Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 4/15 p. 23-26
  • Agbamakwụkwọ Ndị Na-asọpụrụ Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Agbamakwụkwọ Ndị Na-asọpụrụ Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mee Ka Ụbọchị Agbamakwụkwọ Gị Wetakwuoro Gị Ọṅụ Ma Dịkwuo Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Agbamakwụkwọ Ndị Na-enye Ọṅụ Bụ́ Ndị Na-ewetara Jehova Nsọpụrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Gosipụta Okwukwe Gị Site n’Otú I Si Ebi Ndụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 4/15 p. 23-26

Agbamakwụkwọ Ndị Na-asọpụrụ Jehova

A kwadebere isiokwu a na-esonụ banyere agbamakwụkwọ ndị Kraịst na mbụ n’Etiopịa iji nye nduzi na-enye aka n’asụsụ Amharic maka ọtụtụ ndị nọ n’ala ahụ ghọworo Ndịàmà Jehova ná nso nso a. Ọ na-atụle ụfọdụ omenala na omume obodo ndị pụrụ ịdị iche ná ndị dị n’ebe i bi. O yikarịrị ka ị ga-ahụta ọdịiche ya dị ka ihe na-adọrọ nnọọ mmasị. N’otu oge ahụ, isiokwu a na-enye ndụmọdụ Bible kwesịrị ekwesị nke ị ga-ahụta na ọ dị irè ọbụna ma ọ bụrụ na omenala agbamakwụkwọ dị iche n’obodo gị.

“AGBAMAKWỤKWỌ Ndị Kraịst Nke Na-enye Ọṅụ” bụ isiokwu dị mma dịrị ọmụmụ n’Ụlọ Nche nke October 15, 1984. Isiokwu na-eso ya ná mbipụta ahụ ka a kpọrọ “Nweta Ezi Ọṅụ n’Oriri Agbamakwụkwọ.” (Maka onye ọ bụla na-atụle ịlụ di ma ọ bụ nwunye, e nwere ndụmọdụ amamihe ndị ọzọ n’akwụkwọ Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ, isi nke 2, na Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, isi nke 19 na 20.)a Ọtụtụ aghọwo Ndịàmà Jehova kemgbe isiokwu ndị ahụ pụtara, ya mere anyị chọrọ ịtụleghachi ụfọdụ ihe ọmụma sitere n’isiokwu ndị ahụ nke dị irè karịsịa n’ebe anyị bi, nakwa isi ihe ndị ọzọ kwesịrị ekwesị ga-enyere gị aka ime agbamakwụkwọ oge na-enye Jehova, Onye Malitere alụmdi na nwunye, nsọpụrụ.

Ajụjụ a pụrụ ibu ụzọ tụlee bụ, Olee mgbe e kwesịrị ịgba akwụkwọ? Oge agbamakwụkwọ nke ọdịnala obodo ò kwesịrị iduzi ụbọchị a ga-eme ya? Nkwenkwe obodo bụ na alụmdi na nwunye ọ bụla weere ọnọdụ n’oge ọ bụla ọzọ n’ime afọ agaghị aga nke ọma. Nke a bụ nkwenkwe ụgha na-enweghị ntọala, n’ihi na ọtụtụ di na nwunye ji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi n’ịdị n’otu agbaghị akwụkwọ n’oge ọdịnala. Anyị adịghị ekwenye n’isi ọma ma ọ bụ n’isi ọjọọ. (Aịsaịa 65:11; Ndị Kọlọsi 2:8) Anyị agaghị enyere ndị ikwu na-ekweghị ekwe aka ịhụ ọdịiche dị n’etiti eziokwu na ụgha ma ọ bụrụ na anyị esetịpụ ụbọchị agbamakwụkwọ ka o kwekọọ ná nkwenkwe ụgha ha. Eziokwu dị na ya bụ, ndị Kraịst pụrụ ịgba akwụkwọ n’ọnwa ọ bụla.

Mgbe e dokwara okwu agbamakwụkwọ ma ememe obodo dị mkpa gasịa, ọ ga-abụ ihe amamihe ịghara ikwe ka e nwee ọtụtụ ụbọchị n’agbata ihe omume abụọ ahụ. Ọ bụrụ na mmadụ abụọ ahụ ga-achọ inwe okwu agbamakwụkwọ ahụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ha kwesịrị ịgakwuru ndị okenye ọgbakọ n’ezi oge tupu mgbe ahụ iji rịọ ka ha jiri ụlọ nzukọ ahụ mee ihe. Ndị okenye ọgbakọ ga-anwapụta na ndokwa ndị e mere maka ememe ahụ ga-eme ka ha nwee akọ na uche dị ọcha. E kwesịrị isetịpụ oge ka ya na ihe omume ọ bụla nke ọgbakọ ghara ịsọkọta isi. Nwanna a họọrọ ikwu okwu agbamakwụkwọ ahụ ga-eso ndị ahụ na-aga ịlụ kwurịta okwu iji nye okwu ndụmọdụ na-enye aka ma jide n’aka na e nweghị ihe mgbochi n’ụzọ omume ma ọ bụ iwu n’ebe alụmdi na nwunye ahụ dị nakwa na o kwenyere n’atụmatụ maka nnọkọ ntụrụndụ ọ bụla ga-esochi. Okwu agbamakwụkwọ ahụ kwesịrị ịdịru ihe dị ka ọkara otu hour n’ogologo, a ga-ekwukwa ya n’ụzọ dị ùgwù, na-emesi ike akụkụ ime mmụọ ya. Okwu agbamakwụkwọ ahụ dị nnọọ mkpa karịa oriri ọ bụla ga-esochi.

Agbamakwụkwọ ndị Kraịst bụ ohere dị mma iji gosi na anyị “esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:14; Jemes 1:27) Ịdị n’usoro anyị kwesịrị ịpụta ìhè. Nke a ga-apụta na anyị ga-abịa n’oge kama ime ka ndị mmadụ na-echere, ikekwe na-emetụta ihe omume ọgbakọ. Nke a karịsịa bụ ihe nwanyị a na-alụ ọhụrụ ga-aghọta, ebe ọ bụ na ndị ikwu bụ́ ndị ụwa pụrụ ịgba ya ume ịbịa n’azụ oge—dị ka a ga-asị na ọ ga-ebuli ịdị mkpa ya. Site n’ịbịa n’oge nwanna nwanyị bụ́ onye Kraịst tozuru okè pụrụ igosipụta na àgwà ime mmụọ, dị ka ịdị umeala n’obi na nchebara echiche, dị ya mkpa! Ọzọkwa, mgbe a kpọrọ onye na-ese foto ka o sere ihe omume ahụ, ịdị n’usoro dị mkpa. Anyị ga-eme nke ọma ịchọ ka onye ahụ na-ese foto yiri kootu, taị, na traụza dị mma nakwa na ọ dịghị adọpụ uche n’okwu ahụ mgbe ọ na-ese foto. E kwesịghị ise foto ọ bụla mgbe a na-ekpe ekpere. Ịdị n’usoro anyị ga-enye Jehova nsọpụrụ ma gbaa ezi àmà. Ọ dịghị mkpa ịgbalị ikwekọ n’ihe ọha mmadụ na-emekarị bụ́ ndị ga-ekpuchi ihe ememe ahụ pụtara n’ezie.

A chọghị oriri ka agbamakwụkwọ wee bụrụ ihe gara nke ọma, ma ọ dịghị ebe Akwụkwọ Nsọ kagburu ụdị oge obi ụtọ dị otú ahụ. Otú ọ dị, ụdị nnọkọ ahụ maka ezi ndị Kraịst kwesịrị ịdị iche site n’oriri ndị ụwa ndị e ji imebiga ihe ókè, ịṅụ oké mmanya, iribiga ihe ókè, egwú na-ada oké ụda, ịgba egwú na-akpali mmekọahụ, na ọbụna ọgụ mara. Bible na-agụnye “oriri oké mkpọtụ” n’ọrụ nke anụ ahụ. (Ndị Galetia 5:21, NW) Ọ ka mfe ịchịkwa ya nke ọma mgbe ọ na-abụchaghị nnukwu nnọkọ. Ọ dịghị mkpa iguzobe ụlọ ntu iji kwekọọ n’omenala a na-anakwere. Ọ bụrụ na ụfọdụ ekpebie iji ụlọ ntu mee ihe n’ihi ohere ma ọ bụ ihu igwe, nke a bụ okwu aka mmadụ.

Ahụmahụ egosiwo na ụzọ dị mma iji kpaara ọnụ ọgụgụ nke ndị ọbịa ókè bụ iji ịkpọ òkù e dere ede kpọmkwem mee ihe. Ọ bụ ihe amamihe karị ịkpọ ndị mmadụ n’otu n’otu karịa ọgbakọ dum, dịkwa ka ndị Kraịst na-adị n’usoro, anyị kwesịrị ịkwanyere ụdị ịkpa ókè ahụ ùgwù. Ịkpọ òkù e dere ede na-enyekwara anyị aka izere mmechuihu nke onye a chụpụrụ achụpụ ịbịa n’oriri ahụ, n’ihi na nke ahụ mee, ọtụtụ ụmụnna nwoke na nwanyị pụrụ ịhọrọ ịpụ. (1 Ndị Kọrint 5:9-11) Ọ bụrụ na di na nwunye akpọọ ndị ikwu ma ọ bụ ndị ha ma ama na-ekweghị ekwe òkù, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị a ga-adị nta n’ọnụ ọgụgụ, na-ewere “ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị” dị ka ndị ka mkpa. (Ndị Galetia 6:10) Ụfọdụ ahọrọwo ịkpọ ndị ụwa ha ma ama ma ọ bụ ndị ikwu na-ekweghị ekwe n’okwu agbamakwụkwọ karịa n’oriri. N’ihi gịnị? E nwewo ọnọdụ mgbe ndị ikwu bụ́ ndị ụwa mere ihe na-emechu ihu n’oriri agbamakwụkwọ nke na ọtụtụ ụmụnna nwoke na nwanyị chere na ha apụghị ịnọgide. Ụfọdụ di na nwunye ahaziwo isoro ndị òtù ezinụlọ ha na ndị enyi bụ́ ndị Kraịst nwee ntakịrị oriri.

N’ikwekọ na Jọn 2:8, 9, o kwesịrị ekwesị ịhọrọ “onye isi oriri.” Onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ ga-achọ ịhọrọ onye Kraịst ọ tụkwasịrị obi nke ga-ahụ na a nọgidere na-enwe ịdị n’usoro na ụkpụrụ ndị dị elu. Ọ bụrụ na ndị enyi eweta onyinye, e kwesịrị ime nke a n’emeghị “oké ngosi.” (1 Jọn 2:16, NW) Egwú pụrụ inye obi ụtọ ọ bụrụ na ọ bụghị nke e ji okwu egwú a na-enyo enyo, ụzụ gafere ókè, ma ọ bụ oké ụda egwú tetọsịa. Ọtụtụ ahụtawo ya dị ka ihe kasị mma ime ka onye okenye gee egwú a gaje ịkpọ tupu oge eruo. Ịgba egwú pụrụ iweta ihe mkpọbi ụkwụ, ebe ọ bụ na e sitere n’ịgba egwú ọmụmụ nwa nweta ọtụtụ ịgba egwú ọdịnala, ọ na-enwekwa mkpali ihe anụ ahụ na-ekwesịghị ekwesị. “Oge kekị na mmanya champagne” mgbe ụfọdụ abụrụwo ihe mgbaàmà maka ndị ụwa ịgbawa ara. N’ezie, ọtụtụ ndị di na nwunye bụ́ ndị Kraịst ekpebiwo ịghara inwe mmanya ọ bụla na-aba n’anya n’oriri agbamakwụkwọ, si otú na-ezere nsogbu.

Ebe ọ bụ na anyị chọrọ ịsọpụrụ Jehova, anyị ga-ezere ime ngosi iji dọrọ uche n’ụzọ gafere ókè gaa n’ebe anyị onwe anyị nọ. Ọbụna mbipụta ndị ụwa ekwuwo okwu megide mmụọ zuru ebe nile nke ime ihe n’ụzọ gafere ókè. Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe amamihe na-adịghị ya ịbanye n’ụgwọ n’ihi oké agbamakwụkwọ ma mesịa nọrọ n’ụkọ ruo ọtụtụ afọ iji kwụọ ihe e mefuru n’otu ụbọchị ahụ! Otú ọ dị, uwe ọ bụla e yiri n’oge ahụ kwesịrị ikwesị ekwesị ma bụrụ nke a haziri nke ọma, na-ekwesị onye na-ekwupụta egwu Chineke. (1 Timoti 2:9, 10) Isiokwu bụ́ “Agbamakwụkwọ Ndị Kraịst Kwesịrị Igosipụta Ezi Uche” (Ụlọ Nche [Bekee] nke January 15, 1969) kwuru ihe a na-adọrọ mmasị banyere uwe:

“Agbamakwụkwọ mmadụ bụ oge pụrụ iche, ya mere a na-etinyekarị uche igosipụta ọṅụ na ịdị mma n’anya. Ma nke a apụtaghị na mmadụ aghaghị iyiri otu ụdị uwe mwụda ma ọ bụ kootu. Mmadụ kwesịrị ịtụle otú ndị ógbè ya si adụ uwe, ihe ọ ga-efu na ihe na-amasị ya. . . . Otú ọ dị, ọ̀ ga-abụ ihe ezi uche dị na ya ịzụ ejiji dị oké ọnụ dị otú ahụ iji kpatara onwe ha ma ọ bụ ndị ọzọ ibu arọ ego? . . . Ọ masịwo ụfọdụ ndị nwanyị a na-alụ ọhụrụ iji uwe mwụda nke ezi enyi ma ọ bụ onye ikwu mee ihe. Ndị ọzọ enwetawo oké afọ ojuju site n’ịdụ uwe nwanyị a na-alụ ọhụrụ nke ha, ikekwe n’ụzọ dị otú ahụ nwee ike inwe uwe nke a pụrụ iji eme ihe n’oge ọzọ n’ọdịnihu. O kwesịkwara nnọọ ekwesị ka nwoke na nwanyị yiri uwe ha kasị mma bụ́ nke ha nweburu gbaa akwụkwọ . . . Ndị ọzọ bụ́ ndị pụrụ ịnọ n’ọnọdụ nke ịgba akwụkwọ na-efu oké ego nwere ike ịchọ n’onwe ha inwe ‘agbamakwụkwọ dị jụụ’ n’ihi ịdị oké egwu nke oge a.”

N’otu aka ahụ, òtù agbamakwụkwọ ahụ (ndị enyi nke onye na-alụ nwunye ọhụrụ na ndị inyom bụ ndị enyi nwanyị a na-alụ ọhụrụ) adịghị mkpa ịdị ọtụtụ. Ha onwe ha kwa agaghị achọ ịdọrọ uche gaa n’ebe ha nọ n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị site n’uwe na omume ha. Ọ bụ ezie na a pụrụ ikwe ka onye a chụpụrụ n’ọgbakọ bịa gee okwu ahụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Nche nke October 15, 1984, kwuru, sị: “Ọ gaghị ekwesị ekwesị ma e nwee ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ ndị ụzọ ọjọọ ha si ebi ndụ megidere ụkpụrụ Bible n’ụzọ dị ukwuu nke so n’òtù agbamakwụkwọ ahụ.”

Ọ bụ ezie na Jisọs gara agbamakwụkwọ, anyị apụghị iche n’echiche na ọ ga-akwado omenala a na-anakwere nke inwe ịkwụ n’ahịrị nke obere ụgbọala na-aga gburugburu obodo na-eme oké ụzụ; ọbụna ndị uwe ojii adawo ndị ọkwọ ụgbọala nhá maka igbu opi n’ụzọ na-ada oké ụda n’ịkwụ n’ahịrị nke agbamakwụkwọ. (Lee Matiu 22:21.) N’ihe ndị a nile, kama iṅomi ime oké ngosi ma ọ bụ omume ndị mba ọzọ nke a na-ahụkarị, ndị Kraịst na-egosipụta amamihe nke dị n’ebe ndị dị umeala n’obi nọ.—Ilu 11:2.

Ma gịnị banyere ịga agbamakwụkwọ nke ndị agbata obi, ndị ụwa e so arụkọ ọrụ, ma ọ bụ ndị ikwu dị anya na ndị a maara? Onye Kraịst nke ọ bụla aghaghị ime mkpebi banyere nke a n’onwe ya. Ọ dị mma iburu n’uche na oge anyị dị oké ọnụ ahịa, ebe oge dị anyị mkpa maka ozi anyị, ọmụmụ ihe onwe onye, na nchụso ezinụlọ na nke ọgbakọ ndị ọzọ. (Ndị Efesọs 5:15, 16) Ná ngwụsị izu, anyị na-enwe nzukọ na ozi ubi nke anyị na-agaghị achọ ka ha kwaa anyị. (Ndị Hibru 10:24, 25) Oge e tinyere a ga-eme ọtụtụ agbamakwụkwọ na-emegide mgbakọ ma ọ bụ mgbalị ozi pụrụ iche ndị e jikọrọ ha na Nri Anyasị Onyenwe Anyị. Anyị ekwesịghị ikwe ka a dọpụ uche anyị n’ime otu mgbalị ahụ pụrụ iche nke ụmụnna anyị gburugburu ụwa na-eme iji gaa Nri Anyasị Onyenwe Anyị. Tupu anyị amara eziokwu ahụ, anyị na-eji oge dị ukwuu soro ndị ụwa nọrọ, eleghị anya n’ọnọdụ ndị na-adịghị enye Chineke nsọpụrụ. (1 Pita 4:3, 4) Ugbu a ihe ndị ka anyị mkpa dị iche. O kwere omume mgbe nile ichere di na nwunye echiche ọma site n’izije kaadị ma ọ bụ mee nleta dị mkpirikpi n’ụbọchị ọzọ. Ụfọdụ ejiriwo oge dị otú ahụ gbaa àmà, na-ekerịta ụfọdụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị kwesịrị ekwesị maka ndị gbara akwụkwọ ọhụrụ.

Agbamakwụkwọ ebe ihe ime mmụọ na-achịkwa ụzọ ụwa si eme ihe ga-asọpụrụ Jehova n’ezie. Site n’iji n’aka na ha dị iche n’ụwa na nkwenkwe ụgha na imebiga ihe ókè ya, site n’ịghara ikwe ka o gbochie ihe omume ọchịchị Chineke a na-eme mgbe nile, nakwa site n’igosipụta obi umeala kama ime oké ngosi, ndị Kraịst ga-anụ ụtọ oge ahụ. Ọzọkwa, ha ga-enwe ike ileghachi anya azụ n’ihe omume ahụ, na-enwe ezi akọ na uche na ihe ncheta ọma. Site n’igosipụta amamihe na ezi uche, ka agbamakwụkwọ ndị Kraịst anyị nile gbaara ndị obi ha ziri ezi na-ekiri ihe na-emenụ àmà.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ndị Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 24, 25]

Ndị Kraịst adịghị agbaso omenala agbamakwụkwọ nile nke obodo n’ajụghị ase

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya