Ị̀ Na-atụ Egwu Ịtụkwasị Ndị Ọzọ Obi?
‘ENWEGHỊ onye m pụrụ ịgwa okwu. Ndị mmadụ agaghị aghọta. Nsogbu nke ha ji ha aka nke ukwuu. Ha enweghị ohere maka m.’ Ọtụtụ na-eche otú ahụ, n’ihi ya ha adịghị agwa ndị ọzọ ihe. Mgbe ndị ọzọ jụrụ otú ha dị, ha na-achọkarị ịgwa ha, ma ha adịghị agwa ha. Ha apụghị nnọọ ikwupụta obi ha.
N’eziokwu, e nwere ndị na-achọghị ka ndị ọzọ nyere ha aka. Ma, ọtụtụ na-achọsi enyemaka ike ma ha na-atụ egwu ikpughe echiche, mmetụta, na ahụmahụ onwe onye ndị kasị dịrị nanị ha. Ị̀ bụ otu n’ime ha? Ọ́ dịghị onye ị pụrụ ịtụkwasị obi n’ezie?
Ịghọta Egwu Ahụ
E nwere ọnọdụ nke enweghị ntụkwasị obi n’ụwa taa. Ndị na-eto eto adịghị agwa ndị mụrụ ha okwu. Nne na nna apụghị inwe nkwurịta okwu. Mmadụ ole na ole dị njikere ịgwa ndị nọ n’isi okwu. N’enweghị ike ịgwa ndị ọzọ ihe nzuzo ha, ụfọdụ na-echigharịkwuru mmanya na-aba n’anya, ọgwụ ọjọọ, ma ọ bụ ụzọ ndụ aghara iji gbanahụ nsogbu ha.—Ilu 23:29-35; Aịsaịa 56:12.
Ịtụkwasị ndị nọ n’isi obi, dị ka ndị ụkọchukwu, ndị dọkịta, ndị dibịa, na ndị nkụzi, abụrụwo nke mkpughe dị iche iche nke emeghị ihe n’eziokwu na omume rụrụ arụ bibisịrị. Dị ka ihe atụ, otu atụmatụ na-ekwu na ihe karịrị 10 pasent nke ndị ụkọchukwu tinyere aka n’àgwà ọjọọ nke mmekọahụ. “Ndị omebi ntụkwasị obi” ndị a, ka otu onye na-ede akwụkwọ kwuru, “na-egwu olulu ukwu na olulu nta ndị dị omimi ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya.” Olee otú nke a si emetụta ọgbakọ ha dị iche iche? Ọ na-ebibi ntụkwasị obi.
Ndakpọ omume ọma zuru ebe nile edugawokwa n’ọgba aghara n’ezinụlọ, n’ókè nke na ọ fọrọ nke nta ka ezinụlọ ndị kewara ekewa bụrụ ụzọ ndụ, ọ bụghị nke pụrụ iche. Ọ dị mgbe ebe obibi bụ ebe nzụlite. Taa ọ na-adịkarị ka ebe a na-ere mmanụ ụgbọala n’oge nri. Mgbe nwatakịrị tolitere n’ezinụlọ ebe “ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ,” ihe na-esikarị na ya apụta bụ enweghị ike ịtụkwasị ndị ọzọ obi mgbe o mere okenye.—2 Timoti 3:3.
Ọzọkwa, ka ọnọdụ ụwa na-aka njọ, a na-ekpughekwu anyị nye ihe ndị pụrụ ịdị na-akpaghasị uche. N’ọnọdụ yiri nke ahụ, Maịka onye amụma dere, sị: “Unu atụkwasịla enyi unu maara nke ọma obi.” (Maịka 7:5) Ọ pụrụ ịdị gị otú ahụ mgbe i nwesịrị obere ndakpọ olileanya, ntụkwasị obi e bibiri ebibi, ma ọ bụ otu ihe gbara ọkpụrụkpụ nke na-eyi ndụ egwu. Ọ pụrụ isiri gị ike ịtụkwasị ndị ọzọ obi ọzọ, ma na-etolite n’egosipụtaghị mmetụta uche, na-ebi n’ime ihe mgbochi nke mmetụta uche kwa ụbọchị. (Tụlee Abụ Ọma 102:1-7.) N’eziokwu, àgwà dị otú ahụ pụrụ inyere gị aka ịnọgide na-adị ndụ, ma “mwute nke obi” gị na-anapụ gị ezi ọṅụ ọ bụla ná ndụ. (Ilu 15:13) Eziokwu bụ, ka ahụ wee dị gị mma n’ụzọ ime mmụọ, n’ụzọ mmetụta uche, n’ụzọ uche, na n’ụzọ anụ ahụ, ihe mgbochi ahụ aghaghị ịpụ, ị ghaghịkwa ịmụta ịtụkwasị ndị mmadụ obi. Nke ahụ ò kwere omume? Ee.
N’ihi Gịnị Ka Ihe Mgbochi ahụ Na-aghaghị Ịpụ?
Ịkọrọ ndị ọzọ ihe nzuzo na-ewetara obi nke ihe na-enye nsogbu ahụ efe. Hana nwere ahụmahụ nke a. O nwere alụmdi na nwunye dị mma, ebe obibi nwere nchebe, ma o nwere oké obi erughị ala. Ọ bụ ezie na ‘ọ dị ya ilu ná mkpụrụ obi,’ n’ụzọ amamihe o “wee kpeere Jehova” n’ụzọ siri ike nke na egbugbere ọnụ ya na-ekwughị okwu na-ama jijiji. Ee, ọ kọọrọ Jehova ihe nzuzo ya. Mgbe ahụ o mepere obi ya nye onye nnọchiteanya Chineke, bụ́ Ịlaị. Gịnị si na ya pụta? “[Hana] wee jee ije ya, rie ihe, ihu ya agbarụghịkwa n’ihi ya ọzọ.”—1 Samuel 1:1-18.
Ihe ka ọtụtụ n’ọdịbendị amarawo abamuru nke ịgwa mmadụ ihe dịịrị onwe onye. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ ihe bara uru isoro ndị nọworo n’ọnọdụ yiri nke gị ekerịta echiche na ahụmahụ dị iche iche. Ndị na-eme nnyocha na-ekwubi, sị: “Ikewapụ onwe onye n’ụzọ mmetụta uche na-akpata ọrịa—ọ dị anyị mkpa ikwupụta ihe iji nwee uche zuru ezu.” Otu ìgwè na-abawanye ụba nke ndị na-eme nnyocha sayensị na-ekwenyere eziokwu nke ilu ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke na-asị: “Ọchịchọ nke ya onwe ya na-achọsi ike ka onye na-ekewapụ onwe ya na-achọ, ọ bụ ezi nzube nile ka ọ na-alụsosi ọgụ ike.”—Ilu 18:1.
Ọ bụrụ na ị dịghị agwa ndị ọzọ obi gị, olee otú ha pụrụ isi nyere gị aka? Ọ bụ ezie na Jehova Chneke na-amata obi, ezinụlọ na ndị enyi adịghị ama echiche na mmetụta gị ndị dị omimi—ọ gwụla ma i kwuru obi gị. (1 Ihe Emere 28:9) Mgbe nsogbu ahụ metụtara ijehie megide iwu Chineke, ichere ruo mgbe ọzọ tupu e kwupụta ihe na-eme nanị ka ọ ka njọ.—Ilu 28:13.
N’ezie, abamuru nke ịkọrọ ndị ọzọ nsogbu karịrị nnọọ ihe ize ndụ nke ịbụ onye a kpasuru iwe. N’eziokwu, nke ahụ apụtaghị na anyị kwesịrị ịdị na-akpọsasị aghara aghara ụmụ irighiri ihe ndị dịịrị onwe anyị. (Tụlee Ndị Ikpe 16:18; Jeremaịa 9:4; Luk 21:16.) “E nwere enyi ndị na-achọkarị itisasị onwe ha iberibe iberibe,” ka Ilu 18:24 (NW), na-adọ aka ná ntị, ma gbakwụnyezie, sị: “E nwere enyi na-arapara n’ahụ karịa nwanne.” Olee ebe ị pụrụ ịchọta enyi dị otú ahụ?
Tụkwasị Ezinụlọ Gị Obi
Ọ bụrụ na i nwere nsogbu, ị̀ gbalịwo isoro onye òtù ọlụlụ gị ma ọ bụ ndị mụrụ gị kwurịta ya? “Nye ọtụtụ nsogbu, ikwurịta ha nke ọma na-abụ nanị ihe dị mkpa,” ka otu onye ndụmọdụ nwere ahụmahụ na-ekwenye. (Ilu 27:9) Ndị Kraịst bụ́ di ndị ‘hụrụ nwunye ha n’anya dị ka onwe ha,’ ndị bụ nwunye ‘na-edo onwe ha n’okpuru di ha,’ na nne na nna ndị ji ibu ọrụ Chineke nyere ha nke ‘ịzụpụta ụmụ ha n’ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị’ kpọrọ ihe ga-arụsi ọrụ ike iji bụrụ ndị na-ege ntị nke ọma na ndị ndụmọdụ na-enye aka. (Ndị Efesọs 5:22, 33; 6:4) Ọ bụ ezie na o nweghị nwunye ma ọ bụ ụmụ n’echiche anụ ahụ, lee ihe nlereanya magburu onwe ya Jisọs setịpụrụ n’ihe banyere nke a!—Mak 10:13-16; Ndị Efesọs 5:25-27.
Gịnị ma ọ bụrụ na nsogbu ahụ karịrị ihe a pụrụ ịhụ maka ya n’ime ezinụlọ? N’ọgbakọ ndị Kraịst, ọ dịghị mkpa na anyị ga-anọ nanị anyị ma ọlị. “Ònye na-adịghị ike, nke mụ onwe m na-esoghị ya n’adịghị ike?” ka Pọl onyeozi jụrụ. (2 Ndị Kọrint 11:29) Ọ dụrụ ọdụ, sị: “Na-eburịtanụ ibu na-anyị ibe unu.” (Ndị Galetia 6:2; Ndị Rom 15:1) N’etiti ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị, obi abụọ adịghị ya na anyị pụrụ ịchọta ihe karịrị otu “nwanne nke a na-amụ maka mgbe e nwere ahụhụ.”—Ilu 17:17, NW.
Tụkwasị Ọgbakọ Obi
N’ime ihe karịrị ọgbakọ 80,000 nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile, e nwere ndị ikom dị umeala n’obi na-eje ozi dị ka ‘ndị so gị na-arụta ọṅụ gị.’ (2 Ndị Kọrint 1:24) Ndị a bụ ndị okenye. “Otu onye,” ka Aịsaịa na-arịba ama, “ga-adịkwa ka ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara ná mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndo nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.” Nke ahụ bụ ihe ndị okenye na-agbalị ịbụ.—Aịsaịa 32:2; 50:4; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:14.
Ndị okenye nwere iru eru Akwụkwọ Nsọ chọrọ tupu ‘mmụọ nsọ ahọpụta’ ha. Ịmara nke a ga-eme ka obi ike i nwere n’ebe ha nọ sikwuo ike. (Ọrụ 20:28; 1 Timoti 3:2-7; Taịtọs 1:5-9) Ihe i sooro onye okenye kparịta ga-anọgide na-abụ nnọọ ihe nzuzo. Ịbụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi bụ otu n’ime iru eru ya.—Tụlee Ọpụpụ 18:21; Nehemaịa 7:2.
Ndị okenye nọ n’ọgbakọ “na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu.” (Ndị Hibru 13:17) Ọ̀ bụ na nke a adịghị akwali gị ịtụkwasị ndị ikom a obi? Dị ka ọ na-adịkarị, ọ bụghị ndị okenye nile na-emecha nke ọma n’otu àgwà ahụ. Ụfọdụ nwere ike iyi ndị dị mfe ịgakwuru, nwee obiọma, ma ọ bụ na-aghọta ihe karịa ndị ọzọ. (2 Ndị Kọrint 12:15; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:7, 8, 11) Gịnị mere ị gaghị akọrọ otu okenye ihe nzuzo gị, bụ́ onye ị na-enwe ahụ iru ala n’ebe ọ nọ?
Ndị ikom a abụghị ndị ọkachamara a na-akwụ ụgwọ. Kama nke ahụ, ha bụ “onyinye n’ụdị mmadụ,” nke Jehova nyere iji nyere gị aka. (Ndị Efesọs 4:8, 11-13, NW; Ndị Galetia 6:1) N’ụzọ dị aṅaa? N’iji Bible eme ihe n’ụzọ dị nkà, ha ga-etinye ike ngwọta ya n’ọrụ n’ọnọdụ nke aka gị. (Abụ Ọma 107:20; Ilu 12:18; Ndị Hibru 4:12, 13) Ha ga-esoro gị kpee ekpere, kpeekwara gị ekpere. (Ndị Filipaị 1:9; Jemes 5:13-18) Enyemaka sitere n’aka ndị ndụmọdụ dị otú ahụ na-ahụ n’anya pụrụ ime ihe dị ukwuu ịgwọ mmụọ ihe na-enye nsogbu ma wetaghachi udo nke uche.
Otú E Si Ewulite Mmekọrịta Ndị A Tụkwasịrị Obi
Ịrịọ maka enyemaka, ndụmọdụ, ma ọ bụ nanị onye ga-ege gị ntị abụghị ihe àmà nke adịghị ike ma ọ bụ ọdịda. Ọ bụ nanị nkwenye ziri ezi nke na anyị ezughị okè nakwa na ọ dịghị onye nwere azịza ihe nile. N’eziokwu, onye ndụmọdụ na onye a na-akọrọ ihe kasị ukwuu anyị nwere bụ Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke. Anyị na-ekwenyere ọbụ abụ ahụ onye dere, sị: “Jehova bụ ike m na ọta m; Ya ka obi m tụkwasịworo obi, e nyewokwara m aka.” (Abụ Ọma 28:7) Anyị pụrụ isite n’ekpere ‘wụsị obi anyị dị ka mmiri’ nye ya kpam kpam n’oge ọ bụla, na-enwe obi ike na ọ na-anụ olu anyị ma na-eche banyere anyị.—Abụ Ọma 62:7, 8; 1 Pita 5:7.
Ma olee otú ị pụrụ isi mụta ịtụkwasị ndị okenye na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ obi? Nke mbụ, nyochaa onwe gị. È nwere ezi ihe mere ị ga-eji atụ egwu? Ị̀ na-enyo ebumnobi nke ndị ọzọ enyo? (1 Ndị Kọrint 13:4, 7) È nwere ụzọ isi belata ihe ize ndụ nke ịbụ onye a kpasuru iwe? Ee. N’ụzọ dị aṅaa? Gbalịa ịmata ndị ọzọ n’onwe gị n’ọnọdụ ihe ime mmụọ. Gwa ha okwu ná nzukọ ọgbakọ. Gakọọ ọrụ ụlọ n’ụlọ ọnụ. Ntụkwasị obi, dị ka nkwanye ùgwù, aghaghị ịbụ nke e nwetara enweta. Ya mere nwee ndidi. Dị ka ihe atụ, ka ị na-amata onye ọzụzụ atụrụ ime mmụọ, obi ike gị n’ebe ọ nọ ga-eto eto. Jiri nwayọọ nwayọọ kpughee nchegbu gị. Ọ bụrụ na ọ zaghachi n’ụzọ kwesịrị ekwesị, n’ụzọ dị ọmịiko, na n’ụzọ amamihe, ị pụziri ịgbalị ịkọrọ ya ihe ndị ọzọ.
Ndị anyị na ha na-efekọ Jehova, karịsịa ndị okenye ndị Kraịst, na-arụsi ọrụ ike n’iṅomi àgwà ọma ndị Chineke nwere ná mmekọrịta ha nwere n’ebe ibe ha dị. (Matiu 5:48) Nke a na-akpata ọnọdụ ntụkwasị obi n’ime ọgbakọ. Otu onye bụworo okenye ruo ogologo oge na-ekwu, sị: “Ụmụnna aghaghị ịmara otu ihe: N’agbanyeghị ihe mmadụ na-eme, onye okenye adịghị atụfu ịhụnanya onye Kraịst o nwere n’ebe ọ nọ. Ihe e mere nwere ike ghara ịmasị ya, ma ọ ka hụrụ nwanna ya n’anya, chọọkwa inyere ya aka.”
Ya mere ọ dịghị mkpa iche na nsogbu bụ nke nanị gị. Gwa onye “Mmụọ Nsọ na-achị” okwu, bụ́ onye pụrụ inyere gị aka iburu ibu arọ gị. (Ndị Galetia 6:1) Cheta na “nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi ruru ala,” ma “ụgbụgbọ mmanụ aṅụ ka okwu ọnụ ụtọ nile bụ, nke na-atọ mkpụrụ obi ụtọ, bụrụkwa ihe na-agwọ ọkpụkpụ n’ọrịa.”—Ilu 12:25; 16:24.
[Igbe dị na peeji nke 26]
A pụrụ ịkpọ onye Kraịst ọ bụla òkù inyere onye ikwu, enyi, ma ọ bụ nwanna ime mmụọ aka ná nsogbu onwe onye. Ị̀ maara otú e si enye aka?
Onye Ndụmọdụ Dị IrÈ
na-adị mfe ngakwuru: Matiu 11:28, 29; 1 Pita 1:22; 5:2, 3
na-ahọrọ ọnọdụ okwu kwesịrị ekwesị: Mak 9:33-37
na-achọ ịghọta ihe bụ nsogbu: Luk 8:18; Jemes 1:19
adịghị emeghachi omume n’ụzọ fere ókè: Ndị Kọlọsi 3:12-14
na-enye aka ná mmetụta uche na-egbu mgbu: 1 Ndị Tesalọnaịka 5:14; 1 Pita 3:8
maara adịghị ike nke ya: Ndị Galetia 6:3; 1 Pita 5:5
na-enye ndụmọdụ a kapịrị ọnụ: Abụ Ọma 19:7-9; Ilu 24:26
na-edebe ihe nzuzo: Ilu 10:19; 25:9