È Nwere Nkwekọ n’Etiti “Ụlọ Nsọ nke Chineke” na Arụsị na Gris?
N’ỤBỌCHỊ oge okpomọkụ a dị oké ọkụ, anyanwụ na-achakwasị nkume ndị ahụ na-egbuke egbuke. Otú ọ dị, okpomọkụ ahụ gabigara ókè eyighị ka ọ na-ebelata mmụọ na mkpebi siri ike otu ìgwè ji okpukpe Grik Orthodox kpọrọ ihe ndị na-eme njem ala nsọ, bụ́ ndị na-aga n’ụlọ ekpere dị n’elu ugwu ahụ.
Ị na-ahụ agadi nwanyị ike gwụsịrị, onye meworo njem site n’ebe dị anya nke mba ahụ, na-agbalị ịdọkpụ ụkwụ ya ike gwụrụ na-aga. Ịgakwu n’elu nke nta, ọsụsọ na-agbasi otu nwoke nwere oké mmasị ike ka o ji oké ọchịchọ na-agbalị isi n’etiti ìgwè mmadụ juru ebe nile gafee. Tinyere otu nwa agbọghọ, onye o doro anya na ọ nọ n’ihe mgbu ma nwee ọdịdị enweghị olileanya n’ihu ya, ji ikpere ya na-agba ọbara nke ukwuu na-egbe igbe. Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ ha? Iru n’oge, ikpe ekpere n’ihu ihe oyiyi nke “senti” ahụ a ma ama, na isutụ ya ọnụ, ma ọ bụrụ na o kwere omume.
A na-enweghachi ọnọdụ ndị yiri nke a ugboro ugboro n’ụwa nile n’ebe ndị a na-efe “ndị senti” ofufe. N’ụzọ doro anya, ndị a nile na-eme njem nleta kwenyesiri ike na n’ụzọ dị otú a, ha na-agbaso ụzọ Chineke maka ịbịakwute ya, wee si otú a na-egosi nsọpụrụ na okwukwe ha. Akwụkwọ bụ́ Our Orthodox Christian Faith na-ekwu, sị: “Anyị na-echeta [“ndị senti”], na-enyekwa ọdịdị ịdị nsọ ha otuto na nsọpụrụ . . . , anyị na-arịọkwa maka ekpere ha n’ihu Chineke maka anyị, na arịrịọ na enyemaka ha n’ọtụtụ ihe na-akpa anyị ná ndụ. . . . Anyị na-agakwuru Ndị Senti na-arụ ọrụ ebube . . . maka mkpa ime mmụọ na nke anụ ahụ anyị.” Ọzọ, dị ka iwu nduzi ndị e nyere ná nzukọ ndị isi chọọchị nke Chọọchị Roman Katọlik si dị, a ga-ekpeku “ndị senti” n’ekpere dị ka ndị nrịọchitere n’ebe Chineke nọ, a ga-efekwa ma ihe ncheta mgbe ochie ma ihe oyiyi nke “ndị senti” ofufe.
Nchegbu bụ isi nke ezi ndị Kraịst kwesịrị ịbụ ife Chineke “n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:24) N’ihi nke a ka anyị tụlee ụfọdụ ihe ndị mere eme banyere ụzọ e si webata ife “ndị senti” ofufe dị ka akụkụ nke ihe omume okpukpe nke Krisendọm. Nnyocha dị otú ahụ kwesịrị inye onye ọ bụla chọrọ ịbịakwute Chineke n’ụzọ Ọ na-anara nke ọma ihe ọmụma dị ukwuu.
Ụzọ E Siri Webata “Ndị Senti”
Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na-akpọ ndị Kraịst oge mbụ nile, e ji ọbara Kraịst sachaa na ndị e doro iche maka ozi Chineke dị ka ndị gaje ịbụ ndị ha na Kraịst ga-eso chịa, “ndị nsọ,” ma ọ bụ “ndị senti.” (Ọrụ 9:32; 2 Ndị Kọrint 1:1; 13:13)a Ndị ikom na ndị inyom, ndị a ma ama na ndị nọ n’ọnọdụ dị ala n’ọgbakọ, a kọwara ha nile dị ka “ndị nsọ” mgbe ha dị ndụ n’elu ala ebe a. O doro anya na e chereghị ruo mgbe ha nwụrụ tupu a mata ha dị ka ndị senti n’ụzọ kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ.
Otú ọ dị, mgbe narị afọ nke abụọ O.A. gasịrị, mgbe Iso Ụzọ Kraịst si n’ezi ofufe dapụ na-ebilite, ihe a na-eme bụ ịgbalị ime ka Iso Ụzọ Kraịst bụrụ nke ọha nakweere, okpukpe nke ga-amasị ndị na-ekpere arụsị ma bụrụkwa nke ha nakweere n’egbughị oge. Ndị a na-ekpere arụsị kpeere ọtụtụ chi, okpukpe ọhụrụ ahụ kwekwara nanị n’otu chi. Ya mere nkwekọrịta ga-ekwe omume site n’iwebata “ndị senti,” ndị ga-ewere ọnọdụ nke chi dị iche iche nke oge ochie, ndị dike, na ndị a maara aha ha n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme. N’ikwu banyere nke a, akwụkwọ bụ́ Ekklisiastiki Istoria (Akụkọ Ihe Mere Eme Chọọchị) na-asị: “Nye ndị a na-atọghata site n’ikpere arụsị gaa n’Iso Ụzọ Kraịst, ọ dịrị ha mfe ịghọta ndị a maara aha ha gbahapụrụ agbahapụ n’ọdịdị nke ndị e gburu n’ihi okwukwe ha na ịmalite inye ha nsọpụrụ ha nyebuworo ndị nke oge gara aga. . . . Otú ọ dị, mgbe mgbe, inye ndị senti dị otú ahụ nsọpụrụ aghọwo ikpere arụsị kpọmkwem.”
Akwụkwọ ọzọ na-akọwa otú e si webata “ndị senti” na Krisendọm, sị: “N’inye ndị senti nke Chọọchị Grik Orthodox nsọpụrụ, anyị na-ahụ ihe àmà pụtara ìhè nke mmetụta siri ike okpukpe ikpere arụsị nwere. Àgwà ndị e kwuru na ha bụ nke chi ndị Olympia tupu a tọghata [ndị mmadụ] n’Iso Ụzọ Kraịst ka a na-ekwuzi na ha bụ nke ndị senti. . . . Malite n’afọ ndị mbụ nke okpukpe ọhụrụ ahụ, anyị na-ahụ ka ndị na-ekpe ya ji Elaịja Onye Amụma na-edochi anya chi anyanwụ (Phoebus Apollo), na-ewu chọọchị n’elu ma ọ bụ n’akụkụ mkpọmkpọ ebe nke ụlọ nsọ oge ochie ndị ahụ ma ọ bụ n’òkwù arụsị nke chi a, karịsịa n’elu ugwu dị iche iche, n’ebe ọ bụla ndị Grik oge ochie nyere onye na-enye ìhè bụ́ Phoebus Apollo nsọpụrụ. . . . Ọbụna na ha sịrị na Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke bụ́ Meri n’onwe ya bụ chi nwanyị Na-amaghị Nwoke bụ́ Athena. N’ihi ya, e wepụrụ oghere nke e nwere mgbe a kwaturu ihe oyiyi nke Athena n’ime mkpụrụ obi nke onye na-ekpere arụsị a tọghatara atọghata.”—Neoteron Enkyklopaidikon Lexikon (Ọkọwa Okwu Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nkà Ihe Ọmụma), Mpịakọta nke 1, peji nke 270-271.
Dị ka ihe atụ, nyochaa ọnọdụ dị n’Atens laa azụ n’ihe dị ka ngwụsị nke narị afọ nke anọ O.A. Ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’obodo ahụ ka bụ ndị na-ekpere arụsị. Otu n’ime ememe okpukpe ha kasị nsọ bụ ememe nzuzo nke Eleusinia, bụ́ ihe omume gbara mkpị,b nke a na-eme kwa afọ na February n’obodo bụ́ Eleusis, kilomita 23 n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke Atens. Iji gaa ememe nzuzo ndị a, ndị Atens na-ekpere arụsị aghaghị ịgbaso Ụzọ Dị Nsọ (Hi·e·raʹ Ho·dosʹ). N’ịgbalị inweta ebe ofufe ọzọ n’ọnọdụ ya, ndị ndú nke obodo ahụ gosiri onwe ha ịbụ ndị nwere nnọọ ọgụgụ isi. N’otu ụzọ ahụ, ihe dị ka kilomita iri site n’Atens, e wuru ebe obibi ndị mọnk dị na Daphni iji dọta mmasị ndị na-ekpere arụsị na iji gbochie ha ịga n’ememe nzuzo ndị ahụ. E wuru chọọchị ebe obibi ndị mọnk ahụ na ntọala nke ụlọ nsọ oge ochie nke a raara nye chi ndị Gris bụ́ Daphnaios, ma ọ bụ Pythios Apollo.
A pụkwara ịchọta ihe àmà nke njikọ e jikọrọ chi arụsị dị iche iche ka ha bụrụ inye “ndị senti” nsọpụrụ n’àgwàetiti nke Kithira, Gris. N’ebe kasị elu nke otu n’ime àgwàetiti ndị ahụ, e nwere obere ụlọ ekpere Byzantine abụọ—a raara otu n’ime ha nye “Senti” George, rarakwa nke ọzọ nye Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke bụ́ Meri. Ihe ndị e gwutere n’ala gosiri na ọ bụ n’ebe a ka e nwere òkwù arụsị nke ebe kasị elu nke Minoan, bụ́ nke e ji mee ihe dị ka ebe a na-efe ofufe n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 3,500 gara aga. N’ime narị afọ nke isii ma ọ bụ nke asaa O.A., “ndị Kraịst” wuru ụlọ ekpere ha raara nye “Senti” George n’otu ebe ahụ e nwere òkwù arụsị nke ebe ahụ kasị elu. Ihe omume ahụ nwere oké ihe ọ nọchiri anya ya; ebe ahụ bụ isi nke okpukpe Minoan nwere ụzọ oké osimiri nke Oké Osimiri Aegean. E wuru chọọchị abụọ ahụ n’ebe ahụ iji nọgide na-enwe ihu ọma nke Nwaada Anyị na “Senti” George, ebe a na-eme ememe nke ikpeazụ n’otu ụbọchị ahụ a na-eme “onye nchebe nke ndị ọrụ ụgbọ mmiri,” bụ́ “Senti” Nicholas. Otu akwụkwọ akụkọ na-akọ banyere nchọpụta nke a, sịrị: “Taa ụkọchukwu [Grik Orthodox] ga-arịgo n’ugwu, dị ka ụkọchukwu Minoan si eme n’oge ochie,” ịga mee ememe okpukpe!
N’ịchịkọta ókè okpukpe ikpere arụsị ndị Gris nwere mmetụta n’Iso Ụzọ Kraịst si n’ezi ofufe dapụ, onye nchọpụta nke akụkọ ihe mere eme na-ekwu, sị: “Ntọala ikpere arụsị nke okpukpe ndị Kraịst na-anọgidekarị ná nkwenkwe ndị ọha nakweere n’agbanweghị agbanwe, wee si otú a na-agba akaebe nye ọdịdị na-adịgide adịgide nke ọdịnala.”
‘Ịkpọ Isiala Nye Ihe Anyị Matara’
Jisọs gwara nwanyị Sameria, sị: “Anyị onwe anyị na-akpọ isiala nye ihe anyị matara. . . . Ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu: n’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye Ya.” (Jọn 4:22, 23) Rịba ama na ịkpọ isiala n’eziokwu bụ iwu! N’ihi ya ọ bụ ihe a na-apụghị ime ife Chineke ofufe n’ụzọ ọ na-anara n’enweghị ezi ihe ọmụma na ịhụnanya dị omimi maka eziokwu ahụ. Okpukpe ezi ndị Kraịst aghaghị ịbụ nke a tọrọ ntọala ya n’eziokwu, ọ bụghị n’ọdịnala na omume ndị a gbazitere site n’ikpere arụsị. Anyị maara otú ọ na-adị Jehova mgbe ndị mmadụ nwara ife ya ofufe n’ụzọ na-ezighị ezi. Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst nọ n’obodo Gris oge ochie ahụ bụ́ Kọrint akwụkwọ, sị: “Olee nnwekọ otu olu Kraịst na Belial na-enwekọ? . . . Olee nkwekọ ụlọ nsọ nke Chineke na arụsị na-ekwekọ?” (2 Ndị Kọrint 6:15, 16) Mgbalị ọ bụla iji jikọọ ụlọ nsọ Chineke na arụsị bụ ihe ọ na-asọ oyi.
Ọzọkwa, n’ụzọ doro nnọọ anya, Akwụkwọ Nsọ na-akagbu echiche nke ikpegara “ndị senti” ekpere ka ha wee mee ihe dị ka ndị nrịọchitere n’ihu Chineke. N’ekpere nlereanya ya, Jisọs kụziri na ọ bụ nanị Nna ahụ ka a ga-ekpegara ekpere, ebe ọ bụ na ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Kpeenụ ekpere otú a: Nna anyị Nke bi n’eluigwe, Ka e doo aha Gị nsọ.” (Matiu 6:9) Jisọs kwukwara, sị: “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ: ọ dịghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna m, ma ọ bụghị site na Mụ. Ọ bụrụ na unu ga-arịọ ihe ọ bụla n’aha m, nke ahụ ka M ga-eme.” Pọl onyeozi kwukwara, sị: “Otu Chineke dị, otu Onye ogbugbo dịkwa n’agbata Chineke na mmadụ, Onye Ya onwe ya bụ mmadụ, bụ́ Kraịst Jisọs.”—Jọn 14:6, 14; 1 Timoti 2:5.
Ọ bụrụ na anyị chọrọ n’ezie ka Chineke nụ ekpere anyị, ọ dị mkpa ka anyị gakwuru ya n’ụzọ Okwu ya si atụzi. N’imesi nanị ụzọ ziri ezi e si agakwuru Jehova ike, Pọl dekwara, sị: “Ọ bụ Kraịst Jisọs Onye nwụrụ, ma nke karịrị, e mere Ya ka O si ná ndị nwụrụ anwụ bilie, Onye nọ n’aka nri Chineke, Onye na-arịọkwara anyị arịrịọ.” “O sitekwara na nke a pụ ịzọpụtachasị ndị na-esite n’aka Ya abịakwute Chineke, ebe Ọ na-adị ndụ mgbe nile ịrịọ arịrịọ n’ihi ha.”—Ndị Rom 8:34; Ndị Hibru 7:25.
‘Ịkpọ Isiala n’Ime Mmụọ na Eziokwu’
Iso Ụzọ Kraịst si n’ezi ofufe dapụ enweghị ume ime mmụọ ma ọ bụ nkwado nke mmụọ nsọ Chineke iji kwalie ndị na-ekpere arụsị ịgbahapụ ofufe ụgha ha ma gbasoo ozizi bụ eziokwu nke Jisọs Kraịst. Ọ nabatara nkwenkwe na omume ndị na-ekpere arụsị ná nchụso ọ na-achụso ịtọghata ndị mmadụ, ike, na ịbụ nke a ma ama. N’ihi nke a o mere ka e nwee ọ bụghị ezi ndị Kraịst, bụ́ ndị Chineke na Kraịst na-anara, kama ndị kwere ekwe ụgha, “ata” na-ekwesịghị ekwesị maka Alaeze.—Matiu 13:24-30.
Otú ọ dị, n’oge ọgwụgwụ nke a, e nwere usoro ọrụ dị mkpa n’iweghachi ezi ofufe n’okpuru nduzi Jehova. Ndị Jehova n’ụwa nile, n’agbanyeghị nzụlite ha n’ụzọ ọdịbendị, ọha mmadụ, ma ọ bụ okpukpe, na-agbalị ime ka ndụ na nkwenkwe ha kwekọọ n’ụkpụrụ Bible. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụtakwu banyere ụzọ e si efe Chineke “n’ime mmụọ na eziokwu,” biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova n’ebe i bi. Ha ga-enwe obi ụtọ dị ukwuu inyere gị aka ife Chineke ofufe dị nsọ nke ọ na-anara, na-adabere n’ikike nke iche echiche gị na ezi ihe ọmụma nke Okwu ya. Pọl dere, sị: “Ụmụnna m, eji m obi ebere nile nke Chineke na-arịọ unu, ka unu chee ahụ unu n’ihu Chineke, dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke ezi ụtọ, nke bụ ikpe ekpere unu dị ka uche si dị. Unu ekwekwala ka e mee ka unu yie ajọ oge a: kama ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè.” Nyekwa ndị Kọlọsi, ọ sịrị: “Anyị onwe anyị kwa, site n’ụbọchị anyị nụrụ ya, anyị ewepụghị aka n’ikpe ekpere na ịrịọ arịrịọ n’ihi unu, ka e wee mee ka unu jupụta ná mmazu nke ihe Ọ na-achọ n’ime amamihe na nghọta nile nke Mmụọ Nsọ, ka unu jegharịa n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị ime otú ọ ga-atọ Ya ụtọ n’ụzọ nile, na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ nile ọ bụla, na-abakwa ụba n’ime mmazu nke Chineke.”—Ndị Rom 12:1, 2; Ndị Kọlọsi 1:9, 10.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ụfọdụ nsụgharị Bible na-ede okwu Grik bụ́ haʹgi·os dị ka “onye nsọ,” ndị ọzọ dị ka “senti.”
b A na-enwe Eleusinia Ka Ukwuu kwa afọ na September n’Atens na Eleusis.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 28]
Ojiji E Ji Parthenon Mee Ihe n’Ụzọ A Na-atụghị Anya Ya
“Onye Kraịst” bụ́ Eze Ukwu Theodosius nke Abụọ, site n’iwu ndị e tiri banyere obodo bụ́ Atens (438 O.A.), kachapụrụ ememe okpukpe na ememe nzuzo ndị na-ekpere arụsị, mechie ụlọ nsọ ndị na-ekpere arụsị. A pụrụ imesịa gbanwee ha ịghọ chọọchị ndị Kraịst. Nanị ihe a chọrọ iji gbanwee ụlọ nsọ n’ụzọ gara nke ọma bụ ime ka ọ dị ọcha site n’itinye obe na ya!
Otu n’ime ụlọ nsọ mbụ a gbanwere bụ Parthenon. Mwuzigharị gbara ọkpụrụkpụ weere ọnọdụ iji mee ka Parthenon kwesị nnọọ ekwesị ka e jiri ya mee ihe dị ka ụlọ nsọ “ndị Kraịst.” Malite na 869 O.A., e ji ya mee ihe dị ka katidral nke Atens. Na mbụ e nyere ya nsọpụrụ dị ka chọọchị nke “Amamihe Dị Nsọ.” Nke a nwere ike ịbụworị ihe ncheta e leziri anya nwee nke eziokwu ahụ bụ na “onye nwe” ụlọ nsọ ahụ n’ezie, bụ́ Athena, bụ chi nwanyị nke amamihe. E mesịa, a raara ya nye “Nwaada Anyị Onye Atens.” Mgbe narị afọ asatọ nke ndị Orthodox iji ya mee ihe gasịrị, a gbanwere ụlọ nsọ ahụ ka ọ bụrụ chọọchị Katọlik nke St. Mary nke Atens. “Mgbanwegharị” n’ụzọ okpukpe dị otú ahụ nke Parthenon gara n’ihu mgbe ndị Ottoman Turkey gbanwere ya ka ọ bụrụ ụlọ ofufe ndị Alakụba na narị afọ nke 15.
Taa Parthenon ahụ, ụlọ nsọ Doric oge ochie nke Athena Parthenos (“Nwanyị Na-amaghị Nwoke”) bụ́ chi nwanyị nke amamihe ndị Gris, ka ọtụtụ ndị na-eme njem nleta na-eleta nanị dị ka ihe owuwu magburu onwe ya nke ndị Gris.
[Foto dị na peeji nke 26]
Ebe obibi ndị mọnk dị na Daphni—ebe ofufe ọzọ maka ndị na-ekpere arụsị nke Atens oge ochie