Ndị Ozi nke Udo Chineke Ezukọọ
“MGBAKỌ distrikti ọ bụla anyị gaworo ewuliwo anyị elu,” ka otu okenye bụ́ onye Kraịst sitere United States na-ekwu. “Ma, a pụghị nnọọ ịkọwa afọ a. Anyị hapụrụ ụbọchị ọ bụla na-eche otú echi ga-esi gafee atụmanya anyị, e mechughịkwa anyị ihu!”
Ọ bụrụ na ị gara otu n’ime Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke,” ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-ekwenyere onye a gara mgbakọ nke nwere ịnụ ọkụ n’obi. Ụbọchị ọ bụla nke mgbakọ ahụ lekwasịrị anya n’akụkụ dị iche nke ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ dị ka ndị ozi Chineke. Ka anyị tụleghachi usoro ihe omume ụbọchị atọ ahụ.
“Lee, Ka Ha Si Maa Mma nke Ukwuu . . . Onye Na-eme Ka A Nụrụ Okwu Udo”
Nke a bụ isiokwu nke ụbọchị mbụ nke mgbakọ ahụ. Ọ dabeere n’Aịsaịa 52:7. N’oge ndị a siri ike, ọtụtụ na-ejere Jehova ozi n’okpuru ọnọdụ ndị na-ama aka. Okwu bụ́ “Ịnụrụ Site n’Ọnụ Ndị Ji Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-akpọsa Udo” gụnyere ịgba ụfọdụ ndị a kwesịrị ntụkwasị obi ajụjụ ọnụ. Ịnụrụ okwu nke onwe ha bụ n’ezie ihe na-agba ume, e sikwa otú a mesie ndị bịara mgbakọ obi ike na Jehova pụrụ iwusikwa ha ike, ọbụna na-enye “ọkịka nke ike” iji nyere ha aka ịtachi obi.—2 Ndị Kọrint 4:7.
Ihe Jehova chọrọ adịghị arọ. (1 Jọn 5:3) E mere ka nke a doo anya n’okwu ikpeazụ nke usoro ihe omume ụtụtụ, nke bịara ná njedebe ná mwepụta nke broshuọ dị peji 32 a kpọrọ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Ihe ọhụrụ a na-enye aka ịmụ ihe nke e sere ihe ndị mara mma ga-ekere òkè dị mkpa n’inyere ọtụtụ ndị ọzọ aka ịmụta nzube Chineke. Okwu banyere iji mbipụta ọhụrụ a eme ihe dị n’isiokwu ikpeazụ dịịrị ọmụmụ na magazin a nakwa na peji nke 16 na 17.
Okwu bụ́ “Ịtachi Obi n’Ezi Ọrụ” mesiri ike na Jehova maara ule anyị nke ọma. Ịtachi obi pụtara na anyị ga-akwụsi ike ma ghara ịbụ ndị na-enweghị olileanya. Jehova enyewo anyị Okwu ya, mmụọ ya, na nzukọ ya inyere anyị aka. Ọ na-ewe ntachi obi ime nkwusa, ma ime nkwusa na-enyere anyị aka ịtachi obi, n’ihi na ọ na-eme ka okwukwe anyị dịgide ndụ. N’ịbụ ndị nọ nso n’ebe mgbaru ọsọ, anyị ekwesịghị ikwe ka nsogbu anyị menyụọ ịnụ ọkụ n’obi anyị, n’ihi na nanị ndị nwere ntachi obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.—Matiu 24:13.
Okwu bụ isi, “Ọrụ Anyị Dị Ka Ndị Ozi nke Udo Chineke,” kpọtụrụ uche ná ntọhapụ nke ndị Juu a dọọrọ n’agha site na Babilọn nakwa mweghachi nke ofufe dị ọcha na Jerusalem na 537 T.O.A. Ọkà okwu ahụ kọwara na ihe omume a bụ nanị ihe atụ nke ihe Alaeze Chineke ga-emezu n’isi nso n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ. (Abụ Ọma 72:7; Aịsaịa 9:7) Ọrụ anyị nwere ugbu a bụ ikwusa ozi ọma banyere Alaeze a na ibi ndụ kwekọrọ n’ozi ahụ. Ịhụnanya maka Chineke na agbata obi kwesịrị ịkpali anyị ịnọgide n’ọrụ a n’esepụghị aka.—Ọrụ 5:42.
