Ụkpụrụ Ndị Metụtara Ndụ na Ịwa Ahụ n’Ejighị Ọbara
E NWEWO ọganihu a na-enwetụbeghị na nkà mmụta ọgwụ n’afọ ndị na-adịbeghị anya. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na ha na-agwọta nsogbu ahụ ike, ọganihu ụfọdụ akpatawo nsogbu ndị metụtara ụkpụrụ omume.
Ndị dọkịta aghaghị ịtụgharị n’uche ọnọdụ amaghị nke a ga-eme ndị dị ka: È kwesịrị ịgbahapụ inye ọgwụ nile a maara mgbe ụfọdụ ka onye ọrịa wee nwee ike iji ùgwù nwụọ? Dọkịta ò kwesịrị ime mkpebi ga-akagbu nke onye ọrịa ma ọ bụrụ na o chere na ọ bụ maka ọdịmma kasị mma nke onye ọrịa ahụ? Olee otú e kwesịrị isi nye nlekọta ahụ ike n’ụzọ hà nhata mgbe aka mmadụ nile na-erughị ọgwụgwọ dị oké ọnụ?
Ihe iseokwu ndị dị otú ahụ dị mgbagwoju anya emewo ka e lerukwuo anya na nkà mmụta ọgwụ na ahụ ike a na-akpọ ụkpụrụ ndị metụtara ndụ. Nzube nkà nke a bụ iji nyere ndị dọkịta na ndị ọkà mmụta sayensị aka ịgbaso ihe banyere ihe ndị metụtara omume ndị na-esi ná nnyocha ihe ndị dị ndụ na ọganihu ọgwụ apụta mgba. Ebe ọ bụ na ọtụtụ n’ime mkpebi ndị sikarịsiri ike na-ebilite n’ụlọ ọgwụ, ọtụtụ ụlọ ọgwụ eguzobewo kọmitii ụkpụrụ ndị metụtara ndụ. Dị ka ọ na-adịkarị, ndị òtù kọmitii ahụ—na-agụnye ndị dọkịta na ndị ọkàiwu—na-aga semina maka ụkpụrụ ndị metụtara ndụ, ebe a na-enyocha nsogbu ụkpụrụ ndị e nwere n’ọgwụ.
Ajụjụ ụfọdụ a na-ewelite na semina ndị dị otú ahụ bụ: Ruo n’ókè hà aṅaa ka ndị dọkịta kwesịrị ịkwanyere nkwenkwe Ndịàmà Jehova ùgwù, bụ́ ndị n’ihi ihe metụtara okpukpe karịsịa, na-ajụ ịnara mmịnye ọbara? Dọkịta ò kwesịrị ịmịnye onye ọrịa ọbara n’ụzọ megidere ọchịchọ onye ọrịa ahụ ma ọ bụrụ na nke ahụ yiri ihe “kwesịrị ekwesị” n’ụzọ nlekọta ahụ ike? Ọ̀ ga-abụ ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ime otú ahụ ma ọ bụrụ na onye ọrịa amaghị banyere ya, dị ka a ga-asị na ‘ihe onye ọrịa na-amaghị agaghị emerụ ya ahụ’?
Iji mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị banyere ihe iseokwu ndị dị otú ahụ, ọ dị ndị dọkịta mkpa inwe nghọta kwesịrị ekwesị banyere ụzọ ile ihe anya nke Ndịàmà. N’akụkụ nke ha, Ndịàmà Jehova nwere oké mmasị ịkọwara ndị dọkịta nguzo ha, na-ama na ịghọta onwe ha pụrụ ime ka e zere esemokwu.
Mgbanwerịta Echiche
Prọfesọ Diego Gracia, onye Spain a ma ama nke ọnụ na-eru n’okwu n’ụkpụrụ ndị metụtara ndụ, chọrọ ka klas ya nwee mkparịta ụka dị otú ahụ. “Ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị ka e nye unu [Ndịàmà Jehova] ohere ikwupụta nchegbu unu . . . n’ihi ihe isi ike unu nweworo n’ihe metụtara mmịnye ọbara,” ka prọfesọ ahụ kwuru.
N’ihi ya, na June 5, 1996, a kpọrọ ndị nnọchiteanya atọ nke Ndịàmà Jehova òkù ịbịa Mahadum Complutense dị na Madrid, Spain, iji kọwaa echiche ha. Ihe dị ka ndị dọkịta 40 na ndị ọzọ bụ ọkachamara bịara.
Mgbe Ndịàmà ahụ kwusịrị okwu dị mkpirikpi, e meghere nnọkọ ahụ maka ajụjụ. Ndị nile bịaranụ kwenyere na onye meworo okenye kwesịrị inwe ikike ịjụ otu ụdị ọgwụgwọ nlekọta ahụ ike. Ìgwè ahụ kwenyekwara na e kwesịghị ma ọlị inye mmịnye ọbara ma ọ bụrụ na onye ọrịa ahụ ekwetaghị site n’ihe ọ maara. Ma akụkụ ụfọdụ nke nguzo Ndịàmà nyere ha nsogbu.
Otu ajụjụ metụtara ego. Mgbe ụfọdụ ịwa ahụ n’ejighị ọbara na-agụnye ngwá ọrụ pụrụ iche, dị ka n’ịwa ahụ laser, tinyekwara ọgwụ ndị dara oké ọnụ, dị ka erythropoietin, nke e ji akpali mmepụta nke mkpụrụ ndụ ọbara uhie. Otu dọkịta nwere mgbagwoju anya ma site n’ịjụ nhọrọ na-adịchaghị oké ọnụ (ọbara nwere nkwekọ), ọ̀ pụrụ ịbụ na Ndịàmà na-atụ anya ka ụlọ ọrụ na-ahụ maka ahụ ike ọha mmadụ nye ha ihe ùgwù ndị pụrụ iche.
Ọ bụ ezie na ọ ghọtara na ego bụ n’ezie ihe ndị dọkịta na-aghaghị ịtụle, otu onye nnọchiteanya Ndịàmà zoro aka n’ihe ọmụmụ e bipụtara ndị na-enyocha ihe ndị zoro ezo nke ịmịnye ọbara nwere nkwekọ na-efu. Ndị a na-agụnye ọnụ ahịa nke ịgwọ nsogbu ndị mmịnye ọbara na-akpata, gụnyere mfu ego nke nsogbu ndị na-esite ná nsogbu ndị dị otú ahụ. O hotara otu ihe ọmụmụ sara mbara nke sitere United States nke na-egosi na nkezi ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara, nke ọ bụ ezie na ọ na-efu nanị $250 na mbụ, na-akpata n’ezie mmefu nke ihe karịrị $1,300—ihe ji okpukpu ise karịa ọnụ ego mbụ. N’ihi ya, o gosiri na mgbe e chebaara ihe nile echiche, ịwa ahụ n’ejighị ọbara adịghị efu oké ego. Ọzọkwa, ihe dị ukwuu n’ime ihe ahụ a na-akpọkarị ụma ọnụ ahịa nke ịwa ahụ n’ejighị ọbara bụ ngwá ọrụ a pụrụ ijighachi mee ihe.
Ajụjụ ọzọ dị n’uche ọtụtụ dọkịta metụtara nrụgide nke ndị òtù. Gịnị ga-eme, ka ha na-ajụ, ma ọ bụrụ na Onyeàmà adaa ma nara mmịnye ọbara? Ndịàmà hà ga-achụpụ ya?
Azịza ya ga-adabere n’ọnọdụ dịnụ n’ezie, n’ihi na inupụ isi n’iwu Chineke bụ okwu dị oké mkpa, ihe ndị okenye ọgbakọ ga-enyocha. Ndịàmà ga-achọ inyere onye ọ bụla nweworo ahụmahụ na-akpaghasị uche nke ịwa ahụ na-eyi ndụ egwu aka, bụ́ onye narawooro mmịnye ọbara. Obi abụọ adịghị ya na Onyeàmà dị otú ahụ ga-enwe mmetụta dị oké njọ, nweekwa nchegbu banyere mmekọrịta ya na Chineke. Enyemaka na nghọta pụrụ ịdị onye dị otú ahụ mkpa. Ebe ọ bụ na ntọala nke Iso Ụzọ Kraịst bụ ịhụnanya, ndị okenye ga-achọ, dị ka n’okwu ikpe nile, iji ebere tụgwaa ime ihe n’ụzọ siri ike.—Matiu 9:12, 13; Jọn 7:24.
“Ọ̀ bụ na unu agaghị atụleghachi nguzo unu n’ihe metụtara ụkpụrụ n’isi nso?” ka otu prọfesọ n’ụkpụrụ ndị metụtara ndụ jụrụ, bụ́ onye si United States bịa. “Okpukpe ndị ọzọ emewo nke ahụ n’afọ ndị na-adịbeghị anya.”
Nguzo Ndịàmà n’ihe banyere ịdị nsọ nke ọbara bụ nkweta metụtara ozizi kama ịbụ echiche ụkpụrụ nke a pụrụ ịtụleghachi site n’oge ruo n’oge, ka a gwara ya. Iwu Bible doro anya enyeghị ohere ọ bụla maka imebi okwukwe. (Ọrụ 15:28, 29) Imebi iwu Chineke dị otú ahụ ga-abụ ihe Onyeàmà na-apụghị ịnakwere dị ka ịnabata ikpere arụsị ma ọ bụ ịkwa iko.
Ndịàmà Jehova na-enwe obi ụtọ dị ukwuu n’ịdị njikere nke ndị dọkịta—dị ka ndị ahụ bịaranụ na semina ahụ e nwere banyere ụkpụrụ ndị metụtara ndụ na Madrid—ịsọpụrụ mkpebi ha ịchọ ọgwụgwọ ọzọ nke kwekọrọ ná nkweta ha ndị dabeere na Bible. N’enweghị obi abụọ, ụkpụrụ ndị metụtara ndụ ga-arụ ọrụ dị mkpa n’imeziwanye mmekọrịta dị n’etiti ndị dọkịta na ndị ọrịa na ịkwalite nkwanye ùgwù ka ukwuu maka ihe onye ọrịa chọrọ.
Dị ka a kọrọ na otu dibịa a ma ama bụ́ onye Spain kwuru, ndị dọkịta aghaghị icheta mgbe nile na ha “ji ngwá ọrụ na-ezughị okè na ụzọ nwere ike ịgahie na-agwọ ọrịa.” N’ihi ya, “mkpebi bụ na ịhụnanya kwesịrị ịgaru mgbe nile n’ebe ihe ọmụma na-apụghị iru” dị ha mkpa.