Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 1/1 p. 30-31
  • Ha Mere Uche Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Mere Uche Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọrụ Siri Ike
  • Ihe Mmụta Dịịrị Anyị
  • Ribeka Chọrọ Ime Ka Obi Dị Jehova Ụtọ
    Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • Ribeka Dị Njikere Ime Ihe Dị Jehova Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • “Achọrọ M Iso Ya Laa”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Ike nke Ekpere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 1/1 p. 30-31

Ịchọtara Aịsak Nwunye

Ha Mere Uche Jehova

IKE gwụsịrị agadi nwoke ahụ nọ ala n’akụkụ olulu mmiri ahụ. Ya na ndị na-ejere ya ozi tinyere camel ha iri jiri ụkwụ siterị n’ógbè Bia-sheba gaa n’ebe ugwu Mesopọtamia—ihe karịrị kilomita 800 n’ịdị anya.a Ugbu a ha ruworo ebe ha na-eje, onye njem a ike gwụsịrị kwụsịtụrụ iji tụgharịa uche n’ọrụ ya siri ike. Nwoke a bụ ònye, n’ihi gịnịkwa ka o jiworo malite njem a siri ike?

Nwoke ahụ bụ ohu Abraham, “okenye nke ụlọ ya.” (Jenesis 24:2) Ọ bụ ezie na a kpọghị ya aha n’ihe ndekọ ahụ, ma eleghị anya nke a bụ Elieza, bụ́ onye Abraham zoro aka n’ebe ọ nọ n’otu oge dị ka ‘nwa ụlọ ya’ bụ́ onye o kwukwara banyere ya dị ka onye ‘ga-enweta ihe ya.’ (Jenesis 15:2, 3) Otú ọ dị, nke ahụ bụ mgbe Abraham na Sera na-amụbeghị nwa. Ugbu a nwa ha nwoke, bụ́ Aịsak, dị afọ 40, ọ bụkwa eziokwu na Elieza agakwaghị abụ onye bụ isi ga-enweta ihe Abraham, ọ ka bụ ohu ya. Ya mere, o rubere isi mgbe Abraham rịọrọ otu arịrịọ siri ike. Gịnị ka ọ bụ?

Ọrụ Siri Ike

N’oge Abraham, alụmdi na nwunye na-emetụta ọ bụghị nanị ezinụlọ kama agbụrụ dum, ma ọ bụ ógbè ndị nna ochie. Ya mere ọ bụ omenala nye ndị mụrụ ụmụ ịhọtara ụmụ ha ndị ha ga-alụ. Otú ọ dị, n’ịchọtara nwa ya nwoke bụ́ Aịsak nwunye, Abraham chere ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme ihu. Ụzọ asọpụrụghị Chineke nke ndị Kenean bi n’ógbè ahụ mere ka ịlụ otu n’ime ha ghara ịbatatụ n’echiche. (Deuterọnọmi 18:9-12) Ọ bụkwa ezie na ọ bụ omenala bụ nwoke ịlụ nwanyị site n’agbụrụ ya, ndị ikwu Abraham bi ọtụtụ kilomita site n’akụkụ ebe ugwu Mesopọtamia. Ọ pụghị nnọọ ime ka Aịsak kwaga ebe ahụ, n’ihi na Jehova ekwelaarị Abraham nkwa, sị: “Mkpụrụ gị ka M ga-enye ala nke a,” ala Kenean. (Jenesis 24:7, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) N’ihi ya, Abraham gwara Elieza, sị: “Ọ bụ ala m na ụmụnna m ka ị ga-ejekwuru, lụtara nwa m, bụ́ Aịsak, nwunye.”—Jenesis 24:4.

Mgbe o mesịrị ogologo njem ahụ, Elieza zuuru ike n’akụkụ olulu mmiri ka ọ nọ na-atụgharị uche n’ọrụ ya. Ọ matara na n’oge na-adịghị anya ndị inyom ga-amalite ịbịa n’olulu mmiri ahụ isere mmiri maka abalị ahụ. Ya mere ọ rịọrọ Jehova, sị: “Nwa agbọghọ ahụ onye m ga-asị, Biko, zie ite gị ka m ṅụọ; onye ga-asịkwa, Ṅụọ, ọzọkwa, camel gị ka m ga-eme ka ha ṅụọ: ka ọ bụrụ nwanyị ahụ ka Ị họpụtaworo nye ohu gị, bụ́ Aịsak; ọ bụkwa n’ime nke a ka m ga-amara na I meworo onye nwe m ebere.”—Jenesis 24:14.

Mgbe ọ ka nọ na-ekpe ekpere, otu nwa agbọghọ mara mma aha ya bụ Rebeka bịara. “Biko, kwee ka m ṅụọ nwantịị mmiri site n’ite gị,” ka Elieza gwara ya. Rebeka mere otú ahụ, mgbe ahụ kwuo, sị: “Camel gị ka m ga-eserekwa mmiri, ruo mgbe ha ga-aṅụjuworị.” Nke a bụ nnọọ nkweta ime ihe siri ike, ebe ọ bụ na camel akpịrị na-akpọ nkụ pụrụ ịṅụ mmiri ruru lita 95 n’ime minit iri nanị! Ma akpịrị ọ̀ kpọruru camel Elieza nkụ otú a ma ọ bụ na ọ kpọrughị, Rebeka aghaghị ịmataworị na ozi o wepụtara onwe ya ije ga-esi ike. N’ezie, “o mee ngwa, gbapụ mmiri dị n’ite ya n’ime ihe anụ ụlọ ji aṅụ mmiri, ọ gbaa ọsọ ọzọ ruo olulu mmiri isere mmiri, wee sere nye camel ya nile.”—Jenesis 24:15-20.

N’ịghọta nduzi Jehova, Elieza nyere Rebeka otu ọla imi ọlaedo, na mgbaaka ọlaedo abụọ, nke dị ihe dị ka $1,400 n’ọnụ ahịa nke taa. Mgbe Rebeka gwara ya na ya bụ nwa nwa Nehoa, nwanne nwoke Abraham, Elieza kpegaara Chineke ekpere ekele. “Jehova [eduworo] m ruo ụlọ ụmụnne onye nwe m,” ka o kwuru. (Jenesis 24:22-27) A kpọọrọ Elieza bịa n’ezinụlọ Rebeka. Ka oge na-aga, Rebeka ghọrọ nwunye Aịsak, o nwekwara ihe ùgwù nke ịghọ nne nne nke Mesaịa ahụ, bụ́ Jisọs.

Ihe Mmụta Dịịrị Anyị

Jehova gọziri mgbalị Elieza ji ekpere mee iji chọtara Aịsak nwunye na-atụ egwu Chineke. Otú ọ dị, cheta na e jikọtara kpọmkwem alụmdi na nwunye Aịsak na nzube Chineke iwepụta otu mkpụrụ site n’Abraham. Ya mere ihe ndekọ a ekwesịghị ime ka anyị kwubie na onye ọ bụla nke na-ekpe ekpere maka onye òtù ọlụlụ ga-enweta otu n’ụzọ ọrụ ebube. Ma, ọ bụrụ na anyị arapagidesie ike n’ụkpụrụ Jehova, ọ ga-enye anyị ume iji tachie obi n’ihe ịma aka ndị ya na ọnọdụ nke ọ bụla ná ndụ na-eso—alụmdi na nwunye ma ọ bụ alụghị di ma ọ bụ nwunye.—1 Ndị Kọrint 7:8, 9, 28; tụlee Ndị Filipaị 4:11-13.

Elieza aghaghị itinye mgbalị dị ukwuu iji mee ihe n’ụzọ nke Jehova. Anyị onwe anyị kwa pụrụ ịchọpụta na irube isi n’ụkpụrụ Jehova anaghị adị mfe mgbe nile. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ isi ike ịchọta ọrụ nke na-adịghị egbochi ihe omume ọchịchị Chineke, di ma ọ bụ nwunye na-atụ egwu Chineke, ndị enyi na-ewuli elu, ntụrụndụ nke na-arụghị arụ. (Matiu 6:33; 1 Ndị Kọrint 7:39; 15:33; Ndị Efesọs 4:17-19) Ma, Jehova pụrụ ịkwagide ndị jụrụ imebi ụkpụrụ Bible. Bible na-ekwe nkwa, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi.”—Ilu 3:5, 6.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’ịtụle ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ nke camel, ọ pụrụ iweworị ihe karịrị ụbọchị 25 iji mesịa njem ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya