Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 7/1 p. 27-30
  • Ị̀ Bụ Enyi Chineke?—Ihe Ekpere Gị Na-ekpughe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Bụ Enyi Chineke?—Ihe Ekpere Gị Na-ekpughe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịchọta Oge Maka Ekpere
  • Ime Ka Ọdịdị Ekpere Anyị Ka Mma
  • Nkasi Obi na Nghọta n’Oge Mkpa
  • Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Otú Ị Pụrụ Isi Bịaruo Chineke Nso
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Chineke Ọ̀ Ga-anụ Ekpere M?
    Teta!—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 7/1 p. 27-30

Ị̀ Bụ Enyi Chineke?—Ihe Ekpere Gị Na-ekpughe

Ọ̀ DỊWO mgbe ị nụpeere ná ndaba ka mmadụ abụọ na-akpa nkata? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na o weghị gị ogologo oge ịchọpụta ụdị mmekọrịta ha nwere—ma ha bụ ndị chiri anya ma ọ bụ ndị na-amaghị onwe ha, nanị ndị maara onwe ha ka ọ̀ bụ ndị enyi tụkwasịrị onwe ha obi. N’ụzọ yiri nke ahụ, ekpere anyị pụrụ ikpughe mmekọrịta anyị na Chineke.

Bible na-emesi anyị obi ike na Chineke ‘anọghị n’ebe dị anya n’ahụ onye ọ bụla n’ime anyị.’ (Ọrụ 17:27) N’ezie, ọ na-akpọ anyị òkù ịmara ya. Ọbụna na anyị pụrụ ịbụ ndị enyi ya. (Abụ Ọma 34:8; Jemes 2:23) Anyị pụrụ iso ya na-akpachi nnọọ anya! (Abụ Ọma 25:14) N’ụzọ doro anya, mmekọrịta anyị na Chineke bụ ihe kasị dị oké ọnụ ahịa nke anyị bụ́ mmadụ na-ezughị okè pụrụ inwe. Jehova na-ejikwa ọbụbụenyi anyị akpọrọ oké ihe. Nke a pụtara ìhè n’ihi na ọbụbụenyi anyị na ya dabeere n’okwukwe anyị n’ebe Ọkpara ọ mụrụ nanị ya nọ, bụ́ onye nyere ndụ ya n’ihi anyị.—Ndị Kọlọsi 1:19, 20.

Ya mere ekpere anyị kwesịrị igosipụta ịhụnanya na ekele dị ukwu maka Jehova. Otú ọ dị, ọ̀ dịwo mgbe i chere na ekpere gị, ọ bụ ezie na ọ dị nsọpụrụ, enwechaghị ezi mmetụta miri emi? Nke a adịghị ụkọ. Gịnị bụ isi ihe ga-emeziwanye ihe? Iwulite mmekọrịta gị na Jehova Chineke.

Ịchọta Oge Maka Ekpere

Nke mbụ, ọ na-ewe oge ịzụlite ọbụbụenyi. Kwa ụbọchị ị pụrụ ikele ma ọ bụ ọbụna isoro ọtụtụ ndị mmadụ kparịta ụka—ndị agbata obi, ndị ọrụ ibe gị, ndị na-anya bọs, na ndị na-ere ihe n’ụlọ ahịa. Ma, nke a apụtatụghị na gị na ndị dị otú ahụ bụ enyi n’ezie. Ọbụbụenyi na-eto ka i sooro mmadụ kwurịta okwu ruo ogologo oge, na-esi ná nkata na-emighị emi gaa n’ikwupụta mmetụta na echiche unu miri emi.

N’ụzọ yiri nke ahụ, ekpere na-enyere anyị aka iru Jehova nso. Ma a ghaghị inye ya oge zuru ezu; a chọrọ ihe karịrị iji ọkụ ọkụ kwuo i meela n’oge nri. Ka ị na-agwa Jehova okwu karị, otú ahụ ka ị na-enwe ike inyocha mmetụta, ebumnobi, na omume gị. Ihe ngwọta nye nsogbu ndị siri ike na-amalite ịpụta ìhè ka mmụọ Chineke na-eme ka e cheta ụkpụrụ ndị sitere n’Okwu ya. (Abụ Ọma 143:10; Jọn 14:26) Ọzọkwa, ka ị na-ekpe ekpere, Jehova na-aghọkwu onye dị adị nye gị, ị na-amatakwukwa mmasị ịhụnanya na nchegbu ya maka gị.

Nke a dị otú ahụ karịsịa mgbe i nwetara azịza nye ekpere gị. Ee, Jehova pụrụ “imebiga ókè nke ukwuu hie nne karịa ihe nile nke anyị na-arịọ ma ọ bụ nke anyị na-atụgharị uche”! (Ndị Efesọs 3:20) Nke a apụtaghị na Chineke na-arụrụ gị ọrụ ebube. Otú ọ dị, site n’Okwu ya e dere ede, mbipụta nke òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, ma ọ bụ site n’ọnụ ụmụnna nwoke na nwanyị na-ahụ n’anya, ọ pụrụ inye gị ndụmọdụ ma ọ bụ nduzi dị mkpa. Ma ọ bụ ọ pụrụ inye gị ume dị mkpa iji tachie obi ma ọ bụ guzogide ọnwụnwa. (Matiu 24:45; 2 Timoti 4:17) Ụdị ahụmahụ ndị ahụ na-eme ka obi anyị jupụta n’ekele maka Enyi anyị nke eluigwe!

Ya mere mmadụ aghaghị iwepụta oge maka ekpere. N’eziokwu, oge adịghị ezu ezu n’ụbọchị ndị a jupụtara ná nchekasị. Ma mgbe ị na-eche banyere mmadụ n’ezie, ị na-achọtakarị oge iji soro onye ahụ nọrọ. Rịba ama ụzọ ọbụ abụ ahụ siri kwupụta obi ya: “Dị ka agụụ iyi mmiri si agụ nne ele, otú a ka agụụ Gị na-agụ mkpụrụ obi m, Chineke. Akpịrị Chineke, bụ́ Chineke dị ndụ, akpọwo mkpụrụ obi m nkụ: olee mgbe m ga-abịa, e wee hụ m n’ihu Chineke?” (Abụ Ọma 42:1, 2) Ị̀ na-enwe agụụ yiri nke ahụ ịgwa Chineke okwu? Mgbe ahụ zụchapụta oge ime otú ahụ!—Tụlee Ndị Efesọs 5:16.

Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ịnwale iteta ụra n’isi ụtụtụ iji nwee oge ị ga-anọ nanị gị iji kpee ekpere. (Abụ Ọma 119:147) Ọ̀ na-esiri gị ike mgbe ụfọdụ ịrahụ ụra n’abalị? Mgbe ahụ, dị ka ọbụ abụ ahụ, ị pụrụ ile ụdị oge ndị ahụ na-enye nsogbu anya dị ka ohere ikwupụtara Chineke nchegbu gị. (Abụ Ọma 63:6) Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ nanị ihe banyere ikpe ọtụtụ ekpere dị mkpirikpi n’ụbọchị. Ọbụ abụ ahụ gwara Chineke, sị: “Gị ka m na-akpọku ogologo ụbọchị nile.”—Abụ Ọma 86:3.

Ime Ka Ọdịdị Ekpere Anyị Ka Mma

Mgbe ụfọdụ ị ga-ahụkwa ya dị ka ihe na-enye aka ime ka ekpere gị dịkwuo ogologo. Mgbe ị na-ekpe ekpere dị mkpirikpi, ị pụrụ ịchọ ikwu banyere ihe na-emighị emi. Ma mgbe ị na-ekpe ekpere dị ogologo ma dị omimi, ị na-ekwupụta echiche na mmetụta ime gị ozugbo karị. Ma ọ dịghị ihe ọzọ n’otu oge Jisọs ji abalị nile kpee ekpere. (Luk 6:12) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-ahụta na ekpere gị ga-esikwu n’ala ala obi ma nwekwuo nzube ma ọ bụrụ na i zere ikpe ha ọkụ ọkụ.

Nke a apụtaghị ịgba gburugburu mgbe i nwere ihe dị nta ikwu; ọ pụtaghịkwa ikwughachi ihe n’ụzọ na-abaghị uru. Jisọs dọrọ aka ná ntị: “Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwukwasị efu, dị ka ndị mba ọzọ na-eme: n’ihi na ha na-eche na a ga-anụ olu ha n’ọtụtụ okwu ha na-ekwu. Ya mere, unu eyila ha: n’ihi na Nna unu matara ihe nile dị unu mkpa, mgbe unu aka-arịọghị Ya.”—Matiu 6:7, 8.

Ekpere na-enwekwu nzube mgbe i bu ụzọ chebara ihe ndị ị chọrọ ikwu banyere ha echiche. Ihe ha pụrụ ịbụ adịghị agwụ agwụ—ọṅụ anyị n’ozi, adịghị ike na mmejọ anyị, ndakpọ olileanya anyị, nchegbu akụ̀ na ụba anyị, nrụgide n’ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ, ọdịmma nke ezinụlọ anyị, na ọnọdụ ime mmụọ nke ọgbakọ anyị, ihota nanị ole na ole.

Mgbe ụfọdụ uche gị ò yiri ka ọ na-akpapụ mgbe ị na-ekpe ekpere? Mgbe ahụ tinyekwuo mgbalị ịtụkwasị uche na ya. E kwuwerị, Jehova dị njikere ‘ịṅa ntị n’iti mkpu anyị.’ (Abụ Ọma 17:1) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịdị njikere itinyesi mgbalị ike iji ṅaa ntị n’ekpere nke onwe anyị? Ee, ‘tụkwasị uche n’ihe nke Mmụọ Nsọ,’ gharakwa ikwe ka ọ kpapụ.—Ndị Rom 8:5.

Ụzọ anyị si agwa Jehova okwu dịkwa mkpa. Ọ bụ ezie na ọ chọrọ ka anyị were ya dị ka enyi, anyị ekwesịghị ichezọ na anyị na-agwa Eze nke eluigwe na ala okwu. Gụọ ma tụgharịa uche n’ihe omume na-akpata egwu nke e gosipụtara ná Mkpughe isi nke 4 na 5. N’ebe ahụ Jọn hụrụ n’ọhụụ ịdị ukwuu nke Onye ahụ anyị na-agakwuru n’ekpere. Lee ihe ùgwù ọ bụ inwe ike ịgakwuru “Onye ahụ nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ”! Ọ dịghị mgbe anyị ga-achọ ka okwu anyị bụrụ nke na-adịghị nsọpụrụ ma ọ bụ na-enweghị nkwanye ùgwù. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị itinye mgbalị siri ike iji mee ka ‘okwu nile nke ọnụ anyị na ntụgharị nke obi anyị bụrụ ihe na-atọ ụtọ n’ihu Jehova.’—Abụ Ọma 19:14.

Otú ọ dị, ghọta na anyị adịghị egosi Jehova na anyị maara ihe site n’okwu na-ada oké ụda. Okwu anyị ndị sitere n’obi, dị nsọpụrụ na-atọ Jehova ụtọ, n’agbanyeghị otú e si kwuo ha n’ụzọ dị mfe.—Abụ Ọma 62:8.

Nkasi Obi na Nghọta n’Oge Mkpa

Mgbe anyị chọrọ enyemaka na nkasi obi, anyị na-ejekwurukarị ezi enyi maka nkwado na ọmịiko. Ọ dịghị enyi a pụrụ ịgakwuru n’ụzọ dị mfe karịa Jehova. O “mewo ka a chọta Ya n’inyeaka nke ukwuu ná mkpagbu nile.” (Abụ Ọma 46:1) Dị ka “Chineke nke nkasi obi nile,” ọ na-aghọta ihe anyị na-enwe ahụmahụ ya karịa onye ọ bụla ọzọ. (2 Ndị Kọrint 1:3, 4; Abụ Ọma 5:1; 31:7) O nwekwara ezi mmetụta ọmịiko maka ndị nọ n’oké nsogbu. (Aịsaịa 63:9; Luk 1:77, 78) N’ịghọta Jehova ịbụ enyi nwere nghọta, anyị na-enwere onwe anyị ịgwa ya okwu site n’obi, n’ụzọ dị omimi. A na-akpali anyị ikwupụta egwu na nchegbu anyị ndị kasị omimi. Anyị na-esi otú a hụta n’onwe anyị otú ‘nkasi obi Jehova si agụgụ mkpụrụ obi anyị.’—Abụ Ọma 94:18, 19.

Mgbe ụfọdụ anyị pụrụ iche na anyị erughị eru ịgakwuru Chineke n’ihi njehie anyị. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ezi enyi gị emehie megide gị ma rịọ mgbaghara? Ọ̀ bụ na a gaghị akpali gị ịgụgụ onye ahụ ma mesighachi ya obi ike? N’ihi gịnịzi ka ị ga-eji atụ anya ihe dị ala karịa nke ahụ n’aka Jehova? Ọ na-agbaghara ndị enyi ya mehiere n’ihi ezughị okè mmadụ n’ụba. (Abụ Ọma 86:5; 103:3, 8-11) N’ịmara nke a, anyị adịghị ala azụ inwere onwe anyị ikwupụta njehie anyị nye ya; anyị pụrụ inwe obi ike inweta ịhụnanya na ebere ya. (Abụ Ọma 51:17) Ọ bụrụ na anyị dara mbà n’ihi emezighị emezi anyị, anyị pụrụ inwe nkasi obi n’okwu nke 1 Jọn 3:19, 20: “N’ime nke a ka anyị ga-amara na anyị bụ ndị nke eziokwu ahụ, meekwa ka obi anyị kwenye ekwenye n’ihu Ya, n’ihe ọ bụla nke obi anyị na-ama anyị ikpe n’ime ya; n’ihi na Chineke ka obi anyị ukwuu, Ọ makwaara ihe nile.”

Otú ọ dị, ọ dịghị anyị mkpa ịnọ n’oké nsogbu iji nweta nlekọta ịhụnanya Chineke. Jehova nwere mmasị n’ihe ọ bụla nke ga-emetụta ọdịmma ime mmụọ na mmetụta uche anyị. Ee, ọ dịtụghị anyị mkpa iche na mmetụta, echiche, na nchegbu anyị dị nke nta nke ukwuu ịbụ ihe a ga-akpọtụ uche n’ekpere. (Ndị Filipaị 4:6) Mgbe gị na ezi enyi gị nọ, ùnu na-ekwurịta nanị oké ihe ndị mere ná ndụ unu? Ọ̀ bụkwa na unu anaghị ekwurịta nchegbu ndị dịtụ nta? N’ụzọ yiri nke ahụ, ị pụrụ inwere onwe gị iso Jehova kwurịta banyere akụkụ ọ bụla nke ndụ gị, na-amara na “ihe nile banyere unu na-emetụ Ya n’obi.”—1 Pita 5:7.

N’ezie, o yighị ka ọbụbụenyi ọ ga-adịte aka ma ọ bụrụ na ihe nile ị na-ekwu bụ banyere onwe gị. N’otu aka ahụ, ekpere anyị agaghị abụ banyere onwe anyị nanị. Anyị kwesịkwara ikwupụta ịhụnanya na nchegbu anyị maka Jehova na ọdịmma ya. (Matiu 6:9, 10) Ekpere abụghị nanị ohere ịrịọ enyemaka Chineke kamakwa ohere ikwupụta ekele na otuto. (Abụ Ọma 34:1; 95:2) “Inweta ihe ọmụma” site n’inwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya ga-enyere anyị aka n’akụkụ a, ka ọ na-enyere anyị aka ịmarakwu Jehova na ụzọ ya nke ọma. (Jọn 17:3, NW) Ị pụrụ ịhụta ya dị ka ihe inyeaka karịsịa ịgụ akwụkwọ Abụ Ọma ma rịba ama otú ndị ohu kwesịrị ntụkwasị obi ndị ọzọ si kwupụta obi ha nye Jehova.

Ọbụbụenyi Jehova bụ n’ezie onyinye dị oké ọnụ ahịa. Ka anyị gosi na anyị nwere ekele maka ya site n’ime ka ekpere anyị mikwuo emi, sitekwuo n’obi, ma gakwuo n’ihe dịịrị onwe onye. Mgbe ahụ anyị ga-enweta obi ụtọ nke ọbụ abụ ahụ kwupụtara, bụ́ onye kwuru, sị: “Ihe na-agara ya nke ọma, bụ́ onye Ị na-ahọpụta, onye Ị na-emekwa ka ọ bịaruo nso.”—Abụ Ọma 65:4.

[Foto ndị dị na peeji nke 28]

Anyị pụrụ ikpegara Chineke ekpere n’oge nile n’ụbọchị ka ohere na-ebilite

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya