Olee Otú Chineke Si Duzie Odide Bible?
NZIRỊTA ozi na-adọrọ adọrọ taa karịa n’oge ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme. Telifon, ígwè fax, kọmputa—ọtụtụ afọ gara aga ònye pụrụ ichetụwo n’echiche oge mgbe e nwere ike iziga ozi n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ebe nile gburugburu ụwa n’otu ntabi anya?
Ma ụdị nzirịta ozi kasị adọrọ mmasị bụ nke mmadụ na-apụghị ịbụ ọkà na ya—nduzi mmụọ Chineke. Jehova duziri ihe dị ka ndị edemede 40 bụ́ mmadụ iwepụta Okwu ya e dere ede, bụ́ Bible Nsọ. Dị nnọọ ka ụmụ mmadụ nwere ihe karịrị otu ụzọ nke nzirịta ozi, otú ahụ ka Jehova ji ọtụtụ ụzọ nzirịta ozi duzie odide Akwụkwọ Nsọ.
A Kpọọ E Dee. Chineke ziri ozi ndị a kapịrị ọnụ e mesịrị tinye n’ihe ndekọ Bible.a Dị ka ihe atụ, tụlee iwu nchịkwa ndị mejupụtara ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. “Deere onwe gị okwu ndị a,” ka Jehova gwara Mosis, “n’ihi na dị ka okwu ndị a si dị ka M gbaworo ndụ n’etiti Mụ na gị, na n’etiti Mụ na ụmụ Israel.” (Ọpụpụ 34:27) “Okwu” ndị ahụ, nke ‘e nyere site n’aka ndị mmụọ ozi,’ ka Mosis deturu, a pụkwara ịhụ ha n’akwụkwọ Bible ndị bụ́ Ọpụpụ, Levitikọs, Ọnụ Ọgụgụ, na Deuterọnọmi.—Ọrụ 7:53.
Ọtụtụ ndị amụma ọzọ, gụnyere Aịsaịa, Jeremaịa, Ezikiel, Emọs, Nehum, na Maịka, natara ozi ndị a kapịrị ọnụ n’aka Chineke site n’ọnụ ndị mmụọ ozi. Mgbe ụfọdụ ndị ikom a ji nkebi ahịrịokwu a malite nkwupụta okwu ha: “Otú a ka Jehova sịrị.” (Aịsaịa 37:6; Jeremaịa 2:2; Ezikiel 11:5; Emọs 1:3; Maịka 2:3; Nehum 1:12) Mgbe ahụ ha etinye ihe Chineke kwuru n’ụdị e dere ede.
Ọhụụ, Nrọ, na Uche Mkpapụ. Ọhụụ bụ onyinyo, ọdịdị, ma ọ bụ ozi e mere ka ọ dịkwasị n’uche mmadụ mgbe ọ mụ anya, na-abụkarị site n’ụzọ ụfọdụ pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, Pita, Jemes, na Jọn, “mgbe ha tetara nke ọma,” hụrụ ọhụụ nke Jisọs e nwoghara enwogha. (Luk 9:28-36; 2 Pita 1:16-21) N’ọnọdụ ụfọdụ e ziri ozi ná nrọ, ma ọ bụ ọhụụ abalị, bụrụ nke e mere ka ọ dịkwasị n’uche onye ahụ na-anara ya mgbe ọ nọ n’ụra. N’ihi ya Daniel dere banyere “ọhụụ nile nke isi m n’elu ihe ndina m”—ma ọ bụ, dị ka onye nsụgharị bụ́ Ronald A. Knox si dee ya, “ka m dina na-ekiri ná nrọ m.”—Daniel 4:10.
O doro anya na onye Jehova tinyere n’uche mkpapụ mikpuru onwe ya kpam kpam n’ọnọdụ itinyemi uche n’ihe, ọ bụ ezie na ma ọ dịghị ihe ọzọ, ọ mụtụ anya. (Tụlee Ọrụ 10:9-16.) N’ime Bible okwu Grik ahụ a sụgharịrị “uche mkpapụ” (ekʹsta·sis) pụtara ‘iwepụ ma ọ bụ idochi anya.’ Ọ na-enye echiche nke iwepụ uche n’ọnọdụ ọ na-adịbu. N’ihi ya, onye uche ya kpapụrụ akpapụ agaghị ama ihe na-eme gburugburu ya mgbe o mikpuru onwe ya n’ịhụ ọhụụ ahụ. O yikarịrị ka Pọl onyeozi ọ̀ nọ n’uche mkpapụ dị otú ahụ mgbe “e weliri ya rịgoo na paradaịs na mberede, o wee nụ okwu nke a na-apụghị ikwu, nke ọ na-ezighị ezi n’iwu ka mmadụ kwuo ha.”—2 Ndị Kọrint 12:2-4.
N’ụzọ dị iche n’ebe ndị deturu ozi a kpọọ e dee sitere n’ọnụ Chineke nọ, ndị dere Bible bụ́ ndị natara ọhụụ ma ọ bụ nrọ ma ọ bụ nwee uche mkpapụ na-enwetụ ohere mgbe mgbe ịkọwa n’okwu nke aka ha ihe ha hụrụ. A gwara Habakuk, sị: “Dee ọhụụ ahụ n’elu mbadamba ihe dị iche iche, tụọ ya akịka, ka onye na-agụ ya wee gbaa ọsọ.”—Habakuk 2:2.
Nke a ọ̀ pụtara na akụkụ ndị a nke Bible esitechaghị n’ike mmụọ nsọ dị ka akụkụ okwu ndị e mere a kpọọ e dee? Ọ dịghị ma ọlị. Site na mmụọ ya, Jehova mere ka ozi ya gbanye mkpọrọgwụ n’uche onye edemede ọ bụla, ka o wee bụrụ echiche Chineke, ọ bụghịkwa nke mmadụ ka e dere. Ọ bụ ezie na Jehova hapụụrụ onye edemede ahụ ohere ịhọrọ okwu ndị kwesịrị ekwesị, o duziri echiche onye edemede ahụ ka e wee ghara ịhapụ ihe ọmụma ọ bụla dị mkpa, n’ikpeazụkwa a na-ele okwu ndị ahụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ka nke Chineke.—1 Ndị Tesalọnaịka 2:13.
Mkpughe Chineke. Bible nwere amụma—akụkọ ihe mere eme e kpughere ma dee tupu oge eruo—nke karịrị nnọọ ikike mmadụ efu. Otu ihe atụ bụ mbilite na ọdịda nke “eze Gris,” Aleksanda Onye Ukwu, nke e buru amụma ya ihe dị ka afọ 200 tupu oge eruo! (Daniel 8:1-8, 20-22) Bible na-ekpughekwa ihe omume ndị anya mmadụ na-ahụtụbeghị. Okike nke eluigwe na ala bụ otu ihe atụ. (Jenesis 1:1-27; 2:7, 8) E nwekwara mkparịta ụka ndị weere ọnọdụ n’eluigwe, dị ka ndị a kọrọ n’akwụkwọ Job.—Job 1:6-12; 2:1-6.
Ọ bụrụ na Chineke ekpugheghị ya nye onye edemede ahụ kpọmkwem, Chineke mere ka e nwee onye maara maka ihe omume ndị dị otú ahụ ka ndị a wee bụrụ akụkụ nke akụkọ a kọrọ n’ọnụ ma ọ bụ nke e dere ede, nke e nyefere site n’otu ọgbọ gaa n’ọgbọ ọzọ ruo mgbe ha ghọrọ akụkụ nke ihe ndekọ Bible. (Lee igbe dị na peji nke 7.) Otú o sina dị, anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova bụ Isi Iyi nke ihe ọmụma nile dị otú ahụ, o duzikwara ndị ahụ dere ya ka ezighị ezi, ikwu ihe gabiga ókè, ma ọ bụ akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme ghara itetọ ihe ha dekọrọ. Pita dere banyere amụma: “Mmadụ sitere na Chineke kwuo okwu, mgbe Mmụọ Nsọ na-eme ka ha kwuo.”b—2 Pita 1:21.
Ọ Chọrọ Mgbalị Siri Ike
Ọ bụ ezie na ‘mmụọ nsọ mere ka ndị ahụ dere Bible kwuo okwu,’ n’agbanyeghị nke ahụ a chọrọ ka ha chezie echiche. Dị ka ihe atụ, Solomọn “ṅakwara ntị, wee gwupụta, mee ka ọtụtụ ilu dịzie. [Ọ] chọrọ ịchọpụta okwu nile na-atọ ụtọ, na ihe e deziri edezi, bụ́ okwu nile nke eziokwu.”—Eklisiastis 12:9, 10.
Ụfọdụ ndị so dee Bible mere nnyocha buru ibu iji dee ihe ha dere. Dị ka ihe atụ, Luk dere banyere ihe ndekọ Oziọma ya, sị: “M sooro ihe nile nke ọma site na mbụ, ka m degara gị n’usoro.” N’ezie, mmụọ Chineke gọziri mgbalị Luk, na-akwali ya n’ụzọ doro anya ịchọta akwụkwọ dabeere n’akụkọ ihe mere eme a pụrụ ịtụkwasị obi na ịgba ndị ji anya ha hụ ihe merenụ, bụ́ ndị a pụrụ ịdabere na ha ajụjụ ọnụ, dị ka ndị ozi dị ndụ mgbe ahụ na ikekwe Meri, bụ́ nne Jisọs. Mgbe ahụ mmụọ Chineke ga-eduzi Luk idekọ ihe ọmụma ahụ n’ụzọ ziri ezi.—Luk 1:1-4.
N’ụzọ dị iche n’Oziọma Luk, nke Jọn bụ ihe ndekọ nke onye ji anya ya hụ ihe merenụ, nke e dere ihe dị ka afọ 65 mgbe Jisọs nwụsịrị. Obi abụọ adịghị ya na mmụọ Jehova mere ka ikike ncheta Jọn dị nkọ ka oge gafeworonụ wee ghara ibelata ikike ya. Nke a ga-ekwekọ n’ihe Jisọs kwererịị ụmụazụ ya ná nkwa: “Onye nkasi obi ahụ, bụ́ Mmụọ Nsọ, Onye Nna m ga-ezite n’aha m, Onye ahụ ga-ezi unu ihe nile, meekwa ka unu cheta okwu nile Mụ onwe m gwara unu.”—Jọn 14:26.
N’ọnọdụ ụfọdụ ndị dere Bible denyere nchịkọta sitere n’ihe odide nke ndị ji anya ha hụ ihe merenụ nke ndị ọkọ akụkọ nke oge gara aga, bụ́ ndị ha dum na-esiteghị n’ike mmụọ nsọ. Jeremaịa chịkọtara ihe ka ukwuu ná Ndị Eze nke Mbụ na nke Abụọ n’ụzọ dị otú a. (2 Ndị Eze 1:18) Ezra zoro aka ma ọ dịkarịa ala n’ebe 14 na-esiteghị n’ike mmụọ nsọ chịkọta ihe dị n’Ihe Emere nke Mbụ na nke Abụọ, gụnyere “ihe e mere n’ụbọchị nke eze, bụ́ Devid” na ‘akwụkwọ ndị eze Juda na Israel.’ (1 Ihe Emere 27:24; 2 Ihe Emere 16:11) Ọbụna na Mosis hotara site “n’akwụkwọ agha dị iche iche nke Jehova”—eleghị anya ihe ndekọ a pụrụ ịdabere na ya nke agha ndị Chineke.—Ọnụ Ọgụgụ 21:14, 15.
N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ mmụọ nsọ tinyere aka n’ụzọ dị ike, na-akpali ndị dere Bible ịhọrọ nanị ihe a pụrụ ịdabere na ya, bụ́ nke ghọziri akụkụ nke ihe ndekọ Bible sitere n’ike mmụọ nsọ.
Ndụmọdụ Bara Uru —Site n’Ọnụ Ònye?
Bible nwere ụba ndụmọdụ bara uru nke dabeere ná nchọpụta onwe onye dị nkọ. Dị ka ihe atụ, Solomọn dere, sị: “Ọ dịghị ezi ihe dị n’ime mmadụ nke na-eri ihe na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-emekwa ka mkpụrụ obi ya hụ ezi ihe n’ime ndọgbu nke ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ. Nke a ka mụ onwe m hụkwara, na ọ bụ n’aka Chineke ka o sitere.” (Eklisiastis 2:24) Pọl kwuru na ndụmọdụ ya banyere alụmdi na nwunye bụ “izu [ya],” ọ bụ ezie na ọ gbakwụnyere, sị: “Ana m eche na mụ onwe m nwekwara Mmụọ Chineke.” (1 Ndị Kọrint 7:25, 39, 40) Pọl n’ezie nwere mmụọ Chineke, n’ihi na dị ka Pita onyeozi si kwuo, ihe Pọl dere bụ “dị ka amamihe e nyere ya si dị.” (2 Pita 3:15, 16, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) N’ihi ya, n’ịbụ onye mmụọ Chineke duziri, o kwuru izu ya.
Mgbe ndị dere Bible kwupụtara nkwenyesi ike onwe onye dị otú ahụ, ha mere nke ahụ n’ihi ịmụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ha nwere na itinye ha n’ọrụ. Anyị pụrụ ijide n’aka na ihe ha dere kwekọrọ n’echiche Chineke. Ihe ha dekọrọ ghọrọ akụkụ nke Okwu Chineke.
Otú ọ dị, Bible nwere okwu ụfọdụ ndị echiche ha hiere ụzọ kwuru. (Jiri Job 15:15 tụnyere 42:7.) Ọ gụnyekwara okwu ole na ole ndị gosipụtara mmetụta nhụjuanya nke ndị ohu Chineke, ọ bụ ezie na nke ahụ egosipụtaghị otú ihe dị n’akụkụ nile.c N’agbanyeghị ikwu okwu onwe onye dịgasị otú ahụ, ọ ka bụ mmụọ Chineke duziri onye edemede ahụ ka o detuo ihe ndekọ ziri ezi, bụ́ nke mere ka a mara ma na-ekpughe echiche na-ezighị ezi. Ọzọkwa, n’ọnọdụ nke ọ bụla okwu ndị gbara ya gburugburu na-eme ka onye ọ bụla ji ezi uche agụ ihe mara ma echiche onye edemede ahụ ò ziri ezi.
Ná nchịkọta, anyị pụrụ inwe obi ike na Bible dum bụ ozi Chineke. N’ezie, Jehova mere ka e jide n’aka na ihe nile dị n’ime ya kwekọrọ ná nzube ya ma nye ntụziaka dị mkpa maka ndị chọrọ ijere ya ozi.—Ndị Rom 15:4.
Ndị Edemede Bụ́ Mmadụ —N’ihi Gịnị?
Ojiji Jehova ji ụmụ mmadụ dee Bible na-egosi oké amamihe ya. Tụlee nke a: A sị na Chineke nyefere okwu ahụ n’aka ndị mmụọ ozi, Bible ọ̀ gaara enwe otu ndọrọ ahụ? N’eziokwu, ọ ga-abụrụ anyị ihe na-akpali akpali ịgụ banyere àgwà Chineke na mmeso ya site n’ụzọ onye mmụọ ozi si ele ihe anya. Ma ọ bụrụ na mmetụta mmadụ adịghị ya ma ọlị, anyị pụrụ inwe ihe isi ike ịghọta ozi Bible.
Iji maa atụ: Bible nwere ike ịkọ nanị na Eze Devid kwara iko ma gbuo ọchụ, nakwa na o mesịrị chegharịa. Ma lee ka o si ka mma inwe okwu Devid n’onwe ya, ka o kwupụtara nhụjuanya na-agbawa obi n’ihi omume ya ma rịọ Jehova maka mgbaghara! “Mmehie m dịkwa n’ihu m mgbe nile,” ka o dere. “Obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa, Chineke, Ị dịghị eleda ya anya.” (Abụ Ọma 51:3, 17) N’ihi ya, Bible nwere ikpo ọkụ, ịgwa ọgwa, na ndọrọ nke mmetụta ụmụ mmadụ na-enye ya.
Ee, Jehova họọrọ ụzọ kasị mma iji nye anyị Okwu ya. Ọ bụ ezie na e ji ụmụ mmadụ nwere adịghị ike na ndahie mee ihe, mmụọ nsọ duuru ha ka a ghara inwe ihie ụzọ ọ bụla n’ihe ndị ha dere. Otú a, Bible nwere abamuru kasị elu. Okwu ndụmọdụ ya ziri ezi, a pụrụ ịdabere n’amụma ya banyere Paradaịs ọdịnihu n’elu ala.—Abụ Ọma 119:105; 2 Pita 3:13.
Gịnị ma i mee ka ọ mara gị ahụ ịgụ otu akụkụ nke Okwu Chineke kwa ụbọchị? Pita dere, sị: “Ka agụụ mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya, na-agụsi unu ike, ka unu wee were ya na-eto eto ruo nzọpụta.” (1 Pita 2:2) Ebe ọ bụ na o si n’obi Chineke pụta, ị ga-ahụ ihe ọ bụla e deworo n’Akwụkwọ Nsọ ịbụ ihe “bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.”—2 Timoti 3:16, 17.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’otu ọnọdụ ma ọ dịkarịa ala, n’ihe banyere Iwu Iri ahụ, “mkpịsị aka Chineke” dere ihe ọmụma ahụ kpọmkwem. Nanị ihe Mosis mere bụ idebanyezi okwu ndị ahụ n’ime akwụkwọ mpịakọta ma ọ bụ n’ihe ndị ọzọ.—Ọpụpụ 31:18; Deuterọnọmi 10:1-5.
b E ji okwu Grik a sụgharịrị “na-eme ka ha kwuo” n’ebe a, bụ́ pheʹro, mee ihe n’ụdị ọzọ n’Ọrụ 27:15, 17 iji kọwaa ụgbọ mmiri nke ifufe na-ebugharị. Ya mere mmụọ nsọ ‘chịkwara ụzọ’ nke ndị dere Bible. Ọ kwaliri ha ịjụ ihe ọmụma na-ezighị ezi na idenye nanị nke bụ eziokwu.
c Dị ka ihe atụ, jiri 1 Ndị Eze 19:4 tụnyere amaokwu nke 14 na 18; Job 10:1-3; Abụ Ọma 73:12, 13, 21; Jona 4:1-3, 9; Habakuk 1:1-4, 13.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]
Olee Ebe Mosis Nwetara Ihe Ọmụma Ya?
MOSIS dere akwụkwọ Bible bụ́ Jenesis, ma ihe nile o dere mere ogologo oge tupu ọmụmụ ya. Mgbe ahụ, olee ebe o si nweta ihe ọmụma dị otú ahụ? Ọ pụrụ ịbụworị Chineke kpughere ya kpọmkwem nye ya, ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na a kọrọ n’ọnụ otú ihe omume ụfọdụ siri mee site n’otu ọgbọ gaa n’ọzọ. Ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ nwere oge ndụ ka ogologo n’oge mbụ, ọ pụrụ ịbụ na e nyefere ihe ka ọtụtụ n’ime ihe Mosis dekọrọ na Jenesis site n’Adam ruo Mosis site nanị ná njikọ mmadụ ise—Metusela, Shem, Aịsak, Livaị, na Amram.
Ọzọkwa, ọ pụrụ ịbụ na Mosis ji akụkọ ndị e dere ede mee ihe. N’ihe banyere nke a, o kwesịrị ka a rịba ama na ugboro ugboro Mosis jiri nkebi ahịrịokwu bụ́ “nke a bụ [akụkọ, NW] banyere” eme ihe, tupu ọ kpọọ aha onye a gaje ịkọ banyere ya. (Jenesis 6:9; 10:1; 11:10, 27; 25:12, 19; 36:1, 9; 37:2) Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na okwu Hibru a sụgharịrị “akụkọ” n’ebe a, bụ́ toh·le·dhohthʹ, na-ezo aka n’ihe odide akụkọ ihe mere eme dịbu adị ndị Mosis jiri mee ihe dị ka ebe ihe ndị o dere sitere. Otú ọ dị, a pụghị ikwu nke a n’enweghị mgbagha.
Ọ pụrụ ịbụ na e nwetara ihe ọmụma dị n’akwụkwọ Jenesis site n’ụzọ atọ dum ahụ dị n’elu—ụfọdụ site ná mkpughe kpọmkwem, ụfọdụ site n’okwu ọnụ, ụfọdụkwa site n’akụkọ e dere ede. Isi ihe dị mkpa bụ na mmụọ Jehova duziri Mosis. Ya mere, a na-ele ihe o dere anya n’ụzọ ziri ezi dị ka Okwu Chineke.
[Foto ndị dị na peeji nke 4]
N’ụzọ dịgasị iche iche, Chineke duziri ụmụ mmadụ ide Bible