Ihe pụtara ìhè n’usoro ihe omume Friday bụ usoro isiokwu bụ́ “Kpachara Anya Maka Ọnyà Ndị Zoro Ezo nke Ntụrụndụ.” Egwú, ihe nkiri sinima, ihe nkiri vidio, ihe ngosi telivishọn, egwuregwu vidio, akwụkwọ, magazin, na ihe ndị na-atọ ọchị nke taa na-egosikarị echiche ndị mmụọ ọjọọ. Ya mere, ọ dị anyị mkpa ‘ịkpọ ajọ ihe asị’ ma “na-arapara ezi ihe n’ahụ.” (Ndị Rom 12:9) Ee, anyị aghaghị iwere ntụrụndụ rụrụ arụ dị ka ihe a ga-akpọ asị ma zere ya, ka anyị na-atụkwasị uche n’ihe ndị dị ọcha, dị mma, ma kwesị otuto. (Ndị Filipaị 4:8) Mbipụta na ngwá ọrụ e ji eme nnyocha nke nzukọ Jehova wepụtara na-eji echiche ndị na-ewuli elu na-akpali uche anyị ma na-azụ anyị ịmata ezi ihe na ihe ọjọọ. (Ndị Hibru 5:14) Anyị kwesịrị ịrapara ndokwa ndị a n’ahụ dị ka anyị ga-eme ihe nkwado sara mbara n’oké osimiri na-adịghị jụụ.
Okwu ọzọ sochiri bụ “Guzogide Ekwensu—Anabatala Ihe Ọjọọ.” Nwa ntakịrị oge tupu ha achọọ ịbanye n’Ala Nkwa ahụ, omume rụrụ arụ matara ọtụtụ puku ndị Israel n’ọnyà. Fineas anabataghị ihe ọjọọ n’ebe ezi ofufe ahụ dị. O mere ihe ngwa ngwa megide ndị mere ihe ọjọọ, ofufe ya a na-ekewaghị ekewa masịkwara Jehova. (Ọnụ Ọgụgụ 25:1-13) Ihe mgbaru ọsọ Setan bụ ime ka onye ọ bụla n’ime anyị ghara iru eru ịbanye n’ụwa ọhụrụ Chineke. Ya mere, dị ka Fineas, anyị aghaghị iguzogide mgbalị Ekwensu imerụ anyị. Ma anyị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na anyị alụbeghị, anyị aghaghị ‘ịgbanarị ịkwa iko.’—1 Ndị Kọrint 6:18.
“Iji Ịnọgidesi Ike n’Ihe Na-akwado Izi Ezi nke Okwu Chineke” bụ okwu mmechi nke ụbọchị mbụ nke mgbakọ ahụ. Ọtụtụ ndị nsụgharị na-agbanwe ma ọ bụ na-ewepụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, iji mee ka obi tọọ ndị na-akwado ihe ndị ruuru ụmụ nwanyị ụtọ, ndị nsụgharị nke The New Testament and Psalms: An Inclusive Version na-ezo aka n’ebe Chineke nọ, ọ bụghị dị ka Nna, kama dị ka Nna-Nne nakwa n’ebe Jisọs nọ dị ka “Onye Bụ Mmadụ” kama ịbụ “Nwa nke mmadụ.” N’ụzọ dị iche, New World Translation rapasiiri nnọọ ike n’ihe odide e ji asụsụ mbụ dee nke na o nyewo aka ime ka echiche anyị doo anya n’ọtụtụ ihe metụtara Akwụkwọ Nsọ. Dị ka ihe atụ, ọkà okwu ahụ sịrị: “Ọ bụ nsụgharị ziri ezi dị na New World Translation nyere ihe ndabere maka anyị ịhazigharị ọgbakọ site n’ịhọpụta òtù ndị okenye, n’ikwekọkwu n’usoro e setịpụrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst narị afọ mbụ.” Anyị na-egosipụta iguzosi ike n’ihe anyị nye Okwu Chineke site n’ịgụ ya kwa ụbọchị nakwa site n’itinye ndụmọdụ ya n’ọrụ. Ọkà okwu ahụ sịrị: “Anyị na-egosi na anyị bụ ndị nkwado na-eguzosi ike n’ihe nke Okwu Chineke site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusara ya ndị ọzọ na site n’iji nlezianya jiri ya eme ihe ka anyị na-akụziri ndị ọzọ ihe, n’agbalịghị mgbe ọ bụla ime ka o kwekọọ n’echiche anyị site n’ịgbagọ ma ọ bụ itinye ihe n’ihe ọ na-ekwu.”
‘Udo nke Chineke Kachasị Uche Nile’
Isiokwu a, nke dabeere ná Ndị Filipaị 4:7, kwadebere ọnọdụ maka ụbọchị nke abụọ nke mgbakọ ahụ. Ihe dị ukwuu n’ihe ọmụma e nyere metụtara echiche kwesịrị ekwesị nke ozi, ezinụlọ, nraranye, na akụkụ nke ndụ mmadụ na-adị kwa ụbọchị.
Mgbe a tụlesịrị ihe mmụta dịịrị ụbọchị, e kwuru usoro isiokwu nke a kpọrọ “Ndị Ozi Na-eweta Ozi Ọma nke Udo.” Ozi anyị bụ nke udo, e kwesịkwara izi ya n’ụzọ udo. (Ndị Efesọs 6:15) Nzube anyị bụ irite obi, ọ bụghị imeri n’arụmụka. Ọzụzụ na mbipụta ndị anyị na-enweta site n’aka nzukọ Jehova na-enyere anyị aka ime nnọọ nke ahụ. Anyị ekwesịghị ikwe ka enweghị mmasị ma ọ bụ omume ọ gbasara m kụda anyị aka. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịnọgide “na-anụ ọkụ n’obi,” na-enwe usoro ọmụmụ ihe onwe onye dị mma, ịga nzukọ, na ikere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ. (2 Timoti 2:15) Ihe a na-agaghị eleghara anya bụ imere ndị ọzọ ihe ọma, karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ. (Ndị Galetia 6:10) N’ezie, anyị ịnụ ọkụ n’obi apụtaghị ịrụnye onwe anyị ike ọgwụgwụ n’ahụ. Ihe onye nke ọ bụla pụrụ ime dị ka ikike na ọnọdụ nke ya si dị bụ ihe Jehova na-anakwere.
Ndị Chineke na-enye oge, ike, na ihe onwunwe ha iji mee ka ọdịmma Alaeze na-aga n’ihu. Okwu bụ́ “Iji Obi Ụtọ Na-enye Ihe n’Ime Nzukọ Jehova” kwuru na ka ndị yiri atụrụ na-anabata ozi Alaeze ahụ, e nwekwuru mkpa maka ngwá ọrụ, ebe nzukọ, na ihe owuwu alaka. Onyinye anyị na-eme ka nzukọ a nwee ike inwe ihe ọ bụla dị ya mkpa iji rụzuo ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ. Inye ihe ná mmesapụ aka na-asọpụrụkwa Jehova ma na-ewetara onye na-enye ya ọṅụ. Ya mere, dị ka ndị Kraịst, anyị agaghị eleghara akụkụ a dị mkpa nke ofufe anyị anya ma ọlị.—2 Ndị Kọrint 8:1-7.
Ihe mechiri nnọkọ ụtụtụ bụ okwu baptism—ihe na-apụta ìhè ná nzukọ buru ibu nke Ndịàmà Jehova mgbe nile. Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ ka ndị ọhụrụ raara onwe ha nye na-agbaso nzọụkwụ Jisọs site n’ikwe ka e mee ha baptism ime mmiri! (Matiu 3:13-17) Ndị nile weere nzọụkwụ a abụrụwo ndị e ziri ihe n’isi iyi nke amamihe kasị ukwu—Bible. Ọzọkwa, ha achọtawo ezi nzube ná ndụ, e jikwa udo nke na-abịa site n’ịmara na ha na-eme ihe ziri ezi gọzie ha.—Eklisiastis 12:13.
E nyere ndụmọdụ a kapịrị ọnụ n’okwu bụ́ “Kwee Ka Nghọta Chebe Gị.” Nghọta dị oké mkpa n’ihe metụtara mmekọrịta azụmahịa. Anyị ekwesịghị ime ihe azụmahịa onwe onye n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, anyị ekwesịghịkwa irigbu ndị Kraịst ibe anyị maka uru ego. (Tụlee Jọn 2:15, 16.) Nghọta dịkwa mkpa mgbe a na-etinye ego n’azụmahịa ma ọ bụ mgbe a na-agbaziri ma ọ bụ na-agbazinye ego. “Ndakpọ nke atụmatụ azụmahịa n’etiti ndị Kraịst edujewo ná ndakpọ olileanya na ọbụna mfu nke ọnọdụ ime mmụọ n’akụkụ nke ụfọdụ bụ́ ndị ji ọsọ maba n’atụmatụ inwe ego dị ize ndụ,” ka ọkà okwu ahụ kwuru. Ọ bụ ezie na ọ dịghị njọ ndị Kraịst ịzụrịta ahịa, mkpachara anya bụ ihe amamihe n’ezie. Mgbe mmadụ abụọ mekwara nkwekọrịta azụmahịa, e kwesịrị ide ihe ndị ahụ e kwekọrịtara ede mgbe nile.
A tụlere ụkpụrụ Chineke maka ndị nwoke na ndị nwanyị n’okwu bụ́ “Nwoke na Nwanyị Ka O Kere Ha.” A gwagbuwo ibu ọrụ nke ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị n’akụkọ ihe mere eme nile. “Ọtụtụ na-eji ihie ụzọ eji ịbụ nwoke atụnyere ịbụisi obi ọjọọ, ịdị aka ike, ma ọ bụ ịdị oké mkpa nke ndị ikom,” ka ọkà okwu ahụ kwuru. “N’ọdịbendị ụfọdụ ọ na-adị ụkọ, ọbụna bụrụ ihe ihere, ka nwoke bee ákwá n’ihu ọha ma ọ bụ ọbụna ná nzuzo. Ma, Jọn 11:35 na-akọ na mgbe ọ nọ n’etiti ìgwè mmadụ n’èzí ili Lazarọs, ‘anya mmiri pụrụ n’anya Jisọs.’” Gịnị banyere ụmụ nwanyị? A na-ewerekarị ịbụ nwanyị dị ka ihe ya na ndọrọ nke anụ ahụ bụ otu ihe ahụ. Ma ọkà okwu ahụ jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na nwanyị mara mma ma ezi uche akọọ ya, ọ bụrụkwa onye na-arụkarị ụka, na-eme akaje, ma ọ bụ dị mpako, ọ̀ pụrụ n’ezie ịma mma n’ezi echiche nke okwu ahụ, bụrụ nwanyị n’eziokwu?” (Tụlee Ilu 11:22; 31:26.) N’okwu, àgwà, na ejiji ha, ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst na-agbalị ịgbaso ụkpụrụ Bible. Ọkà okwu ahụ sịrị: “Nwoke nke na-egosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ dị mfe ịkwanyere ùgwù, nwanyị kwa nke na-eme otú ahụ dị mfe ịhụ n’anya.”—Ndị Galetia 5:22, 23.
Usoro isiokwu bụ́ “Chineke nke Udo Na-elekọta Gị” sochiri. Ọtụtụ ndị Kraịst nwere nchegbu ego. Ka o sina dị, Jehova na-ekwe nkwa, sị: “M gaghị aha gị aka ma ọlị, M gaghị ahapụkwa gị ma ọlị.” (Ndị Hibru 13:5) N’agbanyeghị ihe isi ike akụ̀ na ụba, ụfọdụ egosiwo obi ike ná nkwa a site n’ịbanye n’ozi ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ nke oge nile. Ndị ọzọ na-apụghị ịsụ ụzọ ugbu a na-etinye ọdịmma Alaeze n’ọnọdụ mbụ site n’iji ohere ọ bụla gbaa àmà. (Matiu 6:33) A na-aja ụdị mgbalị ahụ nile mma! Nzukọ Jehova ewepụtawo ọtụtụ mbipụta iji nyere anyị aka n’ozi anyị nakwa iji nyere anyị aka ịnagide nsogbu anyị. Ọ bụrụ na anyị egosi ekele maka ndokwa ime mmụọ Jehova nile, ọ ga-eji udo gọzie anyị n’oge a nke ọgba aghara akụ̀ na ụba.—Abụ Ọma 29:11.
Ná mmechi nke okwu ikpeazụ nke ụbọchị ahụ, bụ́ “Chụsoo Udo Chineke n’Ime Ndụ Ezinụlọ,” ndị bịara mgbakọ nwere obi ụtọ ịnata akwụkwọ ọhụrụ ahụ, bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. “Jiri nlezianya mụọ akwụkwọ a n’onwe gị na dị ka ìgwè ezinụlọ,” ka ọkà okwu ahụ gbara ume ya. “Jiri ezi obi gbalịa itinye ndụmọdụ ya dabeere na Bible n’ọrụ, ị ga-ejidekwa n’aka ime ka udo na obi ụtọ nke ezinụlọ gị rịa elu.”
‘Idebe Ịdị n’Otu n’Ime Ihe Nkekọ nke Bụ́ Udo’
N’ịbụ nke dabeere ná Ndị Efesọs 4:3, nke a bụ isiokwu dabara adaba maka ụbọchị ikpeazụ nke mgbakọ ahụ. Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị e si na mba nile nke ụwa nweta, abụrụwo ndị Chineke ziri ihe. Ya mere, ha hụrụ udo n’anya. Ha na-agbaso ihe nlereanya Jisọs ma na-agbalị “idebe ịdị n’otu nke Mmụọ Nsọ n’ime ihe okike nke bụ́ udo.”
E mere ka udo nke na-erugharị na nzukọ Chineke pụta ìhè n’usoro isiokwu bụ́ “Ịmata Ụdị Ndị Ozi Bụ Ndị Ọma Ya.” Ndị amụma ụgha dịrị n’Israel oge ochie. Otú ọ dị, ezi ndị ozi Chineke—dị ka Aịsaịa, Ezikiel, na Jeremaịa—n’ụzọ ziri ezi buru amụma ọdịda nke Jerusalem, oge ndọrọ n’agha, na ntọhapụ nke ndị Chineke n’ikpeazụ. Ọnọdụ yiri ya dị taa. Ndị ozi ụgha juru eju n’ógbè ndọrọ ndọrọ ọchịchị na okpukpe ụgha. Ma, Jehova ewepụtawo Ndịàmà ya ịkpọsa nzube ya n’ihe banyere usoro ihe a. Karịsịa kemgbe 1919, e jiriwo ndị ohu Jehova kpọsaa ozi Chineke. Lee ka ha si dị iche n’ebe ndị ozi ụgha nke Krisendọm nọ! Ka anyị jiri ịdị uchu kere òkè anyị n’ọrụ a ruo mgbe Jehova sịrị na a rụzuwo ya.
Okwu bụ́ “Gee Ntị ma Rubere Okwu Chineke Isi” mesiri ike na Akwụkwọ Nsọ bụ isi iyi kasịnụ nke nduzi, nkasi obi, na olileanya. (Aịsaịa 30:20, 21; Ndị Rom 15:4) Ụwa nke taa na-abawanye ụba n’ime ihe masịrị onye. Ya mere dị ka ọ na-adịtụbeghị, ọ dị anyị mkpa ige ntị ná ndụmọdụ nke na-abịa site n’Okwu na nzukọ Chineke. Jehova maara adịghị ike anyị, n’Okwu ya kwa o setịpụwo n’ụzọ doro anya ụzọ nke ga-abara anyị uru. Ịmara na Jehova kwụ anyị n’azụ na-enye anyị obi ike ịga n’ihu n’ihe ọ bụla ọ chọrọ anyị n’aka.
Nke a kwadebere ọnọdụ maka ihe nkiri sochirinụ nke e ji ejiji zuru ezu mee. Isiokwu ya bụ “N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Kwanyere Ndokwa Ọchịchị Chineke Ùgwù?” N’iji akụkọ Bible banyere Gideọn mere ihe ndabere, ihe ngosi a mesiri ike ihe mmụta siri ike—anyị aghaghị ịgbaso ntụziaka Chineke, gharakwa iji echiche onwe anyị dochie ha ma ọ bụ nwaa izere ndụmọdụ ọchịchị Chineke.
Okwu ihu ọha bụ n’isiokwu bụ́ “Ezi Udo n’Ikpeazụ!—Site n’Olee Ebe?” Udo nke Chineke na-ekwe nkwa ya gabigara ihe ọ bụla nke ụwa a pụrụ iche n’echiche. “Ezi udo pụtara udo kwa ụbọchị,” ka ọkà okwu ahụ kwuru. “Udo Chineke pụtara ụwa nke ọrịa, ahụ mgbu, iru újú, na ọnwụ na-adịghị.” Bible na-agwa anyị na Jehova “na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.” (Abụ Ọma 46:9) Olee otú ọ ga-esi eme nke a? Site n’iwepụ onye ahụ na-akpasu agha, Setan bụ́ Ekwensu. (Mkpughe 20:1-3) Nke a ga-emeghe ụzọ maka ndị dị umeala n’obi ‘inweta ala, ịba ụba nke udo atọọkwa ha ụtọ.’—Abụ Ọma 37:11.
N’isochi nchịkọta isiokwu dịịrị ọmụmụ nke Ụlọ Nche maka izu ahụ, e kwuru okwu ikpeazụ maka mgbakọ ahụ. N’ịbụ nke isiokwu ya bụ “Ịga n’Ihu Dị Ka Ndị Ozi nke Udo Chineke,” okwu a na-akpali akpali mesiri ike na ọrụ nkwusa anyị bụ ma nke pụrụ iche ma nke dị ngwa. Ugbu a abụghị oge ịtụsara ahụ, igbu oge, ma ọ bụ ịlaghachi n’echiche ndị na-ezighị ezi. E jiriwo ihe ndị dị anyị mkpa kwadebe anyị—ozi Chineke, mmụọ nsọ ya, na ọtụtụ ndokwa ndị na-abịa site ná nzukọ ọchịchị Chineke nke na-ahụ n’anya. Ya mere, dị ka ndị ohu Jehova, ka anyị nọgide na-aga n’ihu dị ka ndị ozi nke udo Chineke!
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 9]
Ndokwa Ịhụnanya Maka Ezinụlọ Dị Iche Iche
Ndị nọ na-ege ntị n’ụbọchị nke abụọ nke Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke” nwere obi ụtọ ịnata mbipụta ọhụrụ ahụ isiokwu ya bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. Akwụkwọ a nwere ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ nke ga-abara ezinụlọ nile hụrụ Chineke n’anya uru.
Otu onye okenye sitere Connecticut, U.S.A., na-ekwu, sị: “Na June 15, anyị natara akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ nke anyị. Ka ọ na-erule June 16, agụwo m ya ọkara. Na 17, anyị nwere ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị mbụ n’ime ya, a gbakwara anyị ume nke ukwuu! N’otu ụbọchị ahụ, agụchara m akwụkwọ ahụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na mbipụta ọma a ga-aghọ ihe dị oké ọnụ ahịa nye ndị nile ga-eji ya eme ihe. Izi ezi na ihe ọmụma kwesịrị oge a nke akwụkwọ ahụ na-enyekwu ihe àmà na ‘ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche’ na-enye ‘nri n’oge ya,’ ọ makwaara nke ọma ihe na-akpa anyị n’oge ndị a siri ike.”—Matiu 24:45-47.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ma ndị na-eto eto ma ndị agadi chọchara ịmara ihe Chineke na-achọ