Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 5/15 p. 22-25
  • Ụzọ Isi Nweta Olileanya n’Oge Obi Nkoropụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Isi Nweta Olileanya n’Oge Obi Nkoropụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olileanya n’Agbanyeghị Ule Dị Iche Iche
  • Ihe Ọma Ọ Bụla Ọ̀ Pụrụ Isi n’Ule Pụta?
  • Tụkwasị Jehova Obi
  • “Nwee Olileanya n’Ebe Jehova Nọ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • N’agbanyeghị Ọnwụnwa, Jidesie Okwukwe Gị Ike!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Job—Nwoke Nwere Ntachi Obi Ma Kwesị Ntụkwasị obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-ele Ọnwụnwa Anya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 5/15 p. 22-25

Ụzọ Isi Nweta Olileanya n’Oge Obi Nkoropụ

WERE ya na ị gaje inwe ahụmahụ ndị na-esonụ: E kpochapụrụ ihe onwunwe gị nile, na-ahapụ gị ịnọ n’ụkọ. Ụmụ gị—ndị na-enye gị ọṅụ ná ndụ—anọkwaghị. Onye ị na-alụ adịghị enye gị nkwado agbamume. Ahụ ike gị adakpọwo n’ụzọ nkịtị. Ụbọchị ọ bụla na-abụ ahụmahụ ọjọọ na-egbu mgbu.

Ọ bụrụ na nke a aghọọ ọnọdụ gị ná ndụ, ị̀ pụrụ ịchọta ihe mere ị ga-eji nọgide na-adị ndụ? Ka ị̀ ga-adaba n’obi nkoropụ?

Ọnọdụ a dị mwute nke a ka kọwapụrụ bụ ahụmahụ mere eme ná ndụ Job, nwoke nke dịrị ndụ n’oge Bible. (Job, isi nke 1, 2) N’oge ọ dara oké mbà n’obi, Job kwara arịrị, sị: “Ike ndụ m agwụwo mkpụrụ obi m.” Ọ gaara anabata ọnwụ dị ka ihe ahụ efe. (Job 10:1; 14:13) Otú ọ dị, n’agbanyeghị ahụhụ ya dị oké ukwuu, Job nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke. Ya mere Jehova “gọziri ikpeazụ Job karịa mmalite ya.” O si otú a nwụọ n’udo, “bụrụ agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ.”—Job 42:12, 17.

Job setịpụrụ ihe nlereanya n’ịtachi obi nke a na-eto ruo taa. Ọnwụnwa ya nụchara ụdị mmadụ ọ bụ ma kpasuo ndị ọzọ ịrụ ọrụ ọma. (Jemes 5:10, 11) Nke kasị mkpa, iguzosi ike n’ezi ihe n’enweghị ntụpọ nke Job mere ka obi Jehova ṅụrịa. (Ilu 27:11) Otú a ka o si bụrụ na ahụmahụ ọjọọ nke oké ihe mgbu mesịrị ghọọ mmeri dị ukwuu nke nsọpụrụ Chineke, okwukwe, na iguzosi ike n’ezi ihe nke wetaara Job na ndị nile ihe nlereanya ya kpaliworo ngọzi.

Olileanya n’Agbanyeghị Ule Dị Iche Iche

Ị pụrụ inweta ule ndị yiri ndị ahụ Job nwetara. Ọ pụrụ ịbụ na ọnwụ nke onye ị hụrụ n’anya emewo ka ị bụrụ onye a kụpịara n’ụzọ mmetụta uche. Ọ pụrụ ịbụ na nrịanrịa siri ike emewo ka ịdị ndụ gị bụrụ ahụmahụ na-egbu mgbu. Ọ pụrụ iyi ka ndụ gị nile ọ dakpọsịwo n’ihi ịgba alụkwaghịm na-akụri obi. Ndala azụ n’akụ̀ na ụba pụrụ ịhapụwo gị n’ụkọ. Ị pụrụ ịbụ onye ndị mmegide na-akpọ ezi ofufe asị na-akpagbu n’ụzọ obi ọjọọ. Ọ pụrụ ịbụ na mgba ị na-agba ịnagide ule gị nile emewo ka i chee na olileanya ọ bụla adịghị n’ọdịnihu gị.—1 Pita 1:6.

Kama ịdaba n’obi nkoropụ, jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị mere m ji na-ata ahụhụ?’ Ị na-ata ahụhụ n’ihi na ị na-ebi n’ụwa nke ‘na-atọgbọ n’aka ajọ onye ahụ,’ bụ́ Setan Ekwensu. (1 Jọn 5:19) N’ihi ya, onye ọ bụla na-ata ahụhụ. N’ụzọ ụfọdụ, ịkpọ ozi Alaeze ahụ asị nke Ekwensu na-akpali, okwu ndị ọzọ na-ejighị ịhụnanya kwuo, ma ọ bụ omume jọgburu onwe ha nke àgwà asọpụrụghị Chineke nke dị ebe nile ‘n’oge ndị a dị oké egwu’ na-emetụta anyị nile.—2 Timoti 3:1-5.

Ọ bụrụ na ihe ọdachi emewo ná ndụ gị, ọ pụrụ ịbụ na ị bụwo onye “mgbe na ihe ndapụta” dakwasịrị. (Eklisiastis 9:11) N’aka nke ọzọ, mgbe ụfọdụ ihe adịghị agazi agazi ná ndụ n’ihi mmehie nke onwe anyị e ketara eketa. (Ndị Rom 5:12) Ọ bụrụgodị na i mehiere n’ụzọ dị njọ ma chegharịa wee chọọ enyemaka ime mmụọ, echela na Chineke agbahapụwo gị. (Abụ Ọma 103:10-14; Jemes 5:13-15) Karịa onye ọ bụla ọzọ, ọ na-eche banyere anyị. (1 Pita 5:6, 7) Ị pụrụ inwe obi ike na “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.” (Abụ Ọma 34:18) N’agbanyeghị otú ule gị si dị oké njọ ma ọ bụ sie ike, Jehova pụrụ inye gị amamihe iji mee ihe banyere ya. (Jemes 1:5-8) Cheta mgbe nile na Jehova pụrụ imela ọnyá nile. Mgbe i nwere ihu ọma ya, ọ dịghị ihe pụrụ igbochi gị inweta ihe mgbata n’ọsọ nke ndụ.—Ndị Rom 8:38, 39.

Ihe Ọma Ọ Bụla Ọ̀ Pụrụ Isi n’Ule Pụta?

Otu okwu a na-ekwu na-asị, “Igwe ojii ọ bụla nwere akara ọlaọcha.” Nke a bụ ụzọ dị mfe iji kwuo na n’agbanyeghị otú ihe si dị njọ, ị pụrụ ịchọta mgbe nile ihe mere ị ga-eji nwee olileanya. Nzube nke ihe nile e dere n’Okwu Chineke bụ ka anyị wee “nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) N’agbanyeghị otú ọnọdụ gị si sie ike, nkwa na ụkpụrụ ndị dị na Bible pụrụ iwetara gị ọṅụ na olileanya e mere ka ha dịghachi ọhụrụ.

Akwụkwọ Nsọ na-egosi na ‘mkpagbu dị mfe, dịkwa nwa oge’ mgbe e ji ya tụnyere ngọzi ebighị ebi e setịpụrụ n’ihu ndị hụrụ Chineke n’anya. (2 Ndị Kọrint 4:16-18) Bible na-egosipụtakwa na àgwà nsọpụrụ Chineke a zụlitere n’oge ule bara uru nke ukwuu karịa ide ude ma ọ bụ akụ̀ na ụba nkịtị. (1 Jọn 2:15-17) Otú a, ọbụna ahụhụ pụrụ ịrụpụta ihe bara uru. (Ndị Hibru 5:8) N’ezie, itinye ihe a mụtara n’oge ule n’ọrụ pụrụ iwetara gị ngọzi ndị ị na-atụghị anya ha.

Ule tara akpụ pụrụ ime ka ị dịkwuo nro. Ị pụrụ ikweta na n’oge gara aga i nwere ọdịdị nke na-akpasu ndị ọzọ iwe, gbochiekwa ọbụna ọganihu ime mmụọ gị. Eleghị anya ọ bụ inwebiga obi ike ókè. Mgbe otu ọdachi tiri gị ihe otiti, ị pụrụ ịghọta ozugbo otú i si bụrụ onye na-esighị ike nakwa otú ndị ọzọ dịruru gị mkpa. Ọ bụrụ na ule ahụ akụziworo gị ihe ahụ, i meekwa mgbanwe ndị dị mkpa, ọ baworo gị uru.

Gịnị ma ọ bụrụ na, n’oge gara aga, ọ na-esiri ndị ọzọ ike iso gị mekọọ ihe n’ihi na ọ na-esiri gị ike ịchịkwa mmụọ gị? Ọbụna ọ pụrụ ịbụ na nke a akpataworo gị ụfọdụ nsogbu n’ihe banyere ahụ ike gị. (Ilu 14:29, 30) Otú ọ dị, ugbu a, ọnọdụ ahụ pụrụ ịka nnọọ mma n’ihi na ị na-adabere na mmụọ Chineke inyere gị aka inwe njide onwe onye.—Ndị Galetia 5:22, 23.

Dị ka ndị ọzọ, ọ pụrụ ịbụ na n’otu oge i nweghị ọmịiko iji meere ndị mehierenụ ebere. Ma ọ bụrụ na gị onwe gị adabaa n’ọnọdụ i chere na i nwere mkpa dị ukwuu maka ebere, o yikarịrị ka ị ga na-achọ imere ndị ọzọ ebere karị ugbu a. Ọmịiko, nchegbu, na ebere na-enye obi ụtọ e gosiworo gị emewo ka ị mata na i kwesịrị igosipụta otu ụdị àgwà ndị ahụ n’ebe ndị mere ihe ọjọọ nwere nchegharị nọ. Ọ bụrụ na ihe mgbu gị akpaliwo gị idozi adịghị ike ndị a n’omume gị, nke a bụ otu abamuru i nwetaworo site n’ahụmahụ gị. Ị mụtawo na “ebere na-anyara ikpe isi.”—Jemes 2:13; Matiu 5:7.

Gịnị ma ọ bụrụ na ahụhụ ọgbakọ nyere anapụwo gị ihe ùgwù ndị ị hụrụ n’anya na nkwanye ùgwù nke ndị ọzọ? Adabala n’obi nkoropụ. Ịdọ aka ná ntị na-enye aka idebe ọgbakọ ọcha, ma ebumnobi ya gụnyere mweghachi ime mmụọ nke onye ahụ mere ihe ọjọọ. N’ezie, “ozizi nile site n’inye ahụhụ na-adị ka ihe na-adịghị eweta ọṅụ n’oge dị ugbu a, kama mwute: ma e mesịa ọ na-enyeghachi ndị ahụ e werewooro ya nwapụta ha mkpụrụ nke dị n’udo, bụ́ mkpụrụ nke ezi omume.” (Ndị Hibru 12:11, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ọ bụ ezie na inye ahụhụ pụrụ ịbụ ihe otiti na-egbu oké mgbu, ọ dịghị ahapụ onye ahụ dị umeala nwere nchegharị n’enweghị olileanya. E nyere Eze Devid nke Israel oge ochie ahụhụ dị ukwuu maka ime ihe ọjọọ, ma o chegharịrị ma mesịa nata ịja mma pụrụ iche dị ka nwoke nwere okwukwe pụrụ iche.—2 Samuel 12:7-12; Abụ Ọma 32:5; Ndị Hibru 11:32-34.

Ule pụrụ imetụta echiche gị n’ụzọ dị ukwuu. N’oge gara aga, ọ pụrụ ịbụ na ị na-elekwasị anya n’ihe mgbaru ọsọ na nchụso nke ihe onwunwe ndị mere ka a mara gị, buliekwa ọkwá gị n’ọha mmadụ n’ime ụwa a. Eleghị anya ule nke e jikọrọ ya na mfu ego ma ọ bụ mfu ihe onwunwe atụkwasịwo echiche gị n’ihe ndị ka mkpa. (Tụlee Ndị Filipaị 1:10.) Ugbu a ị na-aghọta na uru na ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ n’ozi dị nsọ bụ nanị ihe ndị na-eweta ezi ọṅụ na afọ ojuju na-adịgide adịgide.

Tụkwasị Jehova Obi

Ijere Jehova ozi dị nsọ pụrụ ịrụpụta mkpagbu na ahụhụ n’aka ndị na-emegide nkwenkwe ndị Kraịst gị. Ị pụrụ inwe mmetụta nke onye e wedara n’ala n’ihi ule a, ma ihe ọma pụrụ isi na ya pụta. Ule a pụrụ iwusi okwukwe gị ike. Ọzọ, a pụrụ ịgba ndị ọzọ na-enweta mkpagbu ume ma wusie ha ike site n’ịhụ nnọgidesi ike gị. A pụrụ ịkwali ndị ji anya ha hụ àgwà ọma gị inye Chineke otuto. Ọbụna ndị na-emegide gị pụrụ inwe mmechuihu wee jaa ọrụ ọma gị mma!—1 Pita 2:12; 3:16.

Iji zere obi nkoropụ mgbe a na-akpagbu gị, ọ dị gị mkpa ịtụkwasị Jehova obi. Okwu ya na-egosi na ahụ efe pụọ n’ule aghaghị ịbịa, ma o nwere ike ọ gaghị abịarute ngwa ngwa dị ka ị chọrọ. Ka ọ dịgodị ugbu a, “ike agwụla [gị] n’obi n’ime ihe ọma.” (2 Ndị Tesalọnaịka 3:13) Nọgide na-achọ ụzọ dị iche iche iji nagide ule ma tachie obi. Ọbụna mgbe ihe yiri ka olileanya adịghị ya, “tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga na-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 55:22) Kama imikpu onwe gị n’iruru onwe gị újú, chee echiche banyere otú i si bụrụ onye a gọziri agọzi ịmara Jehova, inwe ọnọdụ n’etiti ndị ya, nakwa inwe olileanya nke ndụ na-enweghị ngwụsị.—Jọn 3:16, 36.

Tụkwasị uche gị n’ihe ndị dị mkpa. Gakwuru Jehova kwa ụbọchị n’ekpere, na-arịọ maka ume ịtachi obi. (Ndị Filipaị 4:6, 7, 13) Wepụ echiche ọ bụla nke imegwara ndị na-akpatara gị ahụhụ. Hapụrụ Jehova okwu ahụ. (Ndị Rom 12:19) Nọgide na-achọ ụzọ ịnụcha ụdị mmadụ ị bụ, na-azụlite àgwà ndị Kraịst. (2 Pita 1:5-8) Nwee ekele maka ihe nile ndị ọzọ meere gị, gụnyere ndị okenye ji ịhụnanya na-elekọta mkpa ime mmụọ gị. (Ndị Hibru 13:7, 17) Kwesị ntụkwasị obi nye Chineke, na-elegidekwa anya gị n’ihe mgbata n’ọsọ nke ndụ, na-enwe obi ike na ọbụna ọnwụ apụghị ịnapụ gị ya.—Jọn 5:28, 29; 17:3.

Ọ bụrụ na ị na-enwe mwute dị ukwuu ma ọ bụ ule siri ike ugbu a, “tụkwasị Jehova obi gị nile,” ọṅụ dị ukwu ga-emesịakwa nọchie iru újú na ihe isi ike gị. (Ilu 3:5, 6; Jọn 16:20) Obi ụtọ ga-anọchi anya nhụsianya mgbe Chineke ga-agọzi gị dị ka ọ gọziri Job. Ahụhụ ndị dị n’oge a enweghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere ụgwọ ọrụ gị. (Tụlee Ndị Rom 8:18.) Ntachi obi gị n’ikwesị ntụkwasị obi pụrụ ịgba ndị ọzọ ume ma nyere gị aka ịzụlite àgwà ndị Kraịst mara mma ndị na-eso “mmadụ ọhụrụ” ahụ abịa. (Ndị Efesọs 4:23, 24; Ndị Kọlọsi 3:10, 12-14) Ya mere, mgbe ahụ, nweta obi ike site n’okwu ndụmọdụ Pita onyeozi: “Ka ndị na-ahụ ahụhụ dị ka ọchịchọ Chineke si dị werekwa mkpụrụ obi ha n’ime ezi ihe nye n’aka Onye okike kwesịrị ntụkwasị obi idebe.”—1 Pita 4:19.

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Dịrị ka Job. Ahapụla inwe olileanya mgbe ọ bụla

[Foto dị na peeji nke 24]

Tụkwasị Jehova obi gị nile

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya