Epafras—“Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi N’ijere Kraịst Ozi”
ÒNYE hiwere ọgbakọ ndị Kraịst dị na Kọrint, Efesọs, na Filipaị? Ikekwe ị gaghị egbu oge ịza: ‘Pọl, “onyeozi nke ndị mba ọzọ.”’ (Ndị Rom 11:13) Eziokwu ka i kwuru.
Otú ọ dị, ònye hiwere ọgbakọ ndị dị na Kọlọsi, Hierapọlis, na Leọdisia? Ọ bụ ezie na anyị apụghị iji ya n’aka, ọ pụrụ ịbụworị otu nwoke aha ya bụ Epafras. Ka o sina dị, ikekwe ị ga-achọ ịmatakwu ihe banyere onye a na-ezisa ozi ọma, ebe a kpọrọ ya “onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ijere Kraịst ozi.”—Ndị Kọlọsi 1:7.
Onye Na-ezisa Ozi Ọma nke Ndagwurugwu Lycus
Aha ahụ bụ́ Epafras bụ mkpọbiri nke Epafrọdaịtọs. Ma e kwesịghị iche na Epafras bụ Epafrọdaịtọs si Filipaị. Epafras si Kọlọsi, otu n’ime ebe atọ e nwere ọgbakọ ndị Kraịst ná ndagwurugwu Osimiri Lycus, n’Asia Minor. Kọlọsi dịrị nanị kilomita 18 site na Leọdisia na kilomita 19 site na Hierapọlis, n’ógbè ochie nke Frijia.
Bible ekwughị kpọmkwem otú ozi ọma nke Alaeze Chineke si ruo Frijia. Otú ọ dị, ndị Frijia nọ na Jerusalem n’ụbọchị Pentikọst na 33 O.A., ikekwe ụfọdụ n’ime ha si Kọlọsi. (Ọrụ 2:1, 5, 10) N’oge ije ozi Pọl n’Efesọs (n’ihe dị ka 52-55 O.A.), àmà a gbara n’ógbè ahụ dị nnọọ ike ma dịkwa irè nke na ọ bụghị nanị ndị Efesọs kamakwa “ndị nile ndị bi n’Esia nụrụ okwu Onyenwe anyị, ma ndị Juu ma ndị Grik.” (Ọrụ 19:10) Ọ ga-eyi ka ọ̀ bụ na Pọl ekwusaghị ozi ọma na Ndagwurugwu Lycus nile, ebe ọtụtụ n’ime ndị ghọrọ ndị Kraịst n’ógbè ahụ ahụtụbeghị ya anya ma ọlị.—Ndị Kọlọsi 2:1.
Dị ka Pọl kwuru, onye kụziiri ndị Kọlọsi banyere “amara Chineke n’eziokwu” bụ Epafras. Eziokwu bụ na Pọl kpọrọ onye a ya na ya rụkọrọ ọrụ “onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ijere Kraịst ozi n’ọnọdụ anyị” na-egosi na Epafras bụ onye na-ezisa ozi ọma rụsiri ọrụ ike n’ógbè ahụ.—Ndị Kọlọsi 1:6, 7.
Ma Pọl onyeozi ma Epafras onye na-ezisa ozi ọma nwere nchegbu dị ukwuu maka ọdịmma ime mmụọ nke ndị kwere ekwe ibe ha na Ndagwurugwu Lycus. Dị ka “onyeozi nke ndị mba ọzọ,” Pọl aghaghị ịṅụrịworị ọṅụ ịnata ozi banyere ọganihu ha. O nweghị onye ọzọ ma ọ bụghị Epafras ka Pọl sitere n’ọnụ ya nụ banyere ọnọdụ ime mmụọ nke ndị Kọlọsi.—Ndị Kọlọsi 1:4, 8.
Akụkọ Epafras Wetara
Ndị Kọlọsi chere nsogbu ndị dị nnọọ oké njọ ihu nke na ọ manyere Epafras ime njem ahụ dị ogologo gaa Rom maka kpọmkwem nzube nke isoro Pọl tụlee okwu ndị a. Ihe àmà na-egosi na ọ bụ akụkọ ahụ sara mbara Epafras nyere kpaliri Pọl idegara ụmụnna ndị ahụ akwụkwọ ozi abụọ bụ́ ndị ọ na-agaraghị ama. Otu bụ akwụkwọ ozi ahụ e degaara ndị Kọlọsi. E zijeere ndị Leọdisia akwụkwọ ozi nke ọzọ, nke o doro anya na e chekwaghị. (Ndị Kọlọsi 4:16) Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya iche na ihe ndị dị n’ime akwụkwọ ozi ndị ahụ bụ iji zaghachi ná mkpa ndị Kraịst ahụ dị ka Epafras si hụta ha. Mkpa ndị dị aṅaa ka ọ hụrụ? Gịnịkwa ka nke a na-agwa anyị banyere ụdị onye ọ bụ?
Akwụkwọ ozi e degaara ndị Kọlọsi yiri ka ọ na-egosi na Epafras nwere nchegbu na nkà ihe ọmụma nke ndị na-ekpere arụsị nke na-agụnye ịta onwe onye ahụhụ, mgbaasị, na nkwenkwe ụgha nke ikpere arụsị tinyere ndị Kraịst nọ na Kọlọsi n’ihe ize ndụ. Ọzọkwa, nkụzi ndị Juu nke ịghara iri nri na idebe ụbọchị ụfọdụ pụrụ imetụtaworịị ụfọdụ ndị òtù ọgbakọ ahụ.—Ndị Kọlọsi 2:4, 8, 16, 20-23.
Eziokwu bụ na Pọl dere banyere isiokwu ndị a na-egosi anyị otú Epafras si mụrụ anya ma dị nkọ nye mkpa ndị Kraịst ibe ya. O gosiri nchegbu ịhụnanya maka ọdịmma ime mmụọ ha, na-amata ihe ize ndụ dị na gburugburu ebe ha biri. Epafras chọrọ ndụmọdụ Pọl, nke a gosikwara na ọ dị umeala n’obi. Ikekwe o chere na ya nwere mkpa nke ịnata okwu ndụmọdụ site n’aka onye nwere ahụmahụ karị. Otú o sina dị, Epafras jiri amamihe mee ihe.—Ilu 15:22.
Nwoke nke Ji Ekpere Kpọrọ Ihe
Ná ngwụsị nke akwụkwọ ozi o zijeere ndị Kraịst nọ na Kọlọsi, Pọl na-asị: “Epafras, onye bụ otu onye n’etiti unu, ohu nke Kraịst Jisọs, na-ekele unu, na-agbasi mgba ike n’ihi unu n’ekpere ya nile mgbe nile, ka unu wee guzo dị ka ndị zuru okè ndị kwezuwokwara ihe nile Chineke na-achọ. N’ihi na ana m agbara ya àmà, na ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ nke ukwuu nye unu na ndị nọ na Leọdisia na ndị nọ na Hierapọlis.”—Ndị Kọlọsi 4:12, 13.
Ee, ọbụna mgbe ọ bụ ‘onye a dọkọọrọ ya na Pọl n’agha’ na Rom, Epafras nọ na-eche banyere ụmụnna ya ọ hụrụ n’anya nọ na Kọlọsi, Leọdisia, na Hierapọlis, na-ekpekwa ekpere maka ha. (Faịlimọn 23) N’ụzọ nkịtị, ‘ọ gbalịsiri ike’ n’ekpere maka ha. Dị ka ọkà mmụta bụ́ D. Edmond Hiebert si kwuo, okwu Grik e jiri mee ihe n’ebe a na-egosi “ọrụ siri ike, na-ewekwa oké ihe,” ihe yiri uche “mgbu” ahụ Jisọs Kraịst gabigara ka ọ na-ekpe ekpere n’ogige Getsemane. (Luk 22:44) Epafras chọsiri ike ka ụmụnna ime mmụọ ya ndị nwoke na ndị nwanyị bịaruo ná nguzosi ike na ntozu okè zuru ezu nke ndị Kraịst. Lee ngọzi nwanna nwoke dị otú ahụ ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe na-aghaghị ịbụwororị ọgbakọ ndị ahụ!
Ebe a kpọrọ Epafras “ohu ibe anyị onye anyị hụrụ n’anya,” obi abụọ apụghị ịdị ya na o mere onwe ya onye a hụrụ n’anya nye ndị Kraịst ibe ya. (Ndị Kọlọsi 1:7) Mgbe ọnọdụ nyere ohere ya, ndị òtù nile nke ọgbakọ kwesịrị iji ikpo ọkụ na ịhụnanya nye onwe ha n’afọ ofufo. Dị ka ihe atụ, a pụrụ ilebara inyere ndị ọrịa, ndị agadi, ma ọ bụ ndị ọzọ nwere mkpa ndị pụrụ iche anya. A pụrụ inwe ọtụtụ ibu ọrụ a ga-elekọta anya n’ọgbakọ, ma ọ bụ ọ pụrụ ikwe omume ịtụnye ụtụ n’ihe owuwu ọchịchị Chineke.
Ikpere ndị ọzọ ekpere, dị ka Epafras mere, bụ ụdị ije ozi dị nsọ nke onye ọ bụla pụrụ ime. Ekpere ndị dị otú ahụ pụrụ ịgụnye okwu nchegbu maka ndị na-efe Jehova ofufe bụ́ ndị na-aghaghị iche ihe ize ndụ dị iche iche ma ọ bụ ihe isi ike ime mmụọ ma ọ bụ nke elu ahụ ihu. Site n’ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ n’ụzọ dị otú a, anyị pụrụ ịdị ka Epafras. Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ inwe ihe ùgwù na ọṅụ nke ịnwapụta ịbụ “ohu ibe anyị onye anyị hụrụ n’anya” n’ezinụlọ ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi.