Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 2/1 p. 24-28
  • Ọnọdụ Egwú n’Ofufe nke Oge A

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọnọdụ Egwú n’Ofufe nke Oge A
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọnọdụ Akụkọ Ihe Mere Eme nke Egwú n’Ofufe
  • Ịbụ Abụ nke Ndị Kraịst Narị Afọ Mbụ
  • Mmetụta nke Ofufe Ụgha
  • Iweghachi Egwú n’Ọnọdụ Ya Kwesịrị Ekwesị n’Ofufe
  • ‘Ịbụ Abụ n’Obi Anyị Nye Jehova’
  • Bụkuonụ Jehova Abụ
  • Jirinụ Ọṅụ Na-abụku Jehova Abụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Bụkuo Jehova Abụ Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Bụkuo Jehova Abụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Egwú Ndị Na-eme Chineke Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 2/1 p. 24-28

Ọnọdụ Egwú n’Ofufe nke Oge A

ỊBỤ abụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke. Iweli olu anyị n’abụ pụrụ iwetara anyị na Onye Okike anyị obi ụtọ. Site na ya, anyị pụrụ igosipụta mmetụta uche anyị, ma iru újú ma ọṅụ. Ọbụna karị, anyị pụrụ ikwupụta ịhụnanya, oké nsọpụrụ, na otuto anyị maka Onye Malitere abụ, bụ́ Jehova.

Ihe ka ọtụtụ n’ime ihe dị ka izo aka narị atọ e mere n’ebe egwú dị na Bible metụtara ife Jehova ofufe. E jikọtakwara ọṅụ na ịbụ abụ—ọ bụghị nanị ọṅụ nke ndị na-abụ abụ kama ọṅụ n’akụkụ nke Jehova n’otu aka ahụ. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ka ha . . . bụkuo Ya abụ ọma. N’ihi na ihe ndị Ya na-atọ Jehova ụtọ.”—Abụ Ọma 149:3, 4.

Ma olee ókè ịbụ abụ dị mkpa n’ofufe oge a? Olee otú ndị Jehova taa pụrụ isi mee ihe na-atọ ya ụtọ site n’iweli olu ha n’abụ? Ọnọdụ dị aṅaa ka egwú kwesịrị inwe n’ezi ofufe? Inyocha akụkọ ihe mere eme nke egwú n’ofufe ga-enye aka zaa ajụjụ ndị a.

Ọnọdụ Akụkọ Ihe Mere Eme nke Egwú n’Ofufe

Izo aka mbụ e zoro na Bible n’ebe egwú dị enweghị njikọ kpọmkwem n’ebe ofufe nke Jehova dị. Na Jenesis 4:21, e kwuru na ọ bụ Jubal mere ihe nwere ike ịbụ mmepụta mbụ nke ngwá egwú ma ọ bụ ma eleghị anya nguzobe nke ụdị ụfọdụ nke iji egwú mere ọrụ. Otú ọ dị, egwú bụ otu akụkụ nke ofufe Jehova ọbụna tupu e kee mmadụ. Ọtụtụ nsụgharị Bible na-akọwa ndị mmụọ ozi dị ka ndị na-abụ abụ. Job 38:7 na-akọ banyere ndị mmụọ ozi iti mkpu ọṅụ na ‘itisi mkpu ọṅụ ike.’ N’ihi ya, e nwere ihe sitere n’Akwụkwọ Nsọ mere a ga-eji kwere na ịbụ abụ n’ofufe a na-enye Jehova bụ ihe a na-eme ogologo oge tupu e kee mmadụ.

Ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme arụwo ụka na egwú Hibru oge ochie bụ nanị uri olu ụtọ, n’enweghị nkwekọ ụda na-enye nkwado. Ma, a pụrụ ịkpọ ihe karịrị otu akara ụda egwú n’otu mgbe n’ụbọ akwara, bụ́ ngwá egwú a kpọtụrụ aha karịsịa n’ime Bible. Ndị na-akpọ ụbọ akwara aghaghị ịghọtaworị nkwekọ ụda a pụrụ inweta site n’ijikọta ụda egwú ndị dị ná ngwá egwú ahụ. Kama ịbụ ihe mgbe ụwa nọ n’ìsì, e nweghị obi abụọ na egwú ha bụ nnọọ nke dị elu. Ọ bụrụkwa na e jiri uri na okwu nke Akwụkwọ Nsọ Hibru tụọ ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, anyị pụrụ ikwubi na egwú ndị Israel dị mma nke ukwuu. N’eziokwu, mkpali e nwere maka ịchịkọba egwú dị nnọọ elu karịa nke mba ndị agbata obi ha.

Nhazi ụlọ nsọ oge ochie ahụ mere ka e nwee ndokwa dị mgbagwoju anya nke ngwá egwú na olu dị iche iche n’ofufe ụlọ nsọ ahụ. (2 Ihe Emere 29:27, 28) E nwere “ndị isi nke ndị abụ,” “ndị nwere nghọta,” ‘ndị a na-ezi ihe,’ na ‘ndị isi nke ndị ọbụ abụ.’ (1 Ihe Emere 15:21; 25:7, 8; Nehemaịa 12:46) N’ikwu banyere nkà dị elu nke egwú ha, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Curt Sachs dere, sị: “Ndị ukwe na ìgwè ndị egwú e jikọtara ha na Ụlọ Nsọ dị na Jerusalem na-egosi ụkpụrụ dị elu nke mmụta egwú, nkà, na ihe ọmụma. . . . Ọ bụ ezie na anyị amaghị otú egwú oge ochie ahụ si ada, anyị nwere ihe àmà zuru ezu banyere ike, ịdị elu, na nke e ji nkà kụọ.” (The Rise of Music in the Ancient World: East and West, 1943, peji nke 48, 101-102) Abụ nke Abụ bụ ihe atụ nke nkà na ịdị mma nke ịrọ̀ egwú n’asụsụ Hibru. Ọ bụ akụkọ n’egwú, nke yiri akụkụ ihe odide nke egwú opera. A kpọrọ egwú ahụ n’akụkụ ihe odide Hibru dị ka “Abụ nke Abụ Solomọn,” ya bụ, abụ kasị mma. Nye ndị Hibru oge ochie, ịbụ abụ bụ akụkụ dị mkpa nke ofufe. Ọ na-emekwa ka e nwee ngosipụta mmetụta uche dị mma n’otuto ha na-enye Jehova.

Ịbụ Abụ nke Ndị Kraịst Narị Afọ Mbụ

Egwú nọgidere bụrụ akụkụ chiri anya nke ofufe n’etiti ndị Kraịst oge mbụ. Tụkwasị n’inwe Abụ Ọma ndị sitere n’ike mmụọ nsọ, o yiri ka ha rọrọ egwú na okwu abụ dị iche iche maka ofufe, na-esetịpụ ihe nlereanya maka ịrọ̀ abụ ndị Kraịst nke oge a. (Ndị Efesọs 5:19) Akwụkwọ bụ́ The History of Music, nke Waldo Selden Pratt dere, na-akọwa, sị: “Ịbụ abụ n’ofufe ihu ọha na nke onwe onye bụ omenala ndị Kraịst oge mbụ. Nye ndị Juu a tọghatara, nke a bụ iji omenala ụlọ nzukọ gaa n’ihu . . . Tụkwasị n’Abụ Ọma ndị Hibru . . . , okpukpe ọhụrụ ahụ yiri ka ha wepụtara abụ ọhụrụ ọtụtụ ugboro, ikekwe na mbụ, n’ụdị nke nhazi egwú rhapsody.”a

N’ime ka abamuru nke ịbụ abụ pụta ìhè, mgbe Jisọs guzobere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, ikekwe ya na ndị ozi ahụ bụrụ abụ Hallel. (Matiu 26:26-30) Ndị a bụ abụ otuto nye Jehova, ndị e dekọrọ n’Abụ Ọma ma bụọ n’ihe metụtara Ememe Ngabiga.—Abụ Ọma 113-118.

Mmetụta nke Ofufe Ụgha

Ka ọ na-erule n’oge ahụ a na-akpọkarị Oge Ụwa Nọ n’Ìsì, e mere ka egwú okpukpe ghọzie nanị ákwá iru újú. N’ihe dị ka 200 O.A., Clement nke Alexandria sịrị: “Otu ngwá ọrụ dị anyị mkpa: okwu udo nke inye otuto, ọ bụghị ụbọ akwara ma ọ bụ ịgba ma ọ bụ ọja ma ọ bụ opi dị iche iche.” E nyere ọtụtụ mmachibido, na-akpara egwú chọọchị ókè ka ọ bụrụ nke e ji olu agụ. A bịara mara ụdị a dị ka ukwe ma ọ bụ abụ okpukpe. “Ihe na-erughị afọ iri anọ mgbe e wusịrị Constantinople, Kansụl nke Leọdisia (A.D. 367) machibidoro nkere òkè nke ma ngwá egwú ma nke ọgbakọ n’ihe omume okpukpe. Egwú okpukpe ọdịnala abụrụwo nanị nke e ji olu agụ,” ka akwụkwọ bụ́ Our Musical Heritage na-ekwu. (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ihe mgbochi ndị a enweghị ndabere n’Iso Ụzọ Kraịst oge mbụ.

N’Oge Ụwa Nọ n’Ìsì, Bible bụ ihe a na-amaghị ama nye ndị nkịtị. A na-akpagbu na ọbụna na-egbu ndị Kraịst nwara inwe Bible ma ọ bụ ịgụ ya. Mgbe ahụ, o jughị anya na ihe omume nke ịbụku Chineke abụ otuto fọrọ nke nta ka ọ pụọ n’anya n’oge ahụ a nọ n’ìsì. E kwuwerị, ọ bụrụ na ndị nkịtị enweghị ike inweta Akwụkwọ Nsọ, olee otú ha ga-esi mara na otu ụzọ n’ime ụzọ iri nke Bible dum bụ abụ? Ònye ga-agwa ha na Chineke nyere ndị na-efe ya ofufe iwu ka ha ‘bụkuo Jehova abụ ọhụrụ, bụọ abụ otuto Ya n’ime mkpọkọta ndị ebere Ya’?—Abụ Ọma 149:1.

Iweghachi Egwú n’Ọnọdụ Ya Kwesịrị Ekwesị n’Ofufe

Nzukọ Jehova emewo ọtụtụ ihe iji weghachi egwú na ịbụ abụ n’ọnọdụ kwesịrị ha n’ofufe. Dị ka ihe atụ, ihe dị ná mbipụta Zion’s Watch Tower nke February 1, 1896, bụ nanị abụ. Isiokwu ya bụ “Abụ Ọṅụ Ụtụtụ nke Zaịọn.”

Na 1938, ọ fọrọ nke nta ka a hapụ ịdị na-abụ abụ ná nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ. Otú ọ dị, e tinyere amamihe nke ịgbaso ihe nlereanya na ntụziaka ndị ozi n’ọrụ n’oge na-adịghị anya. Ná mgbakọ distrikti e nwere na 1944, F. W. Franz kwuru okwu bụ́ “Abụ nke Ije Ozi Alaeze.” O gosiri na ihe ndị Chineke kere n’eluigwe bụrụ abụ otuto nye Jehova ogologo oge tupu e kee mmadụ, wee sị: “Ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ma na-amasị Chineke ka ndị ohu Ya n’elu ala na-ebuli olu ha n’abụ nkịtị.” Mgbe ọ kọwachara ihe ịrụ ụka na-akwado ịbụ abụ n’ofufe, ọ mara ọkwa mwepụta nke Kingdom Service Song Book maka iji eme ihe ná nzukọ ije ozi kwa izu.b Informant (nke a na-akpọ Ozi Alaeze Anyị ugbu a) nke December 1944 maziri ọkwa na nzukọ ndị ọzọ ga-agụnyekwa abụ mmeghe na nke mmechi. Ịbụ abụ ghọrọ otu akụkụ nke ofufe Jehova ọzọ.

‘Ịbụ Abụ n’Obi Anyị Nye Jehova’

Ụmụnna anyị nọ n’Ọwụwa Anyanwụ Europe na Africa, ndị nweworo oké ihe isi ike na mkpagbu ruo ọtụtụ afọ, bụ ihe atụ nke abamuru nke ịbụ abụ sitere n’obi. Lothar Wagner nọrọ ngá afọ asaa n’ebe ọ nọ nanị ya. Olee otú o siri tachie obi? “Ruo ọtụtụ izu atụkwasịrị m uche n’ịkwanyezu ihe n’ụlọ nkwakọba ihe m nke abụ Alaeze. Mgbe m na-amaghị ihe odide ya kpọmkwem, m na-arọ otu ahịrị ma ọ bụ abụọ. . . . Lee ụba nke echiche na-agba ume ma na-ewuli elu ndị dị n’abụ Alaeze anyị!”—1974 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peji nke 226-228.

N’ime afọ ise nke ịnọ nanị ya na ngá n’ihi nguzo ikwesị ntụkwasị obi ya, Harold King nwetara nkasi obi n’ịrọ na ịbụrụ Jehova abụ otuto dị iche iche. Ndịàmà Jehova ji ọtụtụ n’ime ndị ọ rọrọ eme ihe ugbu a n’ofufe ha. Ọṅụ e jikọrọ ya na ịbụ abụ bụ nke na-akwagide akwagide. Ma o kwesịghị ịbụ mkpagbu ga-eme ka anyị kwere n’abamuru nke ịbụrụ Chineke abụ otuto.

Ndị Jehova nile pụrụ inweta ọṅụ n’abụ. N’agbanyeghị na anyị pụrụ inwe ihe mgbochi ụfọdụ n’iji okwu akọwa onwe anyị, mmetụta anyị n’ebe Jehova nọ pụrụ ịpụtara onwe ha mgbe anyị na-ekwupụta ha n’abụ. Pọl onyeozi gosiri otú anyị pụrụ isi nweta ọṅụ n’ịbụ abụ otuto mgbe ọ gbara ndị Kraịst ume ịnọgide “na-ewere abụ ọma na ukwe na abụ nke Mmụọ Nsọ gwarịta onwe unu okwu, na-ewere obi unu bụọ abụ kpọọkwa ụbọ nye Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 5:19) Mgbe obi anyị jupụtara n’ihe ime mmụọ, anyị na-achọta okwu ndị dị ike n’abụ. Ya mere isi ihe na-akpata ịbụ abụ n’ụzọ ka mma bụ ọdịdị uche ziri ezi.

Inwe ezi mmekọrịta n’ebe Jehova nọ na-atụnye ụtụ ná mmụọ nwere ọṅụ, na-akwali anyị ikwu okwu, ịbụ abụ, na iti otuto Jehova ná mkpu. (Abụ Ọma 146:2, 5) Anyị na-eji obi anyị nile na-abụ abụ banyere ihe ndị na-amasị anyị. Ọ bụrụkwa na abụ ahụ ma ọ bụ mmetụta nke abụ ahụ masịrị anyị, o yikarịrị ka anyị ga-eji ezi mmetụta bụọ ya.

Ọ bụghị iwu na mmadụ ga-abụ abụ n’olu dara ụda iji were mmetụta na-abụ abụ. Ịbụ abụ n’oké olu na ịbụ abụ nke ọma abụchaghị otu ihe ahụ; ịbụ abụ a na-apụghị ịnụ abụghịkwa. Ụda olu ụfọdụ nwere ọdịdị na-asụ asụ pụrụ ịdị na-adapụta nke ọma n’agbanyeghị na e ji olu dị nro na-abụ abụ ahụ. Ihe so bụrụ ihe ịma aka nke ịbụ abụ nke ọma n’otu ìgwè bụ ịmụta inwe nkwekọ. Ma ùnu ji otu olu na-abụ abụ ma ọ bụ na-abụkọ ya ọnụ, ụda olu gị ikwekọ na nke ndị nọ gị n’akụkụ na-eme ka e nwee abụ na-atọ ụtọ na nke nwere otu olu. Obi umeala ndị Kraịst na ịṅa ntị nke ọma na-enyere mmadụ aka inwe ezi nguzo nke iji mmụọ na-abụpụta abụ ma ghara ime ka olu ya na-ada ụda karịa nke ndị ọzọ. Otú ọ dị, ndị ji nkà na-abụ abụ ma ọ bụ ndị nwere olu ịdị mma ya pụrụ iche ekwesịghị ịbụ ndị a kụdara aka ịbụpụta abụ ma ọlị. Olu dị ụtọ pụrụ inye abụ otuto ọgbakọ na-abụku Jehova nkwado siri ike.

Ịbụ abụ ná nzukọ anyị na-enyekwa ọnọdụ kwesịrị ekwesị maka ịbụ akụkụ ndị nwere nkwekọ ụda olu n’uri olu ụtọ. A na-agba ndị nwere ntị maka nkwekọ ụda olu ma ọ bụ pụrụ ịgụ ahịrị nkwekọ ụda olu ndị dị n’akwụkwọ abụ ma bụọ ha ume ijikọta olu ha n’abụ a na-abụ ma tinye ihe n’ịdị ụtọ nke egwú ahụ.c

Ụfọdụ pụrụ ịzọrọ, sị, ‘Enweghị m ike ịbụ abụ nke ọma’ ma ọ bụ ‘Ụda olu m dị njọ; ọ na-agbaka agbaka n’akara ụda egwú ndị chọrọ iweli olu elu.’ N’ihi ya, ihere na-eme ha mgbe a na-abụ abụ, ọbụna n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Eziokwu bụ na ọ dịghị olu e weliri n’otuto nye Jehova nke “dị njọ” site n’ụzọ o si ele ihe anya. Dị nnọọ ka a pụrụ iji mmụgharị ihe mee ka ụda olu mmadụ ka mma site n’ịgbaso aro ndị na-enye aka a na-enye n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, otú ahụkwa ka a pụrụ imeziwanye abụ mmadụ na-abụ. Ụfọdụ emewo ka ụda olu ha ka mma site nanị n’abụpụtaghị ya abụpụta mgbe ha na-arụ ọrụ. Abụpụtaghị abụ abụpụta na-enye aka ime ka ụda nke olu dị larịị. N’oge kwesịkwara ekwesị mgbe anyị nọ nanị anyị ma ọ bụ mgbe anyị na-agaghị emere ndị ọzọ mkpọtụ, ịbụ uri olu ụtọ Alaeze bụ ụzọ magburu onwe ya iji megaa ụda olu na otu ụzọ nke idebe mmadụ n’ọnọdụ uche nwere ọṅụ, n’enweghị nchekasị.

Anyị pụkwara ịgba ume ịbụ abụ Alaeze ole na ole ná nnọkọ dị iche iche. Ịbụ abụ dị otú ahụ, nke e jikọrọ ya na ngwá egwú dị ka ụbọ akwara ma ọ bụ piano ma ọ bụ kaseti Society e ji piano kpọọ, na-enye nnọkọ anyị ọdịdị ime mmụọ. Ọ na-enyekwa ihe enyemaka maka ịmụta abụ ndị ahụ na ịbụ ha nke ọma ná nzukọ ọgbakọ.

Iji nyere ọgbakọ aka ịbanye ná mmụọ nke ịbụ abụ ná nzukọ, Society ewepụtawo egwú nkwado ndị e tinyere na kaseti. Mgbe a na-akpọ ha, onye na-ahụ maka ígwè okwu kwesịrị ịkpachara anya banyere ụda olu ya. Ọ bụrụ na egwú ahụ adịghị adapụta nke ọma, ọgbakọ nwere ike ghara inwe obi ike n’ịbụpụta abụ nke ọma. Ka nwanna ahụ na-achịkwa ígwè okwu so ọgbakọ na-abụ abụ, ọ ga-enwe ike ikpebi ma egwú ahụ ọ̀ na-enye nduzi nkwado ma ọ bụ na ọ dịghị enye.

Bụkuonụ Jehova Abụ

Ịbụ abụ na-enye anyị ohere iji kwupụta mmetụta anyị nwere maka Onye Okike anyị. (Abụ Ọma 149:1, 3) Ọ bụ, ọ bụghị nanị ntiwapụ nke mmetụta uche, kama nkwupụta a chịkwara achịkwa, nke ọṅụ na ezi uche dị na ya, nke otuto anyị. Itinye obi anyị n’abụ ọgbakọ na-abụ pụrụ itinye anyị n’ọnọdụ uche na obi kwesịrị ekwesị maka usoro ihe omume na-esochi, ọ pụkwara ịkpali anyị ikere òkè ka ukwuu n’ofufe Jehova. Ọ bụ ezie na ịbụ abụ na-akpa ike ná mmetụta uche, a pụkwara iji okwu ndị ahụ mee ihe iji zie anyị ihe. Site n’isi otú a bụkọọ abụ ọnụ na ná nkwekọ na n’otu olu, anyị na-eji ịdị nwayọọ na obi umeala na-akwadebe obi anyị ka anyị wee nwee ike ịmụtakọ ihe ọnụ dị ka ndị zukọrọ ọnụ.—Tụlee Abụ Ọma 10:17.

Ịbụ abụ ga-abụ mgbe nile otu akụkụ nke ofufe Jehova. Ya mere anyị nwere olileanya nke inwe otu mmetụta ahụ ọbụ abụ ahụ nwere: “M ga-eto Jehova n’ogologo ndụ m nile; m ga-abụku Chineke m abụ ọma mgbe m nọ na-adị ndụ.”—Abụ Ọma 146:2.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Rhapsody bụ egwú a na-eji mmụọ nke nnwere onwe na-amata nkebi ya dịgasị iche iche. Ọtụtụ mgbe, rhapsody na-enye oge ememe ma ọ bụ ndị a na-asọpụrụ otuto.

b Ndị Kọrint nke Mbụ 14:15 yiri ka ọ na-egosi na ịbụ abụ bụ akụkụ ofufe ndị Kraịst oge mbụ na-enwechi anya.

c Ụfọdụ n’ime abụ ndị dị n’akwụkwọ abụ anyị ugbu a, bụ́ Sing Praises to Jehovah, ka nwere ọdịdị nkwekọ ụda olu ahụ nwere akụkụ anọ maka abamuru nke ịbụ akụkụ nkwekọ ụda olu ndị ahụ na-amasị. Ma, a haziwo ọtụtụ n’ime abụ ndị ahụ maka iji piano na-abụ ha, e nyekwara ha ọrụrọ egwú nke e ji achọ ichekwa mmalite mba nile nakweere nke ụda ndị ahụ nwere. Imepụta ụda egwú na-ekwekọ ekwekọ maka abụ ndị ahụ e dere n’agụnyeghị nkwekọ ụda ahụ nwere akụkụ anọ bụ́ iwu pụrụ ime ka abụ ndị anyị na-abụ ná nzukọ dị ụtọ karị.

[Igbe dị na peeji nke 27]

ARO ỤFỌDỤ MAKA ỊBỤ ABỤ KA MMA

1. Welite akwụkwọ abụ ahụ n’ihu gị mgbe ị na-abụ abụ. Nke a na-enyere mmadụ aka iku ume n’ụzọ ka kwesị ekwesị.

2. Kudaa ume nke ọma ná mmalite nke nkebi ahịrị okwu nke ọ bụla.

3. Imeghekwu ọnụ nke nta karịa otú mmadụ chọrọ na mbụ ga-ewelitekarị ụda olu na ịsụ asụ nke olu okwu.

4. Karịsịa ihe nile, lekwasị anya ná mmetụta nke abụ ahụ a na-abụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya