1:23) Ma ka ndị ozi ahụ nwụsịrị, oké ndapụ n’ezi ofufe mere, ìhè nke eziokwu malitekwa ịnyụ anyụ. Ịrọ òtù Krisendọm, nke dabeere n’ozizi na nkà ihe ọmụma ndị ọgọ mmụọ, kpuchiri ezi Iso Ụzọ Kraịst.—Ọrụ 20:29, 30.
15, 16. (a) Olee otú amụma si mezuo na 1914? (b) Nchịkọbata dị aṅaa kara ngwụsị narị afọ nke 19 na mmalite nke 20 akara?
15 Ọtụtụ narị afọ gafere. Mgbe o ruru n’afọ ndị 1870, otu ìgwè ndị Kraịst nwere obi eziokwu malitere ọmụmụ ihe miri emi nke Bible. Site n’Akwụkwọ Nsọ, o kwere ha omume ịkapị afọ 1914 ọnụ dị ka nke na-aka ọgwụgwụ nke “oge ndị mba ọzọ” akara. Ọ bụ n’oge ahụ ka “oge” asaa ihe atụ (afọ 2,520 nke ọchịchị mmadụ yiri anụ ọhịa) gwụsịrị site ná nnọkwasị n’ocheeze eluigwe nke Kraịst Jisọs—Onye “o ruuru aka” dị ka Eze Mesaịa nke elu ala. (Luk 21:24; Daniel 4:25; Ezikiel 21:26, 27) Karịsịa site na 1919 gaa n’ihu, Ndị Mmụta Bible a, ndị a maara taa dị ka Ndịàmà Jehova, anọwo na-eji ume na-agbasa ozi ọma Alaeze ahụ na-abịanụ gburugburu ụwa. Ọ bụ na 1919 ka puku ole na ole n’ime ndị a zara òkù ịrụ ọrụ ahụ bụ́ nke a kpọrọ ná mgbakọ e nwere na Cedar Point, Ohio, U.S.A. Ha rịrị elu n’ọnụ ọgụgụ ruo n’afọ 1935 mgbe mmadụ 56,153 nyere akụkọ ozi ubi. N’afọ ahụ, 52,465 keere òkè n’ihe nnọchianya nke achịcha na mmanya n’Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs a na-eme kwa afọ, si otú ahụ na-egosipụta olileanya ha nke iso Kraịst Jisọs bụrụ ndị nchụàjà n’akụkụ eluigwe nke ụlọ ukwu ime mmụọ dị ebube nke Jehova. Ha gaje isokwa ya jee ozi dị ka ndị so bụrụ eze n’Alaeze Mesaịa ya.—Luk 22:29, 30; Ndị Rom 8:15-17.
16 Otú ọ dị, Mkpughe 7:4-8 na 14:1-4 gosiri na ngụkọta ọnụ ọgụgụ ndị Kraịst a e tere mmanụ akarịghị 144,000, ndị a chịkọbatara ọtụtụ n’ime ha na narị afọ mbụ tupu oké ndapụ n’ezi ofufe ahụ amalite. Malite ná ngwụsị narị afọ nke 19 ma banye na nke 20, Jehova nọ na-achịkọbatasị ìgwè a nke ndị e ji mmiri nke Okwu ya sachaa, gụọ ná ndị ezi omume site n’okwukwe n’àjà Jisọs na-ekpuchi mmehie, n’ikpeazụkwa kaa akara dị ka ndị Kraịst e tere mmanụ iji mejupụta ọnụ ọgụgụ 144,000 ahụ zuru ezu.
17. (a) Nchịkọbata dị aṅaa gaworo n’ihu eri afọ ndị 1930? (b) N’ihi gịnị ka Jọn 3:30 ji bụrụ ihe mmasị n’ebe a? (Leekwa Luk 7:28.)
17 Gịnị ga-esochi mgbe a họrọsịworo ọnụ ọgụgụ dum nke ndị e tere mmanụ? Na 1935, ná mgbakọ dị oké mkpa e nwere na Washington, D.C., U.S.A., e mere ka a mata na “oké ìgwè mmadụ” nke Mkpughe 7:9-17 bụ ìgwè a ga-amata mgbe 144,000 ahụ “gasịrị,” bụrụkwa ndị ọdịnihu ha bụ ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. Ka ọ kọwasịrị Jisọs onye e tere mmanụ n’ụzọ doro anya, Jọn Onye Na-eme Baptism, onye mbilite n’ọnwụ ya ga-abụ n’ụwa dị ka otu n’ime “atụrụ ọzọ” ahụ, kwuru banyere Mesaịa, sị: “Ya onwe ya aghaghị ịdị na-aba ụba, ma aghaghị m ịdị na-ala ala.” (Jọn 1:29; 3:30; 10:16; Matiu 11:11) Ọrụ Jọn Onye Na-eme Baptism nke ịkwadebere Mesaịa ndị na-eso ụzọ na-akwụsị ka Jisọs na-eweghara nhọpụta nke ọnụ ọgụgụ na-arị elu ga-eso na 144,000 ahụ. N’afọ ndị 1930 ọnọdụ tụgharịrị. ‘A kpọrọ ma họpụta’ ọnụ ọgụgụ na-adalata adalata iso na 144,000 ahụ ebe ịrị elu dị ukwuu malitere n’ọnụ ọgụgụ nke “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ.” Oké ìgwè mmadụ a nọgidere na-amụba ka ajọ usoro ụwa na-abịaru ọgwụgwụ ya n’Amagedọn.—Mkpughe 17:14b.
18. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji were obi ike tụọ anya na “ọtụtụ nde ndị dị ndụ ugbu a agaghị anwụ ma ọlị”? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji jiri ịnụ ọkụ n’obi ṅaa Hagaị 2:4 ntị?
18 Ná mbido afọ ndị 1920, otu okwu ihu ọha wuru ewu Ndịàmà Jehova nyere nwere isiokwu bụ́ “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị.” Nke a pụrụ igosipụtawo nnwebiga nchekwube ókè n’oge ahụ. Ma taa a pụrụ iji obi ike zuru ezu kwuo okwu ahụ. Ma mmụba nke ìhè n’amụma Bible ma enweghị nchịkwa nke ụwa a na-anwụ anwụ na-eti mkpu na ọgwụgwụ nke usoro ihe Setan dị nnọọ ezigbo nso! Akụkọ Ememe Ncheta maka 1996 gosiri na 12,921,933 bịara, nke nanị 8,757 (.068 pasent) n’ime ha gosipụtara olileanya eluigwe ha site n’iri ihe nnọchianya ndị ahụ. Mweghachi nke ezi ofufe na-abịaru ọgwụgwụ ya. Ma ka anyị ghara ịkụda aka n’ọrụ ahụ. Ee, Hagaị 2:4 na-ekwu, sị: “Dị ike, unu ndị nile nke ala nke a, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), rụọnụ ọrụ: n’ihi na Mụ onwe m nọnyeere unu, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha pụta).” Ka anyị kpebisie ike na ọ dịghị ụdị ọ bụla nke ịhụ ihe onwunwe n’anya ma ọ bụ omume ụwa ga-akụda ịnụ ọkụ n’obi anyị maka ọrụ Jehova!—1 Jọn 2:15-17.
19. Olee otú anyị pụrụ isi kere òkè ná mmezu nke Hagaị 2:6, 7?
19 Ihe ùgwù anyị nke ikere òkè ná mmezu nke oge a nke Hagaị 2:6, 7 bụ ihe aṅụrị: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Ọ fọdụrụ otu ugbo, nwa mgbe nta ka ọ bụ, Mụ onwe m gaje ime ka eluigwe na ụwa na oké osimiri na ala kpọrọ nkụ mee mkpatụ; M ga-emekwa ka mba nile mee mkpatụ, ihe a na-achọsi ike nke mba nile ga-abịakwa, M ga-emejukwa ụlọ a n’ebube, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.” Anyaukwu, ịrụ arụ, na ịkpọasị juru ebe nile n’ụwa nke narị afọ nke 20 a. Ọ nọ n’ezie na mgbe ikpeazụ ya, Jehova amalitewokwarị ime ka o mee “mkpatụ” site n’ime ka Ndịàmà ya ‘kpọsaa ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ ya.’ (Aịsaịa 61:2) Ime mkpatụ nke a bu ụzọ ga-agwụsị ná mbibi ụwa n’Amagedọn, ma tupu oge ahụ, Jehova na-adọpụta maka ozi ya “ihe a na-achọsi ike nke mba nile”—ndị dị umeala n’obi yiri atụrụ n’ụwa. (Jọn 6:44) “Oké ìgwè mmadụ” a ‘na-efe ofufe’ ugbu a n’ogige elu ala nke ụlọ ofufe ya.—Mkpughe 7:9, 15.
20. Olee ebe a ga-achọta akụ̀ kachasị oké ọnụ ahịa?
20 Ije ozi n’ụlọ ukwu ime mmụọ Jehova na-eweta uru dị oké ọnụ ahịa karịa akụ̀ ihe onwunwe ọ bụla. (Ilu 2:1-6; 3:13, 14; Matiu 6:19-21) Ọzọkwa, Hagaị 2:9 na-ekwu, sị: “Ebube ikpeazụ nke ụlọ a ga-adị ukwuu karịa ebube mbụ, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: ọ bụkwa n’ebe a ka M ga-enye udo; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha pụta.” Gịnị ka okwu ndị a pụtaara anyị taa? Isiokwu anyị na-esonụ ga-ekwu.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E ji okwu ahụ bụ́ “Ja Jehova” mee ihe maka imesi okwu ike n’ụzọ pụrụ iche. Lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 1, peji nke 1248.
b Jeshua n’Ezra na n’akwụkwọ Bible ndị ọzọ.
Ajụjụ Maka Ntụleghachi
◻ Olee ihe nlereanya nke ndị amụma anyị kwesịrị ịgbaso n’ihe metụtara aha Jehova?
◻ Agbamume dị aṅaa ka anyị na-enweta site n’ozi dị ike nke Jehova nye Israel e weghachiri?
◻ Olee ụlọ ukwu ime mmụọ dị ebube nke na-arụ ọrụ taa?
◻ Nchịkọbata ndị dị aṅaa gaworo n’usoro na narị afọ nke 19 na nke 20, n’olileanya dị ebube dị aṅaa?
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Usuu ndị agha nke eluigwe Jehova na-eduzi ma na-akwado Ndịàmà ya n’ụwa