Ihe Nzuzo Ndị Kraịst Na-agaghị Anwa Anwa Idebe!
“Mụ onwe m agwawawo ụwa okwu. . . . Ekwukwaghị m ihe ọ bụla na nzuzo.”—JỌN 18:20.
1, 2. Gịnị ka okwu Grik ahụ bụ́ my·steʹri·on pụtara dị ka e ji ya mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ?
A SỤGHARỊRỊ okwu Grik bụ́ my·steʹri·on na New World Translation of the Holy Scriptures ugboro 25 dị ka “ihe nzuzo dị nsọ” na ugboro atọ dị ka “ihe omimi.” Ihe nzuzo a kpọrọ ihe dị nsọ aghaghị ịdị mkpa n’ezie! Onye ọ bụla nwere ihe ùgwù nke ịmata ihe nzuzo dị otú ahụ kwesịrị iwere onwe ya dị ka onye e nyere oké nsọpụrụ, ebe ọ bụ na a gụwo ya n’onye ruru eru ya na Chineke Kasị Elu nke eluigwe na ala ikerịta ihe nzuzo.
2 Akwụkwọ Expository Dictionary of Old and New Testament Words nke Vine dere na-akwado na n’ọnọdụ kasịnụ “ihe nzuzo dị nsọ” bụ nsụgharị kwesịrị ekwesị karịa “ihe omimi.” Ọ na-ekwu banyere my·steʹri·on, sị: “N’ime [Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst] ọ pụtara, ọ bụghị ihe omimi (dị ka ọ dị n’okwu Bekee), kama nke, n’ịbụ nke a na-enweghị ike ịghọta site n’ikike ebumpụta ụwa a na-enyereghị aka, a pụrụ ime ka a mara nanị site ná mkpughe Chineke, nke a na-emekwa ka a mara ya n’ụzọ na n’oge nke Chineke họpụtara, nyekwa nanị ndị ahụ Mmụọ Ya nyere nghọta. N’echiche nkịtị ihe omimi pụtara ihe ọmụma e jichiri ejichi; ihe ọ pụtara n’Akwụkwọ Nsọ bụ eziokwu e kpughere ekpughe. N’ihi ya okwu ndị a na-ejikọkarị ya na isiokwu ahụ bụ ‘e mere ka a mara,’ ‘e mere ka ọ pụta ìhè,’ ‘e kpughere,’ ‘e kwusara,’ ‘ghọta,’ ‘ihe e kesara.’”
3. Olee otú ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ si dị iche n’ebe ìgwè okpukpe ụfọdụ ndị dị omimi dị?
3 Nkọwa a na-eme ka otu ọdịiche bụ isi pụta ìhè n’agbata ìgwè okpukpe ndị dị omimi jupụtara ebe nile na narị afọ mbụ na ọgbakọ ndị Kraịst ahụ e guzobere ọhụrụ. Ọ bụ ezie na a na-ejikarị ịṅụ iyi onye ekwula kee ndị a nabatara n’òtù nzuzo agbụ iji chee ozizi okpukpe dị iche iche nche, ọ dịghị mgbe e tinyere ndị Kraịst n’okpuru ihe mgbochi dị otú ahụ. Ọ bụ eziokwu na Pọl onyeozi kwuru banyere “amamihe Chineke n’ihe omimi,” na-akpọ ya “amamihe nke e zobeworo,” ya bụ, nke e zopụrụ ya n’ebe “ndị isi nke oge a” nọ. E zopụghị ya n’ebe ndị Kraịst nọ bụ́ ndị e kpughewooro ya site na mmụọ Chineke ka ha wee nwee ike ime ka ọ pụta ìhè.—1 Ndị Kọrint 2:7-12; tụlee Ilu 1:20.
A Mata “Ihe Nzuzo Dị Nsọ” Ahụ
4. N’ònye ka “ihe nzuzo dị nsọ” ahụ hiwere isi, n’ụzọ dịkwa aṅaa?
4 “Ihe nzuzo dị nsọ” nke Jehova hiwere isi na Jisọs Kraịst. Pọl dere, sị: “[Jehova] mere ka anyị mara [ihe nzuzo dị nsọ, NW] nke ihe Ọ chọrọ, dị ka ọ dị Ya ezi mma, bụ́ ihe O zubere n’ime Ya, ruo ọchịchị ezinụlọ nke ozuzu oge a kara aka, ịchịkọta ihe nile n’ime Kraịst anyị dị ka Isi, bụ́ ihe nile dị n’eluigwe, na ihe nile dị n’elu ụwa; n’ime Ya, ka m kwuru.” (Ndị Efesọs 1:9, 10) Pọl kapịrị okwu ọnụ ọbụna karị banyere ọdịdị nke “ihe nzuzo dị nsọ” mgbe ọ rụtụrụ aka ná mkpa e nwere maka “mmazu ihe [ihe nzuzo dị nsọ, NW] nke Chineke, bụ́ Kraịst.”—Ndị Kọlọsi 2:2.
5. Gịnị ka “ihe nzuzo dị nsọ” na-agụnye?
5 Otú ọ dị, ọ gụnyere ihe ka ukwuu, n’ihi na “ihe nzuzo dị nsọ” bụ ihe nzuzo nwere ọtụtụ akụkụ. Ọ bụghị nanị ịmata Jisọs dị ka onye bụ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ma ọ bụ Mesaịa; ọ na-agụnye ọrụ e kenyere ya ịrụ ná nzube Chineke. Ọ na-agụnye ọchịchị eluigwe, Alaeze Mesaịa nke Chineke, dị ka Jisọs kọwara n’ụzọ doro anya mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ka e nyeworo ịmara [ihe nzuzo dị nsọ, NW] alaeze eluigwe, ma e nyeghị ndị ahụ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Matiu 13:11.
6. (a) N’ihi gịnị ka o ji zie ezi ikwu na “ihe nzuzo dị nsọ” bụ nke ‘e mere ka o kpuchie ọnụ n’oge ebighị ebi’? (b) Olee otú e si kpughee ya n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu?
6 Ogologo oge gaje ịgafe n’agbata mkpọtụ mbụ a kpọtụrụ nzube Chineke aha iji nye ihe ndabere maka Alaeze Mesaịa na ime ka “ihe omimi . . . zuo okè.” (Mkpughe 10:7; Jenesis 3:15) Ime ka o zuo okè ga-ewere ọnọdụ ná nguzobe nke Alaeze ahụ, dị ka iji Mkpughe 10:7 tụnyere 11:15 na-egosi. N’eziokwu, ihe dị ka afọ 4,000 gafere site n’oge mbụ e kwere nkwa Alaeze n’Iden ruo ná mpụta nke Onye A Họpụtara Ịbụ Eze na 29 O.A. Afọ 1,885 ọzọ gafere tupu e guzobe Alaeze ahụ n’eluigwe na 1914. Otú a e ji nwayọọ nwayọọ kpughee “ihe nzuzo dị nsọ” ahụ n’ime oge fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 6,000. (Lee peji nke 16.) Pọl ziri ezi n’ezie n’ikwu banyere ‘mkpughe nke ihe nzuzo dị nsọ nke e meworo ka o kpuchie ọnụ n’oge ebighị ebi, ma ugbu a ka e mere ka ọ pụta ìhè, e mewokwa ka a mara ya.’—Ndị Rom 16:25-27; Ndị Efesọs 3:4-11.
7. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike kasịnụ n’ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche?
7 N’ụzọ dị iche n’ebe ụmụ mmadụ nọ, bụ́ ndị nwere oge ndụ a kpaara ókè, ọ dịghị mgbe ọ na-adị Jehova ka a na-amanye ya ikpughe ihe nzuzo ya mgbe oge na-erubeghị. Eziokwu a kwesịrị igbochi anyị ịbụ ndị na-enweghị ndidi mgbe a na-enweghị ike ịkọwa ajụjụ ụfọdụ nke Bible n’ụzọ juru anyị afọ ugbu a. Obi umeala n’akụkụ òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, nke e nyere ọrụ inye ezinụlọ ndị Kraịst nri n’oge ya, na-egbochi ya iji mpako na-agbaga n’ihu ma na-akọ nkọ na-enweghị isi banyere ihe ndị na-edobeghị anya. Òtù ohu ahụ na-agbalị izere ịbụ ndị na-ekwesi olu ike. Ọ dịghị mpako ikwenye na ka ọ dị ugbu a, ọ pụghị ịza ajụjụ nile, na-eburu Ilu 4:18 n’uche nke ọma. Ma lee ihe na-akpali akpali ọ bụ ịmara na Jehova, n’oge nke ya na n’ụzọ nke ya, ga-anọgide na-ekpughe ihe nzuzo ya n’ihe banyere nzube ya nile! Anyị ekwesịghị ịbụ ndị na-enweghị ndidi ná ndokwa Jehova, jiri enweghị uche na-anwa iji ọsọ na-ebutere Onye Na-ekpughe ihe nzuzo ụzọ. Lee ihe na-emesi obi ike ọ bụ ịmara na ụzọ Jehova ji eme ihe taa adịghị eme otú ahụ! O kwesịrị ntụkwasị obi, nweekwa uche.—Matiu 24:45; 1 Ndị Kọrint 4:6.
A Ghaghị Ịkọ Ihe Nzuzo nke E Kpugheworo!
8. Olee otú anyị si mara na a gaje ime ka a mara “ihe nzuzo dị nsọ” ahụ?
8 Jehova ekpugheghị “ihe nzuzo dị nsọ” ya nye ndị Kraịst ka ha wee nọgide na-ezo ya. A ga-eme ka a mara ya, n’ikwekọ n’ụkpụrụ Jisọs tụrụ maka ndị nile na-eso ụzọ ya—ọ bụghị nanị maka ndị ụkọchukwu ole na ole: “Unu onwe unu bụ ìhè nke ụwa. A pụghị izo obodo nke e wuworo n’elu ugwu. Ma ha adịghị amụnye oriọna, dọba ya n’okpuru mgbé, kama n’elu ihe ịdọba oriọna; ọ na-enwukwara mmadụ nile nọ n’ụlọ ahụ. Otú a meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu, wee too Nna unu Nke bi n’eluigwe.”—Matiu 5:14-16; 28:19, 20.
9. Gịnị na-egosi na Jisọs abụghị onye na-achọ oké mgbanwe, dị ka ụfọdụ na-azọrọ?
9 Jisọs ebughị n’obi ịkpata oké mgbanwe nke iguzobe òtù ụmụazụ nzuzo iji chụsoo nzube zoro ezo. N’akwụkwọ bụ́ Early Christianity and Society, Robert M. Grant dere banyere ngọpụ ahụ onye nkwado okwukwe bụ Justin Martyr mere banyere ndị Kraịst oge mbụ: “Ọ bụrụ na ndị Kraịst bụ ndị na-akpata oké mgbanwe ha ga-anọgide na nzuzo iji mezuo nzube ha.” Ma olee otú ndị Kraịst pụrụ isi ‘nọgide na nzuzo’ ma n’otu oge ahụ yie “obodo nke e wuworo n’elu ugwu”? Ha anwaghị anwa izo ìhè ha n’okpuru mgbé! N’ihi ya, gọọmenti enweghị ihe ha ga-atụ egwu ya n’ebe ọrụ ha dị. Onye edemede a gara n’ihu ịkọwa ha dị ka “ndị ha na eze alaeze ukwu ahụ kasị arụkọ ọrụ ná nchụso nke udo na ezi ịdị n’usoro.”
10. Gịnị mere ndị Kraịst na-ekwesịghị iji zobe ihe e ji mara ha?
10 Jisọs achọghị ka ndị na-eso ụzọ ya zobe ndị ha bụ dị ka ndị a na-asị na ha bụ ịrọ òtù okpukpe. (Ọrụ 24:14; 28:22) Ịghara ime ka ìhè anyị na-enwu taa ga-ewute ma Kraịst ma Nna ya, bụ́ Onye Na-ekpughe ihe nzuzo, ọ gaghịkwa eme ka anyị nwee obi ụtọ.
11, 12. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji chọọ ka e mee ka a mara Iso Ụzọ Kraịst? (b) Olee otú Jisọs si setịpụ ihe nlereanya kwesịrị ekwesị?
11 Jehova ‘ezubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịa ruo nchegharị.’ (2 Pita 3:9; Ezikiel 18:23; 33:11; Ọrụ 17:30) Ihe ndabere maka mgbaghara mmehie nke ụmụ mmadụ nwere nchegharị bụ okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst, onye nyere onwe ya dị ka ihe mgbapụta maka mmadụ nile—ọ bụghị nanị maka ole na ole—ka “onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ọ dị mkpa ka e nyere ndị mmadụ aka iwere nzọụkwụ ndị dị mkpa ndị ga-eme ka ha ruo eru ịbụ ndị e kpere ikpe dị ka atụrụ, ọ bụghị ewu, n’oge ikpe na-abịanụ.—Matiu 25:31-46.
12 A gaghị ezo ezi Iso Ụzọ Kraịst ezo; a gaje ime ka a mara ya n’ezi ụzọ ọ bụla kwere omume. Jisọs n’onwe ya setịpụrụ ihe nlereanya kwesịrị ekwesị. Mgbe ndị isi nchụàjà jụrụ ya ajụjụ banyere ndị na-eso ụzọ ya na n’ozizi ya, ọ sịrị: “Mụ onwe m agwawawo ụwa okwu; Mụ onwe m ziri ihe mgbe nile n’ụlọ nzukọ, na n’ụlọ ukwu Chineke, ebe ndị Juu nile na-agbakọ; ekwukwaghị m ihe ọ bụla na nzuzo.” (Jọn 18:19, 20) N’ihi ụkpụrụ nke a, olee mmadụ na-atụ egwu Chineke nke ga-anwa izobe ihe Chineke kwupụtaworo na a ghaghị ime ka a mara? Ònye ga-anwa anwa izobe “mkpịsị ugodi nke ihe ọmụma” nke na-eduba ná ndụ agwụghị agwụ? Ime otú ahụ ga-eme ka o yie ndị okpukpe ihu abụọ nke narị afọ mbụ.—Luk 11:52; Jọn 17:3.
13. Gịnị mere anyị ji kwesị ime nkwusa n’ohere ọ bụla dịnụ?
13 Ka onye ọ bụla ghara inwe ike mgbe ọ bụla ikwu na anyị dị ka Ndịàmà Jehova ezobewo ozi Alaeze Chineke! Ma a nakweere ozi ahụ ma à jụrụ ya, ndị mmadụ aghaghị ịma na e kwusawo ya. (Tụlee Ezikiel 2:5; 33:33.) Ya mere ka anyị jiri ohere nke ọ bụla gwa mmadụ nile ozi nke eziokwu ahụ, n’ebe ọ bụla ọ dabara na anyị zutere ha.
Itinye Nko n’Agba Setan
14. Gịnị mere anyị na-ekwesịghị ịla azụ banyere ịpụta ìhè n’ofufe anyị?
14 N’ọtụtụ ebe Ndịàmà Jehova na-aghọwanye ebe usoro mgbasa ozi na-elekwasị anya. N’ihe yiri ihe mere ndị Kraịst oge mbụ, a na-akọwahiekarị ha, na-edebekwa ha na ịrọ òtù okpukpe na òtù nzuzo ndị a na-enyo enyo n’otu ọkwá. (Ọrụ 28:22) Ịpụta ìhè anyị n’ime nkwusa ọ̀ pụrụ ime ka anyị bụrụ ndị a na-awakwasịkarị? Ọ ga-abụ nnọọ ihe amamihe na-adịghị ya, bụrụkwa ihe na-ekwekọghị na ndụmọdụ Jisọs, ịtụbanye onwe anyị n’etiti esemokwu n’ụzọ na-adịghị mkpa. (Ilu 26:17; Matiu 10:16) Otú ọ dị, a gajeghị izobe ọrụ bara uru nke ime nkwusa Alaeze na inyere ndị mmadụ aka imeziwanye ndụ ha. Ọ na-enye Jehova otuto, na-ebuli ya elu, na-eduzi uche n’ebe ọ nọ na n’ebe Alaeze ya e guzobere eguzobe nọ. Nzaghachi na-enye obi ụtọ n’eziokwu Bible n’oge na-adịbeghị anya n’Ọwụwa Anyanwụ Europe na akụkụ ụfọdụ nke Africa abụrụwo n’otu akụkụ n’ihi ụzọ ịpụta ìhè ka ukwuu nke a pụrụ iji kwusaa eziokwu ahụ n’ebe ahụ ugbu a.
15, 16. (a) Nzube ndị dị aṅaa ka ịpụta ìhè na ịba ụba ime mmụọ anyị na-arụzu, ma nke a ọ̀ bụ ihe a ga-enwere nchegbu? (b) N’ihi gịnị ka Jehova ji etinye nko n’agba Setan?
15 Ọ bụ eziokwu na ịpụta ìhè nke Ndịàmà Jehova ji eme nkwusa, paradaịs ime mmụọ ha na-anụ ụtọ ya, na ịba ụba ha—ma n’ụba mmadụ ma n’ihe onwunwe—abụghị ihe a na-adịghị ahụ. Ọ bụ ezie na ọ na-adọta ndị nwere obi eziokwu, ihe ndị a pụrụ ịdị na-ewute ndị mmegide. (2 Ndị Kọrint 2:14-17) N’eziokwu, a pụrụ imesịa jiri nke a rabanye ndị agha Setan ịwakpo ndị Chineke.
16 Nke a ò kwesịrị ịbụ ihe a ga-enwere nchegbu? Ọ bụghị dị ka amụma Jehova dị n’Ezikiel isi nke 38 si dị. Ọ na-ebu amụma na Gọg nke Megọg, ihe e ji mara Setan Ekwensu kemgbe a chụdatara ya n’ógbè ụwa mgbe e guzobesịrị Alaeze ahụ na 1914, ga-ebute ụzọ ná mwakpo a ga-awakpo ndị Chineke. (Mkpughe 12:7-9) Jehova na-agwa Gọg, sị: “Ị ga-asịkwa, M ga-arịgo imegide ala bụ nanị obodo na-enweghị mgbidi; m ga-abakwasị ndị nọ jụụ, ndị nọ ná ntụkwasị obi, ha nile bi n’ebe na-enweghị mgbidi, ọ dịghịkwa ihe ntụchi ma ọ bụ ibo ọnụ ụzọ ha nwere: ịkwata ihe nkwata na ịlụta ihe nlụta n’agha; ichigharị aka gị imegide mkpọmkpọ ebe nke mmadụ bi n’ime ha ugbu a, na imegide otu ndị nke a chịkọpụtaworo ná mba dị iche iche, nke rụtaworo anụ ụlọ na ihe ahịa n’ọrụ, ndị bi n’elu ala nke ụwa.” (Ezikiel 38:11, 12) Otú ọ dị, amaokwu nke 4 na-egosi na ọ dịghị ndị Chineke mkpa ịtụ egwu mwakpo a, n’ihi na ọ bụ Jehova na-eme ya. Ma gịnị mere Chineke ga-eji kwere—ee, ọbụna kpalite—mwakpo eleghị anya n’azụ n’isi ndị ya? N’amaokwu nke 23 anyị na-agụ azịza Jehova: “M ga-emekwa Onwe m ka M dị ukwuu, M ga-edokwa Onwe m nsọ, mee ka a mara Mụ onwe m n’anya ọtụtụ mba; ha ewee mara na Mụ onwe m bụ Jehova.”
17. Olee otú anyị kwesịrị isi were mwakpo Gọg ga-eme n’oge na-adịghị anya?
17 N’ihi ya, kama ịnọ n’ụjọ n’ihi mwakpo Gọg, ndị Jehova ji nchekwube na-elepụ anya ná mmezu ọzọ nke a nke amụma Bible. Lee ihe na-akpali akpali ọ bụ ịmara na site n’ime ka nzukọ ya a na-ahụ anya baa ụba na ịgọzi ya, Jehova na-ekonye nko n’agba Setan ma na-adọta ya na usuu ndị agha aga ná mbibi ha!—Ezikiel 38:4.
Ugbu A Karịa Mgbe Ọ Bụla Ọzọ!
18. (a) Nghọta dị aṅaa ka ọtụtụ mmadụ na-enwe ugbu a, n’ihi gịnịkwa? (b) Olee otú ụzọ e si azaghachi ná nkwusa Alaeze si eje ozi dị ka ihe nkwali dị ike?
18 N’oge a Ndịàmà Jehova apụtawo nnọọ ìhè n’ikwupụta echiche ha ndị dabeere na Bible, ọ bụ ezie na ọha anabatabeghị nke a. Eri ọtụtụ iri afọ ha adọwo aka ná ntị banyere ise siga na iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, elepụghị anya n’ihu nke ịzụtọ ụmụaka, mmetụta ọjọọ nke ntụrụndụ jupụtara ná mmekọahụ rụrụ arụ na ime ihe ike, na ihe ize ndụ nke mmịnye ọbara. Ha arụtụwokwa aka n’ekwekọghị ekwekọ nke nchepụta evolushọn. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu ugbu a, sị, “Ndịàmà Jehova ehieghịdị ụzọ.” A sị na anyị apụtaghị ìhè nke ọma n’ime ka ọha mmadụ mara echiche anyị, ha enweghị ike isi otú a zaghachi. Elefula anya n’eziokwu ahụ bụ na site n’ikwu okwu dị otú ahụ, ha na-ewere nzọụkwụ n’ụzọ nke ikwu, sị, “Setan, ị bụ onye ụgha; Jehova zidịrị ezi.” Lee ihe nkwali siri ike ọ bụrụ anyị ịnọgide na-agbaso ihe nlereanya Jisọs, na-ekwu okwu nke eziokwu ahụ n’ihu ọha!—Ilu 27:11.
19, 20. (a) Mkpebisi ike dị aṅaa ka ndị Jehova kwupụtara na 1922, okwu ndị a hà ka dịkwa irè? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi were “ihe nzuzo dị nsọ” nke Jehova?
19 Ọ dịwo anya ndị Jehova ghọtara ibu ọrụ ha n’ihe banyere nke a. N’otu mgbakọ kwesịrị ịrịba ama na 1922, J. F. Rutherford, onye isi oche Watch Tower Society mgbe ahụ, mere ndị gere ya ntị obi ụtọ site n’ịsị: “Nweenụ anya udo, dịnụ njikere, dịnụ ike, nweenụ obi ike. Bụrụnụ ezi ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi nke Onyenwe anyị. Gaanụ n’ihu n’ọgụ ahụ ruo mgbe akụkụ ọ bụla nke Babilọn tọgbọrọ n’efu. Kwusaanụ ozi ahụ ruo nsọtụ nile. Ụwa aghaghị ịmara na Jehova bụ Chineke nakwa na Jisọs Kraịst bụ Eze kachasị ndị eze nile na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile. Nke a bụ ụbọchị kachasị ụbọchị nile. Lee, Eze ahụ na-achị achị! Unu bụ ndị mkpọsa ya. Ya mere kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ, Eze ahụ na alaeze ya.”
20 Ka okwu ndị a dị mkpa na 1922, lee ka ha si dịkwuo mkpa mgbe afọ 75 gafesịworo, mgbe mkpughe nke Kraịst dị ka Onye Ikpe na Onye Ọ́bọ̀ dị nnọọ nso karị! Ozi nke Alaeze Jehova e guzobere eguzobe na banyere paradaịs ime mmụọ nke ndị Chineke na-anụ ụtọ ya bụ “ihe nzuzo dị nsọ” nke dị nnọọ ukwuu idebe. Dị ka Jisọs n’onwe ya kwuru n’ụzọ doro anya, ụmụazụ ya aghaghị, site n’enyemaka mmụọ nsọ, ịbụ ndị àmà “ruokwa ebe nile ụwa sọtụrụ” banyere ọnọdụ ya dị oké mkpa ná nzube ebighị ebi nke Jehova. (Ọrụ 1:8; Ndị Efesọs 3:8-12) N’eziokwu, dị ka ndị ohu Jehova, Chineke nke na-ekpughe ihe nzuzo, anyị adịghị anwa anwa idebe ihe nzuzo a nye onwe anyị!
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Gịnị bụ “ihe nzuzo dị nsọ” ahụ?
◻ Olee otú anyị si mara na e kwesịrị ịkpọsa ya?
◻ Gịnị ga-akpata mwakpo Gọg ga-awakpo ndị Jehova, oleekwa otú anyị kwesịrị isi were nke a?
◻ Gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?
[Igbe dị na peeji nke 16]
“IHE NZUZO DỊ NSỌ” E KPUGHERE N’ỤZỌ NA-AGA N’IHU N’IHU
◻ Mgbe 4026 T.O.A. Gasịrị: Chineke ekwee nkwa ịkpọlite otu mkpụrụ ibibi Setan.—Jenesis 3:15
◻ 1943 T.O.A.: E mee ka ọgbụgba ndụ Abraham dị irè, na-ekwe nkwa na Mkpụrụ ahụ ga-abịa site n’Abraham.—Jenesis 12:1-7
◻ 1918 T.O.A.: Ọmụmụ Aịsak dị ka onye nketa nke ọgbụgba ndụ ahụ.—Jenesis 17:19; 21:1-5
◻ Ihe Dị Ka 1761 T.O.A.: Jehova emesie ya ike na Mkpụrụ ahụ ga-abịa site na nwa nwoke Aịsak, bụ́ Jekọb.—Jenesis 28:10-15
◻ 1711 T.O.A.: Jekọb egosi na Mkpụrụ ahụ ga-abịa site na nwa ya nwoke bụ́ Juda.—Jenesis 49:10
◻ 1070-1038 T.O.A.: Eze Devid amata na Mkpụrụ ahụ ga-abụ onye sitere n’eriri ya na ọ ga-achịkwa dị ka Eze ruo mgbe ebighị ebi.—2 Samuel 7:13-16; Abụ Ọma 89:35, 36
◻ 29-33 O.A.: A mata Jisọs dị ka Mkpụrụ ahụ, Mesaịa, onye ikpe n’ọdịnihu, na Onye A Họpụtara Ịbụ Eze.—Jọn 1:17; 4:25, 26; Ọrụ 10:42, 43; 2 Ndị Kọrint 1:20; 1 Timoti 3:16
◻ Jisọs ekpughee na ya ga-enwe ndị ọchịchị na ndị ikpe ibe ya, na Alaeze eluigwe ga-enwe ndị ọ ga-achị n’elu ụwa, nakwa na ụmụazụ ya ga-abụ ndị nkwusa nke Alaeze.—Matiu 5:3-5; 6:10; 28:19, 20; Luk 10:1-9; 12:32; 22:29, 30; Jọn 10:16; 14:2, 3
◻ Jisọs ekpughee na a ga-eguzobe Alaeze ahụ n’oge a kara aka, dị ka ihe ndị na-eme n’ụwa na-akwado.—Matiu 24:3-22; Luk 21:24
◻ 36 O.A.: Pita amata na ndị na-abụghị ndị Juu ga-abụkwa ndị nketakọ nke Alaeze.—Ọrụ 10:30-48
◻ 55 O.A.: Pọl akọwaa na a ga-akpọlite ndị nketakọ nke Alaeze gaa n’anwụghị anwụ na ereghị ure n’oge ọnụnọ Kraịst.—1 Ndị Kọrint 15:51-54
◻ 96 O.A.: Jisọs, onye na-achịworị n’elu ụmụazụ ya e tere mmanụ, ekpughee na ọnụ ọgụgụ ikpeazụ ha ga-abụ 144,000.—Ndị Efesọs 5:32; Ndị Kọlọsi 1:13-20; Mkpughe 1:1; 14:1-3
◻ 1879 O.A.: Zion’s Watch Tower ezoo aka na 1914 dị ka afọ dị oké mkpa ná mmezu nke “ihe nzuzo dị nsọ” nke Chineke
◻ 1925 O.A.: Ụlọ Nche akọwaa na a mụrụ Alaeze ahụ na 1914; a ghaghị ịkpọsa “ihe nzuzo dị nsọ” banyere Alaeze ahụ.—Mkpughe 12:1-5, 10, 17
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Dị ka Onye Ndú ha, bụ́ Jisọs, Ndịàmà Jehova na-akpọsa Alaeze Jehova n’ihu ọha