Kpachara Anya Banyere Ịkọwahie Ebumnobi
OTU onye okwuchukwu telivishọn a ma ama kwuru okwu nkatọ jọgburu onwe ya banyere onye okwuchukwu ibe ya maka ịkwa iko nke onye lụrụ nwunye. Otú ọ dị, n’ime otu afọ, e jidere onye okwuchukwu ahụ boro ebubo ahụ ya na otu akwụna.
N’ọnọdụ ọzọ, otu ike ụwa bụ isi zigara ndị ozi ka ha mee ka ìgwè ndị na-eburịta agha kparịta ụka udo. Ka ọ dị mgbe ahụ, otu mba ahụ zigara na nzuzo ndị na-agbara ha mgbere ngwá agha gaa ná mba ndị ọzọ ka ha ree ngwá agha ruru ọtụtụ ijeri dollar.
Ebe ọ bụ na ihu abụọ pụtara ìhè ezuwo nnọọ ebe nile, ọ̀ na-eju anya na inwe obi abụọ anọchiwo anya ntụkwasị obi n’ụzọ dị ukwuu? Nye ọtụtụ ndị, inyo ebumnobi ndị ọzọ enyo abawo ha n’ọbara.
Dị ka ndị Kraịst, anyị aghaghị ilezi anya ka àgwà ndị dị otú ahụ ghara imetụta mmekọrịta anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị. Ọ bụ ezie na Jisọs Kraịst gbara anyị ume ịbụ “ndị nwere uche dị ka agwọ” n’etiti ndị iro anyị, o kwughị na anyị kwesịrị ịdị na-enyo ezi ụmụazụ ya enyo. (Matiu 10:16) Ya mere, mgbe ahụ, gịnị bụgasị ihe ize ndụ dị n’ịkọwahie ebumnobi ndị ọzọ? N’ebe ndị dị aṅaa ka anyị na-aghaghị ilezi anya karịsịa iji zere àgwà dị otú ahụ? Oleekwa otú anyị pụrụ isi chekwaa mmekọrịta anyị dị oké ọnụ ahịa anyị nwere n’ebe ndị Kraịst ibe anyị nọ?
Ihe Mmụta Sitere n’Oge Gara Aga
Ịkọwahie ebumnobi ndị ọzọ n’enweghị ezi ihe kpatara ya na ikpe ha ikpe bụ otu ihe ahụ. Ọ dị ka a ga-asị na anyị na-amaba ná nkwubi okwu na okwu ma ọ bụ omume ha bụ nanị atụmatụ ọjọọ nke na-ezo ihe dị aghụghọ ma na-egosi obi ilu. Ọtụtụ ugboro ihe na-akpata nsogbu ahụ n’ezie bụ ile ihe anya n’ụzọ hiere ụzọ, dị ka a pụrụ ịhụ site n’ihe ndekọ Bible dị na Joshua isi nke 22.
Ndị Israel emerichawo Ala Nkwa ahụ, ọ dịbeghịkwa anya ha natara ókèala ebo ha dị iche iche. Ebo Reuben na Gad na nkera ebo Manase wuru otu ebe ịchụàjà “ukwu n’ile ya anya” n’akụkụ Osimiri Jọdan. Ebo ndị ọzọ chere n’ụzọ na-ezighị ezi na nke a bụ omume ndapụ n’ezi ofufe. E chere na ebo atọ ahụ na-aga iji oké ihe owuwu a na-achụ àjà kama ịga n’ụlọikwuu nzute dị na Shaịlo, bụ́ ebe a họpụtara maka ofufe. Ozugbo, ebo ndị ahụ na-ebo ha ebubo kwadebere ibuso ha agha.—Joshua 22:10-12.
Ọ dabaara ha na ha ziri ụmụnna ha ndị Israel ozi site n’iziga ndị nnọchiteanya nke Finehas nọ n’isi ya. Mgbe ha nụrụ ebubo nke ekwesịghị ntụkwasị obi, nnupụisi, na ndapụ n’ezi ofufe megide Jehova, ebo ndị ahụ e chere na ha mejọrọ kọwara ihe mere ha ji nwee akatamkpo ebe ịchụàjà a. Kama ịbụ ebe a na-achụ àjà, ọ gaje ịbụ “ihe àmà” nye ịdị n’otu nke ebo nile nke Israel n’ife Jehova ofufe. (Joshua 22:26, 27) Ndị nnọchiteanya ahụ lọghachiri na-enwe afọ ojuju na ọ dịghị ihe ọjọọ dị n’ebe ụmụnna ha nọ. E si otú ahụ gbochie agha obodo na mwụfu ọbara dị oké njọ.
Lee ihe mmụta ọ bụụrụ anyị ịghara ịdị ngwa n’ịkọwahie ebumnobi ndị ọzọ! Ọtụtụ ugboro a na-achọpụta na ihe yiri ka ọ bụ eziokwu site n’ile ihe anya elu elu na-abụ ihe dị iche kpam kpam mgbe e ji nlezianya lerukwuo ya anya. Nke a bụ eziokwu n’ọtụtụ akụkụ nke ndụ onye Kraịst.
Ụzọ Anyị Si Ele Ndị Okenye Anya
N’ịrụ ọrụ ha ‘ịzụ nzukọ Chineke dị ka atụrụ,’ ndị okenye na-ahụ ya ịbụ ihe dị mkpa mgbe ụfọdụ inye ndị mmadụ dịgasị iche iche n’ọgbakọ ndụmọdụ. (Ọrụ 20:28) Dị ka ihe atụ, olee otú anyị si emeghachi omume ma ọ bụrụ na onye okenye agwa anyị okwu banyere ụmụ anyị n’okwu ndị dị ka mkpakọrịta ọjọọ ma ọ bụ àgwà na-ezighị ezi n’ebe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha nọ? Ànyị na-ewere ya na o nwere ebumnobi zoro ezo ma na-agwa onwe anyị sị, ‘Ọ dịghị mgbe o nwere mmasị n’ezinụlọ anyị’? Ọ bụrụ na anyị ekwe ka mmetụta ndị dị otú ahụ metụta anyị, anyị nwere ike ịkwa ụta ma e mesịa. Ọdịmma ime mmụọ nke ụmụ anyị pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ, anyị kwesịkwara igosi ekele maka ndụmọdụ na-enye aka nke Akwụkwọ Nsọ.—Ilu 12:15.
Mgbe onye okenye ọgbakọ nyere anyị ndụmọdụ, ka anyị ghara ịdị na-achọ ebumnobi zoro ezo. Kama nke ahụ, ka anyị jụọ onwe anyị ma è nwere ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi rite uru site na ndụmọdụ ya dabeere na Bible. Pọl onyeozi dere, sị: “Ozizi nile site n’inye ahụhụ na-adị ka ihe na-adịghị eweta ọṅụ n’oge dị ugbu a, kama mwute: ma e mesịa ọ na-enyeghachi ndị ahụ e werewooro ya nwapụta ha mkpụrụ nke dị n’udo, bụ́ mkpụrụ nke ezi omume.” (Ndị Hibru 12:11) Ya mere ka anyị na-enwe ekele ma na-echebara ihe echiche nke ọma. Cheta na ọtụtụ ugboro ọ na-esiri ndị okenye ike inye anyị ndụmọdụ dịkwa nnọọ ka ọ na-esiri anyị ike ịnara ya.
Mmetụta Ndị A Na-enwe Banyere Ndị Mụrụ Ụmụ
Mgbe ha na-eche ihe mgbochi ụfọdụ nke ndị mụrụ ụmụ ihu, ụfọdụ ndị na-eto eto na-enwe obi abụọ banyere ebumnobi nke ndị mụrụ ha. Ụfọdụ ndị ntorobịa pụrụ ịjụ, sị: ‘Gịnị mere ndị mụrụ m ji eti ọtụtụ iwu otú a? Ọ ghaghị ịbụ na ha achọghị ka m kporie ndụ.’ Otú ọ dị, kama iru ná nkwubi okwu dị otú ahụ, ọ dị ndị na-eto eto mkpa ịtụle ọnọdụ ahụ n’ụzọ ziri ezi.
Ndị mụrụ ụmụ etinyewo ọtụtụ afọ n’ilekọta ụmụ ha. A chụwo àjà dị ukwuu n’ụzọ ihe onwunwe na n’ụzọ ndị ọzọ iji mee nke a. È nwere ihe ọ bụla mere a ga-eji kwubie na ha ekpebiwo ugbu a ime ka ndụ siere ụmụ ha nọ n’afọ iri na ụma ike? Ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya karị iche na ịhụnanya na-akwali ndị a mụrụ ụmụ ichebe ụmụ ha na ilekọta ha? Ọ̀ bụ na otu ịhụnanya ahụ agaghị na-akwali ha igbochi ụmụ ha ime ihe ụfọdụ, bụ́ ndị na-eche ihe ịma aka ndị ọhụrụ ná ndụ ihu ugbu a? Lee ihe obi ọjọọ na enweghị ekele ọ ga-abụ ịkọwahie ebumnobi ndị mụrụ ụmụ na-ahụ n’anya!—Ndị Efesọs 6:1-3.
Àgwà Anyị n’Ebe Ndị Kraịst Ibe Anyị Nọ
Ọtụtụ ndị na-achọkarị ibu ụzọ kpebie ihe ndị ọzọ bụ ma na-achọ ka ha na-eme omume n’otu ụzọ kpọmkwem. Gịnị ma ọ bụrụ na anyị onwe anyị enwewo àgwà dị otú ahụ, bụrụkwa ndị na-enyotụ ụfọdụ ndị enyo? Ụwa ọ̀ pụrụ imetụta anyị n’akụkụ a?
Dị ka ihe atụ, were ya na otu n’ime ụmụnna ime mmụọ anyị nwere otu ụlọ mara mma na ụgbọala dara oké ọnụ. Ànyị kwesịrị ikwubi ozugbo ahụ na ọ bụ onye hụrụ ihe onwunwe n’anya nke na-adịghị etinye ọdịmma Alaeze n’ọnọdụ mbụ ná ndụ? Ụfọdụ ndị Kraịst nwere ike ịzụta ihe ndị mara mma, ma nke ahụ apụtaghị na ha bu ihe ọjọọ n’obi ma ọ bụ na ha adịghị ‘ebu ụzọ achọ alaeze ahụ.’ Ha nwere ike ịdị na-arụsi ọrụ ike n’ihe ime mmụọ, na-emesapụ aka n’iji ihe onwunwe ha na-akwalite ọdịmma Alaeze, eleghị anya n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè.—Matiu 6:1-4, 33.
Ndị mejupụtara ọgbakọ narị afọ mbụ bụ ụdị mmadụ dị iche iche—ndị ọgaranya na ndị ogbenye. (Ọrụ 17:34; 1 Timoti 2:3, 4; 6:17; Jemes 2:5) Chineke adịghị atụ ndị mmadụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na-adabere n’ọnọdụ ha n’ụzọ ego, anyị ekwesịghịkwa ime otú ahụ. Anyị kwesịrị ịhụ ndị kwere ekwe ibe anyị kwesịrị ntụkwasị obi a nwapụtara n’anya, “gharakwa ime ihe ọ bụla n’ụzọ ịsọ anya.”—1 Timoti 5:21.
N’ụwa nke a na-atọgbọ n’ike Setan, ịchọ ka mmadụ na-eme omume n’otu ụzọ kpọmkwem na inyo mmadụ enyo na-adị n’ụdị dịgasị iche iche. Dị ka ihe atụ, a pụrụ ile mmadụ anya dị ka onye na-eme ihe ike ma ọ bụ onye hụrụ ihe onwunwe n’anya nanị n’ihi nzụlite ya. Otú ọ dị, dị ka ndị Kraịst, anyị agaghị enwe ụdị àgwà ahụ ma ọlị. Nzukọ Jehova abụghị ebe ikwesi olu ike na inyo mmadụ enyo. Ọ dị ezi ndị Kraịst nile mkpa iṅomi Jehova Chineke, onye “ọ dịghị ajọ omume, ma ọ bụ ịhụ mmadụ ihu ọma” dị n’ime ya.—2 Ihe Emere 19:7; Ọrụ 10:34, 35.
Ka Ịhụnanya Na-akwali Gị
Akwụkwọ Nsọ na-ekwu n’ụzọ doro anya na “mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.” (Ndị Rom 3:23) Ya mere ọ dị anyị mkpa ile ndị anyị na ha na-efekọ ofufe anya dị ka ndị e mere ka anyị na ha dị n’otu n’ịgbalị ijere Jehova ozi ọ na-anara nke ọma. Ọ bụrụ na anyị ekwewo ka inyo mmadụ enyo ma ọ bụ mmetụta ọjọọ ndị ọzọ metụta mmekọrịta anyị na nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị ime mmụọ, ka anyị kpee ekpere maka enyemaka Chineke iji merie àgwà dị otú ahụ ka anyị wee ghara ịghọrọ Setan anụ oriri. (Matiu 6:13) O mere ka Iv kwenye na Jehova bu ihe ọjọọ n’obi, enweghị nchegbu banyere ọdịmma ya, ma na-egbochi nnwere onwe ndị ga-eme ka o nwee ezi obi ụtọ. (Jenesis 3:1-5) Anyị ịkọwahie ebumnobi ụmụnna anyị na-emezu ihe ndị o zubere.—2 Ndị Kọrint 2:11; 1 Pita 5:8.
Ọ bụrụ na anyị achọpụta na anyị nwere àgwà nke ịkọwahie ebumnobi ndị ọzọ, tụlee ihe nlereanya nke Jisọs Kraịst. Ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara Chineke zuru okè, ọ chọghị ma ọ̀ dị ihe ọjọọ ndị na-eso ụzọ ya bu n’obi. Kama nke ahụ, Jisọs chọrọ ezi àgwà ndị ha nwere. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya na-azọ ọkwá nke ọkà ibe, o cheghị na ha bu ihe rụrụ arụ n’obi wee jiri ndị ozi 12 ọhụrụ dochie anya ha. (Mak 9:34, 35) N’ịbụ ndị na-ezughị okè, ọ pụrụ ịbụ na ọdịbendị nke okpukpe ndị Juu si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ nke mesiri nganga na ịrọ òtù ike, metụtara ha n’ụzọ ụfọdụ. Jisọs maara na nkwali bụ isi nke ụmụazụ ya bụ ịhụnanya maka Jehova. N’ihi igosipụta ụdị ịhụnanya ahụ na n’ihi ịrapagidesi ike n’ebe Jisọs nọ, a kwụghachiri ha ụgwọ ọrụ n’ụzọ dị ukwuu.—Luk 22:28-30.
Ọ bụrụ na anyị na-enyo ndị kwere ekwe ibe anyị enyo, nke a ga-adị ka isite n’enyo lens gbagọrọ agbagọ na-ekiri ihe. Ọ dịghị ihe ga-adị n’anya dị ka ọ dị n’ezie. Ya mere ka anyị site n’enyo lens nke ịhụnanya na-ekiri ihe. E nwere ọtụtụ ihe àmà na ndị Kraịst ibe anyị na-eguzosi ike n’ihe hụrụ anyị n’anya ma kwesịkwa nchebara echiche obi ọma anyị. (1 Ndị Kọrint 13:4-8) Ya mere ka anyị gosi ha ịhụnanya ma kpachara anya banyere ịkọwahie ebumnobi.
[Foto dị na peeji nke 26]
Olee otú i si ele ndị ọzọ ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Chineke anya?
[Foto dị na peeji nke 27]
Ntụkwasị obi na nsọpụrụ na-eme ka Ndịàmà Jehova bụrụ otu ezinụlọ obi ụtọ